Abù Ọma 51:1-19

Lesson 232 - Senior

Memory Verse
“Ọ buru na ayi ejéghari n’ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n’ìhè ahụ, ayi nēnwekọrita ihe n’etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya, nāsachapu kwa ayi nmehie nile” (I Jọn 1:7).
Cross References

I Ekpere Devid banyere Ịgụ Mmadụ n’Onye Eziomume

1. Ọ rịọrọ arịrịọ, dịka onyemmehie nwere obi ntiwa, maka ebere Chineke, Abù Ọma 51:1; Luk 15:11-24; 23:42; Maika 7:18, 19; Aisaia 43:25; 44:22

2. Mkwụpụta mmehie ya niile, na arịrịọ ka echichapụ ha, bụ eziokwu nke sitere n’obi ya, Abù Ọma 51:2, 3; 32:5; I Jọn 1:9

3. Ọ maara ịdịukwuu nke mmehie ya, Abù Ọma 51:3, 4; Ezra 9:5, 6; Ndi Rom 7:12, 13; 2 Samuel 12:13

II Ekpere Devid banyere Odudonsọ

1. Ọnọdụ nke imeobi ya doro ya anya, Abù Ọma 51:5; Jenesis 5:3; 6:5; Matiu 15:19; Mak 7:21; Jeremaia 17:9, 10

2. Ọ ghọtara na Chineke chọrọ ka ndị nke Ya dị nsọ, Abù Ọma 51:6; 24:3, 4; Matiu 5:8, 48; I Ndi Tesalọnaika 4:3; Ndi Hibru 12:14; 2 Ndi Kọrint 13:11; Jemes 1:4; Ndi Galetia 6:15

3. O kpere ekpere ka ehichapụ mmehie nke amụrụ ya nime ya ma kenyere ya obi dị ọcha, Abù Ọma 51:7-10; Ndi Efesọs 4:17-24; 5:25-27; Ndi Kọlọsi 3:10

III Olileanya Devid maka Òfùfè Obiụtọ

1. Ọ chọghị ịbụ onye ajụrụajụ dịka ọ maara na Sọl bụworo, Abù Ọma 51:11; 2 Samuel 8:15; Jọn 15:6; I Ndi Kọrint 9:26, 27; Matiu 8:12; 25:30

2. Ọ chọrọ ifè Chineke ma bụrụ kwa onye ná-erita mkpụrụobi n’urù, Abù Ọma 51:12, 13; Daniel 12:3

3. O kwere mkwà inye Chineke otuto mgbe azọpụtara ya site n’ajọomume ya niile, Abù Ọma 51:14, 15; 2 Ihe Emere 5:11-14

4. Ọ kọwara ụdị ọnọdụ nke obi egwepịara egwepịa na-enwe, Abù Ọma 51:16, 17; Aisaia 1:2-20; Luk 18:9-14

5. Mmetụta nke obi ya abụghị náánị banyere ya onwe-ya kama banyekwara ndị nọ n’okpuru ya gaje ịhụ ahụhụ n’ihi mmehie ya, Abù Ọma 51:18, 19; Ndi Galetia 5:9.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Dịka anyị na-amù ndụ Devid anyị na-achịkọta ọtụtụ ihe mmụta nke bara urù. Otù nime ihe ndịa na-abịa dịka anyị na-amù Abù Ọma nke a na ọnọdụ dị icheiche metụtara ya.

Devid amaworị iruọma nke Chineke ma bụrụ kwa orù nke Chineke kwesịrị ntụkwasịobi ọtụtụ arọ, ma ọ dara ọdịda dị njọ wee daba nime mmehie nke kachasị njọ. Ọ bụrụ na ọ bụghị ụdị mmadụ dị ka ya onwe ya, ọ ga-anọgideworị n’ọnọdụ ọdịda ya wee ghara ịgbalị isi nime ya pụta. Anyị kwesịrị nnọọ ikele Chineke na O nyewo anyị, tụkwasị akụkọ banyere mmehie nke Devid, akụkọ banyere nchègharị nke Devid na okwu nke gosịrị na agbaghaara mmehie nke Devid!

