Abù Ọma 23:1-6; 27:1-14

Lesson 245 - Senior

Memory Verse
“JEHOVA bu Onye nāzum dika aturu: ọ digh ihe kọrọm, n’ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka Ọ nēme ka m’makpu: n’akuku miri nke izu-ike ka Ọ nēdum nwayọ. Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n’uzọ nile nke ezi omume n’ihi aha-Ya. Ọzọ, asi na ejem ijè na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, M’gagh-atu egwù ihe ọjọ ọ bula: n’ihi na Gi onwe-gi nọnyerem: ndele-Gi na nkpa-n’aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi. I nēdo table n’usoro n’irum n’anya ndi nākpagbum: I tewo isim manu; ikom bu inwebiga-ihe ókè. Nani idi-nma na ebere gāgbasom ubọchi nile nke ndum: m’gēbi kwa n’ulo JEHOVA rue ogologo ubọchi nile” (Abù Ọma 23:1-6).
Cross References

I Abù Ọma Onyeọzụzụatụrụ

1. Ịhụn’anya na nlekọta ọma nke Chineke n’ebe ndị Ya nọ ka ejiri tụnyere nlekọta ọma nke onyeọzụzụatụrụ n’ebe atụrụ ya nọ, Abù Ọma 23:1; Aisaia 40:11; Jọn 10:11-16; Ndi Hibru 13:20; I Pita 2:25

2. Onyeọzụzụatụrụ ọma ahụ na-edu atụrụ Ya jee n’ebe inwebiga ihe ókè, udo, na ịdịmma dị, Abù Ọma 23:2, 3; Aisaia 49:10; Ezikiel 34:22-31

3. Ịdị-ike na nnọnyere nke onyeọzụzụatụrụ na-emeri ike na egwù nke ọnwụ na ahụhụ, Abù Ọma 23:4; 72:12-17; 91:1-14; Ndi Hibru 2:14, 15

4. Chineke ji ịhụn’anya na ezi nlekọta ná-azụ ndị nke Ya ná-agbanyeghị ndịiro gbara ha gburugburu, Abù Ọma 23:5; 31:19-24; Job 36:15, 16

5. Chineke na-enye ndị Ọ hụrụ n’anya iko nke ngọzi, n’ezi ọtụtụ nke jubigara ókè, Abù Ọma 23:5; 45:7; 92:10; Malakai 3:10

6. Ndụ ebighịebi bụ ihe-nketa nke atụrụ nke ebe ọzụzụ nke Chineke, Abù Ọma 23:6; 16:11; 2 Ndi Kọrint 5:1; Nkpughe 21:3, 4

II Abù Ọma nke Devid

1. Ntụkwasịobi nke Devid nime nzọpụta nke Chineke bụ ihe siri ike ma guzosieike, Abù Ọma 27:1-3; Ọpupu 15:2; Abù Ọma 46:2

2. Devid chọrọ ka o biri n’Ụlọ nke Chineke rue mgbe niile ebighịebi, n’ihi na n’ebe ahụ ka ndụ ebighịebi dị, Abù Ọma 27:4-6; 31:19, 20; Jọn 14:2, 3; Ndi Hibru 12:22

3. Devid kpere ekpere maka inyeaka nke Chineke, ka ọ dịgide ná ndụ ya, Abù Ọma 27:7-9, 11, 12; Deuteronomi 4:31; Abù Ọma 50:15

4. Devid gbara àmà ná ntụkwasịobi banyere ebere na nzọpụta nke Chineke, Abù Ọma 27:10, 13, 14; Ọnu-ọgugu 14:8; Abù Ọma 3:5, 6; Aisaia 12:2

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Onyeọzụzụatụrụ Ọma ahụ

Abù Ọma nke Iri abụọ na atọ bụ otù nime akụkụ niile nke Akwụkwọnsọ nke amaara hụ kwa n’anya nke ukwuu. Okwu nke ịhụn’anya na ịdịmma ya akasiwo ìgwè mmadụ nke ana-apụghị ịgụta ọnụ nke ọtụtụ ọgbọ gara aga obi, site n’ụdị iheike ọ bụla, ọnwụnwa dị icheiche, ọbụná ọnwụ. Idoanya ya abụworị ihe mere ka ọtụtụ mmadụ were obi ha hụ ya n’anya.

