Matiu 25:1-13

Lesson 224 - Junior

Memory Verse
“Ya mere, nēchenu nche, n’ihi na unu amatagh ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu (mgbe Nwa nke madu gābia”) (Matiu 25:13).
Notes

Nlọghachị nke Jisọs

Jisọs na-ekwu banyere oge ahụ mgbe Ya Onwe-ya ga-alọghachị n’ụwa. O kwere mkwà sị “Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ” (Jọn 14:3). Ọ na-ekwu banyere ihe gana-eme n’ụwa mgbe Ọ ga-abịaghachị. Jisọs sị na ọ ga-adị ka ụbọchị Noa, mgbe óké ijummiri ahụ bịara. Ọ bụ ezie na adọwororị ndị ahụ akanántị, ha ejikereghị. Jisọs dọrọ ndị náesoụzọ Ya akanántị ka ha ná-echenche, ná-ekpe kwa ekpere ka ha wee jikere banyere ọbịbịa-Ya. Jisọs na-abịa ọzọ.

Iheọmùmù anyị malitere n’ịsị “mgbe ahu,” nke á-atụ aka n’oge ahụ nke ọ na-ekwu banyere ya -- mbịaghachị ọzọ Ya n’ụwa. Mgbe Ọ ga-abịa ọzọ, ọ ga-adị ka o si dị n’ilu a nke anyị gaje ịmụ: ụfọdụ ga-ejikere, ma ụfọdụ agaghị ejikere.

Oge Anáamataghị

N’ilu a, ana-egosi Jisọs dịka onye náalụ nwunye ọhụụ. Ụmụ mmadụ na-ele anya mpụtaìhè Ya, ma amaghị mgbe ọ ga-eme. “Unu amatagh ubọchi Onye-nwe-unu gābia” (Matiu 24:42). Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ, ma fọdụ kwa ịma oge hour ahụ. Jisọs kwuru, “Ma ọ digh onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi na oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ọzi nke elu-igwe amatagh, Ọkpara ahu amatagh kwa, kama ọ bu nánị Nnam matara” (Matiu 24:36). Amataghị mgbe Jisọs ga-abịa kwesịrị ime ka anyị chee nche karị ịnọ kwa ná njikere mgbe niile.

Ndị ahụ ná-echere onye ahụ náalụ nwunye ọhụụ ka ekere ụzọ abụọ, ndị nwere uche nọ kwa ná njikere, na ndị nzuzu ná-ejikereghị. Ụzọ mmadụ abụọ ndịa na-echere onye ahụ náalụ nwunye ọhụụ. Ụzọ mmadụ abụọ ndịa nwere ọwa, ha abụọ rarụrụ ụra tutu onye ahụ ná-alụ nwunye ọhụụ abịa.

Ìhè

Aga-eji ndịa tụnyere ndị niile ná-esoụzọ Kraist. Jisọs sịrị, “Mu onwem bu ìhè nke uwa: onye nēsom agagh-ejeghari n’ọchichiri, kama ọ gēnwe ìhè nke ndu” (Jọn 8:12). Oziọma nke Jisọs na-enye anyị ìhè. Anyị aghaghị ịña ntị soro kwa Ya ka anyị wee nwee mnwapụta nke nzọpụta. “Ọ buru na ayi ejeghari n’ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n’ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n’etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-Ya nāsachapu kwa ayi nmehie nile” (I Jọn 1:7).

Onye dere Abù Ọma na-ekwu banyere Baịbụl mgbe ọ sịrị, “Okwu-Gi bu oriọna diri ukwum, Ọ bu kwa ìhè diri okporo-uzọm” (Abù Ọma 119:105). Oriọna kwesịrị inye ìhè. Mgbe anyị nwere Jisọs ná ndụ anyị, anyị nwere ihe ahụ ná-enye anyị ìhè nke imemmụọ.

Ụra

Ndịa niile rarụrụ ụra mgbe ha na-echere. Onye ahụ ná-alụ nwunye ọhụụ bịara n’abalị, n’oge ụmụmmadụ kwesịrị ịnọ n’ụra. Ụra a abụghị nke ọnwụ, ọ bụghị kwa ụra nke imemmụọ maọbụ irò ụra. Ọ bụ ihe dị ka òkìkè si dị na ha ga-ararụ ụra. Ka Jisọs naánọ ọdụ ịbịa, ana-ele anya na ndị-Ya ga-ebi kwa ndụ n’ụzọ esi ebi ndụ. Ha nwere èzínaụlọ ha na ọlụ ha; ma ịnọ ná njikere banyere ọbịbịa Jisọs mgbe niile kwesịrị ịbụ ihe mbụ nime obi-ha.

