Lesson 229 - Junior
Memory Verse
“Gi onwe-gi gāzù ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú Israel” (2 Samuel 5:2).Notes
Iruuju N’ihi Ọnwụ Sọl Na Jonatan
Devid kwara ákwá n’ihi ọnwụ Sọl na Jonatan. O gosịrị nsọpụrụ kwesịịrị onye ahụ bụwororị eze na onye-iro-ya, Sọl, ọnwụ Jonatan bụ ọkpara Sọl wutekwara ya nke-ukwuu. Devid bụrụ abù-ákwá site n’ide abù nke kwuru banyere náánị ezi ihe na ihe ukwuu ha mere. O kwuru banyere Jonatan otú a “nwa-nnem Jonatan,” wee cheta kwa ịhụn’anya na eziomume Jonatan n’ebe ọ nọ.
Ọnwụ Sọl pụtara na aga-eme Devid eze, n’ihi na Jehova etewo ya-rị mmanụ. Ọbụná ọ bụ ezie na ọnwụ Sọl pụtara ọgan’iru nke Devid, o kwughị okwu ọñụ maọbụ obiụtọ na onyeiro ya anwụwo. Devid añụrịghị ọñụ mgbe onyeiro ya dara (Ilu 24:17).
Ekpere
Devid pụwororị iziga ndịozi rue Israel niile na-enye ha iwu ka ha niile nara ya dịka eze. Devid emeghị ihe dị otú a. O cheere ka mkwà Chineke kwere mezue. Devid na-ekpe ekpere ná-ajụ kwa ase n’aka Chineke n’oge iruọma na n’oge nsogbu. Devid anọghị ná-emeghị ihe ọ bụla mgbe ọ na-echere Jehova, kama o mere ihe niile egosịrị ya ka o mee. Devid jụrụ Chineke ase ma yà gaeje n’otù nime obodo Juda. Chineke gwara Devid ka o jee. Devid ejeghị n’obodo nke ya bụ Betlehem, maọbụ n’ebe ọzọ nke ọ ga-achọworị ijé. Chineke duziri Devid ka o jee Hebron, obodo ndịnchụàjà na obodo ebemgbábà.
N’oge Udo Na N’oge Agha
Devid kpọkwara ndị ahụ soro ya mgbe ọ na-agbá ọsọ ndụ. Ndị nọ ná nsogbu na ndị ji ụgwọ, ha na ndị obi ha dị ilu, emewo Devid onyeisi ha (I Samuel 22:2). Ndịa esowo Devid n’oge mkpà na nzogharị. Mgbe enyere Devid ọnọdụ ịbụ eze, o chezọghị ndị ahụ meworo ya enyi ha. Ha esowo Devid hụkọọ ahụhụ, soro ya nọkọọ n’agụụ, soro kwa ya nọkọọ ná mwuta. Ugbu a ndị kwesịrị ntụkwasịobi ga-eso ya chịkọọ ọchịchị. Baịbụl na-akụzi na ndị ahụ niile kwesịrị ntụkwasịobi ná-erube kwa isi, ndị náeso kwa Kraist hụkọọ ahụhụ, ga-eso kwa Ya bụkọọ eze, ebe Kraist ga-agọnarị ndị ahụ niile na-agọnarị Ya (2 Timọti 2:12).
Eze Juda
Mgbe ya onwe-ya, ndịkom ya, na èzínaụlọ-ha rịdaruru Hebron, ndị nke Devid, bụ ụlọ Juda tere ya mmanụ ịbụ eze. Nke a bụ ugbò abụọ e tere Devid mmanụ ịbụ eze. Ihe ra ka arọ iri gara aga, Samuel tere ya mmanụ n’iwu Jehova. Ugbu a otite mmanụ nke a bụ nke ndị Juda bụ ụfọdụ nime Ụmụ Israel tere ya.
