2 Samuel 19:9-15

Lesson 242 - Senior

Memory Verse
“N’uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n’iru Chineke náni otù mgbe iburu nmehie nile nke ọtutu madu. Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ugbò abua, ma mmehie adigh ya, ka ewe zọputa ha” (Ndi Hibru 9:28).
Cross References

I Ajụjụ nke Eze Jụrụ

1. Israel sere okwu n’ihi na agbalịghị ịkpọghachite eze site n’ọsọ ndụ, 2 Samuel 19:9, 10; Ndi-ikpe 18:9

2. Ndịokenye nke Juda ka ajụrụ ajụjụ banyere enweghị mmetụta n’obi ha nye nlata nke Devid, 2 Samuel 19:11; 2 Ndi Tesalọnaika 3:8, 9

3. Eze Devid chètaara ụmụnne ya n’anụarụ na arụ na ọkpụkpụ ya ka ha bụ, 2 Samuel 19:12; 5:1; Ndi Ikpe 9:2

4. Nzukọ ahụ nke nwere mkwuwa okwu, site n’ikwupụta Kraist ha, Eze ha nke ha ná-adịghị ahụ anya, ná-ekwenye ijéozi na irubere Ya isi, 2 Samuel 19:12; Ndi Efesọs 5:30

5. Ndị Israel bụ ụmụnne Devid site n’agbụrụ náánị, ma onye nke Kraist bụ nwanna nime ọbara nye Eze ya, 2 Samuel 19:13; Jọn 1:12; Ndi Rom 8:16, 17; Ndi Galetia 4:7; Ndi Efesọs 2:19

6. Ndịokenye nke Juda jikọrọ onwe ha, e wee mee ka Devid lata n’ocheeze-ya, 2 Samuel 19:13-15

7. Ndị Kraist nwere ọlụ ịlụ ọgụ nime ibuagha megide iheọjọọ a ka Eze ha wee lata ngwangwa n’ocheeze Ya, Ọnu-ọgugu 32:6; Ndi Ikpe 5:23; Jeremaia 48:10

8. Ndị ụmụnna nke Kraist ganaele anya ma ná-enwe kwa mmasị banyere nlata nke Eze ha, Ọlu Ndi-ozi 1:11; Matiu 25:6; Luk 13:24, 25

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Ịbámbá n’Oge Kwesịrị

Isiokwu nke iheọmụmụ anyị metụtara ihe ahụ mere ná nlata nke Devid ịbànye kwa n’ocheeze ahụ emere ka ọ rapụ n’ike n’ihi nnupuisi nke Absalom. Ihe ka mma emewo, site n’amara Chineke, emeriwo kwa ndịiro nke Devid ọzọ; ma ọ dịghị ihe ndị ahụ mere banyere iweghachị eze ha n’ọnọdụ kwesịrị ya. N’ikpe-azụ Devid nwere mmasị ijụ ndịokenye nke Israel ihe mere na ọ dịghị ihe ha na-eme iji weghachị eze ha.

Ndịokenye nke agbụrụ ahụ ga-abụworị ndị mbụ ịmalite usoro iji weghachị Devid n’ocheeze ya. Nganga nke agbụrụ ha na ịhụn’anya ha nye Devid kwesịrị ime ka ha chọọ ịhụ ya ka ọ na-achị Israel. Otú ọ dị, eziokwu dị nime okwu ahụ na-egosi na ọ dịghị ihe ha na-eme bụ nke elere anya n’aka ha.

Devid jụrụ ajụjụ banyere enweghị mmetụ n’obi ha nye ọnọdụ ya. Ọ bụ ihe metukarịrị ma dịkwara onye ọ bụla nime ha. “Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n’ihi gini kwa ka unu bu ndi ikpe-azu ime ka eze lata?”

Enweghị Mmetuta na Nlefuruanya

Ihe mere ka anyị nwee mmasị n’isiokwu iheọmụmụ anyị nke ụbọchị ndịa bụ ezi mmetụta dị n’etiti enweghị mmasị nke ụmụnne Devid maka iweghachị ya dịka eze, na ụdị enweghị mmasị ahụ nke nzukọ Kraist n’ụbọchị taa n’ịkpọlata Onyenwe ha na Eze ha bụ Jisọs Kraist.

