Abù Ọma 103:1-22

Lesson 227 - Junior

Memory Verse
“Gọzie JEHOVA, nkpuru-obim; ka ihe nile nke di nimem gọzi kwa aha nsọ Ya” (Abù Ọma 103:1).
Notes

N’ike Ya Niile

Mgbe Devid na-echè banyere ngọzi-ya niile, obi-ya jupụtara n’otuto nye Chineke. Devid apụghị igọzi Chineke dịka Chineke gọziworo ya, ma Devid pụrụ inye Chineke nsọpụrụ site n’itó Ya. Devid nwere mmetụta n’onwe-ya, na ya ji Chineke ụgwọ otuto. Mmụọ ịmata iheọma emeere ya na inye-ekele kpalitere Devid inye Chineke otuto dị ukwuu, iji ihe niile dị nime-ya: site n’obi ya niile, site ná mkpụrụobi ya niile, site n’uche-ya niile, site n’ike-ya niile, na site n’ume-ya niile.

Urù niile sitere na Jehova bụ ngọzi niile na ezi ihe niile nke O nyeworo anyị. Anyị agaghị échèfu nke ọ bụla nime ha. Ụfọdụ mmadụ ga-achọ ikwu na ezi ihe dị ná ndụ ha sitere n’ọlụ aka-ha; ha na-echè na ha lụsịrị ọlụ ike inweta ha na ihe niile ahụ kwesịkwara ịbụ nke ha. Ma n’ebe Chineke nọ ka ezi ihe ọ bụla si apụta. “Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru okè nke enyere enye si n’elu bia, ebe o si n’aka Nna nke ìhè ridata” (Jemes 1:17). Otuto anyị dị ntakịrị iji kwụghachị ebere Chineke niile anyị nataworo.

Mgbaghara

Mgbe Devid na-echè banyere ebere Chineke, ọ malitere ịgụkọ ngọzi ya niile nke mere o ji ná-étó Chineke. Devid esiwo n’aka Chineke nata mgbaghara mmehie, ọ bụghị náánị ndị ntakịrị maọbụ ndị ahụ ana-akpọ ndị jọrọ njọ nke ukwuu. Devid toro Chineke onye gbagharaworo mmehie-ya niile. Òlee otú Devid si mara na Chineke agbagharawo ya mmehie ya niile? Devid kweere-rị na ya bụ onyemmehie; o kwupụtakwara mmehie-ya niile nye Chineke; o chègharịa site ná mmehie ya niile, ọ rịọwo Chineke ka ọ gbaghara ya; mgbe o kwere ná mkwà niile nke Chineke, udo na ezi ịgbaàmà batara n’obi Devid na agbagharawo ya mmehie-ya niile na ha adịkwaghị ọzọ. Mgbaghara mmehie a adịrịghị náánị Devid; onye ọ bụla pụrụ ịnata ya n’aka Chineke, “Ọ buru na ayị ekwuputa nmehie-ayi, Ọ bu onye kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa onye ezi omume, ka O we gbaghara ayi nmehie-ayi, sachapu kwa ayi ajọ omume nile” (I Jọn 1:9).

Ọgwụgwọ

Ngọzi ọzọ Devid natara n’aka Chineke bụ ọgwụgwọ nke arụ-ya -- ọgwụgwọ nke ọrịa niile. Ike Chineke akwụsịghị n’ịgwọ náánị ọrịa olenaole maọbụ ọrịa ná-adịghị ike nke ukwuu. Chineke na-agwọ ọrịa na nrịarịa niile. Nke a abụghị kwa nye náánị ndị biri n’oge Baịbụl. Anyị onwe-anyị, taa, pụrụ ịnata ọgwụgwọ nke arụ-anyị site n’Ọbara Jisọs.

Enwere ndụmọdụ nime Baịbụl nye ndị arụ ná-adịghị ike. “Ọ di onye ọ bula n’etiti unu nāhuju anya? Ya kpe ekpere … ekpere nke okwukwe ahu gāzọputa kwa onye ahu aru nādigh ike, Onye-nwe-ayi gēme kwa ka o bilie” (Jemes 5:13-15). Na Baịbụl, kwa, ọ dị ọtụtụ ugbò anyị hụrụ ebe agwọrọ ndị arụ ná-adịghị ike: ọrịa ekpenta (Matiu 8:3), onye akụkụ arụ-ya nwụrụanwụ (Matiu 8:6, 13), ọrịa arụọkụ (Matiu 8:14, 15), ikpu ìsì (Matiu 9:28-30), aka kpọnwụrụ akpọnwụ (Matiu 12:13), idaogbi (Matiu 12:22), na ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ dị icheiche. “Jisus we nējeghari n’obodo na obodo ntà ha nile, nēzi ihe n’ulo-nzukọ nile ha, nēkwusa kwa ozi ọma nke ala eze ahụ, nāgwọ kwa ọria nile di iche iche na nriaria nile di iche iche” (Matiu 9:35). N’ụlọ ọlụ Apostolic Faith dị na Portland Oregon, ka edebere ihe niile edepụtaworo banyere igbá àmà nke ndị nataworo ọgwụgwọ site n’ụdị nrịarịa na ọrịa niile dị icheiche mgbe ekpeere ha ekpere ha were kwa okwukwe nime Chineke nara ya. Ọ bụrụ na arụ adịghị gị ike maọbụ na ị maara onye arụ ná-adịghị ike, okwu Devid ndịa ọ dịghị eme ka obi gị dị ike itò Chineke onye ga-agwọ “ọrịa-gị nile”? Ná arụghịụkà Chineke agwọwo gị na mgbe gara aga. Ị chetara ikele ya ekele na itò Ya?

