Abù Ọma 103:1-22

Lesson 227 - Senior

Memory Verse
“Dika nna si enwe obi-ebere n’aru umu-ya, Otú a ka JEHOVA nwere obi-ebere n’aru ndi nātu egwù Ya” (Abù Ọma 103:13).
Cross References

I Okwu Mmeghe ahụ eji nye Iwu ka Agọzie Chineke

1. Onye Odeabù ahụ kwuru banyere ọlụ nke itó Jehova, Abù Ọma 103:1, 2; Deuteronomi 8:10, 18; Luk 19:40

2. Akọwapụtara ihe mere Chineke jiri kwesị ka ụmụmmadụ ná-enye Ya otuto, Abù Ọma 103:3-6; 130:4; Matiu 1:21; Luk 9:56; I Pita 2:9

II Iruọma niile A na-ekwesịghị Ịnata

1. Chineke kpughere Onwe-ya nye Moses n’Ugwu Sainai, gosikwa, Ụmụ Israel Onwe Ya site n’Iwu ahụ, Abù Ọma 103:7; Deuteronomi 4:8-14; Daniel 2:22; Jọn 1:17; Ndi Hibru 1:1-3

2. Ebere bụ ihe mbụ eji mara Chineke, dịka mmadụ niile ndị bịakutere Ya n’obi nchègharị hụworo, Abù Ọma 103:8-12; 108:4; Abù Akwa 3:22, 23; Joel 2:12-14; Taitọs 3:5

3. Ndụ mmadụ dị óké mkpụmkpụ ma Chineke maara otú akpụworo anyị, Abù Ọma 89:48; Aisaia 40:6, 7; Ndi Hibru 9:27; Jemes 4:14

4. Ihenzuzo nke ndụ ebighịebi dị n’idebe Okwu Chineke, Abù Ọma 103:17, 18; Aisaia 1:19; Jọn 8:31, 32; 14:23

III Eze nke Ụwa niile

1. Devid kpọrọ ọbụná ndị mmụọozi ka ha soro nime ngọzi a nye Chineke, Onye alaeze Ya na-achị ihe niile, Abù Ọma 103:19, 20; I Ihe Emere 29:11; Aisaia 6:2, 3

2. •sù niile nke Eluigwe ka akpọrọ, ma n’ikpeazụ Onye odeabù kwalitere onwe ya ọzọ, ịgọzi Onyenwe anyị, Abù Ọma 103:21, 22

Notes
NKỌWA DỊ ICHE ICHE

Ọ dị mgbe ụfọdụ ná ndụ onye ọ bụla na-efè ezi Chineke dị ndụ, mgbe ịdịukwuu, ịdịelu, na ịmamma nke ebube Chineke na-adị ka ana-ewebata ha ọhụụ nime obi site ná njubiga ókè nke ịmamma ya. Onye Odeabù a dị ka o nwere mkpali nke imemmụọ mgbe o dere okwu dị icheiche nke Abù Ọma 103. Isiokwu nke ozi a bụ na Onyenwe anyị Chineke dị elu ná-adịkwa ebighịebi, na ndụ nke mmadụ dị ala ná akwụ kwa éfèké èfè, ma Chineke nọ n’elu mazuru mmadụ na ụzọ ya niile. Échìchè a mere ka odeakwụkwọ a nke nwere mkpali nke mmụọ, wee site ná nghọta ya niile, kpọkwa ndị mmụọozi na ùsù niile nke Eluigwe, iwebata otuto na ngọzi nye Chineke nke ahụ kwesịrị ịbụ Onye Òkìkè na Eze ahụ ná-enweghị àtù nke Ọ bụ.

