2 Samuel 22:1-51

Lesson 244 - Senior

Memory Verse
“I mewo ka madu rikwasi inyinya gabiga n’elu isi-ayi: ayi bara n’ọku na nime miri: I we me ka ayi puta ba n’inwebiga-ihe-ókè” (Abù Ọma 66:12).
Cross References

I Jehova Ebemgbaba dị Ike

1. Edere ebeọgụgụ a mgbe enyesịrị Devid mmeri n’ebe ndịiro ya nọ, 2 Samuel 22:1

2. Jehova bụ Óké Nkume, Ebe ewusiriike, na Onye-nnapụta nke Devid, 2 Samuel 22:1; Abù Ọma 18:1, 2

3. Jehova bụ Ọta, Mpi, Ụlọelu: ntụkwasịobi Devid, nzọpụta, ebemgbaba, na Onyenzọpụta, 2 Samuel 22:3

II Otù Inyeaka nọ nso n’oge Nsogbu

1. Devid nọ n’óké mkpà, eleghịanya n’aka Sọl, 2 Samuel 22:5, 6; I Samuel 23:26-28; 27:1; Abù Ọma 18:4, 5

2. Nime mkpà ya, Devid na-akpọku Jehova, 2 Samuel 22:4, 7; Luk 22:41-44; Abù Ọma 18:3, 6

III Dike n’Ịzọpụta dị kwa Ike n’Ịnapụta

1. Eluigwe na ụwa naama jijiji mgbe Chineke na ebili, n’ịbọọbọ, ịchụsa ndịiro Ya, 2 Samuel 22:8-16; Abù Ọma 93:1; 18:7-15; Ọlu Ndi-ozi 4:23-31; 18:7-15; Ọlu Ndi-ozi 4:23-31; 16:25, 26; Matiu 28:2-4

2. Óké nnapụta ka enyere site n’ọzịzá ekpere, 2 Samuel 22:17-20; Abù Ọma 31:7, 8; 18:16-19

IV Ụgwọọlụ niile ahụ nke Eziomume

1. Devid chọtara nnapụta n’ihi ndụ ya zuruòkè, 2 Samuel 22:21-25; Abù Ọma 4:3; 18:20-24; 34:17; Ndi Hibru 1:9

2. Ebere nke Chineke ka egosirị onyeebere, 2 Samuel 22:26-28; Matiu 6:12, 14; Abù Ọma 18:25-27

V Enweghịike imeri Onye nke Chineke

1. Chineke naenye ike ibuagha, 2 Samuel 22:29-40; Abù Ọma 18:28-39; Ndi Filipai 4:13

2. Ọ naazọda ndịiro anyị n’okpuru anyị, 2 Samuel 22:41-46; Abù Ọma 18:40-45; Deuteronomi 11:25; Luk 10:19

3. Onye ahụ dere Abù Ọma naenye Chineke nke usoro agha niile ekele ikpeazụ, 2 Samuel 22:47-51; Abù Ọma 18:46-50.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

A naechèkarị banyere Abù Ọma nke a dịka Abù Ọma Mesaia, maọbụ Abù Ọma naekwu banyere Kraist náagwa kwa anyị ihe banyere Ya, ọlụ Ya niile, maọbụ ọbịbịa Ya n’ụwa. Devid naebuli Onyenwe anyị elu n’ịnapụta ya ná nsogbu ya niile na inye ya mmeri n’ebe ndịiro ya nọ; n’otù oge ahụ kwa, ná mkwalite nke Mmụọ Nsọ, o buuru anyị amụma nke mara mma banyere Mesaia. Ọ dị ọtụtụ ihe agaeji tụnyere mnwapụta dị icheiche nke Devid na ndụ nke Kraist.

N’oge ọchịchị nke Sọl, Devid gabigara oge nke mwedan’ala na nhụjuanya. Jisọs n’otù aka ahụ gabigara oge nke mwedan’ala na nhụjuanya n’ụwa. Jisọs nyere ndịotiihe azụ Ya, nye kwa ndị na ekwopụ afụọnụ ntị Ya. Adọkpụụrụ Ya “dika aturu nke anākpuru ije n’ogbugbu-ya,” ma O biliri ná mmeri n’ebe ọnwụ, ọkụalammụọ, na ílì dị.

Devid ejezughị ijè n’izuòkè ná ndụ ya niile dịka Jisọs jere: ma n’ebeọgụgụ a, nke dị ka o metutara karịa ná mmeso ya niile n’ebe Sọl nọ, anyị na-ahụ na Devid enweghị ihe ịtaụta ọ bụla ma gosị kwa Sọl ebere dị ukwuu.