Ndị ọjọọ ahụ niile guzogideworo ọchịchị Ya ogologo oge ndịa egbochiwo Eze ukwuu anyị náánị nwaoge iwere ọchịchị kwesịrị Ya. Ọ gara ibinyere Nna Ya n’Eluigwe, ma ihe dị ka puku arọ abụọ abịawo ma gwụsịa ma Ọ laghachibeghị. Ajụjụ ahụ bụ nnọọ nke oge a na ihe metutara ndị ọgbọ a ndị na-akpọ aha nke Kraist, “n’ihi gini kwa ka unu bu ndi ikpe-azu ime ka eze lata?” Ndịa, n’ezie, ndị kwesịrị ịbụ ndị ọ na-anụkarị ọkụ n’obi ma dị kwa njikere maka nlata nke Eze ha n’oge ná-adịghị anya egosiwo onwe ha ndị ná-alakarị oge n’iyi banyere okwu ahụ.

Ọ bụghị ihe ná-adịghị eme mgbe niile na ndị ná-ekweghị n’Oziọma, na ndị ná-ekweghị na Chineke dị, na ndị ná-amaghị ihe adịghị eme ihe ọ bụla banyere nlata nke Onyenwe anyị n’ọchịchị ahụ kwesịrị Ya. Ọ bụ óké enweghị mmetụta ọjọọ ahụ nke ndị ahụ na-akpọ onwe ha ndị náesoụzọ Eze ahụ bụ ihe ahụ nke dị ịtụn’anya. Mmasị ntakịrị ha nye ọnọdụ nke Alaeze Ya n’ụwa nke a bụ ihe ịsọoyi nke ukwuu. Baịbụl na-akọwa ihe mere na ha enweghị mmetụta n’obi, na-ekwu kwa ihe ga-eme ndị ahụ nke ná-egosi na ha bụ ndị okpukpé ukwuu ma ọ dịghị ihe ha na-eme iweghachị Eze ahụ n’ocheeze Ya.

Okpukpé Efu

Nime ndị niile bi n’ụwa, ọtụtụ mmadụ na-eche na ndị Ju, ndị Chineke rọpụtara, bụ ndị kachasị ịnụọkụn’obi ná-enyebiga kwa onwe ha ókè banyere Chineke na okwu nke ọbịbịa Eze ha. Okpukpé nke ndị Ju n’ụbọchị taa na-eme óké mkpọtụ n’ile-anya nlata nke Eze ha n’otù ntabìanya. Ememe nke oriri Ngabiga n’onwe-ya, ná-ekwughị ihe ọ bụla banyere oche ahụ ghere oghe (mmadụ ná-anọghị ya) nke ana-arapụ n’èzínaụlọ ọ bụla nke onye-Ju ná-anụ ọkụ n’obi n’oge ahụ nime ntụkwasịobi na Onye ahụ ana-ele anya ya ga-abịa ebe ahụ iwere ọnọdụ Ya, bụ nnọọ otù akụkụ nke ọtụtụ ememe okpukpé ezi ndị Ju nke ụbọchị taa nke ha na-agbasosi kwa ike dịka ụda obi ha si akụ. Ma okpukpé ha, mgbe eleziri ya anya site n’Okwu nke Chineke, na-egosipụta ezughị òkè na kwa ụgha. O zighị ezi n’anya Chineke.

Kama ịnabata Eze ha mgbe Ọ bịara, ha kpagburu Ya ná-emeghị ebere, kpọgbue Ya n’obe nime nnupuisi ha, ma lelịa Chineke site n’okwu ọnụ ha, “Ayi achọgh ka nwoke a buru eze-ayi” (Luk 19:14). Ụdị ikpé dị icheiche dịka nke ahụ dakwasịworo ndị Ju kemgbe ahụ enweghị atụ. Rue n’ụbọchị nke taa ndị Ju na-eru uju n’ihi óké mkpagbu ha ma ná-aga kwa n’iru n’ịkwa ákwá ha nye Chineke ka O zite Mesaia. Ná agbanyeghị ọtụtụ mkpagbu ha, ha onwe ha, dịka otù mba, ka na-aga kwa n’iru n’ịjụ ịnabata Kraist dịka ezi Mesaia na Eze ha.

