Jọn 17:1-26

Lesson 238 - Senior

Memory Verse
“Ọ bugh kwa nani ndia ka M’nēkpe ekpere banyere ha, Kama anamekpe kwa ekpere banyere ndi kwere na Mu site n’okwu ha; ka ha nile we buru otù: dika Gi onwe-gi di nimem, dika mu onwem di kwa nime Gi Nna, ka ha onwe-ha we di kwa nime Ayi: ka uwa we kwere na Gi onwe-gi ziterem” (Jọn 17:20, 21).
Cross References

I Jisọs, Ọkpara Chineke

1. Oge hour nke inye Kraist otuto, bụ nke emezuru site n’ike nke Chineke bu Nna, na abịaru nso, Jon 17:1; I Pita 1:18-21

2. Ihe otuto a ga-ewetara ndị niile nke ga-ekwere ná Nna na Ọkpara ahụ ga-abụ ndụ ebighịebi, Jọn 17:2, 3; 3:14-16

3. Jisọs kpere ekpere ka enyeghachị Ya otuto ahụ nke o nwere na mbụ, Jọn 17:4, 5; Ndi Filipai 2:6-9; Ndi Hibru 1:3

4. Ndị náesoụzọ Ya anarawo-rị okwu nke Kraist, wee site n’ụzọ dị otú a nábata mkpughe nke ịbụ Mesaia Ya, Jọn 17:6-8; Matiu 16:13-17

II Ekpere Nke Jisọs Banyere Nzukọ-Ya

1. Onye nzọpụta rịọrọ Nna ka o mee ka ndị náesoụzọ Ya dị n’otù ma bụrụ kwa ndị ekewapụrụ site n’ụwa, Jọn 17:9-11; 10:28, 29; Ndi Filipai 4:7

2. Jisọs edebeworị ndị náesoụzọ Ya n’aha nke Nna site kwa n’Okwu-Ya, Jọn 17:12-14

3. Ndị náesoụzọ Ya nwererị ọlụ nke ha ga-alụ, ya mere agaghị ewepụ ha n’ụwa n’oge a, Jọn 17:15, 16; Ndi Filipai 1:23-25

III Odudonsọ na Mkpà Ọ dị

1. Aga-esite n’eziokwu nke Chineke lụọ ọlụ Odudonsọ, Jọn 17:17; I Ndi Kọrint 1:30; Ndi Hibru 10:10; 13:12, 13

2. Jisọs doro onwe-Ya nsọ ka e wee doo ndị náesoụzọ Ya nsọ, ma mee kwa ka ha dị ọcha, Jọn 17:18, 19; Ndi Efesọs 5:25-27

3. Ekpere nrịọchitaarịrịọ n’ihi odudonsọ na ịdị n’otù jikọtara ndị náesoụzọ Ya nke ọgbọ niile bụ ndị kwere na Ya, Jọn 17:10; Ọlu ndi-ozi 10:15, 34, 35; Ndi Hibru 2:9-13

4. Ịdị n’otù nke nzukọ ahụ ga-eme ka ụwa mara eziokwu nke Kraist, Jọn 17:21-23; Ọlu ndi-ozi 2:1; 4:13, 14; Ndi Rom 12:5

