2 Samuel 9:1-13

Lesson 231 - Senior

Memory Verse
“Pua ọsọsọ ga n’ama nile na uzọ ntà nile nke obodo, kubata n’ebe a ndi-ogbeye na ndi-ọlusi na ndi-ìsì na ndi-ngwurọ” (Luk 14:21).
Cross References

I Mefiboshet Ụdị Mmadụ Daraada

1. Mefiboshet, dịka otù nime ndị èzínaulo Sọl, ka Chineke jụrụ ka ọ ghara ịbụ eze, 2 Samuel 9:1, 2; I Samuel 15:28; 13:13, 14; 2:30

2. Mefiboshet bụ onye achụpụrụ site n’ihenketa ruuru ya, 2 Samuel 9:7; Jenesis 3:22-24

3. Dịka onye ọnọdụ nke otù eze ajụrụájụ, Mefiboshet ka ajụrụ rue ọnwụ, 2 Samuel 3:1; Aisaia 43:27; Ndi Rom 5:12; I Ndi Kọrint 15:21

4. Mefiboshet ka emere ka ọ ghọọ onye ngwụrọ nke ná-enweghị inyeaka site na ọdịda ọ dara , 2 Samuel 9:3; 4:4; Ndi Rom 5:6

II Ọgbụgbandụ nke Devid

1. Mefiboshet ritere urù site n’ọgbụgbandụ nke Devid na Jonatan gbara, 2 Samuel 9:1; I Samuel 20:15, 16; Ọpupu 2:24; Jenesis 26:3

2. Devid chọrọ ma ọ dị onye nketa fọdụrụ n’ụlọ Sọl ka o wee meere ya ebere, 2 Samuel 9:2-5; Luk 19:10; Jọn 10:10; Ndi Galetia 4:4, 5

III Ihenketa ahụ ka enyeghachịrị

1. Mefiboshet gosiri ezi nweda n’ala n’iru Devid, ọbụná dịka onye mmehie na-aghaghị iweda onwe ya n’iru Chineke, 2 Samuel 9:6; Luk 18:13 Jemes 4:8-10; I Pita 5:5

2. Ihenketa nke Mefiboshet furuefu ka enyeghachịrị ya, 2 Samuel 9:7-9; I Pita 1:3, 4; Ndi Efesọs 1:5-7

3. Mefiboshet ịnọdụ na tebụl nke eze bụ otù ụdị nke onye mmehie agbapụtara, 2 Samuel 9:10; Luk 22:29, 30; Nkpughe 19:9

4. Devid rọpụtara ndị orù ijere Mefiboshet ozi, 2 Samuel 9:9-13.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ebere n’ihi Chineke

Ihe ndepụta banyere afọọma na ebere nke Devid nye Mefiboshet, onye sitere n’ụlọ Sọl, (ebe Sọl bụ onye iro kachasị njọ nke Devid) bụ ngosipụta nke ihe amara Chineke pụrụ ime n’obi nke mmadụ.

Devid ahụwo ahụhụ nke ukwuu n’ihi Eze Sọl ma ugbu a Sọl anwụwo, ma ndị fọdụrụ dị olenaole bụ ndị ga-eguzogide Devid ịrịgo n’ocheeze Israel. Mgbe Sọl nwụsịrị ndị èzínaụlọ Sọl ụfọdụ ka ụmụndịkom chèré na ha na-emere Devid ezi ihe gburu. N’ihi mmeso dị otú a, Mefiboshet tụrụ egwù maka ndụ ya, na aga egbu kwa ya onwe-ya. Mefiboshet nwere iruọma rii nne n’ihi na Devid bụ orù nke Chineke, Mmụọ nke Chineke dị ndụ bụ kwa onye ná-achịachị ná ndụ Devid. N’ihi na Devid chọrọ ịsọpụrụ Chineke ná ndụ ya, Chineke emewo ya eze, ka ewee chịa Israel nkeọma. (Lee Abù Ọma 78:70-72).

Chineke kwuru banyere onwe-Ya sị “O jigidegh iwe-Ya rue mgbe ebigh-ebi, n’ihi na onye ebere nātọ utọ ka Ọ bu” (Maika 7:18). Chineke nwapụtara nke a nime Devid, n’ihi na ọ bụ mmetuta nke Chineke ná ndụ Devid mere ka o meere Mefiboshet ebere. Devd nyere Chineke otuto nke ukwuu n’imere Mefiboshet ebere, ma gosipụta kwa nkeọma mkwesị na ụdị nke omume ya. (Lee 2 Samuel 4:10-12).

Ihenketa nke Furuefu

Mefiboshet onye ngwụrọ na-egosi ụdị mmadụ daraàdà na nweghachị nke ihenketa ya furuefu site n’ike na ebere nke onye ọzọ. Jonatan (nna Mefiboshet) na Devid agbaworị ndụ na mgbe Devid bụ eze na ọ gaghị èchéfu imere ndị èzinaụlọ Sọl ebere. Devid kwere mkwà ime nke a, ma o debere mkwà ya. (Lee I Samuel 20:15-17).

