Lesson 248 - Senior
Memory Verse
“Onye agọziri agọzi ka JEHOVA, bụ Chineke, bu, bụ Chineke nke Israel, Onye nání Ya nālu oké ọlu di iche iche” (Abù Ọma 72:18).Cross References
I Alaeze Ebighịebi
1. Onye ahụ dere Abù Ọma na-achọ ka enye Nwa Eze eziomume na ikpé niile nke Chineke, Abù Ọma 72:1; Aisaia 59:16, 17; Jeremaia 23:5, 6
2. Eze ahụ ga-eji eziomume na izu òkè kpee ndị mmadụ ikpé, Abù Ọma 72: 2-4; Aisaia 11:2-5; 9:7; 32:1
3. Alaeze ahụ ga-adị ebighịebi, Abù Ọma 72:5-7; Daniel 2:44; Luk 1:32, 33; Maika 4:7
4. Ọchịchị Eze ahụ ga-ejikọta ihe niile, Abù Ọma 72:8-11; 59:13; 103:19; Daniel 7:14; Nkpughe 21:24-26
5. Eze ahụ ga-anụ ma za kwa ákwá nke onye nọ ná mkpà, ogbenye, na onye ana-akpagbu, Abù Ọma 72:12-14; Aisaia 2:4; Hosea 2:18; Maika 4:3, 4; Aisaia 60:1-22
6. Aga-ebuli Eze ahụ elu ma sọpụrụ kwa Ya, Abù Ọma 72:15-20; Aisaia 2:1-3; Maika 4:1, 2; Luk 1:32, 33; Ndi Filipai 2:9, 11; Nkpughe 19:12, 16
Notes
NKỌWA DỊ ICHEICHEỌkpara Eze ahụ
Ekpere nke Devid, bụ nke edere na Baịbụl nye anyị dịka Abù Ọma nke iri asaa na abụọ, karịrị náánị otù ekpere. Ọ bụ mkwupụta nke okwukwe, na amụma banyere Mesaia n’ụzọ pụtara ìhè. Devid nwere ezi nghọta nke àtụmààtụ nzọpụta nke Chineke, ọtụtụ nghọta pụtara ìhè, ma zue kwa òkè nke Devid banyere Alaeze Chineke ka ekpughere nye anyị n’ekpere a.
Ọ bụ ihe pụtara ìhè nkeọma na ọchịchọ Devid ka enye nwa Eze ikpé niile nke Chineke na eziomume abụghị banyere nwa ya nwoke, Solomon dịka ihe mbụ. Solomon nwere ọchịchị nke ọgan’iru na udo nke ọ dịbeghị nke ruru ka ya n’akụkọ mba Israel ná ndị bu ya ụzọ maọbụ ndị náeso ya. Ma otú ọ dị, ọchịchị nke Solomon bụ ihe-ntà iji ya tụnyere Alaeze ahụ nke Devid na-ekwu ihe banyere ya site na Mmụọ Nsọ. Devid maara Onyenzọpụta ya na Eze na-abịa, ọ bụghị kwa onye ná-enweghị mmasị n’ebe udo ahụ na ịbá ụba nke ga-abụ akụkụ nke Alaeze ahụ nke aga-eguzobe n’ụwa n’ikpeazụ. Ekpere ya bụ ọchịchọ nke ọ bụ Chineke kpaliri ịhụ nguzobe nke Alaeze ahụ ngwangwa.
Ọ bụghị náánị Devid ka Chineke kpugheere nke ntà banyere ebube niile nke Alaeze nke Ọkpara Ya. Aisaia buru amụma banyere Jisọs Kraist na Alaeze Ya: “Amuworo ayi otù nwa, otù nwa-nwoke ka enyeworo ayi; ibu-onye-isi gādikwasi kwa n’ubu-ya: agākpọ kwa aha-ya Onye-ebube, Onye-ndum-ọdu, Chineke Nke bu Dike, Nna nke bu Nna mgbe nile ebigh-ebi, Onye-isi udo” (Aisaia 9:6).
Akawo Kraist akara ịchị site n’oge ntọala ụwa. (Lee I Pita 1:20). Onye dere Abù Ọma ekwuwo sị “Oche-eze-Gi eguzosiwo ike site na mgbe ochie” (Abù Ọma 93:2).
Jọn Onyeozi n’agweetiti nke Patmos hụrụ Ya bụ onye gaje ịchị, wee nụ mkwupụta ahụ nke óké ìgwè mmadụ ahụ: “O kwesiri, bú Nwa-aturu ahu Nke egbuworo egbu, inata ike nile, na àkù, na amam-ihe, na ume, na nsọpuru, na otuto, na ngọzi. M’we nu ihe nile ọ bula ekèrè èkè nke di n’elu-igwe, na n’elu uwa na n’okpuru uwa, na n’elu oké osimiri, ha na ihe nile di ha nime, ka ha nāsi, Ọ bu Onye ahu Nke nānọkwasi n’oche-eze ahu, Ya na Nwa-aturu ahu, ka ngọzi nile na nsọpuru nile na otuto nile na ike nile diri rue mgbe nile ebigh-ebi” (Nkpughe 5:12, 13).
