Ilu 31:10-31

Lesson 228 - Senior

Memory Verse
“Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: ma nwayi nke nātu egwù JEHOVA, nwayi ahu gēnwe otuto” (Ilu 31:30).
Cross References

I Ntozuòkè na Ihe dị icheiche eji mara Nwanyị Anáalụ Ọhụụ nke Kraist

1. Nke dị ụkọ, dị kwa óké ọnụahịa n’ịdịmma, Ilu 31:10; Aisaia 62:3; Deuteronomi 32:10; Luk 12:32; 18:8

2. O kwesịrị nchèkwube, Ilu 31:11; 2 Ndi Eze 12:15; 2 Ihe-Emere 34:11, 12; Nehemaia 7:2; Daniel 6:4; I Ndi Kọrint 4:2; Nkpughe 17:14

3. O kwesịrị ntụkwasịobi n’ihe ọ bụla dị mma, Ilu 31:12; Luk 19:17; Ndi Hibru 3:5; Nkpughe 2:10

4. Ọ dị ike n’ọlụ, ná-eji obi ya niile, tinyeuchu n’ọlụ, Ilu 31:13, 24; Ndi Rom 12:11; I Ndi Kọrint 4:10-12

5. Ọ na-enweta ike site n’ebe Chineke nọ, Ilu 31:14; Ọpupu 15:2; Abù Ọma 46:1; 73:26; 84:5; 89:21

6. Ịdịike n’ọlụ n’ebe Chineke na mmadụ nọ, Ilu 31:15; 22:29; Ndi Rom 12:6-8; Ndi Hibru 6:10-12

7. Ilepụ anya n’ọdị-n’iru, Ilu 31:16; Ndi Hibru 11:8-16

8. Ná-eyi iheagha nke imemmụọ, Ilu 31:17; 2 Ndi Kọrint 6:7; 10:4; Nkpughe 19:7; Ndi Efesọs 6:13-17; I Ndi Tesalọnaika 5:8

9. Inwe ezi nghọta nke Okwu Chineke, Ilu 31:18; I Ndi Kọrint 2:9-16; Jemes 1:22-25

10. Ịmụanya na ichenché maka ọbịbịa nke Onyenwe ya, Ilu 31:18; I Ndi Tesalọnaika 5:8; Matiu 25:1, 4-7, 9, 10

11. Ijupụta n’ịhụn’anya na ezi échìchè banyere ndị ọzọ, Ilu 31:19, 20; I Jọn 3:16, 17; 2 Pita 1:7; Jemes 1:27; Aisaia 58:6, 7; Ọlu Ndi-ozi 20:35; Ndi Rom 15:1; Ndi Galetia 6:2; I Pita 3:8

12. Inwe ntụkwasịobi na Chineke, Ilu 31:21; Abù Ọma 3:6; 20:7; 23:4

13. Iyikwasị uwe nke eziomume, Ilu 31:22; Job 29:14; Nkpughe 3:5; 7:14; 19:8; 21:2; Luk 15:22; Aisaia 61:10; Zekaraia 3:4

14. Ibi-ndụ nye Di-ya; Ọchịchọ ya dị kwa n’ebe Ọ nọ, Ilu 31:23; Ndi Rom 7:4; 2 Ndi Kọrint 11:2; Nkpughe 19:7; Luk 14:33

15. Ịdịmma nke Chineke dị nime ya, Ilu 31:25; Ndi Efesọs 5:23-27

16. Ná-enwe olileanya ebighịebi, Ilu 31:25; I Ndi Kọrint 15:19, 49-54; I Ndi Tesalọnaika 4:13-18

17. O jupụtara ná mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ, Ilu 31:26; 2 Pita 1:5-8; Ndi Galetia 5:22, 23

18. Ọ na-ezisa Oziọma nye ndị ná anọghị nime Kraist ma ná-eje kwa ozi nye ndị nọ nime Kraist, Ilu 31:27; Nkpughe 22:17; 2 Timọti 4:1-5; I Pita 5:2-4

