Jọn 15:1-27

Lesson 236 - Junior

Memory Verse
“Nka bu ihe M’nyere n’iwu, ka unu hurita ibe-unu n’anya dika M’huru unu n’anya” (Jọn 15:12)
Notes

Ejikọtara Ọnụ

Jisọs matara na oge ná-adịghị anya, na Ya ga-arapụ ndị náesoụzọ Ya wee laghachị n’Eluigwe ọ chọghị ka ha nọọ náánị mgbe ha ná-agaghị ahụ Ya ọzọ, n’ihi nke a Ọ tụụrụ ha ilu iji gosi ha na Ya ga anọgide n’ịnọ ha nso -- dịka osisiVine na-anọ alaka ya nso ejikọtaraọnụ. O wee gosị na Chineke anọghị kwa n’ebe dị anya. Chineke dị ka Onye nlekọta kwesịrị ntụkwasịobi nke ubiVine. Ọ na-eji nlezi anya ná-eche Vine na alaka ya niile dị nrò nche. Ịhụn’anya Chineke jikọtara anyị niile Chineke Nna (Onye-ọlụ-ubi), Jisọs (ezi osisi-Vine), na ezi ụmụ azụ Ya (alaka niile ahụ) -- nime ezi mmekọrịta.

Ndịozi matara na Chineke hụrụ Jisọs n’anya. Ụfọdụ nime ha anụwo olu Ya site n’Eluigwe, ka Ọ na-asi, “Onye a bu Ọkparam M’huru n’anya, Onye ihe-Ya dim ezi nma” (Matiu 17:5). Ha anụwokwa ka Jisọs kpere ekpere: “Nna, ekelem I na I nuru olum. Ma Mu onwem matara na I nānu olum mgbe nile” (Jọn 11:41, 42). N’ezie ọ dị óké ịhụn’anya dị n’etiti Nna na Ọkpara nke kpalịrị inwe ntụkwasịobi dị otú a!

Jisọs wee gwa ndịozi ahụ. “Dika Nna hurum n’anya, Mu onwem hukwara unu n’anya” Lee óké ịhụn’anya dị otú a nye anụ-arụ bụ mmadụ! Ị pụrụ ịtụle na Jisọs hụrụ anyị n’anya, bụ ụmụ Ya kwesịrị ntụkwasịobi, n’otù aka ahụ Nna Ya sị hụ Ya n’anya?

Irubeisi rue Ọnwụ

Otù ihe mere Chineke ji hụ Jisọs n’anya bụ na O jikeere ịnwụ n’ihi ndị mmehie. Mgbe Chineke ledatara anya n’ụwa nke mmehie a wee hụ na obi ụmụmmadụ bụ náánị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị niile, O wee kwupụta n’Eluigwe na ndị ahụ niile aghaghị ịnwụ wee bụrụ kwa ndị aga-enye ahụhụ dị óké egwù ma ọ bụrụ na otù onye ná-enweghị mmehie ejikereghị ịnwụchịtara ha ọnwụ. Jisọs na-ege ntị mgbe Nna Ya kwuru okwu ahụ, O wee zaghachị na Ya ga-eje, dịka esi tụọ àtụmààtụ ya site n’oge ịtọ ntọala nke ụwa (Nkpughe 13:8). O jikeere ịrapụ Eluigwe ebe onye ọ bụla hụrụ Ya n’anya ná-efè kwa Ya òfùfè, wee bịa biri n’ụwa ebe Ọ matara na aga-akpọ Ya asị kpọgide kwa Ya n’obe, ka ewee zọpụta mụ na gị. O jikeere ịhụrụ anyị ahụhụ wee buru kwa mmehie anyị. “Ọ weda-kwa-ra Onwe-ya, we buru Onye na-aña nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe. N’ihi nka Chineke weli-kwa-ra Ya elu nke-uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu” (Ndi Filipai 2:8, 9). Jisọs nwụrụ n’ihi otuto nke Chineke, na n’ihi na Ọ hụrụ ndị mmehie n’anya nke ukwuu iji Ọbara Ya zụta ha nye onwe Ya.

