Abù Ọma 8:1-9; 19:1-14; 119:1-24

Lesson 234 - Senior

Memory Verse
“JEHOVA, onye-nwe-ayi, Le otú aha-Gi di ebube n’uwa nile!” (Abù Ọma 8:9).
Cross References

I Ịsọpụrụ Onyeòkìkè site n’ihe niile Èkèrèèkè

1. Devid jiri olu dị elu náàjá ịdị mma nke Chineke, Abù Ọma 8:1, 2; Matiu 21:10, 11, 15, 16

2. Ọ na-atụgharị uchè maka usoro nke ùsù niile nke eluigwe, Abù Ọma 8:3; Aisaia 40:26; Ndi Rom 1:20

3. Échìchè ya na-atụgharị banyere mmadụ efù, Abù Ọma 8:4; Ndi Rom 1:25

4. Mgbe ahụ o wee ná-échè échìchè banyere Kraist na òkìkè ọhụụ ahụ, Abù Ọma 8:5-9; Ndi Hibru 2:6-9

II Ibuli Chineke elu site n’Ịdịebube nke Ọlụ Ya niile

1. Ihe niile O kèrèèkè na ekpughe ebube Ya ná-egosi kwa nghọta ukwuu Ya, Abù Ọma 19:1, 2; 98:7, 8; Aisaia 55:12

2. Ọlụ Ya niile na-eto Ya rue nsọtụ niile nke ụwa, Abù Ọma 19:3-6; Aisaia 55:11

III Mbulielu nke Chineke site n’Ebube Niile nke Okwu Ya.

1. Iwu nke JEHOVA zuruòkè, Abù Ọma 19:7-10

2. Ụgwọọlụ riri nne dị n’idebe Iwu ahụ niile, Abù Ọma 19:11-14; Luk 10:15-28

3. Okwu ahụ nime obi bụ ezi nchebe megide mmehie, Abù Ọma 119:1-24

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Mkpughe ahụ

N’ọtụtụ abalị, mgbe ọtụtụ kpakpando na-enye ìhè n’ebe niile dịka Devid na anọdụọdụ n’akụkụ ugwu ná-eché atụrụ ya niile nché, ọ na-atụgharị uche ya n’ịmamma nke ùsù niile nke Eluigwe wee chee kwa échìchè banyere Onyendozi nke ụwa nke dị ukwuu otú a. “Elu-igwe” ka ọ sịrị “nākọ nsọpuru Chineke; ọ bụ kwa ọlu aka Ya ka mbara elu-igwe nēgosi” (Abù Ọma 19:1). Ọtụtụ ndị òzízí nke taa ndị nwere óké nghọta nke nchọpụta, enweghị ike site n’iji ihe eji ele ihe dị anya (Telescope) na ihe nchọpụta nke iheọmụmá (Science) dị icheiche hụ dịka Devid hụrụ mgbe o jiri anya nke okwukwe gafee ihe ekèrèèkè rue Onye nke kachasị ihe niile elu bụ Onyeòkìkè. Ọtụtụ mgbe, ndị ná-ede akwụkwọ na-ewere ebube nke ihe Chineke kèrè nye òzízí nke iheọmụmá (science) nke ihemmụta nke mnwogharị nke mmadụ (Evolution).

Okwu Chineke na-agwa anyị sị, “N’ihi na ihe-Ya anya nāhugh site n’òkìkè uwa ka anāhu nke-ọma, ebe anāghọta ha site n’ihe nile ekèrè èkè, bú ike ebigh-ebi Ya na udi Chineke Ya; ka ha ghara inwe ngọpu n’ihi na, ọ bu ezie na ha mara Chineke, ma ha enyegh Ya otuto dika Chineke, ha ekelegh kwa Ya; kama emere ha ihe-efù n’ihe nile ha nātule n’obi ha, obi-ha nke nēnwegh nghọta gbakwara ọchichiri. Mgbe ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu” (Ndi Rom 1:20-22). Ọtụtụ ndịnzuzu n’otù n’otù asịwo taa na ọ dịghị Chineke dị. Otú ọ dị, Chineke na-adị rue mgbe ebighịebi, Eluigwe Ya niile na-egosi kwa ebube Ya.

