Matiu 25:14-30

Lesson 225 - Junior

Memory Verse
“I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: I kwesiri ka atukwasi gi obi n’umu ihe ole-na-ole, m’gēme gi onye-isi ọtutu ihe” (Matiu 25:21).
Notes

Ekesara Talent

Otù nime ilu dị icheiche nke Jisọs tụụrụ ndị náesoụzọ Ya bụ banyere otù ọgaranya tụrụ àtùmààtù ijé n’obodo ọzọ, ná arapụ ụlọ ya na ihe niile o nwere n’aka ndị orù ya ilekọta. O chere na ya nwere ndị egoro ọlụ ya pụrụ ịtụkwasị obi, n’ihi ya ọ kpọkọtara ha tupu ya amalite ijè-ya, wee nye onye ọ bụla nime ha ego dị ukwuu iji zụọ ahịa mgbe ahụ ọ na-anọghị n’ụlọ.

Orù nke mbụ ka o nyere talent ise, wee gwa ya ka o jiri ego ahụ mee ihe n’ụzọ ga-eme ka o rita urù. Orù nke abụọ ka o nyere náánị talent abụọ. Orù nke a enweghị ike dịka onye nke mbụ nwere, ọ pụghị kwa iji ihe karịrị talent abụọ mee ihe. Orù nke atọ ka o nyere náánị otù talent dị ka ike ya ra.

Mpịazi Ahụ

Mgbe ogologo oge gasịrị (ọ ghaghị ịbụworị ọtụtụ arọ) onyenwe ha lọghachirị. Ọ kpọrọ ndị orù-ya ka ha gosi ya ihe ha ritara n’urù n’ọlụ ha lụrụ mgbe ya ná-anọghị n’ụlọ.

Orù nke mbụ wetara talent iri -- okpukpu abụọ nke ihe enyeworo ya. Obi tọrọ onyenwe ya ụtọ nkeukwuu. Nke a bụ ụdị orù dị ya mma. Ọ gwara nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasịobi: “I kwesiri ka atukwasi gi obi n’umu ihe ole-na-ole, m’gēme gi onye-isi ọtutu ihe: ba n’ọñù nke onye-nwe-gi.” O nyere ya ọbụná karị ihe orù ahụ wetaara ya.

Chee obiụtọ orù ahụ ga-enweworị! Afọ juru ya ịma na ya alụwo ọlụ ya nkeọma -- ugbu a o nwetakwara ụgwọọlụ ukwuu ra otú a! O gosiwo na ya bụ onye pụrụ ịzụ ahịa ya nkeọma, ugbu a na enyekwara ya ohere iso onyenwe ya ná-achị isi.

Mgbe ndị orù ibe ya hụrụ ụgwọọlụ a, eleghịanya, ọ gụrụ ha agụụ ka asị na ha nwekwara talent ise iji lụọ ọlụ; ma ka anyị lee ihe onyenwe ha gwara orù ahụ nke enyere náánị talent abụọ. Talent abụọ ahụ ritakwara abụọ ọzọ n’urù, n’okpuru ezi nlekọta nke orù nke abụọ ahụ. Onyenwe ha gwakwara ya otù ihe ahụ ọ gwaworo orù nke mbụ: “I kwesiri ka atukwasi gi obi n’umu ihe ole-na-ole, m’gēme gi onye-isi ọtutu ihe ba n’ọñù nke onye-nwe-gi.” Ọ ghọtara na orù a enweghị ike dịka orù nke mbụ nwere, kama akwụghachịrị ya ụgwọ n’ihi ikwesị ntụkwasịobi ya. Orù nke abụọ ahụ gaje kwa ịbụ onye ná-achị isi. O nwere ike ịbụ na ọ ga-achị náánị obodo ise, mgbe orù nke mbụ ga-achị iri (Luk 19:17-19) ma nke ahụ bụ ole ọ pụrụ ịchịkọta, ụgwọọlụ ya nyekwara ya obiụtọ.

Amaraikpé

Òlee ihe banyere nwoke ahụ nke nwere náánị otù talent? Onyenwe ya eleghịanya na ọ ga-eritaworị talent iri n’urù, kama o lere anya na ọ gaje inweta okpukpu abụọ ihe enyere ya. Otú ọdị, orù ahụ bụ onye umengwụ, ọ dịghị kwa ọlụ ọ lụụrụ onyenwe ya. Ezobewo talent ahụ n’ala ebe ọ dịghị onye pụrụ ịhụ ya anya n’arọ niile ahụ ekwesịrị iji ya ná-eme ihe.