Mgbe onye ọ bụla nupụụrụ Chineke isi ma dapụ site n’iruọma Ya ọ na-aba nime ọnọdụ mmehie dịkarịsịrị njọ karịa nke amụrụ ya nime ya, n’ihi na mgbe mmụọ ọjọọ batara n’ụlọ azachara dozi kwa ọ ga, “chiri mọ-ibe-ya asa nke jọkari ya onwe-ya njọ … ọnọdụ ikpe-azu nke madu ahu bia jọkari nke-mbu” (Matiu 12:45). Devid amaworị iruọma nke Chineke na mbụ. O nweworị ihe jikọrọ ya na Chineke nke na, n’ụzọ ụfọdụ, ọ bara ụba ju kwa eju dịka onye ọ bụla ọzọ amaara aha ya nime Àgbà Ochie. Ọ bụ ihe ná-eme eme, n’oge ahụ, na ekpere ya banyere nweghachị ga-abụ maka iweghachị rue ebe dị elu nke eziomume na ịdịnsọ nke ọ matara na mbụ. N’ihi na o mere otú a egosighị na óké onyinye amara abụọ ndịa nke ịgụ mmadụ n’onye eziomume na odudonsọ zuruòkè bụ náánị otù onyinye amara. Nime Abù Ọma a anyị nwere ihe ngosi nke kachasị mma nke omume mmadụ ga-eji nata onyinye àmàrà abụọ ndịa, ọnọdụ mkpụrụobi tupu anata ha, na mkpụrụ nke aga-enweta mgbe anatazuru ha.

Ịgụ mmadụ n’onye eziomume site n’Okwukwe

Anyị matara na Devid, n’otù oge, enweworị mnwapụta nke ịgụ mmadụ n’onye eziomume n’ihi na ọ rịọrọ banyere inyeghachị ya. Anyị matakwara na ọ nataghachirị ya n’ihi na Netan sịrị, “JEHOVA emewo kwa ka nmehie-gi gabiga” (2 Samuel 12:13). Devid bịara n’ezi nchègharị, ná-emeghị ihe ọ bụla iji mee ka mmehie ya dị ntà n’anya Chineke maọbụ mmadụ. Ọ rịọrọ náánị ebere Chineke, ná-enweghị ezi ihe ọ bụla iji jaa onwe ya mma n’iru Chineke, ma ná-agụ onwe ya n’onye mmehie ya kachasị.

Ikpé mmehie abụọ kachasị njọ n’anya ọra mmadụ mara Devid, ma ọbụná mmehie ahụ ana-eleghara anya na-abụ ihe jọgburu onwe ya n’iru Chineke nwee kwa ike ikewapụ mmadụ n’ebe Chineke nọ ma iwezuga ya kpamkpam n’iruọma Ya. Devid emejọwo onyeagbataobi ya nke ukwuu; ma ọ bụ iwu nke Chineke ka o jehieworo nime ya ọ bụ kwa Chineke ka ọ na-aghaghị ịza ajụjụ nye. Ịjọnjọ na ịdịukwuu nke mmehie ya megide óké iwu ahụ nke Chineke eziomume, dị ebere, ju kwa n’ịhụn’anya buru ibu nke ukwuu n’iru ya na o kpuchirị ma o wepụghị mmejọ ahụ o mejọrọ onyeagbataobi ya. Ọ ghaghị ịkwụghachị ụgwọ n’ụzọ niile ọ bụla o nwere ike, ma ọ bụrụ na ọ ga-anọgide n’iruọma nke Chineke. N’ọnọdụ nke ya ọ dịghị ihe o nwere ike ime ebe ọ na-apụghị inyeghachị di nwanyị ahụ egburu egbu ndụ wee jikọta kwa èzínaụlọ ahụ nke o mere ka ọ gbasasịa.