19. Ọ na-enwe mkwagide nke Chineke na mmadụ, Ilu 31:28; Ndi Rom 8:16; Ndi Galetia 4:6, 7; Aisaia 62:5

20. Ọ na-ebi ndụ nke ana-apụghị ịta ụta, Ilu 31:29; 2 Pita 3:14; 2 Ndi Kọrint 6:3; I Timọti 4:12; Taitọs 2:7, 8

21. Ọ dabereghị n’ọlụ nke aka ya maka nzọpụta ya, Ilu 31:30; Ndi Rom 3:20; 11:6; Ndi Galetia 2:16; Ndi Efesọs 2:8, 9; Taitọs 3:4, 5

22. O nwezuru ihe niile aga-eji mata na ọ bụ Onye Kraist, Ilu 31:31; Jọn 15:1-16; Ndi Kọlọsi 1:10; Ndi Filipai 1:11

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nye Ụbọchị ndị Nne nke arọ a arọpụtara ihemmụta anyị site n’akwụkwọ Ilu isi nke iri atọ na otù. A jụrụ ajụjụ a, “Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọpụta ya?” Ihe eji amata nwanyị nke ná-ejide onwe-ya nkeọma ka edepụtara n’amaokwu ndịa. Amaokwu ndịa na-egosi omume nwanyị nwere ezi ùgwù. Ụwa a ga-abụworị ebe obibi dị ebube ma ọ bụrụ na ndị nne niile wetara ndụ ha rue ọnọdụ dị otú a edepụtara n’amaokwu ndịa.

Otù onye odeakwụkwọ amaara aha ya na mgbe garaaga kwuru na nne Jọn na Charles Wesley mezuru okwu ndịa dị n’Akwụkwọnsọ. O lebara anya n’usoro ndụ ya site n’ọmụmụ ya wee rue n’ọnwụ ya ọ dịghị ụmụ ndịnyom nke mmadụ mụrụ eji atụnyere ya.

N’ọgbọ anyị, anyị maara otù nwanyị nke ndụ ya dị elu karịa ndị nne nke ụbọchị anyị. Nwanyị ahụ bụ Florence L. Crawford, onye malitere ọlụ Apostolic Faith. Ndụ ya dịka nne na onyendú bụ ihe dị elu na ihenlereanya nye ndị nne nke ụbọchị taa. Ilu isi nke iri atọ na otù bụ ebe ná-adịkarị ya mma n’Akwụkwọnsọ. O jikarịrị ya kwusaa ma kụzi kwa banyere Nwanyị ahụ anáalụ Ọhụụ nke Kraist.

Eji ọnọdụ a dị elu nke dị n’isiokwu a tụnyere otù nwanyị; anyị kwenyekwara na ihe nkọwa ya nime mmụọ na-ekwu banyere Nwunye Ọhụụ nke Kraist, nke bụ ndịkom na ndịnyom.

Ọmụmụ Ọhụụ

Ihe mbụ nwanyị na-ejide onwe ya nkeọma ga-enweta iji bụrụ Nwunye Ọhụụ nke Kraist, bụ ọmụmụ ọhụụ nke bụ mgbe eji Ọbara Jisọs sachapụ mmehie nke obi ahụ. Mmụọ nke Chineke na-atụte mkpụrụobi ná-eme kwa ka ọ dị ndụ. Nke a karịrị nnọọ inwe mkpebi ifè Kraist. Nke a karịrị ime omume ọhụụ nke anụarụ. Ọ bụ ihe anwapụtaworo nime obi site n’Ọbara Jisọs. Mmehie e wee pụọ, ndụ ọhụụ e wee malite. Ewezuga mnwapụta nke ọmụmụ ọhụụ mmehie gana-achị ndụ ahụ, ibi ndụ ahụ dị elu dịka edepụtaworo ya n’isiokwu a ga-abụ ihe ana-apụghị ime. Mgbe ebibiri mmehie, mee kwa ka mkpụrụobi dị ọcha, mkpụrụobi ahụ e wee malite ịga n’iru n’ihe ana achọsiike niile nke ọkpụkpọòkù dị elu nke Chineke nime Kraist Jisọs.

