Abù Ọma 1:1-6; 15:1-5; 24:1-10

Lesson 233 - Senior

Memory Verse
“Ngọzi nādiri ndi di ọcha n’obi: n’ihi na ndi ahu gāhu Chineke” (Matiu 5:8).
Cross References

I Ụdị ndị Mmehie Atọ nime Ụwa

1. Ndị ná-emebiiwu na-arapụ Chineke ná ndụ na àtùmààtù ha, Abù Ọma 1:1; Ndi Efesọs 2:12

2. Ndị mmehie ndị ná-akpachapụ anya ná-emebiiwu Chineke, Abù Ọma 1:1; Jenesis 13:13

3. Ndị ná ákwáemo ná-eleda kwa nsọpụrụ Chineke anya, Abù Ọma 1:1; Ilu 22:10

II Onye ahụ Nwereọñụ

1. Ọ na-ezè ụzọ ndị mmehie, Abù Ọma 1:1

2. N’iwu Chineke ka iheụtọ ya dị, Abù Ọma 1:2; Ndi Filipai 4:8

3. Ọ ganiru ya ka eji tụnyere mbibi nke ndị mmehie, Abù Ọma 1:3-6; Jemes 1:25; Matiu 3:12

III Onye ahụ nke Ná-eme Eluigwe Ebe Obibi Ya

1. Ọ na-eje ijé na ndụmọdụ nke Jehova, Abù Ọma 15:3

2. Ọ na-ahụ onyeagbataobi ya n’anya ná asọpụrụ kwa ndị ná-asọpụrụ Chineke, Abù Ọma 15:3, 4; I Pita 4:8

3. Asachapụwo anyaukwu niile n’obi ya, Abù Ọma 15:5; Luk 12:15

4. Ọbụaka ya abụọ emeghị ihe ọjọọ, obi ya dị kwa ọcha, Abù Ọma 24:1-10

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ịchụso Ọñụ

Okwu ahụ bụ “ihe nāgara nke ọma” nime Abù Ọma a pụtara “ọñụ.” N’ihi nke a anyị na-achọpụta nime amaokwu ndịa ihe mmadụ ga-eme iji nweta ezi ọñụ. Ịchọ ọñụ emewo ka mmadụ gafee ala ùzùzù ahụ dị ọkụ nke Sahara, gabiga kwa ugwu Alaska ahụ nke snow kpuchiri. Ọtụtụ mmadụ achọwo ọñụ n’etiti ìgwè mmadụ ndị ná-enwe añụrị nke obodo anyị jupụtara na mmadụ, ndị ọzọ na-ewezuga kwa onwe ha ibi n’ebe dị iche ewuru nye ndịkom ndị nọ n’okpuru mkwà nke okpukpé ha. Iheọmùmù na omume nzuzu ná-esite n’otù agụụ ahụ nke dị nime mmadụ -- ịchụso ọñụ. Ma ọñụ abụghị na abaraụba maọbụ na adara ogbenye, ọ bụghị kwa site n’iheọmụma na amaghị ihe. Nzọụkwụ nke mbụ n’ịchọ ọñụ bụ ịjụ ndụmọdu nke ndị ná emebiiwu, isi n’ụzọ ndị mmehie chịgharịa, wee malite ịchọ Chineke.

Mkpafu nke Mmehie Na-eweta

Ụzọ mmadụ atọ ka akpọrọ aha nime amaokwu mbụ nke Abù Ọma a -- ndị ná-emebiiwu, ndị mmehie, na ndị ná-ákwáemo. Ọnọdụ atọ ka akpọrọ aha nke ná-emetụta ụzọ mmadụ ndịa -- ịga-ijè, iguzoọtọ, na ịnọdụala. Nkọwa nke a na-egosi otú mmadụ si akpafu ná mmehie. Nke mbụ ya na ndị ná-emebiiwu ná-agakọrịta -- mmadụ ndị ná-abamibeghị ná mmehie pụtara ìhè, ma náánị na ha enweghị Chineke. Ha pụrụ ịbụ ndị ọ na-ezute ebe ọ na-alụọlụ, ndị ná-akpọ ya ijé ịkùazù n’ụbọchị Onyenwe anyị mgbe o kwesịrị ịnọ n’ụlọụkọ. Nke abụọ, anyị na-ahụ ya ka ọ na-eguzo n’ụzọ ndị mmehie. N’ebe a ọ na-akwụsị ijè ya wee soro ndị ahụ ná-eme mmehie pụtara ìhè. Ya na ha ịnọkọta na-atọ ya ụtọ wee ná-achọpụta na mgbe ná-adịghị anya na ya naeso ụzọ ha, tutu rue mgbe ọ ga-anọ n’ọnọdụ ndị ná-ákwáemo, ná-eji ihe niile ziriezi na ihe dị nsọ ná-eme ihe ọchị, ná-akpọ kwa òzízí niile nke dị na Baịbụl asị. “Nkparita nile ọjọ nēmebi omume ọma” (I Ndi Kọrint 15:33).