Ịhụrịta Onweanyị n’anya

Ọ bụghị náánị Chineke Nna, na Chineke Ọkpara nwere ịhụ-n’anya. Ugbu a Jisọs wee nye iwu sị, “Hurita ibe-unu n’anya dika M’huru unu n’anya.” Ọ sịrị, “Ọ digh onye ọ bula nwere ihun’anya kari nka uku, ka mmadu tọgbọ ndu-ya n’ihi ndị eyi-ya.” Ọ chọkwara ka anyị nwee ịhụn’anya dị otú a.

Mgbe Pọl Onyeozi degaara ndị Filipai akwụkwọ, ọ siri, “Nwenu uche a nime onwe-unu, nke di kwa nime Kraist Jisus.” Ọ bụrụ na Jisọs jikeere inye ndụ Ya ka Ọ zọpụta mkpụrụobi anyị, anyị aghaghị kwa ijikere inye ndụ anyị iji wee nyere Jisọs aka zọpụta ndị ọzọ.

Ọ dịghị onye ọ bụla apụrụ ịzọpụta ná-ejighị Ọbara Jisọs, ya mere anyị apụghị ịzọpụta onye ọ bụla n’onwe anyị, ọbụná ma asị na anyị nwụrụ n’ihi ha. Ma Jisọs chọrọ ka anyị were ndụ anyị chụaọ àjá iji nyere Ya aka gbasaa akụkọ nke nzọpụta n’ime ụwa niile. Anyị pụkwara imere Ya ihe dị ukwuu karịa site n’ibi ndụ anyị nye Ya, karị kwa ma asị na anyị nyere ndụ anyị ka ewepụ ya. Ma inye Chineke onweanyị na ijere Ya ozi aghaghị ịbụ ihe dịkarịsịrị óké mkpà nime ndụ anyị. Anyị adịghị echegbu onweanyị banyere ebe anyị bi, ihe anyị ga-eri, maọbụ ihe anyị na-eyikwasi, dịka anyị na-enwe banyere irita mkpụrụobi furu efu n’urù nye Jisọs. Anyị hụrụ mmadụ niile n’anya nke ukwuu nke mere na ọ ga-adị anyị mma ịhụ na ha gara n’Eluigwe ibinyere Jisọs mgbe niile ebighịebi; anyị jikekwara ịlụsị ọlụ ike iji nyere ha aka.

Okwu ahụ Ịnọgide nime Anyị

Jisọs sịrị, “Unu onwe unu bu ndi-eyim, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n’iwu.” Ị matara ihe iwu Ya niile bụ? Ị matara ụfọdụ nime ha? Ma nleru anya dị añaa ka ị na-aghaghị inwe iji mụọ Baịbụl ka i wee mara okwu niile nke Jisọs? Site n’akwụkwọ niile nke Matiu, Mak, Luk na Jọn anyị na-enwe okwu ahụ niile Jisọs n’Onwe Ya kwuru mgbe Ọ nọrọ n’ụwa. Ma ugbò ole ka i na-ele iji hụ ihe ha bụ? Ọ ga-abụ na ịgụwo ha mgbe ụfọdụ, ma ịpụghị icheta ha niile. Anyị niile aghaghị ịdị ná-eleba anya nime okwu ahụ kwa-ụbọchị iji hụ na o doro anyị anya na anyị na-eme ihe Jisọs sịrị anyị mee.

Okwu Ya niile aghaghị ịnọgide nime anyị.

Jisọs gwara ndịodeakwụkwọ na ndị-Farisi sị, “Unu nēnyocha ihe edeworo n’akwukwọ nsọ; n’ihi na unu onwe unu nēchè na unu nēnwe ndu ebigh-ebi nime ha.” Ọ na-eju gị afọ ichè na ị nwewo ndụ ebighịebi n’ihi na azọpụtawo gị, doo gị asọ, i wee nwee kwa ụbọchị iji mee ka o doo gị anya na i nọ ná njikere izute Jisọs?