Arọ asaa na nkera ka Devid bụ eze ná-achị ụlọ Juda na Hebron. N’oge a Devid mere ndịkom Jebesh-gilead enyi too kwa ha n’ihi omume ọma ha mesoro eze mbụ ha, Sọl, onye ha liworo. Devid kwukwasịrị ha okwu ngọzi Jehova na obiọma nke ya onwe-ya n’ebe ha nọ. O ji kwa obiumeala gwa ha na emewo ya eze n’ọnọdụ Sọl.
Ụmụndịkom Sọl
Devid achụpụghị ndị niile sitere n’agbụrụ Sọl, dịka omen’ala si dị. N’oge ahụ ana-eche na ọ bụ ihe dị mkpà igbu ndị niile sitere n’agbụrụ eze nke ochie, ka alaeze nke eze ọhụụ wee guzosie ike. Devid ewelighị aka ya megide onye ọ bụla sitere n’èzínaụlọ Sọl. Ọ dịghị eze ọzọ dị ka Devid nime otú a. Egburu ụfọdu ụmụndịkom Sọl n’agha gbue kwa ndị ọzọ mgbe emesịrị, ma ọ bụghị Devid maọbụ site n’àtùmààtù ya ka egburu ha.
Israel
Ndị ná-anọchị anya ebo niile nke Israel zukọtara na Hebron. Ha nwere “otù obi ime Devid eze” (I Ihe Emere 12:38). Devid bụ onye Chineke rọpụtara bụrụ kwa onye mmadụ niile rọpụtara. Ụbọchị atọ ka ha nọrọ na Hebron ka ha na Devid wee gbaa ndụ, ná-arịọ ya ka ọ bụrụ onyeisi ha. Ha kwuru ihe atọ mere ha ji chọọ ka Devid bụrụ eze ha bụrụ kwa eze Juda. Dịka Ụmụ Israel, ha bụ ụmụnne. Ọ bụ iwu Chineke na eze ha ga-abụ otù onye nime ndị nke ha, ọ bụghị onye ala ọzọ (Deuteronomi 17:15). Ha chetaara Devid, “Ọkpukpu-gi na anu-aru-gi ka ayi bu”; nke ga-eme ka o kwesị ịbụ eze-ha.
Ihe ọzọ kwa bụ na ha chetara ezi ọlụ nke Devid lụworo mgbe ochie nye Ụmụ Israel. O kwesịworị ntụkwasịobi n’ime ihe ọ pụrụ ime n’ihi ọdịmma Ụmụ Israel. Eleghịanya ha na-ekwu banyere otú Devid si gbue Golaiat mgbe ndịkom-agha niile, ọbụná eze n’onwe-ya, na-atụ egwù onye-iro ahụ toro ogologo nke-ukwuu.
Ihe nke atọ ndịkom Israel kwuru bụ nke kachasị mkpà. Ọ bụ Chineke rọpụtara tee kwa Devid mmanụ. Ọ bụ ya ga-abụ eze n’udo ma n’agha. Jehova gwara Devid, “Gi onwe-gi gāzu ndim, bú Israel, gi onwe-gi gābu kwa onye-ndú Israel.”
Eze Nke Ndụ Anyị
Ọ dị n’obi ndị Israel niile ime Devid eze ha. Ọ dịghị onye ọ bụla n’etiti ha kwupụtara ihe ọ bụla mere Devid ga-eji ghara ịbụ eze-ha. Ọ dị Otù onye kwesịrị ịbụ eze ná ndụ mmadụ niile taa. Ọ dịghị ihe aga-ekwu mere Jisọs ga-eji ghara ịbụ eze nke ndụ anyị. Ụfọdụ na-ekwu okwu ngọpụ, ma ọ dịghị nke apụrụ ịnara nkeọma. Ọ dị ọtụtụ ihe mere Jisọs ji kwesị ịchịachị nime obi na ndụ-anyị, ụdị ihe ndị niile mere Devid eze ha kwupụtara. Ndị niile nábatara Jisọs dịka Eze ka ana-akpọ ụmụ-nna. Jisọs sịrị, “N’ihi na onye ọ bula nke gēme ihe Chineke nāchọ, onye ahu bu nwa-nnem nwoke” (Mak 3:35). Jisọs bụ náánị otù onye pụrụ iweta nnapụta site n’aka onyeiro wepụ kwa mmehie ná ndụ anyị niile. Ka Jọn Onyeọwụmmiri na-elegide Jisọs anya, ọ sịrị, “Le, Nwa-aturu Chineke, Nke nēbupu nmehie nke uwa” (Jọn 1:29).