Isi Obiụtọ

Onye ahụ nwere ọñụ bụ onye nke ná-eze ihe ọjọọ, ná-ewezuga kwa onwe-ya na ndụmọdụ nke ndị ná-emebiiwu. “Abala n’okporo-uzọ ndi nēmebi iwu, aga-kwa-la n’iru n’uzọ ndi ọjọ. Zere ya, agabigala nime ya, wezugara ya onwe-gi, gabiga” (Ilu 4:14, 15). Ma obiụtọ karịrị náánị izere ụzọ niile nke ndị mmehie. Ọ dị ihe dị mkpà aga-eme. “N’iwu JEHOVA ka ihe-utọ-ya di; ọ bu kwa n’iwu-Ya ka ọ na-atughari uche ehihie na abali.” Ọ bụrụ na iheụtọ mmadụ dị n’Iwu Jehova nke ahụ pụtara na onye ahụ ga-erubeisi n’Iwu ahụ. Ọ bụrụ na ọ na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị, Iwu ahụ ga-ebi nime ya. Ịtụgharị uche n’Iwu nke Chineke abụghị inwe nzọpụta; kama ịmụ ihe edere n’Iwu ahụ na-ekpughe Kraist ná-egosi kwa ihe achọrọ na ngọzi niile nke óké àtùmààtù nke nzọpụta. Mmadụ ikwere na ya bụ onye mmehie site n’ezi nchègharị ná mmehie ga-eme ka ọlụ àtùmààtù nke nzọpụta malite, nke bụ ebe ndụ ọñụ dị nime ya na-amalite.

ké ihe dị iche dị n’etiti ndị sitere n’ụzọ dị otú a mee ka ha na Chineke dị n’udo na ndị ná-emebiiwu, ndị sitere n’ụzọ nke aka ha ná-achọ ọñụ nime ụwa. Ndị eziomume dị ka “osisi akuworo n’akuku iyi juputara na miri, nke nāmi nkpuru-ya na mgbe-ya” ma ndị ná emebiiwu “di ka igbogbo-ọka nke ifufe nēfesa.” Ndị ná-emebiiwu pụrụ ịchọ ụzọ iji chebe onwe-ha nime ụwa nke a; ha pụrụ ịkwụnye ego dị ukwuu n’ụlọ ọlụ dị icheiche banyere ihe ọ bụla ga-adakwasị ha; ma mgbe ifufe na-efé ha na-agabiga dịka igbogboọka. Ndị eziomume pụrụ inwe ihe olenaole jikọrọ ha n’ụwa a, ma mkpọrọgwụ ha niile siriike ná ndụ ebighịebi. Aga-agbanwe ha n’otù ntabianya ma ha ga-enwupụ dịka kpakpando rue mgbe ebighịebi.

“Uzọ di nke ziri ezi n’iru madu, ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu” (Ilu 14:12). Ọtụtụ atụwo àtùmààtù ndụ ha -- gbasoo kwa ụzọ nke aka ha ná ndụ a -- ná-enweghị Chineke; ma ebighịebi ga-ekpughe ihenzuzu nke ụzọ niile ha. “JEHOVA mara uzọ ndi ezi-omume: ma uzọ ndi nēmebi iwu gāla n’iyi.”