5. Jisọs kpere ekpere ka Ya na Nzukọ ahụ e doro nsọ n’ezie nọ n’otuto n’ikpeazụ, Jọn 17:24-26

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Onye Isinchụàjà Anyị

Ọkwá dị iche nke onye amụma, onyenchụàjà, na eze bụ nke ana-enwe n’oge Iwu ka ahụrụ na ejikọtara ha ọnụ n’otù n’Onye ahụ bụ Jisọs Kraist. Ọkwá ndịa n’otù n’otù na-egosi ụdị ọlụ dị icheiche nke Jisọs ga-alụzu nime àtụmààtụ nke Chineke. Onyeamụma bụ onye ná-ekwusa ozi Chineke nye ụmụmmadụ -- ọkwá ahụ ka Jisọs mezuru n’oge ijéozi Ya nke arọ atọ na ọnwa isii n’eluụwa. Onye nchụàjà bụ onye Chineke rọpụtara ịnọchita anya ụmụmmadụ n’iru Chineke. Nime arịrịọ, ekpere a nke n’enweghịatụ, nke onyeozi ahụ ahụrụ n’anya dere, ka egosiworo akụkụ nke abụọ nke ọlụ ahụ dị mkpà nke Jisọs nke ịbụ Onyeisi Nchụàjà nke Chineke na Onye ná arịọarịrịọ maka mkpụrụobi nke ụmụmmadụ. Ebe aga-anọ lụọ ọlụ ahụ na ọlụ ahụ nke aga-alụ dị n’Eluigwe n’aka nri nke Chineke. “Ọ bụ Kraist Jisọs onye nwuru ma nke kariri, emere Ya ka O si na ndi nwuru anwu bilie, Onye nọ n’aka-nri Chineke, Onye nāriọ-kwa-ra ayi aririọ” (Ndi Rom 8:34). Akụkụ ikpeazụ nke ọlụ Jisọs -- nke ịbụ Eze -- ga-emezu ná njedebe nke oge ịrịọ arịrịọ Ya. Mgbe ahụ aga-eme Jisọs Eze nke ndị eze na Onye Nwenu kachasi ndị nwenu niile, ime ka ọñụ nke ndị nsọ ana-apụghị ịgụta ọnụ na usu nke ndị bi n’Eluigwe zuo òkè, ma ahụhụ ga-adịrị ndị niile jụrụ Jisọs na ịkpọòkù nke Mmụọ Nsọ. Anyị kwere n’ezie na akụkụ ikpeazụ a nke ọlụ Jisọs ga-emezu n’oge ná-adịghị anya.

Ekpere Banyere Ya Onwe Ya

Dịka ndịisi nchụàjà n’akụkọ nke ndị Israel na-ebu ụzọ chụọàjà n’ihi ha onwe ha ma emesia n’ihi ndịọzọ, otú a ka Jisọs mere, Onye bụ mmezu zuruòkè nke Iwu ahu, Ọ malitere arịrịọ ekpere Ya ahụ dị ukwuu site n’ịrịọ arịrịọ banyere onwe Ya. Jisọs matara na oge hour ahụ akàrà aka abịawo mgbe Ọ ga-ewere ndụ Ya agọziri agọzi nye n’ihi mmehie nke ụmụmmadụ ndị bi n’eluụwa. O kwuru okwu banyere oge áwà ahụ dịka ihe emezuwororị; Ọ pụrụ ime otú a n’ihi na n’obi Ya O nyeworị ndụ-Ya. Oge áwà nke ahụhụ nke Jisọs bụ ihe arịbaworo àmà n’oge akàrà àkà nke Chineke site ná mmalite nke oge, ọ dịghị kwa oge hour nke ga-adị ka ya n’ebe mmadụ nọ. Ọmụmụ nke Jisọs mere ka óké ọñụ dị n’etiti ndị mmụọozi na ụmụmmadu, ma oge nke ọnwụ Ya wetara mgbapụta nye ndị niile kwere ekwe n’ezie. Oge áwà ahụ nke óké mweda n’ala nke Kraist bụ oge áwà nke wetara ná mmezu mkwà niile nke Chineke maka mgbapụta. (Lee Jenesis 3:15). Ebibiri ike nke Ekwensu site n’ọnwụ mmeri nke Kraist n’elu obe. Ihe banyere ahụhụ, mweda n’ala, na ọbụbụọnụ nke mmehie nke ga-abịakwasị Ya dịka ọnụahịa nke mgbapụta abataghị Ya n’obi n’ekpere ahụ nke O kpere banyere onwe-Ya; ma O chọrọ náánị ka enye Chineke Nna otuto site n’ụgwọ ahụ nke Ọ kwụrụ.

