2 Samuel 7:1-29; Abù Ọma 30:1; Aisaia 66:1, 2

Lesson 230 - Senior

Memory Verse
“Otú a ka JEHOVA siri, Elu-igwe bu oche-ezem, uwa bu kwa ihe-ngbakwasi-ukwum: àha ulo gini ka unu gēwurum? Ma-ọbu àha ebe gini gābu ebe-izu-ikem?” (Aisaia 66:1).
Cross References

I Arịrịọ Devid na Nnabata Ya

1. Obi adịghị Devid mma, n’oge o kwesịrị inwe udo nke Chineke, n’ihi na ụlọ ya dị mma karịa ebe edebere Igbe ọgbugbandụ, 2 Samuel 7:1, 2; 5:11; 6:17; I Ihe Emere 17:1; Abù Ọma 30:1

2. Netan, dịka onye nke Chineke gbara Devid ume ka o wue Ụlọukwuu Chineke nke ga-adịgide, 2 Samuel 7:3; I Ihe-Emere 17:2

3. Netan, dịka Onyeamụma nke Chineke matara uche Chineke banyere Ụlọukwuu Chineke ahụ, 2 Samuel 7:4; I Ihe-Emere 17:3

II Ozi Chineke ziri Devid

1. Chineke asịghị ka ewuere Ya Ụlọukwuu, 2 Samuel 7:5-7; Aisaia 66:1, 2; Jọn 4:20-24; I Ihe Emere 17:4-6; Ọlu Ndi-ozi 7:48-50

2. Agụụ dị n’obi Devid iwu Ụlọukwuu ahụ ka Chineke jara mma, I Ndi Eze 8:18; 2 Ihe Emere 6:7, 8

3. Chineke kpọrọ Devid ịbụ onyeagha ọ bụghị iwu Ụlọ nke Udo, I Samuel 7:8, 9; I Ihe Emere 17:7, 8; 22:7-10; Ndi Rom 11:29; I Ndi Kọrint 7:20; 12:28; Ndi Efesọs 4:11

4. Ekweghị ka Devid wue Ụlọukwuu ahụ, n’ihi na Chineke nwere àtùmààtụ ka ukwuu nye ya na Israel niile, site kwa na ya, 2 Samuel 7:10; I Ndi Eze 8:16-20; I Ihe Emere 17:9, 10; Jeremaia 32:37-42; Aisaia 55:8, 9; I Ndi Kọrint 3:16, 17; 6:19

5. Ọlụ nke iwu Ụlọukwuu ahụ ka aga-enye Solomon, 2 Samuel 7:12, 13; I Ndi Eze 8:19; I Ihe Emere 17:11-14; 22:9, 10; 2 Ihe Emere 6:9, 10

6. Mkwà niile nke Chineke nye Solomon na-adabere n’irubeisi ya zuru òkè, 2 Samuel 7:14, 15; I Ihe Emere 22:12, 13; Abù Ọma 89:30-32

7. Ọgbụgbandụ nke Chineke na Devid ka emesiri ike site n’ịñụiyi ma bụrụ kwa ihe nwere ike imezu náánị n’ọbịbịa nke Mesaia ahụ, 2 Samuel 7:16, 17; I Ihe Emere 17:14, 15; Abù Ọma 89:1-4; 20:37; Ọnu-ọgugu 24:17-19; Aisaia 9:7; Zekaraia 14:9, 16, 17; Matiu 21:5-9; 27:37; Luk 1:32, 33; Nkpughe 19:11-16

III Ọzịzá Devid nye Chineke

1. Ewedara Devid n’ala n’iru nchịkọta niile nke ọgbụgbandụ ya na Chineke, 2 Samuel 7:18; I Ihe Emere 17:16; Aisaia 51:1

2. Ọzịzá Devid na-egosi na ọ ghọtara, ọbụná n’ọtùtù, ịdị omimi nke Ọgbụgbandụ Chineke, 2 Samuel 7:19; I Ihe Emere 17:17; Matiu 13:17; Ndi Hibru 11:32-35; I Pita 1:10-12

3. Devid na-étó Chineke n’ihi nwedata O wedatara onwe-Ya n’ala n’etiti Ya na Ụmụ Israel, 2 Samuel 7:20-29; I Ihe Emere 17:18-27; Deuteronomi 4:7, 8; 33:29; Ọnu-ọgugu 23:8-10

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

N’inyocha iheọmùmù a dị ebube anyị nwere ike n’ezie ịmalite site n’ihe ọgụgụ ná-adịghị na nke enyere anyị ịgụ. Site n’ebe ọgụgụ a anyị pụrụ ịhụ ihe ụfọdụ eji tụnyere ihe aga-ahụta site n’ilezianya mụọ ihe mere ná ndụ eze nke abụọ nke Israel.

