2 Samuel 24:1-25

Lesson 247 - Senior

Memory Verse
“Ọ digh eze anēji uba nke usu-ndi-agha-ya zọputa: adigh-eji kwa ike riri nne naputa dike” (Abù Ọma 33:16).
Cross References

I Ihe Kpatara Omume ahụ nke Devid n’Ịgụ Israel ọnụ

1. Iwe Chineke dị ọkụ megide Israel, eleghịanya n’ihi ịlaghachịazụ n’ikpere arụsị, 2 Samuel 24:1; Ndi-ikpe 2:14, 20; 3:8; 10:7

2. David bụ onye Chineke jiri dịka ngwaọlụ wee taa Israel ahụhụ, Chineke takwara Devid onwe-ya ahụhụ, 2 Samuel 24:1, 2; I Ihe Emere 21:1-3; Matiu 18:7; Deuteronomi 28:50; Ndi Ikpe 3:12; Jeremaia 5:15

3. Chineke zigaara Devid ịdọakanántị, bụ nke o ledara anya, ya mere o nweghị ihengọpụ, 2 Samuel 24:3, 4; I Ihe Emere 21:3, 4; Ilu 12:15; 15:22; 29:1

4. Ịgụ ọnụ ahụ agụrụ bụ ịmata ọnụọgụgụ ndị-agha nke mba ahụ, nke na-egosi ihe pụrụ ịbụ ihe kpatara ejiri nwee ịgụ ọnụ ahụ, 2 Samuel 24:5-9; I Ihe Emere 21:5-7; Abù Ọma 20:7; Matiu 7:26, 27; Abù Ọma 33:15, 16; Hosea 1:7; Hagai 2:22

II Ahụhụ Chineke nyere n’ihi Mmehie

1. Devid chègharịrị maka mmehie ya, o mere mkwụpụta zuruezu maka ya, wee rịọ kwa arịrịọ maka mgbaghara, 2 Samuel 24:10, 17; I Ihe Emere 21:7, 16, 17; Abù Ọma 34:18; 51:17; 2 Ndi Kọrint 7:10

2. Chineke nyere Devid otù ohere ka o gosi ebe ntụkwasịobi ya dị maka nnapụta, 2 Samuel 24:11-13; I Ihe Emere 21:9-12

3. Devid gosịrị na Chineke bụ ntụkwasịobi ya na ebemgbabá ya, 2 Samuel 24:14; I Ihe Emere 21:13; Abù Ọma 46:1; 118:8, 9; Ilu 3:5; Aisaia 2:22; Habakuk 2:4; Ndi Hibru 10:33

4. Mbibi niile nke iheotiti ahụ mere ka ezi ngụkọta nke ọnụọgụgụ ahụ ghara ịdị, 2 Samuel 24:15; I Ihe Emere 21:14

5. Chineke mere ka iheotiti ahụ kwụsị na Jerusalem, 2 Samuel 24:16, 17; I Ihe Emere 21:15, 20

III Ịchụàjà ahu n’Ebenzọchaọka

1. Chineke chọrọ ka Devid chụara Ya àjà, 2 Samuel 21:18, 19; Ndi Rom 12:1, 2; Ọpupu 32:29

2. Mkpebi ahụ nke Devid kpebiri ka ọ kwụọ ụgwọ maka àjà ahụ na ebeịchụàjà ahụ gosịrị ijiobichụaàjà dị omimi, 2 Samuel 24:19-25; I Ihe Emere 21:21-27; Ndi Filipai 3:7, 8; Matiu 16:24

3. Ebe ahụ Devid chụrụ àjà mesịrị bụrụ ebe e wuru Ụlọukwuu Chineke, I Ihe Emere 21:28-30; 22:1-5; 2 Ihe Emere 3:1

Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHE

Nwoke ahụ bụ Devid

Devid, bụ eze, na-eme okenye ugbu a. Ndụ ya abụworị ihe jupụtara n’ọlụ, ijéozi dị icheiche nke ndịagha bụ ihe karịrị n’oge ya na n’ọlụ ya. Ma site n’inye-aka nke Chineke, ọ bụwo onye nwere ike ịchịkọta ọtụtụ ókéala n’okpuru ọchịchị ya. N’ọchịchị ya na kwa nke Solomon, mba nke Israel bụ ndị emere ka ha nwetazue ala ahụ nke Chineke kwere ha ná mkwà.