Anyị apụghị inwe olileanya na obi ga-atọ onyenwe ya ụtọ n’ebe orù dị otú a nọ. Orù ahụ matara na ya emewo ihe ọjọọ, ma ngwangwa, ọ malitere ịta onyenwe ya ụta ka aga-asị na ọ bụ ya mere eji zobe talent ahụ n’ala. Ọtụtụ ugbò ole ka ụmụmmadụ na-ata onye ọzọ ụta n’ihi ihe ná-adịghị mma nke ha mere! Ọbụná asị na onyenwe ya bụ “madu aka ike,” dịka orù ahụ kwuru, nke ahụ agaghị-eme ka orù ahụ rapụ iji ikwesị ntụkwasịobi lụọ ọlụ-ya.

Gee ntị n’ihe onyenwe ha gwara orù a: “Ajọ orù nke di ume-ngwu.” Mmehie ya bụ nke nlefuanya. Ọ bụghị ọlụ ọjọọ wetara ịma ikpé ahụ, kama ọ bụ ịrapụ ime ezi ihe o kwesịrị ime. Atụpụkwara orù a n’ọchịchịrị nke èzí ebe “ikwa-ákwa na ita-ikekere-ezé” dị.

Mgbe ọzọ Jisọs sịrị na ọ dị ndị ga-abịakute Ya na mgbe ikpé ná-eti, “Onye-nwe-ayi, Onye-nwe-ayi, àyi ejigh aha-Gi bu amuma, àyi ejigh kwa aha-Gi chupu ndi-mọ ọjọ, àyi ejigh kwa aha-Gi lu ọtutu ọlu di ike?” Ọ ga-azaghachị kwa ha, sị, “Ọ digh mgbe ọ bula M’mara unu: si n’ebe M’nọ pua, unu ndi nālu ọlu nēmebi iwu” (Matiu 7:22, 23). Ụdị ndị dị otú a ga-eche na aga-anabata ha n’Eluigwe n’ihi na ha alụwo ezi ọlụ; ma Jisọs sịrị na ha aghaghị ibu ụzọ bụrụ ndị azọpụtara ná mmehie ha tutu agụnye ọlụ-ha n’ihe ga-eweta ụgwọọlụ nke eluigwe.

Ọ bụrụ na agaama ndịa lụworo ezi ọlụ n’aha Jisọs ikpé n’ihi na azọpụtaghị ha, òlee ohere ga-adịrị onye dị ka orù a nwere otù talent na mgbe ikpé? O nweghị ọbụná ọlụ ọ ga-egosi onyenwe ya.

Inye Jisọs

Ekwuwo ya na anyị pụrụ inye ihe ná-enweghị ịhụn’anya ma anyị apụghị ịhụ ná anya ghara inye ihe. N’ụzọ ọzọ, mgbe ụfọdụ i nwere ike nye onyinye n’ihi na ị ghọtara na ọ bụ ọlụ dịrị gị n’ebe onye ahụ enyere ya nọ, ọ bụghị na i nwere ịhụn’anya pụrụ iche n’ebe ọ nọ. Ma ọ bụrụ na ị hụrụ mmadụ n’anya n’ezie, ị ganaachọ inye ya ihe niile ị pụrụ inye. Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị niile hụ Jisọs n’anya, anyị na-enye Ya ihe kachasị mma anyị nwere n’afọòfùfò.

Gịnị ka anyị pụrụ inye Jisọs? Nke mbụ, anyị na-enye Ya ịhụn’anya anyị. Anyị na-ejekwara Ya ozi. Otù nime ozi anyị ga-ejere Ya bụ ikpé ekpere. Anyị ga-elezianya ịhụ na anyị ji ekpere malite ụbọchị ọ bụla. Anyị na-ekpe ekpere n’ihi nzọpụta nke mkpụrụobi ndị furuefu na ọgwụgwọ nke ndị nọ n’ọrịa. Anyị na-ekpe ekpere ka agọzie nzukọ anyị niile. Anyị na-eji ekpere nke ekele mechie ụbọchị ọ bụla n’ihi odudu na nchebe nke Chineke n’ụbọchị ahụ.