Ụfọdụ agafewo akụkọ a ngwangwa wee ghara ịhụ ọnọdụ ebighịebi ọ pụrụ iweta bụ njikere ọma nke emere ka ọ malite n’ebe a. Nke a abụghị ihe mere na mberede. Ihe niile ọ ga-eweta ka aga-amata n’ebighịebi, n’ihi na ọ bụ ihe dị elu karịsịa ná ndụ eze nke mbụ ahụ n’Alaeze ebighịebi. Devid bụ “ọkpara, di uku karia eze nile nke uwa,” nye Chineke, eze nke Chineke tere mmanụ n’onwe-Ya, na nwoke onye mkpụrụ ya gādi “rue mgbe ebigh-ebi, me kwa ka oche-eze-ya di ka ubọchi nile nke elu-igwe” (Abù Ọma 89:20, 27, 29).

Ụzọ niile nke Chineke

“Échìchè nkem, ha abugh échìchè-unu, uzọ-unu kwa, ha abugh uzọm; ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta.

N’ihi na dika elu-igwe si di elu kari uwa otú a ka uzọm nile di elu kari uzọ nile unu, ọ bu kwa otú a ka échìchèm nile di elu kari échìchè nile unu” (Aisaia 55:8, 9).

N’ebe a ka ezipụtara ya nkeọma na ụzọ niile nke Chineke dị elu karịa ụzọ niile nke anyị, na échìchè Ya abụghị kwa échìchè anyị. Onyeamụma bụ Devid na Onyeamụma bụ Netan hụrụ nime ihe a mere, óké ebube na òzùzùòkè nke àtùmààtù nke ha ná-ezughị ezu ma eji ya tụnyere nke Chineke. Àtùmààtù Devid adịghị njọ. Emere ka ha ghara izuezu n’anya nke mmadụ ma n’ụzọ nke ụwa ọbụná site n’eziokwu ahụ nke bụ na ọ dịghị onye ọ bụla ga-enwe olileanya ebighịebi dị otú a dịka Chineke zubere nye mmadụ ahụ nwere obi zuruòkè n’ebe Ọ nọ.

Otù onye na-atụ egwù Chineke na mgbe garaaga ekwuwo sị, “Chineke bụ mmalite nke nzube niile dị nsọ nke anyị, dịka n’ọlụ ọma niile nke anyị; Ọ na-ebu ụzọ kpalie ha; ma ọ bụrụ na anyị bụ ndị ha na Ya na-alụkọ ọlụ, Ọ ga-ekpukwasị ha okpueze, nye kwa ha ụgwọ ọlụ dịka ha bụ nke anyị, ọ bụ ezie na Ya onwe-Ya bụ onye mmalite ha.” Nwoke a na-ekwu nnọọ na, “Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru òkè nke enyere enye si n’elu bia, ebe o si n’aka Nna nke ìhè ridata, Onye ọghugha ọ bula nāpugh idi n’ebe Ọ nọ, ma-ọbu onyinyo nke nchighari nēweta” (Jemes 1:17).

Ụfọdụ chèrè na ana-ewesa Devid iwe mgbe ajụrụ arịrịọ ọ rịọrọ ka arapụ ya ka ya wuere Jehova ụlọ. Ma Okwu nke Chineke na-agwa anyị na échìchè na mmasị ya dị mma ma kwesị kwa ekwesị. Ọjụjụ ahụ bụ náánị igosi na ụzọ niile nke Chineke abụghị ụzọ niile nke anyị na, échìchè Ya niile dị kwa elu karịa échìchè niile nke anyị.