“Mgbidi nke ikwa akwa” ahụ nke ndị Ju mba Palestine na-eje ná-akwa ákwá ná-ekpesa kwa mkpesa ha nye Chineke bụ nke amaara nkeọma n’ebe niile na nke ana-ekwu kwa ọtụtụ ihe banyere Ya. Mgbidi a bụrị otù akụkụ nke Ụlọukwuu nke Solomon na mbụ ma bụrụ náánị ya ka ha ka na-ejide nime ebube niile ahụ o nwere na mbụ; ma ọ bụ kwa n’ebe a ka ha na-akwá ákwá ná-eti kwa aka n’obi maka nlata nke Eze ha Onye nke bịaworo ma laa kwa. Ọ baghị urù ikwu na mmadụ ndịa apụghị inwe mmeri n’iweghachị Eze ha ma ọ bụrụ na ha anọgidesie ike n’ekweghịekwe na nnupuisi ha nke ụbọchị ndịa.

Emechaa

Ọ dị òtù ọzọ ndị, kama ịchọ ka Eze ha lata, ná-adọghachị ya àzụ n’obi ha ka ha wee gaa n’iru n’ọchịchọ nke mmehie ha niile. Ndịa maara ihe Chineke na-achọ na ụgwọọlụ nke nnupuisi, ma ha na-aga n’iru n’igbochi na ịdọghachị nlata nke Eze ha àzụ (Gụọ Ndi Rom 1:32). Nye ndịa, Onyenwe anyị sịrị, “Ma ọ buru na orù ọjọ ahu gāsi n’obi ya, Onye-nwem nānọ ọdu di anya; ọ buru kwa na ọ gāmalite iti ndi-orù ibe ya aka, so kwa ndi nāñubiga manya ókè nēri nāñu kwa; onye-nwe orù ahu gābia n’ubọchi ọ nēlegh anya ya, na n’oge hour ọ nāmagh, ọ gēgbubi kwa ya nkpirikpi abua, kè òkè nye ya n’etiti ndi-iru-abua: n’ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi” (Matiu 24:48-51). Nke a, n’ezie, bụ olileanya nke ndị ahụ maara ime ezi ihe ma ha adịghị eme ya. N’ebe ha nọ, ọ ghọwo mmehie. Ihe mere, n’ezie, na ọ dịghị ihe ha na-eme iji mee ka eze ahụ lata bụ na ha achọghị ịhụ Ya anya.

Ha so kwa n’òtù a bụ ndị ahụ, n’ilu nke Kraist, ndị akpọrọ òkù ịnọ n’óké oriri ma n’otù olu ha malite inye ihe ngọpụ dị icheiche. Ebe ha asaghepụghị ọnụ wee jụ ọkpụkpọòkù nke Onyenwe ha, inye ihe ngọpụ ha niile bụ otù ụdị ịjụajụ. Ndị ótú a enweghị mmasị ọ bụla nye Alaeze nke Onyenwe anyị. Ha enweghị agụụ iketa òkè na ya, ọ bụ ezie na akpọwo ha. Eze Ukwuu ahụ chọrọ ka anọkwasị n’elu oche niile dị gburugburu tebụl Ya, ma n’ihi nke a ọ dị ka Ọ na-adọghachị Nrianyasi nke Ọlụlụnwunye ahụ azụ ọtụtụ arọ rue mgbe aga-anọzu gburugburu tebụl Ya.