Enweghịnsọtụ

“Le kwa idi-elu kpakpando, na ha di elu!” (Job 22:12). Mmadụ nọ kwa ná-eme nlebàanya nchọpụta nimeime óké mbara dị icheiche nke Eluigwe niile wee ná-ahụ ọtụtụ kpakpando dị n’ebe dị anya nke ukwuu nke na ọ karịrị échìchè nke mmadụ. Agwara anyị na otù nime kpakpando achọpụtara n’oge ná-adịghịanya garaaga dị nnọọ óké elu nke na ọ bụrụ na anyị na-aga ihe ra ka ‘maịlị’ iri puku asatọ na isi (186,000) n’ọsọ nke ìhè ji aga, ọ ga-ewe anyị arọ nde abụọ na iri ise (250,000,000) iji rue ebe ọ dị. O jughị anya na Devid sịrị, “Mgbe m’huru elu-igwe-Gi, bú ọlu nkpisi-aka-Gi, ọnwa na kpakpando nile nke I doziworo; gini ka madu bu, na I nēcheta ya?” (Abù Ọma 8:3, 4). Ma otú ọ dị Chineke n’obi ebere Ya agwawo anyị na Ya ga-ebinyere onye obi umeala, na onye nke nwere obi etiwaraetiwa na nke egwepịaraegwepịa. Onyeòkìkè nke Eluigwe na ụwa, na-enyocha kwa échìchè niile na nzube niile nke obi mmadụ, ka o wee gosi onwe Ya onye dị ike nye ndị ahụ niile obi ha zuruòkè n’ebe Ọ nọ.

“Agagh-agu ùsù ihe di n’elu-igwe ọnu”, (ma-ọbu “Apughị ịguta ùsù nile nke elu-igwe ọnu), na otú agagh-atùta ájá nke óké osimiri” (Jeremaia 33:22). N’ọtụtụ oge dị icheiche nime ọtụtụ arọ nke mgbe ochie mmadụ na-agụ na-agbakọta kwa ọtụtụ kpakpando; ma mgbe amalitere iji teleskop (telescope) nyoo ihe, mmadụ pụrụ ịhụ ugbu a ndè iri anọ (40,000,000) kpakpando bụ ndị ahụ niile apụrụ iji anya ghere-oghe hụ. Oge ọ bụla emepụtara telescope ọhụụ nke nwere ike ka nke mbu, nnukwu mbara eluigwe nke jupụtara n’ọtụtụ kpakpando na-apụta, tụtụ rue taa ndị ahụworo eruela ijeri abụọ (2 billion). Ma ònye maara òle kafọdụrụ zoroezo site n’anya nke mmadụ? “Ònye kwa ka unu gāsi na Mu yiri ya, M’we ra ka ya? Ka Onye Nsọ nāsi. Welienu anya unu elu, hụ ọ bụ Ònye kèrè ihe ndia? Ọ bu Onye ahu nke nēme ka usu ha puta n’ọnu-ọgugu ha nile n’aha-ha ka Ọ nākpọ; site n’iba-uba nke ike-Ya, na n’ihi na Ọ nwere ume n’ike, ọ digh ihe fọduru nke anagugh.” (Aisaia 40:25, 26). Ọbụná n’óké ịdịọtụtụ dị otú a, otú ọ dị, kpakpando ọ bụla dị iche site n’ibe ya. Ichè échìchè na Chineke nwere aha nye ha niile bụ kwa nnọọ óké ihe ebube nke karịrị uche mmadụ! “Otù ebube nke anyanwu di, ebube ọzọ nke ọnwa di kwa, ebube ọzọ nke kpakpando di kwa; n’ihi na otù kpakpando di iche n’aru kpakpando ọzọ n’ebube” (I Ndi Kọrint 15:41). Ma ha niile na-egosi ebube Chineke anyị.

