Jọn 15:1-27

Lesson 236 - Senior

Memory Verse
“Mu onwem bu osisi vine ahu, unu onwe-unu bu alaka nkem: Onye nānọgide nimem, Mu onwem kwa nime ya, onye ahu nāmi nkpuru ri nne: n’ihi na unu apugh ime ihe ọ bula ma Mu anọgh ya” (Jọn 15:5).
Cross References

I Osisivine ahụ na Alaka ya dị icheiche -- Kraist na Ndị náesoụzọ Ya

1. Kraist bụ Ezi OsisiVine ahụ; ma Chineke Nna bụ Onye ọlụubi ahụ maọbụ Onyenlekọta, Jọn 15:1; Ndi Efesọs 4:21

2. Ọ na-eme ka alaka ahụ niile dị ọcha ka ha wee mịa mkpụrụ karị, Jọn 15:2; Ndi Galetia 5:22, 23

3. Ana-eme ka ndị náesoụzọ Ya dị ọcha site n’okwu Jisọs kwuru, Jọn 15:3; I Pita 1:22

II Mkpà ọ dị ka Alaka ahụ niile Nọgidesie ike n’Osisi Vine ahụ

1. Alaka niile ná-amị mkpụrụ náánị mgbe ha na-anogide n’osisivine ahụ, Jọn 15:4, 5

2. Egosiri ọnọdụ na ịla n’iyi nke alaka ahụ na-anọgideghị n’osisivine, Jọn 15:6; I Jọn 2:6; 2 Pita 2:20

3. Ana-aza ekpere ma nye kwa Nna otuto mgbe anyị na-anọgide n’osisivine ahụ, Jọn 15:7, 8; Abù Ọma 91:1, 15; I Jọn 3:22

III Njikọ nke Ịhụn’anya nke Dị n’etiti Kraist na ndị náesoụzọ Ya

1. Idebe iwu niile nke Chineke na-egosi ịhụn’anya Chineke nke dị nime obi anyị, Jọn 15:9, 10; I Jọn 3:24

2. Ihe kachasị n’ihe Kraist nyere n’iwu bụ ka anyị hụ Ya n’anya ma hụrịta kwa onwe anyị n’anya, Jọn 15:11-14

3. Kraist rọpụtara ndị náesoụzọ Ya, ọ bụghị ndị náesoụzọ Ya rọpụtara Ya, Jọn 15:15-17; 8:31

IV Ndị náesoụzọ Ya, na Ịkpọasị nke Ụwa kpọrọ Ha

1. Ụwa burịị ụzọ kpọọ Jisọs asị tutu ha akpọọ ndị náesoụzọ Ya asị, Jọn 15:18, 19; I Jọn 3:1

2. Jisọs chetaara anyị na “orù adighi-aka onye-nwe-ya uku,” Jọn 15:20, 21; 13:16

3. Ndị niile ná-esogbu Jisọs bụ ndị amaworo ikpé, ná-enweghị ihe ngọpụ, Jọn 15:22-27; Ilu 29:1

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ihe nkọwa a nke osisivine ahụ na alaka-ya dị icheiche na-egosipụta n’ụzọ maramma ịdịn’otù nke imemmụọ nke dị n’etiti Kraist na ndị Ya. Ọ na-egosipụta mmekọrịta Ya na ha dịka isiiyi nke ndụ nke imemmụọ na ịdị mma ha niile.

Ezi Osisivine na Vineọhịa

Mgbe Jisọs sịrị, “Mu onwem bu ezi osisi vine,” Ọ na-egosi n’ezie na enwe-kwara ọtụtụ vineọhịa. Osisi vineọhịa nwere ike inwe ọtụtụ akwụkwọ ndụ, ndị nwere ike ịmamma n’ile ha anya. Ma mkpụrụ niile nke ịdịnsọ na eziomume adịghị n’osisi vineọhịa ahụ. Náánị Ezi Osisivine ga-enwe ihe ndịa nke kwesịrị ná ndụ nke imemmụọ ma mee kwa ka alaka ya niile mịa ezi mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ nke bụ ịhụn’anya, ọñụ, udo, ogologontachịobi, obiọma, ịdịmma, ikwesi ntụkwasịobi, ịdịnwayọ na imeruihen’ókè.

