Jọn 16:1-33

Lesson 237 - Senior

Memory Verse
“N’ezie, n’ezie, asim unu, onye nēkwere na Mu, ọlu Mu onwem nālu ka onye ahu gālu kwa; ọlu ka ndia uku ka ọ gālu kwa n’ihi na Mu onwem nāgakuru Nnam” (Jọn 14:12).
Cross References

I Okwu nke Ịdọakanántị

1. Jisọs dọrọ ndị náesoụzọYa akanántị ka ha ghara ịma n’ọnyà n’arụ-Ya n’ihi ọtụtụ nsogbu nke ga-abịa, Jọn 16:1; 16:11; Matiu 11:6; 26:31; Mak 14:27; Zekaraia 13:7

2. Jisọs kwuru okwu banyere mkpagbu ha rue ọnwụ n’ọdịn’iru, Jọn 16:2; Matiu 10:17, 18; 24:9, 10; I Ndi-Kọrint 4:11-13; Nkpughe 2:10

3. Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya na aga-akpagbu ha n’ihi ajọ mmadụ ndị ná-amaghị Chineke, Jọn 16:3; 15:21; 2 Timọti 4:14, 15

II Mkwà ekwere banyere Onyenkasịobi ahụ

1. Jisọs kwere mkwà na ọ ga-ezite Onyenkasịobi n’ọnọdụ Ya onwe-ya site n’ebe Nna Ya nọ mgbe Ọ lasịrị, Jọn 16:7; 14:16, 17, 26; 15:26; Luk 24:49

2. Onyenkasịobi ahụ ga-abụ Onyendú, Onyenkasị na Onyendụmọdụ nke Nzukọ nke Chineke, Ọ ga-eme kwa ka àtụmààtụ nke nzọpụta nke Chineke n’ụwa gaa n’iru, Jọn 16:8-15

3. Onyenkasịobi ahụ ga-ewere n’ihe nke Chineke gosi ndị kwereekwe, Jọn 16:12-15; Ndi-Efesọs 1:13, 14, 17, 18; Nehemaia 9:20; I Ndi Kọrint 2:13; I Jọn 2:27; Nkpughe 1:10; Luk 12:12

III Mwute n’ihi Nlaghachị

1. Ndị náesoụzọ Ya nọ n’ihe mgbagwojuanya n’ihi okwu ụla nke Jisọs gwara ha, Jọn 16:4-6, 16-19; 3:8; Eklisiastis 11:5

2. Jisọs kwere ndị náesoụzọ Ya mkwà na mwute ha ga-aghọ ọñụ, Jọn 16:20-23; Luk 24:17-35; Abù Ọma 45:14, 15; Aisaia 61:3

3. Ekwere mkwà nkasịobi nke Chineke maka ọtụtụ ụbọchị nsogbu dị n’iru, Jọn 16:24-33; 2 Ndi Kọrint 1:3-6.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ndụmọdụ Ikpeazụ

Ka ndụ nke Jisọs na-abịaru ná mgwụsị, nke bụ ọnwụ na mbiliten’ọnwụ-Ya, o wee dị mkpà na Ọ ga-eme ka ndị náesoụzọ Ya ghọta óké ihe ahụ gaje ime. Ọ gwawo ha na mbụ na Ya aghaghị ịnwụọnwụ, ma ha aghọtaghị omimi nke okwu ahụ. Ha wee nọọ ná mwute n’ihi okwu ahụ nke Jisọs na-ekwusi ike na Ya aghaghị ịnwụ, n’ihi nke a Jisọs wee chọọ iwezuga mwute na mgbagwojuanya ha. Ọ bụ Onye ná-eme ka ha nwee ezi nghọta banyere òzízí niile nke Alaeze Chineke; Ọ bụ Onye nwe ha na Eze ha; n’ebe ha nọ, ọ bụrụ na Ọ nọghị ọ dịghị olileanya ọ bụla maọbụ ihe ga-akpali mmụọ dịrị ha. Jisọs maara ụzọ kwesịrị iji nyere ha aka, ya mere Ọ gwara ha ihe ahụ nke ná-aghaghị ime n’oge ná-adịghị anya.