Otuto nke A naanara nkeọma

Ajọ mmadụ site n’ajọ obi ya apụghị inye Chineke otuto kwesịrị ekwesị, “N’ihi na ọnu-ya nēkwu okwu site n’ihe nke obi nwebigara ókè” (Luk 6:45); ma amara Chineke pụrụ ịgbanwe obi nke onye ajọomume. O nwere mgbe onye dere Abù Ọma a nwere ajọobi, ma o kpere ekpere rue mgbe ọ natara mgbaghara mmehie (Abù Ọma 32:5); ya mere ọ pụrụ isite ná njubiga ókè nke obi ọhụụ ya wepụta otuto nke Jehova ga-anabata. Ọtụtụ mgbe ka eze ukwuu a nke Israel na-arapụ ọchịchọ nke aka ya wee ná-enye Chineke ya otuto! Mmadụ itó Onye kèrè ya na-eme ka ezi njikọ ọnụ dị n’etiti ha abụọ nke ná-etinye ike ná-enweghị àtù n’ọnọdụ onye ahụ. Ihenzuzo nke ike onye nke Kraist taa dị n’inye Chineke nke dị ndù otuto na ngọzị nke sitere n’obi anyị pụta n’ihi ebere na ịhụn’anya Ya nye ụmụmmadụ. Ọ bụrụ na mmadụ elezighịanya inye Chineke otuto, ọ gaghị adị anya mgbe aga-echèzọ mmeso ọma Ya niile. Abù ụtọ ahụ na-adụ Onye Kraist ọdụ, sị “Gukọ ngọzi gi, kpọ ha otù otù.”

Mgbaghara maka Ajọomume niile

Onye odeabù ahụ wepụtara n’otù n’otù ihe mere na mmadụ aghaghị inye Chineke otuto, ma fèè kwa Ya òfùfè. Eburu ụzọ kwue ihe banyere mgbaghara mmehie, n’ihi na ọ bụ mmehie na-ewezuga ngọzi Chineke ná ndụ mmadụ. Mmehie na-eweta ọnwụ dịka ụgwọọlụ nye onye ikpé mara, ma Chineke na-agbaghara ajọomume niile nke ndị ná-abịakute Ya.

Ọgwụgwọ Nsọ

Ihe nke abụọ mere anyị ji ná ètò Chineke bụ na Ọ na-agwọ ụdị nrịarịa niile. Ọ bụrụ na dibịa nke ụwa nwere ike dị otú a, aha ya, ọ gaghị abụ ihe ana-ebuli elu? ọbụná ndị nwere mmasị, hà agaghị ejekwuru ya ka ọ gwọọ ọrịa ha? Ma Chineke adịghị agbanwe, O nwekwara ike ebube ịgwọ nrịarịa niile n’ụbọchị taa nke ndị ná-abịakute Ya. Ọkpara Chineke gwọrọ ndị niile bịakutere Ya, ma anyị na-agụ sị, “Jisus Kraist di otù aka ahu unyahuru na ta, e, ru kwa mgbe nile ebigh-ebi” (Ndi Hibru 13:8). Gịnị mere ndị ọrịa niile nke ụwa adịghị abịakute Ya? Mmehie ha na-akpa ókè n’etiti ha na Chineke. Mgbe ụmụmmadụ jikeere ichègharị ná mmehie niile ha, ọtụtụ mgbe ha na-ahụ na ike Chineke nọ nso ịgwọ ọrịa ha niile. Mkwà nke Chineke nye Ụmụ Israel bụ: “Ọ buru na i ge nti nke-ọma n’olu JEHOVA, bú Chineke gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n’anya-Ya, ọ buru kwa na i ña nti n’ihe Ọ nyere n’iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ digh ọria ọ bula nke M’tiyere n’aru ndi Ijipt M’gētiye n’aru gi: n’ihi na Mu onwem bu JEHOVA nke nēme ka aru di gi nma” (Ọpupu 15:26).