Dịka onyeọzùzùatụrụ na-elekọta atụrụ ya, Jisọs na-edu ndị Ya were kwa achịcha maọbụ nri nke ndụ ná-azụ ha. Ndịa bụ okwu nke Jisọs: “Onye nēsom agagh-ejeghari n’ochichiri, kama ọ gēnwe Ìhè nke ndu” (Jọn 8:12); na, “Mu onwem bu nri nēnye ndu: onye nābiakutem, agu agagh-agu ya ma-ọli, onye nēkwere kwa na Mu akpiri agagh-akpọ ya nku ma-ọli mgbe ọ bula” (Jọn 6:35).
Jisọs bụ àtùmààtù nke Chineke banyere nzọpụta anyị. Ọ bụ Chineke nyere Ya (Jọn 3:16), Chineke tere Ya mmanụ (Ọlu Ndi-ozi 10:38), onye Chineke matara (Matiu 17:5). Jisọs ga-ewere ọnọdụ Ya dịka Eze ndị eze na Onyenwenụ kachasị ndịnwenụ niile (I Timọti 6:15). Gịnị mere ị gaghị-ekwe ka Jisọs bụrụ Eze na Onye náachị obi na ndụ-gị ugbu a?
Ọchịchị Devid
Chineke bụ Onye àmà n’ọgbụgbandụ Devid na ndịokenye niile nke Israel gbara. Na nke ugbò atọ, e tere Devid mmanụ ịbụ eze. Devid gbara iri arọ atọ mgbe ọ malitere ịchị ọchịchị. Ọ gbara arọ ole ahụ ndị Livai na-agba tutu enye ha ọlụ ịlụrụ Jehova ọlụ n’Ụlọikwu (Ọnu-ọgugu 4:47). Devid gbara arọ ole ahụ Jisọs gbara mgbe Jisọs malitere ijéozi Ya nke pụtara ìhè (Luk 3:23).
Devid chịrị iri arọ anọ. Ụfọdụ n’oge ọchịchị a ka o biri na Hebron, obodo amaara nkeọma n’akụkọ niile nke Ụmụ Israel. Ọtụtụ ihe ana-echeta nkeọma mere na ya. Na Hebron ka Abraham wuuru Jehova ebeịchụàjà. N’ebe ahụ ka Sera bụ nwunye ya nwụrụ, ewee lie ya n’ọgbà ahụ dị nso nke Makpila, n’ílì èzínaụlọ ahụ (Jenesis 12:8; 12:2, 19, 20). Hebron bụ ihe-nketa nke Keleb n’ihi na o sozuru Jehova n’azụ (Joshua 14:14). Emesịrị nye ndị Livai Hebron (Jọshua 21:11-13) o wee ghọọ obodo ebemgbábà (Lee (Iheọmùmù 139).