Ọgbụgbandụ ahụ site n’Ịchụàjà

Ọ na-adị mma mgbe dum ịnagide Chineke na mmasị Ya karịa nke anyị onwe-anyị. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ dị njọ “iburu uzọ chọ ala-eze Chineke” na ibuli ihe Ya niile elu, ọbụná iji iheụtọ anyị na izuike anyị na mkpà ụfọdụ nke anyị chụara Ya àjà. Ọ na-atọ Chineke ụtọ mgbe ọ bụla anyị na-asọpụrụ Ya karịa onwe-anyị, ndị anyị na ha na-emekọrịta, ọlụ anyị, na ihe ná-adị anyị mma n’ụwa a. Oziọma nke alaeze ahụ bụ okpukpé nke ịchụàjà. Ọ dịghị ụzọ dị mfé ijeru Eluigwe. Ọ dịghị ụzọ okporoigwè ijeru n’elu ugwu nke ebube Eluigwe. Ndịnsọ ahụ ndị aga-achịkọtara Kraist ga-abụ ndị Ya na ha gbara ndụ n’elu àjà (Abù Ọma 50:1-6).

Chineke bụ Onyemmalite nzube n’obi onyeijè ahụ nke ná-ejé Eluigwe, onye ga-ewere ihe dum debe n’akụkụ -- ọbụná ndụ n’onwe-ya -- ịhụ na emere ka Alaeze ahụ gaa n’iru ma mee kwa ka aha Chineke dị elu. Ọchịchọ na échìchè dị otú ahụ abụghị nke ụwa; ọ bụ otù nime ezi ihe dị ókéọnụ nke ná-esi n’Eluigwe n’onwe-ya bịa. Ọ dịbeghị àjà ọ bụla nke ezi onye Kraist chụworo -- malite n’eze ahụ nwere àkù bụ David, rue na nwanyị ahụ di ya nwụrụ onye ji nwayọ ná-egosipụtaghị onwe ya tinye ihe niile o nwere n’igbeàkù nke Chineke -- ma Chineke hụtara ya wee nyeghachị kwa ya ụgwọ ọlụ ya. Ndị ná-agbabeghị ndụ “n’elu àjà” amaghị ọñụ nke dị n’udị ọgbụgbandụ nke a n’etiti mmadụ na Chineke. Ịgụ ihe niile anyị nwere n’ihe efù n’ihi Alaeze nke Kraist na-egosi ebe nsọpụrụ anyị dị, onye bụ Eze anyị, na onye anyị nyeworo ịhụnanya anyị.

Ọ dịghị àjà dịkarịrị ukwuu ịchụrụ Chineke, n’ihi na ọ na-akwụghachị ụgwọọlụ ná-enyeghachị kwa òkpùkpù narị n’ụma. Ọ dịghị ihe ọ bụla anyị ga-enweworị n’ụwa a ma mesịa rapụ ha n’ihi Ya, ga-abụ ịchụàjà karịrị óké ọnụahịa. Emesịa ụwa nke a ga-agabiga; ma asịkwarị na anyị ga-anwụ tupu óké ụbọchị Jehova, mgbe ihe niile ga-eji óké ọkụ wee gbazee, aga-eme ka anyị rapụ urù nke ụwa nke a wee zọbà ụkwụ nime ebighịebi, náánị anyị, ná-adịghị ihe ụwa niile anyị nwetaworo maọbụ urù ga-eduru anyị baa. Ma àjà achụrụ nye Chineke ga-akwụ ụgwọọlụ ebighịebi. Eleghịanya anyị enwetaghị ihe ịchọmma na ihe egwuri-egwú nke ụwa nke a, ma anyị pụrụ inwe n’ọnọdụ ha, àkù dị ukwuu na-adịgide rue ebighịebi.

Àjà Kraist Chụrụ n’ihi Anyị

Ịchụàjà dị mkpà, ọbụná nye Ọkpara Chineke. Chineke buliri Ya elu rue ọnọdu nke na aha Ya dị elu karịa aha niile n’ihi na O jikeere ịchụàjà ahụ. O nyere ndụ Ya. O nyere ihe niile. Ọ gụghị ọnwụ n’elu obe nke ihere dịka àjà karịrị akarị. Ọchịchọ niile nke Kraist bụ ka enye aha Chineke otuto ma napụta kwa ụmụmmadụ ndị furuefù.

