Abù Ọma 34:1-22

Lesson 226 - Junior

Memory Verse
“Mọ-ozi nke JEHOVA nāma ulo-ikwu-ya gburugburu ndi nātu egwu Ya, o we dọputa ha” (Abù Ọma 34:7).
Notes

Otù Ịgbáàmà

Devid na-echeta mgbe ọ bụla ihe niile mere ya mgbe ọ bụ onye na-agba ọsọ ndụ, onye si n’ebe ndị iro ya nọ na-agbalaga. Chineke enyeworo Devid aka, kpuchie kwa ya ọtụtụ ugbò na n’ụzọ dị iche iche. Site n’ihe niile Devid nwapụtara, okwukwe na olileanya ya nime Chineke adịwo omimi rue n’ime ka o nwee ndabere na ntụkwasịobi nime obi-ya. Mgbe Devid tụkwasịrị Chineke obi, ọ matara na ọ dịghị ihe ọjọọ ga-eme ya.

Mmụọ Chineke tinyere Abù Ọma nke a n’obi-ya mgbe Chineke nyeere Devid aka n’otù ihe egwù ọ dabara. N’ebe a, Abimelek bụ aha dị ka Fero, eze, maọbụ onye naachịisi. Ná arụghịụka, Devid na-ekwu banyere Ekish, eze Gat, onye ọ tụworo egwù ya nke-ukwuu (I Samuel 21:12). Devid matara na Chineke nyeere ya aka ịgbalaga. Mgbe Devid na-echè échìchè banyere ihe ndịa, o metụtara ya na ya ji Chineke ụgwọ otuto riri nne. Abù Ọma a bụ ịgba-ama Devid.

Inye Otuto Mgbe niile

Devid sịrị, “M’gāgọzi JEHOVA na mgbe nile.” N’ebe a o kwupụtara ihe o bu n’obi bụ inye Chineke otuto n’ọnọdụ ọ bụla. Ụfọdụ mmadụ pụrụ itó Chineke mgbe ọ dị ka ihe niile na-agara ha nkeọma. Ndị ọzọ na-enye Chineke otuto otù ugbò nime ọtụtụ arọ. Devid matara na mgbe niile ka ana-enwe ihe aga-eji na-enye Chineke otuto ná-ekele kwa Ya. Ọbụná mgbe egwù na ihe izendụ, obi Devid na-adaberesi ike na Chineke. Mgbe nchekasị na mkpagbu bịakwasịrị Devid, ọ na-enwe kwa ihe na-eme ka ọ tụkwasị Chineke obi na-eto kwa Ya otuto. Devid sị na otuto Chineke ga-adịgide n’egbugbereọnụ ya, mgbe niile, na mgbe ihe ọ bụla na-eme. Onye dere Akwụkwọozi edegaara ndị Efesọs na-agwa kwa anyị sị “Nēkele kwa Chineke … ekele mgbe nile n’ihi ihe nile” (Ndi Efesọs 5:20).

Inye Chineke Otuto

Devid emewo ọtụtụ ihe dị ike ná ndụ-ya -- dịka iji èbè tigbue dike ahụ bụ Gọlaiat bụ onyeiro ndị nke Chineke, dịka ijide ọdụm n’ọza-ya tigbue ya mgbe ọ chọworo izuru otù nime ụmụatụrụ Devid, dịka itigbu bear wee si n’ọnụ-ya napụta otù nwaatụrụ nke ìgwèatụrụ Devid. Devid adịghị anyaisi n’ihi ọlụ dị ike maọbụ ihe ọ bụla nke o meworo. Devid na-enye Chineke otuto n’ihi na ọ matara na ya apụghị ime ihe ọ bụla nime ihe ndịa ma ọ bụghị site n’inye-aka Chineke. Pọl Onyeozi kwuru okwu ụfọdụ yiri nke a Devid kwuworo. Pọl sịrị: “Chineke ekwela ka m’nya isi, ma-ọbugh n’obe Onye-nwe-ayi Jisus Kraist” (Ndi Galetia 6:14). Ọ dị mgbe ọ bụla anyị nyaworo isi? Ọ bụ n’ihi onweanyị, ka-ọ bụ banyere ihe Chineke meworo?

