Abù Ọma 32:1-11

Lesson 239 - Junior

Memory Verse
“Anyam gādikwasi kwa gi n’aru” (Abù Ọma 32:8).
Notes

Mmehie nime Ndụ Ya

Devid, Onye dere Abù Ọma kwuru banyere mnwapụta nke onwe ya nime Abù Ọma nke a. O kwuru ihe wetara obiụtọ, ọñụ na ngọzi nime ndụ ya. Ọ matara na ya nwetara iruọma nke Chineke mgbe agbaghaara ya mmehie ya. Devid emebiwo iwu nke Jehova. O mebiwo iwu nke Chineke, mmehie dị kwa ná ndụ ya. Devid enweghị obi izuike maọbụ obiụtọ mgbe o biri ụdị ndụ ahụ; ọ nọ n’iruuju na amamikpé nke obi. Devid matara ihe banyere mmehie ahụ dị ná ndụ ya, ma ọ nabataghị ya ngwangwa. Devid gbara nkịtị ka o wee zoo amamikpé ahụ. Ụfọdụ mmadụ na-agbalị ịlụsi ọlụ ike mgbe ha nwere amamikpé ka ha wee nwee náánị ohere ntà iji chee échìchè tụlee kwa ụzọ ha niile.

Ikpé mara nnọọ Devid kpamkpam n’ihi mmehie dị ná ndụ ya na ọkpụkpụ ya niile dịrị ka ihe kara nká. Devid adịghị enwe amamikpé náánị mgbe ụfọdụ, kama ọ na-enwe ya ogologo ụbọchị niile.

Ịmata Mmehie

Devid enweghị obiụtọ mgbe ọ na-agbalị ikpuchi mmehie dị ná ndụ ya. Otù aka ahụ kwa ọ dịghị onye ọ bụla na-enwe obiụtọ mgbe ọ na-agbalị izo mmehie ọ matara dị ná ndụ ya. Mgbe niile ka egwù na-adị na aga-ekpughe mmehie ya, na onye ọzọ ga-achọpụta ihe banyere ya.

Amamikpé

Mmadụ ịmata na mmehie dị ná ndụ ya bụ otù nzọụkwụ iduru ná nchègharị. Mmadụ aghaghị ịmata na ya bụ onyemmehie tutu ya enwee ike ichègharị. Site n’ime ka Devid nwee amamikpé nke mmehie ya, Onyenwe anyị na-eduru ya gaa ná nchègharị ka mmehie ya wee bụrụ ihe apụrụ ịgbaghara. Ehihie na abalị niile nke Devid jupụtara ná-ezughị ike n’ihi na aka Chineke dị n’arụ ya. Ihe-mgbu nke obi Devid dị ka okpomọkụ nke ọkọchị. Ọ dịghị nnapụta dị?

Nchègharị

Devid nwetara ndajụ mgbe ọ nabatara mmehie ya wee chigharịa kwa site na ha. N’ịhụn’anya na ebere, Chineke egosiwo Devid mmehie dị ná ndụ ya, ka Devid wee nwee ike inwe nkasiobi n’ọnọdụ ezughịike. Mgbe Devid kwupụtara njehie ya, Onyenwe anyị gbaghaara ya. Devid agbalịghị kwa ọzọ ikpuchi mmehie dị ná ndụ ya. Devid nabatara na ya bụ onyemmehie kwupụtakwara Onyenwe anyị mmehie ya niile n’otù n’otù. Ọ chọtara mgbaghara ọ na-achọ. Ọ bụghị kwa onye ná-enweghị olileanya, nke ná-enweghị kwa izuike ọzọ. Ndụ ya wee dị iche. Aka Chineke eduruwo Devid ná nchègharị site n’ime ka o nwee amamikpé nke mmehie ya.

Ndị Agọziriagọzi

Mgbe ahụ ka Devid pụrụ ịgbá àmà na ya bụ otù onye nime ndị agọziri agọzi. Devid nwapụtara na Jehova “kwesiri ntukwasi-obi buru kwa Onye ezi omume igbaghara ayi nmehie ayi nile” ọ bụrụ na anyị ekwupụta ha (I Jọn 1:9). Agbaghaara njéhie niile nke Devid. Mmehie ya agabigawo. Nke a bụ náánị otù ụzọ ọ pụrụ isite na ya nwee udo nke akọnauche.