Échèrè alaeze niile nke ụwa a n’iru Kraist ma ọ bụrụ na Ọ ga-agọnarị Chineke wee rubere chi nke ụwa nke a isi. Ọtụtụ nde mmadụ na-eme ihe ndị ahụ: ndị ná-ada n’ala n’ezi mweda onwe ha site n’alaala obi ha, na site n’ihe mnweta ha na ike ha niile, nye onye ahụ nke ná-apụghị inyeghachị ha ihe ọ bụla ná mkwụghachị. Ìgwè mmadụ ana-apụghị ịgụta ọnụ nime ndịa so n’ìgwè ndị ahụ ná-akpọ aha nsọ ahụ n’egbugbereọnụ ha n’òfùfè nke ná-esiteghị n’obi ha. Ha naasị, “Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi”, ebe obi ha dị anya n’ebe Chineke nọ. Otú ọ dị, Jisọs ekwenyereghị ekwensu; ma ọ bụ kwa, ihe nlere anya nye anyị niile ndị náeso nzọụkwụ Ya n’ụzọ a.

Devid ji Uche na Àtùmààtù Ya niile Chụọàjà

E jiri ceda wue ụlọ Devid ma Igbe Ọgbụgbandụ Chineke ka adọbara nime ụlọikwuu. Devid rịọrọ ihe onye nke Chineke ọ bụla nwere ike ịrịọ: ka Chineke were ihe ya kachasị mma. Netan, onye nke Chineke, hụrụ ọchịchọ Devid, ma ebe ọ na-eche na o sitere n’ebe Chineke nọ, o wee kwadoo àtùmààtù ahụ. Ma Onyeamụma ahụ arahụghị ụra n’ụlọ ya n’abalị ahụ. Netan na Devid nwere agụụ banyere ọ gan’iru nke ihe nke Chineke, ma ha enupughịisi maọbụ were uche nke aka ha mee ihe ha chèrè banyere ya. Karịa ịrụụkà, Netan kpere ekpere ka Chineke kwụsị ihe niile ọ bụla ná-abụghị uche Ya ma mee ka náánị nke ahụ bụ uche Ya gaa n’iru. Chineke pụrụ ịgwa onye ntị ya ghereoghe okwu. Ọ pụrụ ịgwá Netan okwu. Anyị pụrụ ịhụ na obi Devid ghere kwa oghe nye uche nke Chineke zùrùòkè, ọzọ, n’ihi na n’ịrịọ arịrịọ nke iji obi chụọàjà na ịnagide uche nke Chineke ọ sịrị na “ọ di n’obi-ya ikpe ekpere a” nye Chineke. Mmadụ na-achọta àkù niile nke imemmụọ náánị mgbe ọ na-achọ ha. N’ihi nke a anyị, ma na Devid, otù aka ahụ, na-achọ uche Chineke n’okwu ahụ, ọbụná mgbe ọ natasịworo mkwado nke onye nke Chineke ahụ.

Àtùmààtù Chineke nye Devid

Chineke ekwughị ka ewuere Ya ụlọ. Ọ dịghị ụlọ ọ bụla ga-anagide Ya, bụ Onye dị ukwuu karịa ụwa dum. Ọ rọrọghị obodo ọ bụla ịbụ ebe obibi Ya. Kama nke ahụ, Ọ rọọrọ mmadụ, ma mmadụ ahụ bụ Devid. Chineke nwere obi ụto na Devid nwere mmasị iwuru Ya ụlọ; n’ikpeazụ O kwere ka emee nke a n’otù ụzọ. Ma ewughị ya dịka ebe obibi nye Chineke. E wuru ya ka ọ bụrụ ebe nsọpụrụ nye aha nke Chineke.

Ọ dịghị ebe ọ bụla mmadụ wuru ụlọ ga-ekwesị ka Chineke bie ya. Ọ sịrị, “Ma onye a ka M’gēlegide, ọbuná onye ewedara n’ala nke etigbu-kwa-ra mọ-ya etigbu, onye nāma kwa jijiji n’okwum” (Aisaia 66:1, 2). Chineke hụrụ nime Devid nwoke Ọ ga-eji mezue mkwà nke ọgbụgbandụ nye ụwa nke ndị mmehie. Devid chọpụtara na Chineke na eleanya gafee ọchịchọ nke iwuru Ya ulo. Chineke gaje iwu ulo nye Devid; ọ bụghị iji nye aha Devid nsọpụrụ, kama imezu mkwà niile nke ọgbụgbandụ O kwere Abraham.