Ịnọgide N’ọlụ

N’ilu ọzọ, nke atụrụ banyere pound, anyị ghọtara na Onyenwe anyị enyewo onye ọ bụla ọlụ dịrị ya (Mak 13:34); Ọ na-ele kwa anya na anyị ga-anọgide n’ọlụ anyị rue mgbe Ọ ga-abịa (Luk 19:13). Ịnọgide pụtara ịlụ ọlụ, ijikere, iche nche, na ịña ntị n’ihi ọbịbịa-Ya. Anyị na-ebi ndụ anyị ụbọchị ọ bụla dịka ọ bụ ụbọchị ahụ ka Ọ ga-abịa. Anyị adịghị echè échìchè ihe niile anyị gaje ime na mgbe dị anya. N’ikwu banyere echi anyị na-asị, “Ọ buru na Jisus anọ ọdu.” Solomon sịrị, “Mu onwem nāraru ura ma obim nēteta” (Abù nke Abù 5:2). Otú a kwa ka Onye Kraist na ararụ ụra dịka anụarụ si dị, kama obi ya na amụ anya mgbe ọ bụla nye ọbịbịa Jisọs.

Ndịnzuzu na Ndị Nwereuche

Ụfọdụ ná ndị na-eche ọbịbịa onye ahụ náalụ nwunye ọhụụ nwereuche ma ụfọdụ bụ ndịnzuzu. Gịnị bụ ihe dị iche? Ha niile nwere oriọna; ọtùtù mmanụ ha ji bụ ihe ná-egosipụta ma ha bụ ndị nwereuche maọbụ na ha bụ ndịnzuzu. Ndị nwereuche weere mmanụ n’oriọna-ha ma ndịnzuzu weere oriọna na mmanụ dị ntakịrị maọbụ ná-enweghị mmanụ maọlị.

Oriọna

Eleghịanya ị hụwo oriọna ana-eji amụ ọkụ tutu anyị enwee ọkụ eletrik. N’okpuru oriọna ahụ ka ebe ana-etinye mmanụ dị. N’elu ya bụ enyo ebe anwụrụọkụ si apụ, ya na ogho mmanụ dị na ya nke ọma nke ganaenwu mgbe etinyere ya ọkụ ọ bụrụ na ihe niile ọzọ dị otú ha kwesịrị. Ana-asacha enyo ebe ahụ anwụrụọkụ si apụ ụbọchị niile ma ọ bụghị otú a, ọ ga-eru unyi mgbe ná-adịghị anya, malite ịkwu anwụrụọkụ, nke ga-eme ka ìhè ọkụ ahụ ghara ịna enwu nkeọma. Ana agbaju ebe ahụ ana-etinye mmanụ, ka o wee ghara ịbụ na mmanụ adịghị ya mgbe achọrọ iji ya mụọ ọkụ. Mgbe ogho ọkụ ahụ na-erepụ, ana-achapụ elu-ya ka ebe ahụ repụworo ghara ime ka ọkụ ahụ ghara inwu nkeọma wee mee ka ebe ahụ anwụrụọkụ si apụ bụrụ ihe ruru unyi. O kwesịrị ka elezie oriọna anya ụbọchị niile.

Inwuru Jisọs

Jisọs gwara ndị náeso ụzọ Ya na ha bụ ìhè nke ụwa (Matiu 5:14) dịka Ya onwe ya. Dịka ndị náeso ụzọ Jisọs taa, ana-eji anyị na atụnyere ìhè dị icheiche. Ọ dị mkpà na anyị ga-eme ka ihe nke imemmụọ dị otú o kwesịrị dịka ana aghaghị idozi ihe anaahụ anya ime ka oriọna na-enwu nkeọma.

Anyị aghaghị ido ndụ anyị ọcha ụbọchị ọ bụla, hour ọ bụla, ọ bụrụ na anyị ga-enye ìhè na-enwu ezi onwunwu mgbe niile. Akụkụ ọ bụla nime anyị nke ná-adịghị mma maọbụ ná-eweta mgbochi aghaghị ịbụ ihe ewezugara ọ bụrụ na anyị ga-abụ ìhè ná-enwu nkeọma, ọ bụghị nke ná-enwu otù akụkụ, ná-akwụ kwa anwụrụ ọkụ.

