Jọn 12:37-50

Lesson 223 - Junior

Memory Verse
“Ònye kwere ihe ayi nuworo? Ogwe-aka Onye-nwe-ayi kwa, n’àru onye ka ekpugheworo ya?” (Jọn 12:38).
Notes

Ọhù nke Aisaia

Aisaia Onyeamụma onye biri ihe karịrị narị arọ asaa tutu amụọ Jisọs, hụrụ Chineke n’anya, were kwa ịkwesị ntụkwasịobi fèè Ya òfùfè. Otù ụbọchị, mgbe ọ nọ n’Ụlọukwuu Chineke ná-efè òfùfè, ọ dị ihe mere ya, bụ ihe dị ebube karị ihe ọ bụla nke ọ mawooro na mbụ. Ọ hụrụ ọhù ka Jehova na-anọdụ n’ocheeze Ya! Ọ hụkwara ndị mmụọozi na-eguzo n’ebe dị elu n’ọnọdụ ocheeze ahụ, ha naabù kwa abù sị “Nsọ, nsọ, nsọ, ka JEHOVA nke usu nile nke ndi-agha di: ùjú uwa nile bu ebube-Ya” (Aisaia 6:3). (Nke a na-ewepụtara anyị otuto nye Chineke Nna, Chineke Ọkpara na Chineke Mmụọ Nsọ.) Ntọala niile nke mbataụzọ mere mkpatụ n’ụda ndịabù nke Eluigwe, anwụrụọkù wee jupụta Ụlọukwuu nke Jehova.

Otú obi Aisaia nụwororị ọkù nime ya ịkọrọ mmadụ ihe ọ hụwọrọ! O metụtara ya na ya ekwesịghị iguzo n’iru Chineke dị nsọ, ma agụụ gụrụ ya nime obi nke ukwuu ịgbá Ụmụ Israel ume ifè náánị ezi Chineke, wee nwee kwa ọñụ n’iso ya nwee mmekọ. N’ụbọchị ahụ, ọ mụtara na ọ dị ihe ọ pụrụ ime.

Odudonsọ nke Aisaia

N’ebe ahụ, n’etiti ebube ahụ si n’ocheeze Chineke ná-enwupụ edoro Aisaia nsọ; e wee nye ya ike ijé kwusaara Ụmụ Israel okwu Chineke. Chineke dọrọ ya akanántị na ọ ga-abụ ọlụ siri ike, n’ihi na ndị ahụ agaghị achọ ịña ya ntị; ha agaghị ekwe ihe ọ gwara ha banyere ịdịnsọ nke Chineke na ụgwọọlụ nke dịịrị ndị kwesịrị ntụkwasịobi. Ndị dị otú a bụ ndị ntị chịrị na ndị kpuruisi nime mmụọ.

Ahụghị Ụzọ, Anụghị kwa Ihe

Mgbe Jisọs nọ n’ụwa, náalụ ọlụ ịrịbaàmà nke ịgwọ ọrịa, ime ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie, ná-ewetara ndị nwere nsogbu udo, ọ hụkwara ndị dị otú a bụ ụdị ndị Aisaia kwusawooro okwu Chineke. Ha nwere anya ịhụụzọ ma ha achọghị ịhụ ihe kwesịrị ekwesị; ha nwere ntị iji nụ ihe, ma ha achọghị ịghọta ihe dịkarịsịrị mkpà ná ndụ.

N’ijéozi nke Aisaia, o tiwo mkpu sị, “Ònye kwere ihe ayi nuworo? Ogwe-aka JEHOVA kwa, n’àru onye ka ekpugheworo ya?” (Aisaia 53:1). O wee gaa n’iru ịkọwa Jisọs na ihe dị ịcheiche Ọ ga-ahụ n’ahụhụ iji gbapụta ụwa. Chineke gosịrị Aisaia ihe ga-eme Jisọs narị arọ asaa dị n’iru.

N’ebe ọgụgụ nke iheọmùmụ nke taa, ihe ahụ niile eburu ná amụma na-emezu. Jisọs enwewo-rị obiọma n’arụ ụmụmmadụ: O kechiwo ọnya ndị obi-ha tiwaraetiwa, Ọ gwọwo arụ ndị nwere ọrịa. O mewo ihe dị icheiche n’etiti ha nke onye ọzọ ná-emebeghị. Ma náagbanyeghị ọlụebube Ya niile ahụ, Jisọs bụ Onye “eledara anya, ọ bu kwa onye madu rara aka; onye nwere ọtutu ihe-ngbu na onye mara ọria nke-ọma” (Aisaia 53:3), dịka Aisaịa kwuwororị na Ọ ga-abụ. Ọtụtụ ndị ahụ ná-ekweghị okwu niile nke Jisọs bụ ndị kpuruísí na ndị ntịchiri nime mmụọ.