Eziulo Nsọ nke Chineke

Arụ anyị dum bụ ulonsọ nke Mmụọ Nsọ (I Ndi Kọrint 3:16, 17; 6:19, 20). Eji ọnụahịa zụta anyị. Anyị abụghị nke onwe anyị. Chineke arọpụtawo Devid iji mezue àtùmààtù ebighịebi Ya na nzube niile nke Ya; ma Ọ na-akpọ kwa òkù n’ụbọchị taa ọbụná n’ọtùtù dị ukwuu karịa, maka ndị ahụ ga-agbá ndụ ahụ “n’elu àjà” ma were kwa onwe ha nyezue Onye ahụ ná-eme eziomume na ihe ziriezi.

Chineke na-achọ ndị ọ ga atụkwasịobi maka ọlụ ọgbụgbandụ nke Alaeze Eluigwe, ka Oziọma wee gazue ụwa niile, rue ìgwè mmadụ ndị ná-anọghị n’Alaeze ahụ ndị ná-amaghị kwa ụzọ esi abata ya. Ọlụ nke ịgbasa Oziọma taa bụ ihe dịrị Mmụọ Nsọ na Nwanyị anáalụ Ọhụụ nke Kraist. Kraist nọ n’aka nri nke Chineke Nna ná-arịọrọ mmadụ ndị bi n’ụwa arịrịọ, ma nye kwa n’aka anyị ijéozi nke ime ka mmadụ na Chineke dị n’udo. N’ihi ọlụ a Mmụọ Nsọ ga-emeju anyị -- Ụlọnsọ Ya -- nye anyị ike, duzie anyị, gbaa kwa anyị ume. Ọ bụ óké ọlụ a na-adịkwasị n’ịdịarọ n’isi ndị niile ahụ ná-anọ nso Chineke ndị ná-achọ kwa náánị otuto Chineke ma ná-arọrọ kwa ụzọ Ya karịa nke onwe-ha. Site na ha Chineke pụrụ imezu mkwà Ya nke O kwere ndị nna ha nke ọgbọ garaaga.

Ọgbụgbandụ niile ahụ

N’ebe a anyị na-ahụta óké àtùmààtù ọgbụgbandụ ọzọ nke Chineke. Ya na Abraham gbara ọgbụgbandụ ebighịebi nke aga-emezu site ná mba nke Israel. Ya na Israel gbara ndụ dị iche banyere nke a. Ọgbụgbandụ nke Chineke na Abraham ka eji ịñụ iyi mee ka o sie ike, ma ebe Chineke ná-enweghị onye ọ bụla ọzọ ka Ya ukwuu iji ñụọ iyi, O jiri onwe-Ya ñụọ iyi (Ndi Hibru 6:13).

Mba nke Israel adịghị mgbe ha mezuru ọgbụgbandụ ahụ nke ha na Chineke gbara na Horeb maọbụ nrọpụta niile nke óké ọgbụgbandụ ahụ nke Ya na Abraham gbara. Ma mkwà dị nime ha abụọ ka ụfọdụ mmadụ mezuru, ndị rọọrọ iji onwe ha chụọàjà karịa inwe ọñụ, “ihe utọ nke nmehie na nwa oge” (Ndi Hibru 11:25). Ekele dịrị Chineke na ọ dị ndị kwesịrị ntụkwasịobi dịka Moses, Joshua, Debora, Berak, Samuel, Devid, Elaija, Elaisha, na Jọn Onyeọwụmmiri, iji mezue àtùmààtù Chineke banyere nzọpụta nke ụwa.

Ọgbụgbandu mbụ ahụ nke Ya na Abraham agaghị agabiga ma eji ịñụ iyi mesie ya ike. Ọgbụgbandụ nke Ya na Israel metụtara náánị ha ma aga-emezu kwa ya site n’Onye ahụ nke bịara imezu eziomume niile. Ọgbụgbandụ a nke Ya na Israel abụghị nke ebighịebi, ya mere ejighị ịñụ iyi mesie ya ike.