Óké Nkume na Ebemgbaba

Ná mmalite abụ a, Devid nyere ịgbáama nke onwe ya. O dere banyere ihe Chineke bụ nye ya. O kwupụtara échìchè ahụ, “JEHOVA bu oké nkumem, na ebem ewusiri ike.” Ka Devid ji nwayọ ná agabiga n’elu nkume ahụ niile dị elu ma jọọ kwa njọ mgbe ọ naagbapụ n’ebe Sọl nọ, ọ tụgharịrị uche ụdị ebe-ewusiri ike ha bụrị ọtụtụ mgbe nye ya. Jehova bụ ụdị Ebe-ewusiri ike dị otú ahụ nye mkpụrụobi ya. Ọ bụrụwo onye agbara gburugburu ọtụtụ oge na onye ọ fọdụrụ nke ntà ka ejide ya, n’ikwu ya n’ụzọ imemmụọ, ma mgbe onyeiro nke mkpụrụobi ya bịara n’otù akụkụ, Chineke naeduru Devid ka ọ gbapụ site n’akụkụ ọzọ. N’ihi ya, Onyenwe anyị bụ ebemgbaba ya mgbe niile.

Mpi nke Nzọpụta

“Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam.” Ana-eji mpi n’Akwụkwọnsọ egosi ike. Ọ bụ ihe sitere n’òkìkè, iheagha Chineke nyere óké ehi bụrụ kwa nchebe na ike nke anụmanụ ahụ. Nke a bụ kwa eziokwu n’ebe ọtụtụ anụmanụ ndị ọzọ dị. N’ihi nke a ịchị isi dị ọchịchị dị icheiche ka anaekwukarị banyere ha n’Akwụkwọnsọ dịka mpi. “Mpi nke nzọputam” pụtara nzọpụta nke siri ike ma náalụ kwa ọlụ nkeọma. Ọ dịghị adịghịike ọ bụla dị n’óké nzọpụta nke Onyenwe anyị nyeworo anyị. Site na ya anaeme ka anyị nwere onwe anyị pụọ n’ike na ọchịchị nke mmehie. Ọ na-ewe onyennapụta dị ike ịnapụta mkpụrụobi ọ bụla n’ọnyà niile nke ekwensu na n’ihe ọjọọ dị icheiche nke mmehie jiworo kee ndụ ahụ agbụ. Ma nzọpụta ahụ nke Jisọs zụtaara anyị ezuwo. O zuruòkè. O jikọtara ihe dị anyị mkpà banyere inye anyị otuto (maọbụ ebube) n’ikpeazụ.

Ebilimmiri nke Ọnwụ

“Ebili-miri nke ọnwụ gbaram gburugburu.” Eleghịanya ọtụtụ ugbò mgbe ọ na-agbapụ n’iru Sọl, Devid nọrọ ọtụtụ anyasị ná ararụghị ụra n’akụkụ ugwu maọbụ nime ọnụala maọbụ ọgbà dị icheiche. N’ezie ọ na-awagharị awagharị n’échìchè ya ma ọ gaahụ kwa ìhè nke ụbọchị ọzọ anya.

Onye dere Akwụkwọ ozi nye Ndị Hibru kpọrọ aha Devid n’etiti ndị amụma mgbe ochie ahụ ndị “jeere akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ na nkpà, anākpagbu ha, anēmejọ ha; n’ọhia na ugwu, na ọgba na ọnu nke ala.”

“Miri-iyi nile nke ihe jọgburu onwe-ya nēme ka m’tua egwu.” Ìgwè ndị sitere ná ndịagha Sọl, maọbụ ndị Filistia, ndị ná-abịa n’ike dịka ebilimmiri, mere ka Devid tụọ egwù na nwaoge. Ma Chineke nụrụ ákwá ya wee nápụta ya n’ụjọ ya niile, na iheizendụ ya niile.

Mkpatụ nke Iheòkìkè

Nkọwa ahụ Devid naenye n’ebe a banyere ụzọ niile ahụ Chineke jiri nụrụ ákwá ya maka inyeaka tụkwasịrị ihe nke ukwuu n’ihe agwara anyị n’akwụkwọ akụkọ iheodide dị icheiche.

Ma nkọwa niile ndịa egosighị náánị mmeri nke ya onwe ya kama ha bu amụma banyere Mesaia otù aka ahụ, nke metụtara Onyenzọpụta ahụ na mkpọgide n’obe Ya na mbiliten’ọnwụ Ya.

