Abù Ọma 34:1-22

Lesson 226 - Senior

Memory Verse
“JEHOVA nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha” (Abù Ọma 34:18).
Cross References

I Abù Ọma nke Otuto

1. Ihe mere n’etiti Devid na Abimelek bụ eze Gat kpatara o jiri bụọ Abù Ọma nke a, I Samuel 21:10-15; Ilu 29:25; Eklisiastis 7:7

2. Devid malitere Abù Ọma ya n’obi nke jupụtara n’otuto nye Chineke, Abù Ọma 34:1, 2; 72:8, 15; 145:2

3. Devid chọrọ ka mmadụ niile soro ya bulie Chineke elu, Abù Ọma 34:3; 35:26-38; Luk 1:46

II Abù nke Nnapụta

1. Devid kwupụtara na ya rịọrọ Chineke arịrịọ, Chineke wee zaa ekpere ya, Abù Ọma 34:4-6; 18:6; 22:24; 10:17

2. Nchébe na nnapụta n’ihe ánà-áhù anya bụ ihe-nketa nke ụmụ Chineke, Abù Ọma 34:7; 91:9-12; Matiu 18:10; Ndi-Hibru 1:14

3. Nlekọta dị nsọ nke Chineke ka ekwupụtara na ọ dịrị ụmụ Chineke, Abù Ọma 34:8-10; 23:5; Aisaia 25:4; Jenesis 28:15; Abù Ọma 37:28; 2 Timọti 4:18

III Ndụmọdụ ka E fèè Chineke

1. Devid chọrọ ka ndị-ya site n’aka ya mụta ịtụ egwù Chineke, Abù Ọma 34:11; Ilu 1:8; 4:1; Eklisiastis 12:1

2. Devid dụrụ ndị chọrọ ịhụ ụbọchị ọma na ogologo ụbọchị ọdụ ka ha mụta ihe site n’aka ya, Abù Ọma 34:11-14; I Pita 3:10, 11; Job 28:28

3. Chineke na-azọpụta ndị Ya site ná nsogbu na mkpagbu ọ bụla, ma ana-ekpochapụ ndị na-emebi iwu, Abù Ọma 34:15-22; 2 Ihe Emere 16:9; Abù Ọma 11:4-7

4. Devid kwuru okwu n’ụzọ amụma banyere ọnwụ Kraist, Abù Ọma 34:20; Jọn 19:35; Ọpupu 12:46; Ọnu-ọgugu 9:12

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Mnwapụta (Ọnwụnwa) niile nke Devid

Devid dere Abù Ọma nke a, nke anyị maara dịka nke iri atọ na anọ, iji cheta mgbe Chineke nápụtara ya n’ọnọdụ dị óké egwù. Devid agbapụworị n’ala nke aka ya gbagaa n’ala ndị Filistia n’ihi ịkpọas sitere n’ekworo nke Sọl nwere n’ebe ọ nọ. Ike na-agwụ Devid, ọ na-ada kwa mbà n’ihi mkpagbu ná-enweghị ọgwụgwụ nke Sọl; ná-enweghị olileanya ọ gbabara ná nchébe nke Abimelek (Ekish), eze Gat. Ndị Filistia bụ ndịiro ụmụ Israel, n’ihi na Chineke nyere Ụmụ Israel iwu ka ha busoo ndị Filistia agha rue mgbe aga-ekpochapụ ha. N’ihi nke a, Devid, bụ orù Chineke, itinye onwe-ya n’aka-ha, wee chọọ kwa inyeaka bụ itinye onwe ya n’óké ihe egwù. Ụdị omume dị otú a na-egosi ọnọdụ ọjọọ nke amakwaghị ihe aga-eme nke Devid hụrụ onwe ya nime ya -- nke mere na o kwere na ebere dị n’aka ndịiro Ụmụ Israel karịa ka ọ ga-adị n’aka Eze Sọl.

N’ụbọchị niile ahụ anwara okwukwe Devid n’ebe Chineke nọ nke ukwuu, mnwapụta ahụ dị kwa ukwuu mgbe ọ rọọrọ ụzọ ahụ ná-ezighịezi iji gbanarị nsogbu ya niile site n’ịchọ ebere n’aka ndị ná-emebiiwu. Akwụkwọnsọ na-ekwu na “obi-ebere nile nke ndi nēmebi iwu bu enwegh-obi-ebere” (Ilu 12:10).

