2 Samuel 7:1-29; Abù Ọma 30:1; Aisaia 66:1, 2

Lesson 230 - Junior

Memory Verse
“Ònye nwere ike iwuru Ya ulo, n’ihi na elu-igwe na elu-igwe nke elu-igwe nāgagh-anagide Ya? ònye kwa ka mu onwem bu, na m’gēwuru Ya ulo, ma-ọbugh nani isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n’iru Ya?” (2 Ihe Emere 2:6).
Notes

Udo na Izuike

Onyenwe anyị enyewo Devid udo na izuike site n’aka ndị iro ya niile. Devid alụwo ọtụtụ agha ma Chineke nọnyeere ya ịnapụta ya. Oge bịara mgbe ihe niile dị n’udo. Devid nọdụrụọdụ n’izuike n’ụlọ eji cedar wue. Ná arụghịụka ọ na-eche banyere ịdịmma nke Onyenwe anyị n’ebe ya onwe ya nọ. Devid bụ eze, ala-ya dịkwa n’udo. Ọ bụrụ na ọ chọrọ ọ ga-ebiworị ndụ ime otú ọ masịrị ya nke nsogbu ná-adịghị.

Ọ dịbeghị mgbe Devid biri ụdị ndụ a. Mgbe ọ bụ nwaokorọbịa, dịka onye ná-azụ atụrụ, ọ lụsowo anụọhịa dị icheiche ọgù iji chebe ụmụatụrụ-ya. Mgbe o tolitere karị, Sọl chọrọ iwepụ ndụ Devid. Ọ dị mkpà na Devid ga-anọgide na nche mgbe ọ bụla. Mgbe ụfọdụ ọ na-ezo n’etiti óké nkume na n’ọgba dị icheiche, n’ebe dị anya site n’ebe ndị nke-ya nọ, n’oge dị otú a ọ na-enwe ọtụtụ agha ọ na-alụ. Chineke kpuchirị Devid, welie ya elu ịbụ eze, nye kwa ya udo na izuike. Devid agaghị abụworị eze ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị emeghị ya nye ya. Devid nyere Chineke ekele n’ihi ọga’iru na ọnọdụ-ya. Devid sịrị, “I dọgowom n’elu, I megh kwa ka ndi-irom ñuriam.”

Imere Chineke Ihe

Ekele dị Devid n’obi nye Chineke. Devid chọrọ imere Chineke ihe, iji gosi obiekele-ya. Devid chere échìchè banyere ezi ụlọ edoziri nkeọma o bi nime-ya. Dịka échìchè ya si dị, ụlọ-ya maramma, edozikwara ya nkeọma karị ọbụná ụlọ Chineke ebe ana-efè òfùfè -- ákwà mkwụba nke edebeworo Igbé Ọgbụgbandụ ahụ nime ya. Site ná mmasị dị ukwuu dị n’obi Devid imere Jehova ihe, o nwere agụụ iwu ụlọ nye aha Jehova.

Mgbe anyị na-eche ihe Chineke mewooro anyị, ànyị adịghị-eche, dịka Devid si chee na anyị ga-achọ imere Jehova ihe? Ànyị na-atụgharị uche n’okwu onye ahụ dere Abù Ọma: “M’gēsi aña nyeghachi JEHOVA nmeso ọma Ya nile Ọ mesoworom? Iko nke nzọputa nile ka m’gēbuli, … Ka m’kwughachi JEHOVA nkwa nile m’kwere … Gi ka m’gāchuru àjà ekele, Ọ bu kwa aha JEHOVA ka m’gākpọku” (Abù Ọma 116:12-18). Gịnị ka nwatakịrị pụrụ imere Onyenwe anyị? Nwatakịrị pụrụ inwe nzọpụta, ná-ebiri Chineke ndụ. Nwatakịrị pụrụ inye Chineke otuto site n’iji ndụ-ya chụọ àjà. Nwatakịrị pụrụ itò Chineke na-enye kwa ekele. Nwatakịrị pụrụ ikpe ekpere. Ka anyị were ekpere chee agụụ obi-anyị n’iru Chineke. Ọ ga-egosi anyị ihe ọzọ anyị pụrụ imere ya. Ọ pụkwara inye anyị ọbụná karị ka anyị na arịọ maọbụ ná-ele anya ya, dịka O meere Devid.