Ụfọdụ mmadụ pụrụ ikwu na Onye odeabù ahụ, nime Abù Ọma 103, na-atù aka n’ọgwụgwọ nke imemmụọ nke ụmụmmadụ, ma Aisaia na-ewere otù isiokwu ahụ mgbe ọ na-ede banyere Mesaia ahụ sị, “Ma ya onwe-ya bu onye amapúworo site ná njehie nile nke ayi, onye azọpiaworo site n’ajọ omume nile nke ayi: ahuhu-mmehie nke udo-ayi di n’aru ya; ọ bu kwa ubiri-utari-ya ka ejiri me ka aru-ayi di ike” (Aisaia 53:5). Mmụọ Chineke gwara anyị site n’ọnụ Matiu na Jisọs gwọrọ ndị niile arụ ná-adịghị ike n’imezu amụma niile eburu (Matiu 8:16, 17). Ahụrụ n’ebe a na Jisọs, ọ bụghị náánị na ọ chụrụ àjà nke mkpuchi mmehie, kama àjà ahụ dịkwara ịgwọ ọrịa.

Ọrịa sitere ná mmehie, ma otù Ọbara ahụ nke awụsịrị n’ihi mgbaghara mmehie nwere ike iwepụ ọrịa. Gịnị mere na mmadụ agaghị atụkwasị Chineke obi n’ịgwọ ha ọrịa ma nye kwa Ya otuto mgbe Ọ gwọrọ ha?

“Ezi Ihe nile”

“Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi.” Okwu a karịrị ihe oriri niile nke ụmụ mmadụ ji azù onwe ha kwa-ụbọchị. Job metụrụ isiokwu nke iheọmùmù a aka, “Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm” (Job 23:12). Ihe oriri nke ndụ a dị mkpà ma Chineke ekwewo mkwà na ụmụ Ya agaghị anọ n’ụkọ ihe dị icheiche nke ná-akpà ndụ ha. “Onye ahụ gēbi n’ebe di elu: ebe ewusiri ike nke nkume di elu ka ulo-elu-ya gābu: anēnye ya nri-ya; miri-ya kwesiri ntukwasi-obi” (Aisaia 33:16). Ma nri nke Eluigwe dị, nke dịkarịsịrị mkpà nye obi anyị. Nri nke anụarù na-edebe anyị ndụ ma mkpụrụobi aghaghị inweta nri ya site na Chineke. E nyere okwu Chineke n’ihi nke a: ọ bụ nri nke mkpụrụobi. Ndị ha na Jisọs na-anọdụ ná nri na-eriju afọ nwee kwa nke ha ga-enye ndị ọzọ: “Mu onwem bụ nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agagh-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agagh-akpọ ya nku ma-ọli mgbe ọ bula” (Jọn 6:35). Onye Odeabù kwuru na iri ezi ihe niile nke Chineke na-eme ka nwaokorọbịa dị ọhụụ. O weere ùgò mee ihe àtù, eleghịanya n’ihi na ọ bụ anụufe nke ná-ebi ogologo ndụ. Amawo ùgò dịka anụufe na-adị ndụ rue narị arọ (100); ọbụná n’oge a, abụba ùgò nke ochie na-adapụsị nke ọhụụ ewee pute kwa, wee mee ugo ahụ ka o yie kwa nwa-ugo. Mkpụrụobi nke onye ná-atụkwasị Chineke obi adịghị eme ochie. Arụ pụrụ ịnwụanwụ wee gabiga, ma mkpụrụobi ahụ na-alakwuru Chineke Onye kèrè ya. N’ụtụtụ mbiliten’ọnwụ, mkpụrụobi na arụ nke si n’ọnwụ bilie nke yiriworo ebube ga-ejikọ ọnụ ọzọ ibinyere Onyenwe anyị mgbe niile (I Ndi-Tesalọnaika 4:16, 17). Olileanya onye nke Kraist bụ olileanya ná-adịghị ada-àdà.

