Jọn 17:1-26

Lesson 238 - Junior

Memory Verse
“Dika I zigaram nime uwa, Mu onwem ziga-kwa-ra ha nime uwa” (Jọn 17:18).
Notes

Ịdịmkpà nke Ekpere

Jisọs ji ekpere mechie okwu ikpeazụ nke Ya na ndị náesoụzọ Ya. Ị rịbara àmà otú Jisọs siri kpee ekpere mgbe niile? Ọ bụ Ọkpara Chineke, Onye nke abụọ nime Atọ-nime-otù dị Nsọ, O nwekwara ike inye ndụ ebighịebi, ịgwọ ndịọrịa, ịkpọlite ndị nwụrụanwụ, na ịgbàghara mmehie. Ọ pụrụ ime ihe ndịa niile n’ihi na Ya na Chineke bụ otù. Ọ bụ ezie na Ọ bụ Chineke ma Ọ bụ kwa mmadụ; O si n’Eluigwe nata ike na ume Ya site n’ekpere. Ọ ghọtara mkpà ọ dị Ya ikpe ekpere karịa ka anyị ghọtara mkpà ọ dị anyị. Ọtụtụ abalị ka Jisọs kpere ekpere náánị Ya n’akụkụ ugwu -- ogologo abalị niile. Ọtụtụ oge, O tetara n’isi ụtụtụ wee pụọ, ikpe ekpere. Abalị ikpeazụ ahụ mgbe O kpesịrị ekpere ike na Getsemane abụghị mbụ O jeworo n’ebe ahụ. Akwụkwọnsọ na-agwa anyị na Judas matakwara ebe aga-achọta Ya, “N’ihi na Jisus na ndi nēso uzọ Ya zukọrọ n’ebe ahu ọtutu oge” (Jọn 18:2).

Ọ bụrụ na Jisọs, Ọkpara Chineke kpere ekpere maka inye aka dị nsọ, n’ihi na Ọ matara mkpà ọ dị Ya na Chineke inwe mmekọ, lee otú ọ dị anyị onwe-anyị mkpà karị! Jisọs chọrọ ka anyị kwupụta mkpà anyị site n’ekpere, ọ bụ ezie na Ọ mataworị ihe ná-akpá anyị. Ọ bụ kwa site n’ekpere ka anyị na-ekele Chineke maka ihe O mewooro anyị. O kwesịrị ka ekpere nke otuto na ekele ná-akwụgo site n’obi anyị mgbe niile nye Onye ahụ nke ji Ọbara Ya dị ókéọnụahịa gbapụta anyị.

E nyere Ọkpara ahụ Otuto

Jisọs jiri okwu ndịa malite ekpere Ya: “Nna, oge hour abiawo; nye Ọkpara-Gi otuto, ka Ọkpara-Gi we nye Gi otuto.” Jisọs abịawo n’ụwa ijéozi dị ukwuu. O nwekwara ọlụ dị mkpà ịlụ. Mgbe ọ dị ndụ, O mere ọtụtụ ihe ịrịbaàmà, Ọ kpọkwara ụmụmmadụ ka ha soo Ya. Ma oge hour nke Ọ ga-alụ ọlụ kachasị bụ ịnwụ n’elu obe maka mmehie anyị, abịawo kwa ugbu a. Nke a bụ ọlụ nke Chineke nyeworo Ya-rị ịlụ; ugbu a Ọ na-ekwu na ọ gwụsịwo. Ọ ka-anwụbeghị anwụ, ma nzube Ya guzosiri ike, o dokwara Ya anya na Ọ ghaghị imezu Ya nke mere O jiri kwue ihe banyere ya dịka ihe emewororị eme.

Mgbe Jisọs biri n’Eluigwe, tupu Ọ bịa nime ụwa, ndị mmụọozi fèrè Ya òfùfè n’ihi na Ọ bụ Ọkpara Chineke. Ya na Chineke bụ otù n’òkìkè nke ụwa, “Ekègh kwa otù ihe ọ bụla ekèworo ma Ọ nọgh ya” (Jọn 1:3). Ná agbanyeghị nke a, Ọ tọgbọrọ otuto ahụ n’akụkụ wee bịa n’ụwa dịka mmadụ, ikuziri mmadụ otú esi ebi ndụ, inwe mmetụta nke ahụhụ anyị, na n’ikpeazụ inye ndụ Ya maka mgbapụta anyị.