Njèm

Kwa iri áwà abụọ na anọ ụwa na-agba gburugburu zuruezù n’elu ahịrị ya. Nke a pụtara na ọ bụrụ na mmadụ nọ n’etiti ụwa ebe ana-akpọ ikwetọ (equator) ọ ga-aga njèm ruru puku maịlị iriabụọ na ise (25,000) nime iri áwà abụọ na anọ site ná ntụgharị nke ụwa. Ọ bụghị náánị na ụwa na-atụgharị n’ahịrị (axis) ya ma n’arọ ọ bụla ọ na-aga njèm n’okporo-ụzọ ya gburugburu anyanwụ, ihe karịrị nde maịlị isii (600,000,000). Dịka àgàasịrị na njèm nke a ezughi, ùsù nke ihe niile ekèrè-èkè dị anyanwụ gburugburu na-erichapụsị ọsọ na mbara igwe n’ọtùtù ọsọ ra ka nde maịlị anọ (400,000,000) n’otù arọ. Chee nnọọ échìchè banyere njèm nke a -- ihe ra ka puku maịlị abụọ (2,000) n’otù nkeji nke onye ọ bụla n’eluụwa ná-añagharị, ma otú ọ dị anyị adịghị-enwe mmetụta n’arụ nke ọmajijiji maọbụ inye onwe anyi nsogbụ ịma ihe banyere óké mgbagharị n’ọsọ dị otú ahụ. Ụgbọmmiri na-asọkọrịta isi n’òkè osimiri, ụgbọ elu otùaka ahụ na mbara igwe, ụgbọoloko na-akụkọrịta n’okporo-igwè, moto na-asụpịasị n’elu ibe ha n’okporoụzọ anyị niile; ma ndekwurunde ihe Chineke kèrè èkè n’eluigwe na-agba ọsọ karịa otú ọ bụla mmadụ pụrụ ichè, (maọbụ karịa dịka mmadụ pụrụ ịrọ ná nrọ) ma “ọ dịghị otù na-ada.” Chee échìchè banyere óké abadaba ịdị-arọ nke ụwa anyị bi nime ya nke na-akwụ efekefe n’ifufe na-adịghị ihe na-ejide ya aka, na ike nke dị mkpà iji ná-eme ya ka ọ na-aga njèm n’ụzọ ya niile -- “Ọ nēkokwasi kwa uwa n’ihe nābugh ihe” (Job 26:7).

Devid kwuru okwu banyere otú anyanwụ si agagharị, wee sị na ọ “di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n’ulo-ndina-ya puta, obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike igbaso uzọ ya. Site n’otù nsọtu elu-igwe ka nputa-ya di, igba gburugburu-ya diru kwa nsọtu-ya nile: ọ digh kwa ihe ezonariworo okpom-ọku ya” (Abù Ọma 19:5, 6). Onyenwe anyị gwara Job okwu banyere njégharị nke ùsù nke eluigwe: “Ị nēkekọta iru utọ-Pleiades, ma-ọbu tọsa ihe-ọdudọ nile nke Orion? Ì nēme ka Mazzroth puta na mgbe ya? Ma-ọbu ì nēdu Bear na umu-ya? Ị mawo ùkpùrù nile nke elu-igwe?” (Job 38:31-33). Mgbe anyị na-atụle njèm niile ndịa na nhazi zuruezù nke ndahie ná-adịghị na ya nke ùsù ihe ndịa ekèrè-èkè na-aga njèm -- ọbụná klọk anyị niile ndị ná-aga nkeọma ka edoziri dịka njèm kpakpando si aga -- anyị apụghị ime ihe ọzọ ma ọ bụghị iti mkpu sị, “Onye uku ka JEHOVA bu, Ọ bu kwa onye anēto nke uku; ọ digh kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya” (Abù Ọma 145:3).