Ọchịchị n’Eziomume
Jisọs Kraist bụ Onyeọchịchị kwesịrị nke Alaeze a, Ọ ga-achị kwa n’Eziomume. Anyị na-agụ n’ọtụtụ ebe n’Akwụkwọnsọ banyere eziomume nke Eze ahụ na ụdị nke ikpé Ya niile. “Onye ezi omume ka I bu, JEHOVA, ọzọ, ihe ziri ezi ka ikpe-Gi nile bu” (Abù Ọma 119:137). “Ezi omume-Gi bu ezi omume nādiru mgbe ebigh-ebi” (Abù Ọma 119:142); na “Ezi omume na ikpe ziri ezi bu ọnọdu guzosiri ike nke oche-eze-Ya” (Abù Ọma 97:2). Iwu Ya niile, ikpé Ya niile, okwu Ya niile bu eziomume. (Lee Abù Ọma 119:172; 19:9; 119:123). “Onye ezi omume ka JEHOVA bu n’uzọ-Ya nile, Ọ di kwa ebere n’ọlu-Ya nile” (Abù Ọma 145:17). Anyị gụkwara, “Ọ gēji ezi omume kpe ndi nile di iche iche ikpe” (Abù Ọma 96:13). Ndịa bụ olenaole nke ebeọgụgụ sitere na Baịbụl ná-akọwa eziomume nke ọchịchị Eze ahụ.
Ala Maramma
Aisaia Onyeamụma chịkọtara ọnụ n’okwu olenaole banyere ọtụtụ nke Alaeze Chineke n’eluụwa nke a, “Ọ digh ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi Ya na udo-Ya gāgwu” (Aisaia 9:7). Anyị na-agụ site n’ebeọgụgụ anyị na “Ọ gārida dika miri-ozuzo si ezokwasi n’ọzara asuru asu: dika oké miri-ozuzo nēdè ala. Onye ezi omume gāma akwukwọ n’ubọchi nile ya dika osisi ndu; ọtutu udo gādi kwa rue mgbe ọnwa agagh-adi.” Ebe ọgugu ọzọ dị icheiche yiri ebeọgụgụ anyị na-abịa kwa n’échìchè. “Ọ gēkpe kwa ikpe n’etiti ọtutu ndi di iche iche dozi-kwa-ra mba di iche iche nwere ume okwu-ha rue ebe di anya; ha gākpughari kwa mma-agha-ha nile ka ha buru mma-ogè, na ube-ha nile ka ha buru mma-ikwa-osisi: mba agagh-ebuli mma-agha megide mba, ha agagh-amuta kwa agha ọzọ. Ma ha gēbi, onye ọ bula n’okpuru osisi vine ya na n’okpuru osisi fig ya; ọ digh kwa onye gēme ka ha ma jijiji” (Maika 4:3, 4).
Ebe ọgụgụ ọzọ mara mma n’Akwụkwọnsọ na-akọrọ anyị maka udo nke Alaeze Chineke ahụ n’eluụwa: “Ha gēwu kwa ulo, biri nime ha; ha gāku kwa ubi-vine, rie nkpuru-ha. Ha agagh-ewu ulo, onye ọzọ ebichie; ha agagh-aku, onye ọzọ erie: n’ihi na dika ubọchi nile nke osisi di, otú a ka ubọchi nile nke ndim gādi, ndi M’rọputaworo gēnwe kwa ihe aka-ha lutara mgbe di anya nke-uku. Ha agagh-adọgbu onwe-ha n’ọlu n’efu, ha agagh-amu umu nye obi-ọlulọ-miri: n’ihi na nkpuru nke ndi JEHOVA gọziworo ka ha bu, ha na umu gēsi ha n’aru puta: ọ gēru kwa na, tutu ha akpọ, Mu onwem gāza; mgbe ha onwe-ha nọ nēkwu okwu, Mu onwem gānu” (Aisaia 65:21-24).
Ọchịchị Ruru Ụwa niile
N’oge ọchịchị nke Eze Solomon mba nke Israel toruru n’ọnọdụ dị elu nke-ukwuu n’etiti mba niile. Mba dị icheiche nke ụwa webatara ngwaahịa ha n’Israel, ma nye kwa Eze Solomon onyinye dị ókéọnụahịa n’ịtụụtụ na otuto banyere amamihe ya. Ezenwanyị Sheba si n’ebe dị anya bịa ile Solomon; wee gwa ya banyere obí na ndị ná-ejere ya ozi, na usoro òfùfè Chineke ya: “Ma, le, egosighm nkera uba amam-ihe-gi: i tukwasiwo ihe n’akukọ nke m’nuru. Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndikom-gi bu, ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi-orù gi ndia bu, ndi nēguzo n’iru-gi mgbe nile, ndi nānu amam-ihe-gi” (2 Ihe Emere 9:6, 7).