N’oge gara aga Devid mehiere. Ọ dị ọtụtụ ụzọ o siri dahie. Ma o nwewo nchègharị zuruókè banyere ha wee bụrụ kwa onye chọtara mgbaghara. Otù nime ekpere nke ọ na-ekpe mgbe niile bụ ka ọ ghara ịbụ onye ikpé mmehie nke nganga megide ebere nke Chineke ga-ama -- bụ mmehie nke ọ gụrụ dịka nke kachasị. Ọ bụ kwa n’ihi nzube ahụ nke dị n’obi ya mere o ji bụrụ onye Chineke jiworo lụọ ọlụ nke ukwuu n’oge ọ nọ ndụ n’ụwa.

Site na nwoke a bụ onye nke Chineke, anyị enwewo ọtụtụ mkpughe nke àtụmààtụ Chineke, nke egosipụtara site n’ụzọ dị icheiche nke Chineke siri mesoo ya. Ụdị eziokwu a bụ kwa ihe akụziiri anyị nime ọtụtụ Abù Ọma nke sitere na mkpịsị akwụkwọ nke Devid. Ọ bụrị onye nwere nnukwu nsọpụrụ, n’oge niile, nye Chineke na kwa otitemmanụ nke Chineke. Ọ bụ onye náechere oge nke Chineke nime ọtụtụ ihe nke ọ matara na ọ bụ uche Chineke nye ya, wee site n’ụzọ dị otú ahụ nápụta onwe-ya n’ọtụtụ ahụhụ na mgbakasịarụ. Ọ bụworị orù nke kwesịrị ntụkwasịobi nke Chineke ya, bụrụ kwa onye biri Chineke ya nso.

Anyị nwere ike chee mgbe ahụ na ọ ga-akaworị mma ma ọ bụrụ na ihe a nke mere ná ndụ Devid n’ebe a emeghị. Ọ bụ ihemwute na nke ịkwaụta ọzọ merenụ. Ma n’ihi nzube ahụ nke dị nime obi Devid, ihe ahụ nke mere gwụsịrị ná mmeri; site kwa n’omume nke nchègharị ya, ọ bụghị náánị Devid kama anyị niile anatawo ihemmụta na ọtụtụ urù nke imemmụọ.

Agwaghị anyị otú ihe ahụ niile siri mee. Agwaghị anyị ebumn’uche nke omume ahụ maọbụ ihe niile nke mere n’ihi omume ahụ. Ma agwara anyị ihe nke zuuru anyị igosi anyị nkeọma ihemmụta nke imemmụọ nke Chineke chọrọ ka anyị mụta. Ọ bụ okwu ndịa nke anyị matara nkeọma ka anyị ga-atụgharị uche na ha mgbe anyị na-amụ iheọmụmụ a.

Mmehie ahụ wetara Amamikpé

Náánị nke ntà ka Akwụkwọnsọ na-agwa anyị ihe banyere mgbochị nke Chineke na-egbochị ịgụ Israel ọnụ. Otú ọ dị, ọ bụ nnukwu ihe na-ezighịezi nye Devid ime otú ahụ. Emere ka eziokwu a pụta ìhè site n’okwu ekwuru n’ebe dị icheiche, e mere ka ha niile pụta ìhè n’ebeọgụgụ nke iheọmụmụ a. Nke mbụ, iwu ahụ ezighịezi ọbụná nye nwoke onyeagha nke náadịghị agazị agazị, Joab, onye dị ka agaasị na ọ maghị ihe ziriezi na ihe ọjọọ mgbe ọ bụla ha gbabatara n’uche ya maọbụ dịka ọchịchọ ya si dị. Joab gwara Devid na o zighịezi, ma mgbe emesịrị emere ka ọ pụta ìhè na Devid emeghị nkeọma n’ịjụ ntụpụta nke onyeisi agha ya.