Ọ bụghị Mefiboshet kpatara mmehie Sọl, ma ọ hụrụ ahụhụ n’ihi ya. Otú a ka ọ dịrị mmadụ, n’ebe ọ bụghị ha kpatara mmehie nke nna ha Adam ma ha ahụwo ahụhụ n’ihi ya. Ekewapụrụ Mefiboshet n’ihenketa ya, o wee ghọọ onye achụpụrụ achụpụ, ma ná-ebi kwa n’óké egwù n’ihi ndị iro Sọl, n’ihi na Sọl leziri anya wee mejọọ Chineke.

Aha Mefiboshet pụtara “ihere” ma aha ọzọ ana-akpọ kwa ya bụ Meribeal nke pụtara “nnupuisi” (I Ihe Emere 8:34). Ọ dị ka Mefiboshet bụ nwa nkọcha, ọbụná rue n’aha ya. Lee ka o si yie nwoke mbụ ahụ bụ Adam!

Adam mehiere wee tụfue ihenketa ya, ya na èzínaụlọ ya wee tụfue ihenketa ha. Mmehie batara nime obi mmadụ, mkpụrụobi mmadụ wee gbachue ma daa ngwụrọ site ná mmehie ahụ. Mmadụ niile nọ n’okpuru ikpe ọmụma n’ihi njehie mbụ ahụ, ọ bụ ezie na ha amaghị ihe banyere ya. (Gụọ I Ndi Kọrint 15:21, 22).

Ime Udo

Anyị maara na ọ bụ iwu na ọchịchọ nke Chineke ka Ya na ndị mmehie dị n’udo. (Lee 2 Ndi Kọrint 4:20). Ọ bụ na Devid ebughị nke a n’obi, tinyekwara mkwà ya nye Jonatan, mgbe o mere ka ebere ya site n’ọnọdụ ịbụ eze ya rutu Mefiboshet? Site n’aka ònye ka óké mkpali dị mma otú a si abịa ma ọ bụghị site n’aka Onye ahụ nke ná-enye ezi onyinye niile ọ bụla? Eriri ogho uhie nke àtùmààtù Chineke maka nzọpụta sitere ná ndụ Jonatan wee kpalie Devid onye bụ ezi enyi ya. Otù eriri ogho uhie ahụ dịgidere ná ndụ Devid, ma anyị na-ahụ kwa Devid ka ọ na-esetịpụ aka ịdọta otù onye ọzọ n’eriri ịhụn’anya ndị ahụ.

Mefiboshet, onye achụpụrụ ma maa kwa ikpé, ka eze ahụ chọpụtara, ka ha wee mee udo. Nke a yiri mnwapụta nke onye mmehie, dịka ndị ozi nke Eze ahụ na-achọpụta ya bụ ndị nwere mmasị ịgwá ya oziọma nke imeudo. N’okwu niile nke Baịbụl ozi ahụ na-asi: “Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n’otù, nāgugh ndahie nile ha megide ha, Ọ debe-kwa-ra nime ayi okwu nke ime-ka-adi-n’otù ahu” (2 Ndi-Kọrint 5:19). N’ebe a ka ekpughere ebube nke ịhụn’anya Chineke n’ebe mmadụ nọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị nnupụ isi, ndị ajụrụajụ na ndị achụpụrụ achụpụ, ha pụrụ ime udo, ha na Onyenwe ha na Eze ha site n’ebube nke àmàrà Chineke.

Tebụl nke Eze ahụ

Devid nyere ndụmọdụ ka Mefiboshet ná-anọdụ na tabụl eze ahụ na n’ebe ahụ ka ọ ga ná-eri kwa nri-eze. Nke a bụ nsọpụrụ kachasị ukwuu Devid nwere ike inye ya, nke a kọwaara mmadụ dum na Mefiboshet nọ n’okpuru nchedo nke eze ahụ na onye ọ bụla mere Mefiboshet ihe ọjọọ na-akọcha ịdịukwuu nke eze ahụ n’onwe-ya.

Otù ihe a ka emekwara ọzọ ná ndụ nke ndị ná-anara okwu nke ịdịn’udo site n’aka ndị ozi nke Chineke ewee nábata ha n’Alaeze nke Chineke. Chineke ekwuwo na anyị na Ya ga-anọkọ na tebụl nke Ya, anyị ewee nwekọọ àkù nke alaeze Ya. E wepụtara eziokwu a n’ilu nke Nrianyasị Ọlụlụ nwunye nke Jisọs tụrụ, tinyere ebe ọzọ dị icheiche nime Akwụkwọnsọ. Jisọs kwuru na akpọrọ ndị ogbenye, ndị ọlụsi, ndị ìsì na ndị ngwụrọ n’oriri nke Chineke. Ndịa dị n’ụdị dị icheiche na-egosipụta ndị mmehie gaje ịnara ọkpụkpọ òkù nke Oziọma. (Lee Luk 14:16-24.) Otù aka ahụ, Jisọs kọwara na oge na-abịa mgbe Nnaukwu ahụ ga-ejere ndị orù Ya ozi: “Ngọzi nādiri ndi-orù ahụ, ndi mgbe onye-nwe-ha gābia, ọ gāhu ka ha nēche nche: n’ezie asim unu, na ọ gēke onwe-ya ihe-okike n’úkwù, me ka ha nọdu ná nri, ọ gābia kwa jere ha ozi” (Luk 12:37).

