Lesson 235 - Junior
Memory Verse
“Ka obi unu ghara ilọ miri, ka ọ ghara kwa itu ujọ” (Jọn 14:27).Notes
Mgbe Ememe nke Oriri Ngabiga Gasịrị
Jisọs na ndị náesoụzọ Ya jikọtara ọnụ mee Ememe Ngabiga. Mgbe oririanyasị ahụ gasịrị, Jisọs gwara ha okwu banyere ihe niile nke gaje ime. Oge ịrara Jisọs nye na oge ọnwụ Ya bịaruru nso, Jisọs wee gwa ndị náesoụzọ Ya okwu ịgbáume.
Jisọs dụrụ ndị náesoụzọ Ya ọdụ ka ha ghara ikwe ka obi lọọ ha mmiri. N’ezie, ọtụtụ ihe emewo iwetara ha obiịdambá, ịnwapụta okwukwe na ntụkwasịobi ha. Ná arụghịụka, ihe banyere Judas Iskarịọt metụrụ ha, bụ onye rapụrụ òtù ahụ mgbe nrianyasị ahụ gasịrị wee pụọ nime abalị ahụ. Jisọs Ò kwughị na otù onye nime ha ga-arara Ya nye? Jisọs Ò surughị iberibe achịcha wee nye Judas Iskarịọt? Gịnị ka ihe ndị a niile na-egosi? Otù onye nime mmadụ irinaabụọ ahụ, ọ ga-arara Kraist ya nye?
Eleghịanya, ọ bụ ihe ịtụn’anya nye ha banyere Pita onye sịrị na ya jikeere ịtọgbọ ndụ ya n’ihi Kraist. Pita ekwururị na agaghị eme ka ya maa n’ọnyà n’ihi Kraist ọbụná ma asị na emere ka ndị ọzọ maa n’ọnyà (Matiu 26:33). Jisọs etoghị Pita n’ihi okwu ahụ kwesịrị ntụkwasịobi o kwuru, Ọ baghị kwara ya mba n’ihi ịtụkwasị onwe-ya obi. Jisọs gwara Pita sị: “N’abali a, mgbe oké ọkuku akākwagh ákwá, I gāgọnarim ugbò atọ” (Matiu 26:34).
Iburu ụzọ Dọọ Akanántị.
Jisọs adọwo ha akanántị banyere ọnwụ-Ya, na aga “Eweli Ya elu site n’ala, … nēgosi aha ọnwu ọ gaje inwu” (Jọn 12:32, 33). Onyendú ha ọ gaje iwezuga onwe-ya site n’ebe ha nọ ná-enweghị olileanya?
Tụkwasị nke a, aghaghị ịgwa ndị náesoụzọ Jisọs banyere ahụhụ nke ga-adakwasị ha mgbe Kraist rapụrụ ha (Jọn 16:2). Ha aghaghị ịnụ banyere ihe ịtaụta nke gaje ịbịa, na ụwa ga-akpọ kwa ha asị n’ihi na ọ kpọrọ Kraist asị (Jọn 15:18).
Okwu niile nke Nkasiobi Niile
Iheọmụmụ anyị bụ akụkụ nke okwu ikpeazụ Jisọs na ndị náesoụzọ Ya kwukọrịtara, bụ ndị dị Ya n’obi tutu amalite ikpé Ya. Iji wepụ ihe mgbu nke échìchè niile ha, Jisọs kwuru okwu nkasịobi ndịa: “Ka obi-unu ghara ilọ miri: kwerenu na Chineke, kwere-kwa-nu na Mu.” Ọ bụghị náánị na okwu ndịa bupụrụ ibu arọ dị n’obi ndị náesoụzọ Jisọs n’oge ahụ, kama ọ bụrụwo kwa nke náeme ka obi dajụọ ọtụtụ ndị náesoụzọ Kraist nime arọ niile ndịa. Okwu niile nke Kraist enyeworo ha aka idebe okwukwe na ntụkwasịobi ha nime Ya.
“Ka obi-unu ghara ilọ miri” Ndị ọzọ pụrụ inwe mgbagwojuanya banyere ihe ha ga e kwere na ya, na kwa nime onye ha ga atụkwasịobi. Ma ndị náesoụzọ Kraist, onwe ha ekwesịghị inwe nsogbu ná enweghị òzùzù ike banyere ọdịn’iru. Site na ntụkwasịobi ha nime Onyenwe anyị ndị náesoụzọ Kraist pụrụ iguzogide mmegide na ọnwụnwa ọ bụla.