Nke abụọ, nke bụ kwa ezi ihe-ngosi nke ndahie ahụ ka ahụrụ n’okwu nke Chineke, site n’Onyeamụma Ya, na kwa ahụhụ ahụ nke bịara n’ihi uche nke onweonye ahụ nke Devid.

Ọ bụ náánị ugbò abụọ ndị ọzọ ka agụrụ ndịkom ndịagha nke Israel ọnụ n’akụkọ ha, dịka anyị matara site n’Akwụkwọnsọ. Ma nime ugbò abụọ ọzọ ndịa, ọ bụ site n’okwu na n’iwu nke Chineke. Ihe a nke mere bụ uche Devid, nke ekwensu tinyere nime ya, ọ ga-abụwori otù akụkụ nke àtùmààtụ nke dị nime obi ya banyere ụfọdụ ibu agha nke dị n’iru. Otú ọ dị, omume a nke Devid ka Chineke jiri dịka otù ụzọ iji wetara Israel ikpé. Agwaghị ihe kpatara eji wetara ha ikpé a; ma eleghị anya ọ ga-abụ n’ihi nlaghachịazụ nke ha laghachịrị ọzọ n’ikpere arụsị, dịka ọ na-abụ ihe náakpata ọdịda nke ndị Israel mgbe niile.

Emere ka urù na ịdịmkpà iheèfu site n’otù iheotiti ahụ nke ikpezịrịezi nke Chineke, n’ihi na iheotiti ahụ sochịrị ndị ahụ gụrụ ọnụ n’azụ wee mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụrụ ná mmehie nke Devid bụrị idebe ntụkwasịobi ya na ndabere ya n’ebe ịdịike nke ndị ya nọ -- n’ogwe aka nke anụarụ bụ mmadụ -- o nweghị kwa ọnụọgụgụ nke ọ pụrụ iji nyàà isi na nganga mgbe aka nke ikpé Chineke malitere. Emere ka ike gwụsịa mba ahụ n’ụzọ dị ịtụn’anya na n’ụzọ dị óké egwù nime ntakịrị hour olenaole.

N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na mmehie nke Devid bụ nke ọ kpachara nnọọ anya mee iji wee mee ka àtụmààtụ ụfọdụ nke ọ na-atụ n’ọdịn’iru nke ná-adịghị dịka uche Chineke si chọọ wee gaa n’iru, aka nke Chineke gbochirị ya ime ihenzuzu ahụ. Mgbe iheotiti ahụ gasịrị, ọ dịghị kwa ihe ọzọ nke Devid na-échèkwube dịka ihe nchèbe. Emere ya ka ọ bụrụ onye na-ekwenye, site n’ebere nke Chineke, ịbụ onye náadabere náánị na Chineke Nke pụrụ ime ihe niile. Emere ya ka ọ mata na ọ dị mkpà ka ọ bụrụ onye ná-ejé ijè n’okwukwe na onye ná-erubeisi nye náánị olu nke Chineke site n’óké iheegwù a nke ọ na adịghị nke agaeji tụnyere ya n’akụkọ nke ebe ọ bụla n’ụwa nke a.

N’ikpeazụ, ọ bụrụ na mmehie nke Devid bụ mmehie nke nganga, ọ ga-abụworị onyekwesịrị inye Chineke ekele na mmehie ọjọọ ahụ bụ ihe emere ka ọ pụta ìhè ka o wee si nime ya pụta tutu oge agafee. Ekwensu na-eji nganga ọtụtụ mgbe ná mgbalị ya iji wee jide mmadụ. Ma Chineke kpọrọ mmehie a asị ma ná-ata kwa mmadụ ahụhụ nke ukwuu n’ihi ya. Anyị pụrụ ịbụ ndị náeche obi anyị na onweanyị nche nkeọma ka anyị ghara ikwe ka mmehie a nke ná-ebibi mkpụrụobi bata.

