Abù Ọma 10:1-18; 14:1-7; 36:1-12

Lesson 240 - Senior

Memory Verse
“I nuwo ihe ndi di ume-ala n’obi nāchọsi ike, JEHOVA; I nēdozi obi-ha, I nēme ka nti-Gi ge” (Abù Ọma 10:17).
Cross References

I Mmeso Chineke N’ebe ndị Mpako Nọ

1. Nzube niile nke Chineke, mgbe Ọ na-enye ndị Ya ahụhụ, adịghị apụtacha ìhè mgbe ahụ, Abù Ọma 10:1; Job 23:10; Aisaia 48:10; 2 Ndi Kọrint 12:7; I Pita 1:6, 7; 4:12, 13

2. Mpako na nfụlielu na-adị n’obi ndị ná-emebiiwu, nke pụtara ìhè n’omume ha niile, Abù Ọma 10:2-6; 49:18; Ilu 3:7; 13:15; 21:4; Ndi Rom 8:5-8; 12:16; I Jọn 2:16; I Ndi Kọrint 8:2; Ndi Galetia 6:3

3. Omume pụtara ìhè nke ndị ná-emebiiwu na-adị anya n’ebe eziomume dị, Abù Ọma 10:7-11; 37:1, 2, 9, 12-15, 17, 21, 32, 35, 36; Ndi Rom 1:18-32; Ilu 6:12-19

4. Mmeso Chineke na-emeso ndị na-enupuisi ka egosipụtara n’ekpere nke Devid, Abù Ọma 10:12-18; Nkpughe 6:10; Job 10:4; Eklisiastis 8:10; Jeremaia 2:22; 17:9, 10; Emos 5:12: Ndi Rom 6:23; 2 Pita 3:9

II Omume Ọjọọ Zuru Ụwa na Olileanya Alaeze nke Ndị Israel

1. Òzízí nke ekwenyeghị na Chineke dị ná ndị ahụ ná-ekweghị na Chineke dị ka Chineke rịbaraàmà nkeọma, Abù Ọma 14:1; 10:4; 36:1; Jeremaia 5:12-14

2. Chineke anyị bụ Onye obiebere, ebe Ọ na-achọ ka azọpụta onye ọ bụla ná-ahụta na ha na-abànye n’ụzọ niile nke ajọomume kama ịgazi-agazi, Abù Ọma 14:1-3; Ndi Rom 1:21-32; 3:10-12, 23; Jenesis 6:5; 18:23-26; 2 Ihe Emere 16:9; Aisaia 1:6; 59:1-8; 64:6

3. Ewegawo ụfọdụ mmadụ n’ikpé, ná-akpọ kwa ha ndị-ọlụ nke mmebiiwu, Abù Ọma 14:4-6; 119:86; 143:3; Matiu 10:17; Luk 21:12-18; Jọn 16:2

4. N’ebe a ka egosipụtara nrọpụta na obiebere nke Chineke ebighịebi bụ Onye ná-adịghị ele mmadụ anya n’iru, Abù Ọma 14:4-6; Ọlu Ndi-ozi 10:34, 35

5. Ekwuru okwu dị ebube banyere ndaghachị azụ nke ndị Israel n’ọgbụgbandụ ahụ na ọñụ ha ga-enwe n’Ọchịchị Otù Puku arọ ahụ nke ná-abịa, Abù Ọma 14:7; Ọpupu 19:5, 6; Deuteronomi 4:7-13, 23; 5:2, 3; Ndi Hibru 8:6-13; Jeremaia 31:31-34; 32:37-42; Ndi Rom 4:9-16; 11:15

III Enweghị Olileanya nke Onyemmehie nime Chineke

1. Omume na ụzọ ndị ná-emebiiwu na-egosi na ha enweghị olileanya n’ebe Chineke nọ, Abù Ọma 36:1-4; Ilu 12:15; 20:6; 30:12; 2 Ndi Kọrint 10:12