Ụzọ nke Mgbapụta

Mmehie wetara nkewa n’ebe Chineke na mmadụ nọ, ma ọ dị mkpà na aga-achọta ụzọ aga-esi kpọghachi mmadụ ịchọta iruọma na mmekọrịta nke ya na Chineke. Náánị àjà nke a na-anara nkeọma n’ihi mmehie bụ Ọbara nke Ọkpara Chineke ná-enweghị mmehie, nke ana-achọ ka achụọ. Jisọs kpere ekpere ka Nna nye ndụ Ya nke ana-aga iji chụọàjà otuto, ka e wee site na ya nye Nna ahụ otuto site n’ọtụtụ ụmụmmadụ ndị agbapụtara baa n’eziomume. N’ihi àjà ahụ, ụmụmmadụ pụrụ iguzo n’iru Chineke, n’ihi na asawo mkpụrụobi ha nime Ọbara Nwaatụrụ ahụ. Jisọs bụ mpụtaihè nke Chineke bụ Nna nye ụwa, “nnwupu nke ebube-Ya na onyinyo nke udi-Ya.” Site n’okwukwe nke ekwere n’Ọkpara Chineke na Ọbara ahụ dị ókéọnụ nke Ọ wụsịrị, mmadụ pụrụ ịbụ onye akpọbatara ọzọ n’iheọmụmá na n’èzínaụlọ nke Chineke. “Ọ buru na Mọ nke Onye ahụ Nke mere ka Jisọs si na ndi nwụrụ anwụ bilie nēbi nime unu, Onye ahu nke mere ka Kraist Jisọs si ná ndi nwuru anwu bilie ga-esite kwa n’aka mọ-Ya nke nēbi nime unu me ka arụ unu nke puru inwu anwu di ndu.” “N’ihi na unu anatagh mọ nke ibu orù ilaghachi n’egwù ọzọ; kama unu natara mọ nke ido-ka-nwa-nwoke, Nke ayi nēti nkpu nime Ya, si, Aba Nna. Mọ Nsọ onwe-ya soro mọ ayi nāgba àmà, na ayi bu umu Chineke” (Ndi Rom 8:11, 15, 16). Amamihe Chineke nke ekpughere nime Kraist na iso Ya ná-enwekọrịta ihe, na-ewetara ndị niile kwere n’ezie ndụ ebighịebi.>

Jisọs mechiri akụkụ nke ekpere ahụ nke metutara Ya onwe Ya na Nna ahụ site n’ịrịọ arịrịọ ka enyeghachi Ya otuto ahụ nke o nwere-rị na mbụ. Ọ fọdụrụ nwamgbentà ka ọlụ ahụ nke Jisọs dị ngọzi bịara ịlụ n’eluụwa gwụsịa. O chetara ebe obibi ahụ dị ebube, na ịchọ mma nke Obodo ahụ na nnwekọ nke Ya na Nna Ya mgbe niile, nke Ọ rapụrụ n’Eluigwe ịbịa luzue ọlụ a; Mmụọ Ya na-achọsike ịrapụ ndagwurugwu nke iruuju na ákwá a ibinyere Nna-Ya ọzọ.

Ekpere Maka Ndịozi

Jisọs bịara ịzọpụta ndị bi n’ụwa ná mmehie ha niile, ma ekpere Ya n’oge a bụ nnọọ náánị banyere ndị náesoụzọ Ya. Ọlụ nke ịgbasa Oziọma ahụ ga-abụ ihe dịrị ha mgbe Jisọs ga-arapụ ha wee lakuru Nna-Ya, ma ihe dị mkpà nime ya bụ na ndị náesoụzọ Ya aghaghị ịbụ ndị kwesịrị ịlụ ọlụ ahụ nke akpọrọ ha ịlụ. Jisọs na-ekwu nnọọ ihe banyere ndị ahụ náeso-Ya ndị emesịrị mata dịka Ndịozi, n’ihi na ọ bụ ọlụ dịrị ha ijide na ikwusa okwu ahụ na Oziọma ahụ nke Jisọs wetaara nye ụwa niile.>

Jisọs kwuru nkeọma na o mewo ka ndị ahụ enyere Ya site n’ụwa mara Nna ahụ. Jisọs edebewo ndịa náesoụzọ-Ya n’aha nke Nna; ma ugbu a n’oge ọlịlá-Ya O kpere ekpere ka Nna gbaa ha ume ma debe-kwa ha nime Oziọma ahụ mgbe Jisọs ná-anọghị ya. Ndị ná-amụ ihe n’okpuru Kraist na-ejikere ịghọ ndị òzízí nke Kraist ikuzi òzízí niile nke Kraist, Jisọs chọrọ ka Chineke nye ha amara nke ha ga-eji merie ihe mgbochị niile nke ga-achọ ịnapụ ha okwukwe ọhụụ ahụ nke ha chọtara.