Ọ bụghị náánị Devid bụ onye Onyenwe anyị duruworo n’ebe nchègharị na ịmata na agbagharawo mmehie ya. Ọtụtụ mmadụ, ndịokenye na ụmụntà, nọ kwa n’etiti ndị ahụ agọziworo n’ihi na mmehie ha agabigawo. Ha onwe-ha, dịka Devid, eruwo ọnọdụ obiụtọ na nkasịobi mgbe agbaghaara mmehie ha niile.

Ha kwupụtara mmehie ha niile, ha adịghị agbalị kwa izobe ha ọzọ. Ha kweere na ha bụ ndịmmehie wee rịọ mgbaghara. Mgbe ha chègharịrị agbaghara ha njéhie ha. Ha kwere ná mkwà nke Chineke na ha ga-anata ebere. “Onye nēkpuchi njehie-ya nile, ọ gagh-agara ya: ma onye nēkwuputa ha, nke nārapu kwa ha, agēnwe obi-ebere n’aru-ya” (Ilu 28:13). Mgbe mmehie ha niile gabigara, ha nwetara izuike na nnapụta nke Jisọs kwere ná mkwà mgbe Ọ sịrị, “Biakutenum, unu nile ndi nādọgbu onwe-unu n’ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike” (Matiu 11:28). Asachapụrụ mmehie niile ha nime Ọbara Jisọs (Nkpughe 1:5). Onyenwe anyị hichapụrụ njéhie ha niile Ọ gaghị echèta kwa mmehie niile ha (Aisaia 43:25). Agụghịkwara ha ajọomume ọzọ. Onyenwe anyị nyere ha eziomume n’ihi okwukwe ha (Ndi Rom 4:6).

Ị nọ n’etiti ndị ahụ agọziri agọzi -- ndị nwere obiụtọ? Àgbagharawo mmehie gị niile, sụchapụ kwa ha nime Ọbara nke Jisọs?

Enweghị Onyendú

Óké ihe dị iche dị ná ndụ Devid tutu ya ekpee ekpere, na mgbe ọ natasịworo mgbaghara. Amamikpé adịghị kwa ọzọ (Ndi Rom 8:1). Aghụghọ adịghị kwa ọzọ. O nweghị kwa ihe ọ bụla ọ na-ekpuchi ọzọ -- mmehie ya niile agabigawo. Ọ dịghị egosi n’efu na-ya nwere obiụtọ -- ọ bụ otù onye n’etiti ndị agọziri agọzi. Ọ dịghị ekpuchi kwa ọnụ ya -- ọ sịrị, “Ti-kwa-nu nkpu ọñu.” Ndị a bụ ụfọdụ mgbanwe nke Onyenwe anyị lụpụtara nime ndụ Devid mgbe azọpụtara Devid.

Ikpéekpere n’Oge

Devid kwuru okwu banyere mkpà ọ dị ikpé ekpere n’oge mgbe aga-achọta Jehova. Aisaia Onyeamụma kwukwara okwu yiri nke a: “Chọnu JEHOVA mgbe anāchọta Ya, kpọkuenu Ya mgbe Ọ nọ nso” (Aisaia 55:6). Anyị pụrụ ịghọta site n’okwu niile a na oge dị mgbe Jehova ná-agaghị anọ kwa nso na mgbe ana-agaghị enwe ike ịchọta Ya. Devid echèrèghị rue mgbe oge gasịrị tutu ya ekpee ekpere. O kpere ekpere chọọ Chineke mgbe aka Jehova “di arọ” n’arụ ya.

Mgbe mmadụ kpere ekpere n’oge, mgbe ahụ o jikerewo maka ihe niile ọ bụla ga-abịakwasị ya. Devid sịrị na n’oge ijummiri nke ọtụtụ mmiri ha agaghị eru ya arụ, n’ihi na o kperuwo ná mmeri nke imemmụọ. Ụfọdụ mmadụ na-echère rue oge nsogbu, ijummiri nke nsogbu, tutu ha akpọkue Jehova. Mgbe ahụ o doghị ha anya na ha ga-enwe oge maọbụ ike ikpé ekpere nke Chineke ga-aza. Ha na-eche n’obi ha na ha ga-achọta Ya, na Ọ ga-anọ kwa nso mgbe Ọ dị ha mkpà. Lee óké nchekwube Devid nwere na Chineke ga-echèbe ma duzie kwa ya! “Gi onwe-gi burum ebe-nzuzo; I gēchezim ka m’pua n’ahuhu; iti-nkpu nke mgbe anēme ka agbapu, ndia ka I gēme ka ha dim gburugburu.” Ọ bụghị ihe ịtụn’anya na Devid ñụrịrị ọñụ nime Onyenwe anyị!