2. Ndị ahụ ná-atụkwasị Chineke obi na-erite urù site n’ebere Ya, ikwesị ntụkwasịobi Ya, eziomume Ya, ikpé Ya niile, na ịhụn’anya Ya, Abù Ọma 36:5-9; 63:3; 103:17; 108:4; Abù Akwa 3:22, 23; Aisaia 63:7

3. Ekpere nke onye eziomume na-ekwupụta ọchịchọ nke Chineke banyere onye eziomume, Abù Ọma 36:10-12; Ndi Rom 4:21; 2 Pita 1:4.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Okwu nke Onyenwe anyị na Mmeso Ya n’ebe Mmehie nọ

Amaara Devid, eze Israel, dịka Onyeamụma nime Akwụkwọnsọ. Anyị matakwara na nke a bụ eziokwu n’ihi na ihe-odide ya niile wepụtara ọtụtụ eziokwu nke Oziọma na ozi dị icheiche nke sitere n’aka Chineke nke Eluigwe banyere àtụmààtụ Ya nye mmadụ niile. Nime Abù Ọma atọ ndịa nke anyị na-amụ ihe banyere ha ugbu a anyị ga-ahụ ọlụ nke Mmụọ Nsọ pụtara ìhè dịka O si due onye nke Chineke a ide ihe banyere eziokwu ebighịebi bụ nke Chineke ga-achọ ka anyị nweta. N’ozi ndịa niile anyị hụrụ ebere, ikwesị ntụkwasịobi, na obi ịhụn’anya, na kwa eziomume nke ikpé niile nke Chineke ebighịebi Onye “Ọ digh uzọ ọ bula Ọ gāgu ndi ikpe mara na ha bu ndi ikpé nāmagh” (Nehum 1:3).

N’ebe a, nime Abù Ọma ndịa, anyị hụrụ mmeso Chineke n’ebe mmehie na onyemmehie nọ. N’ebe a, anyị hụrụ na ọ dịghị ihe jikọrọ eziomume na omume ọjọọ. N’ebe a, anyị hụrụ na enwere náánị ụzọ abụọ, ụzọ nke ndụ na ụzọ nke ọnwụ. Ụmụmmadụ pụrụ ịtụfu oge nime mmehie, ma ụzọ niile nke Chineke ziriezi. Ụmụmmadụ nwere ike inye mmehie ohere nwee kwa ihe-ngọpụ dị icheiche n’ebe mmebiiwu dị, ma Chineke na-akpọ ya ihe ọ bụ n’ezie ná-enye kwa onye ahụ nke ná-edebe ya nime obi ya ahụhụ.

E nwere ọtụtụ mmehie, dịka nghọta na nkọwa nke mmadụ si dị. E nwere ahụhụ dị icheiche ana-enye, n’usoro niile nke ikpé anyị, nye mmehie na ajọomume n’ụdị ha dị icheiche n’ụwa a. Ma n’ebe Chineke nọ, ọbụná mmehie nke dịkarịsịrị ntà na-eweta nkewapụ n’òzùzùòkè ya site ná mmekọrịta na urù niile nke ọgbụgbandụ Ya. Ebe ọ rọrọworo ụzọ nke onye ná-emebiiwu, ọ dịghị kwa ihe ọzọ fọdụrụ onye ahụ nke ná-ehie ụzọ ime ma-ọbụghị ịnabata ihe niile nke ụzọ ahụ na-alụpụta náánị ma ọ gbabara n’Ebere nke Ọbara ahụ awụsịrị wee rịọ maka mgbaghara nke mmehie ya niile. N’ihi nke a, Chineke adịghị ahazi mmehie, dịka mmadụ si eme, ebe ọ na-eche na ahụhụ ebighịebi ụfọdụ ka aga-enye mmadụ n’ihi ụfọdụ mmehie karịrị ibe ha, na ikpé nke ná-adịghị adịru ebighịebi n’ihi mmehie ndị dị ntà karị. Chineke na-ele anya ná mmehie ahụ nke dị n’obi ná-ahụzu kwa ihe ọ bụ n’ezie, ná-ekpe kwa ikpé Ya niile n’ụzọ kwesịrị ekwesị.