“JEHOVA, bu onye nāzum dika aturu: ọ digh ihe kọrọm” bụ okwu nke chịkọtara ọtụtụ ihe nke na-akọwa ihe Abù Ọma nke Iri abụọ na atọ niile pụtara. Chineke bụ Onyeọzụzụatụrụ nke ndị eziomume, ndị Ya bụ kwa atụrụ nke Ya. Ụmụmmadụ na-achọsi ike onye ga-abụ onyendú ha n’ụbọchị niile nke ha na-adị ndụ; ọ bụ kwa Chineke bụ Onye pụrụ ime ya, nkekanke, nye mkpụrụobi ahụ nke ga-elekwasị Ya anya maka ódúdú, ịhụn’anya na nchebe.

Ịnọ n’udo na nchebe nke ìgwèatụrụ ya bụ ọlụ nke dịrị onyeọzụzụatụrụ, n’ihi na atụrụ ya agaghị enwe ike ịchọtara onwe ha ebe ịtanri nke ahịhịa ndụ na mmiri ọñụñụ. Atụrụ ahụ agaghị enwe kwa ike ịnapụta onwe ha pụọ n’ebe ajọ anụọhịa nọ, maọbụ n’ọtụtụ iheegwù nke ga-adakwasị ha site n’ihe ike nke dị n’ụzọ. Ọ bụ ọlụ nke dịrị onyeọzụzụatụrụ iduru atụrụ ya nkeọma gafee ihe mgbochi niile nke ga-achọ imegide maọbụ imerụ ìgwèatụrụ ya arụ. Ọ bụ ya ga-eji ndụ nke onwe ya wee chebe ìgwèatụrụ ya site ná nguzogide niile nke anụọhịa ọjọọ, ndị ná-apụnara mmadụ ihe, ndị ori, maọbụ ndị ogbu mmadụ.

Akọọrọ anyị akụkọ dị ebube nime Testament Ọhụụ nke ọ bụ nime ya ka Jisọs na-agwa ụmụmmadụ na Ya onwe-Ya bụ Onyeọzụzụatụrụ nke atụrụ. O kwuru okwu banyere onwe Ya sị “Mu onwem bu onye-ọzụzụ-aturu ọma: onye-ọzùzù-aturu ọma nātọgbọ ndu ya n’ihi aturu ya” (Jọn 10:11). Nke ahụ bụ nnọọ ihe Jisọs meere ndị Ya -- atụrụ nke Ọ na-azụ nri: O nyere ndụ Ya n’ihi ha, ka ha wee nwee ike ịgbanarị óké ihe egwù nke mmehie na ụgwọọlụ ya nke ikpeazụ -- ọnwụ ebighịebi! Ọbara nke Jisọs, nke Ọ wụsịrị n’obe nke Kalvarị, bụ ihe ịjụrụ Chineke obi banyere mmehie niile nke anyị, anyị anatawo kwa ndụ ebighịebi site n’ikwere n’ịdịike nke ọlụ nsacha nke Osimiri ahụ.