Netan, Onyeamụma

Devid gwara Netan, onye bụ Onyeamụma n’oge ahụ okwu. Devid chere na ụlọ-ya eji osisi wue dị mma karị ákwà mkwụba nke gbara Igbé Chineke gburugburu. Amatara na ụlọ Devid mara mma dị ukwuu n’iji ya tụnyere ụlọ dị n’oge ahụ, ebe eji náánị ụdị osisi ahụ amaara ná-adịghị ahụ ya mgbe ọ bụla nke dị kwa óké ọnụahịa wee wue ụlọ ahụ. Ma ákwà mkwụba ahụ gbara Igbé Onyenwe anyị gburugburu bụ náánị ihe ná-adịgide nwaoge.

Netan hụtara na agụụ obi Devid imere Jehova ihe bụ ezi ihe dị nsọ kwesịrịekwesị. Site n’ile ya anya n’ụzọ ọ bụla ọ dị ka ezi ihe. N’ịnụọkụ n’obi ha na obi chọrọ ime ihe ngwangwa ha rapụrụ ịjụ Chineke ma O kwere ka emee ihe ukwuu dị otú a. Ngwangwa Netan kwenyere ná-agba kwa ya ume. Ọ gwara Devid ka o mee ihe ọ bụla dị ya n’obi.

Àtùmààtù Chineke

Chineke maara na ihe dị Devid n’obi abụghị banyere ịdịmma nke onwe-ya ma-ọbụghị iji nye Onyenwe anyị otuto. Iwe eweghị Chineke, O nyeghị kwa Devid ahụhụ ọ bụ ezie na ọ bụghị uche Ya na aga-ewu ụlọ Chineke n’oge a. Chineke arapụghị Devid ka ọ nọgide ná njehie. Jehova zigaara Devid ozi site n’aka Netan, nwoke ahụ nke gbaworo ya ume.

Chineke ezigaghị onye ọzọ maọbụ gwa Devid okwu, ka aghara inwe nghọtaghie. Anáalụ ọlụ Chineke n’usoro n’usoro. Chineke adịghị agwa otù onye otù ihe nye kwa onye ọzọ àtùmààtù pụrụ iche banyere uche-Ya.

Ozi Jehova ziri Devid na-echetara ya na Chineke ebibeghị n’ụlọ ọ bụla ma Ọ “nējeghari n’ulo-ikwu na n’ebe-obibim.” Ọ dịghị mgbe ọ bụla Chineke gwara Ụmụ Israel ka ha wuere Ya ụlọ, Ya onwe-Ya achọghị kwa ya. Chineke na-ahụta karị onye dị obi umeala nke nwere egwù Chineke nime obi-ya (Aisaia 66:2).

Ezi Mmụọ Ifè Òfùfè

Chineke dị ukwuu nke ukwuu rue na ọ dịghị mgbe ọ bụla apụrụ iwu ụlọ dị ukwuu nke pụrụ ịbata Mmụọ-Ya niile. Ụwa bụ ihemgbakwasị ụkwụ Chineke, Eluigwe bụ kwa ocheeze Ya (Aisaia 66:1). Ọbụná Eluigwe niile apụghị ịnagide Chineke ukwuu nke Israel (2 Ihe Emere 2:6). “Ọ bugh elu-igwe na uwa ka M’juputara? ọ bu ihe si n’ọnu JEHOVA puta” (Jeremaia 23:24). Ihe Devid chọrọ ime bụ iwú ebe dị mma karị ebe ndị Chineke gana-efè Ya. Ọ dịghị mgbe Devid na-atụ anya na aga-agba Chineke gburugburu nime ụlọ n’otù aka ahụ dịka mmadụ si ebi n’ụlọ. Ọ na-emetuta Devid na ọ dịghị ụlọ ọ bụla, ọbụná nke dị ukwuu, dị kwa óké ọnụahịa, ga-adị mma karị ịmamma na ịdị ukwuu nke Chineke.