Omume Amamihe Devid Mgbe Ọ nọ ná Nsogbu

Anyị na-ahụ, site n’ihe nke mere na Chineke bú ụzọ kwue okwu n’akọn’uche nke Devid. Chineke mere ka ọ bata n’uche ya na n’obi ya ịmata mmehie nke o mehieworo; Devid tikukwara Chineke maka nnapụta. Anyị gụrụ na Chineke anyị nke dị ebere gbaghaara ya.

Ma ọ dị ihe Devid gaeme tutu mgbaghara ahụ abụrụ ihe zuruezu. N’ebe ọtụtụ mmadụ nọ ihe ahụ nke ọ gaemezu ga-abụ idozi ụzọ -- idozi ihe ahụ nke ná-adịghị mma ebe ha mejọworo mmadụ n’ụzọ ọ bụla. Chineke adịghị agbaghara mmehie ahụ kpamkpam bụ nke anyị pụrụ idozi n’onwe anyị. Ọbụná Iwu na Oziọma na-akụzi mkpà idozi ụzọ dị ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ka Chineke gbaghara anyị. Otú ọ dị, ọ dị ụfọdụ mmehie nke emehiere megide mmadụ nke ana-enweghị ike idozị. Okwu ọjọọ ekwuru kwugịde mmadụ, maọbụ n’ụzọ nke ime mmadụ ihe merụa ya nnukwu arụ, ndị emere ihe dị otú a nwere ike bụrụ ndị nwụwororị anwụ tutu onye mmehie ahụ abịa ịrịọ mgbaghara n’aka Chineke. Enweghị kwa ike ịnata mgbaghara n’aka ndị nwụrụ anwụ, n’okwu ndị dị otú a, Chineke na-agbaghara onye ahụ nke mejọrọ.

Ọ dị ihe ndapụta ụfọdụ nke náaghaghị iso ná ndụ mmehie ụfọdụ, ọ bụ ezie na ewepụwo amamikpé nke mmehie ahụ ma gụọ kwa onye ahụ n’onye eziomume n’iru Chineke. Oge ụfọdụ ana-arapụ ọtụtụ olenaole nke ụfọdụ ihe ndapụta ahụ iji wee ná-echètara onye ahụ nke agbagharaworo òlùlù ebe esi gụpụta ya. Oge ụfọdụ ihe ndapụta nke náeso ndụ nke mmehie na-abụ adịghị ike maọbụ ezughị òkè nke arụ nke ndụ mmehie wetara. Oge ụfọdụ kwa ihe ndapụta ndịa na-abụ ihe iji zi ihe Chineke kwenyere ka ọ bịa iji wepụ ụfọdụ ihe ná ezighịezi maọbụ ihe ọ bụla na-adịghị ọcha nke dị nime ndụ onye ahụ amụworo ọzọ. Devid chọpụtara na ọ bụghị náánị ịchọ mgbaghara n’aka Chineke ka ọ ga-eme n’oge a. Enyere ya ụzọ ikpé atọ nke ọ na-aghaghị ịrọrọ otù megide onwe ya na mba ahụ.

Nime nrọrọ ya, anyị hụrụ na Devid mere omume nke onye maara ihe na dịka mmadụ kwesịrị ime. Ọ rọorọ ịdaba n’aka Chineke n’ihi na ọ sịrị, “Obi-ebere-Ya bara ụba.” Ọ rịọghị ụzọ ọ ga-esi gbanarị ahụhụ ahụ nke kwesịrị ka ọ hụ. Ọ rọpụtaraghị onwe ya ụzọ nke ka mfé. Náánị ihe ọ chọrọ bụ ka ahụhụ ya site nnọọ n’ebe Chineke nọ, ọ bụghị site n’ebe mmadụ nọ. Devid matara ịhụn’anya na ebere nke Chineke, ọ matakwara ịkpọasị na-ezighịezi na ekworo nke mmadụ. Ọ maara ihe nke ukwuu n’ịrọrọ ịtá ahụhụ nke Onyenwe anyị.

