Abù Ọma 32:1-11

Lesson 239 - Senior

Memory Verse
“Ọtutu ihe-ngbu gādiri onye nēmebi iwu: Ma onye nātukwasi obi na JEHOVA, ebere gādi ya gburugburu” (Abù Ọma 32:10).
Cross References

I Ọnọdụ Ngọzi, na Ọñụ nke Onye ahụ Ná-asọpụrụ Chineke

1. Mgbaghara nke njehie niile (ijehie pụtara, n’ụzọ doro anya, ime ihe ahụ megidere iwu.) na-eweta ezi obiụtọ, Abù Ọma 32:1; 1:1-6; Aisaia 43:25; 44:22; 55:1-3, 6, 7; Jeremaia 31:34; 50:20; I Jọn 1:9; Ndi Rom 8:1

2. Mkpuchi nke mmehie (ime mmehie pụtara n’ụzọ doro anya, ịrapụ ụkpụrụ ahụ, maọbụ, edebeghị ihe enyere n’iwu.) na-eweta kwa ezi obiutọ, Abù Ọma 32:1; I Jọn 1:7; 2:1, 2; 3:5, 8; Levitikọs 17:11; Ndi Hibru 8:12

3. Mgbe agbaghara mmadụ ajọ omume ya (nke bụ imebiiwu maọbụ isi n’ezi ụzọ baa n’ụzọ ọjọọ) ọ na-enwe nnọọ ezi obiụtọ, Abù Ọma 32:2; Maika 7:18-20; Ndi Hibru 8:12

4. Inwereonwe site ná aghụghọ (Aghụghọ pụtara n’ụzọ doroanya, omume aghụghọ maọbụ nghọgbu,) na-eweta ezi obiutọ, Abù Ọma 32:2; 101:7; Jọn 1:47; I Pita 2:22; Mkpughe 14:5

5. Ịkwáụtá dị omimi nke ana-apụghị ịkọ, na amamikpé dị ukwuu n’ihi mmehie, wetaara Devid nchègharị na mgbaghara zuruòkè, Abù Ọma 32:3-5; 51:1-19

II Ngọzi niile, nke dị Ugbu a na Mgbe Ebighịebi nye Ndị Ná-asọpụrụ Chineke

1. Ndị ná-asọpụrụ Chineke ga-achọ ngọzi niile nke Chineke, nrọpụta Ya na nchebe-Ya, Abù Ọma 32:6; Habakuk 2:4; Ndi Hibru 10:38

2. Chineke ga-echèbe ndị nke Ya, Abù Ọma 32:6, 7; 91:1-16

3. Nduzi ka ekwere ndị niile náeso Chineke ná mkwà, Abù Ọma 32:8; 25:9; 48:14; 73:24; Jọn 14:26; 16:13-15; Aisaia 30:21

4. Onyeisiike na omeucheaka-ya agaghị enwe mkwà ahụ ekwere ndị ná-asọpụrụ Chineke, Abù Ọma 32:9, 10; Ilu 3:32; 2 Pita 2:9-17

5. Ya mere, onye ná-asọpụrụ Chineke ga-enwe obi jupụtara na ekele n’ihi urù dị icheiche ọ na-anata, Abù Ọma 32:11; 103:1-22

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Eziomume nke Sitere n’Okwukwe

E dere ya n’akwụkwọ na ajụrụ Martin Luther otù mgbe, òlee Abù Ọma nke, kachasị mma, ọzịzá o nyere bụ, “Abù Ọma nke Pọl.” O juru onye ahụ jụrụ ajụjụ anya na onye ukwu dịka Luther ga-agụ ụfọdụ nime Abù Ọma nke mgbe Ochie n’ihe mkpịsịakwụkwọ Pọl Onyeozi dere, o wee jụọ ya ihe ọzịzá-ya pụtara. Ekwuru na Luther zara na ọ kpọrọ Abù Ọma ndịa nke na-ekwu ihe banyere nchègharị -- Abù Ọma 32, 51, 130 na 143 -- Abù Ọma nke Pọl, n’ihi na ha yiri nnọọ ihe onyeozi ahụ dèrè, n’iwepụta eziokwu ahụ na mgbaghara nke mmehie niile nke onye kwere ekwe na-anata, adịghị esite n’iwu ma-ọbụ n’ọlụ. O kwukwara na Abù Ọma ndịa na-akụzi, dịka ihe Pọl dere n’ihe odide ya n’Agbà Ọhụụ, na ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịnyaisi n’eziomume nke aka-ya; mgbaghara mmehie ahụ nke ọ natara bụ site n’ebere nke Chineke ọ bụghị site n’ọlụ nke onwe-ya.