Nwoke Nwere Amamihe

Na Testament Ọhụụ Jisọs kuziri na onye ọ bụla nke ná-abịakute Ya, nke ná-anụ kwa okwu Ya, ná-eme kwa ha, ka eji tụnyere nwoke nwere amamihe onye wuru ụlọ ya mgbe o gwumisiri ala tọọ kwa ntọala ya n’elu óké nkume. Emesịa mgbe ijummiri bịara ifufe wee fee kwa, ụlọ ahụ adaghị, o meghị ọbụná mkpatụ (Luk 6:48). Otù aka ahụ kwa, Jisọs kuziri na onye ọ bụla nke ná-anụ Okwu ahụ ma ọ dịghị eme ya, ka eji tụnyere nwoke onye nzuzu onye wuru ụlọ ya n’elu ájá (Matiu 7:26). Mmiri wee zoo, osimiri ru kwa, ifufe fee kwa -- ụlọ ahụ wee darue ala!

Devid wuru ulo nke imemmụọ ya n’elu ntọala óké nkume, wee nọdụ n’udo mgbe nsogbu na iheize-ndụ bịara dịka ijummiri nke óké mmiri.

Onyenduzi Ahụ

Mgbe mmadụ na-erubeisi n’iwu niile nke Chineke mgbe ahụ Chineke bụ Onyendú na Onyeinyeaka ya. Onyenwe anyị sịrị, “M’gēme ka i nwe uche, M’gēzi kwa gi ihe n’uzọ nke i gēje ije nime ya: M’gādu gi ọdu, anyam gādikwasi kwa gi n’aru” (Abù Ọma 32:8). Jisọs bịara “imukwasi ndi nọ n’ọchichiri na onyinyo ọnwu ìhè; iduzi ukwu-ayi ba n’uzọ udo” (Luk 1:79).

Onyenduzi bụ onye ná-egosi mmadụ ụzọ site n’isoro onye ahụ ná-eje ijè maọbụ site n’ibutere onye ahụ ụzọ. Onyenwe anyị na-eme ha abụọ -- náeso ndị Ya ná-ejé ijè náebutekwara ndị Ya ụzọ. Onyenwe anyị ga-anọnyere ndị Ya, n’ihi na “Ya onwe-ya ekwuwo, sị, “M’gagh-ara gi aka ma-ọli, M’gagh-arapu kwa gi ma-ọli” (Ndi Hibru 13:5). “Kraist hu-kwa-ra ahuhu n’ihi unu, nārapuru unu ihe ilere anya, ka unu we so ijè-ukwu-Ya nile” (I Pita 2:21). O buteworo anyị ụzọ ịtụziri anyị aka ụzọ anyị ga-eje ijè nime ya. Ọ bụ ìhè igosi anyị ụzọ. Chineke gwara Ụmụ Israel na oge ha ga-echigharị jee n’akanri maọbụ n’akaekpe, ha ga-anụ okwu ndịa: “Nka bu uzọ, jenu ije nime ya” (Aisaia 30:21).

Isoro Onyendú

Eleghịanya ụfọdụ nime unu ejewo ijè dị anya, n’ụzọ nke ị ná-amaghị. O wee dị gị mkpà inwe onyendú maọbụ onye ga-egosi gị ụzọ. Ị na-atụkwasị onyendú gị ahụ obi. I nwere nchekwube na ya n’ihi na ọ maara ụzọ o jewo kwa ijè na ya mbụ. Ị gaghị eche échìchè ijé n’ụzọ ọzọ, maọbụ n’ụzọ dị n’akụkụ maọbụ n’ụzọ dị mkpụmkpụ, ka i wee ghara ikewapụ onwe-gi wee fue. Ị matara na i ga-esogide onye ahụ ná-edu gị ọ bụrụ na i nwere olileanya iru ụlọ n’udo i ga-agụ kwa onye ná-anwa iso ụzọ ọzọ n’onyenzuzu.

Ụzọ Ọzọ

Ụfọdụ mmadụ adịghị eleru anya nkeọma banyere isogide Onyendú nke imemmụọ. Onyenwe anyị na-ebutere anyị ụzọ náeso kwa anyị jee n’ụzọ, ma ekwensu na-ara ụfọdụ ụra isoro ụzọ ọzọ n’akaekpe maọbụ n’akanri. Anaekewapụ ha n’ebe Chineke na ndị Ya nọ. Eleghịanya otù ụbọchị ha alaghachị n’ebe ahụ ha si rapụ ụzọ, ha nwekwara ike ghara ịchọta ụzọ ahụ ọzọ bụ nke na-eduba n’Ụlọ nke Eluigwe na ndụ ebighịebi.