Ọ bụrụ na Devid rọọrọ agha, ya onwe ya ga-abụworị onye anapụtara, ebe ọ bụ na ndị ya enyeworị iwu ka ọ ghara kwa ijé n’ọgbọ agha ọzọ. Ọ bụrụ na ọ bụ ụnwụ ka ọ chọrọ, ọ gaghị eso hụ ahụhụ n’ihi na ọtụtụ ndị ọ hụrụ n’anya nke ọ na-achị ga-arọrọ ka ha hụa ahụhụ n’onwe ha, kama ịhụ eze ha ka ọ na-ata ahụhụ. Ọzọ kwa, ya onwe-ya bụ ọgaranya; ọbụná ma asị na enyeghị ya iheoriri, ọ ga-enwe ike ịzụta ya. Ma o gosịrị ịdị ukwuu nke obi na uche ya n’ịrọrọ ịdaba n’aka Chineke wee hụ ahụhụ nke iheotiti ahụ.

Devid matara na Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’iru n’ikpé Ya niile, na Ọ ga-eme ka ahụhụ Ọ na-enye jee n’ebe o kwesịrị ka o jee. Ọ matara na ọ dịghị aka mmadụ maọbụ mgbidi nke ulo onyeeze ọ bụla nke pụrụ igbochị aka ikpe nke Chineke, ichebe ya maọbụ èzínaulo ya. Site n’ime omume a, Devid kpebiri n’onwe ya isoro ọbụná onye kachasị n’ịdịala n’etiti ndị-orù ya wee kekọọ òkè, dịka ikpé nke Chineke si dị. Ọ bụghị ihe ịrụ-ụka na Chineke hụrụ ma rịba kwa omume a ama n’akụkụ orù Ya nke ná-échègharị.

Ịtụkwasị Chineke ka-ọbụ Mmadụ Obi

Ihenzuzo nke Devid nke dị n’ịrọrọ ịdaba n’aka Chineke, bụ ndabere na ntụkwasịobi o nwere nime Chineke dị ndụ. Ọ dị ọtụtụ mmadụ ndị ná-arọrọ ịdaba n’aka mmadụ kama ịtụkwasị Chineke obi mgbe nsogbu bịara ná ndụ ha. Ha adịghị ahụ ọtụtụ puku mmadụ ana-apụghị ịgụta ọnụ ndị Chineke na-akasị obi, ná-agwọ ọrịa, ná-azoputa, na ndị Ọ na-anapụta. Ha na-ahụ náánị ndị ná-anataghị ụfọdụ ngọzị ndịa n’aka Chineke. Ndị ná-adabere n’ogweaka nke mmadụ apụghị ịhụ nwoke nke bụrị onye ngwụrọ n’oge mbụ ka ọ na-awụli elu ná-eto kwa Chineke. Ha na-ahụ náánị ihe eji ebu ozu nke ozu dị nime ya maọbụ onye nọ n’ahụhụ nke ná-anatabeghị ihe nke Chineke nwere inye. Ha apụghị kwa ilepụ anya n’akụkụ nke ọzọ, wee hụ ọtụtụ agazịghịagazị ọjọọ niile na elezighị n’anya nke mmadụ -- nlụpụta dị icheiche nke ihe emere site ná mnwapụta, na, elezighị anya nke akpachapụrụ anya wee mee, ma otú ọ dị, ha niile bụ ndahie nke ná-egbuegbu maọbụ nke pụrụ ime ka mmadụ daa ngwụrọ.