Ogweaka Chineke

Ònye ka ekpugheworo ogweaka Onyenwe anyị nye? Ònye hụworo ike Jisọs, nwee kwa ọñụ nime ngọzi-Ya niile? Ndị kwereworo akụkọ ahụ akọrọ ha bụ ndị kwere ihe Jisọs kwusara.

I chetara akụkọ banyere nwanyị ahụ nọworo n’ọrịa arọ iri na abụọ (12), onye ego-ya niile gwụrụ n’aka ndị dibịa, ma agwọghị ya. O kweere na Jisọs ga-agwọ ya ọ bụrụ náánị na o metụ uwe-ya aka. N’ihi na o kweere, agwọrọ ya. Nke ahụ bụ ogweaka Onyenwe-anyị ekpughere nye ya.

Anyị na-agụ banyere ọchịagha ná-achị narị ndịagha ise nke nwa-ya nwoke na-achọ ịnwụ. O kwere na ọ bụrụ na Jisọs ekwue náánị okwu, na aga-eme ka arụ dị nwa-ya nwoke mma. Okwukwe ahụ o nwere n’okwu nke Jisọs wetara ọgwụgwọ ọrịa, ọchịagha ahụ wee hụ ogweaka Onyenwe anyị ekpughepụrụ.

Ọ dịwo ọtụtụ ọlụ ebube dị otú a, na Jọn dere n’Oziọma ya sị “ọ buru na edere ha n’akwukwọ n’otù n’otù, ọ dim ka ọbuná uwa onwe-ya agagh-anagide akwukwọ agēde” (Jọn 21:25). Ọtụtụ ihe Jisọs mere kwesịworo ime ka onye ọ bụla bụrụ onye kwere ekwe. Ma Jọn dere sị “Ma ha ekwegh na Ya.”

Mgbe ụmụmmadụ ná-ekweghị, Jisọs agaghị alụ ọlụ. Gburugburu obodo nke aka-Ya bụ Nazaret, ụmụmmadụ ekweghị. “Ọ lugh kwa ọtutu ọlu di ike n’ebe ahu n’ihi ekwegh-ekwe-ha” (Matiu 13:58).

Òlee ndị na-ahụ ogweaka Onyenwe anyị ekpughere taa? Ọ bụghị ndị ahụ ná-ekwere okwu niile Jisọs kwuru? Jisọs sịrị “Biakutenum, unu nile ndi nādọgbu onwe-unu n’ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di ar, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike” (Matiu 11:28). Onye ọ bụla ji obi-ya niile kwere wee si ná mmehie ya niile chègharịa, na-achọta izuike ahụ. Ọ bụ eziokwu guzosiriike taa dịka ọ dị na mgbe ahụ Jisọs na-eje ijè n’ụwa. Ọ na-ekpughe Onwe-ya nye ndị kwereekwe.

Agwọrọ Ndịọrịa

Jisọs gwọrọ ndịọrịa; n’akwụkwọ Jemes, anyị na-agụ kwa “Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nāhuju anya? Ya kpe ekpere … Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nke aru-ya nādigh ike? Ya kpọ ndi-okenye nke nzukọ Kraist ka ha biakute ya; ka ha kpe kwa ekpere n’isi-ya, nēte ya manu olive n’aha Onye-nwe-ayi: ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie” (Jemes 5:13-15). Ndị kweere bụ ndị ana-agwọ n’ọzịzá ekpere. Ha ekwerewo akụkọ ahụ, ha na-ahụ kwa ogweaka Onyenwe anyị, ka ekpughere ya.

Mgbe Jisọs na-achọ ịrapụ ụwa a, O zigara ndị náesoụzọ Ya ka ha jee kwusaa okwu Chineke n’ụwa niile, o wee sị ha, “Ihe-iriba-ama ndia gēso kwa ndi kwere: n’aham ka ha gāchupu ndi-mọ ọjọ; ha gēkwu okwu n’asusu ọhu di iche iche; … ha gēbikwasi ndi-nriaria aka, agēme kwa ka aru-ha di ike” (Mak 16:17, 18). Ihe iribaàmà ndịa ga-eso kwa ndị kwere.

Okwukwe

Ma asị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe ana-apụghị ime, bụ ime ihe ná-atọ Chineke ezi ụtọ (Ndi Hibru 11:6). Òlee otú Jisọs ga-esi lụara anyị ọlụ ọ bụrụ na anyị ekweghị na Ọ pụrụ ime ya? Ma ọ bụrụ na anyị emee ihe ná-atọ Onyenwe anyị ụtọ site n’ikwere ihe O kwuru, Ọ ga-emere anyị ọtụtụ ihe dị ebube. Òlee otú ị ga-esi ná-eche na Chineke ga-enye gị ihe ị na-arịọ ma ọ bụrụ na ị na-eche banyere Ya, ná-arịọ Ya arịrịọ náánị mgbe ị nọ ná mkpà, chezọọ Ya na mgbe ọzọ niile? Onyenwe anyị na-enwe ọñụ n’ekpere niile nke ekele na ịhụn’anya anyị n’ebe Ọ nọ. Ọ na-achọ ka anyị ná-agwa Ya na anyị hụrụ Ya n’anya, ná-ebi kwa ndụ nke ga-egosi na anyị hụrụ Ya n’anya. Anyị aghaghị ime ijéozi Ya ihe kachasị mkpà ná ndụ anyị.