Onye dere Abù Ọma sịrị “unu adila ka inyinya, ma-ọbu dika inyinya mule.” Ana-eduzi anụmanụ ndịa site n’ikenye ha ụdọ n’ọnu na eriri n’elu isi ya. Ana-amata ịnyịnya mule n’ihi isiike ya, ọtụtụ mgbe ọ dịghị ejé ijè ma ọ bụrụ na ọ chọghị, na-eje kwa náánị ebe ọ chọrọ ijé. Ihe niile ndịa na-adị nime ịnyịnya na ịnyịnya mule n’ihi na “ọ digh nghọta ha nwere.” Anyị onwe anyị dịka ndịkom, ndịnyom, na ụmụ-ntakịrị achọghị ime omume dịka anụmanụ ndịa.

Ka anyị kpebie nime obi anyị isoro Onyenwe anyị n’ụzọ ahụ dị mkpagide, wee ghara ige ekwensu ntị bụ onye ga-achọ iduba anyị n’ụzọ obosara ahụ nke ná-edubà n’ịlan’iyi (Matiu 7:13). Ka anyị soro Onyenwe anyị mgbe niile ghara ijé n’ụzọ ọzọ nke nwere ike ịdị ka o ziriezi n’anya anyị ma “nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu” (Ilu 14:12).

Onyendú Anyị

Mgbe ụfọdụ anyị na-akpọ Onyenwe anyị Onyenduzi anyị, site n’ịkpọ Ya aha ọzọ dị icheiche. Jisọs sịrị, “Mu onwem bu onye-ọzùzù-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram” (Jọn 10:14). Onyeọzụzụatụrụ na-eduzi ìgwè aturụ ya. Ọ na-eduru ha ịta nri n’ebe enwere nri na mmiri. Ọ na-echèbe ha pụọ n’óké ifufe na ndịiro, debe kwa ha n’ụlọ ha n’abalị. “JEHOVA bu onye nāzum dika aturu; ọ digh ihe kọrọm” (Abù Ọma 23:1). “Mgbe ọ bula ọ chupuru aturu nke aka-ya nile, ọ nāga n’iru ha, aturu ahu nēso kwa ya: n’ihi na ha matara olu-ya” (Jọn 10:4).

Ụmụ Juda sịrị, “Le, Chineke nọyere anyi, dika onye-isi-ayi” (2 Ihe Emere 13:12). Na Testament Ọhụụ anyị na-agụ na Jisọs bụ Onye ná-eduba anyị ná nzọpụta (Ndi Hibru 2:10). Mgbe ụfọdụ anyị na-abụ abụ banyere Onyeisi anyị nke anaemeribeghị n’agha ọ bụla.

Ma anyị kpọrọ ya Onyendú, Onyeisi, Onyeọzụzụatụrụ, maọbụ aha ọzọ, ka anyị soro ezi Onyendú ahụ, bụ Onyenwe anyị. Ka ekpere anyị dị ka nke Devid: “Mem ka m’zọ ije n’ezi-okwu-Gi, Gi zikwam ihe; n’ihi na Gi onwe-gi bu Chineke nke nzọputam” (Abù Ọma 25:5). “Zim ime ihe di Gi utọ; n’ihi na Gi onwe-gi bu Chinekem: mọ Gi di nma; durum n’ala di lari” (Abù Ọma 143:10).

N’Abù Ọma 32 Devid egosịwo anyị ezi ndụ nke izuike, ọñụ, na ịnọ n’udo nke ná-abịakwasị ndị agbagharaworo mmehie ha niile ndị ná-atụkwasị kwa obi ná nduzi nke Onyenwe anyị, site n’ebere nke Chineke. Devid kwukwara banyere iruuju, izendụ, na nsogbu ná-abịakwasị ndị ajọomume ndị ná-atụkwasị onwe ha obi. Òlee nke ị nọ nime ya n’etiti òtù abụọ ndịa?M

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Devid ji gbaa nkịtị?
  2. Gịnị gbanwere ndụ ya?
  3. Ònye bụ onye agọziri agọzi?
  4. Òlee otú mmadụ pụrụ isi bụrụ otù onye nime ndị agọziri agọzi?
  5. Gịnị kpatara mmadụ ji kwesị ịchọ Chineke ugbu a?
  6. N’oge nsogbu, gịnị ka Chineke na-emere ndị Ya?
  7. Òlee otú Onyenwe anyị si eduzi ndị Ya?
  8. Were ndụ onye ajọomume tụnyere ndụ onye eziomume.