II Samuel 2:1-7, 11; 5:1-5; 6:1-15, 17

Lesson 229 - Senior

Memory Verse
“N’ihi na JEHOVA arọputawo Zaiọn; Ọ chọsiwo ya ike iburu Ya ebe-obibi” (Abù Ọma 132:13).
Cross References

I Mbànye Devid Nime Hebron

1. Mgbe Sọl nwụsịrị, Devid jụrụ Jehova ase ma ọ ga-alọghachị n’ala Israel, 2 Samuel 2:1-3; I Samuel 30:8; I Ihe Emere 14:10, 14-16

2. E tere Devid mmanụ na Hebron ịbụ eze Juda, ebe ọ chịrị eze arọ asaa na mkpirisi, 2 Samuel 2:4, 11

3. Ezigaara ndịkom Jabesh-Gilead ozi ịgbaume n’ihi mmeso ọma ha mesoro Sọl, 2 Samuel 2:5; I Samuel 31:11-13

II Eze nke Náachị Israel Niile

1. Agbùrù niile nke Israel zigara ndị nnọchịanya inwe ọgbụgbandụ ha na Devid ka ha tèè ya mmanụ ịbụ eze Israel niile, 2 Samuel 5:1-3; I Samuel 16:1, 12, 13; I Ihe Emere 12:23-40; Ọlu Ndi-ozi 13:22

2. Ogologo oge niile Devid bụrụ Eze bụ arọ iri anọ (40) 2 Samuel 5:4, 5

3. Ebe isiọchịchị nke Israel ka ebugara na Jerusalem, 2 Samuel 5:5-9

III Ntụgharịuche banyere Igbe Ọgbụgbandụ Chineke

1. Puku ndịkom iri atọ (30) so Devid jee ibupụta Igbe Ọgbugbandụ ahụ n’ụlọ Abinadab, 2 Samuel 6:1-4; I Samuel 7:1; I Ihe Emere 13:1-8

2. Otù nwoke ka etigburu n’ihi na o jidere Igbe ahụ aka, 2 Samuel 6:5-8; Ọnu-Ọgugu 4:15; I Ihe Emere 13:9, 10

3. Devid tụrụ egwù ibubata Igbe Ọgbụgbandụ ahụ n’obodo Ya, 2 Samuel 6:9-11; I Ihe Emere 13:12; Abù Ọma 119:120

4. Ịnọnsọ igbe Ọgbụgbandụ wetara ngọzi, n’ihi nke a Devid nwere ịgbàume ibubata Igbe Ọgbugbandụ ahụ nime Obodo nke Devid, 2 Samuel 6:12-15

5. Edebere Igbe Ọgbụgbandụ ahụ nime otù ụlọikwuu nke Devid meworo maka ya, 2 Samuel 6:17; I Ihe Emere 15:1; 16:1

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ịma Uche Chineke

Mgbe Devid nụrụ na egburu Sọl n’agha nke ha na ndị Filistia, ọ ñụrịghị ọñụ maọli kama obi ya jupụtara n’iruuju. “Añurila mgbe onye-iro-gi nāda, ka obi-gi ghara kwa iteghari egwu ọñu mgbe ọ nāsu ngọngọ” (Ilu 24:17). Ọ bụghị ọnụma aghụghọ ka Devid nwere n’ebe Sọl nọ; Sọl anwụwo, mkpụrụobi ọzọ agawo n’ịlan’iyi ebighịebi. Ọ dịghị ezi Onye Kraist ọ bụla nke ga-achọ ka, ọbụná onyeiro ya gaa ọkụ alammụọ.

Okwukwe emewo ka o wee Devid anya na otù ụbọchị, n’ụzọ ụfọdụ, Chineke ga-ewepụ Sọl n’ebe ịlụọlụ; ma mgbe okwukwe ghọrọ ihe anáahụ anya, Devid guzoro n’egwù banyere ikpé Chineke. Devid emeghị ngwa ngwa gaa n’iru n’ime ọsọsọ, ná ngosi nke ịdịịke, iwere ocheeze nke Israel, ọ bụ ezie na Samuel, site n’odúdú nke Chineke, e tewo ya mmanụ maka ọnọdụ nke a ọtụtụ arọ gara-aga. Otù okwukwe nke ejidewo Devid ná nguzosiike nime ọtụtụ arọ nke nchere ya nke na-agwa ya nime obi ya ugbu a ihe ahụ nke Chineke malitere imezù na Ọ pụrụ iweruta ya n’ọgwụgwụ gara nkeọma. Otú ọ dị, Devid jụrụ ase n’aka Jehova ihe ọzọ nke ọ ga-eme. O meghị ihe ọ bụla tutu rue mgbe ọ maara uche Chineke ya. Okwukwe eziokwu adịghị egosi emeghị ihe n’akụkụ nke onye kwereekwe; kama ezi okwukwe na-enwe nime ya ike nke nchere tutu rue mgbe aga-amazù uchè Jehova, mgbe ahụ amalite ime ihe site ná mmata ahụ.