Ụfọdụ ga-ajụ ajụjụ banyere eziokwu a, ná-eche na ọ dighị ihe dị iche dị ya, ebe ọ bụ na Okwu Chineke na-adị rue ebighịebi, na ihe niile O kwuru aghaghị imezu. Okwu a n’onwe ya bụ ihe mere eme. Iwere ịñụ iyi mesie otù ike na-egosi ụdị ebighịebi na ịka mma ya karịa nke ana-ejighị ịñụ iyi mesie ike. Okwu niile nke Chineke kwuru n’ụgwu Sainai banyere Israel dịrị ha, náánị ha. Ma mgbe ihe niile ekwuru n’Iwu mezuru, Iwu ahụ na Ọgbụgbandụ Ya na Israel gabigara.

ké ihe dị mkpà ná mwulite àtùmààtù nke nzọpụta Chineke ka ejeruru n’oge Devid rịọrọ ka enye ya ohere iwuru Chineke ụlọ. Chineke mere ka akụkụ ụfọdụ nke ọgbụgbandụ Ya na Abraham gbara dị ọhụụ nkekanke akụkụ ahụ nke metụtara Devid na ọnọdụ ọ ga-anọchi n’Àtùmààtù ahụ dị Nsọ.

Chineke sịrị, “Arọputaghm obodo … iwu ulo, … ma arọputaram Devid” (I Ndi Eze 8:16). “Mu onwem siri n’ebe-ita-nri anu-ulo, kuru gi (Devid), … M’gēme-kwa-ra gi aha uku” (2 Samuel 7:8, 9). Ya mere Chineke kpugheere Onyeamụma ahụ bụ Devid site n’Onyeamụma bụ Netan, na Ọ ga-eguzobe Alaeze nke ná-agaghị agwụagwụ, ma rọpụtakwara Israel ebe ga-adịgide, nye ndị ga-ewere Ya dịka Eze ha. Chineke kwuru na Ya ga-ewuru Devid ụlọ, na apụghị iwezuga ebere Ya n’ụlọ ahụ dịka ewezugara ya n’ebe Sọl nọ.

Devid matara mkpà nke mkwà niile na ọgbụgbandụ ndịa dị, n’ihi na Chineke n’onwe-Ya ji ịñụ iyi mesie ya ike. Devid kpere ekpere sị “I we kwue kwa okwu banyere ulo orù-Gi rue mgbe di anya.” Nime okwu nke a ọ na-eme ka anyị mara na ya hụrụ site n’ebe dị anya ezi mmezù nke àtùmààtù Chineke nye ọgbọ niile. Ọ na-ahụta na èzínaụlọ ya pụrụ ịdị ndụ ebighịebi n’ihi na ọ ga-ejeru ná mmezù n’Onye ahụ Nke ga-adị ndụ rue mgbe ebighịebi. Anyị makwara na Onye ahụ bụ Jisọs nke bụ Kraist. Devid bụ eze nke abụọ nke Israel, ma ọ bụ eze nke mbụ n’Alaeze ahụ nke ná-enweghị ọgwụgwụ.

Devid kwukwara okwu sị, “Nka ọ bu kwa iwu bayere madu, Onye-nwe-ayi JEHOVA?” Emewo ka anyị mara na nsụgharị okwu a n’asụsụ Hibru mbụ ya n’ebe a abụghị ajụjụ kama ọ bụ ahịrị okwu: “Ma nka Onye-nwe-ayi CHINEKE, bu iwu nke Adam.” (Adam na mmadụ si n’otù okwu asụsụ Hibru ahụ pụta.) Ná arụghịụkà, Devid na-ekwu n’ebe a banyere nkwà mbụ ahụ e kwere maka Mesaia, na mkpụrụ nke nwanyị ahụ ga-echifịa isi agwọ ahụ. N’ụzọ ọzọ, ọ na-ekwu, “Nka ga-abụ mmezù nke óké nkwa ahụ banyere Mesaia na olile-anya nile.” Ma site n’obi jupụtara n’ọñụ na mkpụrụobi jupụtara ná nrubiga-ókè, Devid gara n’iru ịwụsa obi ya nye Jehova nime nkwuwa okwu nke ekpere iji obichụaàjà na otuto nke bụ ọgwụgwụ nke iheọmùmù anyị.

