Abù Ọma 25:1-22; 94:1-23

Lesson 246 - Senior

Memory Verse
“Izu nzuzo JEHOVA diri ndi nātu egwu-Ya; ya na ọgbugba-ndu Ya, ime ka ha mara ihe” (Abù Ọma 25:14).
Cross References

I Ntụkwasịobi nime ekpere

1. Onye ahụ dere Abù Ọma kpere ekpere, maara na Chineke gaaza ekpere, Abù Ọma 25:1-3; Matiu 7:7, 8; Ndi Hibru 11:6; I Jọn 5:14, 15

2. Ekpere ahụ ka ekpere site n’ezi obi ịmata ụzọ na uche Chineke, Abù Ọma 25:1-7; Jọn 7:17

3. Ịmatasị ịdịmma niile nke Chineke wetara okwukwe nime obi onye nke Chineke, Abù Ọma 25:8-11; Jọn 3:15; I Jọn 4:10

4. Ndị náatụ egwù Onyenwe anyị ka aga-ewebata n’ọgbụgbandụ Ya, Abù Ọma 25:12-14; Ndi Hibru 8:6; 9:14, 15

5. Izuòkè na iziezi ganapụta nwa Chineke site ná mkpagbu ya niile, Abù Ọma 25:15-22; Ndi Hibru 10:35, 36

II Ihe Iyi egwù Nye Ndị Mkpàgbu

1. Akpọkuru Chineke ka O lekwasị ajọomume niile nke mmadụ anya, Abù Ọma 94:1-4

2. Ọ dị ka ọ dịghị ajọomume jọkarịrị njọ nye ya ime, Abù Ọma 94:5, 6

3. Ndị mmehie na-ehie ụzọ site n’iche na Chineke anaghị ahụ ihe niile ha na-eme, Abù Ọma 94:7; Ndi Galetia 6:7

4. Onye ahụ keworo ihe niile ná-arịba kwa ọnọdụ niile dị n’ụwa ama, Abù Ọma 94:8-11; Jenesis 6:5; Ndi Rom 3:23

III Udo nye Ndị A na-akpagbu

1. Chineke nwere nzube n’inye ndị Ya ahụhụ, Abù Ọma 94:12-14; Ndi Hibru 12:5-11

2. Eziomume ga-emeri n’ikpeazụ, Abù Ọma 94:15-18; Aisaia 33:14-17

3. Mkwà niile nke Chineke dị ókéọnụ bụ mgbochi zuruòkè megide onyeiro, Abù Ọma 94:19-23; Ndi Rom 8:31, 33-39.

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Otù Dike nke ekpere

Eze Devid bụ nwoke ekpere n’ezie. N’ọgbọ nke urù na ike ekpere dị ka ihe ana-amazughị, eze Israel, ọtụtụ ugbò na-ewere ohere nke ọnụụzọ ahụ ghere oghe bànye nime ụloakụ nke ịhụn’anya Chineke. Ndụ ekpere nke a bụ ihenzuzo nke ndụ mmeri Devid na ike o nwere n’etiti mmadụ. Chineke ahụ nke Agba Ochie bụ kwa Chineke nke Agba Ọhuụ, otù Chineke ahụ kwa nke nụrụ ekpere nke Devid ka nọ kwa n’Eluigwe ịzà arịrịọ niile nke si n’ezi obi n’ụbọchị taa. Mkpà nke ekpere dị ka a na-ekwusi kwa ike mgbe niile n’oge nke Oziọma, aghaghị kwa inweworị òtù nke ndị dike ekpere nke ọgbọ ọ bụla ka mgbe oge nke Kraist n’eluụwa. Aghaghị kwa ikwu ná mwute, na ụmụmmadụ emeghị ngwa n’iwere ohere nke isiiyi nke ike kachasị bụ nke ụwa apụghị ịma -- bụ nke inweta inye-aka Chineke ná mkpà ọ bụla ná-abịakwasị mmadụ. Gịnị ka anyị ga-ekwenye inye site n’ihe-onwunwe anyị iji nweta mmeri dị icheiche ahụ edere nime Baịbụl? Otù ụdị mmeri nime mkpà ọ bụla ka mmadụ ọ bụla nke ga-ekpe ekpere dịka ndị ahụ edere na Baịbụl ga-enwe. “Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe ọ bula unu nāchọ, agēmekwa-ra unu ya” (Jọn 15:7). Nke a bụ ntọala nke ngọzi niile nke Chineke nye onyeeziomume.