Abù Ọma nke a malitere site n’ịkọwa na onye ahụ nke agbapụtaworo site n’ihe ọjọọ niile bụ onye ihe na-agara nkeọma maọbụ onye nwere ọñụ n’ezie. Onye ahụ dere Abù Ọma akọwawo ya nkeọma bụ ajọomume anyị site n’ọmụmụ na omume anyị ndị ana-ahụ anya ma chịkọta kwa ya na nkenke n’ụzọ dịka ahụrụ ya n’ebe a, nke bụ njehie, mmehie niile, ajọomume na aghụghọ. Ọ na-ekwu na nwoke ahụ nke agbaghaworo njehie ya niile site n’amara na ebere nke Chineke nke ọ na-ekwesịghị ịnata; nwoke ahụ nke ekpuchiworo mmehie ya, nke Chineke tụbakwara n’ala ala óké osimiri -- ọ bụghị isé n’elummiri dịka mgbụgbọ osisi, kama imikpu kpamkpam ebe ana-agaghị ahụ ya anya ọzọ; nwoke ahụ onye agbanweworo site n’ike nke nzọpụta nke Chineke nke mere na agaghị agụkọrọ ya ajọomume ya nke gara aga; nwoke ahụ onye ewepụworo aghụghọ ya niile onye obi ya jupụtaworo n’eziomume kama ajọomume -- nwoke ahụ, ka Devid sịrị na ọ bụ onye nwere ọñụ n’ezie!

Ụfọdụ enwewo obiabụọ ma Chineke Ọ pụrụ ịgbanwe ndụ mmadụ, maọbụ ime ka anwapụta ike nke isite ná ndụ mmehie baa ná ndụ eziomume nke mmadụ pụrụ ịmata ma jide kwa ya. Ọ bụ ihe mwute na enwere ọtụtụ mmadụ ndị ná-esite n’ụzọ dị otú a mee ka ike Chineke dị ala, na ndị ná-ewedata àtụmààtụ ya n’ebe ọ ga-adịrị ha mfé. Ma àtụmààtụ nke Chineke adịghị agbanwe agbanwe!

Nzọpụta nke Chineke na-anapụta mmadụ n’ikpéọmụmá nke mmehìe, ike nke mmehie na ụgwọọlụ nke mmehie. Ọlụ amara a dị ebube, dịka ihe ana-ahụ anya si dị na-eweta ọñụ n’ihi na ewepụwo ịkwá ụta dị ilu nke mmehie, ewepụwo kwa amamikpé, n’ihi na ewerewo “udo di ukwu” nke ana-enye ndị hụrụ iwu Chineke n’anya gbanwee “óké-egwù ahu” nke ikpé na nke óké iwe Chineke nke gaje ịbịa. Ụwa, na ihe niile nke ọ pụrụ inye mmadụ, agaghị eyi maọbụ rue ụdị obiụtọ ahụ.

Ezi Obiụtọ, Otù nime Ihe Mnwapụta nke Nzọpụta

Mmadụ apụghị inwe obiabụọ ịmata ma agbagharawo ya mmehie ya niile, ewezuga onye eji igwè ọkụ daa n’akọnauche ya, n’ihi na ngwangwa échìchè ime mmehie batara n’obi ya nke ahụ ga-eweta óké egwù nime ya. Egwù nke ọnwụ ebighịebi na óké ụjọ nke ikpé Chineke ga-abata n’échìchè ya. N’eziokwu ọñụ adịghị n’ọnọdụ dị otú a.

Ezi ọñụ adịghị ma ọ bụghị nke ahụ na-atọ obi ụtọ, ọñụ agaghị enye obi ụtọ ma mmadụ anwapụtaghị ya. Ma agaghị anwapụta ọñụ ma-ọbụghị ma mmadụ ọ matara na o nwere ya. N’ihi nke a obiabụọ ọ bụla banyere mgbaghara mmehie na-emegide ezi ọñụ ahụ; ma ezi ọñụ ahụ ịnọ nime mmadụ bụ otù n’ihe ahụ nke ná-eme ka enwee owuweanya n’amara nke nzọpụta Chineke.

