Abù Ọma 10:1-18; 14:1-17; 36:1-12

Lesson 240 - Junior

Memory Verse
“Onye-nzuzu asiwo n’obi-ya, Ọ digh Chineke ọ bula di” (Abù Ọma 14:1).
Notes

Nkewapụ site n’ebe Chineke nọ

Chineke kpalirị Devid ide Abù Ọma ndịa. Ha na-egosi anyị ihe ọjọọ dị nime mmehie. Ọ bụrụ na ekwensu na-achọ ime ka anyị kwere na mmehie adịghị óké njọ, ka anyị cheta na ekwensu adịghị ekwu eziokwu. Otù mmehie nime ndụ mmadụ ga-eme ka onye ahụ bụrụ onye ná-emebiiwu. Ịgụkọta mmadụ ya na ndị ná-emebiiwu, apụtaghị na onye ahụ ga-enwe ọtụtụ mmehie, maọbụ mmehie niile ahụ ana-agụ dịka mmehie dị ukwuu. Ọ bụghị kwa na onye ahụ ga-abụ okenye. “Ọbuná nwata nēme ka amata ya site n’omume-ya nile, ma ọlu-ya di ọcha, ma o zi-kwa-ra ezi” (Ilu 20:11). Ilefuru nzọpụta anya, inupuru Chineke isi, na ịjụ kwa ime ka obi anyị dị ọcha n’iru Chineke ga-egbochị anyị ịbịakute Chineke.

Ndị ekewapụrụ n’ebe Chineke nọ bụ ndị ná-emebiiwu. Otù mmehie na-ekewapụ mmadụ n’ebe Chineke nọ. Aisaia bụ Onyeamụma gwara ụmụmmadụ sị, “Ajọ omume nile unu aghọwo ihe nākpa ókè n’etiti unu na Chineke-unu, nmehie nile unu ezonariwo kwa unu n’iru-Ya” (Aisaia 59:2). Solomon sịrị, “JEHOVA di anya n’ebe ndi nēmebi iwu nọ” (Ilu 15:29).

Ikpeekpere

N’ihi na adịghị enye ụmụmmadụ ahụhụ mgbe ahụ ha mehiere apụtaghị na Chineke adịghị ahụ maọbụ na Ọ dịghị ama ihe banyere mmehie ha niile. N’ebe Devid nọ, ọ dị ya ka Chineke adịghị arịba óké mmebiiwu nke dị nime ndụ ụmụmmadụ ámá. Devid gwara Chineke okwu banyere ndị ná-emebiiwu dịka aga-asị na ọ na-eme mkpesa. Dịka onye nwere ibu arọ n’obi banyere mkpụrụobi furuefu, na onye ọ gaara adị mma ịhụ na ụmụmmadụ siri n’ụzọ ọjọọ ha chigharịa, Devid kpere ekpere. Abù Ọma niile ndịa dị ka ekpere nye Chineke.

Devid gwara Chineke okwu banyere ihe ọjọọ niile ọ hụrụ nime ndụ ụmụmmadụ. Ụfọdụ na-ejekwuru ndị ọzọ ikwu banyere mmehie ha hụrụ. Ụfọdụ na-ekwu okwuazụ. Devid kpereekpere. N’ikwu banyere mmehie nke dị ná ndụ ndịọzọ, ka anyị soro ihe nlereanya Devid gosiri site n’ịgwa ya Jisọs n’ekpere.

Obi nke Náeme Iheọjọọ

Abù Ọma ndịa na-egosi otú mmadụ na-esi eme omume mgbe obi ya ná ezighịezi n’ebe Chineke nọ. Ọtụtụ ndị mmehie agaghị achọ ka agụkọta ha na ndị ná-emebiiwu. Ha pụrụ ikwu na ndụ ha adịghị njọ nkeukwuu. Ma ọ bụrụ na agbanwebeghị obi, ọ bụrụ kwa na o jupụtaghị n’ịhụn’anya nke Chineke, ọ bụ nke ná-emebiiwu. Jeremaia bụ Onyeamụma sịrị, “Obi di aghughọ kari ihe nile, ihe nādigh ngwọta ka ọ bu kwa” (Jeremaia 17:9).

