Abù Ọma 8:1-9; 19:1-14; 119:1-24

Lesson 234 - Junior

Memory Verse
“Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke; ọ bu kwa ọlụ-aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi” (Abù Ọma 19:1).
Notes
Otuto Nye Chineke

N’ebe a Devid na-enye Chineke-anyị otuto onye onwunwu nke ịmamma na ịdịukwuu Ya kwesịrị otuto na nsọpụrụ. Aha Jehova bụ aha arọpụtara arọpụta dị kwa óké ọnụahịa n’ihi na Ọ karịrị ihe niile dị n’ụwa ukwuu. Ọ dị elu karịa ihe ọ bụla dị n’eluigwe maọbụ mbaraigwe niile.

Onyenwe anyị bụ Onye kèrè ihe niile. Ọtụtụ mgbe Ọ na-agwa mmadụ okwu site n’ọlụ nke aka-Ya. Ọ na-ekpughe Onwe-ya nye ụmụmmadụ site n’ihe O kèworo. Ọ dịghị asụsụ maọbụ ndị ọ bụla ná-adịghị-anụ olu nke Chineke, mgbe ha na-elekwasị ihe niile ekèrè-èkè anya (Abù Ọma 19:3). “Ka osimiri nile kua aka-ha; ka ugwu tie nkpu ọñu n’otù; n’iru JEHOVA” (Abù Ọma 98:8, 9). “Ugwu nile na ugwu ntà nile gētiwa nkpu ọñu n’iru unu, osisi nile nke ọhia gāku kwa aka-ha” (Aisaia 55:12).

Ebube Nke Chineke Nime Eluigwe Niile

Ihe niile ana-ahụ kwa-ụbọchị na-ekwupụta ebube nke Chineke. Tụgharịa uche banyere Eluigwe niile. Ha “nākọ nsọpuru Chineke” (Abù Ọma 19:1). Ha bụ ọlụaka Chineke, aha-Ya dị kwa ukwuu n’ebube karị ha. Ịmamma nke mbaraigwe na-ewetara ụmụmadụ ọñụ dị ukwuu. Àgwà anụnụ bụ ihe eji mee ka ịmamma ọtụtụ agwa niile ọzọ nke dị nime eke-na-ogwurugwu pụta nkeọma mkwà nke Chineke ná agaghị eji ijummiri mebie ụwa ọzọ (Jenesis 9:11).

Ị hụwo igweojii nke ná-adị ka ogho ná-acha ka nzu nke ná-ejégharị na mbaraigwe wee pụọ n’anya ahụghị kwa ya ọzọ. Ị dịghị-enwe ọñụ n’ile àgwà dị icheiche ná-adị n’iru Eluigwe mgbe anyanwụ na-ada nke ná-esi n’igbu maramara ya gbanwee wee dị jụụ nke ná-enye kwa mmadụ obiụtọ? Ọ bụ Chineke kèrè ha. Ha na-akọ nsọpụrụ Chineke ọ bụ ezie na adịghị anụ olu-ha.

Irú eluigwe bara urù maa kwa mma. Anyanwụ na-aga ijè n’ụzọ ya, nke ana-akpọ gburugburu ya, kwa-ụbọchị, mgbe niile n’otù ụzọ ahụ, ọ na-aga ná-agbanweghị na n’ọtụtụ arọ ọ dịghị ihe ọzọ eji amata oge maọbụghị site n’otù ihe eji amata oge site n’onyinyo mgbe anyanwụ na-acha ya. Anyanwụ na-achị ịdị-ogologo nke ehihie na abalị n’akụkụ niile nke ụwa. Anyanwụ na-enye okpomọkụ ná-enye kwa ìhè, “ọ digh kwa ihe ezonariworo okpom-ọku-ya” (Abù Ọma 19:6). Anyanwụ, na ihe niile na-enyere ya aka n’abalị -- ọnwa na kpakpando niile -- na-eme kwa ka mgbe ọkọchị, udummiri, mgbe oyi na mgbe okpomọkụ dị otú ha si dị. Chineke tụrụ àtùmààtù a niile ná-achị kwa ha. Ụfọdụ mmadụ na-efè anyanwụ òfùfè ná-enye kwa ìhè niile dị na mbaraigwe otuto; ma ka anyị sọpụrụ too kwa Chineke onye bụ Onyeòkìkè na Onyenduzi, Nna nke ìhè nile (Jemes 1:17).