E nwere ihe ụfọdụ doro anya nime àtùmààtù Chineke nye ụmụ ya, dịka ịgụ mmadụ n’onye eziomume, odudonsọ, ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ, na ọgwụgwọ nsọ nye ndị ahụ arụ ná-esighị ike. Àmàrà na onyinye niile ndịa dịrị onye ọ bụla akpọbataworo nime Oziọma bụrụ kwa ihe ahụ niile onye ahụ ga-achọsiike rue mgbe ọ natazuru ha; otú ọ dị, enwekwara ọtụtụ ọkwá na ọkpụkpọ-òkù ọzọ dị icheiche ana-enye ndị niile ahụ ná-echere Onyenwe anyị nime ekpere na iji obichụọàjà. Ebe kachasị nsọ n’eluụwa nye mkpụrụobi ọ bụla kwesịrị ịbụ n’etiti nke uche Chineke. Ọtụtụ mmadụ na-enwe agụụ nke ịma uche Ya, ma ha adịghị ebi nso iru na inwe mmekọ mgbe dum ha na Ya, na-eji obi ejiworo chụọàjà na nke ghere oghe nye Chineke, ka o wee ná-ekpughe uche Ya oge niile nye ha. Ọñụ nke igwe n’eluụwa bụ ịmata uche Chineke, na ime kwa ya. Devid matara na ọkpụkpọòkù ya n’ọkwá gafere ọkpụkpọòkù efù, ọ makwara na uche Chineke aghaghị ịbụ ihe doro ya anya tupu ọ na-etinye otù nzọụkwụ ịga n’iru.

Ijégharị nime Ìhè ahụ

Devid na ndịagha ya nke dị narị ndịkom isii (600) ka nọ n’ala ndị Filistia mgbe ha nụrụ banyere ọnwụ Sọl. Onyenwe anyị gosịrị Onwe Ya onye kwesịrị ntụkwasịobi n’ezi ase Devid jụrụ, o wee gwa ya ka o rịgorue n’ala Israel n’obodo Hebron. N’obodo nke mgbe ochie nke a, ebe Abraham biworo na ebe eliri nwunye ya bụ Sera, ndịkom nke agbùrù Juda zukọtara wee tee Devid mmanụ ịbụ eze nke ụlọ Juda. N’eziokwu, náánị ihe ndịkom Juda mere bụ ịkwagide otite mmanụ ahụ Devid nataworo n’aka Chineke site na Samuel. Onye ọ bụla nke ná-ejégharị nime ìhè nke Okwu nsọ Chineke ga-ahụ ka ana-emezù mkwà niile nke Chineke n’isi ya mgbe niile.

E nwere ike ịsị na alaeze nke Juda bụ náánị otù mpaghara nke mkwà e kwere Devid. Nke ahụ bụ eziokwu, ma mkwà nke Chineke adịghị nnọọ mkpà mezu ya n’òzùzù òkè ná mmalite nke ndụ mmadụ maọbu mmalite mnwapụta nke Onye Kraist. Chineke nime amamihe ya nwere ike ịzọdo mpaghara nke otù mkwà maọbụ ngọzi, ka o wee zi ihemmụta dị mkpà wee mee “ihe … edoziworo iji lu ezi ọlu ọ bula.” Devid nwere ọtụtụ ihe ọ ga-amụta tupu Chineke ekwe ka ọ chịa Israel niile. Ọ mụtawo ihe banyere iji ngwáagha dị icheiche na ịchịkọta ndịagha nime arọ niile nke ọ na-agbara Sọl ọsọ; ugbu a n’oge ịchịisi ntà nke a, Chineke kuziiri Devid otú esi eji ike na ikike eme ihe. Akpọrọ nwa Chineke ọ bụla ịgafe ọzùzù nke ụlọakwụkwọ -- oge niile nke ule na mnwapụta dị icheiche -- nke ga-eme ka o nwee ọnọdụ nime àtùmààtù nke Onyenwe anyị.

