Matiu 23:1-39

Lesson 222 - Junior

Memory Verse
“Nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna-unu n’anya, ndi nwere obi ọmiko, ndi nwere uche di ume-ala” (I Pita 3:8).
Notes

Ịhụrịta Onweanyị N’anya

Ọ dị ndị bụ ezi mmadụ dị n’ụwa bụ ndị nwere obiọma ná-eche kwa échìchè banyere ndị ọzọ, ndị ná-ahụ kwa ndị agbataobi ha n’anya dịka onwe ha. Ha na-agbalị ime ihe niile Kraist sị ka emee: “Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nāchọ ka madu nēme unu, nēme-kwa-nu madu otú a” (Matiu 7:12). Jisọs kwu kwara sị, “N’ihi na nka bu iwu na ndi-amuma Chineke.”

Otú ọ dị, ọ dị kwa ndị ọzọ bụ ndị ná adịghị ahụ onye ọzọ n’anya maọbụghị náánị onwe ha. Mgbe ha mere ezi ihe ọ bụla, ọ bụ n’ihi ọdịmma nke onwe ha, maọbụ nke èzínaụlọ ha maọbụ ndị enyi ha. Ha nwere ike inye ego iji mee ihe dị mma, kama ọbụ náánị iji nata otuto mmadụ n’ihi ezi ihe ha mere. Ha na-achọ ịdị ka ndị ezi mmadụ n’iru ndị ọzọ náagbanyeghị na ha bụ ndị náachọ náánị onwe ha.

Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, bụ ndị anyị na-amụ ihe banyere ha ugbu a bụ ndị dị otú a. Ha na-eje n’ụlọchọọchị mgbe ọ bụla, ma ha na-akpachapụ anya ịhụ na ha weere ọnọdụ nke kachasị mma. Ha ná-eguzo n’akụkụ okporoụzọ ná-ekpé ogologo ekpere ka ndị mmadụ wee hụ ha. Mgbe ha na-ebu ọnụ, ha na-akọpụ agịrịisi ha niile, ka onye ọ bụla wee mara otú ha si dị nsọ. Ma ndịa enweghị ịhụn’anya bara ụba n’ime obi-ha nye mmadụ ibe-ha.

Onye Ná-enye Iwu

Ọbụ site n’aka Moses ka Chineke nyere ndị Israel iwu, mgbe ụfọdụ ka ana-akpọ Moses onye ná-enye iwu. Ọ kọwakwaara Ụmụ Israel ihe okwu niile nke Iwu ahụ pụtara ka ha wee mara ihe ha ga-eme iji mee ihe ná-atọ Chineke ụtọ.

Ugbu a Jisọs na-agwa ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na ha na-anọdụ n’oche Moses, ná anaele kwa anya na ha ga-eme dịka Moses mewororị. Ọ bụ ọlụ dịrị ha ikuziri ndịkom na ndịnyom ihe ha ga-eme iji jikere izute Chineke. Ma ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii enweghị ụdị obi ọmiko nke Moses nwere. Ha na-eguzo n’ụlọnzukọ were olu dị ike ná-asị “I gagh … I gagh,” ma ha ahụghị ndịogbenye n’anya. Ịhụn’anya Chineke kwesịrị ịbụ ihe dịkarịsịrị mkpà ná ndụ ha. Pọl Onyeozi dere sị “Ihu-n’anya bu idebezu iwu” (Ndi Rom 13:10).

Mgbe Jisọs sịrị na anyị kwesịrị imeso ndị-ọzọ dịka anyị si chọọ ka ha mesoo anyị, Ọ kọwara sị, “Nka bu iwu na ndi-amuma Chineke” ọ bụghị kwa òzízí ọhụụ. Nke a bụ Iwu ahụ nke Chineke nyeworo Moses bụrụ kwa nke ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-amụ, nke ha kwesịkwara, ịma.