Ọ gwara ha eziokwu banyere ihe ahụ nke ná-aghaghị ime na ihe nke ha ná-aghaghị ịnagide n’ọdịn’iru. “Ibu ụzọ nata ịdọ aka-ná-ntị bụ ibu ụzọ jikere,” ma njikere dị otú a bụ ihe Jisọs chọrọ imezu n’ebe ndị náesoụzọ Ya nọ. Jisọs gara n’iru ịkọwara ha ihe ha ga-atụ anya ya, wee sị, “Okwu ndia ka M’gwaworo unu, ka mgbe ọ bula oge hour ha gābia ka unu we cheta ha na Mu onwem gwara unu.” (Gụọ Jọn 16:4; 15:18-27).

Mgbe onye ná-anya ụgbọmmiri n’óké osimiri matara na ebilimmiri na-abịa site n’ịdọakanántị nke barometer (enyo eji-ahụ iru Eluigwe) ọ na-ejikere ụgbọmmiri ya maka ebilimmiri ahụ nke gaje ịbịa. Ibu ụzọ mata banyere ebilimmiri ahụ nke gaje ịbịa ga enyere ya aka iji jikere maka ya, asị na o bughị-rị ụzọ mata, anọghị na njikere ya ga-emeworị ka ọ tụfue ụgbọ ya na ndụ ya. Otú a ka ọ dị n’ebe nwa Chineke nọ. Ka okwu Chineke na-adọ akanántị maka iwe Chineke nke gaje ịbịakwasị ụwa n’oge ná-adịghị anya, ọ na-ejikere onwe ya maka ihe ahụ nke gaje ịbịa.

Ibu ụzọ mara ma nwee kwa nghọta nke eziokwu ahụ banyere ihe ahụ nke gaje ịbịakwasi ụwa, dịka ekpughewooro ya site n’Okwu Chineke, adịghị atụ onyeKraist egwù. N’ụzọ ọzọ, emewo ka okwukwe ya n’ebe Chineke nọ dị ukwuu karịa n’ihi na Chineke ekpugheworo ya eziokwu ahụ, o wee bụrụ onye agbara ume tụkwasịkwara ike site na Ya. Ndụ nwere ike sie ike karị ọbụná nye Onye nke Kraist; ma otú ọ dị ọ matara na Okwu Chineke bụ eziokwu na ọ bụrụ na ọ nọgide n’ikwesị ntụkwasịobi Chineke ga-akpọbata ya n’ebe nzobe. (Gụọ Abù Ọma 107:23-30).

Mkwà nke Nna Ahụ

Jisọs matara na ọ bụghị náánị na ihe edere n’akwụkwọ nke eziokwu ahụ ga-eme ka ndị nke Ya nwee agbamume nke ga-ezu maka onwụnwa ndị dị n’iru; n’ihi nke a Ọ gwara ha okwu maka “Onye-nkasi-obi” ahụ onye gaje ịbịa ịkasị ndị nke Chineke obi (Gụọ Jọn 16:7; 2 Ndi Kọrint 3:16). Onyenkasịobi ahụ bụ onye nke atọ nime Ụdị Chineke -- Mmụọ Nsọ. Ọ ga-abụ isi agbamume na nkasịobi ha mgbe Jisọs ná-anọghị kwa. Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya na ọ bụ ihe baara ha urù ka Ọ laa, n’ihi na ọ bụrụ ma Ọ laghị, Onyenkasịobi ahụ agaghị abịakute ha. Ya mere, ka ndị náesoụzọ Ya nọ ná mwute n’ihi na ha agaghị ahụkwa Jisọs ọzọ, maọbụ Ya na ha inwe mmekọrịta ọzọ, ha nwere nkasịobi site n’ịghọta na agaghị arapụ náánị ha. Mkwà nke Onyenkasịobi ahụ ya na ibu ụzọ mata ihe ga-eme ná ndụ ha, bụ ihe inye ha ike na agbamume inyere ha aka iguzogide mkpagbu niile ma n’ikpeazụ wee keta ndụ ebighịebi. Ihe ha maara Jisọs gwaworo ha-rị banyere ihe ndịa ghọọrọ ha mgbidi siri ike nke obi ịlọmmiri ná-apụghị ịkwada.