Ebe ihe Ịtanri Jupụtara

Akụziiri anyị n’ebe a na ọ dịghị ihe anyị ga-achọ achọ, ọ dịghị kwa ezi ihe ọ bụla nke ga-akọ anyị ma ọ bụrụ na anyị elegide Chineke anya maka nrọpụta Ya. Dịka onyeọzụzụatụrụ na-edu ìgwè atụrụ ya jee n’akụkụ mmiri dị nwayọ, na n’ebe ahịhịa ndụ dị ebe ana-azụ atụrụ ma nye kwa ha mmiri nkeọma, otú a ka Chineke na-edu ndị nke Ya jee n’ebe ezi ihe nke ná-enweghị ọgwụgwụ si apụta; nke bụ Isiiyi nke Mmiri dị Ndụ bụ Jisọs Kraist. “Ndi zuru òkè gēketa ezi ihe” (Ilu 28:10); na kwa “O werewo ezi ihe nile nyeju ndi agu nāgu afọ” (Luk 1:53). Aisaia kwuru okwu banyere Onyeọzụzụatụrụ nke Israel, sị: “Agu agagh-agu ha, akpiri agagh-akpọ kwa ha nku; mirage na anyanwu agagh-amagbu kwa ha: n’ihi na Onye nwere obi-ebere n’aru ha gēdu ha, ọ bu kwa n’akuku isi-iyi nile juputara na miri ka Ọ gēdu ha nwayọ” (Aisaia 49:10). Jisọs sịrị ndị akpịrị na-akpọ nkụ, “Ọ buru na akpiri kpọrọ madu ọ bula nku; ya biakutem, ñua miri” (Jọn 7:37).

Ọ bụghị náánị nye mkpà nke arụ na nke mkpụrụobi anyị mgbe anyị nọ ná-aga ijè anyị n’eluụwa nke a ka mkwà niile nke Chineke dịịrị, kama ọ dịkwara maka ọdịmma na añụrị nke anyị n’óké ọgbọ ebighịebi niile n’ebe Chineke nọ. Emere ka Jọn Onyeozi hụ óké Obodo nke Chineke anya site n’ọhụ ka anyị wee mata nke ntà ụdị ọñụ nke ndị nsọ nke Chineke ga-eketa. O dere sị “M’we nu oké olu ka ọ nēsi n’oche-eze ahu dà, si, le, ulo-ikw nke Chineke diyere madu, Ọ gēbiye-kwa-ra ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nke Ya, Chineke Onwe-ya gānọnye-kwa-ra ha, buru kwa Chineke ha: O gēhichapu kwa anya-miri nile ọ bula n’anya-ha; ọnwu agagh-adi kwa ọzọ; iru-uju ma-ọbu ikwa-akwa ma-ọbu aru-ufu agagh-adi kwa ọzọ: ihe mbu nile agabigawo” (Nkpughe 21:3, 4). Ya mere, ọ bụghị óké ihe iju anya n’ihe banyere okwu a, na onye dere Abù Ọma, dịka o dere ya n’Abù Ọma nke Iri abụọ na asaa, chịkọtara ya otú a: “Otù ihe ka m’riọworo n’aka JEHOVA nke ahu ka m’nāchọ; ọ bu ka m’biri n’ulo JEHOVA ubọchi nile nke ndum, ihu idi-utọ JEHOVA, na ijuta ihe n’ulo uku Ya” (Abù Ọma 27:4).

Devid chọrọ ka o biri n’Ụlọ Nsọ nke Chineke -- Jerusalem Ọhụụ -- ibinyere Chineke rue mgbe ebighịebi. Ọchịchọ ya n’oge niile nke ọ nọrọ n’eluụwa nke a, bụ ka ọ ná-atụgharị uche n’ịdịmma na izuòkè nke Chineke site n’ekpere na òfùfè. Ọ bụ ihe kwesịrị bụrụ kwa ohere dịịrị nwa Chineke ịjụta Chineke ihe nime Ụlọ Ya dị nsọ site n’ụzọ nke òfùfè na otuto nye Chineke. Onye ọ bụla nke detuworo ire wee hụ na Chineke dị mma na-etufu ọchịchọ niile nke inwe iheonwunwe nke ụwa nke a wee bụrụ onye ọchịchọ ya ga-abụ náánị ka o wee binyere Chineke mgbe niile. Eleghịanya onye dere Abù Ọma nwere ụdị ihe a n’uche mgbe o dere sị “Detunu ire, hu na JEHOVA di nma: onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu, bụ nwoke nke nagbaba nime Ya” (Abù Ọma 34:8).

Nnọnye Nkasịobi

Nime Abù Ọma nke Iri abụọ na atọ (23) na nke Iri abụọ na asaa (27), egosiri óké ntụkwasịobi nke onye dere Abù Ọma nwere. Ọ dịghị atụ egwù ihe ọjọọ ọ bụla nke ga-abịakwasị ya. Mkwuwaokwu ya pụtara ìhè nkeọma mgbe ọ sịrị: “Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, m’gagh-atu egwu ihe ọjọ ọ bula; n’ihi na Gi onwe-gi nọyerem: ndele-Gi na nkpa-n’aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.”