Okwu nke Chineke

Ọ bụ ezie na òkìkè na-ekpughe otù Onyeòkìkè dị ukwuu, Chineke ekpughewo kwa Onwe Ya n’ọtụtụ ụzọ ọzọ, na site kwa n’ihengosi pụtara ìhè nye mmadụ, site n’oge ịtọ ntọala ụwa rue kwa ugbu a. Tupu Adam emehie, Chineke soro ya jégharịa n’ogige Iden. Mgbe ọdịda ahụ mesịrị, mgbe mmehie batara n’ọgbọ niile nke ụwa, Chineke gara n’iru igosi mmadụ Onwe-Ya na uche nsọ Ya niile. Chineke kwuuru ndịamụma okwu wee kpughee onwe-Ya nye ha n’ọhù na nrọ dị icheiche. Agwara anyị, “N’ihi na ọ digh amuma ọ bula nke eji ọchichọ madu bu mgbe ọ bula: kama madu sitere na Chineke kwu okwu, mgbe Mọ Nsọ nēme ka ha kwue” (2 Pita 1:21). “Chineke, mgbe Ọ gwarari nna-anyi-hà okwu n’oge ochie nime ndi-amuma n’iberibe-akwukwọ di iche iche na uzọ di iche iche, Ọ gwara anyi okwu n’ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n’aka Ya me uwa nile” (Ndi Hibru 1:1, 2). Otù mkpughe Chineke pụtara ìhè ka enyere mgbe Jisọs, Ọkpara Chineke, rịdatara n’eluụwa, biri n’etiti ụmụmmadụ, zie ha ihe, wee nye kwa iheàtù nke ihe ijégharị nime iwu nke Onyenwe anyị pụtara n’ozuzuòkè ya niile. Ọ bụghị náánị na O nyere anyị iheàtù igosi anyị otú esi ebi ndụ; kama site kwa n’ọnwụ Ya emere Mkpuchimmehie nke dịrị mmehie; ka anyị, site na Ọbara Ya, aga-agbapụta anyị site ná mmehie niile anyị, na site kwa n’ike Ya aga-eme ka anyị nwee ike ime uche Ya, maọbụ iwu.

Iwu Nke Zuruòkè

Nime Abù Ọma nke Irinaiteghete ka anyị nwere nkọwa nke iwu nke Chineke n’ụdị dị icheiche: zuruòkè, kwesịrị ntụkwasịobi, ná-enwuenwu, dị ọcha, bụ eziokwu, ha niile ziriezi. Ihe Okwu Chineke na-alụpụta dị ọtụtụ: ná-eweghachị mkpụrụobi, ná-eme ka onye ná-enweghị uche mara ihe, ná-eme ka obi ñụrịa ọñụ, ná-enye anya ìhè, ná-eguzo rue mgbe ebighịebi. Ọtùtù nke ọnụahịa ya dị “kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha” bụrụ kwa ihe anwapụtaworo na “ọ di utọ kari manu-añu, bú nke si n’ugbugbọ manu-añu.” Chineke anyị, Onye tụpụtara ụwa ukwuu ra otú a, enyewo àtùmààtù nke zuruòkè nke anyị pụrụ isite na ya chịa ndụ anyị emesịa anyị na Ya ebikọta rue mgbe niile ebighịebi.