Okpukpu anọ nke arịrịọ pụtara ìhè n’Abù Ọma iriabụọ na ise nke a. Devid kpere ekpere maka nnapụta n’aka ndịiro ya niile, ndụmọdụ n’okporoụzọ nke ndụ, mgbaghara maka mmehie garaaga, na nguzosiike nke ndị nsọ. Abù Ọma iri iteghete na anọ na-ewere kwa otù ụdị isiokwu ahụ, nime ya ka egosipụtara mbibi ikpeazụ nke onye na-emebiiwu na mmeri ebighịebi nke ndị ná-atụkwasị Chineke obi. Devid kpere ekpere ya nye Onyenwe anyị. Dị ka mmadụ, o zipụtara arịrịọ ya. Ọ maara na nke ka ukwuu dabeere ná ntụkwasịobi ya n’ebe Chineke nọ karịa urù nke onwe ya. Ndịiro nke Onyenwe anyị na-ele ndụ Devid, dịka ndịiro nke Oziọma na-ele ndụ nke OnyeKraist ọ bụla n’ụbọchị taa. Ọ bụrụ na okwukwe na ntụkwasịobi Devid n’ebe Chineke nọ amịghị mkpụrụ niile ahụ nke Okwu Chineke gosipụtara, ndịiro nke Devid abụghị náánị na ha ga-achị ya ọchị ma kwaa kwa ya emò, kama ha ga-ekwulu kwa Chineke nke Eluigwe. Ọ bụ ọchịchọ Devid ka ekpere ya ghara ịbụ nke agaghị aza, n’ihi na ekpere azara bụ ihe ana-apụghị ikwugide.

Ọ bụ ndịKraist ole guzoworo iche n’Okwu Chineke -- banyere ọgwụgwọ maọbụ nnapụta ná nsogbu -- wee guzoro, n’etiti ndị na-ákwáemò ná mkpagbu niile nke ndị na-ekweghịekwe? Ọ bụrụ na Chineke azaghị ekpere n’oge áwà ahụ, aha Ya ga-ebu ịta ụta n’otù aka ahụ; ma okwukwe anaghị arapụ inwe ọzịzá. Chineke ga-agbachitere aha Ya oge ọ bụla. Onye ọ bụla nke na-eguzoro Chineke ma ná-anọgide ná ntụkwasịobi ya ga-ahụ ọzịzá nke ekpere ya, aga-eto kwa aha Chineke.

Ịchọ Ụzọ Chineke

Ihe kachasị mkpà ná ndụ kwesịrị ịbụ ịmara Chineke na ịga ijé n’ụzọ ahụ niile nke Ọ rọpụtaworo. Ọtụtụ mgbe ezi ekpere ga-ejikọta arịrịọ ahụ nke onye ná-arịọ ya ji achọ ka egosi ya okporoụzọ nke ijé ozi, n’ihi na ọ bụ okporoụzọ nke náeduru Eluigwe -- ma ewezuga odudu, onyeijè ahụ pụrụ ifu ụzọ ngwangwa. Ọ dị ọtụtụ ụzọ gabigara onwe ha n’okporoụzọ nke ndụ, ma Chineke gaeduzi ndị ahụ nááchọ ndụmọdụ Ya. Devid nwere obi ahụ nke ná-achọsi ike ịbụ onye Chineke nke nzọpụta ya ga ná-edu. Ọ bụ nwoke nwere amamihe nke ụwa, ma ọ matara na iheọmụma nke ụwa nke a abụghị ihe ọ bụla n’ebe amara nke Chineke dị.

“JEHOVA, me ka m’mara uzọ-Gi nile.” Mkpughe nke Chineke ji nwayọ ná-apụta ìhè n’ọtụtụ arọ nke akụkọ ụwa. Ụmụmmadụ na-aga n’iru ịmata ihe Chineke chọrọ n’aka ha. “Chineke, mgbe Ọ gwarari nna-ayi ha okwu n’oge ochie nime ndi-amuma n’iberibe-akwukwọ di iche iche, Ọ gwara ayi okwu n’ọgwugwu ubọchi ndia nime Ọkpara, Onye O doro onye-nketa nke ihe nile, Onye O site-kwa-ra n’aka-Ya me uwa nile” (Ndi Hibru 1:1, 2). Jisọs bịara n’ụwa n’ebumn’obi nke ịbụ mkpughe pụtara ìhè nke Nna ahụ nye mmadụ, iji gosi ndị mmadụ ụzọ ibi ndụ dịka uche Chineke si dị, na inye Onwe Ya dịka àjà ahụ dị ukwuu banyere mmehie niile nke ụwa. Jisọs sịrị, “Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ digh onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbugh site na Mu” (Jọn 14:6). Mgbe ụmụmmadụ ji ezi obi n’ụbọchị taa na-achọ ịmata uche na ụzọ Chineke, ha ga-achọta Jisọs. N’iso nzọụkwụ Ya niile, ha gaeru n’ọgwụgwụ ijé ahụ ha na-achọ. “Ekele diri Chineke n’ihi onyinye-Ya nke anāpugh ikọ akụkọ ya” -- ngọzi nke ná-enweghị atụ nye ụmụmmadụ.