Iwu ahụ nime Obi

Chineke enyewo ndị Israel ndụmọdụ ka ha kee Iwu-Ya n’aka ha, werekwa ya tinye n’iru ha n’etiti anya ha abụọ. Nke a ka ndị Farisii mere. Ha na-eyi phylactery nke a bụ iberibe akwụkwọ anọ nke edekwasịrị otù amaokwu maọbụ abụọ nke Iwu n’elu ha, wee jiri ezinleruanya tinye ya n’akpà akpụkpọ maọbụ ihe ọzọ eji akpụkpọ mee. Á na-ekekwasị ha n’aka ekpè na n’egedege iru, á na-eyikarị ya na mgbe ekpere. Ndị Farisii na-edebe ihe a enyere n’iwu n’ụdị ihe ana-ahụ anya ma ha na-elefuru akụkụ ahụ nke Chineke kwukwara banyere ya anya: “I gēwere kwa obi-gi nile, were kwa nkpuru-obi-gi nile, were kwa ike-gi nile, hu JEHOVA, bú Chineke-gi, n’anya. Okwu ndia, nke Mu onwem nēnye gi n’iwu ta, gādikwasi kwa n’obi-gi” (Deuteronomi 6:5, 6). Inwe ịhụn’anya Chineke nime obi-ha dị mkpà karị idekwasị ya n’iberibe akwụkwọ dị icheiche wee kekwasị ya n’aka.

Enweghị Obiebere

N’ihi na ndị Farisii ji Okwu Chineke kekwasị n’egedege iru-ha na n’elu aka-ha, ma ọ dịghị nime obi-ha, nke a mere na ha enweghị ịhụn’anya; ha pụrụ ikekwasị ndị ọzọ ibu dị arọ, mgbe ha onwe-ha agaghị ewelite mkpịsịaka iji nye aka. Ha “nēripia ulo ndinyom di-ha nwuru,” nke pụtara na n’aha okpukpé ha, ha ga-eme ka ndị di ha nwụrụanwụ tụọ ụtụ buru ibu nke ná-anapụ ha ọbụná ihe ntakịrị ha nwere.

Ọ dịbeghị anya mgbe otù onye dị otú ahụ jere n’ụlọ otù nwanyị di-ya nwụrụ. O chere na ọ bịara ịkasị ya obi, na inyere ya aka ilekọta ụmụntakịrị ya nna-ha nwụrụ; ma náánị ihe ọ chọrọ bụ ịnara ya ego aga-enye n’ụlọnzukọ. Ọ dịghị ihe o nwere inye ya ma-ọ bụghị náánị otù ehi nke bụ náánị ihe o ji enweta inye-aka. Mgbe ọ bịara nke ugbò abụọ na-ekwusi ike na ya aghaghị ịnata ya ego, nwanyị ahụ gwara ya na ọ pụrụ iwere ehi ahụ -- na-échèghị na ọ ga-emesi obi ya ike iwere ihe ikpéazụ o nwere. Ọ kpụụrụ ehi ahụ pụọ, e wee kewaa èzínaụlọ ahụ, e wee zigaa ụmụntakịrị ahụ n’ụlọ dị icheiche ebe aga-elekọta ha anya.

Ọ bụ ụdị obi emesịrị ike dị otú a ka ndị Farisii nwere -- ha enweghị obiebere. Jisọs sị na ha na-akwụ otù ụzọ n’ụzọ iri, dịka Iwu si kwu, ma ha arapụwo “ihe ka arọ n’iwu, bu ikpe na ebere, na okwukwe.”

Ịhụn’anya Chineke Nwere n’Arụ Onyemmehie

Maara Onwe ya

Jisọs kpọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ndịiruabụọ, ndịìsì ná-edu ndịìsì, ọgbọ ajụala (agwọ) na agwọ ọjọọ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla Ọ na-agwa ndị mmehie matara ọnọdụ ha okwu dị otú a. Ọ na-akpọ ha òkù sị: “Biakutenum, unu nile na adọgbu onwe unu n’ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike” (Matiu 11:28); “Onye akpiri nākpọ kwa nku, ya bia. Onye nāchọ, ya nara miri nke ndu ahu n’efù” (Nkpughe 22:17). O meghepụrụ aka-Ya abụọ, ná-anabata onye ọ bụla chọrọ ka azọpụta ya.

Ma banyere ndị iruabụọ na-eguzo n’akụkụ okporoụzọ ná-ekpe ogologo ekpere, ka Ọ sịrị: “Ahuhu gādiri unu, ndi-ode-akwukwọ na ndi Farisi, ndi-iru-abua! … unu gēnwe ezi ọmuma-ikpe gabigara okè kari ndi ọzọ.” Ọ kpọrọ ha “ili eteworo nzu, nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n’ìhè, ma n’ime ha juputara n’ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adigh-ọcha nile.” Lee otú Jisọs si ná-eleba anya nime obi-ha -- gabiga ogologo uweokpukpé ha, phylacteries-ha, iruịdịnsọ ha, iru ná-egosi nsọpụrụ ihe dị nsọ -- wee ná-ahụ mmehie ọjọọ niile dị icheiche nke na ọ na-échètara Jisọs banyere “ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adigh-ọcha nile.”