Ugbu a oge hour ahụ na-abịa mgbe aga-enye Ya otuto ọzọ -- ọbụná karịa nke mbụ, n’ihi na O jiwo onwe Ya chụọ àjà ukwuu ahụ maka mmehie nke ụwa niile. “O weda-kwa-ra Onwe-ya, we buru Onye nāña nti rue ọnwu, bú ọnwu nke obe. N’ihi nka Chineke weli-kwa-ra Ya elu nke uku, were kwa amara nye Ya aha ahu nke kariri aha nile ọ bula elu; ka ọ gābu n’aha Jisus ka ikpere nile we gbue n’ala, nke ihe nile di n’elu-igwe na ihe nile di n’elu uwa na ihe nile di n’okpuru ala, ka ire nile ọ bula we kwuputa kwa na Jisus Kraist bu Onye-nwe-ayi, ka ewe nye Chineke bu Nna, otuto” (Ndi Filipai 2:8-11).

Mgbe O bilisịrị site ná ndị nwụrụanwụ, Jisọs laghachịrị n’Eluigwe wee nọdụ n’Ocheeze nke ike ukwuu Ya, n’aka-nri Chineke, ịrịọrọ anyị arịrịọ. Oge ga-abịa mgbe mmadụ niile na ihe niile dị n’ụwa ga-anọdụ n’okpuru ike Ya. Onye ọ bụla ga-erubere Ya isi. Nke ahụ ga-abụ mgbe eziomume ga-ekpuchị ụwa, ndị nke Chineke ga-eso kwa Ya chịa n’ọchịchị nke udo.

Ekpere n’ihi Ndị nke Ya

Nime ekpere a, Jisọs na-ekpere ndị nke Ya ekpere. Ọ matara na ụbọchị ọchịrị dị n’iru ha. Ha amataghị na Ọ gaje ịnwụ mgbe Ọ ka dị n’okorọbịa -- náánị iri arọ atọ na atọ (33). Ha hụrụ Ya n’anya, ọ ga-ewuta kwa ha nke ukwuu mgbe ha ná-agaghị ahụ kwa Ya. Karịa nke ahụ ha ga-enwe mkpagbu n’ihi okwukwe ha kwere na Ya. Ma Jisọs matara na ha ga-abụ ndị eziokwu n’ikpeazụ. O wee ná-ekpere Nna Ya ka O nye ha amara ka ha kwesị ntụkwasịobi ná-agbanyeghi otú ahụhụ ha ra; Ọ matakwara na Chineke na-aza ekpere Ya mgbe niile.

A ga-egbu ọtụtụ ndị náesoụzọ Jisọs n’ihi okwukwe ha. Aga-akpọgide Pita n’obe. A ga-ebipu Jemes isi; Jọn ka aga-achụpụ gaa n’agwéetiti nke Patmọs; aga-eme ka Pọl hụọ ahụhụ nke ịpịa ụtarị na ime ka ụgbọmmiri kpue, na n’ikpeazụ kwa e wee bipụ ya isi. Ụfọdụ gana-ebi ná-ekpekwara Chineke nime ọgba, izopụ onwe-ha site n’aka ndịọchịchị nke ndị Rom. Ma anyị nwere ihe doro anya site n’aka Pọl Onyeozi: “Asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze” (2 Timọti 2:12). Ndị a tụkwasịrịobi ha n’otuto ahụ nke Jisọs gwaworo ha ihe banyere ya, ahụhụ ọ bụla ha hụkwara ebe a abụghị ihe n’ebe ha nọ maọlị. Pita sịrị na ya hụrụ nhụjuanya niile nke Jisọs (nke ejiri nye Ya otuto), na ya onwe-ya ga-abụ kwa “onye-nnwekọ nke ebube ahu nke agaje ikpughe” (I Pita 5:1). Ọ sịghị kwa na Ya hụrụ ahụhụ. Nke ahụ adịghị mkpà. Náánị ihe dị ya mkpà bụ na aga-enyekọ ya na Jisọs otuto.

