2 Samuel 15:1-17; 16:5-14; 18:1-33; 19:16-23;Abù Ọma 3:1-8

Lesson 241 - Senior

Memory Verse
“Ma Gi onwe-Gi, JEHOVA, bu ọta gburugburum, na nsọpurum, na Onye nēbuli isim elu” (Abù Ọma 3:3).
Cross References

I Aghụghọ nke Absalom n’Irita Ndị ahụ n’Urù

1. Ọ bụ nwaeze mara mma n’ileanya, 2 Samuel 14:24, 26

2. Omume ya jupụtara n’ịchọ iheefu na ọchịchọ dị elu, 2 Samuel 15:1-4

3. Ọ bụ onye aghụghọ na onye gbagọrọ agbagọ n’omume ya, 2 Samuel 15:5, 6

II Nzube Absalom Inweta Ocheeze ahụ

1. O ji aghụghọ jee Hebron, 2 Samuel 15:7-9

2. Nzube ya jezuru Israel niile, 2 Samuel 15:10-12

III Ọsọ Mwedan’ala Devid gbara site na Jerusalem

1. Devid na-arapụ Jerusalem, 2 Samuel 15:13-17

2. Shimai na-akọcha Devid, 2 Samuel 16:5-14

IV Mmeri Devid nwere na Ọnwụ Absalom

1. Devid na-ejikere ndị-agha ya ma ná-arịọ kwa arịrịọ n’ihi Absalom, 2 Samuel 18:1-5

2. Absalom dabara n’ihe-mberede dị óké egwù e wee merie ya n’agha ahụ, 2 Samuel 18:16-18

3. Devid ruuru Absalom uju mgbe ọ nụrụ akụkọ mmeri ahụ, 2 Samuel 18:19-33

4. Devid gosiri Shimai obiebere mgbe ọ lọtara, 2 Samuel 19:16-23

5. Devid tụkwasịrị Chineke obi, Abù Ọma 3:1-8

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nwaeze Maramma

“Ma n’Israel nile ọ digh nwoke mara nma dika Absalom anēto nke-uku: site n’ọbu-ukwu-ya we rue opu-n’isi-ya ọlu adigh n’aru-ya” (2 Samuel 14:25). Ma nwanne Absalom nke maara ihe sịrị na “nma bu ihe-efu.”

Ụmụmmadụ nwere ike ịdahie site n’ile mmadụ anya n’iru, dịka obi ndị Israel dị n’ebe Absalom nọ, ma “JEHOVA nēle obi” (I Samuel 16:7). Nime ịmamma na nganga nke nwaeze ahụ, onye ná-anya ụgbọala nke achọrọ mma n’ụzọ n’etiti ìgwè mamdụ na-aga mgbe iri mmadụ ise na-eje n’iru ya ná-edozi kwa ụzọ, Chineke hụrụ óké mpako. N’ekele ire-ụtọ nke iruabụọ ka nsutuọnụ Judas bụ. “Ònye gēdom onye-ikpé n’ala nka” bụ okwu niile nke onye ndọrọndọrọọchịchị obodo a na-achọ ọkwa, ikwe-n’aka, onye ná-ezuru mkwagide nke ndị obodo n’ori.

Aghụghọ

Site n’obi aghụghọ na ijé dịka aga-asị na ọ na-eje ịkwụghachị Chineke mkwà o kwere, nwaeze nke a ná-enweghị ùgwù wee jee Hebron ịnapụ alaeze n’aka nna-ya bụ Devid onye Chineke rọpụtara ma tee kwa mmanụ. Lee ka o si dị mfé ịghọgbu ndị Israel! “Unu yiri ílì eteworo nzu” ka Jisọs gwara ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nke ụbọchị Ya: “nke nēgosi onwe-ha dika ihe ọma n’ìhè, ma nime ha juputara n’ọkpukpu nke ndi nwuru anwu, na adigh ọcha nile.” Nke a bụ nnọọ ọnọdụ nwaokoro a onye gburu nwanne ya nwoke, wee ná-achọ kwa igbu nna ya. Lee, ihe-efu ka ịmamma nke elu arụ bụ mgbe anyị bịara iguzo n’iru Chineke Onye kachasị ihe niile elu! “Abum ọgaranya, emewo ka m’buru ọgaranya, ọ digh kwa ihe ọ bula nākpam,” ka ha kwuru otù oge bụ ndị Chineke mara ikpé “onye ahu nāhuju anya na onye kwesiri ebere na onye dara ogbenye na onye kpuru ìsì na onye nāgba ọtọ.”

