Lesson 235 - Senior
Memory Verse
“Ka obi unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu, N’ulo Nnam ọtutu ebe obibi di: ọ buru na ọ bugh otú a, M’gāgwawori unu: n’ihi na anamaga idoziri unu ebe” (Jọn 14:1, 2).Cross References
I Okwu Nkasịobi Nke Jisọs gwara Ndị náesoụzọ Ya Ndị Obi Lọrọ Mmiri
1. Jisọs na-ekwe mkwà idoziri ha ebe, Jọn 14:1-3
2. Ụzọ ahụ, Eziokwu, na Ndụ ka akọwara nkeọma nye Tọmas onye obi abụọ, Jọn 14:4-7
3. Iheomimi nke Chineke “Nna na Ọkpara” ka akọwara nye Filip onye obi lọrọ mmiri, Jọn 14:8-11
4. Jisọs kwere mkwà na ọtụtụ ọlụ dị ukwuu ka ndị niile ga-ekwere na Ya ga-alụ, Jọn 14:12-14
II Mkwà Maka Onyenkasịobi
1. “Onyenkasịobi ọzọ” ga-abịa ịnọgide rue mgbe ebighịebi, Jọn 14:15-17
2. Aga-eme ka Jisọs pụta ìhè nye ndị náesoụzọ Ya, ma ọ bụghị nye ụwa, Jọn 14:18-24; Matiu 18:20
3. Onyenkasịobi ahụ, bụ Mmụọ Nsọ ga-abụ Onyeòzízí ha, Jọn 14:25, 26; 16:12-14
4. Jisọs na-enye ọtụtụ okwu nkasịobi nke ikpeazụ, Jọn 14:27-31
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEObi lọrọ ndị náeso Jisọs mmiri mgbe ha na-echè échìchè banyere nkewapụ ha n’ebe Jisọs nọ, n’ihi na Ọ sịrị, “Ọ fọduru nwa oge Mu na unu gānọ,” na “Ebe Mu onwem nāla, unu onwe-unu apugh ibia” (Jọn 13:33). Ma Kraist, site n’obi ebere na ọchịchọ Ya ịkasị ndị ahụ niile soro Ya obi, O wepụtara okwu ọma ndịa: “Ka obi unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu. N’ulo Nnam ọtutu ebe obibi di; ọ buru na ọ bugh otú a, M’gāgwawori unu; n’ihi na anamaga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M’gānara kwa unu nye onwem ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ” (Jọn 14:1-3).
Ọ dị otù oge “mgbe kpakpando ụtụtụ nētikọ nkpu ọñù, umu Chineke nile we tisie nkpu ọñù ike” (Job 38:7) Ma ụbọchị ruru mgbe mmehie gbasasịrị ịdịn’otù nke ihe Chineke kèrèèkè ma webata kwa ọbụbụ ọnụ n’eluụwa. Mmehie mebiri mnwekọ nke Chineke na ụmụmmadụ ma webata ọgbaaghara dị ukwuu nime ụwa; ma obi nke Chineke na-achọsi ihe nke O kèrèèkè ike, ma site n’amamihe Ya nke ná-enweghị nsọtu O wepụtara àtụmààtụ nke aga-esite na ya gbapụta mmadụ nke jupụtara ná mmehie. “N’ulo Nnam ọtutu ebe obibi di.” Chineke Nna zitere Kraist n’ụwa ka O wee mee ka mmadụ na Chineke dị n’udo ka ndị agbapụtara site n’Ọbara nke Jisọs wee binyere Ya ebighịebi. Chee échìchè ihe ọ gaabụ mgbe okwu nke óké olu ahụ nke Jọn nụrụ site n’eluigwe ga-emezu: “Le, ulo-ikw nke Chineke dinyere madu, ọ gēbiye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke-ha.” (Nkpughe 21:3)