Ebube Nke Chineke N’ụwa

Ihe niile dị n’ụwa na-egosi kwa ọlụaka nke Chineke. Ọ dịwo mgbe ị hụrụ óké ifufe, nke ná-amagharị óké osisi dị icheiche mgbe ọ na-efé rue ọbụná iropụ ha? Maọbụ ị lekwasịwo óké osimiri anya mgbe ọ na-amali elu site n’ifufe ná-efekwasị ya? Chineke “nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ, nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu” nke na “ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ogbu-miri nile.” Chineke “ nēme ka oké ifufe guzo n’idere du, nmali-miri-ya nile we gba nkiti” (Abù Ọma 107:25-29).

Ebube Chineke N’ihe Ntà Dị Icheiche

Ọbụná ụmụ ihe ntà dị icheiche ná-adịghị ike ana-ahụ ebe niile na-akọ nsọpụrụ Chineke. Ọ na-atụ anyị n’anya mgbe anyị na-echè banyere ụmụ arụrụ na ụmụ ihe ntà dị icheiche ekèrèekè bi n’eluụwa. Ọ dị ụmụ arụrụ dị ntakịrị nke ukwuu, otú ọdị ha na-egosi kwa ebube Chineke site n’otú ha si ebi ndụ ha. Ònye na-ezi nwaarụrụ ntakịrị ụzọ ọ ga-esi laa ụlọ mgbe ọ jègharịsịworo n’etiti ogologo ahịhịa? Ònye na-enyere ụmụarụrụ niile ahụ aka ibuli ihe ka ha ukwuu dị kwa arọ karị ha? Ònye na-ezi ha ikpokọta nri nke aga-eri na mgbe oyi? Ọ dịghị onye ọzọ ma ọ bụghị Chineke n’Onwe-ya. Ejiriwo ụmụ ihe ntà niile a ekèrèèkè wee meere anyị ihe ịmaatụ dịka ihenlereanya. Solomon sịrị: “Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; le uzọ-ya nile, we mara ihe: nke nēnwegh onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n’ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi, ma o nēdozi nri-ya na mgbe okpom-ọku, nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mgbe owuwe-ihe-ubi” (Ilu 6:6-8).

Eleghịanya ịnụwo banyere, maọbụ hụ idide ntakịrị nke n’oge ndụ ya na-agbanwe wee ghọọ urukurubụba maramma. Mgbe ọ na-arịgharị anaghị-ahụ ya nkeọma n’ihi na o yiri akwụkwọ maọbụ osisi nọ ya gburugburu. Ọ bụghị idide ahụ rọọrọ àgwà maọbụ ụdị ya. Chineke nyere ha dịka ihe mkpuchi nye nwa idide ntà ahụ. Na mgbe ná-adịghị anya nwaidide ntà ahụ na-ewuru onwe-ya ụlọ nke ana-akpọ akpa-ya. Idide adịghị-eje ụlọakwụkwọ ijé mụta otú ọ ga-esi kpaa maọbụ mgbe ọ ga-akpa ya. Eriri ahụ dị n’arụ ya Chineke na-esite kwa na mmetụ gosi ya ijikere onwe ya. Mgbe ọ rarụsịrị nwaoge nime akpà ahụ, akpà ahụ na-agbawa, urukurubụba mara mma ewee pụta. Ọ dịghị onye ọ bụla na-esi n’ụra kpọlie ya maọbụ nyere ya aka yikwasị uwe-ya. Ọ na-apụta gbasaa nku-ya abụọ nwere ọtụtụ àgwà, yọchaa onwe-ya wee fepụ. Na mbụ, ọ na-abụ àkwà, emesịa nwa idide, emesịa ọ baa n’akpa, idide ná-ararụ ụra nime akpa, emesịa urukurubụba, dị nro ma dị ike igosipụta ebube Chineke.