Ọ bụrụ na mmadụ ezue ibe ya ori o mejọwo onye ahụ. Ma o mebiwo iwu nke obodo nke na, ọ ga-aza ajụjụ banyere iwu ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ emejọrọ chọrọ ka akwụghachị ya ụgwọ ọ ga-agba akwụkwọ n’ụlọ ikpé. Nke a n’ụzọ dị nkenke na-egosi ụgwọ anyị na-ejirita ibe anyị na ụgwọ ahụ nke karịrị anyị ji Chineke Eluigwe.

Nnwapụta nke ịgụ mmadụ n’onye eziomume, maọbụ mgbaghara n’ihi mmehie niile nke mmadụ ka ana-enye n’ihi ezi nchègharị dịka anyị hụrụ na ọ pụtara ìhè ná ndụ Devid. Amaara nnwapụta a n’aha dị icheiche, aha nke ọ bụla na-akọwa akụkụ ụfọdụ ọlụ ya nime ndụ onye ahụ nwere nchègharị.

ké mnwapụta a nke ime ka mmadụ na Chineke dị n’udo ka ana-akpọ mgbaghara mmehie (Aisaia 55:7). Onye na-achị achị na-enye mgbaghara ma, n’ebe a, ọ bụ Chineke na-enye ya onye mmehie nke nwere nchègharị. Agaghị èkpé kwa onye mmehie agbagharaworo mmehie ya gara aga ikpé. Kama Kraist anarawo ntaram ahụhụ nke ikpéọmuma ha.

Ịgụ mmadụ n’onyeeziomume bụ aha ọzọ eji mara óké mnwapụta a dị ebube (Ndi Rom 5:1). Onyeikpé na-agụ mmadụ n’onyeeziomume. Ịgụ mmadụ n’onyeeziomeme bụ ikwu na mmadụ bụ onye ná-enweghị ajọomume, maọbụ iwere mmadụ dịka onye ná-adịghị mgbe ọ bụla o mehiere. E nwere ike ịgbaghara mmadụ ma agaghị atụkwasị kwa ya obi ọzọ. Ma ọ bụrụ na agụọ mmadụ n’onye eziomume, ihe ọjọọ o meworo agaghị emetụta ọnọdụ ya n’ọdịniru. Dịka mgbaghara mmehie, ana-eme ya nye onye mmehie ahụ.

Ọtụtụ mgbe ka anyị na-ekwu banyere mnwapụta a dịka nchigharị maọbụ ịmụọzọ (Ọlu Ndi ozi 3:19). Nchigharị pụtara mmadụ ịbụ onye amụrụ site na Chineke. Nke ahụ pụtara na onye mmehie ahụ nke chègharịrị ka emere ka ọ bụrụ onye na-ekekọ ụdị nke Chineke, ịbà ná ndụ ọhụụ na ịbụ onye ekèrè ọhụụ. Ọlụ a ka ana-alụ nime onye mmehie ahụ chègharịrị.

Akụkụ ọzọ nke mmekọrịta ọhụụ nke a ka ana-egosi n’okwu ahụ, idokanwa (Ndi Galetia 4:4, 5). Onye ahụ amụrụ ọzọ ka akpọbatara nime èzínaụlọ nke Chineke. Na mbụ ọ bụrị nwa nke ọkụalammụọ -- nwa nke ekwensu -- ma ana-enye ya Nna ọhụụ -- ọbụná Chineke -- Ọ ghọwo kwa onye nketa nke ihe Eluigwe na ihe mnweta nke ndịnsọ.

