Abù Ọma 51:1-19

Lesson 232 - Junior

Memory Verse
“Kèrem obi di ọcha, Chineke; me kwa ka mọ nke nēguzosi ike di ọhụ nimem” (Abù Ọma 51:10).
Notes
Ezi Ọchịchị Nke Devid

Mgbe e tere onye ahụ kachasị ukwuu n’ọchịchị Israel bụ Devid mmanụ ịbụ eze nke ndị Chineke arọpụtara, Samuel Onyeamụma kwuru banyere ya na ọ bụ onye dị ka obi Chineke si chọọ. Devid enyeworị Chineke ndụ-ya mgbe ọ dị ntakịrị, n’arọ niile na-eso kwa o fèrè Chineke òfùfè n’ikwesị ntụkwasịobi.

Site n’ịgụ ọtụtụ Abù Ọma nke Devid dere, anyị mụtara na ọ bụ nwoke ná-ekpe ekpere. Mgbe ọ bụla ọ nọ ná nsogbu ọ ga-akpọku Chineke ka O nyere ya aka. Mgbe o duru ụsụ ndị-agha nke Israel jee agha, ọ ga-arịọ Chineke ka o duzie ya. Abù Ọma ya nke iri abụọ na atọ bụ abù otuto n’ihi ịdịmma na ebere nke Chineke soworo ya ụbọchị niile nke ndụ-ya.

Devid mụkwara Iwu nke Chineke wee mee ka ọ bụrụ otù akụkụ nke ndụ-ya. Ọ chọrọ ịmata uche Chineke mee kwa ya. Ọ sịrị, “Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke; iwu-Gi di kwa nime obim” (Abù Ọma 40:8).

Ndaghachịazụ Devid

Oge bịara n’oge ọchịchị Devid mgbe o ji oge ya niile ná-alụ agha ná-enwe kwa mmeri na o lezighị anya n’òfùfè ọ na-efè Chineke. Ọ mụghị Iwu Chineke kpee kwa ekpere otú o kwesịrị, ihe nke a wetara bụ na ọ daghachịrịazụ wee mee mmehie jọgburu onwe-ya.

Chineke kwesịrị ntụkwasịobi nye Devid ọbụná dịka Ọ na-ekwesị nye onye ọ bụla daghachịrịazụ. O zigara onyeamụma ịgwá Devid na o mehiewo na ịkpáòkè adịwo kwa n’etiti ya na Chineke. Jehova elefughị mmehie Devid anya n’ihi ịkwesị ntụkwasịobi ya garaaga. Chineke agaghị ekuru Devid baa n’Eluigwe n’ọnọdụ mmehie ahụ. Ná-agbanyeghị otú mmadụ si bụrụ ezi Onye-Kraist, ọ bụrụ na o mee mmehie ọ bụ onye daghachiriazụ, wee bụrụ kwa onye nwụrụanwụ n’ebe èzínaụlọ Chineke dị. Nzọụkwụ mbụ ya ịlọghachikuru Chineke aghaghị ịbụ ịnabata na ya bụ onyemmehie, nwee kwa mwuta n’ihi ihe ahụ o meworo.

Mgbe Netan Onyeamụma kọwaara Devid mmehie ya, wee sị, “Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu” (2 Samuel 12:7), óké ibuarọ bịakwasịrị Devid, o wee kpeere Chineke ka agbaghara ya. Eze Israel wedara onwe-ya n’ala wee kwere na ya emewo ihe ná-adịghị mma. Ọ kwakuru Chineke ákwá dị ilu, “Megide Gi, nání Gi, ka m’mehieworo, ọ bu kwa ihe jọrọ njọ n’anya-Gi ka m’meworo.” Ọ chọrọ ka agbaghara ya ka o wee nwee ọñụ n’iso Chineke nwekọrịta ihe dịka ọ dị na mbụ. Mmehie ekewapụwo ya n’ebe Chineke nọ, ugbu a ọ bụghị kwa nwa Nna nke Eluigwe.

Obi Egwepịaraegwepịa

Devid maara na “JEHOVA nọ nso ndi obi-ha tiwara etiwa, Ọ nāzọputa kwa ndi azọpiaworo nime mọ-ha.” Ugbu a o kpere sị “Obi tiwara etiwa na nke egwepiara egwepia, Chineke, I digh-eleda ya anya.” Chineke nụrụ ekpere nchègharị wee were afọofufo gbaghara.