Mmalite Mmehie nke Mmadụ

A gwara anyị na setan siri n’Eluigwe daa mgbe o buliri onwe-ya elu chọọ kwa ka o were ọnọdụ nke Onye ahụ Kachasị ihe niile Elu. Setan jiri mpako nwaa mmadụ ọnwụnwa, mmadụ ahụ wee daa. Ya mere, mpako bụ ihe wetara ọdịda nke mmadụ. Ọ bụ mmalite mmehie ndị ọzọ nke mmadụ na-eme. Ọ bụghị náánị ekwensu ka ọ dịrị, n’ihi na anyị na-ahụ na ọ dị kwa taa nime ndị ahụ nke ná-enwebeghị mgbanwe nke obi. Ọ bụ ihe ná-enye ndị ahụ nke ná-asọpụrụ Chineke nsogbu mgbe niile, ụzọ a nke esi anwa mmadụ ọnwụnwa bụ nke ná-esikarịrị ọtụtụ mmadụ ike imeri ya. Ebe ọ bụ mmehie, Chineke kpọrọ ya asị! (Ilu 6:16-19).

Anyị ga-ahụ n’iheodide ndịa nke Devid, ihe mmehie ndịa dị óké egwù na-alụpụta n’obi mpako ahụ nke ná-enweghị ike ijide onwe ya. Onye mpako na-akpagbu ụmụ-mgbei, ná-anya kwa isi n’ihe obi ya na-achọsi ike. Ọ na-agọzi onye anya-ukwu ná-asị kwa nime obi ya na ihe niile zuuru ya òkè, na ọ dịghị kwa onye pụrụ iguzogide ya. Ọ bụrụ na arapụ ya ịga n’ụzọ nke aka ya, n’ezie ọ ga-agọnarị Chineke nke Eluigwe, mgbe ahụ, nime mpako na nganga ya, ọ ga-asị na ya onwe ya -- mmadụ efu -- na agaghị ewezuga ya n’ọnọdụ ya maọbụ kwatue ya. N’ikpeazụ, ọ bụrụ na o nye onwe-ya ohere ikwere na Chineke dị, ọ ga-agọnarị na Chineke ahụ nwere mmasị n’ebe ụmụmmadụ nọ maọbụkwanụ na Ọ pụrụ igosi onwe-Ya ma ọ bụrụ na O nwere mmasị. Nke ahụ bụ ihe nlụpụta egwù dị icheiche nke mpako ana-egbochighị egbochi na-alụpụta.

Ma Onyeamụma nke Chineke agawo n’iru n’okwu a wee gosi na mkpụrụ nke mmehie a na-adị n’obi niile nke ana-agbanwebeghị (maọbụ nke ána-amụbeghị ọzọ), n’ihi na mmadụ niile ndị nọ n’ezi site n’ogige (maọbụ èzínaụlọ) nke Chineke bụ ndị rụrụ arụ n’ezie bụrụ kwa ndị gamiworo nime ụzọ niile nke mmehie na ndahie. O kwuwo na Chineke nke obiebere esiwo n’Eluigwe lekwasị ụwa nke ndị mmehie anya wee hụ kwa na ndị mmehie ahụ niile esiwo n’ezi ụzọ wezuga onwe ha wee jehie baa n’ụzọ niile nke ha rọpụtaara onwe ha. O kwukwara na ha niile eruwo unyi. Ọ na-ekwusi kwa ike na ọ dịghị onye ná-eme ezi ihe ma ọ bụghị ma ha chigharịrị site n’ụzọ ọjọọ ha niile e wee gbaghara ha, gụọ ha ná ndị eziomume, mụ kwa ha ọzọ, wee nabata kwa ha n’èzínaụlọ nke Chineke.