N’ịgba n’okporoụzọ n’ụgbọala dị óké ọnụahịa na iyikwasị uwe dị óké ọnụahịa, ka onyemmehie nwere ike iche na ya na-eme nkeọma ma náánị n’ikpeazụ ka ọ na-aghọta na ndụ o biworo abaghị urù ọ bụla maọbụghị ịlan’iyi ebighịebi. Otù nwoke “nēyi kwa uwe ododo na ezi akwa ọcha” tetara otù ụbọchị wee hụ onwe ya ná mmekpaarụ n’ọkụ-ala-mmụọ. Lee, nzuzu nke ịchọ ihe nke ụwa nke a wee lefuru mkpụrụobi anya!

Ịgbáọsọ nke Devid

Site n’okwu ireụtọ na otuto efu, Absalom wee zuru obi ndịkom Israel n’ori. Ná agbaghịagụgọ, nime ọtụtụ arọ ka obi aghụghọ ya na-atụgharị uche ụzọ ọ ga-esi rara nna ya nye. Devid aghọtaghị, ọ hụghị kwa ihe niile nwa ya dị mpako na-eme. Lee ihe dị iche n’etiti Absalom na Devid! N’etiti óké oluopiike nke emume ahụ na Hebron, Absalom mere onwe-ya eze. “Ma Devid nārigo ná nrigo ugwu Olive, nārigo nākwa ákwá; ekpuchi-kwa-ra isi ya, ya onwe-ya nēje kwa gbara ukwu efu: ndi nile ndi soro ya je kpuchi-kwa-ra nwoke ọ bula isi-ya, ha we rigo, nārigo nākwa ákwá” (2 Samuel 15:30).

Ndịnchụàjà na ndị Livai na-ebu Igbe Ọgbụgbandụ Chineke pụtara wee náejeso Devid na ndị òtù ya, ma Devid sịrị “Bughachi igbe Chineke n’obodo; ọ buru na ahutam amara n’iru JEHOVA, Ọ gēweghachim, me ka m’hu Ya na ebe-obibi-Ya: ma ọ buru na Ọ si otú a, Ihe-gi atọghm utọ; lem, Ya mem otú ọ di nma n’anya-Ya” (2 Samuel 15:25, 26). Nime ọnọdụ a Devid na-échè na Onyenwe anyị na-enye ya ahụhụ n’ihi mmehie o mere n’oge garaaga. Mgbe Netan Onyeamụma wetaara Devid ozi nke Onyenwe anyị, okwu ahụ bụ “Le, M’nēme ka ihe ọjọ si n’ulo-gi bilie imegide I” (2 Samuel 12:11). N’obi umeala na ná-enweghị ntamù, Devid naara ahụhụ a dịka ihe si n’aka Chineke. Ọ bụ mmadụ olenaole dị ka Devid -- jikeere ịnagide ịbámbá!

Omume Ihere nke Shimai

Dịka agaasị na iruuju n’ihi ntufu alaeze na nwa-ya ọ hụrụ n’anya ịrara ya nye ezughị, Shimai, nke ụlọ Sọl kọchara Devid ma tụọ kwa ha nkume. Ndị dike ahụ ndị ha na Devid so jikeere ime ka nkọcha ya kwụsị, ma Devid gbochiri ha site n’okwu a “Mgbe JEHOVA siwo-kwa-ra ya, kọcha Devid, ònye gāsi kwa, Gini mere I meworo otú a?” O wee kwue kwa sị “Le nwam, nke siri n’afọm puta, nāchọ ndum: onye Benjamin nka, ọ gēsi kwa aña ghara ichọkari ya ugbu a? ka ọ nọduru onwe-ya, ka ọ kọcha kwa; n’ihi na JEHOVA siworo ya, kọcha. Elegh-anya JEHOVA gēlekwasi nwedam anya, JEHOVA gēnyeghachikwam ezi ihe n’ọnọdu nkọcha-ya ta” (2 Samuel 16:10-12).

