2 Samuel 9:1-13

Lesson 231 - Junior

Memory Verse
“Ọ buru na ọlu onye ọ bula gādigide nke o wukwasiri ya, ọ gānata ugwọ-ọlu” (I Ndi Kọrint 3:14).
Notes

Nwanwoke Ntakịrị Eze Darangwụrọ

N’iheọmùmù-anyị taa anyị na-amụ banyere otù nwanwoke ntakịrị eze darangwụrọ, onye amụrụ n’obíeze n’ala Israel ọtụtụ arọ gaworo aga. Aha-ya bụ Mefiboshet.

Mgbe Mefiboshet gbara náánị arọ ise, agha dara n’Israel, egburu nna-ya na nna nna-ya nime otù agha a dịkarịrị ike. Nwanyị ná-elekọta Mefiboshet tụrụ egwù mgbe ọ hụrụ ndị-agha nke ụsụ-agha Israel ebe ha na-agbalaga n’iru ndị Filistia, o wee chee na ndị-iro ha ga-abịa iwepụsị ihe dị n’ụlọ eze wee dọrọ kwa nwanwoke ntà eze ahụ n’agha laa. Ọ hụrụ nwatakịrị nwoke ahụ n’anya, ya mere na o kuuru ya wee malite ịgbalaga n’ebe ha ga-ezo; ma n’ịnuọkụ n’obi na ime ngwangwa ya, o si n’aka ya dapụ. Mefiboshet merụrụ arụ nkeukwuu n’ihi ọdịda ahụ nke mere na ọ bụgidere onyengwụrọ ná ndụ ya niile.

N’arọ niile Mefiboshet ná-etolite, o bighi n’obíeze, nke mere na ọ dịghị mgbe ejidere ya. Ụmụnne nna-ya ndịkom ka egbuwokwara n’agha, ya mere na o bi náánị ya n’ebe dị anya site n’ụlọ.

N’usoro Nke Sọl

Nna nwaeze a bụ onyengwụrọ bụ Jonatan, nna nna-ya bụ kwa Eze Sọl, eze mbụ nke Israel. Mgbe Jonatan bụ náánị nwaokoro ntà nna-ya kpọrọ Devid ka ọ bịa kpọọ ụbọakwara n’obíeze, ọtụtụ arọ ka Devid bikwara n’ụlọ eze. Jonatan na Devid na-egwukọrịta egwù wee bụrụ ezi enyi. N’eziokwu, Jonatan hụrụ Devid n’anya nke-ukwuu rue na o jikeere ịrapụ ocheeze ka enyi-ya were ya. Mgbe Eze Sọl nụrụ nke ahụ, iwe were ya nke ukwuu o wee chọọ igbu Devid. Jonatan nụrụ banyere àtùmààtù ọjọọ nke nna-ya na-atụ, wee dọọ Devid akanántị ka o si n’ụlọ eze gbalaga.

Chineke ekwuwo na Devid ga-abụ eze ná-esote n’ihi na Sọl ekwesịghị ntụkwasịobi n’ebe Chineke nọ, o rubereghị kwa Ya isi n’ihe niile. Ma Devid matara na ọ bụbeghị oge Chineke nye ya iwere ocheeze ahụ, n’ihi nke a ọ lụsoghị Sọl ọgù, kama ọ pụrụ jee ebe dị anya si n’ebe eze ahụ iwe ji wezuga onwe-ya.

Ọgbụgbandụ Nke Devid Na Jonatan

N’ụbọchị ahụ, mgbe Devid na Jonatan gwara onwe-ha gaa nkeọma, o metụtara ha na ọ pụrụ ịbụ na ha agaghị ezute kwa ọzọ. Ha gbara ndụ n’iru Chineke na ha gana-ahụ onwe-ha n’anya meso kwa èzínaụlọ onwe-ha omume ọma n’arọ niile na-abịa.

Ọtụtụ arọ gabigara nke Devid bụ onye ná-agba ọsọ ndụ site ná ndị-agha Sọl n’ọzara. Devid kpọkọtara ndị-agha nke ya, ọtụtụ mgbe ka ndị-agha-ha lụkọtara ọgù, ma mgbe niile ka Devid na-egosi Sọl obiọma.

Ịhụ Ndịiro N’anya

Jisọs ziri: “Nāhunu ndi-iro unu n’anya, nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsogbu unu” (Matiu 5:44). Devid nwere ịhụn’anya Chineke nime obi ya, n’oge nke ya kwa o mere dịka Jisọs kwuru mgbe emesịrị, na Onye-Kraist kwesịrị ime. Sọl agbalịwo igbu ya, wee kwa iwe nke ukwuu mgbe Chineke sịrị na Devid kwesịrị ịnọkwasị n’ocheeze ahụ. Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla Devid kpọrọ Sọl asị, ọ kpachapụ kwa ra anya ịhụ na ọ dịghị mgbe o merụrụ ya arụ n’agha.

