Ilu 31:10-31

Lesson 228 - Junior

Memory Verse
“Ọnu-ya ka ọ sagheworo n’amam-ihe; Iwu nke ebere dikwasi kwa n’ire-ya” (Ilu 31:26).
Notes

Nwoke Maara Ihe

Mgbe Solomon malitere ịbụ eze Israel, adịghịike-ya n’iru Chineke metụtara ya, o wee kpee ekpere sị “Mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata” (I Ndi-Eze 3:7). N’ekpere ahụ, ọ rịọrọ amamihe karịa ịrịọ àkù na ụba na nsọpụrụ nye onwe-ya. Chineke zara sị: “Enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ digh onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ digh kwa onye gēbili dika gi n’azu gi” (I Ndi Eze 3:12). Ọ bụ nwoke amamihe a bụ onye dere ọtụtụ ihe karị n’Akwụkwọ Ilu.

Ndụmọdụ Nye Ụmụokorọbia na Ụmụagbọghọbịa (Ndịntorọbịa)

Site n’amamihe a Chineke nyere, Solomon pụrụ izi ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa ụzọ ha ga-esi bie ndụ ọñụ na ọ gan’iru. O kweere na ọ bụrụ na-ezi ụmụntakịrị na ụmụokorọbịa na ụmụagbọghọbịa ihe kwesịrị ka ha mara, ha wee malite ndụ-ha n’irubere Chineke isi, ha ga-etolite ịbụ ezi ndịkom na ndịnyom. Ọ bụrụ na ụmụokorọbịa na agbọghọbịa taa enweghị eziihe ọzọ akụzirị ha ma ọ bụghị náánị nke ha hụrụ n’Akwụkwọ ilu, ha ga-amụta ihe niile ha kwesịrị ịma iji mee ha ndị ga-ebi ezi ndụ ná ndụ-ha. Eze Solomon kwuru n’otù ilù ya sị: “Nwam, echezọla iwum; ma ka obi-gi chebe ihe nile m’nyere n’iwu: n’ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, na udo, ka ha gātukwasiri gi. Ekwela ka ebere na ezi-okwu rapu gi … chọta kwa amara na ezi uche n’anya Chineke na madu” (Ilu 3:1-4).

Ezi Nne

Mgbe Solomon desịrị ọtụtụ narị ilu, n’ọgwụgwụ akwụkwọ-ya, o dere ihe dị iche. O gosịrị otú obi ya si ná-añụrị ọñụ n’ihi ezi nne. O leghị onwe-ya anya dịka nwa pụrụ iche nke si n’aka Chineke nata òzízí rue nke na ọ dịghị mkpà ịña nne-ya ntị. N’amamihe ya, ọ maara na ezi nne bụ ihe nketa dị óké ọnụahịa nye nwata ọ bụla.

Ọnụahịa nwanyị ná-ejide onwe-ya nkeọma dị ukwuu karị ruby. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọnụahịa ya dị ukwuu karị ihe ego pụrụ ịzụta. Ọ gaghị aka gị mma inwe ezi nne nke bụ ogbenye karị inwe nne nwere àkùnaụba nke ná-agaghị ezi gị ihe banyere Jisọs? Ihe mwute dị na ya bụ na ọtụtụ mgbe ndị bụ nne na nna ma ha bụ Ọgaranya ma ha bụ ogbenye adịghị ezi ụmụ ha ihe Chineke nyere n’iwu.

Inwe Obi Ekele N’ihi Nne Bụ Onye-Kraist

Ọtụtụ ugbò ụmụntakịrị adịghị enwe obi ekele n’ihi nne bụ Onye-Kraist. Mgbe ha dị na nwata, o nwere ike dị mgbe ihere ya na-eme ha. Ihe Chineke nyere n’iwu bụ ka anyị sọpụrụ ndị mụrụ anyị, mgbe anyị tolitere karị otú a, anyị ga-ahụ ọtụtụ nsogbu ha siworo na ya nánpụta anyị, ezi ihe dị ukwuu nke ekpere-ha niile meworo; ọ bụrụ kwa na anyị nwere ịhụn’anya Chineke nime obi-anyị, anyị ga-asọpụrụ ha ọbụná ma asị na ha bụ ogbenye, na ha amụghị akwụkwọ maọbụ mara ihe dịka amamihe nke ụwa si dị. Ọnụahịa ha “karịrị ruby nke uku” mgbe anyị matara na ọbụ n’ihi ọ dịmma anyị ka eji kụziiri anyị otú esi alụọlụ, na otú esi asọpụrụ ihe ndị okenye nyere n’iwu. Anyị pụrụ ịghọta ihe dị njọ n’iheụtọ nke ụwa bụ nke ndị nne-anyị mere ka anyị ghara ịbà nime ya. Ụmụ ndị nwere obi ekele n’ihi nne ná-asọpụrụ Chineke ga-ebili “kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma.”