Site n’amaokwu niile dị 176 nime Abù Ọma 119 ọ bụ náánị abụọ ka ana-ejighị asụsụokwu ụfọdụ n’ịkọwa iwu Chineke. Ekewara Abù Ọma a ụzọ iri abụọ na abụọ (22), akụkụ ọ bụla ka eji kwa mkpụrụakwụkwọ Hibru kanye ya n’isimbido ya. Abù Ọma nke a na-akụziri mmadụ inwe nsọpụrụ dị elu nye Okwu Chineke; dịka ode-Abù Ọma na-asị, “N’obim ka m’zobeworo okwu-ọnu-Gi, ka n’we ghara imehie megide Gi” (Abù Ọma 119:11). Chineke na-achọ ka Okwu Ya bụrụ ihe échèbere dịka àkù bụrụ kwa ihe eweliri elu, n’ihi na ana-agwa anyị sị, “I mewo ka Okwu ọnu-Gi di uku n’elu aha Gi nile” (Abù Ọma 138:2). Jọn kọwara Kraist dịka Okwu ahụ nke ghọrọ Mmadụ: “Na mbu ka Okwu ahu diri, Okwu ahu na Chineke di-kwa-ra Okwu ahu buru kwa Chineke” (Jọn 1:1). “Chineke nọri nime Kraist nēme ka Ya onwe-ya na uwa di n’otù” (2 Ndi Kọrint 5:19). Àtùmààtù nke mgbapụta Chineke na-achụso òkìkè Ya. “Ọ bu kwa ihe anēkwuputa na ọ di uku, bú ihe-omimi nsọpuru Chineke” (ma-ọbụ, “Na-arughi ukà, nsọpuru Chineke bu ihe-omimi di uku”) (I Timọti 3:16).

Otuto nye Chineke

“Ọ digh mgbe ọ bụla unu guru”, ka Jisọs siri, nárụtụaka n’Abù Ọma nke asatọ amaokwu 2, “I si n’ọnu umu ọhu na umu nāñu ara me ka ọjija zue òkè” (Matiu 21:16). Ndịiro nke Kraist, bú ndị ahụ chèrè na ha na-ekpere Chineke, rapụrụ inye ya otuto, ma “umu ọhu na umu nāñu ara” -- ụmụntakịrị ndị na-ekwu eziokwu n’obi ha, nwere kwa onwe-ha pụọ n’eziomume nke aka ha -- bụrụ otuto nke Ọkpara Chineke. Ọ bụrụkwarị na ndịa kpuchirị ọnụ ha nkume niile ga-etiwa mkpu. Òkìkè niile na-enye Onyeowuụlọ ahụ dị ebube otuto, ma agụpụ iheòkìkè efu ahụ niile eji ájá kpụ bụ ndị ná-ebuli onwe-ha elu karị Onyeòkìkè ha. Ọ bụ ezie na ọlụ niile nke Chineke pụrụ ịdị ukwuu, ma “onye luru èzí-na-ulo nwere nsọpụrụ kari èzí-na-ulo ya” (Ndi Hibru 3:3) Ọ “kachasi ha nile elu, bú ibu-onye-isi, na ichi-isi, na ike, na ibu-onye-nwe-madu, na aha ọ bula anākpọ ya aha, ọ bugh nání n’oge a, kama ọ bu kwa n’oge nke gaje ibia” (Ndi Efesọs 1:21).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ọ bụ n’oge gịnị ka Jisọs hotara Abù Ọma 8:27
  2. N’ebe ole ka ehotara Abù Ọma 8:4-6?
  3. N’ụzọ dị añaa ka amaokwu ndịa na-ekwu banyere Kraist?
  4. Gịnị kpatara anyị onwe anyị taa kwesịrị ịhụ ebube Chineke n’Eluigwe karị dịka Devid hụworo n’oge ya?
  5. Òlee otú Abù Ọma 19:2-4 jiri yie Ndi Rom 1:20?
  6. Gịnị bụ ịmaàtù ị pụrụ iji tụnyere ọlụaka Chineke na Iwu Ya?
  7. Gịnị bụ okwunkọwa dị icheiche ejiri kọwaa iwu Chineke nime Abù Ọma 19?
  8. Gini bụ kwa mmehie nganga niile?
  9. Gịnị bụ isiokwu nke Abù Ọma 119?
  10. Òlee otú esi kọwapụta isiokwu a n’amaokwu niile nke Abù Ọma a?
  11. Akụkụ Nke Abụọ
  12. NKE NDỊETITI