Jọn 14:15-31; 16:1-33

Lesson 237 - Junior

Memory Verse
“Mgbe ọ bula Onye ahu gābia, bú Mọ nke ezi-Okwu, Ọ gēduba unu n’ezi-Okwu nile” (Jọn 16:13).
Notes

Ịdọakanántị

Nke a bụ Oziọma nke ikpeazụ Jisọs ziri ndị náesoụzọ Ya. Ọ gwara ha okwu ụfọdụ nke ịdọakanántị banyere mkpagbu nke ha ná-aghaghị ịgafe. N’ihi nke a okwesịghị ka o ju ha anya maọbụ ka ha tụọ egwù mgbe ahụhụ ahụ ga-abịa. Ụfọdụ mmadụ ga-emekpá ndị náesoụzọ Jisọs arụ wee ná-eche na ha na-ejere Chineke ozi dị ukwuu. Ha ga-eme otú ahụ n’ihi na ha ekweghị na Jisọs. Ha kwere na Chineke -- ma ọ bụghị na Jisọs.

Sọl

Enwere akụkọ dị ụtọ nke otù onye dị otú a, nke kpagburu ndịKraist ma chee na ya na-ejere Chineke ozi. Aha ya bụ Sọl onye Tasọs, nke emesịrị n’ọdị n’iru kpọọ aha ya Pọl. Mgbe Sọl ji akwụkwọozi n’aka ya ná-eje Damaskọs ka o wee tinye onye ọ bụla náesoụzọ Jisọs n’ụlọmkpọrọ, Onyenwe anyị kpugheere ya onwe-Ya (Ọlu Ndi-ozi 26:15). Óké ìhè si n’Eluigwe nwuruenwu nke mere na Sọl kpuruisi abalị atọ. Olu nke Onyenwe anyị wee kpọọ aha ya. Sọl zara si: “Onye-nwe-ayi, gini ka i chọrọ ka m’me? (Ọlu Ndi-ozi 9:6). Sọl mekwara ihe niile nke Onyenwe anyị gwara ya mee. O kpere ekpere ewee zọpụta ya. Sọl wee ghọọ onye ná-agbasa Oziọma bụrụ kwa onyeàmà dị ukwuu banyere ike nke Chineke.

Jisọs Ịrapụ Ha

Mgbe Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya na ọ dị mkpà ka Ya laa, obi ha jupụtara ná nwute. Jisọs sịrị, “Ọ fọduru nwa oge, unu adigh-ahukwam ọzọ; ọzọ kwa, ọ fọduru nwa oge unu gāhukwam: n’ihi na anamalakuru Nnam.” Ndị náesoụzọYa aghọtaghị ihe okwu Ya pụtara. O mere ka o doo ha anya na ha ga-enwe oge iruuju, ma ụwa ga ná-añụrị ọñụ. Ma oge ịkwaákwá agaghị anọ ọdụ. Oge óké ịñụrị ọñụ ga-abịa. Jisọs ga-arapụ ha, n’oge ahụ ha ga-anọ n’óké iruuju; ma Jisọs ga-apụta kwa ìhè ọzọ nye ha nke ga-ewetara ha óké ọñụ.

Onyenkasịobi

Site n’okwu ịgbàume, Jisọs nyere ndị náesoụzọ Ya mkwà dị ịtụ n’anya na Onyenkasịobi ga-abịakute ha mgbe Jisọs lasịrị n’Eluigwe. Ònye bụ Onyenkasịobi a? Onyenkasịobi bụ Mmụọ Nsọ. (Jọn 14:26), onye bụ Otù onye nime Atọ-nime-Otù. Ọ bụ otù nime atọ ahụ “nāgba ama n’elu-igwe, (Nna, Okwụ ahu na Mọ Nsọ; atọ ndia bu kwa otù”), (I Jọn 5:7). Gịnị ka Onyenkasịobi ahụ ga-eme? Ọ ga-eduba ndị náesoụzọ Jisọs n’eziokwu niile, n’ihi na Ọ bụ “Mọ nke ezi-okwu” (Jọn 16:13). Ọ ga-eme ka ha cheta ihe niile Jisọs gwara ha nke ha ná-aghọtaghị (Jọn 14:26).