N’ihi na Devid chọrọ ebe mgbaba n’ebe Eze ndị Gat nọ, ọ nụrụ na nzuzo mgbe ndị-agha ụfọdụ na-ekwu okwu banyere ya, nke a mere o ji tụọ egwù nke ukwuu n’ihi ndụ-ya. Ndị agha ndịa amataworị Devid dịka otù nime ndịiro ha akpọrọ as karịsịa. Devid abụrụwo onye amaara aha ya site n’ogbugbu nke o gburu Gọlaiat na ndị Filistia ọzọ; ya mere, mgbe ndịkom ụfọdụ ná ejere Abimelek ozi matara ya, Devid eleghịanya ịnata iruọma dị ukwuu n’aka ha. Ọnọdụ Devid bụ nke dị óké egwù nke mere na o mere onwe-ya dịka onye ná-awị ará. Eze ahụ nyere ndịkom ya iwu ka ha chụpụ Devid, wee si otú a mee ka Devid nwee ike iji ndụ-ya gbalaga.

Devid mụtara ihe, ma ọ dịghị ihe ọzọ, n’oge a; ma mgbe emesịrị, ka ọ na-atụgharị uche banyere óké nzọpụta nke Chineke nime arọ ndịa niile nke nsogbu, akpaliri mmụọ ya ikwu banyere ya.

N’oge niile nke óké nsogbu, mkpagbu nke imemmụọ, na izèndụ nke anụarụ, ọ na-ewe ntozu dị ukwuu nke imemmụọ na ntụkwasịobi n’ebe Chineke nọ, ịnọ nwayọ ná-écheré Chineke ka Ọ nápụta anyị nime nsogbu niile anyị. Site n’isiokwu nke Abù Ọma iri atọ na anọ anyị maara na okwukwe Devid n’ebe Chineke nọ na-adị elu ná-esi kwa ike karịa ka ọ dị na mbụ.

Échètarà Nzọpụta nke Chineke

Devid chètarà oge nsogbu a nke o nwere n’aka eze ndị Gat, cheta kwa omume nke nsogbu ya mere ya ka o mee. Mkpụrụobi ya aghaghị ịmataworị eziokwu nke okwu ahụ, na ewezuga na Chineke napụtara ya na ya ga-alaworị n’íyì. Isiokwu nke Abù Ọma iri atọ na anọ na-akọwa óké ịdịmma nke Chineke, ịdịukwuu Ya, nchébe ịhụn’anya Ya nye ndị nke Ya, na mkwà ịlan’iyi nke ekwere ndị ajọomume.

N’ụzọ ọ bụla Devid jiri mee ihe -- ma ọ dị mma ma ọ dị njọ, ma o sitere n’ọnọdụ enweghị olileanya ya maọbụ na ọ bụghị --Devid matara nkeọma na ihe niile ga-abụworị n’efu ma ọ bụrụ na Chineke enyereghị ya aka.

Devid akọwaghị otú o si mara na ọ bụ site n’inyeaka Chineke ka o ji nwee ike ịgbanarị ndị Filistia; otú ọ dị o kwenyesirị ike nime obi ya na ọ bụ Chineke zọpụtara ya. Ụdị mkwenye a nime nzọpụta nke nlekọta Chineke, ọ bụ ezie na ọ dịghị ihe pụtara ìhè banyere ya, bụ ezi okwukwe.

Ezigbo anya nke okwukwe na-ahụ aka nke Chineke ka ọ na-alụ ọlụ, ebe obi na akọnauche nke anụarụ apụghị ịhụ ihe-ngosi banyere Chineke maọlị. Anyị maara na nke a bụ eziokwu, ọ bụghị náánị site ná mnwapụta nke otù onye n’ụzọ Chineke si alụ ọlụ na ndụ ndị nke Ya, kama ọ bụ dịka Okwu Chineke si dị: “Okwukwe bu ndabere nke ihe anēle anya, buru kwa nnwaputa nke ihe anāhugh anya” (Ndi-Hibru 11:1).