Ụdị Abụọ nke Mmehie, na Ọgwụgwọ Ya

Ma ekpere nke Devid nye Chineke na-egosi na ọ matara na ọ dị ọlụ omimi nke àmàrà dị mkpà karịa nke mgbaghara mmehie kpuchirị. Ọ hụrụ onwe-ya ọzọ n’ọnọdụ nke ịdaàdà nime mmụọ, nke ọnọdụ onye ahụ ana-asachabeghị n’Ọbara nke odudonsọ ahụ. Mmadụ niile, ma ewezuga Kraist ka amụwororị n’ụdị nke na-enwe mmasị ime mmehie; n’ihi na mmadụ dum, ewezụga Kraist bụrị ndị sitere na nna ha, Adam. Kraist nwere ụdị nke ịdịnsọ n’ihi na Ọ bụ Ọkpara Chineke. Meri mụrụ Kraist dịka “ihe ahụ di nsọ,” ma ekwukwara na ọ bụ Ya bụ “nwa ahu di nsọ Jisus”, “Onye Nsọ nke Chineke” ahụ, ma “O nwegh mmehie.” Edekwara na “Ọ magh mmehie” ya na “O megh kwa mmehie ọ bula.” N’ụzọ dị otú a Ọ dị ichè ná ndị ọzọ amụrụ n’ụwa nke a. Amụrụ ndị ọzọ nime mmehie, mmehie dị kwa n’ụdị ha; ọ dị mkpà na aga-awụsị Ọbara nke nsacha.

N’ezi asụsụ nke Hibru ọ dị okwu abụọ nke na-akọwa ụdị ọsịsá mmiri dị icheiche, ma ana elezianya nkeọma otú esi eji ha ekwuokwu. Otù na-egosi ụdị ọsịsá ahụ nke ná-eru n’akụkụ na nime ihe ana-asacha wee sachaa ya nkeọma. Nke ọzọ na-egosipụta ụdị nsacha ahụ ná-eme ka náánị akụkụ anaahụ anya nke ihe ana-asacha dị ọcha. Site n’ọmụmaàtù nkọwa dị ebube, Devid ewerewo òkè nke mbụ wee mee ihe n’Abù Ọma a, ná-egosi na nsacha zuruòkè bụ ihe apụrụ ime -- n’akụkụ na nime -- site n’ọbara nsacha ahụ. Otù okwu ahụ ka Jeremaia ji kwa mee ihe mgbe ọ sịrị, “Sapu obi-gi n’ihe ọjọ, … ka ewe zọputa gi” (Jeremaia 4:14).

Ihe niile nke dị nime Ụlọikwuu, na kwa mkpọkọta niile nke Israel, emere ka ha dị ọcha mgbe onye nchụàjà ahụ ná ejéozi fesara ọbara nke àjà ahụ, onye na-ewere hyssop maka ya. Ákwá nke obi Devid bụ “I gēwere hyssop wepu nmehiem”, na-atụ nnọọ aka nsacha ahụ nke ana-enweta site n’Ọbara Mkpuchimmehie ahụ. Ọ chọrọ ọlụ alụziri alụzi, ọlụ zuruòkè, ma dị kwa njikere ime ihe ọ bụla dị mkpà ka ewee lụzue ya nime ndụ ya.

Ihe ná-egosi na Devid na-aga n’iru n’àtùmààtù nke nzọpụta karịa náánị mgbaghara mmehie nke o nweworo bụ na, anyị nụrụ ákwá ya, “Kèrem obi di ọcha.” O ji otù okwu ahụ nke ekwuru n’akụkọ banyere òkìkè ụwa, nke pụtara imepụta ihe site n’ihe ná-adịghị. Devid adịghị arịọ ka emee ka ike nke o nweworo sieike karịa, inyere ụdị nke adịghị ike ya niile aka, maọbụ idozi maọbụ ime ka ndụ eziomume nke aka ya dị mma karịa, site n’ịdịukwuu na ike nke Chineke. Ọ na-arịọ ka ekèè ya ọhụụ.

Site n’ọmụmụ, anyị niile rụrụarụ, ndị nwụrụanwụ nime njehie na mmehie dị icheiche. Ihe ahụ nke nwụrụanwụ apụghị ịdị ndụ ma ọ bụghị site n’ịgbànye ya ndụ nke sitere n’ike nke ọ na-enweghị. Ihe ahụ nke hụworo mmerụ adịghị adị mma ma ọ bụghị ma eji ihe dị ọhụụ dochie ya. Mmadu ochie ahụ adịghị agbanwe bụrụ mmadụ ọhụụ. Aghaghị “iyipu” mmadụ ochie ahụ. Mmadụ ochie ahụ apụghị ịbụ mmalite nke ndụ ọhụu. Ọ bụ n’ezie ihe mgbochi nye ndụ ọhụụ. Mmadụ ọhụụ ahụ, bụ nke “di nime Kraist Jisus” ka ana-aghaghị iyikwasị, ma ọ bụrụ na anyị ga-adị ka Kraist.