Oge anyị n’ụwa kwesịrị ịbụ oge anyị ji ná-ejikere ijé Eluigwe na inyere ndị ọzọ aka ijikere izute Jisọs. Arọ olenaole dị mkpụmkpụ anyị na ebi ebe a abụghị ihe anyị pụrụ iji tụnyere ịdị ogologo nke ebighịebi. Ekwuwo ya sị: “Oge ayị n’ebe a bụ náánị oge anyị nwere iji mee ka ijé Eluigwe anyị bụrụ ihe guzosịrị ike. Ọ bụ ihe dịkarịsịrị ókéọnụahịa anyị nwere n’ụwa. Ugbu a, ọ bụrụ na mmadụ nwere ihe dị ókéọnụahịa otú a, ma ọ dị ntakịrị, onye ahụ ọ ga-eje mefue ya n’iji zụrụ ihe ụmụntakịrị ji egwuriegwu na n’izu ihe efu?”

Ọ bụrụ n’ezie na anyị kweere ihe Jisọs gwaworo anyị banyere Eluigwe na ebube anyị na Ya ga-enwekọ n’ebe ahụ, ihe nke ụwa a ga-abụ ihe na-adịghị mkpà n’ebe anyị nọ. Anyị ga-abụ ndị naebi ezindụ, na-eji ikwesị ntụkwasịobi na obi ebere na-emeso ndị ọzọ, kama ibuarọ nke obi anyị ga-abụ iritara Jisọs mkpụrụobi n’urù. Anyị chọrọ ka anyị hụ Jisọs ebe Ọ bịara ime ụwa a ka ọ ghọọ ebe dị nsọ mmadụ ga-ebi nime ya.

Otuto Mmadụ

Ụfọdụ nime ndị náachị ụlọnzukọ kweere na Jisọs kama ụjọ naatụ ha ikwu ya. Á na asọpụrụ ha n’ihi ọnọdụ dị elu nke ha nwere ná nzukọ, ha hụkwara otuto nke mmadụ n’anya. Ha chere na ọ bụrụ na ha esoro Jisọs na agaakpọ ha asì dịka akpọrọ Ya as. Anyị pụrụ ịhụ na ha adịghị échè banyere otú o si dị mkpà ijikere ijé n’Eluigwe. Ihe ndị enyi ha na-eche banyere ha dị ha mkpà karị ihe Chineke na-eche. Karịa ịnagide mkpagbu ntàkịrị n’ebe a n’ụbọchị olenaole, wee nwee ọñụ nke ebube niile nke Chineke rue mgbe niile ebighịebi, ha jikeere ịtụfu ihe ha gara-anata, ma rọrọ oge ntàkịrị nke ebube nke ụwa ná ndụ nke a.

Ọ dị kwa ndị ọzọ kweere na Chineke, ma ha ekweghị na Jisọs bụ Ọkpara-Ya. Jisọs gbalịrị igosi ha na okwu niile nke Ya Onwe-ya kwuru sitere ná Nna bịa. Ọ dịghị òzízí nke aka-Ya O wepụtaworo. Ọ chọrọ ka ha mara na ọ bụrụ na ha ekwere òzízí Ya niile, na ọ bụ iwu niile Chineke ka ha kweworo -- ha bụ otù ihe ahụ, ha ga-eguzo kwa rue ebighịebi. Okwu niile nke Jisọs kwuworo -- Okwu Chineke -- ga-ekpé mmadụ ọ bụla ikpé n’ụbọchị ikpéazụ.

Okwu Jisọs niile na-abụ ndụ ebighịebi nye ndị kwere. Anyị pụrụ ịtụkwasị mkwà niile Chineke obi imezu n’arụ anyị ma ọ bụrụ na anyị emee ókè dịrị anyị. Ọ ga-elekọta ụmụ Ya anya wee durue ha n’Ala Ebube ahụ n’udo, ọ bụrụ na ha emee ihe niile O ziri.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị ka Aisaia hụrụ n’ỤlọUkwuu Chineke?
  2. Gịnị ka nke a mere chọrọ ka o mee?
  3. Òlee otú Chineke si mee ka Aisaia kwesị ịjéozi?
  4. Òlee ụdị ndị Aisaia na Jisọs kwusaara okwu Chineke?
  5. Òlee ndị nwere ọñụ ná ngọzi niile nke ọlụebube Kraist lụrụ?
  6. Gịnị bụ urù anyị ga-erita site n’ime okwu niile Jisọs kwuru?
  7. Òlee ihe dị iche n’ịdị ogologo nke oge anyị n’ụwa na ebighịebi?
  8. Òlee otú anyị ga-esi mara nkeọma na anyị jikeere izute Jisọs?