Ihe ndịa ekèrèèkè bụ ọlụ aka Chineke. Ọ na-esite na ha anata nsọpụrụ na otuto nye Onwe-ya. Ha na-egosipụta ịdịukwuu na ịdịike Ya ikè ha na ịchịzi kwa ha.

Mmadụ

“Gini ka madu bu, na I nēcheta ya?” Ka anyị na-atụgharị uche banyere ebube ukwuu nke Chineke, ọ na-eju anyị onwe-anyị anya na Ọ na-eleba anya n’ebe ndịkom na ndịnyom nke ụwa nọ. Ma Chineke enyewo anyị ọtụtụ ngọzi dị icheiche. O meworo anyị ọtụtụ ihe ukwuu. Mmadụ ka Chineke nyeworo ike na onyinye ichè échìchè na ịmụta ihe, iwu na ime ihe. Mmadụ ka O nyeworo ebe dị elu karị anụmanụ niile na ihe niile ọzọ nke aka Chineke lụpụtaworo. Mmadụ na-achị ihe niile Chineke kèrè. Chineke nyere mmadụ ike iji ihe ekèworo ekè mee ihe -- unyi na ígwè dị nime ala, osisi na anụmanụ dị n’eluụwa, anụufe nke Eluigwe, na azù bi na mmiri.

Anụmanụ niile, anụufe niile, azù niile, na ụmụ arụrụ niile na-agbaso àtùmààtù nke Chineke mewooro ha. Chineke mere mmadụ ịbụ onye-isi ha niile. Chineke emeworo anyị ihe niile ndịa n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya; ọbụná ugbu a Ọ na-elepụ anya ka O wee nyere mmadụ aka. “Le, anya JEHOVA di n’aru ndi nātu egwù Ya, bú n’aru ndi nēchere ebere-Ya; inaputa nkpuru-obi-ha n’ọnwu, na idebe ha ndu n’oké unwu” (Abù Ọma 33:18, 19).

Àtùmààtù Chineke Nye Anyị

Chineke nwere àtùmààtù Ọ chọrọ ka anyị ná-eso kwa. Agụụ dị nime obi mmadụ ịchọ obiụtọ. Chineke emewo ụzọ mmadụ ga-esi nwee ọñụ. Ọ na-agwa anyị onye bụ onye ahụ nwere ọñụ na otú onye ọ bụla pụrụ isi nwee ọñụ bụrụ kwa onye agọziriagọzi -- site n’ijegharị “n’iwu JEHOVA” (Abù Ọma 119:1). Iwu niile nke Jehova bụ ihe aga-achọsi ike karị ọlaedo n’ihi na “n’idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa” (Abù Ọma 19:10, 11).

Iwu Chineke bụ Baịbụl. Chineke na-agwa ụmụmmadụ okwu site n’Okwu Ya dịka Ọ na-agwa kwa ha site n’ihe O kèrèèkè. Enyere anyị iwu idebe iwu Chineke na Okwu Ya (Abù Ọma 119:4), nke ahụ bụ kwa ụzọ anyị pụrụ isite na ya nwee ọñụ n’ezie. “Gini bu … nwa nke madu, na I nēleta Ya?” Mmadụ bụ kwa otù nime ihe niile Chineke kère. Chineke na-achọ ịnata otuto site n’ebe anyị nọ. N’ihi na Chineke hụrụ anyị n’anya Ọ na-achọ kwa ka anyị na-ebi ndụ anyị nye Ya nwee kwa ọñụ, O nyewo anyị Baịbụl, Okwu Ya.

Urù Baịbụl Bara

Devid, dịka onye dere ọtụtụ Abù Ọma, na-agwa anyị na ya nwetara àkù riri nne site n’Okwu Chineke. Devid hụrụ Okwu Chineke n’anya ná-asọpụkwara ya. O ji Okwu Chineke mee ihe site n’ịnara ịdọ akanántị site na ya. Adọrọ ya aka ná ntị banyere ọlụ ya n’ebe Chineke na mmadụ dị. Adọrọ ya aka ná ntị banyere ihe-egwù gaje ịbịa. Adọrọ Devid aka ná ntị site n’Okwu Chineke ijikere iguzo n’iru Chineke.