Baịbụl, n’ebe ọgụgụ niile ọzọ, na-ekpughe ụdị abụọ nke mmehie anyị na ụdị ọgwụgwọ abụọ arọpụtaworo. Ajọomume dị icheiche -- njehie niile nke anyị -- ka agbagharaworo; ma ndụ nke ajọomume -- anụarụ, ụdị ebumpụtaụwa -- ka anaasachapụ. Otú ọ dị, ajọomume dị icheiche -- maọbụ njehie dị icheiche -- ka ana-ekwu maka ha n’ịdị ọtụtụ, ebe ana-ekwu ihe banyere ndụ nke ajọomume -- anụarụ, ụdị ebumpụtaụwa -- n’otù. “Ọ buru na ayi ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu Onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa onye ezi omume, ka Ọ we gbaghara ayi nmehie-ayi (ọgwụgwọ nke mbụ), na isachapu kwa ayi ajọ omume nile (ọgwụgwọ nke abụọ)” (I Jọn 1:9). “Ọ buru na ayi asi na ọ digh mgbe ọ bula ayị mehiere” -- na anyị achọghị ọgwụgwọ nke mbụ ahụ -- ọ bụghị náánị na anyị na-eme Chineke onye ụgha kama anyị na-eme onwe-anyị ndị-àmà ụgha, n’ihi na mmehie ebumpụtaụwa na-egosipụta onwe ya (I Jọn 1:10; Ndi Galetia 3:22).

Ụzọ abụọ ndịa eji ewepụ mmehie ka apụrụ ịhụta nkeọma ná mpaghara ndị ọzọ nke Akwụkwọnsọ. Omume niile pụtara ìhè nke mmehie ka ana-aghaghị ịgbaghara (Aisaia 55:7), agbaghaworo (Mak 11:25; Ndi Efesọs 4:32), ewepụrụ (Abù Ọma 103:12), ehichapụworo (Aisaia 44:22), tụpụ n’àzú nke Chineke (Aisaia 38:17), ma ghara kwa icheta ha ọzọ (Ndi Hibru 8:12). Ma ọlụ àmàrà nke abụọ na-alụpụta ọtụtụ ihe-nlụpụta dị ichè n’usoro dị icheiche, n’ihi na site na ya ana-ebibi ọnọdụ ahụ nke imemụọ (Ndi Rom 6:6), gbue kwa ha (Ndi Rom 6:11), sụchapụ ha (Ezekiel 37:23; Ndi Efesọs 5:26, 27), ma mee ka ọ dị ọcha (Ọlu Ndi-ozi 15:9); ma ka ha ra bụ ndị emewooro ihe a na-adị n’otù (Jọn 17:17, 21, 23; Ndi Hibru 12:11; Ọlụ Ndi-ozi 2:1) ha dị kwa ọcha n’obi (Abù Ọma 24:4; Matiu 5:8).

Izùòkè na Ịgán’iru Nsọpụrụ Chineke

Eziomume bụ inwe oyiyi nke Kraist -- ịdị ka Kraist. Mgbe anyị na-étó n’àmàrà na n’amamihe nke Onyenwe anyị Jisọs Kraist, site n’ịgaijè n’ìhè ahụ dịka ekpughere ya nye anyị, anyị na-étó n’eziomume. Itó étó a na-amalite site n’ịkpọbata anyị nime èzínaụlọ nke Chineke, ma ọ dịghị akwụsị n’odudonsọ n’ihi na anyị na-aga n’iru inweta ìhè karịa, ihe ndịa niile ná-abịa site ná mnwapụta nke ịbụ onye Kraist anyị. Ma itó étó a abụghị mnwapụta nke odudonsọ, n’ihi na ana-anata mnwapụta a dị ebube n’otù ntabianya. Échìchè banyere nsacha bụ kwa nke ọlụ ahụ zuruòkè, n’ihi na mgbe asachara ihe ọ na-adị ọcha. N’ụzọ nke ọzọ ana-agụ anyị ná ndị zuruòkè mgbe anyị na-emezù ihe achọrọ n’aka anyị. Nwata ahụ nke so ná ndị nrọpụta mbụ n’ụlọ akwụkwọ zuruòkè ma ọ bụrụ na ọ na-emezu ihe ahụ achọrọ n’aka ndị ahụ nwere akàràùgwù nrọpụta mbụ ahụ, ọ bụ ezie na o zughịòkè dịka onye nwere ọnọdụ akàràùgwù nke asatọ kwesịrị ịdị. Mnwapụta ahụ nke odudonsọ zuruòkè, nke bụ nsacha pụọ ná mmehie ebumpụtaụwa, bụ otù ọlụ àmàrà nke ana-enweta n’otù ntabianya. Ma ọlụ nke izuòkè bụ ihe náaga n’iru.