Ịdịmma nke Imemmụọ

Pita na-enye anyị ndumọdu ụfọdụ otú anyị ga-esi nweta ịdịmma niile ndịa. “Dika ike o ji buru Chineke nyeworo n’aka ayi ihe nile diri ndu na nsọpuru Chineke n’efu, site ná nmazù nke Onye ahu Onye ji ebube na idi-nma nke aka-Ya kpọ ayi; bú nke O siteworo nye n’aka ayi nkwa nile ahu di oké ọnu-ahia di kwa uku ri nne; ka unu we site n’ihe ndia ghọ ndi nēnwekọ ihe O ji buru Chineke, ebe unu gbanari-woro nmebi nke di n’uwa site n’agu ihe ọjọ. Ma n’ihi otù ihe a n’akuku unu tukwasi-nu inu-ọku-n’obi nile, nyezu-kwa-nu idi-nma n’okwukwe-unu; nyezu-kwa ihe-ọmuma n’idi-nma unu; nyezu-kwa ijisi-onwe-unu-ike n’ihe-ọmuma unu; nyezu-kwa ntachi-obi n’ijisi-onwe-unu-ike; nyezu-kwa nsọpuru-Chineke nime ntachi-obi-unu; nyezu-kwa ihu-n’anya umu-nna nime nsọpuru-Chineke-unu; nyezu-kwa ihu-n’anya nime ihu-n’anya umu-nna-unu” (2 Pita 1:3-7).

Ikwesị Ntụkwasịobi

“Obi di-ya atukwasiwo ya obi.” Ikwesị ntụkwasịobi bụ ịdịmma nke dị ụkọ n’oge ugbu a. N’agha nke ụwa garaaga ọtụtụ ndịkom anyị gara mba ọzọ ịlụ agha maka obodo anyị, latara ná-ahụ na nwunye ha esorowo ndịkom ọzọ. Nwanyị anáalụ ọhụụ nke Kraist kwesịrị ntụkwasịobi. Ọbụná asị na Jisọs anọọ ọdụ ịbịa, nwunye Ya ga-anọgide n’ikwesị ntụkwasịobi. Ọ gaghị enwe ihe-mmeru ọ bụla.

Iji Obi niile Ná Alụọlụ

“Ọ chọwo aji-anu na flax, we nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ.” Nwanyị anáalụ ọhụụ nke Kraist agaghị abụ onye umengwụ maọli. Pọl na-akpá ákwà ụlọikwuu iji nyere onwe-ya na ndị ya na ha na-alụkọ ọlụ aka. Ka ọ na alụọlụ ọ na-ekwusa kwa Kraist nye ndị ahụ ná-ekpere arụsị.

Ọtụtụ ndị nsọ anyị na-alụọlụ site n’ụtụtụ rue anyasị wee jikere ịga ịgbasa Oziọma n’ama ka ha wee nwee ohere ịkọ akụkọ banyere Jisọs nye ndịijè ná-agafe n’ụzọ. Nime ọlụ niile anyị otù ịnụọkụn’obi ahụ ka apụrụ ịhụ. Ndị abù anyị naalụ ọlụ ogologo oge niile nke ụbọchị, ma n’anyasị ha na-eji talent ha ikwusa Oziọma n’ịbụabù na n’ịkpọụbọ, nke bụ onyinye afọ ofufo nye Jehova. Mgbe ụgbọ mmiri Oziọma anyị nke ana-akpọ “Lower Light” na-apụ ịgbasa Oziọma ya na ndị ọlụ ná ejere Chineke ozi, onye ọ bụla nime ha naalụ ọlụ. O nweghị ndị ná-anọ ná alụghị ọlụ nime ụgbọ. Ọtụtụ ụzọ ọlụ ọzọ dị kwa nke ndị Kraist ji obi-ha niile náalụ ọlụ ná-anọchị. Ha na-eleta ndị arụ ná-adịghị ike, ha na-ekwu okwu ịgbàume, ana-ede mpempe akwụkwọ Oziọma nke eji aka ná-ekesa maọbụ ná-eziga n’ebe dị icheiche, ana-elezi ụlọ nzụkọ Kraist anya nkeọma ka o wee dị ọcha n’anya ịbata, ndịa bụ olenaole nime ọtụtụ ọlụ ụmụ Chineke na-alụ.