Onye Kraist taa na-achọ ịhụ ụlọ Chineke ka edebere ya ọcha nkeọma, ka ihe ọ bụla dị n’usoro. Onye Kraist na-eche na ọ dịghị ihe dịkarịsịrị mma nke dị mma karị iji lụọ ọlụ Chineke. Ihe ndịa na-alụ ọlụ dị mma karị n’ịgbasa Oziọma, ọ na-agwa kwa ndị ọzọ okwu banyere ịhụn’anya na nsọpụrụ nke ndị Chineke nwere n’obi-ha.

Devid enyeghị iwu na Ụmụ Israel kwesịrị ịchụ àjà n’otù ebe. Ọ bụ Chineke nyere iwu ahụ. Ụlọikwu nke Chineke nyere Ụmụ Israel n’iwu ka ha wue bụ nke ana-ebugharị ebugharị. Ha na-ebu ya mgbe ha na-ejégharị n’ọzara. Chineke enyewo ha ala Kenean, ebe ọ na-agaghị adị mkpà na ha ga-esi pụọ mgbe ọ bụla. Dịka ha na-eme ka ha niile bụrụ ebe ná-anọgide, otú a ka Devid si chọọ ụlọnzukọ nke gana-adịgide, ebe ha gana-eweta onyinye ha niile ná-achụ kwa àjà nye Chineke, ebe ha ga-ezukọta ifè Chineke.

Ọ dị Chineke mma na anyị onwe-anyị taa gana-ezukọta ifè òfùfè. Ana-echètara anyị ka anyị ghara ịrapụ “nzukọ nke onwe-ayi” (Ndi Hibru 10:25). Otú ọ dị, ijé n’ụlọ nzukọ bụ náánị otù ụzọ anyị si efè Chineke. Ụzọ anyị sị efè òfùfè bụ ihe ọzọ. Jisọs gwara nwanyị Sameria ahụ na ndị náeso Onyenwe anyị n’ezie na-efè Ya nime mmụọ na eziokwu. “Chineke bu Mọ: ndi nākpọ kwa isi ala nye Ya aghagh ikpọ isi ala nime mọ na ezi-okwu” (Jọn 4:24). Dịka Devid si chọọ iwu ụlọ Chineke ahụ abụghị ihe ọzọ “ma-ọbugh nání isure ihe-nsure-ọku nēsi ísì utọ n’iru Ya” (2 Ihe Emere 2:6), otú a kwa ka anyị onwe-anyị ná-aghaghị isi nime obi-anyị kpọọ isiala nye Chineke, n’eziokwu na n’obi ekpere -- ọ bụghị iji ụlọ eji ihe dị óké ọnụahịa dozie, maọbụ site n’ihe anaahụ anya wee ná-akpọ isiala ná-enye Ya.

Ọlụ Devid

Chineke emewo Devid ka ọ gaa n’iru ịbụ onyendú ndị-Ya. Devid nwere ọlụ ọzọ ọ ga-alụ ná-abụghị náánị iwuru aha Jehova ụlọ. Dịka Onye dere Abù Ọma, Devid dere ọtụtụ abù ọma na abù dị icheiche iji gbaa Ụmụ Israel ume na ndị nke Chineke niile n’arọ niile ná-esote, na kwa ọ dị mma anyị onwe-anyị. Devid bụ nwoke agha. Ọ dị ọtụtụ mmeri dị aga-eji mee ka ókèala ha dị obosaara karị. N’oge agha ndịa, Devid emewo ka ọtụtụ ọbara wụfụe ebe ọ dị ukwuu. N’ihi na Devid awụsịwo ọbara rii nne n’eluụwa n’iru Chineke, ekweghị ya ka o wue ụlọ ahụ dịka obi-ya si chọọ (I Ihe-Emere 22:8). Otú ọ dị, Chineke gwara Devid, “N’ihi na ọ di n’obi-gi iwuru aham ulo, i mere nke-ọma na ọ di n’obi-gi” (I Ndi Eze 8:18).