Nchebe nke Ndịnáesoụzọ-Ya

Iji ezi nlezianya mụọ ihe ọmụmụ dị n’ekpere a na-egosi n’ebe odoro anya na mmadụ nwere ike ịbụ onye lara n’iyi ebighịebi ọ bụ ezie na ọ bụwo-rị onye azọpụtara na mbụ. Ònye ga-agọnarị na Judas bụrị onye nwere ezi nchègharị na mbụ, mgbe Jisọs na-ekwu ihe banyere ndịnáesoụzọ-Ya, “Eche-kwa-ram ha, ọ dighi kwa onye ọ bula nime ha lara n’iyi ma-ọbugh nwa nke ila n’iyi ahu.” Náánị nchèbe ebighịebi nke mmadụ nwere ike ịmata nkeọma bụ inwe ezi nchègharị site ná mmehie niile nke o mehieworo ma ná-eje mgbe niile n’ime uche Chineke. Nke ahụ bụ ihe nzuzo nke dị ná mmeri nke ndị náesoụzọ Ya -- “ha edebewo kwa okwu-Gi.” Jisọs sịrị, “Debe ha ka ha pua n’aka ajọ onye ahụ,” na “Ha esitegh n’uwa, dika Mu onwem nēsitegh n’uwa,” nke ná-egosi na ha na-ebi ndụ karịa mmehie niile nke ụwa. Ọ bụ Nna nyere Jisọs ndị niile náesoụzọ-Ya, Ya onwe ya edebewo kwa ha. Edebewo mmadụ irinaotù ahụ n’ihi na ha chọrọ ka edebe ha, ma Judas lara n’iyi n’ihi nrọrọ ọjọọ ya na mmehie ya. Ike nke nchèbe nke Jisọs bụ ihe kachasị ebube. Edebeghị onyeKraist n’ọnọdụ onye ékèrè agbụ nye Kraist ka ọ ghara ime ihe ọ chọrọ, maọbụ dịka agasị na eji-ihe mechibido ya pụọ n’ụwa; kama a na-edebe ya site na njikọ nke ịhụn’anya. Onye nke Kraist nwere onwe-ya mgbe ọ bụla ịrapụ Kraist, ma ọ na-anọgide nime Kraist n’ihi ịhụn’anya ahụ dị omimi. Ezi onye Kraist ọ bụla na-enwe mmetụta dịka ndị náesoụzọ Jisọs nwere mgbe Jisọs sịrị, “Ùnu onwe unu na-achọ kwa ila?” (Jọn 6:67). Ọzịzá ha bụ “Onye-nwe-ayị, ònye ka ayi gējekuru? I nwere Okwu nke ndu ebighi-ebi” (Jọn 6:68). Ekwensu na-anwa onyeKraist ọ bụla ka ọ laghachị n’ihe ná-adịghị ike na ihe ná-abaghị úrù nke ụwa; ma ndị ná-emeri emeri na-anọgidesiike n’Oziọma ime ka ọkpụkpọ-ha na nrọpụta ha bụrụ ihe na-eguzosiike, n’ihi na ha hụrụ ịmamma niile nke Oziọma, “Ebe o nwere nkwà nke ndu, ma nke ndu ugbu a, ma nke gaje ibia” (I Timọti 4:8).

Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ikwu n’owuweanya na ndị náesoụzọ-Ya ndịa bụ ndị Jisọs kpewororị ekpere banyere ha abụghị ndị nwere ezi ọmụmụ ọhụụ. Ha anarawo debe kwa Okwu Chineke nke Jisọs wetara n’ụwa; ha kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke mụrụ náánị Ya. Ha abụghị kwa nke ụwa ọzọ; ya mere ụwa kpọrọ ha asị. Ọ dị ihe mkwàgide ọzọ achọrọ iji gosi na ndịkom ndịa bụ ndị azọpụtaworo-rị site ná mmehie? Náánị nzọpụta na-enye mmadụ ike ibi ndụ nke ná-emeri mmehie; ma Jisọs matara na ndị náesoụzọ-Ya chọrọ amara dị ukwuu nke ha ga-eji nọgidesie ike ibi ndụ nke onye Kraist n’ịdịn’otù n’ebe onye ọ bụla na ibe ya nọ, wee bụrụ kwa ndị jikeere n’ikpeazụ nke ndụ ha ịhụ Chineke n’Eluigwe. O kpere ekpere ka e doo ha nsọ site n’eziokwu nke Chineke. Jisọs, site n’ịghọ mmadụ-Ya, ndụ-Ya, ọnwụ-Ya, mbiliten’ọnwụ, na otuto-Ya, bụ nnọọ òzùzùòkè nke eziokwu Chineke.

Odudonsọ.