Ebere na échìchè ọma nke onye ọ bụla aga-asị na ọ kachasị n’ịbụ ezi mmadụ ezughị iji tụnyere óké ebere na ịhụn’anya nke Chineke anyị. Ụwa enweghị ihe mwuta ọ bụla nke Eluigwe ná-apụghị ịgwọ; ma ụwa nwere ọtụtụ ihe mwute nke dịwororị, nke dị kwa, nke emere ka ọ jọkarịa njọ site ná mgbalị dị icheiche nke mmadụ ná-anwụ anwụ nke amaara nkeọma. O kwesịrị ka anyị dị ka Devid, onye rọọrọ ịdaba n’aka Chineke karịa ịdaba n’aka mmadụ, na ịtụkwasịobi ná nnapụta nke Chineke karịa ịtụkwasịobi n’amamihe maọbụ nghọta nke onwe ya.

Omume Devid n’Ebe Àtụmààtụ Amamihe Nke Chineke Dị

Devid debere nnọọ obi ya n’ebe Chineke nọ, ọbụná mgbe ọ nọ n’óké mwute na nsogbu dịka n’oge a. Nke a bụ óké ihe dị iche n’etiti ya onwe-ya na onye buru ya ụzọ, bụ Sọl. E wepụrụ ebere nke Chineke n’ebe Sọl nọ n’ihi na ọ jụrụ Chineke kpamkpam wee gbakute Ya azụ. N’oge ọ nọ ná mkpà n’ọgwụgwụ nke ndụ ya, Sọl chọrọ Chineke náánị n’eluelu, o jighị obi ya niile chọọ Ya o wee bụrụ onye nwụrụ ọnwụ nke onye dapụrụ n’okwukwe ya.

N’aka nke ọzọ mgbe Devid nọ ná nsogbu ọ rapụghị Chineke ya, kama nke ahụ, ọ gbakuuru Ya. Chineke bụ ebe mgbaba ya n’oge nsogbu. Ọ bụ Chineke bụ onye mbụ Devid jere kwupụtara mmehie ya, na onye mbụ nke o jekuuru maka inyeaka na nnapụta. Devid dapụrụ n’amara, ma eweghachịrị ya n’ọnọdụ ya n’ihi na o chègharịrị wee weere onwe ya nyefee n’ebere nke Chineke. Sọl rapụrụ okwukwe ya wee bụrụ onye furu efu rue mgbe ebighịebi n’ihi na ọ rapụrụ Chineke, ọ bụ kwa onye ná-achọghị ichègharị site ná mmehie ya na nnupuisi ya.

Ọ dịghị mgbe Devid jụrụ Chineke dịka ndị-Ju n’oge nke Kraist mere. Ọ chọghị ime otù ihe ọ bụla nke ga-egbochị àtụmàtụ nke Chineke. “Ka eme uche Gi” bụrị mmụọ ahụ, ma asị na nke a abụghị nnọọ okwu ahụ nke ekpere ya. Oge a kwa abụghị nke aga-arapụ. Ọ hụrụ ịdị ukwuu nke mmehie ya, o wee gwa Chineke ka O kwee ka aka nke ikpé Ya dịgide ya na ụlọ nna ya. Nke ahụ pụtara na ụmụnne ndịnyom na ndịkom nke Devid ga-esoro ya keta òkè n’ahụhụ ahụ nke Chineke ga-enye ya.

Lee ka ụdị arịrịọ ahụ si bụrụ nke ana-adịghị ahụ mgbe niile! Ndị Ju nke oge nke Kraist nwere nnọọ ụdị ekpere dị iche. Ha rịọrọ sị “Ọbara-Ya di ayi n’isi, dị kwa n’isi umu-ayi.” Ha enweghị mmasị n’àtụmààtụ nke Chineke nye ha dịka otù mba. Ha achọghị inwe òkè ọ bụla n’uche nke Chineke banyere ha. Ha achọghị ịmata ma edebere ụmụ ha n’ọbụbụọnụ na ndị ana-apụghị kwa isite na ha mezue àtụmààtụ nke Chineke. Ha rọpụtaara onwe ha na ụmụ ha ikpéọmụmá nke ajọ mmehie a nke kwesịrị ahụhụ nke ọnwụ -- ahụhụ nke ná-enweghị ọgwụgwụ ebe ọ bụ ọjụjụ na nrara araraworo Ọkpara Chineke nye n’ọnwụ. Ọbụbụọnụ na ikpéọmụmá a wetara mgbasasị na mmeri zuruezu nke emeriri mba ha.