Mkwà nke Ọbịbịa Ya

N’ikpeazụ ọ dị ndị na-ajụ n’ịkwáemò sị “Òle ebe nkwà nke ọbibia-Ya di? N’ihi na site n’ubọchi nna-ayi-ha dara n’ura ọnwu, ihe nile nādigide dika ha diworo site ná nmalite nke òkìkè” (2 Pita 3:4). Ndị òtù a, ọ bụghị náánị na ọ dịghị ihe ha na-eme iji mee ka nlata nke Onyenwe ha dị ngwangwa kama ha na-eguzogide ya nke-ukwuu. Ha ekwenyeghị na ihe dị otú ahụ ga-eme mgbe ọ bụla, ma ha na-achị ndị Kraist ahụ ọchị bụ ndị ná-alụ ọlụ n’ozi nke Eze ahụ. Ha na-achị ndị Kraist ahụ ọchị n’ihi mgbalị ha na-agbalị ịgbasa Oziọma n’ụwa niile.

Eleghịanya, mgbasa Oziọma ahụ, karịa ihe ọ bụla ọzọ ga-eme ka Jisọs bịaghachị n’ụwa a. Chineke na-eche ka azọpụta onye ikpeazụ aga-azọpụta. Jemes dụrụ ụmụnna ya ọdụ ka ha kwesị ntụkwasịobi n’okwu a, ma were ntachiobi ná-aga n’iru n’ijéozi nke Eze ahụ. “Ya mere, umu-nnam nātachinu ogologo-ntachi-obi rue ọbibia nke Onye-nwe-ayị. Le, onye-ọlu-ubi nēche nkpuru di oké-ọnu-ahia nke ala, nātachi ogologo ntachi-obi n’ebe ọ di, rue mgbe ọ gānata miri-ozuzo mbu na miri-ozuzo ikpe-azu” (Jemes 5:7).

Ndị Akpọrọ ma Rọpụta kwa

Ná-agbanyeghị enweghị mmasị, anyaukwu, ekworo, na ekweghịekwe nke ọtụtụ ndị ná-aza ndị náesoụzọ Kraist, ọ dị òtù nke kwesịrị ntụkwasịobi ma bụrụ kwa ndị eziokwu nye Eze ha, ma bụrụ kwa ndị ná-ejikere nkeọma ịhụ maka nlata nke Eze ahụ. Ha bụ ndị òtù ahụ kwesịrị ntukwasịobi ndị akpọrọ aha ha n’Akwụkwọnsọ dịka ndị “arọputaworo” (I Pita 1:2), “nzukọ nke ndi eburu uzọ muputa” (Ndi Hibru 12:23), na “umu Chineke” (I Jọn 3:1). Ndịa niile, ebe ejiworo Ọbara dị ókéọnụ nke Jisọs Kraist sachapụ mmehie ha, bụ ọkpụkpụ nke ọkpụkpụ Ya na anụarụ nke anụarụ Ya. (Lee Ndi Efesọs 5:30). Ha bụ ndị ahụ nke nweworo ezi mnwapụta okpukpé nke ọmụmụ ọhụụ, ndị amụbatara nime èzínaụlọ nke Chineke. Ha aghọwo ezi ụmụ nke Chineke, ọ dịghị eme kwa Jisọs ihere ịkpọ ha ụmụnna Ya. (Gụọ Ndi Hibru 2:11).

Ọgbakọ nke ndị kwereekwe a bụ ezi Nzukọ Kraist ahụ. Akwụkwọnsọ na-akpọ ọgbakọ a “NzukọKraist.” Ọ bụ banyere ọgbakọ a ka Stifen kwuru mgbe o chetaara Ndị Ju ihe Moses kwuru banyere Kraist: “Nwoke a bu onye nānọri nime nzukọ n’ọhia, ya na mọ-ozi ahu nke gwara ya okwu n’ugwu Sainai, na nna-ayi-hà: onye nara okwu di ndu nke si n’ọnu Chineke puta inye ayi” (Ọlu Ndi-ozi 7:38). Okwu ahụ bụ nzukọ ka anaakpọ elclesia, n’asụsụ Grik, nke pụtara ndị akpọpụtara maọbụ ọgbakọ. Chineke nwere nzukọ nke dị n’ime Nzukọ, ọ bụ ndị Ya akpọpụtara. N’etiti nzukọ nke ndị ahụ na-ekwu okwu n’eluụwa ọ dị ndị nke bụ ndị Ya n’ezie -- ọ bụ kwa ha bụ ndị ga-eme ka Eze ahụ lata!