Jisọs kwukwara na ha dị ka afere nke asaworo azụ ya, ma ọ dịghị ọcha nime ya. Ọ dịkarịrị mkpà ime ka afere dị ọcha nime ebe aga-etinye nri, ka onye ọ bụla ghara ịrịa ọrịa n’ihi ihe adịghị ọcha na-eweta. Mmadụ pụrụ iyi uwe kwesịrị ekwesị, iji dị ka OnyeKraist, nọrọ kwa ná-ejéozi nke nzukọ n’ikwesị ntụkwasiobi; ma ọ bụrụ na ọ na-ekwuokwu ná-adịghị mma banyere onyeagbataobi ya, ná-éché kwa ajọ échìchè banyere enyi ya, obi-ya adịghị ọcha. “N’ihi na dika o si echè échìchè na nkpuru-obi-ya, otú a ka ọ di” (Ilu 23:7). Ọ bụ onye dị ọcha n’obi, onye dị ọcha nime, bụ onye ga-ahụ Chineke.

Nna Anyị bi n’Eluigwe

Ndị Farisii bụ ndị ná-ejé n’ụlọnzukọ mgbe ọ bụla ná-agụ kwa Baịbụl, ná-eme kwa ka ana-eche na ha dị nsọ nke ukwuu nke mere na ụmụmmadụ na-akpọ ha Rabai, Nnaukwu, maọbụ Nna. Ha na-ebuli isi-ha elu ná-eme omume ka aga-asị na ha dị mma karị onye ọ bụla ọzọ. Ma Jisọs sịrị “Unu onwe-unu nile bu umu-nna. Unu akpọ-kwa-la onye ọ bula nna-unu n’elu uwa: n’ihi na otù Onye bu Nna-unu, Ya bu Onye nke elu-igwe.” Nke a apụtaghị na ụmụntakịrị agaghị akpọ onye mụrụ ha nna, kama na ha agaghị asọpụrụ onyenchụàjà dịka Chineke, wee ná-akpọ ya nna. Ọ dịghị onyenchụàjà ọ bula pụrụ iguzo n’etiti anyị na Chineke, ịrịọrọ anyị arịrịọ maọbụ ịgbaghara anyị mmehie anyị. Jisọs bụ Onyeisinchụàjà anyị, O zikwara ndị náeso ụzọYa ikpere Chineke bụ Nna, na ịrịọ Ya, ka O nye ha agụụ obi-ha, n’aha Ya onwe-ya. O kwere mkwà na ọ bụrụ na ha ekpee otú a, na ha ga-enweta ihe ha rịọrọ.

Obiumeala

Ọ dịghị mgbe ọ bụla Jisọs buliri Onwe ya elu. Ọ sị na Ya bịara dịka orù n’etiti ha, imere ha ihe ọma. Ọ gwara ha na ọ bụrụ na ha chọrọ inweta ụgwọọlụ n’Eluigwe, na ha aghaghị ime dịka Ya onweYa mere. Ọ bụrụ na ha eweda onweha n’ala, na Ya ga-ebuli ha elu, nye kwa ha nsọpụrụ n’iru NnaYa n’Eluigwe. Ma ndị ahụ na-ebuli onweha elu, ná-achọ ime ka ndị ọzọ kwere na ha dị ukwuu, dị nsọ, Jisọs ga-ama ha ikpé; ihere ga-eme kwa ha mgbe ha ga-eguzo n’iru Chineke n’ikpé.

Òzízí Efu Ndịokenye Nyere Ha n’aka Idebe

Ọtụtụ n’ime ihe ndị Farisiị na-eme bụ òzízí ndịokenye nyere ha n’aka idebe, bụ ihe ná-enweghị isi. Ha sịrị na ọ dịghị ihe o mere ọ bụrụ na mmadụ e jiri Ụlọnsọ Chineke ñụọ iyi, ma na ọ bụ ihe ná-adịghị mma ọ bụrụ na ha e were ọlaedo dị n’Ụlọnsọ Chineke ñụọ iyi. Jisọs jụrụ ha ihe ha ji kpaa ókè dị otú a. Ọ bụ na Ụlọnsọ adịghị ukwuu karị ihe ọ bụla dị nime ya? ò kwesịghị kwa ka enye ya nsọpụrụ dịka ụlọ Chineke? Ọ bụrụ kwa na ha ejiri Ụlọnsọ ñụọ iyi, nke bụ Ụlọ Chineke, ọ bụghị Chineke n’Onwe-ya ka ha ji ñụọ iyi, wee si otú a ná-arapụ ịsọpụrụ Ya? Jisọs sịrị ka ha ghara iji ihe ọ bụla ñụa iyi. Ọ bụrụ na ha kwuru eziokwu, ha ekwesịghị ikwu karị náánị e maọbụ é-è. Okwu ọzọ karịrị nke a ga-eme náánị ka okwu ha yie ihe ná-abụghị eziokwu. Gọvment anyị enyewo ohere na OnyeKraist agaghị “añụ iyi” n’ụlọikpé, kama ọ “na-emesi okwu ya ike” na ihe niile ahụ o kwuru bụ eziokwu.