Onyeòzízí nke sitere na Chineke

Okwu Chineke na-eme ka anyị ghọta na ọlụ nke Mmụọ Nsọ bụ ntụzi aka, iduzi, na ikuziri Nzukọ Kraist ihe site n’ọnụ ndị ndú Chineke e téré mmanụ. Ọ dịghị nzukọ nke ụwa, ọgbakọ, òtù, maọbụ mmadụ ọ bụla nke lụpụtaworo otù nime ọlụ ndịa nke Mmụọ Nsọ na-alụ -- maọbụ nke pụrụ ịlụ ya. Nke a bụ nnọọ ọlụ na ohere nke dịrị Mmụọ Nsọ náánị, ọ dịrịghị kwa onye ọzọ. Mmụọ Nsọ bụ Onyeòzízí ná-adịghị adahieadahie na Onyemkpughe nke óké àtụmààtụ nzọpụta nke Chineke nye ndịozi Ya na ndịnsọ Ya.

Jọn onye ahụrụn’anya kwuru okwu banyere Onye a nke ga-ezi ụmụ Chineke ihe: “Unu onwe-unu kwa, otite-manu ahu nke unu natara n’aka-Ya nādigide nime unu, ọ digh kwa unu nkpà ka onye ọ bula zi unu ihe; kama dika otite-manu-Ya nēzi unu ihe banyere ihe nile, dika ọ bu kwa ezie, nābugh kwa okwu-ugha, dika O zi-kwa-ra unu, nānọgidenu nime Ya” (Gụọ I Jọn 2:27; Aisaia 8:20; Nehemaia 9:20; I Ndi Kọrint 2:13).

Anyị ga-echèta na ụzọ kachasị mfé dị kwa mkpà nke Mmụọ Nsọ si ezi ndị nke Chineke ihe bụ site n’ihe edeworo na Baịbụl. Chineke emewo ka okwu-Ya dị ukwuu n’elu aha-Ya, anyị na-agụ kwa ihe banyere nke a, “N’ihi na I mewo ka okwu ọnụ-Gi di uku n’elu aha-Gi nile” (Abù Ọma 138:2). Mmụọ nke Chineke adịghị emegide Okwu nke Chineke, Akwụkwọnsọ emewo kwa ka nke a pụta ìhè. “Ayi diri iwu di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adigh-ekwu dika okwu a si di n’ezie ọ digh chi-ọbubọ diri ha” (Aisaia 8:20). Ọzọ kwa, Mmụọ Nsọ na Okwu ahụ aghaghị inwe nkwekọrịta: “Ọ bu kwa Mọ Nsọ bu Onye nāgba àmà, n’ihi na Mọ ahụ bu ezi-okwu.” “N’ihi na ha di atọ nāgba àmà n’elu-igwe Nna ahu, Okwu ahu na Mọ Nsọ ahu: ha atọ bu otù” (I Jọn 5:7).

Onyenkasịobi ahụ bụ Onye ahụ nke ná-ekpughe Okwu nke Chineke nye onye ọ bụla nke ga-ege ntị, ka O wee gbaa ya ume n’okwukwe ya na Chineke ka o wee kwere rue nzọpụta. Jisọs mere ka okwukwe ndị náesoụzọ Ya dị ukwuu site n’okwu ndụmọdụ Ya, ịgbàume na iheiribáàmà dị icheiche; onye kwereekwe nwere Mmụọ Nsọ nke ná -alụ kwa otù ọlụ ahụ nye ya taa.

Ná enweghịobi abụo, ọtụtụ ndị Kraist na-enwe échìchè mgbe ụfọdụ na ọ gara amasị ha ma ọ bụrụ na ha nọ oge ahụ Jisọs nọ n’elu ụwa ma soro wee hụ óké ọlụ niile ahụ Ọ lụrụ. Ha chere banyere óké agbamume nke ha ga-enweworị site ná mmerịkọta nke ha na Jisọs n’ụzọ dị otú a. Ka ụdị agbamume dị otú a ghara ịkọ n’ụbọchị ndị ná-esochita nrịgo n’Eluigwe nke Kraist, Chineke zitere Onyenkasịobi ahụ ibinyere ụmụmmadụ. Mmụọ Nsọ ahụ abụwo onye ịgbàume nye anyị bụ ndị Kraist nke oge a, dịka Jisọs bụ kwa ihe agbamume nye ndị nke nọrọ n’oge nke Ya. Jisọs kwuru banyere Onyenkasịobi ahụ sị: “O gēwere n’ihe nkem, kọkwa-ra unu ya. Ka ha ra bu ihe nile Nnam nēnwe, bu nkem: n’ihi nka ka M’siri, na Ọ nēwere n’ihe nkem gākọ-kwa-ra unu ya” (Jọn 16:14, 15).Tọmas ekwenyeghị àmà ndị náesoụzọ Jisọs ndị ọzọ gbara sị na Jisọs esiwo n’ílì bilie. Náánị mgbe Tọmas zutere Jisọs iru n’iru ka o kweere na Jisọs dị ndụ n’ezie. Jisọs sịrị ya, “Ngọzi nādiri ndi akāhugh, ma ha kwere” (Jọn 20:29). Mgbe anyị ákà-ahụghị Jisọs anya n’anụarụ, ma anyị anụwo olu nke Mmụọ Nsọ nke Chineke wee kwere kwa ihe ahụ nke Mmụọ Nsọ kpugheere anyị banyere Kraist.