Ime ka Adị Ọcha site n’Okwu ahụ

Jisọs sịrị, “Unu onwe unu di ọcha n’ihi okwu nke M’gwaworo unu.” Ọ bụ ihe ná-aghaghị ime na anyị ga-adị ọcha iji nwee njikere izute Jisọs; ma agana-asacha anyị ọbụná mgbe edosịrị anyị nsọ, site “n’ọsisa miri n’okwu Chineke.” Ka anyị na-anọgide ná-agụ okwu niile nke Jisọs, anyị na-achọpụta ihe ọhụụ dị icheiche Ọ chọrọ ka anyị mee, ewee ná-echetakwara anyị ịhe niile ndị ọzọ anyị matawororị, nke anyị lefuwokwara anya. Ọ bụrụ na anyị gaje ịnọgide nime ezivine ahụ, anyị aghaghị idebe Okwu Chineke nime obi anyị.

“Ọ buru na unu nānọgide nimem, ọ buru kwa na okwum nānọgide nime unu, riọnu ihe ọ bula unu nāchọ, agēme-kwa-ra unu ya.” Ọ bụrụ na-azabeghị ekpere anyị o ziri ezi ka anyị nyochaa obi anyị ịhụ ma okwu niile nke Jisọs ọ “nānọgide” nime obi anyị. Mkwà niile O kwere aghaghị ada. O kwuru eziokwu mgbe Ọ sịrị na Ya ga-aza ekpere anyị niile. Ya mere ọ bụrụ na ọ dịghị anụ mgbe anyị kpere ekpere, ọ ga-adị nnọọ mma ileba anya nime Okwu ahụ ịhụ ma ọ dị ụfọdụ ihe O nyere n’iwu nke anyị lefuuru anya maọbụ nke anyị ná-agụghị n’ihe bara urù. Ọ pụrụ ịbụ na mmehie abatawo nime obi mmadụ ahụ bụwororị onye nke Kraist na mbụ, ma site ná-enweghị nleruanya, ọ dịghị amata rue mgbe o lebara anya nime Okwu ahụ wee hụ iwu nke o mebiworo. Asị na o lebaghị anya ọ gaghịrị aghọta njehie ya.

Aga-eji Okwu ahụ kpee ikpé

Anyị na-aghọta mkpà Okwu Chineke dị? Aga-eji ya kpee mmadụ ikpé n’oge óké ikpé ahụ. Jisọs sịrị, “Okwu nke M’kwuru, okwu ahu gēkpe ya ikpé n’ubọchi ikpe-azu.” Ugbu a ọ bụrụ na aga-eji Baịbụl kpee anyị ịkpé, i chèghị na ọ dị mkpà ka anyị were nleruanya mụọọ ya, iji mara ihe ọ na-ekwu? Anyị na-amụ iheọmụmụ anyị n’ụlọ akwụkwọ dịka anyị kwesịrị ime, ma ọ dị mkpà karịsịa ịmata Okwu Chineke karịa ịmata onye bụ onye isi ọchịchị mbụ nke obodo anyị bụ Nigeria nwere, steeti ole dị n’ime ya, ugbò ole obodo anyị lụworo ọgụ, maọbụ obodo kachasị ike n’ụwa. Oge ra añaa ka ị na-enye iji mụọọ Okwu Chineke, n’iji ya tụnyere oge ị naeji ná-amụ akwụkwọ gị n’ụlọ?