Enyere Devid ohere isepụta n’akwụkwọ otú ụlọ Chineke ga-adị. O nyere Solomon, nwa ya nwoke, ihe ahụ esepụtara bụ nke Mmụọ Chineke tinyeworo n’obi Devid isepụta (I Ihe Emere 28:11, 12). Devid chịkọtakwara ọtụtụ ihe eji ewu ụlọ, ma nye kwa ihe nke-ya onwe-ya, iji lụa ọlụ ụlọ Chineke. Tụkwasị ihe nlereanya ahụ esepụtara na ngwaọlụ eji ewu ụlọ, Devid nyekwara Solonon okwu ndụmọdụ: “Ma gi onwe-gi, Solomon nwam, mara Chineke nke nna-gi, were obi zuru okè, were kwa nkpuru-obi ọ nātọ utọ, fè Ya òfùfè” (I Ihe Emere 28:9).

Mkwà Chineke Kwere

Onyenwe anyị kwere mkwà na nwanwoke Devid ga-ewu ụlọ ahụ nke Devid chọworo iwu. Chineke ga-akwụghachị àtùmààtù obi Devid. Dịka nna, Chineke ga-aba mbá mee kwa ka nwa Devid ghọta ma ọ bụrụ na o mmehie, ma Chineke agaghị ajụ ya. Ebere Chineke agaghị-esi n’arụ nwa Devid pụọ mgbe ọ bụla ọ nọ ná-aña Chineke ntị.

Karịa nke a, Jehova ga-ewuru Devid ụlọ, Ọ ga-eme kwa ka alaeze Devid guzogide rue ebighịebi. Ndị èzínaụlọ Devid gana-abụ eze nke ndị Chineke mgbe niile. Iruọma nke a dị ukwuu karị nke enyeworo onyeisi ọ bụla nke Ụmụ Israel, ọbụná nye Moses, nye Joshua, maọbụ nye onyeikpé ọ bụla.

Sọl abụworị eze mbụ nke Ụmụ Israel. Sọl esiwo n’ebe Chineke nọ wezuga onwe-ya. Ọ jụrụ irubeisi, ewee nápụ ya na ụmụ-ya alaeze ahụ. Mgbe Sọl nwụrụ, Devid bụụrụ eze n’ọnọdụ otù nime ụmụndịkom Sọl. Emere nke a dịka uche Chineke si dị; n’ebe Devid nọ ka ekwere mkwà na èzínaulo-ya ga-enwe ọchịchị doro anya n’ocheeze ahụ.

Alaeze Náadị Ebighịebi

N’ozi Chineke ziri Devid ka etinyere mkwà alaeze ebighịebi -- nke ga-adịgide rue ebighịebi. Ụfọdụ mkwà ahụ na-ekwu banyere Solomon onye na mgbe ná-adịghị anya ghọrọ eze ná-anọchi nna-ya Devid. Nkekanke, mkwà a pụtara ọbịbịa Onye ahụ e tere mmanụ, bụ Jisọs Kraist, nke sitere n’agbụrụ Devid, Onye “gāzọputa ndi nke Ya ná nmehie nile ha” (Matiu 2:21), Onye ọchịchị-Ya ná-agaghị enwe ọgwụgwụ (Aisaia 9:7), na Onye ana-apụghị ibibi Alaeze Ya (Daniel 7:14). Tutu amụọ Jisọs, mmụọozi gwara nne-Ya na Onyenwe anyị Chineke ga-enye ọkpara-ya “oche-eze nna-Ya Devid.” “Ọ gābu kwa eze ulo Jekob rue mgbe nile ebigh-ebi; ala-eze-Ya agagh-agwu kwa agwu” (Luk 1:32, 33). Onyeozi bụ Jọn n’agweetiti ahụ anaakpọ Patmọs ka enyere ọhụ banyere ihe nke gaje ịbịa. Ọ hụrụ mmụọozi wee nụ mkwupụta ahụ: “Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mgbe nile ebigh-ebi” (Nkpughe 11:15).