Ọlụebere Dị icheiche

Mgbe Devid gụkọrọ ụfọdụ nime ngọzị nke ọ natara n’aka Chineke, o lebakwara anya nime ngọzi nke ndị ọzọ natara. Ọ bụụrụ ya ihe dị ebube na nime eziomume ka Chineke na-ekpepụta ndị ana-akpagbu. Nke a bụ ihe dị iche nime ndụ ụmụmmadụ, n’ihi na ndị dị ike na-anya isi n’ịkpagbu ndị ná-adịghị ike. Nke a bụ eziokwu dịka o mere n’oge Devid, ọtụtụ mgbe ka ọ na-anapụta ndị ana-akpagbu n’aka ndị ná-akpagbu ha. N’ịtụgharị uche na Chineke na-anọnyere ndị ana-akpagbu wetaara Devid óké ọñụ. Ndị nke Kraist n’ọgbọ niile agọziwo Chineke n’ihi otù ihe ahụ. “Ọ bu kwa ihe nādigh ike nke ụwa ka Chineke rọputara, ka Ọ we me ka ihere me ihe di ike” (I Ndi-Kọrint 1:27). Ndị dị ike nke ụwa nke a na-enwekarị nganga n’obi ha, ná-añaghị ntị òkù nke Oziọma, onwe-ha juru ha afọ, nke mere na ha adịghị achọ inye aka site n’ebe Chineke nọ. Ndị ana-akpagbu matara na ha chọrọ onye nnapụta, ha wee chọta Chineke nke Eluigwe ịbụrụ ha onye-nnapụta. Nke a ọ bụghị ihe kwesịrị ịkpali onye ọ bụla itò Chineke na ifè Ya òfùfè?

Ịhụn’anya nke Chineke

Onye dere Abù Ọma gara n’iru ná-akọwa na eziomume nke Chineke, ikpé na mkpughe na-esite n’ihe anọ ọzọ eji mara Ya: “JEHOVA nwere obi-ebere, nēme kwa amara, Ọ digh-ewe iwe ọsọsọ, Ọ nāba kwa uba n’ebere.” Ọtụtụ mgbe ọ na-adị mmadụ ike ịghọta eziomume ndịa dị nime Chineke. Ụfọdụ mmadụ ga-asị, “Ọ bụrụ na Chineke na-achị ụwa niile nwee kwa ike dị ka anyị kwere na O nwere, gịnị mere mmehie niile a na ajọomume ji jupụta n’ụwa?” Chineke emewo ihe banyere mmehie, Ọ ga-eme kwa karịa. Chineke na-anagide mmehie n’ụwa náánị ka onyemmehie wee nwee ohere ichègharị. Ònye pụrụ ịdị ndụ ọ bụrụ na Chineke na-eweta ikpé n’otù ntabianya megide mmehie na nnupụisi ọ bụla? Nime mmehie ka amụrụ mmadụ niile, ya mere ha aghaghị inwe ndụ ọhụụ ka ha wee nwee ike ibi ndụ karịa mmehie. Àmàrà, ogologontachịobi na ebere nke Chineke bụ ihe ná-adị n’etiti oge mmadụ maara ihe bụ mmehie na oge nchègharị ya.

Ọ bụ ịhụn’anya dị nrò ka Chineke ji elekwasị obi ụmụmmadụ anya. Ihe dị anyị nso karịa iji tụnyere ịhụn’anya Chineke bụ ịhụn’anya nna n’ebe ụmụ ya nọ. Dịka nna si ezi ụmụ ya amamihe, dịka nna si enwe ntachiobi n’ebe nwa ya nke mehiere ya nọ, ná-agbaghara kwa ya mgbe o chègharịrị, dịka nna si eleta nwa ya nke nọ n’ọrịa, otú a ka Nna nke Eluigwe si egbò mkpà niile nke ndị ná-atụ egwù Ya. Chineke maara otú akpụworo mmadụ ma ná-echeta kwa na ha bụ ájá. Ọ na-echeta na ndụ mmadụ dị mkpụmkpụ. Onye dere Abù Ọma ji okokoosisi ọhịa tụnyere ndụ anyị n’anya Chineke. Okokoosisi na-amamma ile anya taa ma n’echi ya ọ pụrụ ịkpọnwụ wee gabiga; otú a ka ndụ mmadụ dị n’anya Chineke, ma mkpụrụobi na-adị ndụ rue mgbe ebighịebi.