Ndịagha Dị Ike nke Chineke

Akpọpụtara Devid site n’ebe ọ na-azù ìgwèatụrụ nna ya ịbụ onye ọzùzùatụrụ Israel; ọtụtụ nime Ndịozi ka akpọpụtara site n’ọlụ igbu azù ịbụ ndị ọkù ná-akùta mmadụ; ma n’ụbọchị taa Chineke na-akpọ mmadụ niile site n’ọlụ dị icheiche nke aka ha ịbụ “ndi-eze na ndi-nchu-àjà nye Chineke.” Ụzọ esi efè Chineke na ụzọ Alaeze Ya bụrị otù ụzọ ahụ dị warara dị kwa mkpagide. Ọ bụrụ na Devid mụtara nrubeisi site n’ịnagide ahụhụ; ọ bụrụ kwa na emere ka Ndịozi na ndị dike nke okwukwe ndị ọzọ dị ike site n’adịghịike, mmegide na mkpagbu (Ndi Hibru 11:34); Òlee otú onye Kraist ọ bụla ga-eji ná-atụ anya ịbà n’ọnụụzọ Eluigwe ná-agafeghị ahụhụ ọ bụla nime ihe ndịa? Chineke na-eji otù ụdị usoro ndịa taa iji guzobe ndịagha Ya siri ike n’ibu agha nke ndị Kraist.

“Asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze” (2 Timọti 2:12). Ma ọ pụtaghị na ihe ná-abịakute onye Kraist na-abụ náánị ahụhụ, n’ụzọ ọ bụla. Ụgwọ nke ikwesị ntụkwasịobi na-agba ndịagha nke Chineke ume ka ha na-aga n’iru. Onye ahụ ná-emeri ga-eso Kraist bụrụ eze otù puku arọ n’eluụwa a. (Lee Nkpughe 20:4). Ọ pụrụ iwè ogologo ntachịobi ịhụ ka ezi mkwà niile nke Chineke na-emezu ná ndụ mmadụ, ma mkpụrụobi nke ná-etinye okwukwe na ntụkwasịobi ya nime Chineke enwetaworị ụfọdụ n’ihenketa nke ya. “Amara na nsọpuru ka JEHOVA gēnye: ọ gagh-egbochi ezi ihe n’ebe ndi nējéghari n’izu-okè nọ” (Abù Ọma 84:11).

Devid dịka Eze

Mgbe e tere mmadụ mmanụ ịbụ eze nke ga-anọchị eze nke chịworo, ọtụtụ mgbe ihe ọ na-ebu ụzọ mee bụ ịchụda ndị niile nwere ike ibili megide ọchịchị ya. Ọ bụghị náánị na ọ bụ ihe ana-eme, kama na mgbe ochie ahụ eweere ya dịka ihe dị mkpà igbu ndị niile pụrụ iguzogide ocheeze ahụ maọbụ site n’ụzọ ọ bụla megide eze ahụ ná-achịachị. Otú ọ dị Devid enweghị mmụọ dị otú a, n’ihi na o welighị aka ya megide ụlọ Sọl. Abnea, bụ onyeisi ụsụ ndị agha Sọl, weere otù nime ụmụ ndịkom Sọl mee ya eze n’ọnọdụ nna ya; ma “Devid di ike nāga n’iru n’iru, ma ulo Sọl enwegh ike, nāla azu azu” (2 Samuel 3:1). Devid chịrị eze arọ asaa na ọkàrà n’ala Hebron, ma n’ọgwụgwụ nke oge ahụ, Jehova achịkọwo ebo niile nke Israel n’otù alaeze n’okpuru Devid imezù mkwà nke Chineke nye Devid.

N’iji weta nlọghachị nke Israel niile n’otù alaeze, Chineke kwenyere ọnwụ Abnea na Ishboshet nwa Sọl nke Abnea mere ka ọ rịgoro n’ocheeze Israel. Mgbe ndịkom Israel chọpụtara na onye nke ikpeazụ ná-akwagide ụlọ Sọl anwụwo ha wee bịakute Devid n’obodo Hebron ime ya eze. Ha chetara na Devid abụworị onyeisi ụsụ ndị agha ha ọtụtụ arọ gara aga, na Chineke ekweworị Devid mkwà, “Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel gi onwe-gi Gābu kwa onye-ndú Israel.” Ndịokenye nke Israel na Devid wee gbaa ndụ na Hebron n’iru Jehova, ha wee tee Devid mmanụ ịbụ eze Israel, nke mere ka ndị ha niile ñụrịa ọñụ.