Eziokwu nke ihe Nketa Anyị

Aga-aghọta na mmazu nke mgbaghara mmehie niile -- ọnọdụ nke ịgụ mmadụ n’onyeeziomume n’iru Chineke; ọbụná ngọzi nke odudonsọ zuruòkè -- nke bụ ọlụ amara nke abụọ n’obi onye nke kwereekwe; adịghị eweta mbinyere nke Onyenkasịobi ahụ Onye Jisọs kwere anyị ná mkwà. Mmụọ nke Chineke bụ onye ná-agbara onye kwereekwe àmà na azọpụtawo ya, na akpọbatawo kwa ya n’èzínaụlọ nke okwukwe. (Gụọ Ndi Rom 8:14-16; 2 Ndi Kọrint 1:22; I Jọn 5:6-10). Mmụọ nke Chineke na-agbakwa àmà otù aka ahụ mgbe edoro anyị nsọ, mgbe ahụ ka anyị na-enwe ike na nnọnyere nke Mmụọ Chineke karịa, ọ na-anọnyekwara anyị. (Gụọ I Ndi Kọrint 2:12, 13; 2 Ndi Tesalọnaika 2:13; I Pita 1:12). Ma ọ bụ n’oge anyị natara ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ dịka usoro nke Baịbụl si dị ka Onyenkasịobi ahụ na-abịa biri n’ụlọ nsọ nke arụ na mkpụrụobi nke mmadụ. Nke a pụtara ìhè nkeọma site n’iwu ahụ nke Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya mgbe mbiliten’ọnwụ Ya gasịrị: “Le kwa, Mu onwem nēziputa nkwa nke Nnam n’isi-unu na nọdunu n’obodo a, rue mgbe agēwere ike nke si n’elu yikwasi unu” (Luk 24:39). Ndị náesoụzọ Ya rubereisi n’iwu a; ma mgbe ha na-anọgidesiike n’ekpere n’ụbọchị Pentikọst, ha natara Onyenkasịobi ahụ (Gụọ Ọlu Ndi-ozi 2:1-21).

Nnata nke Mmụọ Nsọ ahụ nke mmadụ otù narị na iri abụọ ahụ (120) natara n’ụlọ elu ahụ bụ dịka amụma nke Joel si dị (Gụọ Joel 2:28, 29). Jisọs sịrị na Ọ ga-abịakute ka ha ra bụ ndị chọrọ Ya, Pita mere ka nke a guzosie ike site n’okwu Chineke ahụ o kwuru n’ụbọchị Pentikọst sị: “Chègharianu, ka eme kwa unu nile baptizim n’otù n’otù n’aha Jisus Kraist ka ewe gbaghara mmehie nile unu; unu gānata kwa onyinye a bú Mọ Nsọ. N’ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra bú ndi Onye-nwe-ayi Chineke-ayi gākpọtara Onwe ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:38, 39)).

Ọ bụ nnata nke Mmụọ Nsọ a ka Pọl na-atụ aka mgbe o dere sị “Ọ bu kwa nime Ya, mgbe unu kwe-kwa-ra na Ya, ka eji Mọ Nsọ nke nkwa ahu ka unu akàrà, bú Mọ Nsọ, Onye bu ihe ayi ji mara na ayi gēketazu ihe-nketa ayi, rue ngbaputa nke ihe Chineke nwetara, ka ewe to ebube-Ya” (Ndi Efesọs 1:13, 14).