Devid chịrị ọchịchị arọ karịrị nke a na Jerusalem. O wee bụrụ isiobodo, amaara ya nkeọma karị Hebron ebe ana-akpọ ya aha rue ọgwụgwụ Baịbụl. Ọnọdụ ya dị n’ebe dị ka etiti Ala Nsọ ahụ. “Otú a ka Onye-nwe-ayị, bú JEHOVA siri: Nka bu Jerusalem: n’etiti mba nile ka M’doworo ya, ala di iche iche di kwa ya gburugburu” (Ezikiel 5:5). Onye dere Abù Ọma bụrụ abù banyere Jerusalem, “Ihe mara nma n’idi-elu, na ihe-obi-utọ nke uwa nile, ka ugwu Zaion bu” (Abù Ọma 48:2). Jerusalem dị ihe ra ka iri maịlị ndị Rom n’ebe ugwu nke Hebron, ọ dị kwa n’elu ugwu dị larị -- obodo ugwu nke ndị-ijè niile na-agafe ka ha na-eje n’ugwu na na ndịda site na Palestain. Amaara Jerusalem dịka ebe dị nsọ nke ifè òfùfè n’ihi na ewuru Ụlọukwu Jehova na ya. Chineke na-anụ, na-aza kwa ekpere niile ekpere nime ebe ahụ na nke ekpere n’ụzọ ala ahụ (2 Ihe Emere 7:12-15). Ọ bụ ụdị Jerusalem ọhụụ ahụ (Nkpughe 21:2), Obodo dị Nsọ nke Chineke dị ndụ (Ndi Hibru 12:22), Obodo Eluigwe nke Onyeọkà ya na Onye lụrụ ya bụ Chineke (Ndi Hibru 11:10) nke edoziwo-kwa-ra ndị nke Ya (Iheọmùmù 169).
Igbé Nke Jehova
Otù ugbò ọzọ ndịkom arọpụtara nke Israel na Devid bụ eze ha zukọtara. Ha kwekọrịtara na ọ ga-abụ ihe ziriezi, dị kwa mma ka ebupụ Igbé Jehova (I Ihe Emere 13:3, 4). Ọtụtụ arọ garaaga Igbé ahụ nọworo n’ụlọ Abinadab, Ụmụ Israel lefukwara ya anya. Igbé ahụ bụ ihe ná-egosi na Chineke nọ n’etiti ha; mgbe ọ nọ kwa n’etiti ha, ọ bụworị ngọzi nye ha. Mgbe ndị Filistia buuru Igbé ahụ, óké nsogbu dakwasịrị ha. Ihe bụ ngọzi nye ndị nke Chineke pụrụ ịbụ ọbụbụọnụ nye ụwa. Okwu Chineke bụụrụ anyị ndụ, bụrụ ọnwụ nye ndị ná-adịghị anọgide na ya.
Devid chère ezi échìchè ibute Igbé ahụ na Jerusalem, ma ọ dịghị mgbe ekwuru na o kpere ekpere rịọ nduzi nke Chineke n’ibupụ ihe nsọ a ná-egosi nnọnye nke Chineke n’etiti ha. Ọ bụ ihe dị nsọpụrụ Ụmụ Israel ịchọ iru Jehova ịnọ n’etiti ha. Nnọnye nke Jehova na-eweta amamikpé nke mmehie, nke ná-eduba ná nzọpụta. Iru Jehova na-eweta udo, nchekwube, nchebe, na olileanya. Ewezuga Jehova ọ dịghị ihe fọdụrụ.
Ụzọ Ná ezighiezi
Devid na Ụmụ Israel adahieghị site n’ịchọ ka Igbé Jehova nọdụ n’etiti ha. Iheọmùmù nke ha ga-amụta bụ ịlụ ọlụ Chineke n’ụzọ Chineke chọrọ. Ha dọkwasịrị Igbé ahụ n’elu ụgbọala ọhụụ nke Uza na Ahio, ụmụndịkom Abinadab na-edu. Dịka Iwu si dị, ekwesịrị ibu ya n’ubu ndị Livai. Ụmụ Israel bupụrụ ya n’otù ụzọ ahụ ndị Filistia si bupụ ya (I Samuel 6:7, 8). Lee ọtụtụ mmadụ ole hụworo ahụhụ n’ihi na ha doro ndụ ha dịka ndị nọ ha gburugburu kama irubeisi n’iwu nke Jehova?