Okporoụzọ nke ndụ bụ ụzọ dị ebube. Onye dere Abù Ọma kwuru maka ya dịka ụzọ nke ebere na eziokwu. Àmà nke onyeKraist bụ na ọ bụ ụzọ nke udo, ọñụ, na mmeri n’ebe mmehie dị. Okwu mmeri nke ndi Kraist ahụ nke gaworo n’ụgwọọlụ ha, iji ya tụnyere itimkpu akwa niile nke ndị mmehie ná-anwụ, náegosipụta náenweghị obiabụọ, na ụzọ Chineke bụ ụzọ kachasị mma. Ndị niile nọ n’okporoụzọ ahụ nke ịdịnsọ na-ama ọñụ niile nke dị n’ụzọ ahụ onyeKraist ọ bụla ná-adụ kwa ndị ụwa ọdụ ka ha nwaa ụzọ a ná ndụ ha wee nwapụta n’onwe ha ojuju afọ dị ukwuu nke ga-abụ nke ha.

Izí Ndịmmehie ihe

Chineke kwupụtara n’Okwu Ya na ọ dịghị mgbe Ọ rapụrụ Onwe-ya na-enweghị ihe ịgbáàmà n’ụwa. N’otù ụzọ maọbụ nke ọzọ, onyemmehie naabịaru n’iheọmụma ahụ na ezi Chineke dị ma, ọ bụrụ na ọ gaeso ntụpụta nke akọnauche ahụ nke Chineke nyere mmadụ ọ bụla, onye mmehie ahụ gaabịaru n’oge náádịghị anya n’ime nnwápụta nke iheọmụma nke Chineke. “Ezi Ìhè ahu diri, Nke nēnye madu ọ bula nke nābia nime uwa ìhè” (Jọn 1:9). Mmadụ niile ndị ná-adịghị efè Chineke nwere ngọpụ ha kwadobere dịka ihe mere ha ji efèghị Ya, ma anaagwa anyị na ngọpụ agaghị eguzo n’óké Ocheeze ahụ dị Ọcha nke Ikpé, ebe agaekpe onye mmehie ikpé n’ihi mmehie niile ya. Baịbụl na-agwa anyị na ndị ahụ ná-eguzo n’ikpé n’ụbọchị ahụ ga-eguzo n’ebe ahụ n’ikpuchi ọnụ, n’ihi na Chineke ziri ha ihe nkeọma, ọbụná n’ọnọdụ mmehie ha, ime ka ha ghara ịbà ebe ahụ ma ọ bụrụ náánị na ha rubereisi.