Ọ bụrụ na Jonatan nwere ekworo n’obi ya, ọ pụrụ ileworị Devid anya dịka onyeiro ya kwa, n’ihi na arọpụtara ya ịchị Israel n’ọnọdụ Jonatan. Ma o nwere ịhụn’anya Chineke nime obi-ya, hụ kwa Devid n’anya karịa ile ya anya dịka onyeiro.

Échètara Ọgbụgbandụ

Mgbe ọnwụ Sọl, na Jonatan na ụmụnne ya gasịrị, ọ dịghị ihe ọzọ anụrụ banyere èzínaụlọ eze. Ma mgbe Israel lọghachirị n’oge ibindụ n’udo, Devid chetara ọgbụgbandụ ya na Jonatan wee ná-atụgharị uche ma ọ dị onye ọ bụla n’èzínaụlọ ya fọdụrụ ná ndụ. Ọ dị otù orù nke bụworo okenye ná-ebi n’ụlọeze onye jewooro Sọl ozi otù mgbe, ọ makwaara ebe Mefiboshet nọ na nzuzo n’arọ niile ahụ. Devid wee sị ka ekutere ya nwanwoke eze ahụ darangwụrọ.

Mefiboshet bịara n’egwù, wee gbue ikpere n’iru eze. Ọ mataghị ma aga-anabata ya dịka enyi maọbụ dịka onye adọtara n’agha. Devid sịrị: “Atula egwù: n’ihi na aghaghm imere gi ebere n’ihi Jonatan, bú nna-gi, m’gēweghachi-kwa-ra gi ubi nile nke Sọl nna-gi; gi onwe-gi gēri kwa nri na table nkem mgbe nile” (2 Samuel 9:7). Lee otú ọ ga-abụworị ihe ịtụnanya nye Mefiboshet! Ọ bịara n’egwù, ma ugbu a anabatara ya dịka nwa. Ọ bụghị náánị na ọ ga-ebi n’ụlọukwuu eze ná-eri kwa nri na tebụl nke eze kama na ala niile bụworo-rị nke nna-ya na nke nna nna-ya ga-abụ nke ya.

Mefiboshet darangwụrọ, ọ pụghị kwa ilekọta ala nke ya anya; ma orù ahụ bụ okenye, bụ Ziba, nwere ọtụtụ ụmụ ndịkom na ndị orù ndị jikeere ịlụrụ nwanwa onyenwe ha ochie ọlụ, ha wee were ubi Mefiboshet niile ilekọta ha anya.

Mkwụghachị Akwụghachịrị N’ihi Obiọma

Otú a ka esi kwụghachị obiọma Jonatan gosịrị Devid. Devid emesoghị Mefiboshet dịka onye adọtara n’agha, o jideghị kwa ala ọ lụgbuworo dịka nke ya. O mesoro Mefiboshet dịka ọ ga-adịwo ya-rị mma ka emeso ụmụ ya.

Obiọma Devid nye Mefiboshet aghaghị imeworị ka ịtụ egwù na ịkpọas ọ bụla ọ ga-enweworị n’arụ eze ahụ onye si n’èzínaụlọ-ha nara alaeze bụrụ ihe ewezugara. Ọ nọgidere n’ụlọeze ná-enwe ọñụ n’udo na ọgan’iru.

Otù oge bịara mgbe orù ahụ bụ okenye bụ Ziba, tụrụ àtùmààtù iwere ihe-nketa Mefiboshet. Devid ejewo agha, mgbe ọ lọghachirị wee nụ na ejiriwo aghụghọ mee ka o nye orù ahụ ihenketa Mefiboshet, ọ sịrị na aga èkè ya n’etiti ha abụọ. Ma Mefiboshet jupụtara n’ekele n’ebe Devid nọ n’ihi na o debere ya ndụ nye kwa ya ebe-obibi (“N’ihi na ulo nnam nile abugh ihe ọ bula ma-ọbugh ndi ọnwu n’iru onye-nwem, bú eze: ma i doro orù-gi n’etiti ndi nēri ihe na table nke gi”) na o metụtaghị ya inwe ọtụtụ ala (2 Samuel 19:28). Na Devid si n’agha lata n’udo ezuwo ime ka obi dị nwoke ngwụrọ ahụ ụtọ. Afọ juru ya ibí ndụ ya fọdụrụ n’iru Devid onye nke Chineke, ná-achọghị nsọpụrụ ọ bụla nke onwe-ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ aha nwanwoke eze ahụ dara ngwụrọ?
  2. Ònye bụ nna-ya?
  3. Òlee mgbe anyị mụrụ ihe banyere nna-ya na mbụ?
  4. Gịnị bụ ọgbụgbandụ ahụ Devid na Jonatan gbara?
  5. Gịnị mere Devid anọgideghị n’obí nke Eze Sọl?
  6. Gịnị mere Sọl na Jonatan?
  7. Gịnị mere Devid ji chee échìchè banyere èzínaụlọ Sọl?
  8. Ònye bụ náánị nwanwoke Sọl nke fọdụrụ ndụ?
  9. Òlee otú akụkọ a si gwụsịa?