Mkwà nke Nlọghachị

Jisọs arapụghị ndị náesoụzọ Ya ná-enweghị olileanya nke ịhụ Ya anya ọzọ mgbe Ọ nwụsịrị. O ji okwu a kasie ha obi: “Ya mere unu onwe-unu nēnwe kwa ihe nwuta ugbu a: ma M’gāhu unu ọzọ, obi-unu gāñuri kwa ọñù, ọ digh kwa onye ọ bula gānara unu ọñu-unu” (Jọn 16:22). Okwu a ka apụrụ ịkpọ ụzọ amụmá abụọ maọbụ nkwà abụọ. Ọ bụghị náánị na ndị náesoụzọ Ya ga-ahụ Jisọs ọzọ mgbe O bilitesịrị n’ọnwụ, kama ha ga-ahụ Ya anya ọzọ mgbe Ọ ga-apụta ìhè n’óké ụbọchị nke mbiliten’ọnwụ ahụ.

N’eziokwu ha ga-enwe ihe mwuta n’oge ná-adịghị anya, n’ihi na Jisọs na-aga ịhụ ahụhụ nke ọnwụ n’elu obe. Ihe ahụ, nke merenụ, nke gbagwojuru ha anya, tinyere obi-ha n’óké ihe mwuta dịka Ọ dọworo ha akanántị: e kwere ha mkwà na ọñụ ha ga-alaghachikute ha, na ọ dịghị kwa onye ọ bụla ga-anapụ ha ọñụ ahụ. Emezuru mkwà ahụ; n’ihi na mgbe ha hụrụ n’ezie na O siwo n’ọnwụ bilie, ha nwere ọñụ dị ukwuu n’ihi mmeri ahụ nke o meriworo ọnwụ. Ọñụ ahụ abụrụwo kwa olileanya na ihe agbamume nke Oziọma.

Ọ dịghị mmadụ ọ bụla nke pụrụ ịnapụ nwa Chineke ọñụ ahụ, n’ihi na ọ matara na Onyenwe ya na-adị ndụ. Ọ ga-abịa ọzọ n’ihi ndị nke Ya dị ndụ ugbu a na n’ihi ndị eziomume nwụrụanwụ. Nime ọtụtụ okpukpé juru n’ụwa taa, náánị Oziọma nke Jisọs Kraist bụ nke guzoro iche ná-enweghị ịma aka n’iru n’ihi eziokwu nke mbiliten’ọnwụ nke Onye tọrọ ntọala ya. Chineke esitewo n’aka Mmụọ Nsọ gosi eziokwu ahụ nke dị n’okwu Chineke na nke ndụ na mbiliten’ọnwụ nke Jisọs Kraist nye ndi ga-ekwere. Nke a bụ ọñụ ahụ ga-adịrị ndị niile kwere n’Oziọma ahụ ọbụná dịka ọ dịrị ndị náesoụzọ Jisọs dịka O kwere ná mkwá.

Ịrịọ na Ịrịọta

Jisọs sịrị “Ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n’aham.” Ya mere anyị nwere ohere dị ebube ijekwuru Chineke n’ekpere, ma n’aha nke Jisọs ka anyị ga-arịọ ma nata-kwa ihe ọ bụla nke anyị na-arịọ n’aka-Ya. Mkparịta a nke dị ebube ma ná-ewuli kwa obi nke emechiri site n’okwu ahụ nke bụwororị óké isiiyi nke olileanya na ike nye ndị nke Chineke: “Okwu ndia ka M’gwaworo unu, ka unu we nwe udo n’imem. N’uwa unu nēnwe nkpagbu: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Jisọs ji dọọ ndị náesoụzọ Ya akanántị ka ha ghara ịma n’ọnyà n’arụ Ya?
  2. Òlee ebe ka Ọ sịrị na ha ga-esi nwee mkpagbu?
  3. Gịnị mere o ji dị mkpà ka Jisọs laa?
  4. Ònye bụ Onyenkasịobi ahụ? gịnị kwa ka ọ na-eme?
  5. Òlee ndị ka Onyenkasịobi ahụ ga-abịakute?
  6. Gịnị mere ndị náesoụzọYa ji nọọ ná mwute?
  7. Òlee mgbe ọñụ ha ga-alọghachikute ha? Ọ bụ kwa n’ihi gịnị?