Devid chọrọ ka ndị ọzọ mara ihe Chineke mewooro ya. Devid chère n’onwe-ya na ịnụ ihe dị otú a ga-eweta ọñụ nime obi-ha. Inye Chineke otuto n’ihi ihe o meworo mere ka Devid na ndị ọzọ nwee obiụtọ. Mgbe Devid gwasịworo ndị ọzọ ihe niile ọ nwapụtaworo, ọ kpọkwara ha ka ha soro ya too Chineke. Ha anụwo banyere nnapụta niile anapụtaworo ya, o wee metụta ya na o kwesịrị ka ha keta òkè n’ekele ọ na-enye.

Ekpere niile Azaworo

Devid kwuru ihe mere o ji too Chineke -- Onyenwe anyị anụwo ekpere Devid mgbe o kpere ekpere. Ọ bụghị náánị na Onyenwe anyị nụrụ ekpere Devid kama ọ zakwara ya. Devid toro Onyenwe anyị n’ihi na Chineke wepụkwara egwù site n’obi ya. Mgbe ịhụn’anya Chineke batara nime obi, egwù nke ná-emekpà mmadụ arụ apụwo; udo na ntụkwasịobi na-ewere ọnọdụ ya. N’ide banyere ịhụn’anya Chineke zuru òkè, Jọn kwukwara otù ihe a: “Egwù adigh n’ihu-n’anya: kama ihu-n’anya nke zuru okè nāchupu egwu n’ezí, n’ihi na egwu nwere ahuhu-nmehie agēnye ya” (I Jọn 4:18).

Ná arụghịụkà azawo ekpere anyị niile. Nke a ọ pụghị ime ka anyị too Chineke? Anyị ji Ya ụgwọ otuto na ekele n’ihi ekpere Ọ zaworo. Ọ bụ ezie, anyị anatawo ngọzi niile ọzọ kwa; ma ọbụná asị na Chineke emeghị ihe ọzọ nye anyị, anyị kwesịrị inye Ya otuto n’ihi ekpere niile Ọ zaworo.

Mmụọozi Ná-éché nché

Nke ahụ abụghị náánị ihe Chineke mewooro Devid. Onyenwe anyị ezigawo mmụọozi ka o chee Devid nché. Ụfọdụ mmadụ naakpọ nke a mmụọozi ná-eche nche, onye ná-ekpuchi ha n’ihe-egwù, na-anapụta kwa ha n’ihe izendụ. Ọtụtụ ụmụntakịrị na-achọ ịhụ onyinyo ụmụntakịrị abụọ si n’àkwà dị mkpagide na-agabiga n’ebe dị elu nke mmiri na-eme óké mkpatụ. N’akụkụ ụmụntakịrị ahụ ka mmụọozi nke Onyenwe anyị nọ inyere ha aka ịgabiga àkwà ahụ n’udo. Onyinyo a na-echètara anyị na Chineke na-ezite ndị mmụọozi-Ya ịnọ nso ndị ná-atụ egwù Ya.

Nke a bụ egwù dị iche site n’egwù nke ahụ nwere ahụhụ nke Chineke wepụụrụ Devid. Egwù a adịghị etinye óké egwù na ụjọ nime obi mmadụ. Ọ bụ inye Chineke nsọpụrụ ga-eme ka anyị kpọọ isiala nye Ya mee kwa ka anyị ghara ime ihe ahụ nke ná-adịghị Onyenwe anyị mma. Egwù Chineke na-eme ka anyị ná-efè Onyenwe anyị òfùfè. Baịbụl na-ekwu na “egwu JEHOVA bu nmalite ihe-ọmuma” na “nmalite amam-ihe” (Ilu 1:7; Ilu 9:10).