E sitere n’ụzọ dị icheiche nime Akwụkwọnsọ gosi na odudonsọ zuruòkè bụ ihe ana-enweta n’otùntabianya. Ana-akpọ ya ibiugwù nke imemmụọ (Deuteronomi 30:6; Ndi Kọlọsi 2:11). Ọ bụ ọlụ nke nsụcha, nke edozirị iwezuga ihe ahụ nke nwere ike nke anụarụ site n’ụdị ya (Abù Ọma 51:7; Jọn 15:2). Ọ bụ ọlụ nke nsacha, ebe ọ bụ nzachapụ dịnsọ nke mmerụ niile pụọ ná ndụ (Abù Ọma 51:7; Ezekiel 36:26; I Jọn 1:9). Ana-arụtụ ya aka dịka ọlụ nke òkìkè, ná-ewebata ihe dị ọhụụ nime ndụ (Abù Ọma 51:10; Ndi Efesọs 4:24; Abù Ọma 33:9). Ma ana-akpọ kwa ya mbibì (Ndi Rom 1:6).

N’ebe a, kwa, anyị na-enwe ezi ihengosi site n’asụsụ mbụ niile nke eji dee Baịbụl. Onye ámààmá n’asụsụ Grik nke Agba Ọhụụ na-ede: “Mgbe anyị na-atụle ihe banyere ọlụ nke imekaadịọcha dị nime obi nke onye kwere ekwe … ma nime ịmụ ọhụụ na odudonsọ zuruòkè, anyị na-achọpụta na “aorist” (okwu na-egosi oge n’asụsụ Grik ma o nweghị okwu apụrụ iji kọwazie ya n’asụsụ Bekee) ka ọ fọdụrụ ntà ka ewere náánị ya dee ihe n’otù ụzọ. Mkpụrụ okwu a, dịka ndị ọkachamara nke ụtọasụsụ nke Agba Ọhụụ kwuru, adịghị egosi ọlụ nke ná-aga n’iru, maọbụ ihe ana-eme oge dum dịka ihe maworo mmadụ arụ, maọbụ ihe emeghachirị ọzọ, kama ihe emere n’otù mgbe ná mmezù.” Akwụkwọ ọkọwaokwu ọ bụla amaara nkeọma ga-ekwu na okwu ahụ ana-akpọ “aorist” n’asụsụ Grik nke ná-egosi oge ihe mere na atù aka otù oluokwu asụsụ Grik nke ná-egosi na ihe ahụ emere weere ọnọdụ n’oge gara-aga ná-enweghị mgbe, ná-enweghị kwa ihe mgbakwunye ọ bụla nke ná-egosi na ọ kanaaga kwa n’iru. Nime ùgbò iri asatọ na asatọ (88) ekwuru banyere ọlụ nke odudonsọ nime Agba Ọhụụ, ebe mkpụrụ okwu ndịa bụ, “nnucha” “idonsọ”, “nsacha”, pụtara iri anọ na anọ (44) nime ha dị na “aorist” dịka anyị na ahụ na ọ bụ ihe mere n’otù ntabianya n’oge garaaga. Ebe ndị ọzọ dị n’oluokwu nke ná-ezi ihe mere n’otù ntabianya maọbụ ihe na-aga n’iru, ma ọ dịghị otù ebe ná-egosi náánị ihe ná-eme aga-n’iru.