Ngọzi niile Ọzọ

Devid maara na onye ná-ebi ndụ-ya nime mmehie chere mbibi na ọnwụ nke imemmụọ iru. Devid matakwara na Chineke pụrụ ịgbapụta mkpụrụobi ya n’aka onyembibi ahụ bụ, Setan. Ịgbapụta bụ ịnaghachị na ịzụghachị. Ọkpara Chineke bụ Jisọs Kraist, nyere ndụ-Ya iji gbapụta mkpụrụobi anyị. Ọ kwụrụ ụgwọ na mgbapụta n’ihi mmehie anyị niile. Devid maara na Chineke pụrụ ịgbapụta ma ọ maara karịa nke a -- na Chineke agbapụtawo mkpụrụobi ya. Ọtụtụ mmadụ maara na apụrụ ịzọpụta ha. Ọ bụ kwa ihe ọzọ mmadụ ịma na azọpụtawo ya, o doo kwa ya anya na agbapụtawo ya. O zughị òkè ịma na apụrụ ịzọpụta mmadụ. Anyị aghaghị inwe ike nwee mkwuwa okwu -- ịma na Chineke azọpụtawo anyị. Ị nwere ịgba-àmà ahụ nime obi-gị na ndụ-gị na azọpụtawo gị?

Ọ bụghị náánị na Chineke esiwo n’aka ọnwụ na mbibi zọpụta Devid, o mekwara ka o nwe ezi ọñụ zuru òkè. Jehova ejiriwo nsọpụrụ, ezi ihe na ogologo ndụ kpube Devid dịka okpueze. Iheụtọ kachasị n’ụwa bụ inwe iruọma, mkpuchi, na mgbaghara nke Chineke. Devid na-échéta mgbe ọ bụla, ịhụn’anya, omumeọma na ebere nke Chineke gosiworo ya na nke O nyeworo ya. Mgbe azọpụtara mmadụ, Chineke na-etinye nime obi-ya mmụọ ahụ nke na-egosi “ebere na obiebere dị iche iche” n’ebe ndị ọzọ nọ. Onye-Kraist na-amị mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ (Ndi Galetia 5:22, 23). Onye-Kraist na-anata ngọzi dị icheiche site n’aka Onyenwe anyị ka o wee yie Kraist. Aha ahụ bụ Kristien “pụtara onye yiri Kraist.”

Baịbụl

Devid kwupụtara ojujuafọ o nwere nye kwa ekele n’ihi Okwu Chineke bụ nri nke mkpụrụobi anyị. E wezuga Okwu ahụ anyị ga-anọ n’agụụ nke imemmụọ. Job hụrụ Okwu Chineke n’anya karịa iheoriri ya. Ọ sịrị “Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm” (Job 23:12). Aisaia bụ Onyeamụma kpọrọ mmadụ niile òkù ka ha bịa soro rie nri nke imemmụọ, ka afọ wee ju ha. “N’ihi gini ka unu nātù ego inye n’ọnọdu ihe nābugh nri? Na ihe putara na ndọgbu unu nādọgbu onwe-unu n’ọlu n’ọnọdu ihe nke nādigh-eju afọ? Genum nti nke-ọma, rie ezi ihe, ka ihe nke mara abuba tọ kwa nkpuru-obi-unu utọ” (Aisaia 55:2).

Ọ dịghị akwụkwọ ọzọ ọ bụla nke edeworo pụrụ iwuli mmadụ elu n’ihe nke imemmụọ dịka Baịbụl. Okwu Chineke dị mkpà, n’ihi na ọ na-akwalite okwukwe anyị, olileanya anyị, na ịhụn’anya anyị nime Chineke. Site ná mmalite nke oge, Chineke agwawo mmadụ okwu, nye kwa ya Okwu-Ya. Eziri Ụmụ Israel uche Chineke na uzọ-Ya site n’aka Moses na site n’Iwu. Anyị onwe anyị nwere Baịbụl, anyị nwekwara ike site n’ekpere iso Chineke kparịta ụka.