Ọtụtụ okpukpé n’ụbọchị ndịa nwere ọtụtụ ememe na ịchụàjà dị icheiche, nke pụtara ìhè, ma ha enweghị nnyakudo n’Ezi Osisivine ahụ nke ga-enye ha mmiri nke ndụ nke Mmuọ Nsọ. “N’ihi na ọ bu n’osisi vine nke Sọdọm ka osisi vine ha sitere, site kwa n’ubi Gọmọra: nkpuru-vine-ha bu nkpuru vine nsi, uyọkọ di ilu ka ha nwere: Edide agwọ di ogologo ka mmanya-vine bu, na nsi di ire nke aju-ala” (Deuteronomi 32:32, 33). Lee ihe dị iche n’ebe mkpụrụ ahụ dị! Mmadu, hà na-ekpokọpụta mkpụrụvine n’ogwu, maọbụ fig n’uke? É-è. Náánị otù Osisivine dị onye pụrụ imi ezi mkpụrụ, ọ dịghị kwa mkpụrụ maọbụ alaka nke nọgidere n’Osisivine ahụ nke pụrụ ịbụ nke ọjọọ.

Ọnọdụ nke Alaka dị icheiche

Ụfọdụ alaka nwere ike ịmị mkpụrụ ma ndị ọzọ apụghị ịmị mkpụrụ maọlị. Nke a sitere n’otú alaka ahụ siri nwee nnyakudo n’arụ vine ahụ. Ụfọdụ alaka mgbe anyakudoro ha n’osisivine, nwere ike igosi iheama nke ndụ ná mmalite ma emesịa ha akpọnwụọ wee nwụọ, ná-amịghị mkpụrụ maọlị. Otú a ndị náesoụzọ Kraist gana-amị mkpụrụ nke imemmụọ n’ihi na ha nọgidesiri ike n’Osisivine ahụ wee ná-enweta kwa ike ha site n’ebe Chineke ha nọ. Ma ọ bụrụ na esighị otú a mee ka ha nọgidesie ike n’Osisivine ahụ, ha agaghị amịrị Chineke mkpụrụ maọlị, ná-agbanyeghị otú ha siri maamma n’ileanya. Nnyakudo nke ha esighị ike. Ha adịghị e nweta ndụ maọbụ ike site na Chineke.

Alaka ahụ nke na-amị mkpụrụ na adaberesiike mgbe niile n’osisivine ahụ. Ndụ ahụ nke o nwere bụ ndụ nke ná-esite n’osisivine ahụ sụpụta rue akụkụ niile nke alaka ahụ. Alaka na akwụkwọ ndụ ọ bụla, ka ana-azụ ma mee kwa ka o nwee ndụ. Ihe omimi ahụ nke ana-akpọ ndụ ka ezoro nime osisivine ahụ, anyị hụrụ ma mata kwa n’onwe-anyị na ọ bụrụ na alaka ahụ anọgidesighị ike n’osisivine ahụ, ọ pụghị ịmị mkpụrụ ọ bụla. Ọmụmụ ọhụụ ahụ nke Jisọs kọwaara Nikodemọs jikọtara anyị na Chineke -- alaka ahụ n’Osisivine ahụ -- na-enye anyị isi iyi nke ndụ. Anyị bụrịị ndị nwụworoanwụ nime njehie na mmehie dị icheiche ma emere ka anyị dị ndụ site n’ịnyakudo anyị n’Ezi Osisivine ahụ wee mee ka anyị bụrụ ndị mnwekọ nke Ụdị Chineke. Anyị na-adị ndụ n’ihi na anyakudowo anyị n’Isiiyi nke Ndụ, ọ bụ kwa n’isiiyi nke ná-adịghị atalata atalata ka anyị si adọta ihe oriri na ike nke anyị.

Ọ dị mmekọrịta dị n’etiti osisivine na alaka-ya nke ọlụ aka nke mmadụ maọbụ amamihe ya na apụghị ịlụpụta. Nime ọtụtụ nzukọ nke ndị ná-efé òfùfè, ha nwere ike idebe ụkpụrụ nwee kwa ndị okenye, ndị náejéozi, na òtù ọzọ dị icheiche, wee site n’aka ndịa tụpụta iwu na usoro nke ná-achị ha; ma ọ dịghị otù nime ihe ndịa pụrụ ịnyakudo ha n’ezi Osisivine ahụ. Ma lee otú àtụmààtụ Chineke si dị ebube, n’ihi na anyị hụrụ na ọ bụ náánị nchègharị, mwuta dịka Chineke si chọọ banyere mmehie, na okwukwe nime Jisọs Kraist ga-eme ka mkpụrụobi ọ bụla nyakudo n’Ezi Osisivine ahụ.