Anaeji Obi
Jisọs ekwughị na ha agaghị enwe nsogbu nime échìchè ha. Ọ sịrị ka obi ghara ịlọ ha mmiri! Anyị na-atụkwasị Chineke obi anyị niile, ọ bụghị échìchè anyị. Nzọpụta adịghị esite n’obi; ọ bụ mnwapụta nke anaenweta mgbe obi anyị ziriezi n’ebe Chineke nọ. “Anēji obi kwere rue ezi omume; anēji kwa ọnu kwuputa rue nzọputa” (Ndi Rom 10:10). Mgbe ọ bụla obi mmadụ dị n’ebe Onyenwe anyị nọ ọ dịghị enwe mkpagbu nime iche uche ya. Pọl deere Ndị Filipai na “Udo nke Chineke, nke kachasi uche nile, gēche kwa obi unu na echìche-uche-unu nche nime Kraist Jisus” (Ndi Filipai 4:7).
Taa, anyị amaghị ihe chere anyị n’iru, ma okwukwe anyị matara na “ihe nile nālukọ ọlu iwetara ndi huru Chineke n’anya ezi ihe” (Ndi Rom 8:28). Onye dere Abù Ọma dere banyere onye ná-atụ egwù Chineke ná-edebe kwa iwu Ya: “Ọ gagh-esite n’ihe ọjọ anuworo tu egwù: Edoziwo obi-ya, ebe ọ nātukwasi JEHOVA obi” (Abù Ọma 112:7). Nime Akwụkwọ Ilu anyị na-agụ. “Kari ihe-ndebe-gi nile chebe obi-gi; n’ihi na site na ya ka nputa nile nke ndu di” (Ilu 4:23).
Okwukwe
Ikwere na Chineke na-egbochirị mmadụ isogbu onwe-ya. Devid sị na ya gara eme añaa ma asị na ya ekwereghị (Abù Ọma 27:13). Mmadụ pụrụ inwe ihe mmetụta, ibu arọ, na ọnwụnwa ma ọ dịghị mgbe obi ahụ nwere ntụkwasịobi ga-eru ọnọdụ nke inwebiga obi abụọ ókè na nke enweghị olileanya. Onye dere Abù Ọma sịrị: “Gini mere i ji su ude nke-uku nimem? Chere Chineke” (Abù Ọma 42:5).
Ntụkwasịobi
Jisọs chọrọ ka ndị náesoụzọ Ya nwee ụdị ntụkwasịobi ahụ nime Ya bụ nke ha nwere nime Chineke. Ọ chọkwara ka ha kwere na Ya. Ọ dị kwa mkpà taa na anyị ga-ekwere na Jisọs. Ọtụtụ mmadụ maara Chineke dịka ndị Ju nke Testament Ọhụụ matara, ma iji nwee ndụ ebighịebi mmadụ aghaghị kwa ikwere na Jisọs (Jọn 3:16). Nzọpụta na-abịa site n’ikwere n’Onyenwe anyị Jisọs Kraist (Ọlu Ndi-ozi 16:31). Anyị aghaghị ikwere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke.
Idozi Ebe
Jisọs gwara ndị náesouzọ Ya na Ya gaje ịpụapụ. E nwere ihe kpatara ọpụpụ Ya. O nwere ọlụ Ọ gaje ịlụ. O kwuru na Ya ga-edoziri ha ebe. N’eluigwe, ebe Chineke Nna nọ, ọnọdụ dịrị ọtụtụ mmadụ. Jisọs nọ n’ebe ahụ ugbu a ná-edeziri ndị náesoụzọ Ya ihe. Ọ bụrụ na i nwewo nzọpụta, Jisọs na-edoziri gị ebe.
E kwuwo na ụdị ndụ anyị biri n’ebe a bụ ihe ga-egosi ụdị ngwaọlụ aga-eji lụara anyị ebe-obibi ahụ. Ụdị ngwa ọlụ dị añaa ka ị na-eziga maka idoziri gị ebe-obibi -- “ọla-edo, ọlaọcha, nkume di oké ọnu, osisi, ahịhịa, okporo-ọka”? (Gụọ I Ndi Kọrint 3:11-15). Dịka ihe ị na-eme si dị, ì chere na ị kwesịrị inwe ebe obibi dị ukwuu makwara mma? Eleghịanya ị ga-enwe nke ka mma site n’ịlụ ọlụ karị nke ịlụworo nye Jisọs na ndị ọzọ.