Solomon, nwoke ahụ nwere amamihe, sịrị, “Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ñuria: ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya” (Ilu 15:20); ya na “Ge nna-gi bú onye muru-gi, nti, eleda-kwa-la nne-gi anya mgbe o mere agadi” (Ilu 23:22).

Ihe Ilere anya Kraist

Jisọs nyere anyị ezi ihe nlereanya nke ụmụntakịrị niile ga-agbaso. Ọ bụ Ọkpara Chineke site-rị ná mmalite, O nwekwara amamihe nke Eluigwe. Ya na Chineke ra, ya na Nna-Ya nọwokwara site n’ebighịebi niile. Ná agbanyeghị ihe ndịa, mgbe Ọ na-etolite etolite Ọ ñara nne-Ya ntị. Ọbụná mgbe O ji nghọta-Ya banyere ihe edere n’Akwụkwọnsọ tụọ ndị òzízí ahụ maaraihe n’Ụlọukwuu Chineke n’anya, mgbe ọ dị arọ iri na abụọ, O sokwara nne-Ya na nna-Ya laghachị n’ụlọ, O wee “nọdu n’okpuru ha” (Luk 2:51). Ya Onwe-ya, bụ Ọkpara Chineke, na-aña nne na nna-Ya nke ụwa a ntị, O nyewo ihe nlereanya banyere otú ụmụntakịrị niile kwesịrị ime omume.

Chineke enyewo ya n’iwu na ụmụntakịrị aghaghị ịña ndị mụrụ ha ntị “nime Onye-nwe-ayị” (Ndi Efesọs 6:1). Ọ bụrụ na ndị nne na nna ná-adịghị asọpụrụ Chineke akụziere ụmụ-ha izu ori na ikwu okwu ụgha, ọ dịghị atọ Jisọs ụtọ; ụdị iwu dị otú a ekwesịghị ka egee ya ntị. Anyị aghaghị ibu ụzọ gee Chineke ntị.

Ịdị Mma nke Ezi Nne

N’ilu a ana-agwa anyị ịdị mma niile nke nwanyị zuruòkè. Ọ gana-eme eziomume n’ebe di-ya nọ, ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ ga-eme ihe ga-eme ka ihere mee ya. Ọ dịghị umengwụ, ma ọ na-eji obi-ya niile ná-alụ ọlụ, ọ na-enwe ọñụ n’ihe niile ọ pụrụ imere ndị ọzọ. Ọ na-emeso ụmụ-ya eziomume, ná-ahụ ha n’anya, ná-ákwára ha ezi ákwà, ná-enye kwa ha ụdị nri dị mkpà iji mee ka arụ dị ha mma. Ọ pụrụ ilekọta èzínaụlọ ya nkeọma nke na o nwere ihe fọdụrụ ọ ga enye ndị ogbenye. Uche adịghị eche ya n’ihi oge oyi ná-abịa n’iru, n’ihi na o doziwo uweoyi nye èzínaụlọ ya, nke na ha agaghị ahụ ahụhụ. Ọ dịghị elefuru ọlụ Onyenwe anyị anya iji kpokọta àkùnaùbà n’ihi ụbọchị “miri ozuzo,” kama ọ na-akpachapụ anya na-echeba-kwa échìchè banyere ihe dị ya mkpà ka o wee nwe ike nọ n’udo na n’ojujuafọ mgbe ihe ná-adịghị eme na mbụ ga-eme.

Ịrarụ Ụra Mgbe Ifufè Na-efè

Ana-akọ akụkọ banyere otù onyeọlụ ubi nke chọrọ igota nwoke ga-alụrụ ya ọlu n’ubi-ya. Otù onye bịara ka egoro ya ọlụ kwuru okwu ná ntụkwasịobi sị “Apurum ịrarụ ụra mgbe ifufe nēfe.” Onye ọlụubi a nwere mmasị n’ọzịzá ya, wee goro ya ịmata ihe okwu ya pụtara. N’ụbọchị niile ka onye ọlụ egoro ego a na-alụ ọlụ ya nkeọma na n’ikwesị ntụkwasịobi; ọ dịghị ihe pụrụ iche n’omume ya. Ma otù abalị óké ifufe malitere, onye ọlụubi a biliri n’ụra n’ihi ụzụ ụzọ ọba na-akụkọrịta, na mkpu ehi na ọkụkọ na-eti. Ahịhịa si n’ọnụụzọ ebe ekposara ahịhịa na-efegharị n’elu. Ma nwoke ahụ egoro ọlụ nọ n’óké ụra. Ihe o kwuru mgbe onye ọlụubi ahụ kpọtere ya bụ náánị, “Apụrụm ịrarụ ụra mgbe ifufe nēfe.” Mgbe ahụ onye ọlụubi ahụ matara na ọ bụ anụulo nke onyeagbataobi ya na-eme mkpọtụ ahụ. Ọnụụzọ ọba nke ya kpọchirị nkeọma, ehi nọ nime ya n’udo. Ọkụkọ-ya niile nọ n’ebe ọkụkọ na-anọ. Ekegidere ahịhịa ekposara nkeọma. Onye o goro ọlụ ejikerewo-rị maka óké ifufe, n’ihi nke a o nyeghị onwe-ya nsogbu mgbe ọ bịara.