Ọgbụgbandụ nke Anyị na Ya

Mgbe narị arọ atọ gasịrị Chineke kpọrọ mmadụ dum òkù ka ha bịa “na miri, onye ahu kwa nke nēnwegh ego; bianu zuru ọkà, rie; e, bianu, zuru kwa manya-vine na miri-ara-ehi nējigh ego nārùgh ọnu-ahia.” Chineke kwere mkwà na Ya na ndị niile zara òkù ahụ ga-agba ndụ ebighịebi. Ma ka aghara inwe ihe mgbagwojuanya banyere ihe wetara ọgbụgbandụ ahụ, O kwukwara sị, “Bú ebere nile kwesiri ntukwasi obi nke emere Devid” (Aisaia 55:1-3).

Anapụrụ Sọl ebere Chineke ma emere ka ọ dịịrị Devid rue ebighịebi na mkpụrụ ya n’ihi ọgbụgbandụ nke Devid “n’elu-àjà.” Chineke enyewo anyị Okwu Ya nke ná-adịghị agbanwe agbanwe ka ngọzi ebighịebi niile ekwere Devid ná mkwà wee rutu anyị ma ọ bụrụ na anyị aza òkù ahụ ma gbaa kwa ndụ otù aka ahụ “n’elu àjà” dịka Devid mere.

Anyị hụrụ na Devid bụ eze mbụ n’ụwa nke alaeze ya ná-agaghị ebi, ma anyị pụkwara ịhụ na anyị onwe anyị kwa nwere ike isoro Eze ebighịebi ahụ chịa ọchịchị n’Alaeze ahụ nke ná-agaghị enwe ọgwụgwu. Chineke na Devid gbara ndụ were ịñụ iyi mesie ya ike, ka anyị wee mara ezi nguzosiike ya na ịdị rue ebighịebi ya. Ọ bụghị ọgbụgbandụ nke ga-akwụsị mgbe emezuru akụkụ ụfọdụ, dịka ọgbụgbandụ Chineke na Israel gbara na Horeb. Chineke chọrọ ka anyị na Ya baa n’otù ọgbụgbandụ a nke Ya na Devid gbara. Échèbèrè ọgbụgbandụ a site “n’ebere nile kwesiri ntukwasi-obi nke emere Devid.” Nke a bụ ọgbụgbandụ ahụ añụrụiyi banyere ya site n’ịdịnsọ nke Chineke -- nke bụ ụdị kachasị ukwuu nke Chineke ahụ Onye ná-aghaghị iji onwe-Ya ñụa iyi, n’ihi na ọ dịghị onye ka Ya ukwuu (Ndi Hibru 6:13; Abù Ọma 89:3, 35). Ya mere, ọdin’iru anyị ka na-eguzosi ike ma ọ bụrụ na anyị agaa n’iru imezu mkwà niile nke anyị kwere -- ọ bụrụ na anyị emee ma debe kwa ọgbụgbandụ niile ahụ “n’elu àjà.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ọnọdụ nke obodo Israel n’oge a anyị na-amụ ihe banyere ya?
  2. Gịnị bụ ọnọdọ abụọ Netan nọchirị n’iheọmùmù a?
  3. Àna-abara Devid mba mgbe ajụrụ inye ya ihe ọ rịọrọ?
  4. Gịnị ka Devid bu n’obi kpaliri o ji rịọ arịrịọ a?
  5. Gịnị ka Chineke nwere ikwu banyere arịrịọ Devid?
  6. Gịnị bụ àtùmààtù Chineke nwere banyere Devid na Israel site n’aka Devid?
  7. Ònye ga-eme ihe ahụ Devid zubere ime ma emesịa?
  8. Gịnị ka ị na-achọpụta bụ otù n’ọgbụgbandụ nke Chineke na Abraham gbara na Ya na Devid?
  9. Òlee otú aga-esi mezue óké mkwà ahụ ekwere Devid?
  10. Kọwaa omume Devid na nzaghachị ya nye Chineke mgbe Chineke mesịrị ka Devid mara nzube Ya nye ya na Israel.