“Ọ di ka ugbọ onye-ahia; site n’ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya.” Ọ na-eri Nri sitere n’Eluigwe. Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya otù ụbọchị na Ya onwe Ya nwere iheoriri Ya ga-eri nke ha onwe ha ná-amataghị. Mgbe ndị náesoụzọ Ya jere ịzụ nri ha ga-eri, Ọ nọdụrụ ala n’ụzọ ólùlùmmiri Jekob wee gwa obi ahụ akpịrị na-akpọ nkụ banyere Mmiri nke Ndụ ahụ.

Mmadụ ahụ nke ná-esite n’Eluigwe enweta nri nke mmụọ ya na-enwe njikere n’oge ehihie maọbụ abalị ijé leta ndị arụ ná-adịghị ike, ndị ogbenye, ma ndị nọ ná mkpà ọ bụla ọzọ. “Achọputawo okwu-Gi, m’we rie ha.” (Jeremaia 15:16).

Ubi Náamị Mkpụrụ nkeọma

Nwanyị Anaalụ Ọhụụ nke Kraist na-elezi anya mgbe dum ịchọpụta ubi ga-amịta mkpụrụ nkeọma n’ihi Oziọma. Mgbe ọ chọpụtara ala ga-amịta ihe nkeọma, ọ tụlee ubi ahụ wee zụta ya. Ọ na-akpa uwe ákwà ọcha na-ere ya ka o wee nwee ego ịzụta ubi ahụ na-amịta mkpụrụ nkeọma. O wee gaa ọlụ ịkụ ubivine. Ọ na-alụsi ọlụ ike na-adaghị mbà n’iwu nzukọ Kraist na ime ka Oziọma guzosie ike nime ubi ahụ na-amị mkpụrụ nkeọma. O ji ihe ókìkè nke ike kee onwe-ya n’úkwù; ọbụná ma asị na onyeiro ga-abịa dịka óké ijummiri, o nwere ike nke ọ ga-eji guzogide ike niile nke ọkụ alammụọ.

Ajọ Ifufe nke Mmekpàárù

“Ọ digh atù egwù snow, na ọ gēme ulo-ya ihe; n’ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie.” Ajọ ifufe pụrụ ifé, ihe ọjọọ pụrụ ime kwa ma ọ nwere njikere n’ihi ha. Ọ na-ewusi okwukwe-ya ike mgbe niile iguzogide nsogbu niile siri ike nke ndụ. O nweghị egwù ọ bụla dị n’obi ya. Ọ pụrụ ịbụ abù na mgbe abalị; n’ihi na ọ matara na ihe niile na-alụkọ ọlụ iwetara ndị hụrụ Chineke n’anya ezi ihe.

Amamihe na Obiọma

“Ọnu-ya ka ọ sagheworo n’amam-ihe; iwu nke ebere dikwasi-kwa n’ire-ya.” Nke a nwere ike ịbụ omume pụtara ìhè kachasị mma nke ịdị-mma ya niile. Ọ bụghị ọtụtụ mmadụ toruru ọnọdụ a. Ị bụ onye agọziriagọzi ma ọ bụrụ na apụrụ ikwu otú a banyere gị. Site n’amara Chineke ọ pụrụ ịdị otú a.