Ụlọ Nna
Obodo Nsọ ahụ, bụ Jerusalem ọhụụ nke Jọn hụrụ ka ọ na-esi n’Eluigwe ná-arịda, bụ ụlọ nke Nna. Nime ya ka ọtụtụ ebe obibi dị nke ana-apụghị ịkọwacha ịmamma Ya; Jisọs agawo idozi ha -- idozi ha chéré ndị hụrụ Ya n’anya. Chee échìchè banyere ama ọlaedo ahụ ná-egbu maramara, mgbidi ahụ nke eji nkume jaspa ná-enwuenwu wue, osimiri nke ndụ ahụ, osisi niile ahụ nke ná-enye mkpụrụ ha n’ọnwa n’ọnwa, ahịhịa ya niile bụ ihe ná-eme ka obi tọọ mmadụ ụtọ -- ha niile bụ Ụlọ nke Nna anyị. Ọ kpọwo kwa anyị òkù ka anyị bịa ibinyere Ya n’Ụlọ ebighịebi. Anyị ndị mmefu, ka ejiri óké oriri nábata n’Ụlọ -- mmehie anyị ka agbagharaworo, kagbu kwa ụgwọ niile anyị ji n’elu obe nke Ọkpara Ya Ọ hụrụ n’anya. Onye ahụ dị Ọcha dị kwa Nsọ jiri onwe-Ya chụọ àjà ka e wee gbapụta ndị emerụrụemerụ na ndị ná-adịghị ọcha. Ònye bụ onye ahụ dị nnọọ nzuzu nke ga-ajụ óké àtụmààtụ a nke Chineke? Ònye bụ nnọọ onye ahụ nke maara ihe nke ga-enwe ebe ka mma maọbụ ụzọ ná-enye ọñụ karịa nke ahụ Ya onwe-ya na-enye?
“Ebe Mu onwem nāla, unu mata-kwa-ra uzọ-ya” (Jọn 14:4). Jisọs mere ka o doo anya otú o nwere ike na Ya onwe-ya sitere n’ebe Chineke nọ bịa na Ya onwe-ya na-alaghachikuru kwa Chineke. O jiri arọ atọ nke ijé ozi Ya ná-atụziri ndị mmadụ aka banyere nchègharị na ọmụmụ ọhụụ. Ọ gwara ha ihe banyere ibi ndụ karịa mmehie na otú aga-esi doo ha nsọ mee ka ha dị ọcha ma bụrụ kwa ndị dị nsọ. Ọ gwara ha ka ha chèrè na Jerusalem rue mgbe aga-emeju ha n’ike ahụ nke sitere n’Eluigwe. Ọ gwara ha okwu banyere Onyenkasịobi ahụ onye ga-anọnyere ha rue mgbe ebighịebi. Ọ tọrọ ụkpụrụ banyere Nrianyasị nke Onyenwe anyị na ịsáụkwụ nke ndịnsọ. O nyere ha iwu idebe ụkpụrụ nke ọwụwụmmiri nke mmiri -- ná-awụ ha mmiri baa “n’aha nke Nna na nke Ọkpara na nke Mọ-Nsọ.” Ma karịa ihe ndịa niile, Ya Onwe-ya bụ Ụzọ ahụ. Ọ bụ náánị site n’àjà ahụ nke Ọ chụrụ na Ọbara nke awụsịrị ka ụmụmmadụ na-enwe mgbaghara nke mmehie ha.