Ọbụaka Abụọ Ná emeghị Iheọjọọ na Obi Dịọcha

“Ònye garigo n’ugwu JEHOVA? Ònye gēguzosi kwa ike n’ebe nsọ Ya?” (Abù Ọma 24:3). Ajụjụ a nke pụtara, “Ònye ga-eme elu-igwe ka ọ bụrụ ebe obibi-ya?” ka azara: “Onye nwere ọbụ-aka abua nēmegh ihe ọjọ, na obi di ọcha. … ” Mgbe amụrụ mmadụ ọzọ, Mmụọ Nsọ na-agba àmà na ọ bụrụwo nwa Chineke; ọ dịghị kwa ihe mgbagwojuanya dị na nke a. Ihe ịtaụta adịghị ná ndụ ọ na-ebi -- o nwere ọbụaka ná-emeghị ihe ọjọọ. Agbagharawo ya mmehie niile ya, mee kwa ka o nwere onwe-ya, ma ụdị nke mmehie ahụ amụrụ ya nime ya ka fọdụrụ n’obi ahụ. Eketara ụdị nke mmehie a site n’ọdịda nke Adam, ana-akpọ kwa ya ụdị nke Adam mgbe ụfọdụ. Mgbe amụrụ mmadụ ọzọ ana-emeri ụdị nke mmehie ahụ mee kwa ka ọ dị n’okpuru ike ọmụmụ ọhụụ nke Chineke nke batara n’obi ahụ; ma ụdị nke Adam ochie ahụ dị nime ya, ọ ga-achọ kwa iwepụta onwe-ya ìhè ma ewezuga na ọmụmụ ọhụụ ná-ejide ya n’okpuru. N’odudonsọ Ọbara nke Jisọs Kraist na-eropụ ụdị nke Adam ahụ, ma bibie kwa ya. Mbibi a zuruókè nke mmehie nime obi na-eme mmadụ ka ọ dị ọcha dị kwa nsọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka izuike ahụ, nke ọ bụ náánị ndị ahụ natara ya pụrụ ịghọta, na-abata nime obi ahụ.

Mmadụ Ịjụ Onwe ya

Otú ọ dị, mgbe edosịrị mmadụ nsọ, o wee pụọ ná mmehie, ọ fọdụrụ ndụ anụarụ nke aga-ebuso agha. Pọl Onyeozi kwuru sị, “Anamanwu kwa-ụbọchị” Ọ bụ ndụ anụarụ ka ọ na-eme ka ọ nwụọ. Mgbe ụfọdụ kama ịnwụ kwa ụbọchị n’ebe anụarụ na ihe ọ bụla megidere uche Chineke dị ma ọ dị ukwuu maọbụ ntakịrị, ndị mmadụ, ga-etufu Okwu Chineke ahụ pụọ n’obi ha, mgbe ihe siriike. N’ụdị ọnọdụ ndapụ dị otú a, ụdị nke mmehie ochie ahụ ga-apụta kwa ìhè ọzọ. Agwara anyị ka anyị nyochaa onweanyị ma anyị nọ n’okwukwe ahụ. Abù Ọma nke irinaise bụ ezi ihe ndú nye mmadụ iji nyochaa onwe-ya.

Mmadụ Inyocha Onwe ya

“Onye nke … nēkwu ezi-okwu n’obi-ya.” Ọ dị ndị iru ha na ágbáàmà megide ha ná-egosi kwa na ha enweghị eziokwu ahụ n’obi ha. Ọ dị mkpà mmadụ ikwu eziokwu n’obi ya -- ọ bụghị iwepụ, maọbụ ịtụgharị, maọbụ ịgbanwe ya, maọbụ ịchọ ụzọ ịgbanarị eziokwu a maọbụ nke ọzọ, kama ịnara ọnọdụ ọ bụla site n’obi ghere oghe. Onye ahụ nke ná-ekwu eziokwu n’obi ya bụ onye nweere onwe-ya na onye ndụ ya ghere oghe; ọ dịghị ihe ọ bụla ọ na-achọ izobe.

“O jigh ire-ya kwue okwu-azu. …” Ọ dịghị okwuazụ maobụ okwuọjọọ dị; ọ dịghị nkwulu dị, maọbụ ntámù, maọbu ịchọpụta ihe ịtaụta, n’obi nke onye ahụ ga-ebi n’ụlọ Chineke maọbụ n’Ugwu Nsọ Ya. Ọ dị mma ka anyị mara eziokwu ahụ taa karịa ịbụ ndị aga-arapụ ná Nwelikọ nke Nzụkọ Kraist ahụ. Ọtụtụ mmadụ ga-agbalị iwedata mmadụ ibe ha ala n’anya ndị ọzọ. O kwesịghị ka ahụ nke ahụ n’ebe onye bụ nwa Chineke n’ezie nọ. O nwere ihe dị n’obi ya nke ga-eme ihe ziriezi mgbe ọ bụla. O nwere ike ịhụ na ịnụ na emewo ihe ọjọọ, ma ọ dịghị ekwusasị ya. Ọ bụrụ na ọ pụghị idozi okwu dị n’etiti ya onwe-ya na nwanna ya ọzọ, ọ ga-ejekwuru ndị enyere ike nime Nzukọ Kraist, bụ ndị kwesịrị ekwesị ileba ya anya. Ọ bụghị náánị na onye Kraist na-ewezuga onwe-ya n’ikwu okwu banyere onye agbataobi ya, kama ọ na-elezi kwa anya ka ọ ghara ige ndị ná-eme otú ahụ ntị. Ọ dịghị ebuli maọbụ nábata iheịtaụta megide onye agbataobi ya. Ọtụtụ mmadụ ekwewo ka eziokwu ahụ si n’obi ha pụọ site n’ige ntị n’ire ná-ekwu okwuazụ.