Ma anyị pụrụ ịhụ n’ebe a na Devid leziri nnọọ anya nkeọma n’ụche na n’àtụmààtụ nke Chineke. Chineke ekwuworị na ọ bụ site n’ụlọ Devid ka Alaeze ebighịebi ga-esi bilie. Ka ya onwe-ya wee kwue sị, “Ka aka-gi digidem, digide kwa ulo nnam” -- ekpere nke mmadụ ga-atụ anya ya karịa nke ahụ Devid kpere -- ga-apụta na ọ na-ewepụ onwe ya n’ọgbụgbandụ ahụ nke ya na Chineke gbara banyere ụlọ ya. Ọ ga-apụtaworị na aga-egbochị àtụmààtụ nke Chineke -- maọbụ mee ka ọ bụrụ ihe ewefere n’ebe ọzọ, ma ọ bụrụ na ọ gaghị abụ igbochị ya nnọọ kpamkpam. Egosịrị na omume o mere ziriezi n’ihi na Chineke nụrụ ekpere ya wee mee ka ọgbụgbandụ ahụ guzosie ike bụ nke sịrị na alaeze nke Devid ga-abụ Alaeze ahụ nke ná-agaghị agwụagwụ.

Onye Jebus Ná-atụ egwù Chineke, na Àjà Devid chụụrụ Chineke

Anyị na-ahụ kwa ugbu a omume ọma dị ebube nke nwoke ọzọ onye nwere mmasị n’ihe nke Devid chọrọ ime. Ọ dị ọtụtụ ihe kpatara Arona jiri chọọ inye Devid ihe ahụ n’efu: Ọ tụrụ egwù maka Devid bụ eze; ihe banyere ndị ahụ na-emetu ya n’obi; ọ chọrọ nnapụta ọsọsọ nke ya onwe-ya kwa; o gosịkwara na ya onwe-ya nwere nsọpụrụ nke Chineke. Arona dị njikere iji óké ihe nke ga-efu kwa ya nnukwu ego were chụọàjà. O jikeere ime òkè nke ya -- ọbụná nke karịrị òkè ya. O jikeere inye ihe niile o nwere ka o wee zọpụta ndụ nke ya na ndụ nke ndị ọzọ n’Israel.

Ma ihe ahụ meere gosịrị omume nke obi Devid. Ọ gaghị eji ihe nke ná-efughị ya ihe ọ bụla wee chụara Chineke àjà. Ọ bụrụ na ọ naara onyinye nke Arona ahụ, àjà ahụ ga-abụ nke Arona chụrụ, ọ gaghị abụ kwa nke ya. Chineke ekwuworị ka Devid chụọàjà ahụ, Devid enweghị mmasị n’ile anya n’ụzọ ọzọ kama n’ụzọ nke Chineke n’okwu ahụ. Ọ dị njikere ịkwụzu ụgwọ ahụ niile.