Chee échìchè ihe ga-emeworị Devid n’ọnọdụ a kwesịrị imere ebere asị na ọ malitere ịgọpụ mmehie-ya, wee rụọ Onyeamụma ahụ ụkà na ihe ya mere ajọghị njọ nke ukwuu. Òlee otú ọ ga-adịworị asị na ya onwe-ya, dịka onyeọchịchị nwere mpako, jụrụ ịñantị n’ozi Chineke sitere n’ọnụ Netan? Chineke gara amawo ya-rị ikpé ịbà n’ahụhụ ebighịebi. Ma ekpere nchègharị na mwuta nke Devid n’ihi mmehie ya niile ruru ntị Chineke wee weta mgbaghara.

Mkpọrọgwụ Nke Mmehie

Obi tọrọ Devid ụtọ na Chineke agbagharawo ya njehie-ya niile, ajọomume nke o meworo, ma o metụtara ya na ya chọrọ ịhụn’anya Chineke karịa nime obi ya. Mkpọrọgwụ nke mmehie, ụdị nke anụarụ, ka nọ kwa nime obi-ya.

Mgbe Adam mehiere n’Ogige Iden, o wetaara mmadụ niile amamikpé nke Chineke. Ụdị mmehie nke bịakwasịrị Adam mgbe o nupụụrụ Chineke isi, ka enyefere ụmụ-ya na ụmụụmụ-ya gaa kwa n’iru rue ọgbọ dị ugbu a. Ọ bụ ụdị mmadụ nime nwata na-eme ka o mee ihe-ọjọọ mgbe amụrụ ya. Chineke adịghị ama ya ikpé ebe ọ bụ na ọ maghị ihe ka mma; ọ bụrụ kwa na nwatakịrị anwụọ tutu ya amata ihe dị iche n’etiti ezi ihe na ihe ọjọọ, Jisọs ga-ekuru ya laa Eluigwe ọ bụ ezie na ọ dịghị mgbe o kpere ekpere mgbaghara. Ma mgbe mmadụ tolitere wee mata na ya na-eme ihe ọ na-ekwesịghị ime, ọ ghaghị ịrịọ Jisọs ka Ọ gbaghara ya ọ bụrụ na ọ chọrọ ijé Eluigwe. Mgbe anyị rịọrọ Jisọs ka Ọ gbaghara anyị mmehie niile anyị, Ọ na-azọpụta anyị ewee mụọ anyị ọhụụ. Ana-asachapụ mmehie-anyị, ewee gbaghara ma chefue kwa ha n’iru Chineke. Kama ọ bụ náánị ihe ná-adịghị mma niile anyị mere ka agbaghaara, ha wee pụọ.

Ụdị mmadụ ahụ nke dị nime mmadụ nke mere ya ka o mee ihe ná-adịghị mma ka na-anọgide kwa nime ya. Mgbe ọ na-anọgide ná-ekpé ekpere ná-arịọ kwa ka Chineke si ná mmehie wezuga ya, ụdị mmadụ ahụ apụghị ime ka o mehie ọzọ. Kama ọ ka nọ nime ya, ọ na-agbalị kwa ime ka ọ bụrụ onyemmehie.

Obi Dị Ọcha

Devid matara na ụdị anụarụ ahụ ka na-anọgide nime ya mgbe agbaghasịwooro ya mmehie ya niile, ọ chọkwara ka Chineke wepụ nke ahụ. O kpere ekpere ọzọ, wee rịọ Chineke: “Kèrem obi di ọcha.” Ọ matara na ná-agbanyeghi otú ya si mee ezi ihe ana-ahụ anya, Chineke pụrụ ileba anya nime obi-ya wee hụ na ọ dịzughị ọcha. Iji anụmanụ dị icheiche chụọ àjà, na ememe òfùfè dị icheiche ezughị ime ka obi ya dị ọcha. Ma Devid chọrọ ka Chineke mee ka obi-ya dị ọcha ka o wee nwee ike mgbe niile iwere obi ya niile mee ihe ọ bụla Chineke chọrọ ka o mee. Devid chọrọ ụdị obi ga-ekwere ihe niile Chineke kwuru. Ụdị nsacha obi dị otú a ka ana-akpọ odudonsọ zuruòkè maọbụ ịdịnsọ, anyị na-enweta kwa ya site n’Ọbara Jisọs. “N’ihi nka Jisus, ka Ọ we site n’ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n’azu ọnu-ụzọ-ama nke obodo” (Ndi Hibru 13:12).