Nkasịobi na Inyeaka

Jisọs agaghị arapụ náánị ndị náesoụzọ Ya ịgbasa Oziọma a. Jisọs sị na Ya ga-ekpere Nna Ya Onye ga-ezitere ha Onyenkasịobi. Mmụọ Nsọ ahụ ga-akasị ha obi nyekwara ha aka. Ọ ga-enyere ha aka ịmata eziokwu. Ọ ga-akụziri ndị náesoụzọ Jisọs ihe. “N’ihi na Mọ Nsọ gēzi unu … ihe unu nāghagh ikwu” (Luk 12:12).

Ndịàmà

Ọlụ ọzọ nke Mmụọ Nsọ ga-alụ bụ Ya na ndị náesoụzọ Jisọs ikwupụta Jisọs na ịgbaàmà banyere Ya. Site n’ime otú a, Mmụọ Nsọ gana-eto Jisọs. Onyenwe anyị agwaworị ndị náesoụzọ Ya na ha ga-enwe ike ịlụ ọlụ ọbụná karị nke Ya onwe-Ya lụrụ (Jọn 14:12). “Ma unu gānata ike, mgbe Mọ Nsọ gābiakwasiwori unu: unu gābu kwa ndi-amam” (Ọlu Ndi-ozi 1:8).

Amamikpé

Jisọs kwuru na Mmụọ Nsọ ahụ ga-atụ ụwa mmehie ha n’anya. Dịka Mmụọ nke eziokwu. Ọ ga-egosi ụmụmmadụ ezi ọnọdụ nke ndụ ha. Site n’ịmata eziokwu, ha ga-enwe ohere ichègharị ewee zọpụta ha. “Ezi-okwu ahu gēme kwa ka unu pua n’orù” (Jọn 8:32). Mmụọ Nsọ na-ama mmadụ ikpé banyere mmehie ya. Amamikpé na-eduba ná nchègharị na nzọpụta. Mmadụ ga-ebu ụzọ mata na ya bụ onyemmehie tupu o jekwuru Chineke maka mgbaghara.

E nwere ihenlereanya ná ndụ Pita nke ná-egosi na Mmụọ Nsọ ná-atụ ụmụmmadụ mmehie ha n’anya. Mgbe Pita natasịrị Mmụọ Nsọ n’Ụbọchị Pentikọst, o kwuru okwu Chineke nye ọtụtụ mmadụ. Mgbe ụmụmmadụ nụrụ okwu niile nke Pita, “ewe dua ha nime obi-ha, ha we si Pita na ndi ozi fọduru, umu-nna-ayị gịnị ka ayi gēme?” Mmụọ Nsọ amawo ha ikpé banyere mmehie ha. Pita wee gwa ha ka ha chègharịa. Ọtụtụ kweere n’okwu ya, ewee tụkwasịrị ha puku mmadụ atọ (3000) (Ọlu Ndi-ozi 2:37-41).

Otù ụbọchị Filiks bụ Gọvnọ ziri ka akpọọ Pọl “we nu okwu ya banyere okwukwe nime Kraist.” Ka ọ na-ege Pọl ntị, Mmụọ Nsọ mara Filiks ikpé “Mgbe ọ nēkwu banyere ezi omume, na imeru ihe n’oké, na ikpe ahu nke gaje ibia, Filiks we tua egwu” (Ọlu Ndi-ozi 24:24, 25). O chègharịghị. O wee zilaga Pọl, ma Mmụọ nke eziokwu kwesịrị ntụkwasịobi n’ịtụ ya mmehie ya n’anya.

Eziomume

Jisọs kwuru na Mmụọ Nsọ ga-agba kwa àmà banyere eziomume. Jisọs ga-alaworị. Ụmụmmadụ agaghị ahụkwa ihenlere anya nke eziomume nime ndụ Jisọs. Ma ọ dịghị onye gaenwe ngọpụ, n’ihi na Mmụọ nke eziokwu ahụ ga-agba àmà banyere ndụ nke eziomume, mee ka o doo ụmụmmadụ anya na ha kwesịrị ibi ndụ ziriezi. Ọ bụghị náánị na Jisọs bụrụ anyị ihe nlereanya nke ibi ndụ, O nyekwara ike nke aga-eji bie ezi ndụ. Ọ bụ náánị site na Jisọs na eziomume Ya ka anyị pụrụ iji bụrụ ndị eziomume (II Ndi Kọrint 5:21). N’ihi na Jisọs rubereisi, ọbụná rue inye ndụ Ya ma nwụa n’ihi anyị, apụrụ ime anyị ndị eziomume site n’Ọbara Ya (Ndi Rom 4:25; 5:19).