Jisọs sịrị na ndị Farisii na-emechi ụzọ Eluigwe ka e wee ghara ịzọpụta ndị ọzọ. Òlee otú ha pụrụ isi mee nke a? Nke mbụ, ha ekweghị na apụrụ ịzọpụta mmadụ niile, nke a bụ kwa ihe ha na-ekwusa. N’ezie nke a ga-eme ka ọtụtụ daa mba wee ghara ịchọsiike ka azọpụta ha. Ndị ọzọ pụkwara ịda mba site n’ile ndị iruabụọ ahụ anya, wee sị na ọ bụrụ na ndị náeso Chineke bụ ndị ọjọọ na ndị ná-enweghị obiebere otú a, na ha agaghị-achọ ịbụ otù nime ha. Nke a mere na site ná mmehie ha ndị Farisii na-emechirị onwe ha ụzọ Eluigwe, wee mee kwa ka aghara ịzọpụta ndị ọzọ.

Ajụrụ Jisọs

Ndị Farisii sị na ọ bụrụ na ha dị ndụ n’oge nke ndị amụma, na ha agaghịri abụ ndị ikpé igbu ndị Amụma dịka Aisaia, Jeremaia, Zekaraia, na Hosea mara dịka ndị nna-ha ochie meworo. Ma Jisọs, Onye dị ukwuu karị ndị amụma niile, nọ n’etiti ha ugbu a, ha na-agba kwa ìzù igbu ya. Ndị ná-ekpé okpukpé, bụ ndị sị na ha bụ ụmụ Abraham, bụ kwa ndị enyere Iwu Chineke n’aka, kpọrọ Jisọs as nke ukwuu na ha na-achọ ikpọgbu Ya n’obe. Site n’ime nke a, ha ga-eme ka iko ajọomume ha ju, ikpé ga-eso kwa mgbe ná-adịghị anya.

O wutere Jisọs na ndịa agaghị échègharị. Ọ chọghị ka ha hụọ ahụhụ, ọ bụ ezie na ha mejọrọ Ya nke ukwuu. Na mgbe ná-adịghị anya tutu ha ama Ya ikpé ọnwụ, Ọ kwaara Jerusalem ákwá: “Jerusalem, Jerusalem, nke nēgbu ndi-amuma, nke nēwere kwa nkume atu ndi eziteworo ya, ọtutu mgbe ole ka M’chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọgh! Le, anārapuru unu ulo-unu ka ọ tọgbọrọ n’efu.”

Nke a bụ ohere ikpéazụ enyere ha iji nara Ya. Ha agaghị kwa ahụ Ya ọzọ rue mgbe ahụ ha ga-asị, “Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n’aha Onye-nwe-ayi.” Ụfọdụ ndị Ju bụ ụmụ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii ọjọọ ahụ ga kwa alaghachịkuru Jisọs wee kwasara Ya bù, Mesaia ha ákwá, ka O meere ha ebere. Ha ga-ekwupụta mmehie ha wee rịọ mgbaghara. Mgbe ahụ, ha ga-enwe kwa ọñụ na ngọzi niile nke Chineke dịka ezi ụmụ si enwe, bụ ndị nwere ịhụn’anya nye onye ọ bụla.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Mụọ Iwu Ọlaedo ahụ (Matiu 7:12).
  2. Ònye ka akpọrọ Onyeonyeiwu? ọ bụ kwa onye weere ọnọdụ a n’iheọmùmù a?
  3. Òlee ebe Chineke gwaworo ndị Israel ka ha tinye Iwu Ya?
  4. Òlee ebe Iwu ahụ dị nime ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii?
  5. Ndị Farisii kwụrụ otù ụzọn’ụzọiri, ma ọ bụ gịnị ka ha chèfuworo ime?
  6. Gịnị ka Jisọs kpọrọ ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii?
  7. Gịnị ka Jisọs na-agwa ndị mmehie maara mmehie ha?
  8. Òlee otú ndị Farisii si “nēmechi uzọ ala-eze elu-igwe”?