Onyeozi bụ Pọl na-ekwu kwa otù ihe ahụ mgbe ọ gwara anyị ná Ndi Hibru 11, banyere ndị dike nke okwukwe. Abraham jègharịrị n’ala ahụ n’ebi n’ụlọikwuu, na-echègbughị onwe ya n’ihi na o nweghị ụlọ ebe ọ na-ebi. Náánị ihe ọ na-eche bụ banyere obodo nsọ ahụ ga-abụ nke ya mgbe ọ rapụrụ ụwa nke a. “Ndi ọzọ ka anwara ọnwụnwa nke ihe-ọchi na utari, e, tukwasi ihe ndia, nke agbu na ulo-nkpọrọ: aturu ha nkume, akwọwara ha, anwara ha, ewere iru mma-agha gbue ha: ha jere akpukpọ aturu na akpukpọ ewu nējeghari; ebe ha nọ na nkpà, anākpagbu ha, anēmejọ ha” (Ndi Hibru 11:36, 37). Ma hà gụrụ ya n’ihe? Ha kweere na ebe-obibi dị n’Eluigwe na-echere ha, ebe ha gaebi mgbe ebighịebi. Ndụ anyị n’ebe a dị mkpụmkpụ ma éjí ya tụnyere ebighịebi; ma ihe kachasị mkpà n’ụwa bụ ka anyị nọdụ ná njikere inweta ọñụ nke ebube niile nke Jisọs kwadowooro anyị.

Ebe Jisọs Nọ

Mgbe Jisọs ná-ekpe ekpere, Ọ sịrị: “Nna, ihe I nyeworom, anamachọ ka, ebe Mu onwem nọ, ka Mu na ndi ahu nọ kwa; ka ha we hu otutom nke I nyeworom.” Jisọs chọrọ ka anyị na Ya nọdụ n’ezie! N’ebe a, mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike chee na anyị bụ ndị elefuuru anya, wee chee kwa na ọ dịghị onye ọ bụla chọrọ anyị, ma Jisọs chọrọ anyị. Ọ chọrọ anyị n’elu, ebe ndị mmụọozi na-efè Ya òfùfè, ebe Ya na Chineke Nna na-anọdụ n’ocheeze, na ebe usu niile nke eluigwe na-akpọ isiala n’iru Ya. Ọ chọrọ ka anyị na Ya nọdụ n’ebe ahụ mgbe niile ebighịebi.

Jisọs arọpụtawo ihe ná-adịghị ike nke ụwa ka ihere wee mee ndị maara ihe. Ọ sịrị na ọ bụghị ọtụtụ ndị amaara aha ha n’ụwa ga-achọ ịbụ ndị náeso Ya, ma ndị ogbenye ga-eji obiụtọ wee nụrụ olu Ya. Mgbe Aisaia na-akpọ òkù nke Oziọma ahụ, Ọ sịrị: “Ge nti, onye ọ bula nke akpiri nākpọ nku, bianu na miri, onye ahu kwa nke nēnwegh ego; bianu, zuru ọka, rie” (Aisaia 55:1). Na anyị bụ ogbenye na ndị ụwa ná-amaghị n’ezie apụtaghị na Jisọs elefuwo anyị anya. Ọ na-akpọ onye ọ bụla ka ha bịakute Ya inweta ngọzi Ya nke ná-adịghị agwụagwụ -- udo nke obi n’ebe a, ma ọñụ ebighịebi n’ụwa nke na-abịa.

Échèbere nime Ụwa a

Mgbe Jisọs kwuruokwu banyere otuto nke ga-adị n’Eluigwe, ná-arụghị ụka, ọ ga-adịworị ndị náeso ụzọ Ya ụtọ isoro Ya laa n’otù mgbe ahụ. Mgbe ụfọdụ anyị na-ahụ nsogbu nke dị n’ụwa a, ọ na-agụ anyị ka anyị laa n’Eluigwe, anyị na-ele kwa anya otuto nke ná-echere anyị. Ma Jisọs kpere ekpere nye Nna Ya sị “Ekpeghm ekpere ka I wepu ha n’uwa, kama ka I debe ha ka ha puọ n’aka ajọ onye ahu.” Ha nwere ọlụ ha ga-alụ. Jisọs na-ezipụ ha dịka ndị náezisa Oziọma ime ka ụwa mara na Jisọs ga-azọpụta ha site ná mmehie ha. Ma ihe ụfọdụ dị ha mkpà ime ka ha bụrụ ezi ndịàmà. Otù nime ha bụ odudonsọ.

