Matiu 25:14-30

Lesson 225 - Senior

Memory Verse
“N’ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè ma site n’aka onye nēnwegh, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya” (Matiu 25:29).
Cross References

I Talent niile na Ndị natara ha

1. Enyere ndị orù anwapụtaworo talent dịka ike aka ha ra, Matiu 25:14, 15; Luk 19:12, 13; Ndi Rom 12:6-8; I Ndi Kọrint 12:1-31; Ndi Efesọs 4:11, 12

2. Ndị orù ndị kwesịrị ntụkwasịobi, ritakwara urù talent okpùkpù abụọ, site ná ndọgbu na iji ihe enyere ha lụaọlụ, Matiu 25:16, 17; Luk 19:16, 28; I Ndi Kọrint 12:31; 14:1; 15:10; 2 Timọti 2:15

3. Orù nke ná-ekwesịghị ntụkwasịobi emeghị ihe ọ bụla igosi ekele maọbụ ikwesị ntụkwasịobi, Matiu 25:18; Luk 12:47; 19:20, 21; Jemes 2:14; 4:17

II Ụgwọọlụ na Ikpé nke ga-adị ná Nlaghachịta nke Onyenwe anyị

1. Nlọghachita nke Onyenwe anyị bụ mmalite ikpé na inye otuto, Matiu 25:19, 31-46; Luk 12:37; 19:15; Nkpughe 3:11; 16:15

2. Ndị ahụ kwesịrị ntụkwasịobi ga-anata ụgwọọlụ nke bụ ntụkwasị ijé ozi na ọlụ, Matiu 25:20-23; Luk 19:16-19; 22:28-30; Nkpughe 5:10; 19:11-16; 20:1-6; I Ndi Kọrint 6:2; Jud 14:15

3. Ndị ahụ ná-ekwesịghị ntụkwasịobi ka aga-anapụ ngọzi niile na ọñụ nke ijé ozi wee chụpụ ha rue mgbe ebighịebi, Matiu 25:24-30; Luk 19:20-24; Ndi Rom 11:29; 2 Ndi Tesalọnaika 1:6-10

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndụmọdụ nke Onwe Onye

Jisọs tụrụ ọtụtụ ilu banyere Alaeze Eluigwe. Nime nke a anyị na-atụle ugbu a, Ọ na-egosi onwe Ya dịka mmadụ nke gaje ịnọdụ n’ala dị anya, onye kpọkọrọ ndị orù ya, rara ihe niile O nwere nye n’aka ha, ka ha wee lekọta ha anya mgbe Ọ na-anọghị ya. Anyị nwere ike ichè na mmadụ a na ndị orù ya nwere ezi mkparịtaụkà sitere n’obi ha, O wee kọwaara ha ụdị ọlụ nke Ọ chọrọ ka ha lụọ mgbe Ọ na-anọghị ya. Ha bụrị ndị orù ya. Ha maara ya, ihe niile ọ chọrọ, na ntuziaka ya. Ọ makwaara ha. Ọ maara otú ike ha ra na ikwesị ntụkwasịobi ha. Ọ dịghị agwa ha ka ha mee ihe ana-apụghị ime, ma náánị ka ha lezieanya ime ihe niile ọ chọrọ ná ijé ozi ya.

Dịka o metụtara anyị na kwa ọnọdụ anyị dịka ndị ọlụ n’ubivine nke Alaeze ahụ, anyị na-aghọta na aga-eji ike kwusaa okwu ahụ, aga-ekpekwara ndị ọrịa ekpere ka agwọọ ha, aga-akpọghachị kwa ndị furuefu n’ogige. Aghaghị ịkpọkọta ndị nsọ ná nzukọ ka e wee tutee obi ha dị ọcha n’ichetara ha iwu na mkwà niile nke Chineke. Ndị nwere talent n’abù aghaghị ịmụta nkeọma otú esi akpọ ụbọ dị icheiche; aga-enwe kwa ndịkom na ndịnyom nwere olu abù, ndị gana-eji olu-ha bụọ abù n’ụlọ nsọ Chineke. Aghaghị inwe ndị ná-agbasi mgbá ike n’ekpere n’ihi ụwa nke furuefu, ma aga-enwe kwa ndị ga-apụ gaa n’ụzọ atụliri atụli na awara ụzọ niile ịrụgide ndị mmehie ka ha bata, ná-echéfughị ndụmọdụ nke Onyenwe anyị nyere anyị, bụ ịga “n’uwa nile, kwusara ihe nile ekère-èkè ozi-ọma nkem” (Mak 16:15).