Mmanụ

Ihe niile ndịa pụrụ ịdị otú ha kwesịrị, ma ewezuga mmanụ, agaghị enwe ìhè. Otú a ka ọ dị ná ndụ nke imemmụọ anyị: anyị aghaghị inwe Mmanụ ahụ, bụ Mmụọ nke Chineke. Mgbe azọpụtara mmadụ, ọ na-enwe ọtùtù nke mmụọ Chineke. Ka ọ na-ekpe ekpere, ná-eji kwa ndụ-ya chụaàjà, wee nata odudonsọ, onye ahụ na-enwe mmụọ nke Chineke karị ka o nwere na mbụ.

Ọ dị kwa onyinye amara ọzọ dị omimi nke mmadụ pụrụ ịnata, nke ná-enye Mmụọ nke Chineke n’ọtùtù dịkarịrị ukwuu -- imejupụta na Mmụọ Nsọ bụ inwe ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Mgbe Jisọs rịgosịrị n’Eluigwe, mgbe ndị náeso ụzọ Ya na-ekpe ekpere, eji Mmụọ Nsọ wụọ ha mmiri (Ọlu Ndi-ozi 1:5). Eji Mmụọ Nsọ mejupụta ha (Ọlu Ndi-ozi 2:4). Onyinye amara a dịkwara anyị taa. “N’ihi na unu ka nkwà nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39). Ọ na-enye anyị Mmụọ Chineke karị, ná-enye anyị Mmanụ ahụ nke ná-eme ka ìhè ahụ ná-enwu karị.

Itimkpu Ahụ

N’ime ọchịchịrị nke abalị itimkpu dara: “Le, onye nālu nwunye ọhu nābia! Putanu izute ya.” Ndị nwereuche nwere mmanụ n’arịa ha oriọna-ha na-enwu kwa. Ndịnzuzu elezighịanya. Ha enweghị mmanụ ga-ezuru ha, oriọna ha anyụwo kwa.

Ndi nzuzu ahụ maara ihe achọrọ ka emee. Ha mara ihe ha na-enweghi, ebe ha ga-enweta ya na otú ha ga-esi nweta ya. Ọ dịrị onye ọ bụla n’otù n’otù; onye ọ bụla ga-enwe njikere nke onwe-ya. Iji nwee Mmụọ Chineke n’ọtùtù dị mma, na ihe nke imemmụọ ndị ọzọ achọrọ ka enwee, mmadụ aghaghị ikpe ekpere, were ndụ-ya chụọàjà nye Chineke ná-aña kwa Chineke ntị. Ọ bụrụ na Jisọs abịa n’etiti abalị taa, ì jikerewo?

Oge Adịkwaghị

Mgbe ndịnzuzu jere ịzụta mmanụ, onye ahụ náalụ nwunye ọhụụ bịara. Ọ dịghị ohere dị ijikere mgbe oge gwụworo. Ndị ahụ jikeere bara n’oriri ọlụlụnwunye, e wee mechie ụzọ. Ndị nwereuche nọ nime, ma emechibidoro ndịnzuzu ụzọ.

Mgbe Kraist mechiri ụzọ, ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ imeghe ya (Nkpughe 3:7). Mgbe emesịrị ndịnzuzu ahụ gbalịrị ịbànye. Ha kụrụ aka, kpọọ kwa òkù -- ma ohere adịkwaghị. Lee otú ọ ga-abụworị ihe óké mgbu nye ha! Eleghịanya ha kpere ekpere, kwaa kwa ákwá, ma ọ dịghị ezi ihe nke a wetara. Ha rapụrụ njikere ha ka ọ nọọ ọdụ. “Chọnu JEHOVA mgbe anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mgbe Ọ nọ nso” (Aisaia 55:6).

Ichenche

Ánáadụ anyị ọdụ ka anyị cheénche nọdụ kwa ná njikere. Ka ilu nke a kpalie obi anyị inyocha nkeọma wee hụ ma anyị jikeere, ma anyị nwere Mmanụ n’arịa anyị ya na n’oriọna anyị. Hụ kwa na Mmanụ ahụ na-adịgide ebe ahụ, na o hipụsịghi. “N’ihi nka ayi aghagh iñabiga nti ókè kari n’ihe anuru, ka aghara ibupu ayi n’ebe ha di ma elegh anya, dika miri nēbupu ugbọ” (Ndi Hibru 2:1).

