Lesson 243 - Senior
Memory Verse
“Ma ebere nke JEHOVA nēsi na mgbe ebigh-ebi we rue mgbe ebigh-ebi n’aru ndi nātu egwù Ya, ezi omume Ya dikwa-ra umu umu” (Abù Ọma 103:17).Cross References
I Arọ Atọ ahụ nke Ụnwụ na Ihe Kpatara ya
1. Devid jụrụ ase n’aka Jehova banyere ụnwụ ahụ, 2 Samuel 21:1; I Ndi-Eze 17:1; 18:17, 18
2. Sọl esiwo n’ụzọ ná-ezighị ezi mee ka ndị Gibeon nwụọ, 2 Samuel 21:1
3. Anaejide Israel n’ihi ọgbụgbandụ ha na Gibeon gbara, 2 Samuel 21:2; Joshua 9:3-27
II Arịrịọ nke ndị Gibeon ka Abọọrọ ha ọbọ n’ihi Ihe Ọjọọ Emere Ha
1. Devid na-ekwenye na emere ha ihe ọjọọ, 2 Samuel 21:3; Ilu 14:34
2. Emezuru arịrịọ nke ndị Gibeon, 2 Samuel 21:4-9
3. Rizpa na-eru uju n’ihi ụmụ ya ndịkom, 2 Samuel 21:10, 11
4. Devid zara òkù site n’ịsọpụrụ èzínaụlọ Sọl, 2 Samuel 21:12-14; 2:5, 6
III Mmeri Ikpeazụ emeriri Ndị-Filistia
1. Nwanne Gọlaiat, dike ogologo ahụ bụ Ishbi-benob nwara igbu Devid, 2 Samuel 21:15, 16
2. Abishai napụtara Devid, 2 Samuel 21:17; I Samuel 26:8; 2 Samuel 16:9; 19:21; 23:18, 19
3. Emeriri ndị dike Gat mmeri ikpeazụ, 2 Samuel 21:18-22; I Ihe Emere 20:4-8.
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEỤnwụ
“Oké unwu we di n’ubọchi Devid … Devid we chọ iru JEHOVA” (2 Samuel 21:1). Ọ dịwo ọtụtụ ụnwụ n’akụkọ ụwa, ma enweghị ọtụtụ Devid ịchọpụta ihe na-akpata ya na kwa iweta ọgwụgwọ. Ọ bụ eziokwu na anyị nwere ndịọlụ nkà ndị nyochaworo ụdị nsogbu ndị ahụ dịka uzuzu nke si nime okporoigweọkụ; ọdịda nke mkpụrụ ọghịgha, na ijummiri; ma ha adịghị ka ha na-ahụ aka Chineke n’iheọghọm mberede ahụ. Elaisha gwara otù nwanyị onye Shunem sị “JEHOVA akpọwo óké unwu ka ọ da” (2 Ndi-Eze 8:1). Ụwa n’ụbọchị taa chọrọ ndịkom dị ike dịka Elaisha na Devid ndị hụtara ọkpụkpọókù nke Chineke nime ụnwụ. Onye ahụ dere Abù Ọma na-agwa anyị na “Ọ nēme ka osimiri ghọ ọzara, Ọ nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kporo nku; ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, site n’ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme” (Abù Ọma 107:33, 34).
Ihe Kpatara ya
Agha, ụnwụ, na ihe ọghọm bụ ihe amaara nkeọma n’oge nke anyị, ma enwewo kwa ịkpọòkù ụfọdụ maka ekpere, kama náánị olenaole na-ewezuga onwe-ha nime ajọomume na mmehie nke bụ ihe ná-akpata nsogbu ahụ. Ndị nnyocha na-achọpụta ezighịezi n’àtụmààtụ mmekọrịta nke anyị na mba ndị ọzọ na n’ọnọdụ akụnaụba nke ala anyị, imepụta ihe na usoro eji alụ ọlụ ugbo, na kwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ; ma olenaole, ma ọ bụrụrị na ọ dị onye ọ bụla, na-ahụ aka Chineke ná nsogbu niile anyị nke ná-eweta ọgba-aghara.