Chineke Tigburu
Ka Ụmụ Israel bu Igbé ahụ ná-eje Jerusalem, obi dị ha ụtọ nke-ukwuu. Ha na-abụku Jehova abụ, ndị na-akpọ ụbọ ji kwa obi ha niile ná-akpọ ụbọ ha. Na mberede ha jupụtara n’egwù na mwuta. Ehi ahụ gbara ụkwụ, Igbé ahụ dị n’elu ụgbọala wee dagharịa. Uza wee setịa aka-ya ijide Igbé ahụ -- wee daa nwụọ. Chineke enyewo ndụmọdụ na ndị ná-ebu Igbé ahụ “agagh-emetu ebe nsọ ahu aka, ka ha we ghara inwu” (Ọnu-ọgugu 4:15). Uza metụrụ Igbé ahụ aka; ya mere Chineke tigburu ya, o wee nwụọ n’akụkụ Igbé ahụ. Ọ ga-abụworị ezi échìchè ka Uza chere ime ka Igbé ahụ guzo nkeọma, kama ọ kpachapụghị anya n’ohere enyere ya ilegide Igbé ahụ anya. Ọ bụrụ na eburu ya dịka Chineke kuziworo, ọ gaghị-adịworị mkpà na Uza ga-emetu ya aka. Njehie Uza bụ ihenlereanya ná-egosipụta n’ezie na ezi échìchè adịghị-eme ka omume ọjọọ dị mma. Ka anyị mụta iji egwù na nsọpụrụ ná-ekwu, ná-emeso kwa ihe niile dị nsọ nke Chineke.
Ụzọ Nke Chineke
O wutere Devid, ọ tụọ kwa egwù. Ka Chineke ghara itigbu ha niile, e wee debe Igbé ahụ n’ụlọ Obed-edom, onye Gat. Ngọzi Jehova na-adị n’ebe Igbé ahụ dị. Obed-edom na ndị èzínaụlọ ya chọpụtara na ọ dị mma ifè Jehova, n’ihi na agọziri ha mgbe Igbé ahụ nọ n’ụlọ ha.
Devid kpere ekpere wee jụọ Chineke otú aga-esi bue Igbé ahụ. Ọ bụrụ na o kpere ekpere na mbụ, Uza agaghị anwụworị n’oge a, ngọzi Jehova ga-abịakwasịwo ha-rị ngwangwa karị. Devid doziiri Igbé ahụ ebe, maa-kwa-ra ya ụlọikwu. Mgbe ọnwa atọ gasịrị, Ụmụ Israel bugara Igbe ahụ na Jerusalem. N’oge nke a ha buru ya n’ụzọ Chineke chọrọ -- n’ubu ndị Livai (Ọnu-ọgugu 7:9; I Ihe Emere 15:2, 12-15), ejiri akpụkpọ Seal kpuchie ya (Ọnu-ọgugu 4:6) eji kwa mkpàn’aka buru ya (Ọpupu 25:14). Edebere Igbé ahụ nime ụlọikwu nke edoziwooro ya, achụkwaara Chineke àjà dị icheiche nke otuto na ekele. Mgbe eburu Igbé ahụ n’ụzọ tọrọ Chineke ụtọ, Ụmụ Israel nwere ọgan’iru. Óké ọñụ dị, n’ihi na ha rubere isi.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Kwue mgbe dị icheiche e tere Devid mmanụ ịbụ eze.
- Òlee obodo abụọ Devid nọrọ wee chịa?
- Gịnị mere eji mee Devid eze Israel niile?
- Gịnị ka Igbé Jehova bụ ụdị ya?
- Gịnị mere Uza? N’ihi gịnị?
- Gịnị bụ ndahie Ụmụ Israel mgbe ha na-ebupụ Igbé ahụ ná mbụ?
- Gịnị mere Jehova ji gọzie Obed-edom na ndị èzínaụlọ-ya?
- Òlee ebe adọbara Igbé Jehova n’ikpèazụ?