Gịnị ka olileanya mmadụ ga-abụworị ma ewezuga ịhụn’anya Chineke, Onye ebere Ya na-esi na mgbe ebighịebi rue mgbe ebighịebi n’arụ ndị ná-atụ egwù Ya. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị ná ndụ mmadụ kwesịrị ịnata ịhụn’anya Chineke; ma ndị ga-échègharị bịakute Ya, Ọ gaghị emeso ha dịka mmehie ha si dị. Ebere na-añụrị megide ikpé dịka Eluigwe si dị elu karịa ụwa. Mgbe Chineke bupụworo njehie niile nke mmadụ ha abụrụwo ihe gabigara ebighịebi -- “dika iru-anyanwu si di anya n’ọdịda-anyanwụ.” Ebere Chineke dị mma karịa ndụ; n’ihi na ndụ na-agabiga, ma ebere Chineke na-adị rue mgbe ebighịebi. Ebe Devid na-atụgharị uche banyere ebere Chineke niile ndịa, ọ bụ ihe ijuanya na ọ kpọrọ ndị mmadụ ka ha fèè Chineke-ya òfùfè? Ọ bụrụ na mmadụ niile ga-anabata okwu ndịa n’obi ha, ha ga-eso Devid n’itò na n’igọzi Chineke.

Ọlụ Ịhụn’anya

Eleghịanya Devid nwebigara ọñụ ókè ebe ọ gụnyere ndịozi Chineke ka ha sonye n’itò Chineke; ọ bụghị na ha chọrọ ụgwọọlụ banyere ọlụ ịhụn’anya ha, kama ka ha wee gosi ụwa na Chineke kwesịrị otuto dị otú a. Otuto niile nke ndị bi n’ụwa, na otuto niile nke ndị bi n’Eluigwe agaghị egbochi Devid inye Chineke otuto. Otú o si malite Abù Ọma a ka o si mechie ya, “Gozie JEHOVA nkpuru-obim”; ọ nọgidere n’inye Chineke otuto rue ọgwụgwụ ndụ ya. Ọ bụ ihe dị ebube inwe obi nke ná-enye Chineke otuto nke Ọ na-anara ; ọ dịghị ihe ọ bụla ná-eweta ngọzị ná ndụ mmadụ ọsọsọ dịka inwe obi otuto na ekele banyere obiọma na ebere-Ya ná-adịghị agwụagwụ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee nkọwa niile kachasị mkpà nke onye dere Abù Ọma kwupụtara kwesịrị iji nye Chineke otuto?
  2. Gịnị ka okwu a pụtara, “Onye nēwere ezi ihe me ka afọ ju ọnu-gi”?
  3. Gịnị bụ urù ana-enweta site n’iri “ezi ihe” nke Chineke?
  4. Òlee otú Chineke si akwụghachị ndị ana-akpagbu ụgwọ ọlụ ma ọ bụrụ na ha atụkwasị Ya obi?
  5. N’ụzọ dị añaa ka Chineke si mee ka Moses na Ụmụ Israel mara Ya?
  6. Kọwaa otù nime ụzọ niile nke Chineke si egosi ụmụ mmadụ ebere Ya.
  7. Gịnị na-abụ ọnọdụ nke mmehie niile nke mmadụ mgbe o siri nime ha chègharịa?
  8. Òlee otú onye dere Abù Ọma si kọwaa ịdị mkpụmkpụ nke ndụ mmadụ n’eluụwa?
  9. Ònye na-anata ebere n’aka Chineke?