Nlekọta nke Chineke

Devid na-agwa anyị na “mọ-ozi nke JEHOVA nāma ulo ikwu-Ya gburugburu ndi nātu egwù Ya, o we dọputa ha.” Ọ bụghị náánị na Ọ nọ anyị nso, kama Ọ na-ama kwa ụlọikwuu Ya gburugburu niile anyị, na-eji nchébe Ya gbaa anyị gburugburu.

Jisọs kwupụtakwara otù ihe ahụ mgbe O kwuru banyere nchébe nke Chineke nye Jerusalem, bụ ịhụn’anya na nchébe nke ha jụrụ. “Jerusalem, Jerusalem, nke nēgbu ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya! ọtutu mgbe òle ka M’chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọgh!” (Matiu 23:37). Moses gosirị ụdị nchébe nke Chineke dị otú a n’ebe ndị Ya nọ mgbe ọ bụrụ Abù Moses nye Israel: “Dika ugo nākpọte umu di n’akwu-ya, nērughari n’elu umu-ya, nāgbasa nkù-ya, nāghọrọ ha, nēbu ha n’elu nkù-ya: otú a JEHOVA, nání Ya, nēdu ya, ọ digh kwa chi ala ọzọ diyere ya” (Deuteronomi 32:11, 12).

Devid gara n’iru ịgbáama ná-akọwa nchébe na nlekọta nke Chineke mgbe ọ sịrị, “Ọ digh ihe nākọ ndi nātu egwù Ya”, na-eji kwa amaokwu a akwagide okwu ya, “nkpa akpawo umu ọdum, agu aguwo kwa ha ma ndi nāchọ JEHOVA, ọ digh ezi ihe ọ bula gākọ ha.” A na-ewere nwa ọdụm dịka eze ụmụanụmanụ. Ọdụm bụ otù nime anụ dịkarịsịrị ike n’etiti anụ niile ná-eri anụ ibe ya. Ha dị aghụghọ dị kwa garagara, ọtụtụ oge ka ha na-etigbu anụ ha na-eri n’otù ugbò. Ha bụ anụ jọgburu onwe-ha ná njọ nye ndị ná-achụ ntá, ihe niile ná-abịaru nso ebe obibi ha na-atụ kwa egwù. Ma ná-agbànyeghị ịdị ike ná emeghị ebere ha n’ịchụ ntá ihe ha ji ázù onwe ha, ọtụtụ ugbò ka agụụ na-emekpa ha arụ, ndụ ha e wee jupụta n’ịchụ ntá iheoriri mgbe niile iji dị ndụ.

N’eziokwu Devid na-echè banyere ndị omume ha na-adị ka nke ọdụm n’ụzọ dị icheiche. Ha nwekwara obiọjọọ dị kwa garagara, ná-enweghịkwa obiebere n’ọchịchọ ha nke ná-enweghị ọgwụgwụ iji nweta ike na urù niile nke ụwa. Devid kwuru eziokwu mgbe ọ sịrị na ná agbànyeghị ikpokọta àkù n’ụzọ ọjọọ ha, ha aghaghị ịnọgide n’ụkọ. Ihe nketa nke ndịiro nke Chineke bụ na ha ga-anọgide n’ịdọgbu onwe ha n’ọlụ ná-anọ kwa nime esemokwu na ibuagha mgbe niile ha n’ụwa nke jupụtara ná ndị ọjọọ dịka ha onwe ha. Ọ dịghị udo dịrị ndị ná-emebiiwu, ha dị ka óké osimiri nke ná-amagharị amagharị nke mmiri ya na-amapụta kwa ụrọ na apịtị (Lee Aisaia 57:20). Ọ bụghị otú ahụ ka ụmụ Chineke dị, n’ihi na “ndi nāchọ JEHOVA, ọ digh ezi ihe ọ bula gākọ ha.” A na-azù ụmụ Chineke nime nchèbe nke Chineke, nke eji ịhụn’anya Ya gbaa ogige, nke ná-eme ka ndịiro wee ghara ịbịaru ha nso, e wee mee ka ha nọdụ n’iriju afọ n’udo na n’ụba.