Ọ bụghị náánị Devid bụ onye obi ahụ dị ọcha dị mkpà. Onye-Kraist ọ bụla taa pụrụ inwe ya, aghaghị kwa inwe ya, n’ihi na Baịbụl na-agwa anyị sị “Nāgbasonu udo n’ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu, nke onye ọ bula agagh-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nwegh ya” (Ndi Hibru 12:14).

Mmadụ Na Chineke Ịdị N’otù

Jisọs kpeere ndị náesoụzọ Ya ekpere: “Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu … ka ha nile we buru otù; dika Gi onwe-gi di nimem, dika Mu onwem di kwa nime Gi, Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi … ka ewe me ka ha buru ndi zuworo okè ibu otù” (Jọn 17:17-23).

Mnwapụta nke odudonsọ ka akpọwokwara Izuòkè Onye-Kraist. Ọ dị otù óké onyenkwusa onye Chineke kpọrọ ikwusa óké eziokwu a n’ihe dịka narị arọ iri na asatọ mgbe amụsịrị Jisọs. Aha ya bụ John Wesley. Ọtụtụ mmadụ kwuru na ọ bụghị ihe apụrụ ime bụ ibi ndụ rue ógó ihe ọ na-ekwusa, ọ bụ ezie na o si n’Okwu Chineke wepụta ya. Jisọs sịrị, “Ya mere unu onwe-unu gēzu okè, dika Nna-unu nke elu-igwe zuru okè” (Matiu 5:48). Onye dere akwụkwọ Ndi Hibru kpere ekpere ka emee ka ha “zue okè n’ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ” (Ndi Hibru 13:21). Chineke agaghị-ele anyị anya ime ihe na-agaghị ekwe anyị omume.

Izuòkè Onye-Kraist

Gịnị ka izuòkè Onye-Kraist pụtara? John Wesley gbalịrị ịkọwa ya dịka “nzọpụta pụa ná mmehie nile, na iji obi nile hụ Chineke n’anya nke ga-eme ka ayị na-añụrị ọñụ mgbe nile, ikpe ekpere na-ewepụghị aka, na ikele ekele n’ihe nile ọ bụla.” Chineke enyewo anyị ógó dị otú a na I Ndi Tesalọnaika 5:16-18. Ihe ọ pụtara bụ na anyị gana-enwe ekpere nime obi-anyị, na anyị ga-enwe kwa ike ịñụrị ọñụ ọbụná mgbe ihe ná-adịghị agara anyị nkeọma. Ịhụn’anya ahụ nke ná-emejupụta obi anyị ná-abụku Onyenwe anyị abụ otuto ọbụná mgbe ihe dum dị anyị gburugburu ná-agbalị ime ka anyị nọdụ n’iruuju. “Ezi ịhụ-n’anya nanị, na-achị nime obi na ndụ, nka bụ ozuzu nile nke Izu-okè nke Onye-Kraist.”

Jisọs sịrị na ịhụn’anya bụ idebezu Iwu. Iwu nke mbụ dịka O nyere ya bụ: “I gāhu kwa Onye-nwe-ayi, bú Chineke-gi, n’anya, site n’obi-gi dum, site kwa na nkpuru-obi-gi dum, site kwa n’ike-gi dum”; O wee tinye kwa, “Nke abua bu nka, I gāhu onye-agbata-obi-gi n’anya dika onwe-gi” (Mak 12:30, 31). Mgbe emeworo ka obi anyị dị ọcha, ihe ná-akpali ihe niile anyị na-eme bụ ịhụn’anya.

Ịhụn’anya Ná-adịgide

Anyị na-asị na edowo anyị nsọ. Anyị maara na anyị kpere ekpere ka edoo anyị nsọ wee nata ya mgbe agbaghasịwooro anyị mmehie niile anyị. Anyị pụrụ icheta ịhụn’anya jupụtara obi anyị mgbe ahụ. Anyị agaghị-eche ihe ọjọọ banyere onye ọ bụla; anyị agaghị-ekwu okwu ọjọọ megide mmadụ n’azụ ya; anyị na-eme omume ziriezi, anyị adịghị-agbalị ikpuchi ihe ọ bụla anyị mere. Ma ịhụn’anya ahụ ọ ka na-adịgide? Ị ka na-ahụ onyeagbataobi gị n’anya dịka onwe-gị, kà ị na-eme ihe ọ bụla ị pụrụ ime ka ị nwee ọgan’iru karịa ya? Ị na-echeta kwa na uche Chineke ga-abụ ihe mbụ n’ihe ọ bụla ị na-eme?