Otù akụkụ nime ọlụ nke Mmụọ Nsọ bụ ime ka ụmụ mmadụ kwenye n’eziomume. Ọ dị mkpà na anyị ga-adị ndụ ịsọpụrụ Chineke na ịdị nsọ na n’eziomume ọ bụrụ na anyị ga abànye Eluigwe. Mgbe Ọ na-agwa ndị naesoụzọ Ya okwu, Jisọs kwuru sị, “Ọ buru na ezi omume-unu adigh-akari ezi omume ndi-ode-akwukwọ na ndi-Farisi nke-uku, unu agagh abà n’ala-eze elu-igwe ma-ọli” (Matiu 5:20). Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bụ ndị okpukpé, ma Kraist chọrọ ka ndị Ya bie ndụ karịrị nke okpukpé. Ibi ndụ eziomume bụ ihe achọrọ n’aka ndị naeso Jisọs. Agwara anyị ka anyị yikwasị ihe-agha niile nke Chineke nke otù akụkụ nime ya bụ “ihe-agha nke nēgbochi obi bú ezi omume” (Ndi Efesọs 6:14). Ana-adọ anyị akanántị ka anyị gbanarị ihe ọjọọ “ma nāgbaso ezi omume, nsọpuru-Chineke, okwukwe, ịhụ-n’anya, ntachi-obi, idi-nwayọ. Nāgbasi ngba nke okwukwe ike, jide ndu ebigh-ebi aka” (I Timoti 6:11, 12).

Ikpé

Mmụọ Nsọ ga-eme kwa ka ọ pụta ìhè na ikpé dị. Dịka onyeisi ụwa nke a, ekpewo setan ikpé, otú a kwa ka onye ọ bụla ga-eguzo n’iru onyeikpé nke ụwa niile. “N’ihi na aghagh ime ka ayị nile puta ìhè n’iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n’otù n’otù we nāghachi ihe esitere n’aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādigh nma” (II Ndi Kọrint 5:10).

Onyenkasịobi ahụ

Mmụọ Nsọ, bụ onye ga-akasị obi nye kwa aka, bụ onye ndị ụwa na-apụghị ịnara (Jọn 14:17). Jisọs kwere nkwà na Chineke ga-ezitere ndị naesoụzọ Ya Onyenkasịobi. Òlee ndị bụ ndị naesoụzọ Jisọs? Ha bụ ndị azọpụtara, ndị sokwara Jisọs. Ọ sịrị, “Ọ buru na unu onwe-unu anọgide n’okwum, unu bu ndi nēso uzọm n’ezie” (Jọn 8:31).

Jisọs gwara ndị naesoụzọ Ya otú ha pụrụ isi nweta Onyenkasiobi a. Jisọs kwuru sị, “Ọ buru na unu nāhum n’anya, unu gēdebe ihe nile m’nyere n’iwu” (Jọn 14:15). Ezi nnwale nke ịhụn’anya ha dị n’idebe iwu Jisọs niile, irubeisi nye okwu-Ya niile. Ọ bụghị náánị na Ọ kuziri odudonsọ, ma Jisọs debeere ndị naeso ụzọ Ya ihe nlereanya “ka ewe do kwa ha onwe-ha nsọ” (Jọn 17:19).

Odudonsọ, ọlụ amara nke abụọ bụ ihe dịịrị ndị ahụ azọpụtaworo. Ọ na-ehichapụ mmehie nke Adam n’obi anyị, ná-ewepụ kwa mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ. Ana-enweta ya mgbe mmadụ na-ekpe ekpere, ji kwa ndụ ya chụbiga àjà ókè nye Chineke. Ọ bụ uche Chineke ka ndị naesoụzọ Jisọs nata odudonsọ. “N’ihi na nka bu ihe Chineke nāchọ, bú ka edo unu nsọ” (I Ndi Tesalọnaika 4:3). Mmadụ aghaghị ime ihe Chineke na-achọ ka o wee bụrụ onye naesoụzọ Jisọs. Onyinye amara abụọ -- nzọpụta na odudonsọ na-abịa tupu ike nke Mmụọ Nsọ, ha dị kwa mkpà ime ka mmadụ kwesị ịnata Onyenkasịobi.