Alaeze Eluigwe nke bụ kwa alaeze Nwa Devid, dịka usoro mụmụ nke ụwa si dị, nwere ọtụtụ ihe dị ya yiri nke dị n’alaeze Devid. E tere Devid mmanụ ịbụ eze ọtụtụ arọ gara aga tutu emezue nkwà ahụ. Omume Ụmụ Israel dị ka ha na-asị, “Nwoke a agagh achi ayi”, nke a mere ka ọ gbapụ n’ala Israel n’ihi ndụ ya. Ma otú ọ dị Devid nwere okwukwe nime Chineke wee hụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke mere ka ọ na-aga n’iru n’iru rue mgbe ndị Israel niile bịara n’okpuru ọchịchị ya. Ekwensu na ndịisi nke ọchịchịrị agbasowo ọchịchị Kraist mgbá n’ụzọ niile ha nwere ike. Ndị bi n’ụwa enupụwo isi n’ọchịchị nke Ọkpara Chineke, ma otú ọ dị, Alaeze Chineke na-aga n’iru n’ike kwa arọ. Ma elezie anya ugbu a ọ dị ka ike ekwensu karịrị, ma oge na-abịa mgbe Jisọs ga-ewere mmaagha dị ọkụ nke na-esi kwa n’ọnụ-Ya pụta, tida ike niile nke ekwensu. Aga-amara Jisọs n’ụbọchị ahụ dịka “EZE kachasi NDI-EZE nile NA ONYE-NWENU kachasi NDI-NWENU nile” (Nkpughe 19:16), ma ndị niile bi n’Eluigwe na n’eluụwa ga-eji ọñụ sọpụrụ Ya rubekwara Ya isi. Ọ bụrụ na ndị Israel ñụrịrị ọñụ n’ihi eze-ha nke ụwa, aha ọñụ dị añaa ka ndị nsọ nke Chineke ga-enwe n’ihi Eze-ha nke Eluigwe.

Igbe Ọgbụgbandụ ahụ

Mgbe anyị na-amù ihe banyere ndụ eze ahụ bụ Devid, anyị ga-amata na otù ihe pụtara ìhè dị ná ndụ Devid bụ ikwesị ntụkwasịobi mere ka ọ ghọta Chineke dịka Onyeọchịchị kachasị elu na ya onwe-ya bụ mmadụ efù nke ná-anọchị anya ọchịchị nke Chineke. Devid matakwara na o ziriezi ka isiobodo alaeze ya bụrụ kwa obodo Chineke, ya na ebe isinzukọ òfùfè Chineke nke ndị Israel ñụrịrị ọñụ nime ya. Ọ dịworị anya akwụsịrị ifè òfùfè n’Ụlọikwuu ahụ dị na Shailo; ebe Igbe Ọgbụgbandụ nke ebughachirị site n’ala ndị Filistia, ka edebeworo n’ụlọ Abinadab wee bụrụ kwa ihe echezọrọ echezọ. Ma mgbe emere ka ịbụ-eze Devid guzosieike n’ebo niile nke Israel, ọ hụrụ na ọ bụ ihe dị mkpà bụ inwe Igbe Chineke na Jerusalem. Ọ kpọkọtara iri puku ndịkom atọ (30,000) arọpụtara ka ha soro ya gaa bughachị Igbe Chineke site n’obodo ahụ ná mmeri.

Anyị aghaghị ilezianya ime ihe niile dịka ndụmọdụ Chineke si dị, ma ọ bụrụ na anyị na-achọ ịnata iruọma Chineke nime ndụ anyị! Ọ bụrụ-rị na Ụmụ Israel leziri anya mụta Okwu Chineke n’oge a, ha ga-amataworị na o kwesịrị ka ha kechie Igbe Chineke nkeọma ka onye ọ bụla ghara ilekwasị ya anya, na aga-ebu ya na mkpàn’aka n’ubu ndị Livai. Ọ bụ náánị ndị nchụàjà ndị ná ejéozi n’Ụlọikwuu pụrụ imetu Igbe Chineke na ihe nsọ niile ọzọ aka ghara ịnwụ.