Ọtụtụ Mkpụrụ

Anyị, bụ ndị Kraist, bụ alaka n’elu Jisọs Onye bụ Vine ahụ ma anyị aghaghị ịmị ọtụtụ mkpụrụ nye Ya. Mkpụrụ olenaole adịghị eju Ya afọ -- ọ ghaghị ịdị ọtụtụ. Anyị pụrụ ịdị ná-amị mkpụrụ, wee ná-echè kwa na anyị na-eme ihe ná-atọ Chineke ụtọ ma oge ahụ ọnwụnwa ewee bịa, o wee ná-agbagwoju anyị anya ihe kpatara nke a. Jisọs sịrị, “Alaka ọ bụla nke nāmi nkpuru, O nēme kwa ya ka ọ dị ọcha, ka ọ we mia nkpuru karị.” Site ná nnụcha a (ọnwụnwa niile ahụ) anyị na-achọpụta na ọ dị kwa ọtụtụ ihe, ndị dị ka ndidi, ịdịnwayọ, ogologontachịobi, na obiebere, anyị ga-amụta nke ga-eme ka anyị bụrụ ezi NdịKraist karị.

Ka anyị tụlee mkpagbu. Eleghịanya omume mbụ anyị na-egosipụta ga-abụ ikwu megide ndị ná-ekwu okwu ọjọọ banyere anyị. Nke a pụrụ ịbụ ihe mere Onyenwe anyị ji kwenye ka mkpagbu ahụ bịa -- iji gosi anyị na anyị enweghị ịhụn’anya dịka anyị kwesịrị inwe n’ebe ndịọzọ nọ dịka anyị na-eche na anyị nwere. Ịhụn’anya bụ otù nime mkpụrụ ndị ahụ Jisọs chọrọ ka anyị mịa, o zughị kwa ịhụ náánị ndị enyi anyị n’anya. “Nāhunu ndi-iro-unu n’anya nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsogbu unu” (Matiu 5:44). Ịhụ ndị enyi gị n’anya pụrụ ịbụ mkpụrụ olenaole, ma ịhụ ndị iro gị n’anya bụ ọtụtụ mkpụrụ karị.

Anyị ga-echeworị na náánị ọlụ anyị lụụrụ Jisọs bụ mkpụrụ. Anyị pụrụ iche na anyị na-amị ọtụtụ mkpụrụ ma ọ bụrụ na anyị ábụọ abụ gbaa kwa àmà nye Jisọs, gaa leta ndị náánị ha nọ, na kwa ndị ọrịa, nyere ndị nọ na mkpagbu aka, were kwa obi anyị dum jee ozi. Ma Baịbụl gwara anyị na mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ ihe ndị a: “Ihu-n’anya ọñù, udo, ogologo-ntachi-obi obi-ọma, idi-nma ikwesi-ntukwasi-obi, idi-nwayọ, imeru-ihe-n’oke” (Ndi-Galetia 5:22, 23). Pita Onyeozi gwakwara anyị ụfọdụ ihe ndịọzọ banyere mkpụrụ ndị a: “Nwekọnu otù uche, unu nile, werenu obi sorita onwe-unu hukọ ahuhu, burunu ndi nāhu umu-nna unu n’anya, ndi nwere obi ọmikọ, ndi nwere uche di ume-ala” (I Pita 3:8). Ọbụná inwe omume dị mma, mgbe emere ya dịka ana-emere Onyenwe anyị, ọtụtụ ha nime anyị, na kwa nke anyị gana-atụkwasị n’elu nke anyị nwere.

N’ihi iji mụta ogologontachiobi, ịdịmma, obiọma karị anyị pụrụ ihụ ahụhụ, bụrụ kwa ndị anụcharaanụcha; ma ọ bụrụ na anyị anagide ya dịka ihe si n’ebe Chineke nọ bịa, na kwa maka ọdịnma nke anyị, anyị ga-enwe añụrị nime ụgwọọlụ nke inwe “ọtụtụ nkpuru.” “Ozizi nile site n’inye ahuhu nādi ka ihe nādigh-eweta ọñù n’oge di ugbu a, kama nwuta: ma emesia ọ nēnyeghachi ndi ahu ewereworo ya nwaputa ha nkpuru nke di n’udo, bu nkpuru nke ezi omume” (Ndi Hibru 12:11). Ọlụ anyị nye mmadụ ibe anyị ga-eso kwa ọ bụrụ ma anyị nwee ezi mkpụrụ a nime obi anyị.