Ụwa n’ụbọchị taa na-enwe mwuta banyere mbilata nke mmanya ogbugbu, omumeọjọọ na mmehie. Chineke gwara Israel site n’Onyeamụma bụ Emos na Ya zitere ụnwụ, nchakpọ, mbibi dị icheiche, ọrịa, agha, na ọkụ megide ha, ma “unu alaghachikuteghm” (Emos 4:11). Ụwa n’ụbọchị taa na-eti mkpu n’ihi ọnọdụ ya, ma kpueisi n’ebe ọgwụgwọ ya dị. Ụwa chọrọ udo ma ọ kpọchiri ntị ya nye ọkpụkpọòkù nke Eze nke Udo. Ọkpụkpọòkù nke ndị amụma nke ọgbọ niile abụrụwo “Chègharịa! Chègharịa!” Ma Nigeria echègharịbeghị. “Chigharianu sinu n’uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ bu kwa n’ihi gini ka unu gānwu?” (Ezikiel 33:11). Ma ọtụtụ nde mmadụ ka naesoụzọ nke mmehie na ọnwụ ebe mbibi na-ewere ala anyị.
Ọgbụgbandụ dị icheiche
Ọzịzá Chineke nyere Devid maka ihe mere ụnwụ ahụ ji dị bụ na “Ọ bu n’ihi Sọl na n’ihi ulo ọbara ya, n’ihi na o mere ka ndi Gibeon nwua” (2 Samuel 21:1). Ndị Gibeon a bụ ndị ahụ bịakutere Joshua mgbe akwatusịrị Jeriko wee rịọ ka ha na Israel gbaa ndụ. Ha bịara ná-ejide uwe kara nkà na achịcha mara ebu, ná-ekwusi ike na ha sitere n’obodo dị anya, ma si otú ahụ ghọgbue Joshua ịbànye n’ọgbụgbandụ udo. Ọ bụ ezie na iwu Jehova megidere ha na ndị ala ahụ ịgbandụ, ma bụrụ kwa eziokwu na ndị Gibeon a ji aghụghọ baa n’ịgbandụ ahụ, ma Chineke ka chọkwara ka ndị Israel debe okwu ha. Ọ dị mfé n’ụbọchị taa mmadụ ịchọpụta ohere ụfọdụ na iheụsá dị icheiche iji mebie okwu ya; ma nwoke ahụ onye ga-eme eluigwe ebeobibi, ya bụ onye ahụ nke ọ bụ ezie na “Ọ ñuwo iyi nke nēmejo ya onwe-ya, ma ọ digh-agbanwe okwu-ya” (Abù Ọma 15:4).
Narị arọ anọ agafesiwo site na mgbe emere ka ọgbugbandụ a dị n’etiti Israel na Gibeon, ma Chineke chetara ya wee chọọ ka ha debe ya. Ọgbụgbandụ nke dị n’etiti mba dị icheiche n’ụbọchị taa bụ ihe ntà n’anya ụmụmmadụ. Ụwa na-emikpu ná mgbasa ozi aghụghọ na ụgha dị icheiche. Chineke chọrọ ka ndị Ya kwesị ntụkwasịobi. “Ihe nke nēsi n’egbugbere-ọnu gi puta ka I gēdebe, me kwa” (Deuteronomi 23:23). Pọl na-agwa anyị na mkwà Chineke kwere Abraham na-eguzorịsị, ná-asị kwa na Iwu nke Moses ahụ nke bịara na narị arọ anọ na iri atọ (430) mgbe ekwesịrị mkwà ahụ emeghị ka mkwà ahụ ghara ịdị irè maọbụ ka ọ ghara ịdị ike. Chineke na-edebe okwu Ya ná-achọ kwa ka ụmụ Ya ná-edebe kwa nke ha.