Nlaghachị Ya
Jisọs kasiri ndị náesoụzọ Ya obi site n’ịgwa ha na ọ bụrụ na Ya laa na Ya ga-alaghachị ọzọ. Ọ ga-abịa ịkpọrọ ndị Ya ka Ya na ha nọdụ. Anyị matara na Jisọs lara. Nime Akwụkwọ Ọlụ Ndiozi anyị na-agụ banyere otú O si rịgoo n’Eluigwe. “Mgbe ọ kwusiri okwu ndia, mgbe ha nēle anya, ewe welie Ya elu; igwe-oji we nara Ya, Ọ pua n’anya-ha” (Ọlu Ndi-ozi 1:9). Ọ bụ kwa ihe doro anya na Jisọs ga-abịa ọzọ. Jisọs sịrị “Agajem ibia ọzọ.” Mgbe Jisọs rịgosịrị, ndịkom abụọ yi uwe ọcha gwara ndị ahụ sị, “Jisus nka, Onye anapuru n’ebe unu nọ rigo n’eluigwe, gābia n’otù aka ahu dika unu kiriri Ya ka Ọ nāga n’elu-igwe” (Ọlu Ndi-ozi 1:11).
Ihe Mere O ji Náabịa
Gịnị mere Jisọs ji abịa ọzọ? Ọ na-abịa maka ndị Ya, ndị jikeworo onwe-ha ná-eche kwa nche. Ọ na-abịa maka ndị ahụ jikeworo onwe-ha ibi n’ebe ahụ edoziworo n’Eluigwe.
Ọbịbịa Jisọs dị nso nke ukwuu. Anyị ga-ejikere onwe-anyị, n’ihi na ohere agaghị adị iji jikere mgbe opiike dara. Akwụkwọozi nke Jemes dụrụ anyị ọdụ sị “Unu onwe-unu, nātachi-kwa-nu ogologo ntachi-obi; menu ka obi unu guzosie ike: n’ihi na ọbibia nke Onye-nwe-ayi di nso” (Jemes 5:8).
N’ọbịbịa Ya, aga-achịkọta ndị nke Jisọs “si ‘ifufe anọ zukọ, site n’otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ” (Matiu 24:31). Otú a “ka ayi na Onye-nwe-ayi gānọ kwa mgbe nile” (I Ndi Tesalọnaika 4:17).
Ajụjụ Dị Icheiche
Ụfọdụ nime ndị náesoụzọ Ya nwere ajụjụ dị icheiche. Tọmas jụrụ ajụjụ banyere ụzọ ahụ. Ná-arụghịụka o chere na Jisọs na-aga n’ebe obibi nke ụwa nke a, n’ihi na ndị náesoụzọ Ya lewororị anya n’oge ahụ na Jisọs ga-edo alaeze nke ga-anọ nwa mgbe ntà n’ụwa a. Nke a bụ nzaghachị Jisọs nyere ya: “Mu onwem bu ụzọ, na ezi-okwu, na ndu ọ digh onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbugh site na Mu.”
Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ
Jisọs bụ ụzọ anyị rue Eluigwe na Onye ga-eduba anyị na ndụ ebighịebi. “Aha ọzọ di iche adịgh kwa n’okpuru eluigwe, nke enyeworo n’etiti mmadu, nke anāghaghi izọputa ayi nime ya” (Ọlu Ndi-ozi 4:12). Site n’isoro ihe nlereanya nke Jisọs na òzízí Ya, anyị na-achọta ụzọ nke Eluigwe, wee nwee kwa ndụ ebighịebi. Ọbụ náánị Ọbara Jisọs ga-ehichapụ mmehie anyị niile wee jikere anyị ịba n’Eluigwe. Jisọs bụ ezi Ụzọ ahụ nke ndụ “Uzọ nke idi nsọ ka agākpọ kwa ya; onye ruru áru agagh agabiga na ya; … ma ndi emeworo ka ha nwere onwe-ha nēje ije n’ebe ahu” (Aisaia 35:8, 9).
Arịrịọ nke Filip
Filip rịọrọ ka egosi ha Nna ahụ. Filip ahụwo Jisọs ọtụtụ ugbò. Ọ na-agwa Ya okwu. Jisọs bụ “onyinyo Chineke” (2 Ndi Kọrint 4:4), “onyinyo nke udi-Ya” (Ndi Hibru 1:3). Ebe ọ bụ na ọ hụwo Jisọs, Filip gaara amata Nna ahụ, site na ndụ Jisọs na-ebi. Filip hụrụ Jisọs, n’anụarụ ma ugbu a anyị na-ahụ Ya site n’okwukwe. Jisọs sịrị na anyị kwesịrị ikwere n’okwu niile Ya kwuru, n’ihi na okwu Ya na ọlụ Ya niile na-egosi na Chineke na-alụ ọlụ nime Ya.