Ọlụ ọzọ bụ ịgbaàmà. Ihere agaghị-eme anyị ime ka ụmụmmadụ mata na anyị bụ Ndị Kraist. Anyị chọrọ ka ha mara banyere ịhụn’anya Jisọs n’ebe anyị nọ, na otú obi naatọ kwa anyị ụtọ ịbụ ụmụ Ya. Eleghịanya ụmụntakịrị ụfọdụ gị na ha na égwùégwù anụtụbeghị ihe banyere Jisọs. Ọlụ gị ga-abụ ịkpọ ha okù ka ha bịa Ụlọakwụkwọ Ụbọchịụkọ na ịgwa ha na Jisọs hụrụ ha n’anya, na Ọ chọkwara ime ka ha dị mma ka ha wee soro Ya biri n’Eluigwe rue ebighịebi.

Ọtụtụ Ọlụ Dị Nime

Ọlụ niile ahụ bụ nke anaahụ anya. Anyị nwekwara ọlụ dị nime anyị ga-alụ. Iji mee ka ọlụ anyị niile anaahụ anya dị mma n’anya Chineke, anyị aghaghị ịtụkwasị ihe n’onyinye amara niile anyị dịka Ndị Kraist: “Tukwasinu inu-ọku-n’obi nile, nyezu-kwa-nu idi-nma n’okwukwe-unu; nyezu kwa ihe-ọmuma n’idi-nma-unu; nyezu kwa ijisi-onwe-unu-ike n’ihe-ọmuma-unu; nyezu kwa ntachi-obi n’ijisi-onwe-unu-ike; nyezu kwa nsọpuru-Chineke nime ntachi-obi-unu; nyezu kwa ihu-n’anya umu-nna nime nsọpuru-Chineke-unu; nyezu kwa ihu-n’anya nime ihu-n’anya-umu-nna-unu. N’ihi na asi na unu nwere ihe ndia, asi kwa na unu nwere ha ri nne, ha nēdo unu ndi nābugh ndi nādigh-alu ọlu ma-ọbu ndi nādigh-ami nkpuru rue imazu Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. N’ihi na onye ahu ihe ndia nādigh ya nso bu onye kpuru ìsì, onye nāhu inyogh-inyogh, ebe ọ chezọrọ nsachapu nke nmehie ochie ya nile” (2 Pita 1:5-9).

Talent Anyị Niile

Enyere orù nke mbụ talent ise. Ka anyị were nke ahụ tụnyere ndụ Onye-Kraist. Otù onye nwere ike inwe talent ise nke ọ pụrụ iji fee Onyenwe anyị òfùfè. Ka anyị sị na ọ bụ onyeozi nke pụrụ ikwu okwu Chineke nkeọma. Nke ahụ bụ otù talent. Ọ pụrụ ịbụ abù; o nwere eziomume nke na-eme ka obi dị ọtụtụ mmadụ ụtọ; ọ bụ onye ná-alụọlụ ya nkeọma; arụ dị ya ike nkeọma na ọ pụrụ inyere ndị chọrọ inyeaka aka. Mgbe ọ na-eji talent niile ahụ ná-alụrụ Jisọs ọlụ n’ikwesị ntụkwasịobi, ha na-aba ụba karị. Ma ọ ghaghị iji ha niile lụaọlụ ka o wee nụ ka Onyenwe anyị na-asị, “I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi: I kwesiri ka atukwasi gi obi n’umu ihe ole-na-ole, m’gēme gi onye-isi ọtutu ihe.” Ọ ga-alụsi ọlụ ike iji nweta ụgwọọlụ ya.

Onye ọzọ pụrụ inwe náánị talent abụọ. Ka anyị sị na ọ na-atọ ya ụtọ ijé leta ndị ná arịaọrịa na ndị nọ ná mkpà, okwu ịgbàume ọ na-agwa kwa ha na-eme ka obi ha jupụta n’ọñụ. Ọ pụkwara ịbụ abù nkeọma, ọ na-eji kwa talent abụọ ahụ alụkọ ọlụ. Ọtụtụ ndị ogbenye na ndị ná-ahụju anya na-ejupụta mgbe niile, n’ihi ya ihe ọ pụrụ ime dị ọtụtụ; ma ọ ghaghị ikwesị ntụkwasịobi n’ihe ọ na-eme ọ bụrụ na ọ chọrọ ịnụ: “I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesịrị ka atukwasi gi obi; … m’gēme gi onye-isi ọtutu ihe.”