Mkpụrụobi ahụ nke Ná-emehie
Jehova tụkwasịrị Sọl na èzínaụlọ ya amamikpe maka ụnwụ a. Mgbe ndị Gibeon rịọrọ ka akwụgbue ụmụ ndịkom asaa nke Sọl, Devid kpọpụtara ha nye ha. Nke a abụghị okwu banyere ụmụ ịhụ ahụhụ n’ihi mmehie nke nna ha, kama ebe Jehova bokwasịrị ịtaụta a n’isi èzínaụlọ Sọl ọ bụ ihe ná-egosi na ụmụ ndịa nwere ikpé ọmụma nke otù mmehie ahụ dịka nna ha nwere. Omen’ala nke ndị ná-ekpere arụsị igbu ndị eji n’akambe ka ana-adịghị enye ikike ya n’Israel. Iwu ahụ ka enyere: “Agagh-eme ka ndi bu nna nwua n’ọnọdu umu-ha, agagh-eme kwa ka umu nwua n’ọnọdu ndi bu nna-ha: agēme ka ha nwua, onye ọ bula nime nmehie nke aka-ya” (Deuteronomi 24:16). Ezikiel na-agwa kwa anyị sị “Nkpuru-obi ahu nke nēmehie, ya onwe-ya gānwu: nwa agagh-ebu ufọdu n’ajọ omume nna-ayi; ezi omume nke onye ezi omume gādi n’isi ya, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu gādi kwa n’isi ya” (Ezikiel 18:20).
Ọ dị ọtụtụ ndị ná-ahụ ahụhụ wee nwụọ bụ ndịá-adịghị emebiiwu niile nke mmadụ. Mgbe ụfọdụ anyị na-agụ banyere onye ana-ata ahụhụ n’ihi mmebiiwu nke onye ọzọ. Ma Jehova adịghị enye ikike ka onye ọ bụla nwụọ n’ọnọdụ ikpuchi mmehie onye ọzọ bụ onye mere mmehie n’iwu Ya. Ebe pụtara ìhè nime Akwụkwọnsọ ebe onye ná-enweghị ihe ọjọọ o mere nwụrụ ikpuchi mmehie nke ndị ikpé mara bụ náánị mgbe Jisọs Kraist hụrụ ahụhụ -- onye eziomume -- n’ọnọdụ onye ajọomume. Jisọs, Onye ahụ ná-adịghị ihe ọjọọ O mere, kpebiri nnọọ wee jee n’elu obe n’ihi mmehie nke ụwa niile. “Chineke nēme ka ihu-n’anya nke aka-Ya n’ebe ayi nọ puta ìhè, n’ihi na, mgbe ayi nọ nābu ndi nmehie, Kraist nwuru n’ihi ayi” (Ndi Rom 5:8).
Ụfọdụ nwere ike ná-arụrịta ụka na Iwu ná-ekwu na ndị bụ ụmụ gaahụ ahụhụ n’ihi mmehie nke ndị bụ nna-ha na-agbado ụkwụ n’ịrụụka ha ná mpaghara nke Akwụkwọnsọ ahụ nke na-asị: “Mu onwem, bú JEHOVA Chineke ekworo, nēwere ajọ omume nke ndi bú nna leta umu-ha, leta umu-umu nke-atọ, leta kwa nke anọ, nke ndi nākpọm asì” (Ọpupu 20:5). Ọ dị náánị otù ụzọ nke anyị pụrụ isite n’amamihe nke Okwu Chineke ghọta amaokwu a, nke ahụ bụ na mgbe eweere mmehie nke ndị bụ nna leta ụmụ ha, ana-ewere ya leta ha n’ihi na ha gara n’iru nime mmehie nke ndị bụ nna ha.