Apụkwara ịhụ ụfọdụ ndị mmehie ndị ná-ekwu ihe-ọjọọ n’ebe ọ dị ntà, ná-ejide kwa omume ha, ma n’iru Chineke ha bụ ndị amara ikpé, n’ihi na mmehie dị nime obi ha. Chineke na-ele obi (I Samuel 16:7). Ndịọzọ dị kwa ndị ná-achọghị ikwu maọbụ ime ihe ọjọọ; ma ha enweghị ike inyere onwe ha aka n’ihi na mmehie dị nime obi ha. Pọl Onyeozi gbara àmà na tutu ya enwee nzọpụta, na ya enweghị ike inyere onwe ya aka, nke mere na ya apụghị ime ihe ahụ dị mma nke ya chọrọrị ime, kama ihe ọjọọ niile ahụ nke ya ná-achọghị ime ka ya meworo (Ndi Rom 7:19). Mgbe Pọl nwetara nzọpụta, mgbanwe dị ukwuu batara nime ndụ ya. Pọl gara n’iru ikwu na ọ bụ Jisọs Kraist gbapụtara ya, ná-ekwu kwa na ike dịrị onye ahụ na-efè Chineke; ọ pụkwara ikwu na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ ya n’ịhụn’anya nke Kraist (Ndi Rom 8:35-39). Pọl sịrị, “É-è, kama n’ihe ndia nile ayị nēmeribiga ókè site n’aka Onye ahu Nke huru ayi n’anya.” Pọl nyere Chineke ekele “Onye nēnye ayi nmeri site n’aka Onye-nwe-ayi Jisus Kraist” (1 Ndi Kọrint 15:57). Mgbe azọpụtasịrị Pọl, ndụ ya wee dị ichè. Mmehie emerighị kwa ya ọzọ; kama o nwere mmeri n’ebe mmehie dị.

Mpako

Ọtụtụ Abù Ọma na-agwa anyị ihe banyere ndị ná-emebiiwu, otú ha na-esi emeso Chineke na ihe Chineke na-eche banyere ha. Mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya n’anya Chineke. Ihe onye ná-emebiiwu adịghị atọ Chineke ụtọ (Abù Ọma 5:4). Chineke kpọrọ ndị ná-emebiiwu asị (Abù Ọma 11:5; 5:5). “Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n’obi amara” (I Pita 5:5).

Devid sịrị na onye ná-emebiiwu bụ onye mpako. Ka anyị tụlee ihe mpako pụrụ iwetara mmadụ. Mpako na-eme ka mmadụ ná-echè banyere onwe-ya karịa iche banyere Chineke na ịchọ Chineke (Abù Ọma 10:4). Ọ na-eme ka mmadụ ná-achọ náánị ihe nke onwe ya, ọbụná rue n’ọnọdụ nke iwere ihe dịrị ndịọzọ, ná-emejọ kwa ha (Abù Ọma 10:2). Mpako na-eme ka mmadụ nyaa isi n’ihe niile obi ya na-achọ kama ịnya isi n’uche Chineke (Abù Ọma 10:3). Devid bụ ihe ilere anya nke ịbụ Onye-Kraist. Ọ sịrị, “JEHOVA ka mkpuru-obim gēji nya isi” (Abù Ọma 34:2).