Mkwachasị nke Alaka Osisivine ahụ

Jisọs bụ Ezi Osisivine ahụ ma Nna Ya bụ Onyeọlụubi maọbụ Onyenlekọta. “Alaka ọ bula nimem nke nādigh-ami nkpuru O wepu ya: alaka ọ bula nke nāmi nkpuru, Ọ nēme kwa ya ka ọ di ọcha, ka o wee mia nkpuru kari” Ezi onyeọlụubi ọ bụla na-eji ubivine-ya anya isi, ọ na-achọ kwa ka ọ mịa mkpụrụ kachasị mma. Ọ na-achọ ka ọ dị mma n’ileanya, ná-aba ụba, nwee kwa arụ ike. Otù aka ahụ ka Onyenwe anyị ji e nwe mmasị n’ebe ndị Ya nọ -- ubivine Ya. Ọ bụghị náánị na ọ naachọ ka ọ mịa mkpụrụ, kama ọ naachọ ka ọ mịa mkpụrụ kachasị mma rii nne. Ọ na-achọ ka ọ bụrụ ihe ga-ewetara Ya otuto na nsọpụrụ.

Ọ bụ ọlụ dịrị onyeọlụubi ịkwachasị ubivine ya. Site n’ime nke a ọ na-egbupụ ihe ọ bụla nke ga-egbochị alaka ahụ ịmị ezi mkpụrụ. Mgbe anyị na-ele onyeọlụubi anya ka ọ na-akwachasị osisivine, ọ na-adị ka o nweghị obiebere, ma ọ matara nnọọ ebe na ihe kwesịrị ka o gbupụ ka alaka ahụ wee mịa ọtụtụ mkpụrụ. Onyenwe anyị na-ele anya nime obi anyị ná-amata kwa otú na mgbe ọ ga-ekwe ka ọnwụnwa, ule, na mkpagbu ahụ bịa bụ nke ga-ewepụ ihe ahụ ná-ekwesịghị ná ndụ anyị, maọbụ nke ga-egbochị anyị ka O wee mee ka anyị bụrụ alaka na-amị mkpụrụ rii nne.

Jisọs sịrị, “Unu apugh ime ihe ọ bula ma Mu anọgh ya.” Nke a na-egosi na ọ bụrụ na mmadụ anọgideghị nime Kraist ọlụọma ya niile, ịhụn’anya ya, na òfùfè ya niile ga-abụ náánị ihe efu. Ihe ndịa niile dị ka ihe ana-achọghị nke ná-eripịa ihe na nke ná-egbochi kwa alaka ịmị mkpụrụ. Anyị agaghị échèfu na Onyenwe anyị na-ele anya n’obi ọ bụghị dịka anya na-ahụ. Ọ maara ihe ahụ dị anyị óké mkpà; ma ọ bụrụ na anyị ga-enwe afọ ojuju ịnọgide n’aka Ya na okpuru òdúdú Ya, Ọ ga-eme ka anyị zue òkè dịka amamihe Ya ná-enweghị ọgwụgwụ ga-atụpụta ihe kasị mma ná ndụ anyị nke ga-enyere anyị aka ịbụ ndị ga-alụsi ọlụ Ya ike. Anyị aghaghị ịdabere na Ya mgbe niile. Ọ dịghị ihe ọ bụla anyị bụ n’onwe-anyị. Nime Ya, náánị nime Ya ka anyị pụrụ ịmị mkpụrụ. Ọ bụrụ na anyị anọgide nime ịhụn’anya Ya debe kwa ihe niile O nyere n’iwu, ihe n’aghaghị iso ya bụ na anyị ga-amị mkpụrụ. Dịka anyị na-amị mkpụrụ karị otú a ka ọñụ anyị ga-adị kwa ukwuu karịa n’ụbọchị ahụ Ọ ga-abịa ịkpọrọ ndị nke Ya.