Mwedan’ala dị otú a nke Devid, ọ kwagideghị okwu ahụ Pita kwuru sị “N’ihi na nka bu ihe-ekele ma ọ buru na onye ọ bula nātachi obi n’ihe-nwuta di iche iche n’ihi akọ-na-uche n’ebe Chineke nọ, nāhu ahuhu nke nēzigh ezi. N’ihi na àha otuto gini di ya, ma ọ buru na, mgbe unu nēmehie, mgbe eti kwa unu aka, unu atachi obi na ya? Ma ọ buru na, mgbe unu nēme ezi ihe, hu kwa ahuhu unu atachi obi na ya, nka bu ihe-ekele n’ebe Chineke nọ” (I Pita 2:19, 20).

Ọnwụ nke Absalom

Mgbe ha jeworo njèm karịrị iri maịlị isii site na Jerusalem, Devid wee doo ndị-agha ya usu atọ, o dokwara ndịisi usu puku ndịagha ilekọta ha, nke ná-egosi na óké usu ndịagha soro Devid gbapụ na Jerusalem. Iri puku mmadụ abụọ dabara n’aka ndị-orù Devid n’ụbọchị ahụ, ma onye nnupuisi ahụ bụ Absalom zutere ihe ọ na-eleghịanya ya. “Absalom nānọkwasi n’inyinya mule-ya, inyinya mule ahu we ba n’okpuru alaka tuhiri atuhi nke óké osisi terebinth ahu, isi-ya we kogide n’osisi terebinth ahu, ewe do ya n’etiti elu igwe na ala; ma inyinya-mule ahu nke di n’okpuru gabigara.” Ana-ekwu sị na ihe nke ụwa a dịka ịnyịnya mule nke Absalom, na-agbanarị ma rapụ kwa anyị mgbe anyị na-achọsị ha ike.

Iruujú Devid

Óké ịhụn’anya nke Devid nwere n’ebe nwa ya nwoke na-enupuisi nọ pụtara ìhè n’okwu o kwuru ka ọ nụrụ maka ọnwụ Absalom: “Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ nma ma asi na mu onwem anwuwo n’ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!” (2 Samuel 18:33).

Shimai Naéchègharị

Mgbe usu ndịagha Devid ndị meriworo na-alaghachị na Jerusalem, onye mbụ ha ga-ezute bụ Shimai, nwoke ahụ onye kọchara eze nke ukwuu. Ọ dara n’ala n’iru Devid n’iweda onwe ya n’ala ná nchègharị. Ná-agbanyeghị na Abishai otù nime ndịọchịagha nke Devid tiri mkpu iwe ziriezi ka ewepụ ndụ Shimai, ma eze chigharịrị sị Shimai, “I gagh-anwu.”

Échètaworo anyị banyere ebere nke Chineke nye ndị ahụ mehiere megide Ya ụbọchị ha niile rue mgbe mkpà mere ka ha tikue aha Ya, wee nụ ka Ọ na-asị “I gagh-anwu.” Chee échìchè banyere nnukwu ịhụn’anya nke Jisọs, Onye, mgbe ana-akpọgide Ya n’elu obe, tiri mkpu sị, “Nna, gbaghara ha; n’ihi na ha amatagh ihe ha nēme” (Luk 23:24). Ọ bụ ezie na obi ebere nke Devid dị ukwuu ma agaghị eji ya tụnyere nke Ọkpara Chineke, Onye nwụrụ n’ihi ndịiro Ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ ụfọdụ ihe ná-ekwesịghị ekwesị dị n’omume Absalom?
  2. Òlee ụzọ Absalom si gosi ọchịchọ ọjọọ ya?
  3. Òlee otú o si ghọọ aghụghọ?
  4. Ị na-echè na mgbapụ Devid site na Jerusalem dị mkpà?
  5. Ònye bụ Shimai?
  6. Ò ziriezi ka o kwue na ọbara ụlọ Sọl dị n’isi Devid?
  7. Abishai na Devid, hà si n’otù agbụrụ?
  8. Ị pụrụ ịhụ aka Chineke n’ọnwụ Absalom?
  9. Gịnị bụ ihe ná-egosi ọnụọgụgụ ìgwè mmadụ ndị soro Devid?
  10. Òlee ihe ndị arụtụrụ aka n’iheọmụmụ nke a ná-egosi na Devid bụ nwoke dị ka obi Chineke na-achọ?