Mpako na-eme ka ndị ná-emebiiwu mee ihe ndịa ná-adịghị atọ Chineke ụtọ. Ndị ná-emebiiwu na-eche na ihe niile ezuworo ha, na ọ dịghị nsogbu ọ bụla ga-eru ha arụ (Abù Ọma 10:6). Ha na-atụkwasị onwe ha obi, ná-anya kwa isi n’ụzọ nke onwe ha. Ha na-arafu onwe ha n’anya nke onwe ha (Abù Ọma 36:2). Ha nwere olileanya ụgha na ọ dịghị mgbe ha “gānọ n’ọdị-njọ.” Ndị ná-emebiiwu enweghị ọchịchọ banyere Chineke, ha adịghị kwa echè ihe banyere Ya (Abù Ọma 10:4). Ha adịghị atụ egwù Chineke (Abù Ọma 36:1). Ndị ná-emebiiwu na-emegide ikpé Chineke, ná-agọzi kwa ndị ahụ Chineke jụrụ ajụ (Abù Ọma 10:3). Ha na-atụ àtụmààtụ ọjọọ ná-ahụ kwa mmehie n’anya (Abù Ọma 36:4). Ndị ná-emebiiwu na-ewezuga ikpé ná-eche na Chineke echèfuwo maọbụ na Ọ dịghị ahụ mmehie ha niile (Abù Ọma 10:11). Mpako bụ mmehie n’ihi na ọ bụghị obi umeala, ịdịnwayọ na iwedata onweonye ala n’obi nke Jisọs kuziri, na nke O gosikwara nime ndụ Ya dịka ihe ilereanya nye ndị kwere ekwe. Jisọs sịrị: “Nyaranu yoke nkem n’olu-unu, muta-kwa-nu ihe n’ọnum; n’ihi na abum Onye nwayọ na Onye wedatara Onwe-ya ala n’obi: unu gāhu kwa izu-ike nye nkpuru-obi-unu” (Matiu 11:29).

Mkpagbu

Devid kwukwara ihe ọzọ ana-ahụ mgbe ọ bụla ná ndụ onye ná-emebiiwu -- ọchịchọ nke ịkpagbu ndị eziomume, ndị nke Chineke. Ọ dị ndị mmehie ndị ná-achọghị Chineke, ndị ná-achọghị kwa ịhụ onye ọ bụla ka ọ naeso Chineke ịnata ngọzi Ya niile. Ndị ná-emebiiwu dị ka anụọhịa ọjọọ niile ná-achọ ihe ha ga-adọgbu -- ha dị ka ọdụm ná-echere anụ ọ bụla ga-abịa n’ụzọ ya. Anya ha dị “na enyogide” ndị eziomume; ha na-eguzo n’ebe zoro ezo ijide ndị eziomume.

Jisọs nagidere ụdị mkpagbu dị otú a. “Ha nāchọ ijide Ya” (Matiu 21:46). Ha “we gba ìzù otú ha gēme ka Ọ ma n’ọnyà n’okwu” (Matiu 22:15). Ha chere Jisọs nche, wee zigara Ya ndị nledo ka ha wee “nwude Ya n’okwu” iwere Ya nyefee n’aka ndị ọchịchị (Matiu 12:13; Luk 20:20).

Jisọs gwara ndị náesoụzọ Ya na ha ga-enwe mkpagbu (Matiu 5:11, 44). Eboro ndị náesoụzọ Ya ebubo ụgha tụba ha n’ụlọmkpọrọ (Ọlu Ndi-ozi 5:17-20; 12:3-5; 16:19-24). Ọtụtụ ndị náesoụzọ Kraist egburuegbu bụ ndị nyere ndụ ha ijere Kraist ozi, na n’ihi Oziọma Ya. Ndịa weere ya dịka ohere dịịrị ha iwere ndụ ha nye n’ihi Kraist, ọnwụ ha dị kwa ebube n’igosipụta ịhụn’anya na amara Jisọs na ike nke Chineke nime obi ha. Ọ bụ ezie na ndị nke Kraist a tụfuru ndụ ha, ma ha debere okwukwe ha bụ nke kachasị óké mkpà; n’ihi na mkpụrụobi ha ga-adị ndụ nime ọñụ ebighịebi. Jisọs gwara ndị Ya ka ha ghara ịtụ egwù ndị ahụ nwere ike ibibi anụarụ, ma ha enweghị ike igbu mkpụrụobi. Mmadụ aghaghị ịtụ-egwù Chineke, n’ihi na mmehie na nnupuisi n’ebe iwu Ya dị aghaghị ịma mkpụrụobi ikpé mee ka ọ hụọ ahụhụ nime ọkụalammụọ ebighịebi (Matiu 10:28).