Ekpere Devid

Netan bụ Onyeamụma ziri Devid ozi ahụ sitere n’aka Jehova bịa, na Chineke ajụwo inye ya ohere ọma ahụ iwu ụlọ nye aha Jehova. Devid weere okwu Chineke dịka okwu ikpeazụ. Devid arụsoghị Netan ụkà maọbụ malite ịgbalị ime ka Chineke gbanwee uche-ya n’ụdị nke a maọbụ n’ụdị ọzọ. Ọ kwaghị ákwá, ná-ekwu na egbochiri ya. Ọ gaghị n’iru dịka àtùmààtù ya si dị. Devid rubeere Chineke isi. N’obi umeala na n’óké nsọpụrụ Devid jekwuuru Onyenwe anyị n’ekpere.

N’ịzaghachị ozi Chineke ziri ya, Devid ji ekpere ná-enye Chineke ekele. Devid kwuru na ọ bụ Chineke meworo ihe niile, were kwa obi umeala kwue banyere ya onwe-ya na ihe niile o meworo. Devid sịrị, “Ònye ka m’bu, … na I mewo ka m’biarue na mgbe a?” Devid bụ nwoke nwere nsọpụrụ; ọ gara n’iru nke ukwuu bụrụ kwa onye Chineke ji alụọlụ. Ma ọ dị umeala n’obi n’iru Jehova, n’ihi na Devid maara na ya apụghịrị ijéru n’ọgan’iru dị otú a ma ewezuga Chineke. Devid sịrị “Gini kwa ka ulom bu?” “I we kwu kwa okwu banyere ulo orù-Gi rue mgbe di anya.” Gịnị ka ụlọ Devid bụ? zínaụlọ náachị achị bụ nke Chineke rọpụtaworo. O metụrụ Devid na Chineke ejiriwo ngọzi niile nke mgbe garaaga nye ya nsọpụrụ, ya na n’ihe Chineke kweworo ná mkwà ime na mgbe dị n’iru. Chineke nyere Devid ọbụná karị ka ọ rịọworo na karị ka ọ tụrụ anya.

Devid ji obi ya niile kwere ịrapụ ka Chineke mee ka èzínaụlọ ya guzosie ike rue ebighịebi. Ụfọdụ mmadụ adịghị achọ ịbụ ihe Chineke chọrọ ka ha bụrụ. Ụfọdụ mmadụ na-achọ ime otú ọ masịrị ha, ma ọdị Chineke mma ma ọ dịghị Ya. Ma ihe dịkasịrị Devid mkpà bụ náánị otuto Chineke ya na ka emee ka aha Chineke dị ukwuu.

Devid kweere Chineke. Ọ dịghị mgbe ọ bụla, Devid nwere obiabụọ banyere mkwà a. Okwukwe-ya na olileanya ya dịkwasị ná mkwà niile nke Chineke. Mkwà niile Jehova kwere Devid, mezuru ha niile. Ọ dịghị mkwà ọ bụla nke Chineke kweworo ná-emezughị mgbe ọ bụla.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kọwaa otú ụlọ Devid si dị.
  2. Gịnị mere Devid ji chọọ iwuru Jehova ụlọ?
  3. Gịnị bụ ozi Chineke zigaara Devid?
  4. Ònye wetaara Devid ozi Chineke?
  5. Gịnị mere ejiri nápụ Devid ohere ọma ahụ iwuru Jehova ụlọ?
  6. Ònye wuuru Jehova ụlọ ahụ?
  7. Òlee otú Devid si keta òkè n’ijikere banyere ụlọ ahụ?
  8. Gịnị ka Jehova kwere Devid ná mkwà?
  9. Alaeze ònye ka eburu n’amụma n’oge a?
  10. Gịnị bụ ọzịzá Devid nye ozi Chineke?