Ọnwụ atụfuwo ihe-egwù ya niile na iheọgbụgba ya n’ebe ndị agbapụtara nọ n’ihi mbiliten’ọnwụ dị ebube nke Kraist. O meriri ọnwụ, ọkụalammụọ na ílì nime mbiliten’ọnwụ ahụ. N’oge ọnwụ, igweojii nke ndụ nwere ike bụrụ ihe gbara ọchịchịrị, enwere ike nwee ihemgbu na nwaoge, ma egwù na ihe óké egwù nke ọnwụ adịghị kwa ọzọ nye onye nke Kraist n’ihi na ọ na-elegide óké Onyeọzụzụatụrụ nke atụrụ anya ka O due ya.

“JEHOVA bu ìhèm na nzọputam; ònye ka m’gātu egwù? JEHOVA bu ebe siri ike nke ndum; ònye ka m’gātu óké egwù?” Ọ dịghị ọzịzá dị nye ụdị ajụjụ ndị dị otú ahụ, n’ihi na ọ dịghị onye dị ukwuu karịa Eze nke ndị eze, na Onye nwenu kachasị ndị nwenu niile. “Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?” (Ndi Rom 8:31). N’ihi na “Onwu, ma-ọbu ndu, ma-ọbu ndi-mọ-ozi, ma-ọbu ibu-isi di iche iche, ma-ọbu ihe di ugbu a, ma ọbu ihe gaje idi, ma-ọbu ike di iche iche, ma-ọbu ihe di elu, ma-ọbu ihe di omimi, ma-ọbu ihe ọ bula ọzọ ekère èkè, agagh-apu ikewapu ayi n’ihu-n’anya Chineke, nke di nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi” (Ndi Rom 8:38, 39).

Iko nke Ngọzi

Devid chetara ihe banyere ọtụtụ ihe-egwù na nsogbu nke o nwere ná ndụ ya n’oge gara aga, na kwa ihe banyere ọtụtụ ndịiro ndị chọrọ igbu ya; o wee tóó Chineke n’ihi óké nnapụta niile nke Chineke napụtaworo ya. Chineke edoworị tebụl nke ngọzi na nchèbe n’usoro nye ya n’iru ndịiro ya. Ọ dị ka aga-asị na ka ọnọdụ ya na-adị njọ karịa na otú ahụ kwa ka iru Chineke na-anọnyere ya karịa. Devid jiri óké ịhụn’anya na nlekọta ọma nke Chineke n’ebe atụrụ Ya nọ wee tụnyere iko nke jubigara ókè n’ihi izu ókè ya. Ọtụtụ nime ụdị okwu a ka edere n’Abù Ọma Iri abụọ na asaa ebe onye dere Abù Ọma sịrị, “N’ihi na nnam na nnem arapuwom, ma JEHOVA gēkubatam.” Ịhụn’anya nke nne na nna sitere na Chineke, nime ihe niile nke na-ejikọta mmadụ, njikọta na ịhụn’anya nke nne na nna bụ ihe siri ike nke ukwuu ịtọsa. Ma onye dere Abù Ọma sịrị na ọbụná ma asị na ụdị ahụhụ a ga-adakwasị ya -- na nne na nna nke ya onwe-ya ga-arapụ ya -- ma Chineke ga-akasị ya obi wee debe kwa ya.