Ndị Bụ Ogbenye nime Mmụọ

Obi jupụtara ná mmehie na-eme ka ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ na mmegbu, karịsịa megide ndị nke Chineke. Ogbenye nke Devid kwuru ihe banyere ya bụ ndị ahụ wedara onwe ha n’ala bụ kwa “ogbenye nime mọ-ha.” Jisọs sịrị na ndịa so nime ndị agọziri agọzi (Matiu 5:3). Mmehie nime obi na-eme ka mmadụ ná-akwa ndị ahụ ná-adabere na Chineke emò (Abù Ọma 14:6). Ọ na-ekwu okwu n’ụzọ nduhie na n’ụzọ aghụghọ, ná-ekpuchi ịkpọasị ahụ dị n’obi ya (Ilu 26:26). Site n’ime onwe ya ihe ọ na-abụghị, na site ná nduhie, ọ na-agbalị imeri ndị nke Chineke. Ọchịchọ ndị ná-emebiiwu bụ iduhie na ibibi (Abù Ọma 14:4; 10:8).

Ndị ná-emebiiwu na-atụ àtụmààtụ ọjọọ megide ndị eziomume. Mgbe ụfọdụ n’abalị ha na-amụrụ anya, izube ajọ ihe megide ndị nke Chineke (Abù Ọma 36:4). Ana-ejide ha ná nzube ọjọọ niile nke onwe ha (Abù Ọma 10:2; 9:16). Devid sịrị “N’ugbu nke ha zobere ka anānwude ukwu-ha” (Abù Ọma 9:15). N’ilu, anyị na-agụ na “Onye nēgwu olùlù, nime ya ka ọ gādabà: ọzọ, onye nākpọre nkume, ya ka ọ gālaghachikuru” (Ilu 26:27).

Nime akwụkwọ Esta ọ dị ihenlereanya enyere banyere otù nwoke onye “anējide na nzube nile” o zubeworo. Otù nwoke ọjọọ ana-akpọ Heman kpọrọ Ndị Ju asị n’ihi na Mọdekai rubeere Chineke isi, ọ kpọghị kwa isi ala nye Heman (Esta 3:2). Heman wepụtara àtụmààtụ nke o chere na aga-esite na ya kwụgbue Mọdekai. Heman alụwokwarị osisi dozie kwa ya maka ọnwụ Mọdekai. Ma ihe niile gbanwere site n’ụzọ o si chee. Ahasuerọs bụ eze nụrụ banyere ịkpọasị nke Heman nwere n’ebe Mọdekai nọ, bụ nwoke “kwuru ezi ihe banyere eze” (Esta 7:9). Ahasuerọs jiri nsọpụrụ na àkụ ahụ nke Heman chererị na ya ga-enweta kwụghachị Mọdekai n’ihi ikwesị ntụkwasịobi ya. Eze nyere iwu ka ebibie Heman onye jupụtara n’ọchịchọ na nchepụta nke onwe ya, onye obi ya jupụtakwara n’ihe ọjọọ megide ndị nke Chineke. “Ha we kwuba Heman n’elu osisi nke o doziri nye Mọdekai” (Esta 7:10).

N’échèghị Échìchè

Devid kwupụtara nzuzu nke omume niile nke ndị mmehie. Ọ bụ enweghị uche n’ezie mere ka ọ na-enwe obi abụọ banyere ọchịchị Chineke na ike O nwere n’ebe ihe niile nọ, n’ihi na otù ụbọchị ikperè niile ga-egbu n’ala nye aha Onyenwe anyị, ire niile ọ bụla ga-ekwupụta kwa na Jisọs Kraist bụ Onyenwe anyị (Aisaia 45:23; Ndi Filipai 2:9-11).

Ndị ná-emebiiwu na-asị na ha adịghị atụ egwù Chineke (Abù Ọma 36:1). Ọbụná karị nke ahụ ndị ná-emebiiwu na-ekwu kwa na ọ dịghị Chineke ọ bụla dị. Ndị ná-enwe obi abụọ, ná-agọnarị kwa Chineke ná-eme otú ahụ n’ihi na ọ dị ha ka asị na ọ dịghị Chineke dị, n’ihi na ọlụ ha jọrọnjọ. “Ndi nile nālu ajọ ihe, hà amagh ihe?” Ha na-eme omumenzuzu, dị kwa ka ndị ná-enweghị ezi échìchè, n’ihi na mmadụ pụrụ ịnwapụta rue n’ebe o juru ya afọ na Chineke dị. Ọ dịghị ụzọ aga-esi nwapụta na nke a abụghị eziokwu, ma ndị ná-emebiiwu na-akpachapụ anya iche ihe dị otú a, ná-eduhie ma ná-aghọgbu kwa onwe ha. Ndị ná-emebiiwu bụ ihearụ, ha na-ebi kwa ndụ rụrụarụ na nke rereure (Abù Ọma 14:1, 3), ha adịghị ejere Chineke ozi, ha adịghị enye Ya nsọpụrụ, ha adịghị kwa emere onwe ha ezi ebere.