Onye Nkasịobi

Enwekwara iheọmụmụ ọzọ Jisọs chọrọrị ka ndị náesoụzọ Ya cheta. O kwuwo, kwukwasị kwa ọzọ banyere mkpà Okwu Ya dị, ma ka ha ghara ichèfu ya mgbe Ọ rapụsịrị ha, O kwere mkwà izite Onyenkasịobi ahụ, bụ Mmụọ Nsọ, i chetara ha okwu Ya nile. “Onye ahụ gāgbaram àmà.” N’oge ọzọ Ọ sịrị, “Ma mgbe ọ bula Onye ahụ gābia, bú Mọ nke ezi-okwu, O gēdubà unu n’ezi-okwu nile: n’ihi na Ọ gagh-ekwu n’Onwe-ya; … Onye ahu gēto Mu onwem” (Jọn 16:13, 14).

Mgbe eji Mmụọ Nsọ wụọ anyị mmiri, Mmụọ Nsọ na-ebi nime anyị ná-akụzikwara anyị eziokwu; ma Ọ na-agba kwa àmà banyere Jisọs. Ànyị na-ekwe ka O site nime anyị kwue okwu? Ànyị na-eme ka ụwa mara na anyị bụ ndị nke Kraist? Ànyị na-eduru ndị ọzọ bịakute Kraist? Nke ahụ bụ ọlụ nke Mmụọ Nsọ; ọ bụrụ na Ọ nọ nime anyị, nke ahụ bụ ọlụ anyị gana-alụ -- ịgbara Jisọs àmà.

Okwu ikpeazụ niile Jisọs kwuru nye ndị náesoụzọ Ya n’ụwa bụ: “Ma unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-àmàm nime Jerusalem, na nime Judia na Sameria nile, ru kwa ebe uwa sọturu” (Ọlu Ndi-ozi 1:8). Ndị bụ ndị àmà kwesịrị ntụkwasịobi nye Jisọs bụ ezi alaka niile ahụ, ná-anọgide nime ezi osisivine.

Alaka Ná-amịghị Mkpụrụ Ebipụ ya

Anyị ewerewo ezi nleruanya lezie alaka niile ná-amị mkpụrụ. Òlee ihe banyere ndị ahụ ndị ná-adịghị amị mkpụrụ? Jisọs sịrị na aga-ebipụ ha. Ha agaghị abụ kwa akụkụ nke ezi osisivine; ha na Jisọs agaghị enwe kwa mmekọrịta ọ bụla. Karị kwa nke ahụ, aga-ata ha ahụhụ, ha wee laa n’iyi mgbe ebighịebi ma ọ bụrụ na ha échègharịghị wee laghachikute Jisọs -- ka ewee nyakudo kwa ha ọzọ.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ ezi osisiVine ahụ?
  2. Ndị òle bụ alaka?
  3. Gịnị bụ òkè Chineke nwere n’ebe osisiVine na alaka ya niile dị?
  4. Kpọọ aha ezi mkpụrụ ụfọdụ.
  5. Gịnị ka Chineke na-eme nye alaka niile ahụ ná-amị mkpụrụ?
  6. Mkpụrụ ra añaa ka anyị kwesịrị ịmị?
  7. Olee akwụkwọ anyị nwere ndụmọdụ kachasị mkpà banyere ndụ?
  8. Ọ bụ n’ihi gịnị ka eji zite Onyenkasịobi, bụ Mmụọ Nsọ bịa nime ụwa a?
  9. Gịnị ka anyị kwesịrị ịdị ná-emere Onyenwe anyị?
  10. Gịnị mere alaka niile ahụ ná-adịghị amị mkpụrụ?