Devid emehiewo. Óké ibu nke amamikpé na ikpé Chineke nyịgidere ya o wee si ná mmehie-ya chègharịa. Anyị na-agụ n’ebe a na Chineke agbagharawo ya. N’Abù Ọma a Devid gwara anyị na enyeghachịrị ya ọñụ nke nzọpụta mgbe e mere ka àmàrà nke nzọpụta Chineke pụtakwara ya ìhè ọzọ. Devid ebuworị ụzọ kpee ekpere ka enyeghachị ya ọñụ ahụ; anyị ga-ahụ ekpere ahụ maka mgbaghara (Abù Ọma 51) na Abù Ọma a, na ekpere ahụ o kpere banyere inyeghachị ya ọñụ nzọpụta ya bụ nnọọ maka nzọpụta-ya. Ụfọdụ ga-ekwu na Devid etufughị nzọpụta ya, na ọ bụ náánị nwa mgbe ntà ka anapụrụ ya ọñụ-ya n’ihi omumeọjọọ ahụ o mere. Ma Abù Ọma a, na n’ihe anyị mụtara n’ekpere ya maka mgbaghara mmehie, na-egosi na ọ na-ekpe ekpere dịka onye na-enwekwaghị ihe ntụkwasịobi maọbụ olileanya na Chineke na mgbe ahụ. Ọ bụ onye furu efu -- furu efu ebighịebi -- ewezuga ekpere ahụ maka mgbaghara mmehie nke o kpere. Eweghachịrị ya n’ohere dị icheiche nke o nwere ịbụ nwa na onye nketa nke eziomume, náánị mgbe ahụ enyeghachịrị ya.

Ngọzi niile ahụ Ná-eso Nchègharị

Ebe eweghachịrị ya n’ịhụn’anya nke Chineke, Devid wee bata kwa n’ihenketa nke ndị eziomume. Ebe ọ matara ngọzi niile nke ga-adịrị “Onye ọ bula nke na-asọpuru Chineke,” ọ tụfughị kwa oge ikpé ekpere ka Chineke mee ya onye nketa nke ngọzi ndị ahụ niile. Ọ na-atọ Chineke ụtọ mgbe anyị na-atụkwasị Ya obi. O kwuwo na “Onye ezi omume gēji okwukwe ya di ndu” (Habakuk 2:4). Ọ chọrọ ka anyị daberesie ike na Ya. Ọ chọrọ ka anyị tụkwasị Ya obi anyị niile.

Ngọzi niile anyị na-enweta site na Chineke na-abawanye ụba mgbe anyị na-aghọtakarị ezughịókè anyị na òzùzùòkè nke Chineke n’uju ya. Ndị ahụ na-abịakarị n’Ocheeze Amara bụ ndị ana-agọzi ọtụtụ mgbe. Ndị ahụ nke ná-enwe ntụkwasịobi ha na olileanya ha n’Onye ahụ nke ná-adị ebighịebi bụ ndị ná-enwekarị urù na amamihe na kwa nrọpụta-Ya nke ná-enweghị nsọtụ.

Enwere nrọpụta zuruóké maka mkpà anyị n’ihe ana-ahụ anya n’Ụlọàkụ nke Chineke. Enwere ọgwụgwọ maka ọrịa anyị niile nime Ọbara ahụ nke awụsịrị na site kwa n’arụ ahụ nke etiworo ihe n’ihi anyị. Amamihe na odúdú dị nime Onyenkasịobi ahụ agọziri agọzi maka nsogbu anyị na ihe niile ná-agbagwoju anyị anya ná ndụ. Aga-ekpughe okwu Chineke nye ndị ahụ ná-achọ odúdú nke Mmụọ Nsọ. Ọ dị okwukwe ana-enweta site n’inwe ezi nghọta nke Okwu Chineke. Olileanya ebighịebi dịrị ndị niile na-eso Onye Nazaret ahụ dị umeala n’obi. Nkasịobi na udo dị nye onye ọ bụla nke na-abịakute Nna ahụ nke na-aghọta ihe nkeọma. Nchebe na ibi ná ntụkwasịobi dị nye ndị niile ga-abịa n’okpuru Nku-nchebe ahụ na ndị Anya ịhụn’anya ahụ na-agbaso. Ngọzi ndịa na ọtụtụ ngọzi niile ọzọ na-abịakute ndị ahụ nke nwere okwukwe ha na ntụkwasịobi ha nime Onye nke kwuru na Ọ gaghị arapu anyi na Ọ gaghị ara kwa anyi aka maọlị.

Ọgbụgbandụ nk’Ọbara Ya,

Nēny’rem aka na mkpam niile;

Mgb’ihe niile si n’obim pụa,

Náánị Ya bụ olil’ anyam.”