Uwemwụda Ahụ

Mgbe mmadụ natasịrị onyinye amara ndịa dị omimi nke imemmụọ, ọ ghaghị ịnọgide n’ekpere na ịlụ ọlụ. Ọ bụrụ na anyị echee nche, mee kwa ihe niile anyị kwesịrị ime, egwù ọbịbịa Jisọs agaghị atù anyị, kama ọbịbịa-Ya ga-abụ ihe anyị ga-ahụ n’anya. Mmadụ aghaghị itóétó, ná-adị ka Kraist karị, bụrụ kwa onye eji ịchọ mma na ịdịmma nke imemmụọ wee dozie. Ihe ndịa ka áná-akpọ onyinye amara dị icheiche nke Onye Kraist. Pita nke abụọ 1:5-7 na-agwa anyị na ihe ndịa kwesịrị ịná étóétó, ná-aba kwa uba, dibiga óké ukwuu nime ndụ anyị.

Onyinye amara imemmụọ ndịa ka ana-eji atụnyere uwe mmadụ na-eyi mgbe ụfọdụ. Iji maa atù, anyị na-agụ na “ezi ákwà ọcha ahu bu ezi omume nile nke ndi nsọ” (Nkpughe 19:8) na “ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya” (Ilu 31:25).

N’Abù Ọma 45:13, 14 anyị na-agụ banyere ada eze bụ onye eyikwasịrị uwe dị óké ọnụahịa ya na “uwe akpara nke-ọma.” Onye-Kraist ọ bụla bụ nwa Eze nke ndịeze, eji kwa uwe mara mma nke imemmụọ yikwasị ya. Dịka onye ọ bụla na-abaụba karị n’okwukwe, na ntachịobi, n’obiọma, n’ịhụn’anya, ọ na-enwe kwa karị ihe akpara akpà nkeọma n’elu uwe nke imemmụọ ya. Mgbe ọ na-adị ka Kraist karị, uwe-ya nke imemmụọ na-ama mma ná-adị kwa óké ọnụahịa karị.

Mgbe Jisọs ga-abịa, uwe-ya ga-ejupụta n’ìsìsì “myrrh na aloes na cassia, site n’ulo uku nile nke ọdu ubọ-akwara” (Abù Ọma 45:8). Ihe ndịa na-egosi amara imemmụọ niile anyị na-aghaghị inwe kwa, iji wee dịka Kraist. Jisọs ga-abịa n’ebube na ịdị ike “n’ihi ezi-okwu na ume-ala-n’obi na ezi-omume” nke Ọ hụrụ n’anya (Abù Ọma 45:4, 7).

Ọ bụrụ na anyị na-ele anya iso Jisọs baa n’Oririanyasị nke Ọlụlụ nwunye, anyị aghaghị inwe Mmanụ n’arịa anyị ya na nime oriọna. Anyi aghaghị inwe ọtùtù dị mma nke Mmụọ Chineke bụrụ kwa ndị eji amara dị icheiche nke imemmụọ yikwasi dịka uwe. “Ngọzi nādiri onye nēche nche, nēdebe kwa uwe-ya” (Nkpughe 16:15).

Ka anyị, site n’ikpe ekpere na n’iña ntị, jikere nye ọbịbịa ahụ Jisọs ga-abịa n’oge ná-adịghị anya. Ka anyị, site n’ịlụọlụ na n’iche nche bụrụ ndị jikeere izute Jisọs mgbe Ọ ga-abịa.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú anyị si mara na Jisọs ga-abịa ọzọ?
  2. Òlee mgbe Jisọs ga-abịa?
  3. Gịnị ka mmadụ ná-aghaghị ime iji jikere n’ihi ọbịbịa Jisọs?
  4. Gịnị mere ụfọdụ nime ụmụagbọghọ ahụ ji bụrụ ndịnzuzu?
  5. Gịnị mere ndị ọzọ ji bụrụ ndị nwereuche?
  6. Gịnị mere mgbe onye ahụ náalụ nwunyeọhụụ bịara?
  7. Gịnị mere ndịnzuzu ahụ ji jee ịzuta?
  8. Gịnị ga-eme mgbe Jisọs bịara ma ọ bụrụ na anyị ejikereghị?