Nke kachasị, Jisọs kwuru na ndị kwere ekwe ga-enwe ike iji lụọọlụ ukwuu dị icheiche nye Chineke mgbe Jisọs laworo. Jisọs sịrị na ha ga-enwe ike iji lụọọlụ ukwuu dị icheiche karị nke Ọ lụworo. Tutu oge a, Jisọs enyewo ha-rị ike ịlụọlụ ebube dị icheiche. O zipụwo ndịozi irinaabụọ ahụ ijé mkwusa, ná-asị kwa, “Ala-eze elu-igwe di nso.” Jisọs gwakwara ha sị, “menu ndi aru-ha nādigh ike ka aru di hà ike, menu ndi nwuru anwu ka ha si n’ọnwu bilie, menu ndi ekpenta ka ha dị ọcha, chupunu ndi-mọ ọjọ” (Matiu 10:7, 8). Ha “nāchupu kwa ọtutu mọ ọjọ, were kwa manu olive te ọtutu ndi-nriaria, we me ka aru di ha ike” (Mak 6:13).
Nrọpụta nke Chineke
Mgbe Jisọs laghachịkuru Nna Ya, ndị náesoụzọ Ya nọgidere ịgbasa Oziọma. Chineke akwadobewo na Ya ga-enye ha “Onye-nkasiobi ọzọ” mgbe Jisọs lara (Jọn 14:16) onye Ya na ha ga-anọgide, onye ga-anọ kwa nime ha inye ha ike (Jọn 14:17). Ndị náesoụzọ Ya ga-alụ ọlụ ịrịbaàmà dị icheiche gbasaa kwa Oziọma. Ndị náesoụzọ Ya na Jisọs gana-enwe mmekọrịta site n’ekpere. Ha ga-alụ ọlụ ịrịbaàmà dị icheiche site n’ekpere na okwukwe n’ike nke Chineke. Jisọs kuziri ndị náesoụzọ Ya na ike dị n’ekpere. Ihe ọ bụla ha rịọrọ n’aha Jisọs, na Ọ ga-emezu Ya.
Mgbe Jisọs rapụrụ ndị náesoụzọ Ya, ọtụtụ ọlụ dị ebube ka alụrụ site n’ike nke Chineke. Anyị na-echeta na emewo ka arụ dị otù nwanyị ike site n’imetụ ọnụ uwe Jisọs aka (Matiu 9:20-22). Ọbụná ọlụ ịrịbaàmà dị icheiche karịrị ukwuu ka asịrị na ndị náesoụzọ Ya ga-alụ mgbe ha natasịrị mkwà nke Nna (Ọlu Ndi-ozi 1:4; Jọn 14:12), bụ nke dakwasịrị ha n’ụbọchị Pentikọst (Ọlụ Ndi-ozi 2:1-4). “Chineke lụkwara ọlu di ike site n’aka Pọl dika anāhugh mgbe ọ bula: ya mere anēsi n’aru-ya wetara ndi aru-ha nādigh ike ichafọ ma-ọbu ákwà apron, ọria-ha we la n’aru-ha, ajọ mọ nile aputa kwa” (Ọlu Ndi-ozi 19:11, 12). Ndị ọzọ arụ ná-adịghị ike ka ana-atọgbọ n’akụkụ ụzọ maka ọgwụgwọ, ka mgbe Pita na-aga, ka ọbụná náánị onyinyo-ya e wee kpuchie ha (Ọlu Ndi-ozi 5:15). Mgbe Pita kwusịrị òtù nime mkwusa ya, ọtụtụ ìgwè mmadụ chègharịrị. “Ndi nara okwu ya nke ọma, emere ha baptism: n’ubọchi ahu ewe tukwasiri ha ihe ra ka nnù madu asa na ọgụ iri” (Ọlu Ndi-ozi 2:41).
Ụdị ike dị otù a bụ ihe Chineke rọpụtaara ndị Ya n’ụwa. N’Eluigwe Jisọs na-akwadoro ha ebeobibi. Chineke na-arọpụtara ndị Ya ihe n’ụwa a na kwa n’Eluigwe. Ọ na-enye ike kwa ụbọchị, ná-enye kwa olileanya ná-enwuenwu nke ndụ ebighịebi dị n’iru.
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Kpọọ aha ụfọdụ ihe mere ka obi lọọ ndị náesoụzọ Jisọs mmiri.
- Gịnị mere mmadụ ga-eji kwere na Jisọs kwere kwa na Chineke?
- Gịnị mere Jisọs ji rapụ ndị náesoụzọ Ya?
- Òlee ebe O jere?
- Òlee otú anyị si mara na Jisọs ga-abịa ọzọ?
- N’ihi onye ka Ọ na-abịa?
- Gịnị bụ mkwà Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya banyere ekpere?
- Gịnị ka e kwere ndị náesoụzọ Jisọs na mkwà na ha ga-alụ ọbụná ọlụ dị karị nke Jisọs lụrụ?
- Gịnị ka Chineke rọpụtaara ndị Ya n’ụwa?
- Gịnị ka Jisọs n’edoziri ndị Ya n’Eluigwe?