Ọ dịghị onye pụrụ ileba anya n’obi gị hụ ma ị hụrụ Chineke n’anya site n’obi-gị, site ná mkpụrụobi gị, site kwa n’uche-gị na n’ike-gị niile; ma ọ bụrụ na ị na-eme ya, ị na-erube isi n’iwu Ya niile. Eji nrubeisi anwapụta ịhụn’anya. Na I Jọn 2:5 anyị na-agụ: “Onye ọ bula nke nēdebe okwu-Ya, ọ bu nime onye ahu ka emeworo ka ihu-n’anya Chineke zue okè n’ezie.”

Ihe Niile Chineke Nyere N’Iwu

Gịnị bụ ihe niile ahụ enyere n’iwu nke Chineke na-ele anya na onye edoro nsọ ga-edebe? Anyị na-achọta ụfọdụ nime ha na I Ndi Kọrint 13: “Ihu-n’anya nwere ogologo-ntachi-obi, ọ nwe-kwa-ra obi-ọma; ihu-n’anya adigh-ekwo ekworo; ihu-n’anya adigh-anya isi, ọ digh-afuli onwe-ya elu, ọ digh-eme ihe nādigh nma n’anya, ọ digh-achọ ihe nke aka ya, oké iwe adigh-ewe ya, ọ digh-agu ihe ọjọ emere ya; ọ digh-añuri ọñu nime ajọ omume, ma ọ nēso ezi-okwu ñurikọ ọñụ; ọ nānagide ihe nile, nēkwere ihe nile, nēle anya ihe nile, nēnwe ntachi-obi n’ihe nile.”

Nime akwụkwọozi niile nke Pọl, Jọn, na Pita dere, anyị na-agụta karị; Jemes sịkwara, “Okpukpe-Chineke nke di ọcha nke anēmerugh kwa emeru n’iru Chineke-ayi, bú Nna-ayi, bu nka, ileta umu-ngbei na ndinyom di-ha nwuru nime nkpagbu-ha, na idebe onwe-ya nēnwegh ntupọ site n’uwa” (Jemes 1:27). Ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke nyere n’iwu ná-adịghị mkpà. Anyị pụrụ idebe onwe-anyị ọcha pụọ n’ọñụ na omume niile nke ụwa, ma enyekwara anyị iwu inyere ndị nọ ná mkpà aka, na ijé leta ndị ná-arịa ọrịa -- ọ bụghị ijé kwue okwu azụ, kama ọ bụ ịgwa ha okwu ga-eme ka ha nwee ọñụ nime obi ha na ịgwa ha okwu banyere ihe niile nke Eluigwe. Jisọs sịrị: “Ka ọ ra, bú otú unu si me ya nye otù onye nime umu-nnam ndia, bú ndi dikarisiri ntà, Mu ka unu mere ya nye” (Matiu 25:40).

Itóétó N’amara

Anyị adịghị-ezu òkè n’ihe niile ọ bụla dịka Okwu Chineke si dị ngwangwa ahụ edoro anyị nsọ, kama mgbe mnwapụta ahụ na-adị nime obi-anyị, ana-eme ka anyị dị ọcha ka anyị wee nwee ike iru ógó dịka Okwu-Ya si dị mgbe ana-ekpughere anyị ya. Pọl Onyeozi gwara Timọti, sị “Nānu ọku n’obi iche onwe-gi n’iru madu dika onye Chineke nwaputaworo” (2 Timọti 2:15). Ya mere, Chineke na-ele anya ka ụmụ-Ya mụta ihe bụ uche Ya, mee kwa ya.

Àtùmààtù Chineke n’ido ndị-Ya nsọ bụ ka O wee chee ha n’iru Onwe-ya, “dika ihe di ebube, nēnwegh ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n’ihe di otú a; kama ka ọ we di nsọ buru kwa ihe anāpugh ita uta” (Ndi Efesọs 5:26, 27).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee mgbe Devid nyere Chineke obi ya?
  2. Gịnị ka Chineke chère banyere Devid mgbe ọ ghọrọ eze?
  3. Gịnị ka Devid mere mgbe o mehiere megide Chineke?
  4. Devid kpere ekpere banyere ihe abụọ. Gịnị ka ha bụ?
  5. Gịnị ka Chineke na-emere anyị mgbe azọpụtasịrị anyị?
  6. Gịnị ka odudonsọ na-eme nime obi?
  7. Kwue ihe ụfọdụ Chineke na-ele anya na onye edoro nsọ gana-eme.
  8. Gịnị mere Chineke ji edo ndị Ya nsọ?