Dịka Ugo

Devid ji Onye-Kraist tụnyere ugo, nnụnụ ahụ nwere ogologo ndụ -- ụfọdụ na-adị ndụ rue otù narị arọ. Mmadụ nwere ike chee na mgbe dị ogologo otú a, ugo ahụ agaghị-adị kwa mma ile anya, na ábụbà-ya ụfọdụ ga-ajọ njọ ụfọdụ ga-adapụsịwo kwa. Ábụbà dị nnụnụ mkpà. Ha na-ekpuchịrị ya okpomọkụ na óké ifufe. Ábụbà dị nụụnụ mkpa iji na-éfé éfé. Ọ bụrụ na ọtụtụ ábụbà esi n’otù nku dapụ, nnụnụ ahụ apụghị ifé gaa n’akụkụ ebe ọ chọrọ ijé. Amatawo ugo dịka nnụnụ na-eji nkù ya alụ ọgù -- iji tigbue, bibie kwa onye-iro ya. Ugo agaghị ebi ogologo ndụ ọ bụrụ na ábụbà-ya adapụsịa maọbụ gbajisịa jọọ kwa njọ. Chineke arọpụtaworo ugo: Site n’oge rue n’oge mgbanwe na-adị -- mgbe ábụbà ochie niile na-adapụsị, n’otù n’otù, ábụbà ọhụụ ewere ọnọdụ ha. Ihe ahụ na-ekpuchi ugo, ihe ahụ o ji alụ ọgù, na ihe ahụ ná-enyere ya aka ifé éfé ná-adị kwa ọhụụ ọzọ.

Onye-Kraist na-adị kwa ọhụụ ọzọ site n’Okwu Chineke -- ọ bụghị náánị n’ihe anya na-ahụ, kama n’ịdị ọhụụ nke ime mmụọ. Chineke arọpụtaworo onye-Kraist ihe, “dika àkù nke ebube-Ya si di, ka ewere ike me ka unu di ike site n’aka mọ-Ya nābata nime madu ime unu” (Ndi Efesọs 3:16). Ikpé ekpere na iji-obi chụọàjà dị kwa mkpà ime ka mmụọ mmadụ dị ọhụụ mgbe ọ bụla.

Devid sị na “idi-na-nwata-gi” ka ana-eme ka ọ dị ọhụụ dịka nke ugo. N’ikwu banyere ịdịnanwata, ọ pụtara oge mmadụ na-enwe ike, oge ime ọtụtụ ihe, oge ịnụ ọkụ n’obi, na oge itó-étó. Ịdị ndụ dịka Okwu Chineke si dị -- ime ihe o kwuru na ịmụ ya -- na-eme ka mmụọ Onye-Kraist dị ọhụụ ná-atụte kwa ya. Ọ gaghị-adị mkpà na ọ ga-eru ebe ahụ mmụọ-ya ná-agaghị adị ike maọbụ ná-agaghị eguzo nkeọma n’ihi ịka nká. Ịdịike na ume nke anụarụ mmadụ na-ebilata, ma mmadụ nke imemmụọ na-adị ike ná-eguzosi kwa ike. Aisaia Onyeamụma ji kwa ugo ná-akọwa ihe Chineke ga-emere ndị ná-atụkwasị Ya obi. Aisaia sịrị: “Ndi nēle anya JEHOVA gāgbanwe ike-ha; ha gēfego elu na nkù dika ugo; ha gāgba ọsọ, ike agagh-agwu kwa ha; ha gēje ije, ghara ida bà” (Aisaia 40:31).

Nke Gi

Ngọzi niile ndịa nke Devid kwuru abụghị nye onwe-ya náánị, ọ bụ kwa nye onye ọ bụla nke kweere. N’amaokwu ndịa, Devid asịghị nkem; ọ sịrị ngọzi gị niile. N’elu iheọma ndịa nke Devid hụtara, apụkwara ịtụkwasị ihe ọzọ dị icheiche, dịka ibu enyi ndị Chineke, na ohere ijé n’ụlọnzukọ. Ị pụrụ itinye n’ihe ndịa edepụtara ezi ihe dị icheiche Chineke rọpụtaworo gị?