Otú a ka ọ dị nne ahụ na-elezi ihe gbasara èzínaụlọ ya anya nkeọma. Ọ bụghị náánị mkpà anụarụ ka ọ na-ejikere, kama ọ naelezi omume ụmụ-ya anya na mgbe ha ka dị ntakịrị, ka ha wee mara irubeisi na ime eziomume mgbe ha tolitere. Ọ na-ejikere ha nye iheegwù na ọnwụnwa nke ha gaje izute, ka ha wee mata mmehie ndị ahụ mara kwa otú ha ga-esi guzogide ha.

Nwanyị a nke ná-ejide onwe-ya nkeọma na elezianya ịhụta ubi nke ọ ga-azụta. O wee were ezi mkpụrụ kụọ ya iji nye nri n’oge oyi, na iji nweta urù n’ahịa. N’ịlụ ọlụ ndịa niile, ọ dịghị ewe iwe mgbe ike gwụrụ ya. “Ọnu-ya ka ọ sagheworo n’amam-ihe; iwu nke ebere dikwasi kwa n’ire-ya.” Ọ bụghị náánị na ọ na-agwa ụmụ-ya okwu n’ezi olu nwayọ, kama ọ bụ kwa iwu ya nye ha na ha ga-ahụrịta onwe-ha n’anya.

Nwunye Aná-alụ Ọhụụ Nke Kraist

Anyị ga-eji nwanyị a dị mma wee tụnyere nwanyị aná-alụ ọhụụ nke Kraist, ezi nwa Chineke. Jisọs bụ Nwoke ahụ ná-alụ nwunye ọhụụ, Ọ pụkwara ịtụkwasị Nwunye-Ya ahụ Ọ ná-alụ ọhụụ obi, nke bụ ezi Nzukọ ahụ, ka ọ ghara ịrapụ inye Ya úgwú nime ụwa a. Onye-Kraist na-ebi ndụ-ya ka ihere ya ghara ime Jisọs.

Nwunye aná-alụ ọhụụ nke Kraist na-alụsị ọlụ ike iji gbasaa oziọma nke nzọpụta. Ọ na-ebu ụzọ zụọ ụmụ-ya ime ihe ná-atọ Jisọs ụtọ ná-ebi ndụ ilereanya nke Onye-Kraist n’iru-ha. Emesịa, ọ na-agwa ndị agbataobi ya na ndị ọzọ ọ na-ezute banyere ịhụn’anya Jisọs n’ebe ha nọ na agụụ obi Jisọs ịzọpụta ha site ná mmehie-ha.

Ihe ụwa a adịghị eju Nwunye aná-alụ ọhụụ nke Kraist afọ, kama ọ na-esi “n’ebe di anya” ná eweta nri-ya. Nke ahụ pụtara na ihe dị ya mkpà karị ihe niile ná ndụ-ya bụ ihe nke Eluigwe, na ọ bụ “ọñu nke JEHOVA” bụ ike-ya. Ọ na-arịọ Chineke ka O nye ya amamihe, ọ na-amụ kwa ihe dị na Baịbụl iji mata uche Chineke. Jọb sịrị “Atukọbawom okwu nile nke ọnu-Ya kari òkèm” (Job 23:12). Anyị aghaghị ịghọta na Baịbụl bụ Onye-ndú anyị rue Eluigwe na ọ ghaghị ịbụ ihe kachasị mkpà ná ndụ-anyị.

Onyenwe anyị na-enwe obiụtọ n’ebe Nzukọ-Ya nọ bụ nwanyị-Ya aná-alụ ọhụụ. Anyị niile n’otù n’otù kwesịrị ịgbalịsi ike ibi ndụ-anyị n’ụzọ ga-eme ka Ọ ghara inwe mwute n’ebe anyị nọ mgbe ọ bụla. Anyị chọrọ ka ụwa hụ site n’omume-anyị na anyị bụ nke Jisọs.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye dere Akwụkwọ Ilu?
  2. Gịnị mere o ji mara ihe?
  3. Òlee ndị ka o nyere ọtụtụ nime ndụmọdụ-ya?
  4. Gịnị bụ iwu Chineke nye ụmụntakịrị?
  5. Gụọ ụfọdụ nime ịdịmma nke ezi nne.
  6. Ònye bụ Nwunye ahụ aná-alụ ọhụụ nke Kraist?
  7. Ònye ka ọ na-agbalị ime ihe ná atọ ya ụtọ?