Ma enwere okwu nke ịdọakanántị nime Abù Ọma ahụ, n’ihi na Chineke maara adịghị ike nke mmadụ na erughịeru nke anụarụ anyị bụ ájá. Okwu ahụ, “Unu adila ka inyinya ma-ọbụ dika inyinya mule, nke ọ digh nghọta ha nwere,” na-agwa anyị na mmadụ ụfọdụ dị ndị ga-ajụ ka achịa ha, ndị ga-ajụ ido onwe ha n’okpuru ọchịchị na uche Chineke. Ndịa na-enwe olenaole, ma ọ bụrụ na ọ dị nke ọ bụla, ha na-enweta nime ngọzi niile nke kachasị ukwuu bụ nke ndị eziomume na-anata. “Ọtụtụ ihe-ngbu gādiri onye nēmebi iwu” bụ náánị ihe kachasị nke aga-enye ha n’ọnọdụ nkasịobi n’ihi ihe isiike nke ná-adị ná ndụ ha mgbe niile nke ha na-anagide kwa. Ma enwere nkasịobi dị ntà mgbe ana-achọpụta n’ezie na iru-uju a niile bụ n’ihi mmadụ ime ihe n’ucheaka-ya, isiike na ọchịchọ nke onweonye. Ma n’akụkụ nke ọzọ, onye eziomume nwere ndabere siriike na nkasịobi nke na-adị ebighịebi na “ebere gādi ya gburugburu.”

Otuto na Obiekele

Gịnị ga-eme ka onye eziomume ghara ịbụ abụ? Gịnị ga-eme ka onye agbapụtara ghara itò Chineke? Gịnị ga-eme ka ọ ghara inwe obiụtọ? Ọzịzá nke ajụjụ a niile doroanya ma bụrụ kwa ihe apụrụ ịhụ ná ndụ ndị nke Kraist nke ọgbọ niile.

Abụùné malitere nime òfùfé Chineke. Ịbụ abụ malitere e wee dozie ya iji nye Chineke otuto. Ana-ahụ ezi mnwekọ náánị n’ebe ịdịn’otù na-achịachị na n’ebe obi niile bụ otù. Èzínaụlọ niile nwere ọñụ karịa bụrụ ndị ahụ nábatara Chineke dịka onyeọbịa ahụrụ n’anya. Enyi niile nke kachasị mma bụ ndị ahụ nke Chineke mere ka o guzosie ike ma gaa kwa nkeọma site n’òfùfè-Ya. “Ezi onyinye ọ bula na ihe ọ bula zuru òkè nke enyere enye si n’elu bia” (Jemes 1:17). “Iju-miri nke ọtutu miri … agagh eru ya aru” bụ onye tụkwasịworo obi ya na Chineke -- nwoke maọbụ nwanyị ahụ onye matara eziomume nke sitere n’okwukwe.

“Ñurianu ọñụ na JEHOVA, teghari-kwa-nu egwú ọñu, unu ndi ezi omume; Ti-kwa-nu nkpu-ọñù unu nile ndi ziri ezi n’obi.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Kọwaa ụzọ ihe ọjọọ anọ ekwuru ihe banyere ha n’amaokwu niIle nke eji malite iheọmụmụ a.
  2. Kwue ụzọ dị icheiche nke Chineke meworo iji mee ka anyị nwere onwe anyị site n’ihe ọjọọ ahụ niile nke edeworo n’amaokwu ndịa.
  3. Òlee ụzọ Abù Ọma a si gosipụta na òzízí nke “Nchebe Ebighi-ebi” bụ okwu ụgha?
  4. Gịnị bụ ngọzi niile nke e kwere ndị ná-asọpụrụ Chineke ná mkwà?
  5. Gịnị bụ ịdọakanántị e nyere n’ọgwụgwụ nke Abù Ọma a?
  6. Gịnị ka e kwere onye na-emebiiwu ná mkwà?
  7. Gosi ihe dị iche n’olileanya nke onye ná-emebiiwu na nke onye eziomume.
  8. Gịnị bụ ntọala nke itò Chineke?
  9. Gịnị mere Luther ji kpọọ Abù Ọma a otù nime “Abù Ọma Pọl”?
  10. Gịnị bụ eziokwu ahụ dị ukwuu nke Oziọma nke akụziri n’ebe a na nime Abù Ọma 51 nke yiri ọtụtụ ihe edere n’agba ọhụụ?