Egwù Jehova

Ọ dị ọtụtụ ngọzi ọzọ ekwere ná mkwà nye ndị nwere egwù Jehova. Ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ Devid n’obi. Ọ chọrọ ka mmadụ niile nwere ngọzi niile ahụ o nwere. Devid sị na ya ga-ezi anyị egwù Chineke, ọ bụrụ na anyị ga-aña ntị n’okwu-ya niile. Eleghịanya Devid pụrụrị ikuziri ndị ọzọ otú esi akpọ ụbọakwara, n’ihi na ọ bụ onye maara akpọ ụbọakwara na ihe abù niile ọzọ. Maọbụ Devid pụrụrị ikuziri ndị ọzọ otú esi eji mmaagha, n’ihi na ọ bụ nwoke bụ dimkpà n’agha. Devid ekwughị banyere ihe ndịa, n’ihi na ọ maara na egwù Jehova bụ ihe dịkarịsịrị mkpà.

Devid sịrị, “Detunu ire, hu na JEHOVA di nma.” Ọ na-akwagide anyị ka anyị nwapụta Onyenwe anyị n’onweanyị. Anyị pụrụ ịhụ ihe ahụ niile mere Devid na ndụ anyị kwa, n’ihi na Chineke ga-enyere anyị aka dịka O nyeere Devid aka.

Ọ Dịghị Ụkọ Ezi Ihe Niile

Ana-agba anyị ume ịtụkwasị Chineke obi na ịchọ Chineke. Mgbe ahụ anyị ga-enwe ngọzi Chineke, ọ dịghị kwa ezi ihe ọ bụla ga-akọ anyị. Devid asịghị na anyị ga-enwe ihe niile anyị chọrọ. Ihe ọ na-akọwa bụ na Chineke ga-enye anyị ihe niile dịrị anyị mma. Ọ dịghị ezi ihe ọ bụla nke ga-akọ anyị ụkọ, ngọzi niile nke imemmụọ, n’ihi na Chineke nwere ha n’uju. Ọ dịghị ezi ihe ọ bụla kwesịrị ịkọ anyị, n’ihi na ekwere ya ná mkwà nye ndị ná-achọ Chineke, ná-atụkwasị kwa Ya obi. Anyị pụrụ ịdị ndụ n’okwukwe ọ dịghị kwa ihe ga-akọ anyị.

Ezi Ndụ Jupụtara n’Ọñụ

Ọ dị onye ọ bụla ná-agaghị-achọ ezi ndụ, nke dị ogologo jupụtakwara n’ọñụ? Onye ọ bụla na-achọ inwe ndụ nwere ọñụ. Devid gwara anyị otú o si nweta ya, na otú anyị onweanyị ga-esi kwa nweta ndụ dị mma n’ebe a na ezi ndụ mgbe arapụrụ ụwa nke a.

Ndụmọdụ Devid nyere bụ ka anyị si n’ihe ọjọọ wezuga onweanyị, ma ọ bụ n’ikwu ya maọbụ n’ime-ya. Chineke achọghị ihe ọjọọ. Ọ kpọrọ ya as. Chineke na-ewepụ iru Ya n’ebe ndị ná-eme ihe-ọjọọ nọ. “Ihe ọjọ gēme ka onye nēmebi iwu nwua.” Mmehie na-eweta mbibi. Ọ ga-ebibi, weta kwa ọnwụ ebighịebi nye ndị ná-eme ihe ọjọọ. Ọ dịghị ihe ọma ọ bụla Devid pụrụ ikwu banyere mmehie na ihe ọjọọ. O dere ọtụtụ amaokwu, ọ bụ ezie na ọ bụ banyere ngọzi niile ná-abịakwasị onye eziomume na ndị ná-eme ezi ihe.