“Ọ ñuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ digh-agbanwe okwu-ya.” Ọ dị oge ná-adị ná ndụ onye Kraist ọ bụla mgbe ohere na-apụtara ya ịñụ iyi nke ga-emejọ onwe-ya, ma ghara ịgbanwe okwu ya. Nke a pụtara na ọ gaghị esite n’ọnọdụ eziomume ya laa azụ n’iru Chineke ka o wee gbanarị ahụhụ maọbụ ọnọdụ ụfọdụ siriike nke ná-abịakwasị ya. N’iji maa àtù, o nwere ike imeworị ka ike ya ra; ọ pụrụ ijeworị ijè n’izuòkè ma mee kwa ihe ziriezi; ma ná-enwe kwarị mkpagbu. Ọ pụrụ ịnọ ná-eche échìchè banyere nke a sị “Eleghi anya ebuwom ihe a gabiga ókè”, wee malite ịla azụ site n’ụzọ dị otú ahụ. N’otù mgbe ahụ ọ “na-agbanwe.” Onye ahụ nke “ñuworo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya” adịghị achọ ịtụkwasị onye ọzọ ịtaụta maọbụ tinye onye ọzọ ná nsogbu. Ọbụná ma asị na ọ ghọtaghị, ọ ga-aka ya mma ịhụ ahụhụ karị ime ka onye ọzọ hụ ahụhụ.

“O nyegh ego-ya inara uma, ọ naragh kwa ihe iri-ngo megide onye nēmegh ihe ọjọ.” Akọnauche ná-enweghị ịtaụta bụ ihe-ndebeisi dịkarịsịrị bịalị bịalị nke mmadụ pụrụ idobe isi-ya. Onye ná-eme eziomume apụghị kwa ime ihe ọjọọ n’otù mgbe ahụ. Onyenwe anyị na-anụ ákwá ndị ana-akpagbu, na-ekpé kwa ndị ná-aghọgbu ndị ogbenye ikpé. “Uzọ ndi nēmebi iwu gāla n’iyi.” Ego ahụ enwetara site n’ụzọ iringo na ịnaraụma ka aga-arapụ n’azụ n’oge ná-adịghị anya, ndị ná-emebiiwu ga-ala kwa n’iyì ebighịebi.

Lee ka nke a sị dị iche n’ebe onye eziomume nọ! “Onye nēme ihe ndia, agagh-ewezuga ya n’ọnọdu-ya rue mgbe ebigh-ebi.” Ọ na-eguzosiike ná ndụ a, ná-añụ iyi nke ga-emejọ ya onwe-ya ma ọ dịghị agbanwe okwu ya, ọ gana-ebi kwa rue mgbe ebighịebi n’Ugwu Nsọ ahụ -- ebe ahụ nke Chineke na-edoziri “ndi huru ya n’anya.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka ọbụaka abụọ ná-emeghị ihe ọjọọ pụtara?
  2. Gịnị ka obi dịọcha pụtara? Òlee onyinyeàmàrà ná-eweta obi dịọcha?
  3. Gịnị ka eji tụnyere onye ná-emebiiwu? Onye eziomume?
  4. Nye ọmụmáàtù nke ịñụiyi nke ga-emejọ gị.
  5. Gịnị ka ikwu eziokwu n’obi gị pụtara?
  6. Kwue ụzọ abụọ aga-eji nweta ọñụ.
  7. Gịnị bụ Iwu Onyenwe anyị?
  8. Gịnị ka ị ga-akpọ “ikwuokwu azu” na “ịtaụtá”?