Abù Ọma Iri abụọ na asaa gara n’iru n’okwu banyere nchèbe nke Chineke n’ụzọ ra otú ahụ na Chineke ga-ezobe ndị nke Ya nime Ụlọikwuu Ya na n’iru Ya. Akụkọ a nke Akwụkwọnsọ na-akọwa óké ịhụn’anya na mmasị nke Chineke nwere n’ebe ndị Ya nọ, ọ na-echètakwara anyị ihe ahụ nke mere, nke bụ kwa ihemmụta, mgbe Jisọs jiri ọchịchọ na mmasị mkpuchita nke Chineke nwere n’ebe ndị Ya nọ wee tụnyere nneku-ọkụkụ nke na-achịkọta ụmụ ya n’okpuru nku-ya abuọ. Jisọs sịrị, n’oge ahụ, “Ọtutu mgbe ole ka M’chọrọ ichikọ umu-gi, ọbuná dika nneku-ọkuku nāchikọ umu-ya n’okpuru nkù-ya abua, ma unu achọgh!” (Matiu 23:37). Nime Abù Ọma ndị ọzọ anyị hụkwara ụdị okwu ahụ, ma edere ya otú a sị “Nkù-Ya ka O gēji kpuchie gi, ọ bu kwa n’okpuru nkù-Ya abua ka i gāgbaba” (Abù Ọma 91:4).

Ịdịmma nke Onyenwe anyị

Emechiri Abù Ọma 23 na 27 site n’okwu nke ntụkwasịobi nke ịdịmma na ebere nke Chineke nke bụ kwa òkè nke ndị Ya. Ntụkwasịobi Devid na ịdịmma na ebere ga-agbaso ya ụbọchị niile nke ndụ ya bụ ihe ziriezi, n’ihi na onye ọ bụla nke na-adị ndụ n’ihi otuto nke Chineke na-anata ụgwọọlụ nke Chineke. Ọñụ, udo, na ndụ ebighịebi so kwa n’ụgwọọlụ ndịa -- emere ka ha niile dị irè site n’ịdịmma na ebere nke Chineke Onye pụrụ ime ihe niile. Mkwà nke Chineke bụ: “Echezọla iwum, ma ka obi-gi chebe ihe nile m’nyere n’iwu: n’ihi na ubọchi ndu nke di ogologo, na ọtutu arọ nke ndu, na udo, ka ha gātukwasiri gi” (Ilu 3:1, 2).

Devid nwere nnukwu ohere ịnwapụta ike nke nzọpụta na amara bara ụba nke Chineke nime ndụ ya, n’ihi na mkpụrụobi ya na ndụ ya bụ ihe nọwororị ná nsogbu ọtụtụ mgbe n’oge garaaga. N’oge dị otú ahụ ọ sịrị “M’gēme aña ma asi na ekweghm na m’gēle idi-nma JEHOVA n’ala ndi di ndu?” (Abù Ọma 27:13). Nke a bụ okwu ndegide na nke ịgbaàmà dị ike megide ndị umengwụ ndị na-ewezuga onwe ha mgbe niile ijé ozi Chineke nke kwesịịrị ha. Ụbọchị ahụhụ ga-abịa; ebe ọ bụ na ha enweghị Onyenzọpụta, ndị niile nke ná-adịghị e jere Chineke ozi nke kwesịrị ka ha jee ga-ala n’iyi dịka okoko nke ọhịa. Ma ọ bụghị otú ahụ ka ọ dị n’ebe Devid nọ. Ntụkwasịobi ya mgbe niile bụ n’ebe Chineke dị ndụ nọ, ọ dụkwara ndị ahụ ọdụ bụ ndị olileanya ha n’ebe nzọpụta nke Chineke nọ dị alaala ka ha “Nēle anya JEHOVA: di ike, ka obi-gi nwe ume; e, nēle anya JEHOVA” (Abù Ọma 27:14).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ Onyeọzụzụatụrụ nke atụrụ?
  2. Gịnị bụ ọlụ nke onye ọzụzụatụrụ?
  3. Gịnị mere onyeọzụzụatụrụ ji dị atụrụ mkpà?
  4. Gịnị mere Devid jiri chọọ ka o biri n’Ụlọ nke Onyenwe anyị rue mgbe ebighịebi?
  5. Òlee otú Abù Ọma Iri abụọ na asaa ji kwusie okwu ike banyere mmasị nke Chineke nwere n’ebe ndị Ya nọ?
  6. Òlee otú aga-esi were ịhụn’anya nke nne na nna tụnyere ịhụn’anya nke Chineke?