Ọtụtụ ọlụ dị nke aga-alụ ma Chineke enyewo anyị ọtụtụ mkwà dị óké ọnụahia ịgbà anyị ume na ịdụ anyị ọdụ. Ọ sịwo na Ya agaghị arapụ anyị ná-enweghị nkasịobi; Ọ ga-enye anyị ike ịlụzu ọlụ anyị nkeọma n’ubi Ya; Ọ ga-enyezu anyị ihe niile ná akpá anyị dịka àkù Ya n’ebube sị dị, ma O kwewo kwa anyị mkwà na anyị na Ya ga-abụ ndị ná-ekekọ òkè, na anyị na Ya ga-achị achị n’Alaeze Ya.

Ná arụghịụkà, mgbe onyenwe ndịorù na ndịorù ya nwesịrị ezi mkparịtaụkà site n’obi ha, akpaliri mkpụrụobi ọtụtụ nime ndị orù ya, ha wee kwee mkwà nime onwe ha, na ha ga-eji talent ọ bụla enyere ha lụzue ọlụ otú ike ha ra. Anyị na áhụ na ụfọdụ mere ihe ahụ, ma ndị ọzọ kwere mkwà na ha ga-eme otú ahụ mgbe ha na-achọ ịnata iruọma n’ebe onyenwe ha nọ, ma ha nọdụrụ ala rapụ imezu mkwà ha. Ụfọdụ bụ ndị ike ọgwụgwụ na ndị umengwu n’ịgbalị n’ụzọ ọ bụla.

Nkesà nke Talent

Onyenwe anyị na-ekesà talent, maọbụ ọlụ, dịka ike onye ọ bụla ra. Ọ pụrụ ịhụ ntozuòkè anyị n’ụzọ ọ bụla. Ebe a na-enye onye ọ bụla onyinye dị icheiche n’ọtùtù, otù ikwesị ntụkwasịobi ahụ ka achọrọ n’aka onye ọ bụla, o nwekwara otù ụgwọọlụ. Talent ise ga-adịrị ụfọdụ ukwuu, ma otù talent ga-adịkwara ndị ọzọ óké ntakịrị. Onye ahụ nke nwere nke ntà ekwesịghị ikwosa onye nwere nke ukwuu ekworo, n’ihi na ọ bụ Chineke kesara òkè ahụ O ji kwa amamihe ebighịebi mee ya. Ọ dịghị mgbe Ọ na-asị anyị mee ihe ana-apụghị ime. Ọ maara anyị, ná áhù kwa ka ike anyị ra. Ajụjụ nke dịrị anyị bụ ma anyị na-eji, maọbụ na anyị adịghị eji onyinye O nyeworo anyị, alụ ọlụ maọbụ na anyị ekechịwo ha wee wezuga ha.

Mgbe àtùmààtù niile ndịa zuruòkè e wee nye kwa ha talent ahụ niile, onyenwe ha rapụrụ jee obodo dị anya. A rapụrụ ndị orù ahụ ka ha lụọ ihe enyefere ha n’aka ịlụ. Ọ dị n’ike aka ha iji talent enyeworo ha lụọọlụ, maọbụ ịnọdụ ná-alụghị ihe ọ bụla. Ụgwọọlụ maọbụ amamikpé ikpeazụ ha dabeere n’otú ha si were talent ahụ enyere ha lụọọlụ. Ụgwọọlụ maọbụ amamikpe ebighịebi anyị n’otù aka ahụ ga-esite n’otú anyị si were talent anyị lụọọlụ.

Ime ka Talent baa Ụba

N’ilu ahụ Jisọs tụrụ onye nke natara talent ise na onye nke natara talent abụọ gara otù mgbe ahụ ịlụọlụ. Ha nọgidere n’ọlụ nke onyenwe ha. Ha nọ ná-agbalịsiike ịlụpụta ọtụtụ talent ọzọ. Ha ji ịnọgidesiike ná-alụọlụ ha. Ha alaghị kwa àzú n’ịlụ ọlụ-ha ọbụná mgbe onyenwe ha na-anọ ọdù. N’ihi nke a, ịlụsi ọlụ ike ha wetaara ha ezi ụgwọọlụ. Ha ritakwara ọtụtụ talent ọzọ n’urù. Ndị ọzọ nọ ná-etufu oge ha rue mgbe onyenwe ha lọghachiri.