Odudonsọ bụ nsachapụ nke mmehie niile nke eketara n’ọmụmụ; ọ na-ewepụ mgbọrọgwụ nke mmehie na omume anụarụ niile, ná-ebibi kwa mmehie niile nke eketara n’Adam kpamkpam, Jisọs sịrị, “Ngọzi nādiri ndi di ọcha n’obi: n’ihi na ndi ahu gāhu Chineke” (Matiu 5:8). Odudonsọ na-enye mmadụ obi dị ọcha na ịdịnsọ bụ nke dị óké mkpà ná ndụ nke ná-emeri emeri.

Tutu mmadụ abịakute Chineke e nwere ụzọ mmehie abụọ nke dị ná mkpụrụọbi onye ọ bụla -- nke ahụ pụtara ihè, mmehie nke emehiere n’onwe-onye, na mmehie nke eketara n’Adam. Ọ dị ọlụ amara nke pụtara ìhè na nzọpụta, nke esitere na ya gbaghara ma hichapụ kwa mmehie niile, nke ná-eme ka onye ahụ bụrụ onye ekèrè ọhụụ nime Kraist Jisọs. Enwe-kwara ọlụ amara nke abụọ, nke bụ odudonso, nke esitere na ya wepụ ma bibi kwa mmehie nke eketara site ná nna anyị ochie. Aghaghị ịmụ mmadụ site na Chineke o wee bụrụ onye nwere onwe-ya pụọ n’iwu nke mmehie tutu ọ bụrụ onye kwesịrị ekwesị maka ọlụ ahụ dị ukwuu nke odudonsọ, dịka ọ dịrị ndị náesoụzọ Jisọs bụ ndị Jisọs kpere ekpere banyere ha.

Mmehie ahụ amụrụ mmadụ nime ya esiteghị n’aka ya. Ọ bụghị ya onwe-ya mere mmehie ahụ, ọ pụghị kwa ichègharị na ya. Ihe ọgwụgwọ Chineke nwere maka nke a bụ nsacha ahụ nke akpọkwara odudonsọ, ịdịnsọ maọbụ ihụn’anya zuruòkè. Mgbe amụrụ onye mmehie ọzọ, ana-egbutu mkpụrụ niile nke mmehie ngwangwa mkpụrụ nke Mmụọ-nsọ na apụtaìhè; ma mgbọrọgwụ nke mmehie ochie ahụ ka dị kwa n’ebe ahụ iweta nsogbu. Aghaghị iropụ ma bibie kwa ya site n’odudonsọ.

Okwu ahụ nke bụ odudonsọ na-apụta ụzọ ihe abụọ, nke mbụ bụ iwepụta mmadụ iche maka ijéozi dị mkpà nke pụrụ iche, nke abụọ bụ nsacha na ime ka adị ọcha. Ọ dị ọlụ nke dịrị mmadụ ịlụ n’Onwe-ya dịka Jisọs doro onwe Ya nsọ; maọbu n’ụzọ ọzọ, o mere ka ijiobichụaàjà-Ya dị ọhụụ n’ọlụ ahụ nke Chineke kwadobere Ya ịlụ. E nwere ọlụ ọzọ nke Chineke na-alụ site n’ifesa ọbara nke Kraist nke ugbò abụọ n’obi mmadụ nke ana-esite na ya bibie omume niile nke anụarụ. Mgbe iji obichụọàjà nke mmadụ zuruòkè, mgbe ọ chọsikwara ike ka anapụta ya na mgbọrọgwu nke mmehie ochie ma bụrụ kwa onye nyebigara Chineke onwe-ya òkè, mgbe o nwere okwukwe n’ọbara Jisọs, mgbe ahụ anaanụ ekpere ya n’Eluigwe Chineke na-alụ kwa ọlụ odudonsọ zuruòkè n’obi ahụ. Onye ọ bụla nke asachaworo otú a nke nyebigakwara onwe-ya ókè otú a na-enwe ụdị uche ahụ nime ya nke dị kwa nime Kraist Jisọs. Otù nwaakwụkwọ kwuru okwu banyere odudonsọ sị, “Apụrụ ikwu na madụ bụ onye zuruòkè bú onye mezuru ihe ahụ nke Chineke bu n’obi kee ya; dịka Chineke chọrọ ka madụ nile hụ Ya n’anya site n’obi ha nile, mkpuru-obi ha nile, uche ha nile, na ike ha nile, na ịhụ onyeagbataobi-Ya n’anya dịka onwe-ya, mgbe ahụ onye ahụ ga-abụ onye zuruókè bụ onye mere otú a -- o mezuru ihe niile nke Chineke chọrọ n’aka ya rue ọgwụgwụ.” Ọ bụ náánị mgbe e doro mmadụ nsọ site n’Ọbara ahụ ka ana-ahụ ụdị ndụ nke ịdịnsọ ahụ nke achọrọ.