Ichègharị

Eleghịanya enwere ụfọdụ ndị ga-achọ ime ezi ihe ma ọ dị ka ha na-eme ihe ọjọọ mgbe niile. Ha na-ewé iwe, kwue okwu jọrọ njọ, ma ọ na ewute ha na ha were iwé. Ha na-ekwu okwuụgha, emesịa egwù dị ukwuu atụọ ha na aga-achọpụta ha. Ha na-adaba ná nsogbu, ha aghaghị ịhụ ahụhụ o wetara. Devid maara na Chineke pụrụ inyere onye dị otú a aka bụ onye chọworo ime ezi ihe. Ọ dịghị onye pụrụ ibi ndụ eziomume ma Chineke anọnyereghị ya.

Mgbe mmadụ kpọkuru Chineke ka O nyere ya aka, wee chègharịa, o wute kwa ya n’ihi ihe ọjọọ dị ná ndụ-ya, Chineke ga-anụ, zaa kwa ekpere ahụ. Chineke nọ nso ndị obi-ha tiwaraetiwa, Jehova ga-azọpụta kwa ndị ahụ na-egosi mwute n’ihi mmehie-ha. Chineke ga-enyere obi chègharịrị aka, nye kwa ya ike ibi ndụ eziomume. Anya Chineke na-adị n’arụ onye eziomume mgbe ọ bụla, ịhụ ihe dị ya mkpà. Ntị Chineke na-ege mgbe niile ịnụ ákwá ndị nke Ya. “Le, aka JEHOVA adigh nkpunkpu kari izọputa; nti-Ya adigh kwa arọ kari inu ihe” (Aisaia 59:1).

Ime Ezi Ihe

Devid sịrị, “Si n’ihe ọjọ wezuga onwe-gi, me ezi ihe; nāchọsi udo ike, gbaso kwa ya.” O zughị ókè na mmadụ agaghị-eme ndị ọzọ ihe ọjọọ. Anyị aghaghị “ime ezi ihe” -- anyị aghaghị ịbà urù nyekwara ndị ọzọ aka. Mgbe anyị mụrụ banyere Debora na Berak (Ihe-ọmùmù 191), anyị mụtara na obodo Miroz natara ọbụbụọnụ Jehova n’ihi na ọ dịghị ihe o mere. Ndị bi n’ala ahụ egbochighị ndị nke Chineke ma ha enyereghị ha aka mgbe ha kwesịrị ime otú a. “Ha abiagh iyere JEHOVA aka, iyere JEHOVA aka imegide ndi-dike” (Ndi Ikpe 5:23).

Ime ezi ihe abụghị náánị ihe Chineke chọrọ n’aka mmadụ. Onye ahụ aghaghị-isi n’ihe ọjọọ wezuga onwe-ya. Ọ dị ndị ná-eme ezi ihe ma ha enweghị ezi ọñụ rue mgbe ha si n’ihe ọjọọ wezuga onwe-ha. “Uzọ atuliri atuli nke ndi ziri ezi bu isi n’ihe ọjọ wezuga onwe-ha” (Ilu 16:17). “Ka onye ọ bula nke nākpọ aha Onye-nwe-ayi si n’ajọ omume wezuga onwe-ya” (2 Timọti 2:19). Ụzọ ọ bụla megidere ụzọ nke Chineke bụ ụzọ ọjọọ. Ọ bụ ajọ ihe imebi Okwu Chineke. Ọtụtụ mmadụ adịghị-achọ ikwe na ụzọ ha jọrọ njọ, ma onye ọ bụla ana-azọpụtaghị adịghị edebe ihe niile Chineke nyere n’iwu. Erubereghị Chineke isi na ekweghị na Ya na-eweta ndụ ọñụ ná-adịghị n’ebe a na ahụhụ mgbe niile ebighịebi.