Egwù nke Onyenwe anyị

Devid matara na ya na-amù banyere egwù nke Onyenwe anyị, ná-amù kwa na Chineke na-elekọta ndị nke Ya. Eziokwu na àmàrà dị ukwuu nke Chineke dị ka iyi nke ná-egbu màràmàrà nime obi na ndụ nke Devid, nke mere ka ọ bụrụ ụdị mmadụ dị iche nke ọ bụ. Ya mere, dịka onyendú na onye nke Chineke e tere mmanụ ịbụ eze Israel, ọ ghọtara ọlụ ya n’ịgwa ndị ọzọ banyere nzọpụta ukwuu nke Chineke.

Eleghịanya Devid na-ezi ụmụntakịrị ihe dịka ọ na-egosi n’Abù Ọma nke a, ma o nwere ike bụrụ na ọ chịkọtara ndị ya wee gwa ha okwu n’ụzọ dị mfé n’ịghọta dịka okwu nke Jisọs mgbe Ọ na-ezi ndị náesoụzọ Ya ihe banyere iheomimi nke Alaeze Chineke, “Ọ buru na unu echègharigh, bia dika umu-ntakiri, unu agagh-aba n’ala-eze elu-igwe ma-ọli” (Matiu 18:3).

Nzọpụta Ekwere ná Mkwà

Devid kwuru banyere ihe nke ga-eme, nke bụ nghọta ya banyere ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-ewetara onwe Ya ihe ịchụàjà n’ihi mmehie nke mmadụ. Mkwupụta nke Devid sị “Ọ nēdebe ọkpukpu-ya nile: ọ digh otù nime ha nyajiri anyaji”, na-ekwu banyere ezi Nwaatụrụ ọchụchụàjà ahụ. Otù ihe ana-aghaghị ịma banyere mkwadobe na oriri nke atụrụ Ngabiga ahụ bụ na ọ dịghị otù ọkpụkpụ ya aga anyaji anyaji. Emezuru nke a n’ụzọ pụrụ ichè ná mkpọgide n’obe na ọnwụ nke Kraist. Ọ bụ omen’ala nke ndị Rom ịnyajisi ụkwụ nke ndị akpọgidere n’obe, ime ka ha nwụọ ọsọsọ. Omume dị otú a ka emesoro ndịori abụọ ahụ akpọgidere ha na Kraist n’obe; ma ndị Rom, mgbe ha hụrụ na Kraist anwụworị, ányajighị ọkpụkpụ ọ bụla n’arụ Ya.

Chineke kpaliri mmụọ nke Devid ikwu banyere Ngabiga ahụ, dịka mkwà nke amụma nke Jisọs Kraist, onye aga-eme ihe ihere dị icheiche, ma n’ikpeazụ, Ọ nwụọ ọnwụ n’aka ndịiro Ya. Otú ọ dị, Chineke ga-eme ka O si n’ọnwụ bilie, buli kwa Ya elu n’ọnọdụ dị ukwuu nke otuto. Mgbe Devid chèghachịrị échìchè azụ ná mmekpáarụ ya ụfọdụ, ọ matara na ọ dịwo mgbe ọ hụrụ ahụhụ ma Chineke napụtara ya ná-enweghị mmeruarụ. Ọ bụ ezie na Devid achọghị iwere ahụhụ-ya niile tụnyere nke Onyenwe Ya, ma o nwere obi jupụtara n’ekele n’ihi nnapụta ukwuu nke Chineke nápụtara ya. Mgbe ahụ Devid, site n’obi nke jupụtara n’ekele nye Chineke, weere okwu ndịa dị mma mechie Abù Ọma ya, “JEHOVA nāgbaputa nkpuru-obi ndi-orù-Ya: Agagh ama kwa ha ikpé bú ndi nile nāgbaba nime Ya.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị kpalirị Devid ide Abù Ọma nke a?
  2. Gịnị mere Devid ji tụọ ndị Filistia egwù?
  3. Òlee otú Chineke si nápụta Devid n’aka ndị Filistia?
  4. Òlee ndị bụ ụmụntakịrị ahụ Devid na-ezi ihe?
  5. Òlee ụzọ esi kwue maka Kraist nime Abù Ọma a?
  6. N’ụzọ dị añaa ka Devid ji gụnye onwe-ya dịka onye náeso Kraist ahụkọ ahụhụ?