Eziokwu a ka akọwara n’ilu nke ata na ọka ahụ. Ata, nke ná-anọchite anya ndị òzízí ụgha ndị ná-eche na ha nọ n’ezi okpukpé ahụ, ná-eto n’etiti ọka ahụ bụ ụdị nke ezi ụmụ Chineke. Ha dum na-etokọ ọnụ, ma onye ná-elezighị anya nkeọma apụghị ịchọpụta otù nime nke ọzọ. Ma ilu ahụ kuziri na n’oge owuweiheubi ahụ aga-ekewa, laa ata ahụ n’iyi ma aga-achịkọta ọka ahụ nime ọba. Nke ahụ bụ kwa ihe ọzọ ná-egosi na ọ dị ndị arọpụtara, òtù ndị arọtara n’etiti ọtụtụ okpukpé dị icheiche nke ụbọchị taa. (Gụọ Matiu 13:24-30).

Òtù ndị arọpụtara a, ezi Nzukọ nke Kraist, na-alụ ọlụ ehihie na abalị ịgbasa Oziọma ahụ, ná-ekwusa eziokwu n’akụkụ niile nke ụwa; ma ha na-alụsi ọlụ ike mgbe oge na-aga ime ka Eze ha lata ngwangwa. Mgbalị ha nwere ike dị ka ihe ná-eko achịcha, nke, mgbe etinyere ya nime utuọka agwakọtara agwakọta ná njikere maka ighe ya eghe, na-egosipụta ịdị-ire ya n’ọlụ niile nke ighe achịcha ahụ rue mgbe achịcha niile ahụ koro eko (Gụọ Matiu 13:33). Mgbe aga-enweworị ezi mmetụta nke ihe ná-eko achịcha nke Oziọma n’ụwa niile, mgbe ahụ ka Eze ahụ ga-enwe ike ịlata. (Gụọ Matiu 24:14).

“Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ugbo abua, ma nmehie adigh ya, ka ewe zọputa ha” (Ndi Hibru 9:28). Site na nke a anyị na-amụta na náánị ndị ná-ele anya Ya ga-ahụ Ya; ná-arụghị ụka n’ihi na ha naele anya ná-achọ kwa ka Ọ lata, Ọ ga-abịa. Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya sị “Ọ buru kwa na Mu aga idoziri unu ebe, agajem ibia ọzọ, M’gānara kwa unu nye Onwem; ka unu onwe-unu we nọ kwa ebe Mu onwem nọ” (Jọn 14:3). Ọ ga-abịa ọzọ n’ịza okù nye mkpụrụobi nke ndị ahụ niile náarịọ nime mmụọ maka Onye náalụ Nwunye Ọhụụ ahụ nke mkpụrụobi ha. Ịhụn’anya na inyebiga onwe òkè nke onye Kraist nye Onyenwe ya, gaeme ka Eze ahụ lata.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Devid ji jụọ ụmụnna ya ihe kpatara na ọ dịghị ihe ha mere iji kpọghachite ya dịka eze ha?
  2. Òlee otú apụrụ iji were ọnọdụ nke oge a tụnyere ọnọdụ nke oge ahụ?
  3. Òlee ụfọdụ ndị ahụ kwesịrị inye aka ime ka eze ahụ lata, ma ọ dịghị ihe ha naeme banyere ya?
  4. Ndị ole bụ ezi Nzukọ ahụ?
  5. Òlee otú ndịKraist gaeji nye aka ime ka Eze ahụ lata?
  6. Òlee mgbe Onyenwe anyị gaalata?
  7. Ndị Ju, hà chọrọ ka Jisọs lata?
  8. Ndị Ju, hà nabatara Kraist dịka Mesaia ahụ?