Ka Devid na-ekpe ekpere, ekpere ya bụ megide mmehie. O kpere ka emeere ya ebere. O kpere ka enye ya amara n’oge mkpà iji gbachie mmehie. O kpere ka edebe ya site n’ike Chineke. Onye ahụ dere Abù Ọma kpere ekpere mee kwa ihe. O jiri obi-ya niile chọọ Chineke (Abù Ọma 119:10). O zobere Okwu ahụ nime obi-ya ka o wee ghara imehie megide Chineke (Abù Ọma 119:11). Ọ tụgharịrị uche n’Okwu Chineke niile -- ọ bụghị náánị n’ụgwọọlụ na ngọzi ya niile. Iwu Chineke, ihe niile Chineke nyere n’iwu, iheịrịbaàmà na ụkpụrụ niile nke Chineke bụ ihe dị ya mkpà. Ha bụ ihe ọ na-enwe ọñụ nime ha, ka o wee dị ndụ ná-edebe Okwu Chineke (Abù Ọma 119:16, 17).

Ihe Devid chọsiri ike bụ ibi-ndụ guzoziri eguzozi. Ọ chọrọ ka échìchè ya niile na okwuọnụ ya niile bụrụ ụdị nke Chineke na-anara. Ọ chọrọ ka ha bụrụ otuto na ekpere nye Chineke Onye Devid kpọrọ “oké nkumem, na onye ngbaputam.”

Otuto Si N’ebe Mmadụ Nọ

N’iheọmùmù a anyị amụtawo na ihe niile Chineke kèrèèkè na Okwu Ya na-egosi ebube na ike nke Chineke. Ha na-enye Chineke otuto na nsọpụrụ. Onyenwe anyị na-anata kwa otuto n’ọnụ ụmụntakịrị. Ha dị ntakịrị, eleghịanya ha adịghịike, ụfọdụ kwa ejebeghị ụlọakwụkwọ, ma ha pụrụ itó Chineke. Dịka ụmụntakịrị ahụ mere mgbe Jisọs bàsịrị Jerusalem ná mmeri! Ụmụntakịrị tóró Jisọs n’ụlọnsọ, “si, Hosanna diri Nwa Devid” (Matiu 21:15).

Anyị na-enye Chineke otuto site n’okwu anyị na-ekwu n’otuto Ya. Omume anyị -- ihe niile anyị na-eme -- pụkwara inye Chineke otuto. Onye dere Abù Ọma sịrị: “M’gēwere obi ziri ezi kele Gi, mgbe m’mutara ikpe nile nke ezi omume-Gi” (Abù Ọma 119:7). Mgbe anyị na-erube isi n’ihe dị na Baịbụl, anyị na-enye Chineke otuto site ná ndụ anyị. Mgbe azọpụtara anyị, anyị na-ebi ndụ dị ọcha nye Onyenwe anyị. Ndụ dịọcha na-enye Chineke otuto ná-egosipụta kwa ike Ya. Ka Abù Ọma niile anyị mụworo nyere anyị aka iwere Okwu Chineke kpọrọ ihe nye kwa anyị ike ibi-ndụ, site n’amara Ya, ka Chineke wee nwee ike ịnata nsọpụrụ na otuto.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye kèrè Eluigwe na ụwa?
  2. Òlee otú ha si egosipụta ebube Chineke?
  3. Òlee ụzọ abụọ Chineke si agwa mmadụ okwu?
  4. Gịnị mere Chineke ji ná-echeta mmadụ?
  5. Ònye ka Chineke doro ilekọta ihe niile O kèrèèkè?
  6. Urù ra añaa ka Baịbụl bara?
  7. Gịnị mere Onye ahụ dere Abù Ọma ji zobe Okwu Chineke nime obi-ya? (Abù Ọma 119:11).
  8. Gịnị bụ ekpere Devid? (Abù Ọma 19:14).