N’ime ndụ na ibuagha nke Ndị Kraist ụfọdụ bụ ndị ná-amalite nkeọma na-anọgide kwa na nwa mgbe dịka ndị orù kwesịrị ntụkwasịobi, ma ha adịghị enwe nọgidesiike wee rue ọgwụgwụ. Pọl Onyeozi degaara ụfọdụ ndịa akwụkwọ sị, “Unu nāgbari ọsọ nke ọma; ònye gbochiri unu, ka unu ghara ikwenyere ezi-okwu ahu?” (Ndi Galetia 5:7).

Orù Umengwụ ahụ

Orù nke natara otù talent gara gwue ala zobe ego nke onyenwe ya kama ime ka ọ mụpụta ihe nye onyenwe ya. Ụfọdụ na-asị na ọ bụ onye umeagwụ. Ma ọ bụghị ume ka o jiri gwue ala wee zobe kwa ego ahụ? Ọ bụrụ na o tinyere ume dị otú a ime ka talent ya baa ụba, ọ gaghị enwetaworị urù dị ntà nye onyenwe ya? Jisọs agwawo anyị na “alaka ọ bula … nke nādigh-ami nkpuru, Ọ wepu ya” (Jọn 15:2).

Nlọghachị nke Onyenwe anyị

Jisọs sịrị na onyenwe ha lọghachịrị wee kpọkọta ndịorù ya ka ha na ya wee pịazie. Ndị kwesịrị ntụkwasịobi ji ọñụ bịa ikele onyenwe ha. Ma o sighị ike ịghọta omume ikpéọmụma nke orù ahụ ná-ekwesịghị ntụkwasịobi.

Ikwesị ntụkwasịobi na inye ndụ onweonye n’ọlụ Kraist na-etinye mkwuwaokwu ná ndụ mmadụ. Ndị nwere omume dị otú a enweghị egwù nime obi ha mgbe akpọrọ ha ka ha bịa zute Onyenwe ha. ké ọñụ dị añaa ka ọ ga-abụ mgbe anyị ga-eji talent anyị guzo na-asị, “Lee, Onye-nwem, nka bụ ihe I nyerem; nka bụ kwa ihe m’nwere ike, site n’amara Gị, iritara Gị n’urù.” Tụgharịa n’obi-gị ịhụ ndị agbapụtaworo ka ha guzoro setipụ kwa aka ha ná-enye Onyenwe ha na Onyenzọpụta ha talent ha. Lee ọñụ dị n’iru Onyenwe ha mgbe Ọ na-ekwu okwu otuto ahụ sị, “I mere nke ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi” Ọ bụ na nke a agaghị akwụghachị anyị ụgwọ, n’ihi ọlụ niile, ndọgbu n’ọlụ niile, ọnwụnwa niile, na nkewapụ niile nke anyị gabigaworo nime ha?

Olenaole ghọtara na ọlụ ana-alụrụ Chineke bụ óké ihe nke ná-ekwesịghị ka ewere ya n’ihe dị mfé. Tụlee nkeọma ihe ndepụta ndịa sitere n’Akwụkwọnsọ: “Onye ọ bula nke gēkuru nání iko miri oyi nye otù onye nime ndi nta ndia ñua n’aha onye nēso uzọm, n’ezie asim unu, Ọ gaghi-etufu ugwọ-ọlu-ya ma-ọli”; n’otù aka ahụ, “Onye kwesiri ka atukwasi ya obi n’ihe dikarisiri nta kwesi-kwa-ra ka atukwasi ya obi n’óké ihe.” Ihe ebube dị añaa ka ọ ga-abụ mgbe Onyenwe anyị ga-eme ka otuto anyị dị elu wee sị “Ba n’ọñu nke Onye-nwe-gi.”? Owuweiheubi agawo! Ọlụ agwụwo! Ọñụ mgbe ebighịebi! Ụgwọọlụ dị añaa ka ọ ga-abụ!

Otù Talent Ahụ

Onye otù talent ahụ emeghị dịka ndị orù ibe ya. O kpebiri na ọ dịghị ihe ọ bụla ọ ga-eji talent ya wee mee. Ọ dịghị ihe o jiri talent ahụ mee n’ezie. Ọ maara Onyenwe ya. Ọ dịghị mgbe ọ rapụrụ ịnara ihe ruuru ya. O ji ọnọdụ dị elu n’ebe Onyenwe ya nọ. Ma ọ gbalịghị maọlị, n’oge nke a, nke pụrụ-rị inye ya okpukpu abụọ ọ ga-enyeghachị Onyenwe ya. Ya mere mgbe oge mpịazi nke ana-agaghị agbanarị ruru, o nweghị ihe o nwere inye Onyenwe ya. Ma mgbe ahụ, ka o wee kpuchie umengwụ na nnupuisi nke dị n’obi ya, o bokwara Onyenwe ya ebubo na ọ bụ mmadụ akaike. Orù a ná-ekweghịekwe na onyennupuisi kwuru nkeọma kwue kwa ihe mere eme mgbe ọ sịrị, “M’ we tua egwù.”