Agwara ndị naesoụzọ Jisọs na Onye nkasịobi ahụ ga-abịa inọnyere ha. Ọ bụghị náánị ibinyere ha, maọbụ ileta ha, ma Ọ ga-eme ọbụná karịa nke ahụ. Ọ ga-ebi nime ha (Jọn 14:17). Nke a mezuru n’Ụbọchị Pentikọst nime ụlọ elu na Jerusalem ebe ndị na-esoụzọ Jisọs na-ekpe ekpere. “Ha nile we juputa na Mọ Nsọ” (Ọlu Ndi-ozi 2:4). Ọ bụghị náánị Ndị Juu naeso Jisọs ka enyere Mmụọ Nsọ. Na mgbe dị n’iru “awusawo-kwa-ra onyinye nke bu Mụọ Nsọ-n’isi ndi mba ozọ” (Ọlu Ndi-ozi 10:45).

Nkwà Nye Ụbọchị Taa

Nkwà a nke Onyenkasịobi dịịrị anyị bụ ndị naesoụzọ Jisọs taa ndị na-erube kwa isi n’Okwu Ya. “N’ihi na unu ka nkwa nka diri, na umu-unu, na ndi nile nọ n’ebe di anya, ka ha ra, bú ndi Onye-nwe-ayị Chineke-ayị gākpọtara Onwe-ya” (Ọlu Ndi-ozi 2:39). Ọ bụrụ na anyị tụlee ihe Onyenkasịobi a ekwere nkwà ya ga-emere anyị, anyị niile àgaghị achọ inweta Ya na ndụ anyị? Ị natawo Onyenkasiobi ahụ bụ Mmụọ Nsọ?

Iwu Jisọs

Otù nime iwu ikpeazụ Jisọs nyere bụ “nọdunu … rue mgbe agēwere ike nke si n’elu yikwasi unu” (Luk 24:49). Jisọs nyere ndị naesoụzọ Ya iwu ka ha “chere nkwa nke Nna Ya, … N’ihi na Jọn jiri miri me baptism n’ezie; ma agēji Mọ Nsọ me unu baptism” (Ọlu Ndi-ozi 1:4, 5). Ị dịghị edebezu iwu Ya niile ọ bụrụ na inwetabeghị Mmụọ Nsọ. Kpee ekpere, were kwa ndụ gị chụa àjà nye Chineke rue mgbe ị ga-anata onyinye ahụ nke Jisọs kwuru banyere ya sị, “ọ buru na unu gāriọ Nnam ihe ọ bula, Ọ gēnye unu ya n’aham” (Jọn 16:23).

Mkwà ahụ

Jisọs jiri mkwà nke Mmụọ Nsọ kasie ndị náesoụzọ Ya obi, ma site na nke a rapụrụ ha udo nke Ya. Tupu Ọ rapụ ha, Jisọs kwuru sị, “N’uwa unu nēnwe nkpagbu: ma nwenu obi-ike; Mu onwem emeriwo uwa” (Jọn 16:33). N’ihi na Jisọs meriri ụwa, anyị onwe anyị pụkwara ịbụ ndị mmeri. “Nka bu kwa nmeri nke meriworo uwa, bú okwukwe-ayị. Ma ònye bu onye nēmeri uwa, ma-ọbugh onye ahu nke kwere na Jisọs bu Ọkpara Chineke?” (I Jọn 5:4, 5).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye ka ekwere mkwà nke Onyenkasịobi?
  2. Nime gịnị ka Mmụọ nke eziokwu ga-eduba ndị náesoụzọ Jisọs?
  3. Gịnị ka Ọ ga-echètara ha?
  4. Òlee ebe Mmụọ Nsọ ahụ gaebi?
  5. Ònye ga-enye ndị náesoụzọ Ya ike ịbụ ndịàmà Jisọs?
  6. Ọ bụrụ na anyị hụrụ Jisọs n’anya, gịnị ka anyị ga-edebe?
  7. Òlee ndị natara Mmụọ Nsọ n’oge nke Ndịozi?
  8. Òlee ndị pụrụ ịnata Mmụọ Nsọ n’ụbọchị taa?
  9. Òlee otú mmadụ nwere ike iji nweta Onyenkasịobi ahụ?
  10. Gịnị mere anyị ga-eji nwee Mmụọ Nsọ nime ndụ-anyị?