Mkpà Odudonsọ Dị

Ọ ga-abụ na óké ọlụ nke odudonsọ a adịghị mkpà? Ọ bụ ihe dịrị onye Kraist ọ bụla ịchọ maọbụ ịrapụ ọlụ amara nke abụọ a pụtara ihè? Ọ bụghị otú a! Chineke agwawo ụmụmmadụ n’akụkụ niile nke Baịbụl ka ha chọọ onyinye amara a dị ebube. O nyere Abraham iwu, “Gi jègharia n’irum, buru kwa onye zuru òkè” (Jenesis 17:1), o nyekwara Ụmụ Israel iwu, “Mu onwem bu JEHOVA Chineke-unu: Unu gēdo kwa onwe-unu nsọ, we di nsọ; n’ihi na nsọ ka Mu onwem di” (Levitikọs 11:44). Iwu nke enyere ndị agbapụtara adịghị iche taa. “Nka bụ ihe Chineke nāchọ, bu ka edo unu nsọ.” (I Ndi Tesalọnaika 4:3). Òlee otú mmadụ ga-esi kwue na ya hụrụ Onyenwe anyị n’anya site n’obi ya dum, mkpụrụobi-ya dum, uche ya dum, na ike ya dum, ma o nweghị njikere ime uche Chineke.

E nwere ọtụtụ ebe n’Akwụkwọnsọ nke na-ekwu ihe gbasara nkọwa nke Baịbụl banyere odudonsọ na ịdịnsọ nke onye Kraist. Ụwa na ekwensu na ebuso ya agha, n’ihi na ndụ nke e doro nsọ bụ ihe ana-apụghị ịrụ ụka banyere ya ma bụrụ kwa ihe anapụghị ịta ụta. Ọ dịghị kwa ihe aga-asị na o yiri ya maọbụ iji gbanwee ya -- odudonsọ aghaghị ịbụ nke zuruòkè, site kwa n’Onyenweanyi. Ọlụ amara a ga-eme ka onye ahụ nke nwere ya baa n’Eluigwe. “Nāgbasonu udo n’ebe madu nile nọ, ya na ido-nsọ ahu nke onye ọ bula agaghi-ahu Onye-nwe-ayi anya ma o nwegh ya” (Ndi Hibru 12:14). Odudonsọ ga-eme ka ndụ nke onye Kraist na ọlụ ọ ga-alụrụ Chineke n’eluụwa bụrụ ihe gara nkeọma n’ebe ọ dị ukwuu. Ọ dịrị onye e doro nsọ mfé imeri ụwa, amara ahụ ga-eweta ịdịn’otù nime Nzukọ Kraist nke ihe ọzọ ná-apụghi iweta. Ụwa agaghị enwe ileli ịdịn’otù nke Nzukọ ahụ nke e doro nsọ n’ezie anya, ha ga-aghọta nkeọma na Kraist, bụ olileanya nke ebube, nọ n’etiti-ha.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ oge áwà nke bịaruworo Jisọs, Ọkpara Chineke nso?
  2. Gịnị bụ urù nke o baara ụmụmmadụ ikwere na Jisọs Kraist?
  3. Òlee ndị ka arịrịọ ekpere nrịọchita nke Jọn 17 dịịrị?
  4. Òlee ụzọ esi chebe ndị náesoụzọ Jisọs mgbe ha na Jisọs nọ n’eluụwa?
  5. Òlee otú aga-esi chebe ha mgbe Jisọs lakusịrị Nna Ya?
  6. Gịnị mere ndị náesoụzọ-Ya ga-eji nọgide n’ụwa ebe ọ bụ na Jisọs arapụwo ha?
  7. Kọwa ihe idonsọ pụtara.
  8. Kwue ọtụtụ nime urù nke odudonsọ bara, kwue kwa ihe mere o ji dị mkpà.
  9. Gịnị mere ụwa na ekwensu ji kpọ odudonsọ asị, ma ná-ebuso kwa ya agha?