Mgbe mmehie dị n’obi egwù na-adị, ntụkwasịobi agaghị adị n’ebe Chineke nọ. Adam tụrụ egwù mgbe Chineke kpọrọ ya, n’ihi na o mehiere Chineke. Puku iri abụọ na puku abụọ ndịkom rapụrụ ùsù ndịagha nke Gideon n’ihi egwù. Ọ bụ mmehie na-eme ka mmadụ tụọ egwù.

Ndị ná-atụ ụjọ na ndị ná-ekweghịekwe, òkè ha ga-abụ nime ọdọọkụ ahụ nke ji ọkụ na brimstone ná-ere, n’ihi mmehie na ekweghịekwe ha nke wetaara ha ụjọ. Ọ bụ gịnị taa na-akpata obi ụmụmmadụ ịlọ mmiri, site-kwa n’ile anya ihe ná-abịakwasị eluụwa? Ọ bụ egwù; na mmehie nke dị n’obi ha wetara ụjọ ahụ.

Ụgwọọlụ nke ndị Ajọomume

“Gi ajọ orù di ume-ngwu” bụ okwu amamikpé nke dakwasịrị nwoke ahụ zobere talent ya. “Napunu ya talent ahu, were kwa ya nye onye ahu nwere talent iri ahu. N’ihi na onye ọ bula nke nwere ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa òkè: ma site n’aka onye nēnwegh, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya.” Orù umengwụ a dị ka ndị hụrụ ụwa nke a n’anya karị ndụ ebighịebi. Mgbe ndị ahụ ndị lefuuru ohere nke ha nwere ugbu a anya ga-eguzo n’iru Onyenwe ha, aga-anapụ ha ohere niile ha nwere ịlụrụ Ya ọlụ rue mgbe ebighịebi, ha ga-eguzo kwa ebe ahụ n’ihere.

Ma nke a abụghị náánị amamikpé nke orù onye umengwụ ahụ natara. Ọ nụkwara okwu ndịa: “Tupukwa-nu orù a nābagh n’ihe n’ọchichiri nke ezi; n’ebe ahu ka ikwa-akwa na ita-ikekere-eze ahu gādi.” Lee nnọọ ụdị ọgwụgwụ dị ilu ná-echere ndị ajọomume na ndị na-atụ ụjọ na ndị umengwụ! N’ebighịebi niile ọ gana-échèghachị échìchè àzụ ná “ihe ga-adịwori.” Mgbe abànyere n’ogige ndị furu efu ọ dịghị kwa àjà mkpuchị mmehie dị. Mgbe anwụsịrị ekpebiwo ikpé.

Anya mmiri nke nchègharị na iji eziobi chọọ Chineke n’ihi mgbaghara mmehie ugbu a ga-emeghe ọnụ ụzọ nke Eluigwe wee zọpụta mkpụrụobi n’ịkwáákwá na itimkpu rue mgbe ebighịebi. Ka anyị jụọ onwe anyị ajụjụ a, “Anyị na-eji talent anyị niile ejere Onyenwe anyị ozi?”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ihe jikọtara ndị ahụ natara talent na onye ahụ nyere ha talent, tutu o nye ha talent ahụ?
  2. Gịnị ka talent ndịa na-anọchị anya ha nime onyinye àmàrà anyị na-anata dịka ndị nke Kraist?
  3. Gịnị mere eji nye ụfọdụ karị ibe ha?
  4. Gịnị bụ ihe ana-atụle n’ikesà talent ana-enye anyị n’otù n’otù?
  5. Gịnị bụ ụgwọọlụ nke ndị kwesịrị ntụkwasịobi?
  6. Kwugharịa okwu nke otuto nke enyere ndị ahụ ji talent ha lụpụta ihe.
  7. Kwugharịa okwu nke amamikpé nke agwara onye ahụ zoro talent ya.
  8. Gịnị dakwasịrị orù ahụ nke ná-abàghị n’ihe?
  9. Gụpụta eziokwu niile na ezi òzízí niile nke sitere n’Akwụkwọnsọ nke eziri anyị nime ilu a maramma.