Dịka akpọrọ Mefiboshet ịnọ na tebụl eze, ọ bụghị na ọ lụrụ ọlụ ọ bụla nke kwesịrị àmàrà dị otú a, kama site n’ebere na eziomume nke onye ọzọ, otú a ka ọ diri onye mmehie. Ọ dịghị ihe dị nime ndụ onyemmehie nke ga-eme ka akpọọ ya òkù ịbịa nara àmàrà nke Chineke n’efu. Ọ bụ n’ihi eziomume nke onye ọzọ ka Chineke ji chọpụta onyemmehie, ọ dịghị onye ọzọ ma ọ bụghị Jisọs Kraist, náánị Ọkpara Chineke ahụ. N’ihi iziezi nke ọlụ Ya. Chineke emewo ka óké ịkpọòkù Ya rue ndị ogbenye, ndị ọlụsị, ndị ìsì na ndị ngwụrọ ịbịa keta òkè n’óké oriri Ya.

Nnyeghachị nke Ihenketa

Devid nyeghachịrị Mefiboshet ihe niile bụ nke Sọl na èzínaulo ya. O nweghachịrị ihenketa ya; ọ natara iruọma n’aka eze ya; o wee dị ka otù nime ụmụ ndịkom eze ahụ. Otú a ka ọ dịrị ndị ná-anata àmàrà Chineke. Ihe niile nke anapụrụ ha ka ana-enye kwa ha site n’iwu Eze. Ana-enye ha àmàrà na ebere iji mezue ọchịchọ ha niile, ha na-adị ka ụmụ nke Eze ahụ.

Akwụkwọnsọ na-achọpụta nke a: “Ma ka ha ra, bú ndi nara Ya, ha ka Ọ nyere ike ighọ umu Chineke, bú ndi kwere n’aha-Ya” (Jọn 1:12). Anyị na-agụ kwa: “Unu natara Mọ nke ido-ka-nwa-nwoke, Nke ayi nēti nkpu nime Ya, si, Aba, Nna. Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ-ayi nāgba àmà, na ayi bu umu Chineke: ma ọ buru na ayi bu umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ” (Ndi Rom 8:14-17).

Site n’ebe ndịa n’Akwụkwọnsọ anyị na-ahụ óké ebube nke ịdịmma Chineke n’ebe ụmụmmadụ nọ; ma anyị pụrụ ịghọta nkeọma ihe kpaliri Devid ime ka ebere ya site n’ocheeze ya rue onye a dara ngwụrọ nke ná-enweghị kwa inye aka.

Ihenlereanya nke Chineke

Jisọs kọrọ akụkọ banyere ndị nyere ndị agụụ na-agụ nri, kpuchie ọtọ nke ndị gba ọtọ, nyere ndị nọ n’ụlọmkpọrọ aka, o wee gụọ ha ná ndị lụrụ eziọlụ site n’imere Ya onwe Ya ebere. Mgbe ha jụrụ Ya oge ha ji nwee ohere imere Ya otú a, Jisọs zara ha sị “Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bu ndi dikarisi ntà, Mu ka unu mere ya nye” (Matiu 25:40). Nzaghachị a egosipụtawo òkè na ọlụ dịrị ezi nwa Chineke ọ bụla n’imeso ụmụnna ya na ndị agbataobi ndị ná enweghị ohere ọma dịka ya onwe-ya.

Devid gosipụtara ịbụ nwa Chineke n’ihi o nyere onye agụụ na-agụ nri, o chetara mkwà ya ma mezue kwa ya, o nyeghachịrị mkwà ihenketa ahụ furuefù, ọ rọpụtakwara nchebe nye aka ná-adịghị ike na ikpèrè nwụworoanwụ. Otú a ka ọ dị n’ebe Chineke nọ: Ọ na-enye anyị nri dị mkpà, ná-akasị anyị obi, ná-enye kwa anyị ndụ ebighịebi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Mefiboshet ji tụọ egwù ndị iro nna ya?
  2. Gịnị mere Mefiboshet ji tụfue ihenketa ya?
  3. Òlee ụzọ Mefiboshet ji bụrụ ụdị mmadụ dara àdà?
  4. Gịnị mere Devid ji nwee mmasị n’ebe Mefiboshet nọ?
  5. Gịnị mere Chineke ji enwe mmasị n’ebe ndị mmehie nọ?
  6. Ònye ka akpọrọ ka ọ nọdụ na tebụl Eze?
  7. Ànyị pụrụ ịnata ọkpụkpọ isoro rie nri na tebụl Eze?