Ebere Chineke

Chineke enyeghị anyị ahụhụ kwesịrị mmehie niile nke anyị meworo. Chineke dị ebere bụrụ kwa Onye ná-adịghị ewé iwé ọsọsọ; ọ dịghị enwe akaike n’efu (Ndi Rom 11:22). Chineke bụ Onye eziomume ná-eme ihe ziriezi. Site n’Okwu-Ya, ọ na-eme ka anyị nọ, ná-eme kwa ka anyị ghọta na anyị pụrụ ịtụkwasị Ya obi. Mgbe mmadụ chègharịrị, kpee kwa ekpere n’ihi mgbaghara, iwé Chineke adịghị emegide ya ọzọ. A na-ewepụ mmehie ya n’ebe dị anya nke ana-apụghị ịtụ atụ -- “dika iru-anyanwu si di anya n’ọdida-anyanwu.” Ọ na-anata ebere, ọmịko, na mgbaghara zuruòkè, kama ụgwọọlụ nke mmehie-ya niile.

Devid ji nnọgide ebere Chineke ná-atụnyere ogologo ndụ nke mmadụ. Iji tụnyere ebere Chineke, ndụ mmadụ dị ka “alulu, nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n’anya” (Jemes 4:14). Devid ji kwa ndụ mmadụ ná-atụnyere okokoosisi nke ọhịa -- ọ bụghị ma okokoosisi nke ubi agbara ogige. Adịghị elezi okokoosisi dị n’ọhịa anya, adịghị kwa agba ya mmiri, adịghị kwa agbasa ya ihe ga-egbu ụmụarụrụ maọbụ ọrịa. ké oyi, okpom-ọkụ, na ifufe, na-amakwasị okokoosisi dị n’ọhịa. Ọ bụ okokoosisi dịka ndị ọzọ, ọ dịghị iche. Apụrụ ịzọkwasị ya ụkwụ, zọpịa ya, maọbụ anụmanụ pụrụ iri ya maọbụ bibie ya. Okokoosisi dị n’ọhịa anaghịadị ogologo ndụ. Na nwa oge, ha adịkwaghị, ewee chefue ha. N’otù aka ahụ, ọ bụ ihe ná-eme eme na mmadụ na-ebi ndụ dị mkpụmkpụ wee nwụọ. Ma ebere Chineke adịghị otú ahụ. Ọ na-anọgide rue ebighịebi n’arụ ndị ná-atụ egwù, ná-efè kwa Chineke, nye ndị ná-eme ihe O nyere n’iwu, na ndị ná-ebi ndụ okwukwe na nrubeisi. “N’ezie ahihia ka ndi ahu bu. Ahihia akpọnwuwo, okoko-ọhia ajunwuwo: ma okwu Chineke-ayi gēguzosi ike rue mgbe ebigh-ebi” (Aisaia 40:7, 8). “Ma ebere nke Jehova nēsi na mgbe ebigh-ebi we rue mgbe ebigh-ebi n’aru ndi nātu egwu Ya” (Abù Ọma 103:17, 18).

Mmadụ Niile n’Ebe Niile

Devid nwere obi ekele, obi ná-enye Chineke otuto. Devid enweghị afọojuju rue mgbe ọ gbara ndị-ọzọ ume ná-erugide kwa ha ka ha too Onyenwe anyị. Chineke bú Onye mere ihe niile na Onye ná-achị ihe niile kwesịrị ịnara ịhụn’anya na otuto anyị. Ọlụaka niile nke Chineke -- usu-ndịmmụọozi niile nke Eluigwe, ndị kwere ekwe, na onye ọ bụla -- kwesịrị itó Ya. Devid maara na ọlụ-aka niile nke Chineke, mmadụ, na ihe niile, n’ebe niile ji Chineke ụgwọ otuto. Ọtụtụ ihe ekèreekè apụghị iji okwu ọnụ kwupụta ebube Chineke, ma ha na-enye Chineke otuto site n’ịma mma ha na agwa ha.

Devid mechiri Abù Ọma a otú o si malite ya: “Gọzie JEHOVA, nkpuru-obim.” Ọ dị mma ichetara ndị ọzọ ka ha too Chineke; ma ka anyị, onwe-anyị, n’otù n’otù, kwesị ntụkwasịobi. Ka anyị too Jehova, anyị ga-enwe-kwa iruọma-Ya na ndụ-anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye ka Devid ji ihe niile dị nime ya ná-etó?
  2. Kpọọ aha ụfọdụ ezi-ihe Devid natara nke o kwuru banyere ya?
  3. Gịnị mere anyị ji hụ Baịbụl n’anya?
  4. Gịnị bụ eziihe anyị na-anata n’Okwu Chineke?
  5. Òlee nnụnụ Devid ji tụnyere Onye-Kraist?
  6. N’ụzọ dị añaa ka ndụ mmadụ si dị ka alụlụ?
  7. Rue ebe dị anya añaa ka Chineke na-ewezuga mmehie mmadụ?
  8. Rue òle mgbe ka ebere Chineke ga-adịgide?
  9. Ònye ka Devid na-erugide ka ha too Chineke?
  10. Òlee okwu Devid ji mechie Abù Ọma a?