Atọ nime Otù ahụ
“Kwerenum na Mu onwem nọ nime Nnam, Nnam nọ kwa nimem: ma ọ bugh kwerenum n’ihi ọlum onwe-ha.” Jisọs chọrọ ka ndị náesoYa ghọta ọnọdụ nke ịbụ Chi-Ya. Mgbe Pita nwetara mkpughe ahụ wee mata onye Jisọs bụ ọ sịrị “Gi onwe-gi bu Kraist ahu Ọkpara Chineke di ndu.” Nzaghachị nke Jisọs bụ na mkpughe ahụ sitere n’Eluigwe na ọ bụ kwa “n’elu oké nkume a ka M’gēwu nzukọm dika ulo.” (Matiu 16:16-18). Nzukọ nke Kraist aghaghị ịghọta na Jisọs abụghị náánị onye òzízí nke sitere n’ebe Chineke nọ kama na Ya Onwe-ya bụ Chineke, na ọ bụ kwa Nwaatụrụ Chineke onye e jiri chụọ àjà n’ihi mmehie niile nke ụwa. “Kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.” Nke bụ ma asụgharịa ya, “Kwerenu na Mu onwem bu Chineke.” “Onye huworom anya ahuwo Nnam anya.” Kraist bụ mkpughe zuruòkè nke Nna ahụ. Dịka Ọkpara amụrụ náánị Ya, Jisọs Kraist bụ “onyinyo nke udi-Ya” (Ndi Hibru 1:3). Nke a apụtaghị na Ya onwe-ya bụ otù Onye ahụ, kama ọ bụ ụdị Ya zuruòkè. Ọ dịghị nghọtahie maọbụ adịghị n’otù nke dị n’àtụmààtụ Ha maọbụ nzube Ha. Otù na-ekpughe uche ibe Ya n’òzùzùòkè.
N’ebe iheọgụgụ a na Baịbụl ka e kpughere mmadụ atọ ahụ pụtara ìhè nime Atọ nime otù ahụ. Jisọs sịrị, “Anamagakuru Nnam.” Nke a na-egosi na Nna nke nọ n’Eluigwe na Jisọs Onye nọ n’ụwa bụ ebube dị iche iche. O kwukwara na “Onye-nkasi-obi ahu, bu Mọ-Nsọ, Onye Nnam gēzite n’aham, Onye ahu gēzi unu ihe nile, me kwa ka unu cheta okwu nile Mu onwem gwara unu” (Jọn 14:26). N’ebe a n’otù amaokwu nke ihe edere n’Akwụkwọnsọ anyị hụrụ na e kpughere atọnimeotù site na Mmụọ Nsọ nke Nna zitere ichetara anyị ihe niile nke Jisọs bụ Ọkpara ahụ, kwuru. E kwuru ihe banyere Mmụọ Nsọ n’ebe a dịka onye nke atọ, dịka Onye nke bụ otù Onye. E nwere ịdịn’otù nke dị n’Ịbụisi dị nsọ nke Chineke nke anyị ná-apụghị ịghọtazu, ma anyị pụrụ ịhụ na e nwere Atọnimeotù dị ngọzi: Nna, Ọkpara na Mmụọ Nsọ. Anyị hụkwara na ekpughere Atọnimeotù ahụ na Ọwụwụmmiri nke Jisọs mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị Ọkpara ahụ n’ụdị nke nduru ma Nna ahụ kwukwara okwu site n’Eluigwe.
Mgbe Jisọs sịrị Filip; “Onye huworom anya ahuwo Nnam anya,” O kwuru ihe karịrị ihe Filip pụrụ iji anya nke anụarụ ya hụ. Arụ anyị nke ana-ahụ anya abụghị ihe ná-egosipụta ihe anyị bụ n’òzùzù òkè. Anyị nwere ike ịmata ndị mmadụ site n’ụdị arụ ha nwere; ma mgbe anyị bịaruru ha nso mata kwa ha nkeọma, ọ bụ omume ha na ndụ dị nime ha na-eme ka anyị hụ ha n’anya. Otú a ka ọ dị kwa n’ebe Kraist nọ -- ọ bụghị ogologo maọbụ otú agịrịisi Ya na-acha bụ ihe kpughere Nna ahụ, kama ọ bụ óké obi ebere Ya, ịhụn’anya nke O nwere, ụdị ndụ nke O biri, na ọtụtụ ọlụ nke Ọ lụrụ bụ ihe gosịrị ndị náesoụzọ Ya Nna ahụ.
Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ
“N’ezie, n’ezie asim unu, onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa; n’ihi na Mu nāgakuru Nnam” (Jọn 14:12). Mkwà nke a na-eme ka anyị ghọta ihe mere eji enye Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Ọ bụ onyinye nke ike eji eje ozi. “Unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-amam nime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Onyinye nke ike a, bụ Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ ekwesịghị ka o bụrụ ihe mgbagwojuanya n’ebe odudonsọ dị nke bụ nsacha nke obi.
Odudonsọ bụ ịdịnsọ, ma Ọwụwụmmiri ahụ bụ inye ike. E doro Devid nsọ mgbe o kpere ekpere sị “kerem obi di ọcha Chineke” (Abù Ọma 51:10). E doro Aisaia nsọ mgbe nkume ahụ dị ọkụ nke sitere n’ebe ịchụàjà metụrụ egbugbereọnụ ya abụọ. Awụsaghị Mmụọ Nsọ ma ọ bụghị n’ụbọchị Pentikọst mgbe e jiri Mmụọ Nsọ na ọkụ wụọ ụmụmmadụ Mmiri. Ndị nsọ nke mgbe ochie kwuru okwu dịka Mmụọ Nsọ si due ha; e mejupụtara Jọn na Mmụọ Nsọ site n’afọ nne-Ya; ma n’ụbọchị Pentikọst ka awụrụ otù narị mmadụ na iri mmadụ abụọ Mmiri (mikpue ha) nime Mmụọ Nsọ. Ọ bụghị náánị na e mejupụtara ha na Mmụọ Nsọ kama O jupụtakwara n’ụlọ ahụ ebe ha onwe-ha na-anọdụ, ọ bụ kwa nime ha ka osimiri nke Mmiri na-enye Ndụ na-asụpụta.
Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ akwụsighị n’Ụbọchị Pentikọst, n’ihi na anyị chọpụtara na awụpụkwara ya ọzọ n’ụlọ Kọniliọs mgbe arọ asatọ gasịrị (Ọlu Ndi-ozi 10:44-46) na mgbe iriarọ abụọ na atọ gasịrị n’Efesọs (Ọlu Ndi-ozi 19:6). N’oge ọ bụla ha natara Ya ha na-ekwu okwu n’asụsụ dị icheiche, nke bụ iheàmà nke Ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ. Ihe-mnwapụta a nke dị ebube akwụsịghị n’oge nke Baịbụl; kama, dịka ihe edere n’akwụkwọnsọ si dị “Unu ka nkwà nka diri na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra bu ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39). Chineke ka na-akpọ kwa ná-awụkwasị kwa Mmụọ ya n’arụ ndị e doro nsọ. “Ùnu natara Mọ Nsọ mgbe unu kwere?” (Ọlu Ndi-ozi 19:2).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Òlee ebe aga-achọta ebe akọwara nnọọ ihe banyere Eluigwe nkeọma?
- Kọwaa ọbịbịa nke ugbò abụọ nke Kraist.
- Gịnị bụ ihe dị iche ná mpụtaìhè nke Mmụọ Nsọ na Testament ochie na nke taa?
- Gịnị mere ndị náesoụzọ Ya ji nwee obi ịlọmmiri n’oge a?
- Òlee mkwà ahụ nke wetaara ha niile nkasịobi?
- Ọ bụ mkwà òle ka i nwere ike ịchọta n’ebe ọgụgụ a?
- Mkwà ndịa niile hà dịịrị anyị n’ụbọchị taa?
- Kwue ọtụtụ ọlụ Mmụọ Nsọ na-alụ nime ụwa taa?
- Gosị ọtụtụ ebe n’Akwụkwọnsọ nke ná-akwagide Atọnimeotù.
- Òlee mgbe emezuru mkwà banyere Onyenkasịobi ahụ?