Nke a dị ka okwu nke ndị Amalek. Ahụhụ ahụ ekpebiri inye ndị Amalek a mgbe ha busoro Ụmụ Israel agha ka ana-enyeghị ha rue mgbe narị arọ anọ gasịrị (400), nke bụ na ha ga-eruwo ihe dị ka ọgbọ anọ n’oge ahụ. Onye ahụ na-ekweghị ekwe nwere ike jụọ sị “Òlee otú o ji metuta mmehie nke ndi bụ nna ochie ha ke mgbe narị arọ anọ gara aga?” Náánị n’ihe mgbakwasị ụkwụ a: Ha agawo n’iru n’otù mmehie niile ahụ: ha edebewo otù ụdị omume ahụ; ha anatawo ma debe kwa otù ụdị mmụọ ahụ megide ndị nke Chineke dịka ndị bụ nna ha mere (Gụọ Luk 11:48-51).
Ịhụn’anya nke Otù Nne
Rizpa, nne nke ụmụ ndịkom abụọ nke Sọl ndị akwụgburu akwụgbu “we chiri akwa-nkpé gbasara onwe-ya n’elu óké nkume, site ná mmalite owuwe-ihe-ubi rue mgbe esi n’elu-igwe wukwasi ha miri-ozuzo; o kwegh kwa ka anu-ufe nke elu-igwe nọkwasi ha n’ehihie, ma-ọbu anu-ọhia n’abali” (2 Samuel 21:10). Devid, mgbe ọ nụrụ banyere iche-nche a ná-emetụ n’obi nke otù nne, nyere iwu ka elie ozu ndị ahụ ma chịrị kwa ọkpụkpụ niile nke Sọl na Jonatan lie kwa ha n’ókèala èzínaụlọ ahụ. “Ewe riọta Chineke aririọ banyere ala ahu mgbe ihe a gasiri” (2 Samuel 21:14). N’ụzọ dị otú a, site n’idozi ụzọ n’ụzọ juru afọ, Chineke wụkwasịrị Israel ngọzi Ya ọzọ.
Ndịokoroukwu dị icheiche
Arọ iri anọ na ise mgbe Devid gbusịrị Golaiat, nwanne ya nwoke bụ Ishbi-benob, na-ejide mma agha ọhụụ na ube dị arọ, nwara igbu Devid. Ọtụtụ arọ nke ibuagha anwawo ike nke Devid, ma, Abishai, nwa nwoke nke nwanne ya, nke bụ otù nime ndịkom dị ike nke Devid, gburu dike ahụ ma chebe eze ya. N’akụkụ nke ha, ụmụnne ndịkom atọ ọzọ nke Gọlaiat biliri imegide ndị Israel ma ha zutere ndị kwesịrị ha nime ndị dike ọgụ niile nke Israel. Ma ndịkom a adịghị ebu agha ahụ náánị ha, n’ihi na Chineke nọnyeere ha. Onyendú ha, Onye dere Abù Ọma nke Israel bụ otù nwoke onye ná-atụkwasị Chineke obi.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Òlee ihe ụnwụ jiri daa n’Israel?
- Òlee ndị bụ ndị Gibeon ahụ?
- Òlee ihe mere na o zighịezi ka Sọl gbue Gibeon?
- Òlee ụdị mmebiiwu dịka nke a nke amaworo Sọl ikpé na ya?
- Òlee otú anyị si mara na ụmụ ndịkom Sọl tinyere aka n’ogbugbu egburu ndị Gibeon?
- Kpọọ aha oge niile ọzọ ekwuru maka ụnwụ nime Baịbụl.
- Ndị bụ ụmụ hà ga-eburu mmehie nnenanna hà?
- Kpọọ otù ihe ịmaatụ na-egosi mgbe onye ahụ ná-emeghị ihe ọjọọ hụrụ ahụhụ ikpuchi mmehie n’ọnọdụ ndị ikpé mmehie mara.
- Ndị ole bụ ndị okoroukwu ahụ ekwuru banyere ha n’ebe ọgụgụ a?
- Ihe dịka arọ ole ka Devid gbara n’oge a?