Ntụpụ n’Èzí

Anyị na-agụ: “Ọ buru na onye ọ bula anọgidegh nimem, atupu ya n’ezi dika alaka, ọ kpọnwu kwa.” Onyenwe anyị, site n’ụzọ doro anya karịsịa, na-akụziri anyị n’ebe a na mmadụ pụrụ ịnọgide n’arụ Ya dịka alaka si anọgide n’arụ osisi ahụ nke wepụtara ya, ma emesịa egbupụ ya tụba kwa ya n’ọkụ. Anyị hụrụ na akụziri n’ebe a na ihe kpatara nke a bụ nkewapụ maọbụ ntụfu nke mmekọrịta ahụ dị mkpà; ihe nke a ga-eweta bụ na ọ dịghị mkpụrụ ọ bụla ọ mịrị kwesịrị otuto Chineke. Ọ dịghị onye pụrụ igbupụ alaka ọ bụla nke ná-anọghị mgbe ọ bụla n’osisi. Ma anyị pụrụ ịhụ n’ebe a na ọ bụ ihe dị mfé mmadụ ịnọgide n’Osisivine ahụ na mbụ emesịa kewapụ ya tụba kwa ya n’ọkụ wee rechapụ ya -- kewapụ ya site n’ebe ndị nke Chineke nọ, n’ebe Chineke n’Onwe-Ya nọ, na site n’ebe ebube niile nke Eluigwe dị.

Ọ dị mfé ịbụ Nwa Chineke na onye biworo-rị ndụ nke ịsọpụrụ Chineke, onye nwekwara ndụ ebighịebi nime ya nke ana-enye ndị niile azọpụtara n’ezie, ma emesịa o tụfue nzọpụta ahụ. O kwesịghị ka mmadụ tụfue ya. Mmadụ ekwesịghị ịnọgide n’ọnọdụ ahụ nke ná-enweghị olileanya ma ọ bụrụ na ọ tụfuwo ya. Akwụkwọnsọ nwere ọtụtụ ihe ịmaatụ banyere otú esi nábata kwa ndị tụfuru nzọpụta-ha n’èzínaụlọ nke Chineke, mgbe ha kpere ekpere nke nchègharị ahụ nke mere ka ha nata nzọpụta na mbụ.

Ọ bụ ezie na nwa Chineke adịghị eme mmehie. Ọ bụ kwa dịka Baịbụl kwuru na mgbe ọ bụla onye ahụ mehiere ọ bụghị kwa nwa Chineke ọzọ kama ọ bụ nwa ekwensu. Onye ọ bụla ana-akpọ Kristien nke ná-eme mmehie abụghị onye Kraist maọlị, n’ihi na o nwere ụdị nke setan kama ịbụ otù onye nime èzínaụlọ nke Chineke.

Chineke ga-edebe anyị ma ọ bụrụ na anyị ana-abịa Ya nso. Ọ gaghị ekwe ka ihe ọ bụla kewapụ anyị site n’ịhụn’anya Ya, nchèbe Ya, olileanya ebighịebi Ya, na mmezu nke mkwà Ya niile kwa-ụbọchị, ma ọ bụrụ na anyị “nānọgide n’osisi vine ahụ.” Ma ọ bụrụ na anyị akpachara anya mee mmehie, mgbe anyị natasịworo-rịị n’onwe-anyị eziokwu ahụ na mgbe anyị nweworo onyinyeamara nzọpụta nke Chineke nke alụpụtara nime obi anyị, àjà ahụ nke dịworo-rị n’obi anyị agaghị adị kwa ọzọ, anyị ewe bụrụ ndị ekewapụrụ n’èzínaụlọ nke Chineke ọzọ.

Mmekọrịta na Ịdịn’otù nime Vine ahụ

Jisọs kpọrọ ndị náesoụzọ Ya ndị enyi Ya. Ha abụghị kwa ndị orù Ya ọzọ. Ọ sịrị na orù adịghị amata àtụmààtụ na nzube niile nke onyenwe ya. Ọ na-eme ihe onyenwe ya nyere ya n’iwu ime. N’akụkụ nke ọzọ, enyi bụ onye enyi ya na-adabere n’obi ya na onye mmadụ ga-atụkwasịobi ya wee kọọrọ ya ihenzuzo niile nke obi ya.

Akụkọ banyere ịbụenyi nke Devid na Jonatan bụ ihe ịtụn’anya nye anyị. Ịhụn’anya ahụ nke Jonatan nweworo n’ebe Devid nọ mere ka o yipụ uwe nwụda-ya wee yikwasị ya Devid. Mgbe ọ ga-echèworị n’ọbụ ihe ziriezi n’iwu na ọ bụ ya onwe-ya ga-eyi ha. Ọ dị kwa otù ịhụn’anya dị n’etiti ezi ụmụ Chineke nke ná-ejikọta ha ọnụ dịka otù ndị nime Kraist. Ịhụn’anya nke ndị Kraist a bụ ihe ana-apụghị ịkọwa. Ma Jisọs nwere ịhụn’anya karịrị nke a ukwuu n’ihi na Ya onwe-Ya tọgbọrọ ndụ Ya n’ihi ndị iro-Ya.