Nhụjuanya

“Ihe nile nādakwasi madu nile n’otù uzọ ahu otù ndabà nādabara onye ezi-omume, daba-kwa-ra onye nēmebi iwu; ọ nādabàra ezi madu, dabà-kwa-ra onye di ọcha, dabà-kwa-ra onye nādigh ọcha; ọ nādabàra onye nāchu àjà, dabà-kwa-ra onye nādigh-achu àjà” (Eklisiastis 9:2). Otú ọ dị, ọ dị ihe dị iche n’etiti onye ná-emebi iwu na onye eziomume. Mgbe nsogbu na mbibi bịakutere ndị ná-emebi iwu, ọ dịghị onye ná-enyere ha aka. Ndị ná-eme ihe ọjọọ aghaghị ịhụ ahụhụ ma Chineke na-anapụta ndị eziomume. Onyenwe anyị na-ezitere ndị ná-atụkwasị Ya obi inyeaka. Devid sị na onye ezi omume nwere ọtụtụ ihe ọjọọ ná-adakwasị ya, kama Chineke na-anapụta ya na ha niile. Ọ gaghị-adị mma inwe onye nnapụta ga-esi n’ọtụtụ ihe ọjọọ napụta mmadụ karị inwe otù ihe ọjọọ ma ọ dịghị onye ga-anapụta?

Enweghi Olileanya

Devid na-egosi ihe dị iche n’onye ná-adịghị asọpụrụ Chineke na onye ná-asọpụrụ Chineke. Ndị ná-adịghị achọsi Chineke ike na ndị ná-adịghị atụkwasị Ya obi na-ebi ndụ ná-adịghị ụtọ n’okpuru enweghị iruọma Chineke, ha ga-eguzo kwa n’iru Ya n’ikpé. Ha agaghị enwe olileanya -- ndị arapụworo, náánị ha nọ, ndị amara ikpé, eleghịanya ná nhụjuanya. Ha agaghị ahụ onye ga-agbapụta ha, n’ihi na ha akpọghị Onyenwe anyị tutu ohere agabiga. Enweghị olileanya na ikpé ọmụma ga-abụ òkè ha ebighịebi. Ma Onyenwe anyị na-anapụta ndị ná-achọ Ya. Ọ dịghị onye tụkwasịrị Onyenwe anyị obi nke ga-anọ ná-enweghị olileanya, nke ná-agaghị enwe enyi maọbụ ná-agaghị enwe onye inyeaka.

Ntụkwasịobi

Dịka anyị na-agụ mnwapụta nke Devid, ọ dịghị akpali anyị ịtụkwasị Chineke obi karị? Anyị onwe anyị pụkwara inwe otù ntụkwasịobi ahụ nke Devid nweworo nime Chineke. Òlee otú Devid si nweta ntụkwasịobi dị otú a? Devid nwere obiumeala, kpee kwa ekpere. Devid dabeere na Chineke, ọ bụghị n’ịdịike ya maọbụ n’amamihe ya. Devid nwapụtara Chineke, rubekwara Ya isi. N’ihi na Devid tụkwasịrị Chineke obi, o nwere obiike na Chineke ga-enyere ya aka, kpuchie kwa ya. Ọ maara na Chineke ga-anapụta ya. Anyị onweanyị pụkwara inwe ntụkwasịobi dị otú a n’Onyenwe anyị, n’ihi na mkwà-Ya niile aghaghị imezu.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee mgbe Devid toro Jehova?
  2. Nime Ònye ka Devid na-anya isi?
  3. Òlee otú Devid si mara na Jehova nụrụ olu ya mgbe o kpere ekpere?
  4. Gịnị ka Chineke na-emere onye eziomume?
  5. Gịnị ka Jehova ga-emere ndị ahụ nwere obi tiwaraetiwa na ndị azọpịaworo nime mmụọ?
  6. Ònye na-anapụta onye eziomume ná nhụjuanya ya?
  7. Ná nhụjuanya ole ka aga-esi nápụta onye eziomume?
  8. Òlee ndị mmụọozi Jehova naama ụlọikwu gburugburu ha? Ọ bụ n’ihi gịnị?
  9. Gịnị bụ ntụkwasịobi?
  10. Òlee otú Devid si nweta ntụkwasịobi nime Chineke?