Akọwara Onyenwe anyị n’ebe a dịka dike n’agha, nke náarịda site n’Eluigwe, ná anọkwasị n’elu cherub nke nkù ifufe na-ebugharị, nke ebilimmiri naadọkpụgharị. Ụlọntú Ya bụ igweojii nke gbara Ya gburugburu. Ngwaagha Ya niile bụ égbèeluigwe, àmụmà, akúmmiri náenwu ọkụ, óké mmiriòzùzò na ifufe niile jọrọ njọ. Anwụrụọkụ ahụ nke náesi n’imi Ya apụta, na ọkụ ahụ nke si n’ọnụ Ya, ka eji kọwaa ọnụma nke Onyenwe anyị. Ala mere mkpatụ maa kwa jijiji. Alaọmajijiji bugharịrị ntọala niile nke ugwu ntà niile; agbawakwara óké nkume niile; emeghekwara ebe osimmiri si eru. Anyị pụrụ ịhụ na mgbe Chineke naekwu okwu n’ụzọ dị otú a ụmụmmadụ na agbapụ n’iru Ya.

Lee ka nke a si yie ihe mere na mkpọgide n’obe na mbiliten’ọnwụ nke Jisọs! Banyere alaọmajijiji ndịa onyeodide ahụ nke Oziọma dere na “ala-ọma-jijiji uku dara; n’ihi na mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi si n’elu-igwe ridata, bia rue, kpọrepu nkume ahu, we nọkwasi ya. Oyiyi ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow; site n’egwu ya ndi nche mara jijiji, bia di ka ndi nwuru anwu” (Matiu 28:2-4); na “site n’oge hour nke-isi ọchichiri gbara n’ala ahu nile rue oge hour nke iteghete … Ma le, akwa-ngbochi nke ulo nsọ Chineke gbawara iberibe abua site n’elu rue ala; ala ma-kwa-ra jijiji; óké nkume gbawa-kwa-ra; ílì meghe-kwa-ra; ewe me ka aru ọtutu ndi di nsọ ndi raruri ura si n’ọnwu bilie; ha we si n’ebe anēli ozu puta mgbe mbilite-n’ọnwụ Ya gasịrị” (Matiu 27:45, 51-53). Lee ka okwu ndịa si yie nke ahụ eji ná-akọwa ọbịbịa nke Kraist ná mkpughe Ya! (Gụọ Nkpughe 19:11-16).

Anyị na-echeta na alaọmajijiji, n’etiti abalị, meghere ọnụụzọ niile nke ụlọmkpọrọ nye Pọl na Sailas. Otù Chineke a nke napụtara Devid, Pọl na Sailas, na ọtụtụ ndị nsọ na ndịagha dị ike nke Chineke ndị ọzọ, ga-anapụta anyị n’otù n’otù. Ike Ya adịghị agbanwe. Ebere Ya na-eru anyị niile. Ma ebube Ya zuruòkè ka dị nke aga-ekpughe nye ụwa nke a.

Ụgwọọlụ nke Eziomume

“Jehova nēyeghachim dika ezi omumem si di.” Devid mesoro Sọl n’izuòkè mgbe niile. Ọ dịghị ọbụná ma otù mgbe Devid welitere aka ya imegide Sọl, imerụ ya arụ. Devid enyeghị kwa onye ọ bụla n’etiti ndịkom ya ike, n’oge ọ bụla, imekpà Sọl arụ. Ọ bụ izíezi ahụ nke obi nyere Devid mkwuwaokwu mgbe ọ nọ ná nsogbu.

Mgbe mmadụ naedebe mkwà niile ya nye Chineke wee náága ijè n’iru Ya n’aka dị ọcha na obi dị ọcha, mgbe ahụ n’oge nsogbu ọ pụrụ ịbịakute Chineke ná mkwuwaokwu wee nara mkwà niile ahụ dị nsọ. Ọ gaghị enwe ihemgbochi ọ bụla ọ gaewepụ n’ụzọ niile nke okwukwe. Ọ ga enwe mmekọ zuruòkè n’etiti mkpụrụobi ya na Eluigwe.

Agwara anyị na mgbe Aisaia wetaara Eze Hezekaia okwu ka o dozie ụlọ ya nkeọma n’ihi na ọ gaje ịnwụ, ọ pụrụ ịkpọku Chineke ná mkwuwaokwu, ka O mee ka ụbọchị ya dị ogologo. Hezekaia chere iru ya ná mgbidi wee kpee ekpere, na-agwa Onyenwe anyị na ya ejégharịwo n’iru Ya n’eziokwu na n’obi zuruòkè, wee mee kwa ihe ziriezi n’anya Ya. Lee otú o si nata ọzịzá ngwangwa site n’eluigwe! Aisaia áká alaghịrị site n’ụlọ ahụ mgbe Onyenwe anyị gwara ya ka ọ ga gwa Hezekaia na Ya anụwo ekpere ya. “Onye ezi omume ka JEHOVA bu; ezi omume ka Ọ huru n’anya” (Abù Ọma 11:7).