Ihe Egwù

Ewezuga ibi-ndụ jọrọnjọ na nke nzuzu, onye mmehie nọ nime óké egwù. Ọ bụ ezie na ndị mmehie pụrụ ikwu na egwù adịghị atụ ha, nke ahụ agaghị eme ka ahụhụ na nhụjuanya nke ga-abịakwasị ndị jụrụ ka ha na Chineke mee udo dị ntà. Ha na-eme ka ezi ihe niile nke ndụ a ganarị ha -- iheọma niile nke Chineke nwere inye ndị tụkwasịrị Ya obi -- ma na-ewetara onwe ha mbibi. “Ndi nēmebi iwu gālaghachi n’ala-mọ, bú mba nile ndi nēchezọ Chineke” (Abù Ọma 9:17).

Devid wepụtara ihe dị iche nime òkè nke ndị ná-emebiiwu na ngọzi nke ndị ná-atụkwasị Chineke obi. Ọ dịghị ebere dịịrị ndị ná-achọghị ichègharị, ma, “ebere nke JEHOVA nēsi na mgbe ebigh-ebi we rue mgbe ebigh-ebi n’aru ndi nātu egwu Ya” ọzọ “onye nātukwasi obi na JEHOVA, ebere gādi ya gburugburu” (Abù Ọma 103:17; 32:10). Mmebiiwu na ime ihe ọjọọ dị nime mmehie; ma ịdịọcha na ịdịmma dị nime Chineke nye ndị nke Ya. Ndụ onye mmehie bụ ihe ná-akpalite iwe, bụrụ kwa nke jupụtara ná mmebi échìchè niile, ma onye nke Kraist na-enwe ntachịobi na ojujuafọ.

Chineke na-elekọta ndị nke Ya. Àkụ niile nke ihe nke imemmụọ na-eju ha afọ n’ebe ọ dị ukwuu -- “abuba nke ulo-Gi” na “miri-iyi nke ihe-utọ-Gi” (Abù Ọma 36:8). Ha na-atụkwasị Chineke obi maka ịrọpụtara ha na ichèbe ha. Ha “nāgbaba kwa n’okpuru ndò nku-Gi abua” (Abù Ọma 36:7; 91:1; Deuteronomi 32:11, 12).

Ọ bụ site náánị n’ijere Onyenwe anyị ozi na ịtụkwasị Ya na iwu Ya obi ka anyị pụrụ inwe ndụ nke imemmụọ na ngọzi Ya niile n’ụba n’ebe a na n’ọñụ ebighịebi mgbe ndụ nke a gasịrị. “N’ihi na n’ebe i nọ ka isi-iyi ndu di: N’ìhè-Gi ka ayi nāhu ìhè.” Gụọ ihe Jisọs kwuru banyere ìhè na ndụ nime Jọn 8:12 na Jọn 10:10.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee ndị bụ ndị ná-emebiiwu?
  2. Òlee otú Chineke si eche banyere ndị ná-emebiiwu?
  3. Gịnị na-ekewapụ onye ná-emebiiwu site n’ebe Chineke nọ?
  4. Kpọọ aha ụfọdụ ihe mpako na-eweta nime obi.
  5. Ònye ga-akpagbu ndị nke Chineke?
  6. Gịnị bụ mkpagbu?
  7. Òlee otú anyị si mara na Chineke dị?
  8. Gịnị mere ụfọdụ mmadụ na-asị na ọ dịghị Chineke dị?
  9. Were ndụ onye mmehie tụnyere ndụ onye nke Kraist.
  10. Òlee otú ebighịebi ga-esi dị iche nye onye kwereekwe na onye ná-emebiiwu?