Ọ dịghị oge ọ bụla ekwuru n’Akwụkwọnsọ na ọ ga-agafe mgbe mmadụ chigharịrị tupu edozue mkpụrụobi ya nsọ. Náánị ihe dị mkpà tupu amalite ịchọ ịdịnsọ bụ ọnọdụ nke ịbụ onye agụrụ n’onye eziomume na onye ekèrè ọhụụ. Ọbụná “umu amuru ọhu nime Kraist” ka ana-adụ ọdu “iga n’iru n’izuòkè,” ka enyere iwu a, “Unu gādi nsọ n’ihi na nsọ ka Mu onwem di.” Okwu ahụ “Nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ,” dịrị onye kwere ekwe ọ bụla, ebe ọ bụ ndị chigharịrị, bụrụ kwa ụmụ amụrụ ọhụụ nime Kraist ka agwara okwu ahụ na mbụ. Ọ bụ òkè na ọlụ dịrị ndị kwere ekwe dum inwe obi asachara site ná mmehie ebupụta ụwa na inwe mmeju nime ịhụn’anya ngwangwa agụrụ ha ná ndi eziomume.

Mkpụrụ dị icheiche nke Eziomume

Ịmụọzọ na ezùòkè n’ihi na agbaghaara mmehie dum, onye ahụ chègharịrị ewee nweta udo nime Chineke. Ndị niile amụworo nime Chineke na-enwe ike ịdị ndụ nke mmehie ná-adịghị, ijé ijè nime ìhè nke Chineke, imeri ọnwụnwa niile site n’ụwa, anụarụ, na ekwensu ma dị kwa ndụ nke umeala ná-enweghị ntụpọ.

Odudonsọ zuruòkè bụ ịhụn’anya zuruòkè alụpụtaworo nime obi. Ọ na-asachapụ obi site ná mkpọrọgwụ nke mmehie, mmehie ebupụta ụwa ma mejue kwa obi ahụ n’ịdịnsọ nke Chineke. Ana-eweghachị oyiyi nke Chineke ahụ atụfururị. Mnwapụta a dị ebube ka ana-enweta n’otù ntabianya site n’okwukwe, ma ihe na-ebu ụzọ bụ ezi iji obichụàjà -- ọnọdụ nke náánị nwa Chineke pụrụ imezu. Ọ na-eweta inyechasị Chineke onweonye ma ná-ewepụ kwa mgbá ahụ nke anụarụ na-agba megide Mmụọ nke Chineke, ebe ọ bụ na ọ na-ewepụ uche nke “ya na Chineke di n’iro.” Uche nke anụarụ “edogh onwe ya n’okpuru iwu Chineke, n’ihi na apugh kwa ido ya n’okpuru ya.” Odudonsọ zuruòkè na-eme ka obi ahụ na Chineke na uche nsọ Ya dị n’otù.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Devid ji chee na ya mehiere megide náánị Chineke?
  2. Òlee ụdị omume Devid mere mgbe egosiri ya mmehie ya?
  3. Àgbaghaara Devid mmehie ya wee kpọghachi ya n’iruọma Chineke?
  4. Kwue aha dị icheiche ana-akpọ mnwapụta nke àmàrà mbụ nime Baịbụl.
  5. Gịnị ka emezuru n’obi mmadụ mgbe edoro ya nsọ?
  6. Kọwaa ụzọ dị icheiche Chineke ji alụọlụ nime anyị ime ka anyị zueòkè wee jikere izute Ya.
  7. Gịnị bụ izuòkè nke onye Kraist?
  8. Gịnị bụ ihe ná-egosi na odudonsọ bụ ihe ana-enweta n’otù ntabianya?
  9. Mụọ ma gụọ n’isi ụfọdụ amaokwu pụtara ìhè nime Abù Ọma a.
  10. Gịnị bụ omume ikpeazụ Devid dịka ọgwụgwụ Abù Ọma a gosịrị?