Abù Ọma ndịa na-egosi anyị na onyemmehie nke Mmụọ Nsọ na-emetụghị aka n’obi mgbe Ọ na-abịa ime ka ụmụ mmadụ mara mkpà ọ dị na ha ga-achọ iru Chineke, enweghị egwù Chineke. Kama nke a, onyemmehie ahụ, na-ákwá onwe-ya emò site n’okwu ireụtọ dị iche iche. Ọ dịghị ihe ọ bụla dị mma n’ezie ná ndụ onye dị otú a. O jupụtara n’ajọomume na aghụghọ ma bụrụ kwa onye rapụworo ime ezi ihe. Ọ na-ekwu na “Ọ digh Chineke ọ bula di.” Ọ na-akpachapụ nnọọ anya chepụta mmehie ya niile wee na-eme kwa ha dịka nzube ya si dị. Ọ na-ekwu na Chineke agaghị ama ya ikpé n’ihi mmehie ya, na-ekwu kwa na Chineke echezọwo ile ya anya, na Ọ gaghị kwa ahụ omimi nke mmehie ya maọbụ nye ya ahụhụ n’ihi ya.

Nke a bụ ihe ana-ahụ ná ndụ nke nwoke ahụ daworo ada, onye mmehie dubaworo n’omumeọjọọ, onye na-agbaso ọchịchọ niile nke onwe ya na ihe niile nke obi ya na-achọsi ike. Site ná nnupuisi ọ kpọwo ihe niile dị mma asị, n’otù aka ahụ, ọ ghọwo kwa onye nnupuisi megide Onye ahụ na-enye ezi ihe niile. N’ezie, ọ dịghị ihe-ngọpụ ziriezi ga-adị n’obi onye ọ bụla nke ga-asị na ikpé ziriezi na nke eziomume Chineke ekwesịghị ka enye ya ndị ahụ niile bụ ndị ná-enupụrụ Ya isi ná-aga kwa n’ụzọ nke onwe ha kama ime eziihe.

Chineke nke Eluigwe, Onye Obiebere

Ma anyị na-agụ na Chineke ahụwo mmehie a. Anyị nwere nkasịobi n’owuwe anya na Chineke ga-abụ onye inyeaka nke ndị niile na-atụkwasị Ya obi, na aga-enye ndị na-emebiiwu ahụhụ, ma n’ikpeazụ, Ọ ga-ewere ike na ịchịisi niile bụ nke kwesịịrị Ya n’ezie. Mmụọ Nsọ enyewo anyị ihe anyị ga-eji kwere, nime Abù Ọma atọ ndịa na Chineke anụwọ ọchịchọ obi nke ndị Ya, na Ọ ga-edozi obi ha, na ndị ana-azọpịa azọpịa ka ọ ga-anapụta n’agbụ na ike ndị mkpagbu.

Ihe mkwagide dị n’okwu nnapụta a bụ na Chineke bụ Eze nke ihe niile ekèrè èkè, na otù ụbọchị Ọ ga-abịa iwukwasị Alaeze Ya na ịchị ndịisi niile nke ụwa nke a. N’ebe a egosịrị anyị ọzọ ná nkenke ebube nke Alaeze ahụ, ebe eziomume na ikpé ziriezi ga-abụ ụkpụrụ nke ọchịchị na obe ndị nke Chineke ga-esoro Kraist ha na Onyenwe ha chịa eze. Mmụọ Nsọ mere ka anyị mara na aga-edoghachị ndị Israel n’ọnọdụ ha n’oge ahụ, na àtụmààtụ nke ọgbụgbandụ nke Chineke ga-apụta ìhè n’uju ya n’eluụwa.

Óké ọñụ na obiụtọ ga-adị n’eluụwa n’ụbọchị ahụ nke ọchịchị eziomume ga-adị. Ngọzi niile nke Chineke ga-apụta ìhè n’uju ya n’oge ahụ karịa ka ọ dị taa. Náánị ntụgharị uche n’ebube ndịa emewo ka Onye dere Abù Ọma -- ma kwesị kwa ime ka anyị onwe anyị -- tiwaa mkpu nke otuto mbulielu nye Chineke nke Eluigwe Onye náánị Ya nwere ike na ịma mma zuruòkè ime óké ihe-ebube dị otú a.