Ọ bụrụ na e mee ya n’ụzọ ọzọ dị iche, ọ gaghị atọ Chineke ụtọ, bụ Onye chọrọ ka erubere Ya isi n’ụzọ niile ọ bụla n’iwu Ya niile. Dịka ọ dịrị, ọ bụ ezie na Devid kwụzuru ụgwọ nke ala na àjà ahụ, ọ dị kwa àjà nke Arona chụrụ. Emere ka ọ ghara kwa inwe ala ahụ nke o nwere n’oge mbụ, na ụmụ anụmanụ nke ọ nwere na mbụ nke bụ kwa ihe o ji adị ndụ. Ọ bụ onye ga-amalitezi ndụ n’isi n’ebe ọ nọ. Ma ọ ga-amaworị n’ezie na àjà ya ahụ dị mkpà bụrụ kwa ihe ziriezi ma ọ bụrụ na ọ nọ ndụ wee hụ n’ụbọchị ekpughere àtụmààtụ nke Chineke banyere ala ahụ.

Ọ bụrị ihe ekwuworo ekwu na “ebe nke iji-obi-chụa-àjà dị omimi ga-aghọ ulo-ukwuu nke Chineke dị ndụ.” Nke a bụ eziokwu n’ihe nke imemmụọ na kwa n’ihe nke ana-ahụ anya nke ụwa nke a. Ebe achụrụ àjà a bụ n’Ugwu Moraia nke bụ kwa ebe Solomon mesịrị wue Ụlọukwu Chineke. Ebe ịchụ àjà nke a ghọrọ ebe ọtụtụ puku mmadụ ana-apụghị ịgụta ọnụ kpere ekpere wee nata kwa ọzịzá nke ekpere ha.

Chee échìchè banyere ọtụtụ narị puku àjà nke ewetara n’ebe ahụ, nke Chineke narakwara n’ebe ahụ! Chee échìchè banyere ọtụtụ puku mmadụ ana-apụghị ịgụta ọnụ ndị matara na agbaghaara ha mmehie ha n’ebe ahụ! Chee échìchè banyere ọtụtụ ndị edoworo nsọ! Chee échìchè banyere ọtutụ ndị agọziworo! Chee échìchè banyere ọtụtụ ụgwọọlụ n’ezie, n’ihi àjà ahụ nke Arona na Devid chụrụ ka e wee nwee ebe ifè Chineke òfùfè.

Ọkụ nke Chineke sitere n’Eluigwe dakwasị àjà ahụ nke Devid chụrụ n’ebe ahụ. Àjà ahụ bụ ihe anaara nkeọma. Mgbaghara abụrụwo ihe zuruezu. Akwụsịrị iheotiti ahụ n’ebe ahụ. Udo na iruọma nke Chineke wee bịaghachị ọzọ ná mba ahụ bụ Israel, wee bịakwara eze ha bụ Devid. Lee otú o si dị ebube bụ mgbaghara na ebere nke Chineke anyị!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị bụ mmehie ahụ nke Devid mehiere n’oge ihe a mere?
  2. Ọ bụ gịnị ka a ga-asị eleghị anya kpaliri mmehie ahụ?
  3. Ugbò ole ka Akwụkwọnsọ depụtara na e nwere ụdị ịgụ ọnụ ahụ n’Israel?
  4. Òlee otú aka nke Chineke sịrị gbanwee ma mee kwa ka ọ ghara ịdị irè bụ ntụkwasịobi ụgha ọ bụla nke Devid ga-enweworị?
  5. Òlee ụzọ esị taa ahụhụ mmehie ahụ?
  6. Gịnị bụ ihe niile mere banyere ahụhụ ahụ nke ná-esiteghị n’ebe mmadụ nọ?
  7. Gịnị bụ ụdị omume ọma nke Devid na-eme mgbe niile nke egosịrị site ná nrọrọ nke ụdị ikpé nke ọ rọọrọ?
  8. Tụlee omume Devid na nke Sọl mgbe onye ọ bụla nime ha nọ ná nsogbu wee hụ ihe dị iche.
  9. Gịnị bụ omume nke ziriezi nke ị hụrụ ná ndụ na n’akparamagwa nke Arona?
  10. Kwue ụzọ ihe abụọ ọzọ nke mere n’Ugwu Moraia, kwue kwa ihe nkọwa nke imemmụọ nke ụzọ ihe atọ ahụ bụ.