Ndị Filistia ji ụgbọala ọhụụ bughachịtara Ụmụ Israel Igbe Ọgbugbandụ ahụ. Devid na ndị ya ledara iwu Chineke anya wee chọọ ibu Igbe ahụ n’otù ụzọ ahụ site n’ụlọ Abinadab wee rue na Jerusalem. Mgbe ìgwè mmadụ ndịa na-aga n’usoro ịbà nime obodo, Igbe Chineke chigharịrị n’ihi na ehi na-agbá ụkwụ. Ụza, otù onye nime ndị ná-edu ụgbọala ahụ, setipụrụ aka idozi ya, ma nke a mere ka iwe Chineke dị ọkụ n’arụ ya n’ihi na o megidere iwu Chineke. Chineke wee tigbue ya n’ihi mmehie ya; o wee nwụọ. Ọnwụ Ụza wutara Devid nke ukwuu o wee tụọ egwù ibubata Igbe Chineke nime obodo. Ìgwè mmadụ ndịa wee tụgharịa bugaa Igbe Chineke n’ụlọ Obed-edom.

Ịnata Ngọzi

Chineke gọziri èzínaụlọ Obed-edom n’oge niile ahụ Igbe Chineke dị n’ụlọ ya. Mgbe ọ bụla ejiri ihe Chineke n’ụzọ ziriezi na nsọpụrụ, ngọzi Chineke na-eso ya. Ọ dị Devid mkpà ọzọ ibubata Igbe Chineke n’obodo ahụ ebe ya onwe-ya nọ na n’ihi na ọ na-ahụ ngọzi nke Obed-edom na-enweta site n’Igbe ahụ dị n’ụlọ ya, Devid wee nwee agbamume ka ebubata Igbe ahụ nime Jerusalem. N’oge nke abụọ nke a ndị Livai buru Igbe Chineke n’ubu-ha, Chineke gọzikwara ha niile. Ha butere Igbe ahụ n’obodo Jerusalem n’óké itimkpu na n’olu opiike, wee debe ya n’ọnọdụ ya n’ụlọikwuu ahụ nke Devid maworo.

Ihe nke a mere kwesịrị ịbụrụ mmadụ niile ihe ịdọ akanántị ọbụná taa, na Chineke nke Eluigwe na-akpachapụ anya banyere ihe ntà niile. Nke a na-egosi na ọ bụ ihe dị mfé ịzọhie ụkwụ -- ịdapụ site n’àtùmààtù nke Chineke -- ya na mkwụghachị nke ná-eso omume dị otú a. Ọ bụrụ na Chineke kpachapụrụ anya n’otú Devid si feé Ya òfùfè, ọ bụ na Ọ gaghị esi otú ahụ lebanye anya ná ndụ onye nke Kraist ugbu a? Nke a na-egosi na ọ dị óké mkpà ka Chineke ná-anọ anyị nso mgbe niile, ka O wee ná-edu nzọụkwụ anyị niile. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ga-elezianya ijégharị na nzọụkwụ niile nke Kraist, ná-esokwa odudu Ya niile, o doro anya na ha ga-enwe ọ gan’iru n’ụzọ a atụliriatụli nke ịdịnsọ na ọnụụzọ emegheworo emeghe mgbe ha ga-erute n’Eluigwe.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ebe Devid nọ mgbe ọ nụrụ banyere ọnwụ Sọl?
  2. Òlee ihe Devid mere tutu ọ rapụ ebe ọ nọ? òlee obodo ọ gara?
  3. Ònye bịara n’obodo ahụ? Gịnị ka ha mere?
  4. Àrọ òle gabigara tutu Ụmụ Israel niile e tee Devid mmanụ ịbụ eze ha?
  5. Òlee obodo Devid rọpụtara ka ọ bụrụ isiobodo ya?
  6. Gịnị mere Devid jiri chọọ ka Igbe Ọgbụgbandụ dị nime obodo ya onwe-ya nọ?
  7. Gịnị mere Chineke jiri tie Ụza ihe wee mee ka ọ nwụọ?
  8. Òlee otú esi bubata Igbe Ọgbụgbandụ ahụ nime obodo?
  9. Òlee ihemmụta pụtara ìhè nke anyị pụrụ ịmụta site nime ihe ịma àtù a?