Anyị nwere ike chee na anyị na-adọgbu onwe-anyị n’ọlụ n’ebe a n’ihi Onyenwe anyị, mgbe Ọ bịakwara, ọlụ anyị ga-ebi. Ma site n’ilu a, ọ dị ka ijéozi anyị n’ebe a bụ náánị ijikere anyị maka ihe ka ukwuu n’ofé nke ọzọ. Ka anyị na-alụ ọlụ nkeọma ka o wee bụrụ na Onyenwe anyị ga-enwe ike iji anyị lụọ ọlụ n’ebighịebi niile n’ala ahụ O doziworo nye ndị hụrụ Ya n’anya!

Ọlụ dịrị Anyị

Chineke enyewo anyị niile talent nke Ọ na-ele anya na anyị ga-eji lụọọlụ. Anyị gaje ịzà ajụjụ ọ bụghị náánị banyere ihe anyị nwere kama banyekwara ihe anyị nwere ike inweta. Ọ bụrụ na anyị ewere ihe Chineke nyere anyị lụọọlụ, anyị ga-anata karị, Chineke ga-achọ kwa ọlụ dị ukwuu karị n’aka anyị. Anyị agaghị ejikọ aka-anyị ná-asị na ihe anyị nwere juru anyị afọ, na óké ụgwọọlụ adịghị anyị mkpà; anyị apụghị kwa ikwu na anyị ekwesịghị imere Onyenwe anyị ihe dị ukwuu. Ọ bụrụ na O nyeworo anyị talent nke anyị ná-adịghị eji alụrụ Onyenwe anyị ọlụ, anyị ga-ahụ onweanyị dịka ndị orù umengwụ mgbe Ọ ga-akpọ anyị ịgụkọta.

Ndị orù niile ndịa lere anya na onyenwe ha ga-alọghachị. Ha maara na ọ ga-ajụ banyere talent ha nataworo n’aka-ya. Ná-agbanyeghị nke a orù umengwụ ahụ jere zobe talent nke ya n’ala ghara iji ya lụọọlụ.

Ọtụtụ mmadụ taa na-ele anya nlọghachị nke Onyenwe anyị, ha na-eche kwa na ha ejikerewo. Ọ pụrụ ịbụ na azọpụtawo ha, ma ha atụkwasịghị ịdịmma n’okwukwe-ha, ha atụkwasịghị kwa iheọmụma n’ịdịmma ha na amara niile ọzọ nke Onye Kraist; ya mere ìhè ha nweworo ghọrọ ọchịchịrị. Onyeozi ahụ dere sị “Ọ buru na ayi ejeghari n’ìhè ahu, dika Ya onwe-ya nọ n’ìhè ahu, ayi nēnwekọrita ihe n’etiti onwe-ayi, ọbara Jisus, bú Ọkpara-ya nāsachapu kwa ayi nmehie nile” (I Jọn 1:7). Ma anyị aghaghị ijégharị n’ìhè, ọ bụrụ na ọ bụghị otú a, ọ ga-aghọ ọchịchịrị, anyị ga-ahụ kwa na anyị alọghachịwo nime mmehie.

Ya mere anyị na-amụta na iji nata ịjámma ahụ, “I mere nke-ọma, ezi orù nke kwesiri ka atukwasi gi obi,” anyị aghaghị ikwesị ntụkwasịobi n’ihe ọ bụla nke Onyenwe anyị gosịrị anyị ka anyị mee; were kwa obi afọòfùfò mee ihe ahụ enyeworo anyị ka anyị mee.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Talent òle ka enyere ndị orù ahụ?
  2. Gịnị ka ha ga-eji talent niile ahụ mee?
  3. Gịnị bụ ụgwọọlụ nke orù nke mbụ? na nke abụọ?
  4. Gịnị ka orù nke atọ jiri talent ya mee?
  5. Gịnị bụ ụgwọọlụ ya?
  6. Gịnị ka anyị pụrụ ịkpọ talent ná ndụ anyị?
  7. Òlee ebe anyị si enweta talent anyị?
  8. Òlee otú anyị ga-esi rita talent ọzọ n’urù?
  9. Gịnị ka ọlụ-anyị n’ebe a na-ejikere anyị nye?
  10. Òlee otú aga-esi kpee ọlụ anyị ikpé?