Nke a bụ náánị ihe-atụ nke ụzọ ahụ nke ndị eze nke ụwa ga-abịa ịsọpụrụ na iweta ihe igosi óké nsọpụrụ ha nye Ọkpara nke Eze ahụ n’oge ahụ nke ọchịchị Ya. Site n’ebe-ọgụgụ anyị, anyị na-agụ na “Ndi-eze Tashish na nke ala nile di oké osimiri gburugburu gēnye onyinye-inata-iru-ọma: ndi-eze Sheba na Seba gēweta ùtú nso. E, eze niile gākpọ isi ala nye ya: mba niile gāfè ya òfùfè.”
Ọchịchị Solomon nwere ike n’ebe mba niile ahụ nke ọ na-achị dị, ma Alaeze nke Chineke n’eluụwa ga-enwe ike ọchịchị ya n’akụkụ niile nke ụwa. Kraist ga-eji mkpá-n’aka igwè chịa; mba niile ná-amaghị Chineke ga-abụ ihenketa ya, na nsọtu niile nke ụwa ga-abu ihe onwunwe-Ya (Gụọ Abù Ọma 2:8, 9).
Daniel hụrụ ọhụ nke ụbọchị ikpeazụ ndị a, wee depụta: “Anọm nāhu ọhu nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka Nwa nke madu, nọ nābịa n’igwe-oji nke elu igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n’iru Ya. Ọ bu kwa ya ka enyere ọchichi, na ebube, na ala-eze, ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nile nāsu asusu di iche iche we fè Ya: ọchichi-Ya bu ọchichi ebigh-ebi, nke nāgagh-agabiga, ọ bu kwa ala-eze-Ya bu nke anāgagh emebi” (Daniel 7:13, 14).
Nsọpụrụ nke Mba niile
“N’ihi ulo uku Gi nime Jerusalem ọ bu Gi ka ndi-eze gēdukuru ùtú” (Abù Ọma 68:29). Ebeọgụgụ anyị na-asị na “A gēnye kwa ya ufọdu n’ọla-edo Sheba” (Abù Ọma 72:15). Àmúmà dị icheiche nke Aisaia na-ekwu banyere ndị ahụ ga-abịa inye Eze ahụ nsọpụrụ ha: “Mba nile gējeru kwa ìhè-gi, ndi-eze ejerue onwu-maramara nke ọwuwa-gi.” “Ìgwè camel gēkpuchi gi, umu-camel nke Midian na Ifa: ha nile gēsi na Sheba bia: ọla-edo na frankincense ka ha gēbute, ọ bu kwa ozi ọma otuto JEHOVA ka ha gēzisa. Ìgwè ewu na aturu nile nke Kida ka agāchikọtara gi, ebulu nile nke Nebaiot gējere gi ozi: ha gārigota n’ebe-ichu-ajam dika ihe nātọ utọ, M’gēme kwa ulo nke ima-nmam ka ọ ma nma” (Aisaia 60:3, 6, 7).
Aha Ebighịebi
Mba dị icheiche agabigawo ba n’ebe agaghị ahụta kwa ha ọzọ, ọtụtụ ìgwè mmadụ efunarịwo n’anya ba n’ílì. Ndị eze na ndị isi ana-apụghị ịgụta ọnụ agawo n’ụzọ niile nke anụarụ bụ mmadụ na-apụghị kwa ịhụ maọbụ nụ olu ha ọzọ. Echezọwo aha ha, ọ bụ náánị olenaole ka edepụtaworo n’akwụkwọ dị icheiche nke akụkọ mgbe ochie.
Ma Eze ahụ nke gaje ịchị ụwa niile nwere aha nke ọ dịghị mgbe echefuworo ya, nke ana-apụghị kwa ichefu, site n’oge ná-adịghị agwụ agwụ nke ebighịebi. Ka ọtụtụ arọ na-agabiga ka aha ebube Ya na-amụwa ná-aga n’iru. Ọ dịghị mgbe emebiworo aha Ya site ná mmalite, ọ ga ná-amụ kwa ná-enweghị ọgwụgwụ rue ebighịebi. “Ka aha-Ya dirue mgbe ebigh-ebi; n’iru anyanwu ka aha-Ya gāmu ọmùmù: madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya: mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke ọma” (Abù Ọma 72:17).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Ònye bụ Ọkpara Eze ahụ?
- Òlee otú anyị si mata na Devid anaghị ekpe ekpere banyere Solomon n’Abù Ọma nke a?
- Gịnị bụ ókè nke Alaeze a?
- Kọwaa ụdị ọchịchị ga-adị n’oge ọchịchị nke Ọkpara Eze ahu.
- N’ihi gịnị ka Eze ahụ ga-eji ná-anata óké nsọpụrụ site n’aka ndị eze na mba ọzọ dị icheiche?v
- N’ihi gịnị ka ana agaghị echefu aha Eze nke a?