Lee ihe dị iche nke pụtara ìhè mgbe eji échìchè ọjọọ niile na nchepụta ọjọọ niile nke onye ná-emebiiwu, na nke setan onye obi ọjọọ ahụ nke bụ kwa onyeisi ha, tụnyere eziomume na ịdịmma nke ná-enweghị nsọtụ nke Chineke nke ụwa niile! Ebere Chineke enweghị ọgwụgwụ! Ikwesị ntụkwasịobi Ya ruru eluigwe niile! Eziomume Chineke dị ka óké ugwu! Ikpé Ya niile dị kwa óké omimi! N’ebe a, Mmụọ Nsọ ji ihe dịkarịsịrị ukwuu, na ihe dịkarịsịrị elu, ihe dịkarịsịrị omimi, na nke ná-akpali egwù na nsọpụrụ nke mmadụ maara iji kuziere anyị ịdịelu dị ukwuu nke ike na ozuzuòkè Chineke nke ná-enweghị ọgwụgwụ. Ọ bụ nke a mere o ji sị na anyị pụrụ ịhụ ihe Chineke nke anya ná-ahụghị, ọbụna ike ebighịebi Ya, site n’ihe ndị anyị na-ahụ -- ọlụ niile nke Aka Ya (Ndi Rom 1:20).

“Kelenu JEHOVA: n’ihi na Ọ di nma: n’ihi na rue mgbe ebigh-ebi ka ebere-Ya di.”

“Onye chetara ayi n’ọnọdu-ayi di ala: n’ihi na rue mgbe ebigh-ebi ka ebere-Ya di.”

“O we naputa ayi n’aka ndi nākpagbu ayi: n’ihi na rue mgbe ebigh-ebi ka ebere Ya di.”

“Kelenu Chineke nke elu-igwe: n’ihi na rue mgbe ebigh-ebi ka ebere-Ya di” (Abù Ọma 136:1, 23, 24, 26).

Questions
AJỤJỤ DỊICHEICHE
  1. Mgbe agụsịrị amaokwu niile nke edepụtara n’iheọmụmụ a, nke metụtara inye anyị ahụhụ site n’aka Chineke, gịnị ka ị ga-ekwu na ọ bụ ihe kpatara inye ahụhụ ndịa?
  2. Ànyị na-aghọta ihe kpatara Chineke ji ná-enye ahụhụ ma ná-anụcha kwa anyị n’oge ọnwụnwa ahụ? Ọ bụrụ na ọ dịghị otú a, gịnị kpatara ya?
  3. Gịnị bụ mmehie mbụ nke mmadụ?
  4. Gịnị ka onye ná-ekweghị na Chineke na-ekwu banyere Chineke anyị?
  5. Gịnị ka Chineke kpọrọ onye ná-ekweghị na Chineke?
  6. Kwue ihe dị iche ná nkọwa nke enyere banyere ndị ná-asọpụrụ Chineke dịka egosịrị ya ná ngọzi niile ahụ nke edere ihe banyere ya (Matiu 5:3-12), na nkọwa nke enyere banyere ndị ná-emebiiwu n’ebe ọgụgụ nke iheọmụmụ anyị?
  7. Chineke Ò chezọwo ụwa? Ọ dịghị ama ihe banyere mmehie nke ụmụmmadụ dara ada? Kpọọ otù amaokwu iji kwagide ọzịzá gị.
  8. Gịnị bụ olileanya nke ndị ná-asọpụrụ Chineke dịka egosipụtara ya n’ebe ọgụgụ nke iheọmụmụ anyị?
  9. N’elu gịnị ka olileanya a dabere?
  10. Gịnị bụ amụma ukwuu ahụ nke eburu banyere Israel nke egosipụtara n’iheọmụmụ anyị?