Ọ dị ọtụtụ ụzọ Chineke ji ezi onyemmehie na Chineke dị, na “Ọ nēgosi kwa Onwe-ya Onye nēnyeghachi ndi nāchọ Ya ugwọ-ọlu” (Ndi Hibru 11:6). Anyị naecheta ọtụtụ ịgbaàmà nke ndị ahụ chere na ọ dịghị ihe ha maara banyere Chineke, ma ha kpọkuru Ya nime nsogbu maọbụ mkpagbu wee hụ na Chineke naalụrụ ha ọlụ naaza kwa ekpere ha. Ha bụrị ndị mmehie, n’ezie; ma site n’oge ahụ gaa n’iru ha maara na Chineke nọ n’Eluigwe na Ọ pụrụ ịzá ekpere. Oge ahụ ruru mgbe ha rịọrọ Chineke banyere mgbaghara mmehie niile wee chọta Jisọs dịka Onyenzọpụta ha. Ndị mmehie ọzọ zutere ụfọdụ ụmụ Chineke; site kwa n’ịhụ ndụ nke OnyeKraist ha naebi kwaụbọchị mere ka ha chọọ Onyenzọpụta ahụ n’onwe ha. Baịbụl nke ghere oghe, ịgbaàmà n’ámá, Okwu Chineke ekwuru n’ụlọụkọ, Okwu Chineke ebipụtara n’akwụkwọ ọgụgụ ụfọdụ nke NdịKraist -- ndịa bụ olenaole n’ọtụtụ ụzọ ọzọ nke Chineke na-eji enye obi ụmụmmadụ ìhè. Otù ihe doroanya bụrụ kwa ezie, “Onye di nma na onye ziri ezi ka JEHOVA bu: n’ihi nka Ọ nēzi ndi nmehie ihe n’ụzọ.” Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla gaaza ajụjụ banyere mmehie ya n’ụbọchị ikpé nke Chineke, ọ ga-abụ nlụpụta nke ọjụjụ ya ịñantị na ime ihe niile ọ maara nke kwesịrị ime. Ọ bụrụ na nke a bụ eziokwu mgbe Devid biri n’ụwa, ọ bụ kwa eziokwu n’ụzọ dị ukwuu n’ọgbọ anyị. “Ọ gābu na ha anugh? Ha nuru ezie, n’uwa nile ka olu-ha puru jezue, na nsọtu nile nke elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue” (Ndi Rom 10:18).Ọbọ

Ọ bụ ezie na Chineke dị mma ma zi kwa ezi, ụmụmmadụ enweghị ikike iche na Ọ ga-ewezuga ikpe maọbụ tọghapụ onyemmehie. Chineke pụrụ ịrapụ onye mmehie ka ọ naaga n’iru ọtụtụ arọ, ka O wee nye mmadụ ahụ ohere ichègharị. Ọtụtụ mgbe ọ naadị ka ụmụmmadụ pụrụ ime aha ihe ọjọọ ọ bụla megide Chineke maọbụ ndị Ya wee gbanarị ná-enweghị ntaramahụhụ; ma Chineke, “nke ọbọ nile,” naamazu ihe ọ bụla nke mmadụ ọ bụla na-eme Ọ ghaghị kwa inyeghachị onye ajọomume ụgwọọlụ. “Asi na onye nmehie eme ihe ọjọ ọgu ugbo ise, me kwa ka ubọchi-ya di ogologo, ma mu onwem mara n’ezie na ọ gādiri ndi nātu egwu Chineke nma, bú ndi nātu egwu n’iru Ya: ma ọ gagh-adiri onye nēmebi iwu nma, ọ gagh-eme kwa ka ubọchi-ya di ogologo, bú nke di ka onyinyo; n’ihi na ọ digh-atu egwu n’iru Chineke” (Eklisiastis 8:12, 13).

Ọ dị échìchè abụọ ná ezighịezi nke dị n’akọn’uche nke mmadụ ahụ onye náaga n’iru nime mmehie ná-enweghị kwa échìchè nke nchègharị. Nke mbụ, ọ naéchè na agaghị achọpụta mmehie ya; ma Chineke naadụ onyemmehie ọ bụla ọdụ sị “Mara-kwa-nu nmehie-unu na ọ gāchọputa unu” (Ọnu-ọgugu 32:23). Onye dere Abù Ọma naewepụta isiagụgọ ahụ nke apụghị ịzà: “Onye nāku nti dika ihe-ọkukù, Ọ gagh-anu ihe? Ma-ọbu onye nākpu anya, ọ gagh-ahuwa uzọ? Onye nādọ mba nile aka ná nti, Ọ gagh-aba nba, bú Onye nēzi madu ihe-ọmuma? ọ gaghi ama ihe?” Onyeòkìkè ahụ nke nyere mmadụ onyinye nke ịnụihe, ọ bụ na O nweghị kwa otù ike ahụ nke ịnụ ihe, ọbụná n’ụzọ ọ dị ukwuu karịa? Chineke ahụ nke náanụ ekpere niile nke ndị eziomume, ọ bụ na Ọ dịghị anụ kwa okwu niile nke ndị náemebiiwu? Chineke ahụ nke ná-ahụ arịrịọ nke obi nwere agụụ inwe ịhụn’anya Ya karịa ọbụná tutu ekwupụta ya, ọ bụ na Ọ dịghị ahụ kwa échìchè ọjọọ niile nke anaekwupụtaghị? Dịka Ọ na-aghaghị ịnye ndị náamaghị Ya ahụhụ n’ihi ajọomume ha, otú ahụ kwa ka Ọ na-aghaghị ikpé ndị ahụ batara n’okpuru ìhè nke Okwu Ya ikpé. N’ezie Onyenwe anyị maara échìchè ọ bụla nke mmadụ náahụ kwa mmehie ọ bụla. Njehie ọ bụla nke échègharịghị nime ya ka edebaworo n’Akwụkwọ Chineke. (Lee Nkpughe 20:12).