“Onyeiyeaka Kwesịrị ya”

“Onye amara n’ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu, mgbe ọ nānọdu n’etiti ndi-okenye ala.” O nyewo di-ya nsọpụrụ, o mewo kwa ya iheọma ọ bụghị ihe ọjọọ n’ụbọchị niile nke ndụ ya. O mezuwo ihe ebun’obi kèè ya -- onyeinyeaka kwesịrị nwoke. “Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma bu okpu-eze di-ya” (Ilu 12:4).

N’ụzọ dị otú a ka Nwanyị ana-alụ Ọhụụ nke Kraist na-enwe ọchịchọ ya niile nime Kraist. Ịdị-nsọ nke Chineke, nke pụtara ìhè n’omume ya, na-adọta ndị mmadụ ime ka ha sọpụrụ Kraist.

Okwu Ọjịjá nke Ịhụn’anya

“Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma.” N’ala anyị niile n’ụbọchị taa, ụmụntà na-ekwu okwu ọjịjá nke ịhụn’anya nye nne ha. Ọ bụrụ na ha nwere nne ná-asọpụrụ Chineke ha anatawo ihenketa karịrị ọlaọcha maọbụ ọlaedo maọbụ ụlọ maọbụ ala; ọ na-adị ha ka ọ dịghị onyinye ọ bụla dịkarịrị ukwuu inye nne-ha. Ọ bụ ihe mnwuta na ọtụtụ ụmụntà enweghị ihenketa dị otú a. Nime nkera otù narị arọ gara aga ahụwo ọtụtụ ndapụ nke ndị nne site ná ndụ dị ọcha, nke kwesịrịekwesị dị kwa mma, wee bànye na nke ịñụbiga mmanya ókè, ịñụ anwụrụ na itéegwú. A na-ahụ ihe ụdị ndụ a wepụtara nime ụmụ ha na nime ọtụtụ ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa nke ụbọchị taa. Ilu mgbe ochie ahụ nke ná-asị, “Aka na-elegide nwa ọhụụ bụ aka na-achị ụwa,” ná-egosi ụzọ esi zụlite nwata mgbe mmehie na-aba ụba maọbụ mgbe eziomume na-achị achị.

Iheéfù nke Ịmamma

“Amara bụ ugha, ima nma bu kwa ihe-efu.” Ọtụtụ ụmụnwanyị na-eji ihe ịchọmma nke ụwa ná-edozi onwe-ha, ná-egosi onwe-ha ndị maramma arụ n’ebe mmadụ nọ. ma nime ha, obi ha dị aghụghọ jupụta n’ihe ọjọọ. Mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ ma Chinke na-ele obi. Nwanyị nke nwere ezi okpukpé nwere àmàrà nke ná-eweta udo nke obi, ná-edozi ná-anụcha kwa ọnọdụ nke obi, ná-enye ya ihe ịchọmma nke mmụọ dị nwayọ dị kwa udo nke dị óké ọnụahịa n’anya Chineke.

Otuto

Nwanyị anáalụ Ọhụụ nke Kraist ji obiụtọ, na kwa obi umeala nke ekele ná-ele anya otuto nke ọ ga-anata mgbe ọ ga-ezute Onyenwe ya n’elu. Ihe aka-ya lụpụtara, urù o ji talent ya rita, ndụ nke o biworo, ga “eto kwa ya n’ọnu-uzọ-ama nile.”

“Nwayi nke nējide onwe-ya nke ọma, onye gāchọputa ya? N’ihi na ọnu-ahia ya kariri ruby nke-uku.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHE ICHE
  1. Ònye ka nwanyị a nke ná-ejide onwe-ya nkeọma nọchirị anya ya?
  2. Gịnị bụ ọnụahịa ya?
  3. Òlee ebe o si enweta nri-ya?
  4. Òlee otú o si akụ ubivine ya?
  5. Gịnị mere ọ dịghị atụ egwù snow?
  6. Ụdị ihe ịchọmma dị añaa ka o ji edozi onwe-ya?
  7. Ọ bụ gịnị ka ekwuru n’iheọmùmù anyị banyere ịmamma?
  8. Ònye na-ètó nwanyị a nke ná-ejide onwe-ya nkeọma?