N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na mmadụ naaga náelezịghị anya, rapụ ịkwụghachị mkwà niile ya, kwụsị ime ka ijiobichụaàjà ya niile dị ọhụụ, debe mmehie n’obi ya, maọbụ mee ajọ ihe n’ụdị ọ bụla, mgbe nsogbu bịara ọ ghaghị ime ka mkwà niile na ijiobichụaàjà niile ahụ dị ọhụụ ma wezuga ihemgbochi niile dị n’ụzọ nke okwukwe si aga, tutu o nwee mkwuwaokwu n’ebe Chineke nọ. Ndụ zuruòkè bụ ebe ewusiri ike nke dị ukwuu megide ndịiro nke mkpụrụobi. (Gụọ I Jọn 3:18-22).

Ịdịnwayọ n’obi na Ebere

Devid dere n’ebe a banyere ebere na ọlụ nke ịbụ onye náeme ebere. Devid gosịrị Sọl ebere ọtụtụ ugbò. N’okwu Chineke ahụ ekwuru n’eluugwu Jisọs sịrị, “Ngọzi nādiri ndi-ebere.” Onyenwe anyị naecheta náákwụghachị kwa onye ahụ nke náeme ebere ná mmeso ya n’ebe mmadụ ibe ya nọ. Onyenwe anyị náágbaghara anyị mmehie niile anyị, mgbe anyị náágbaghara ndị ahụ mehiere megide anyị.

“Ume-ala-n’obi nke Gi nēmekwam ka m’ba uba.” Onyenwe anyị ziri Devid, site n’ụbọchị ya nke jupụtara ná nsogbu, ịnagide ihe, inwe obiike n’ọnwụnwa, na inwe obiumeala ọbụná mgbe ihe náágara ya nkeọma.

Omume nke mmadụ nke Devid nwere bụ obiike na ịdịike. Ma, site n’aka Chineke, ọ natakwara àkụnaụba pụtara ìhè; ka o sooro Chineke ná aga ijè ọ dịghị onyeiro ọ bụla pụrụ imeri ya. Devid nyefere Chineke nnapụta niile ya na ọgan’iru ya niile nke imemmụọ na nke anụarụ. Isiokwu nke abụ a mara mma bụ inye Chineke ekele n’ihi ọgan’iru na mmeri dị icheiche.

“Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku; Ọ nēmekwa-ra onye nke Ya éterè manu ebere, bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere, rue mgbe ebigh-ebi” (Abù Ọma 18:50). N’ebe a ana-ekwu banyere Kraist, ezi Eze ahụ, na Devid, onye ahụ é tere mmanụ, na anyị bụ mkpụrụ nke imemmụọ. Lee ka ha si dị obosara, dị kwa elu, metuta kwa mmadụ niile ma gazue ebe dị anya bụ ebere na ịhụn’anya nke ná-anapụta nke Chineke anyị!

Devid bụ eze nke Chineke onwe Ya rọpụtara. Ọ bụ dike n’agha. Ma ọ maara na ọ bụ site n’aka Chineke ya ka ya pụrụ iji “gba ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe,” na ịwụbiga mgbidi. Ma otú ọ dị, o chetara -- otú ahụ ka anyị na-aghaghị kwa icheta na mmeri ọ bụla adịghị ma ewezuga ịlụ-agha, na okpu-eze adịghị kwa, ma ewezuga obe. Ọ “gbara ọsọ ọma ahu”, otú ahụ ka anyị náághaghị kwa, ma ọ bụrụ na anyị ga eketa ndụ ebighịebi.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ụdị Abù Ọma eweere na nke a bụ?
  2. N’ìhi gịnị ka Devid ji enye Chineke ekele?
  3. Kọwaa otú Chineke si nụrụ ákwá ya.
  4. Ndụ Devid, ò zuruòkè mgbe niile?
  5. Gịnị naenye mmadụ mkwuwaokwu n’ebe Chineke nọ?
  6. Gịnị bụ mmeso Onyenwe anyị n’ebe onyeebere nọ?
  7. Ọ bụ site n’aka ònye ka arọpụtara Devid ịbụ eze?
  8. Ọ bụ onye ka “nkpuru” ahụ na-atụ aka n’amaokwu ikpeazụ?