Ndị Arọpụtaworo

Ọ bụ omen’ala nke ndị Ju na mmadụ ga-arọpụtara onwe-ya onyeòzízí mgbe ọ na-achọ ịmalite ihe ọ ga-alụ ná ndụ ya. Otú a ka ọ dị kwa n’etiti ọtụtụ nime anyị onwe anyị. Ma Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya na ọ bụghị ha onwe ha rọpụtara Ya mgbe ha zara ịkpọòkù Ya wee malite kwa iso Ya. Kama Ya onwe-Ya rọpụtara ha wepụtakwa ha ichè, ka ha wee jee mịa mkpụrụ. Ha ga-abụ kwa ndị àmà-Ya. Otú a ka ọ dị kwa nye anyị onwe-anyị.

Jisọs kwukwara tinyere nke a na ọ bụrụ na ụwa kpọrọ ha asị na o kwesịghị ka o wuta ha; n’ihi na ụwa buru ụzọ kpọọ Ya onwe-Ya asị. Ọ sịrị na ọ bụrụ na esogburu ha, ha cheta kwa na eburu ụzọ sogbue Ya onwe-Ya. Ọ matara na ọ ga-abụrụ ha ihe nkasịobi ịmata, na mgbe nsogbu malitere, na ha nọ n’ezi ụzọ n’ihi na ha nọ n’ụzọ ahụ nke Jisọs gaworo. Site ná mkpagbu dị icheiche, ha ga-amata na ha na-anọgide n’Ezi Osisivine ahụ.

Hụrịta Ibe unu n’Anya

“Nka bu ihe M’nyere n’iwu, ka unu hurita ibe-unu n’anya dika M’huru unu n’anya.” Dịka anyị matara nke a bụ iwu ikpeazụ nke Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya tutu mkpọgide n’obe Ya. O nyere iwu a tutu Ọ gaa n’ogige Getsemane ikpe ekpere. O sitere n’Ogige Getsemane ahụ baa n’obí ikpé.

Ihe nke a mere n’ikpeazụ na okwu ndịa ná-adịghị anwụanwụ nke ekwuworo aghaghị ịbụworị ihe nwere óké mmetụta nke ana-apụghị ihichapụ n’obi Jọn, onye ahụrụn’anya. Isiokwu a bụ ịhụrịta onweunu n’anya bụ isiokwu dị ukwuu nime akwụkwọozi niile nke Jọn dere. Ọtụtụ ebe ka o kwuru na ha aghaghị ịhụrịta onwe ha n’anya. Otù nime ndịnsọ nke mgbe ochie edewo sị: “Edere iwu a n’ụzọ dị omimi n’obi onyeozi a (Jọn onyeahụrụ n’anya) nke mere na mgbe o meworo agadi, mgbe ndịnsọ na-eburu ya bịa n’ọgbakọ nke ndị kwereekwe, ihe ọ na-ekwu mgbe niile bụ “Umu-ntakirim huritanu ibe unu n’anya.” Mgbe ike gwụrụ ndịnáesoụzọ ya n’ihi okwu mkwukwasị a, ha wee jụọ ya n’ikpeazụ ihe mere o ji ná-ekwu otù okwu ahu mgbe niile. Ọ sịrị, “N’ihi na ọ bụ ihe Onyenwe anyị nyere n’iwu, na náánị idebe ya ezuwo.”

Ịhụn’anya ahụ amaliteghị n’alaka ahụ kama o sitere n’Osisivine ahụ. Alaka ahụ aghaghị ịnọgidesi ike n’Osisivine ahụ ka mkpụrụ nke ịhụn’anya nke Chineke sụpụta nime izuòkè ya. “Madu nile gēji nka mara na unu bu ndi nēso uzọm, ọ buru na unu enwerita ihu-n’anya n’ebe ibe-unu nọ” (Jọn 13:35).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. 1. Ònye ka Osisivine, alaka ahụ, na Onyeọlụubi nọchirị anya ha?

  2. 2. Òlee ụzọ anyị ga-esi mịa mkpụrụ?

  3. 3. Òlee ụzọ esi anụcha anyị ka anyị wee mịa mkpụrụ karị?

  4. 4. Ọ bụ gịnị na-eme mgbe alaka ná-adịghị amị mkpụrụ?

  5. 5. Ọ bụ ihe dị mfé mmadụ ịla n’iyi mgbe azọpụtasịrị ya?

  6. 6. Kwue ọnọdụ abụọ nke Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya.

  7. 7. Gịnị bụ iwu kachasị nke Kraist nyere?