Échìchè ụgha nke abụọ nke ọtụtụ mmadụ naenwe bụ na ahụhụ n’ihi mmehie, ọbuná ma achọpụta ya, agaghị abụ ihe siri ike dịka Baịbụl naekwu. Ebighịebi dị ogologo ma dị kwa ike nye onyemmehie, o kwesịghị kwa ịnwa ya ịtụfu oge. Okwu niile nke Jisọs, Ọkpara Chineke, n’ihe banyere ebeobibi ebighịebi nke onye ajọomume aghaghị ịbụ ndụmọdụ nye mmadụ niile, ịjụ ebe ahụ. Ịgbáàmà nke ọgaranya ahụ n’akụkọ banyere Lazarọs kwesịrị igosị nhụjuanya niile nke ọkụalammụọ ime ka mmadụ niile gbapụ site n’ụzọ ahụ nke náeduba n’ịlan’iyi. Ihe dị icheiche ahụ nke Jọn onye ahụ ekpugheere ihe hụrụ mgbe ọ naele ọtụtụ, ụwa nke gaje ịbịa n’iru, náegosi ahụhụ ahụ jọgburu onwe ya nke akwadobere nye ndị mmehie. Anwala Chineke wee hụ mkpụrụobi gị nime ọdọọkụ ahụ nke náenwuenwu, kama gbanarị iwe ahụ gaje ịbịa site n’ịgbakuru ebere nke Chineke ịhụn’anya, na nke eziomume.

Ndị dere Abù Ọma ahụ mechiri Abù Ọma ndịa site n’échìchè nke mmeri ikpeazụ nye ndị ahụ ntụkwasịobi ha dị na Chineke. Ndị náamaghị Chineke nwere ike ibili n’óké ọnụma, ndị mmadụ wee náeche kwa ihe efu, ma ihe nke ndị eziomume na-agbaso ga-emeri n’ikpeazụ. Chineke aghaghị ị ná eme ka ndị Ya dị ka Ya -- dị ukwuu n’eziomume na ịdịnsọ -- rue mgbe Ọ gaakpọrọ ha laa n’ụlọ nke eluigwe. Izùòkè a n’etiti ndị bụ Nwunye ọhụụ nke Kraist naapụtakarị ọtụtụ mgbe site n’aka ndịiro nke Oziọma nime mkpagbu dị icheiche na ahụhụ dị icheiche, na site n’inye ahụhụ; ma Jisọs bụ Onyeogbugbò na Onyemmezu nke okwukwe anyị. Ọ gaghị kwa ekwe ka anwa mmadụ ọ bụla karịa ka ọ pụrụ ịnagide. Olileanya ahụ nke OnyeKraist abụghị n’ihe dị icheiche nke ụwa nke a. Olileanya anyị dị n’ihe nke Eluigwe, olileanya a adịghị kwa e weta ihere n’ihi na ọ karịrị ihe niile apụrụ iji tụnyere ya.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. N’ihi gịnị ka Devid ji nọgidesie ike n’ekpere ya ka ndịiro ya ghara imeri ya?
  2. Gịnị ka Onye dere Abù Ọma ahụ na-achọ ka Onyenwe anyị gosi ya?
  3. Kpọọ aha ihe ụfọdụ eji mara Chineke bụ nke ekpere ndị a guzoro n’elu ha.
  4. Kọwaa ụfọdụ ngọzi dị icheiche nke ndị eziomume.
  5. Gịnị ka Baịbụl kwuru banyere ọbọ? Ọ bụ onye nwe ya?
  6. Òlee otú Chineke si amata mgbe emere mmehie?
  7. N’ihi gịnị ka ndị nke Chineke ji agabiga mkpagbu ọtụtụ mgbe, ma ihe na-agara ndị ná-emebiiwu nkeọma?
  8. Gosipụta ihe dị iche n’etiti ndị eziomume na ndị ná emebiiwu n’ebighịebi.
  9. Òlee otú ndị eziomume ga-esi merie n’ọgwụgwụ? Ònye bụ ebemgbabá ha?