Edoro Nsọ Site n’Eziokwu

Mmadụ ndịa bụ ndị Jisọs na-ekpe ekpere banyere ha kweere na Jisọs bụ Ọkpara Chineke, n’ihi ya ndụ ebighịebi amalitewo nime obi ha. “Nka bu ndu ebigh-ebi ahu, ka ha mara Gi, Nke náni Gi bu ezi Chineke, mara kwa Onye I zitere bụ Jisus Kraist.” Ọ bụghị náánị ịmata ihe banyere ha, kama ịmata ha dịka mkpughe nke Mmụọ Nsọ si dị. Ihe ha chọrọ ugbu a bụ ka edoo ha nsọ. Ya mere Jisọs kpere ekpere sị, “Were ezi-okwu do ha nsọ: okwu-Gi bu ezi-okwu.” Ihe dị ha mkpà bụ ka emee ka ha dị ọcha nime obi, ọ bụ kwa na odudonsọ ka nke a na-apụta ìhè.

Jisọs kpekwara ekpere nye anyị bụ ndị azọpụtara. Ọ sịrị: “Ọ bugh kwa náni ndia ka M’nēkpe ekpere banyere ha, kama anamēkpe kwa ekpere banyere ndi kwere na Mu site n’okwu ha.” Apụkwara ido anyị nsọ -- bụ ndị kweere ihe ha kwusara -- ihe edere na Testament Ọhụụ, ọ bụrụ na anyị eji ndụ anyị niile chụọàjà nye Jisọs wee kwere kwa ná mkwà O kwere anyị.

Odudonsọ ga-eme ka ndị náesoụzọ Ya dị ike. Ihe ọzọ dị mkpà dị nke mere aga-eji doo ha nsọ. Ọ ga-eme ka ha na Jisọs bụrụ otù. Odudonsọ na-eweta ịdịn’otù nke okwukwe. Jisọs chọrọ ka ndị Ya kwere Okwu Ya niile; mgbe ha mere otú a, ha na Jisọs na ndị kwere ekwe na-abụ kwa otù.

Ihe ọzọ dịkwarị bụ ihe mere odudonsọ ji dị mkpà nye ndị náesoụzọ Ya. Jisọs chọrọ ka ụwa mara na ha bụ ndị náesoụzọ Ya. Ọ chọrọ ka ndị nke Ya dị ka Ya onwe Ya, ka ụwa wee mara na ha bụ ndị Kraist. Ana-eme ka anyị dị nsọ n’odudonsọ anaenyeghachị kwa anyị oyiyi Chineke ahụ nke Adam na Iv tụfuru mgbe ha mehiere n’Ogige Iden. Anyị na-adị ka Chineke n’eziomume na n’ịdịnsọ. Ka anyị cheta na anyị aghaghị ịdị n’oyiyi Chineke, bi kwa ndụ otú ụwa gaahụ Jisọs nime ndụ anyị.

Mgbe anyị naebi ndụ anyị nye Jisọs, omume anyị dị kwa ọcha, anyị na egosipụta na Chineke zitere Ọkpara Ya ka Ọ nwụọ n’ihi anyị. Anyị apụghị ibi-ndụ ziriezi dị kwa nsọ ọ bụrụ na ewepụghị ụdị nke mmehie nime obi anyị site n’Ọbara Jisọs. Ọ dị mkpà ka ndụ anyị gosi na anyị bụ ndị nke Kraist. Anyị chọrọ ịbụ ìhè idubà ndịọzọ n’Alaeze Chineke, ọ bụghị ihemgbochị n’ụzọ ha.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú Jisọs si mechie okwu ikpeazụ Ya nye ndị náesoụzọ Ya tutu ọnwụ Ya?
  2. Kwue oge ụfọdụ mgbe Jisọs kpere ekpere.
  3. Òlee ndị Jisọs kpeere ekpere n’oge a?
  4. Gịnị ka Jisọs kpere ekpere banyere?
  5. Gịnị mere Jisọs ji bịa n’ụwa?
  6. Gịnị ka Jisọs kwere ná mkwà nye ndị náesoụzọ Ya kwesịrị ntụkwasịobi?
  7. Kwue ihe atọ nke mere o ji dị mkpà na agaedo ndịKraist nsọ.
  8. Òlee oyiyi ndịKraist ná-aghaghị iyikwasị?
  9. Òlee ebe Jisọs chọrọ ka ụmụ Ya nọdụ?