2 Samuel 15:1-17; 18:1-33; Abù Ọma 3:1-8

Lesson 241 - Junior

Memory Verse
“Mu onwem dinara ala, raru ura; etetaram; n’ihi na JEHOVA nākwagidem” (Abù Ọma 3:5).
Notes

Ọkparaeze Maramma

Devid chịrị alaeze niile nke Israel nkeọma ọtụtụ arọ, ma oge iruuju dịrị n’oge ọchịchị ya. Otù óké ihe iruuju mere ná ndụ ya bụ mgbe nwa ya, Absalom biliri imegide ya wee nwaa ịpụnara ya alaeze.

Ọkparaeze ahụ maramma bụrị onye ụmụ Israel na-eto n’ihi nke a ọ bụghị ihe siiri ya ike inweta obi ha. Ọ dị mgbe ọ na-agabiga n’okporoụzọ Jerusalem nime ụgbọala nke ịnyịnyaibu maramma na-adọkpụ ya na ndị ná eso ya na azụ, ọtụtụ ndịorù na-agba kwa ọsọ n’iru ya ime ka ụzọ ghere oghe na ịkpọsa ọbịbịa ya. Ná arụghịụka, óké ìgwè mmadụ na-agbakọta ịhụ ya ka ọ na-agafe, wee feere ya aka tie kwa mkpu sị: “Ọkpara-eze dị ndụ rue mgbe ebighi-ebi!”

Ma ịbụ onye amaara aha ya dị otú a ejughị Absalom afọ. Ọ chọrọ ịbụ eze wee náta kwa otuto nke náeso ọkwá ahụ. Ọ bụ onye kachasị okenye nime ụmụ ndị dị ndụ Devid nwere, bụrụ kwa onye nke ga-anọchi n’ocheeze dịka usoro ịbụ-eze si dị; ma ọ ga-abụ na o nwere mmetụta na Chineke gaje ịrọpụta onye ọzọ ịbụ eze náeso, maọbụ eleghịanya o nweghị ntachịobi ichere ka nna ya nwụọ. Ya mere Absalom malitere ịtụ àtụmààtụ ịpụnara ocheeze n’aka Devid bụ Eze.

Izuọjọọ Ahụ

Na mgbe ochie ọ bụ omenala nye ndịikpé na ndịokenye Israel ịnọdụ ala n’ọnụụzọámá nke obodo ha na mba ha dị icheiche ịnụ esemokwu na nsogbu niile nke ndị ha. N’ụzọ dị otú a ha pụrụ ịmazu ndị ha na-achị, wee dozie adịghịn’otù ha ka udo wee dị n’etiti ha. Ọ bụ ọnọdụ a ka Absalom rọọrọ nye onwe-ya. Mgbe ọ bụla ụmụmmadụ bịara n’obodo ịhụ eze, Absalom na-ejekwuru ha n’ọnụụzọámá obodo wee sị ha kọọrọ ya nsogbu ha. Ọ na-enwe obiọmịko dị ukwuu, wee kwenye na ikpé amaghị onye ahụ ná-ekwupụta nsogbu ya.

Absalom bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị obodo doro anya bụrụ kwa onye maara ụzọ esi enweta mmadụ site n’ọchịchọ obi ya. O wee mee ka ndị Israel chee na eze n’elefuru ha anya, ọ fọdụrụ nke ntà ka ọ kwaa ákwá mgbe ọ sịrị: “Ònye gēdom onye-ikpe n’ala nka, ka nwoke ọ bula nke nwere okwu ma-ọbu ikpe we biakutem, m’we kpọ ya onye ezi omume!” Ọ na-esutụ ọbụná ndị kpọọrọ ya isiala ọnụ. Ụmụmmadụ hụrụ nlekọta n’anya, site n’ụzọ dị otú a Absalom wee zuru obi Ụmụ Israel n’ori pụọ n’ebe nna ya nọ nye onwe ya.

Nnupụisi

Arọ wee ná-aga rue ụbọchị Absalom chere na ya adịwo ike ịkwatu ọchịchị nna ya. Otù ụbọchị o jekwuuru Devid wee gwa ya na ya aghaghị ijé Hebron ịkwụghachị otù mkwà. Nna ya enyochapụtaghị nzube ọjọọ ya, wee sị ya jee n’udo.

Mgbe Absalom rapụrụ Jerusalem o kuuru narị ndịkom abụọ tinyere onwe ya, wee zigaa kwa ndịnledo n’ala Israel niile ịgwá ha na oge eruwo ịgbanwe ọchịchị n’akaike. Mgbe ha ga-anụ olu opiike ha ga-ama na Absalom aghọwo eze n’Israel. Absalom mekwara ka Ahitofel bụ onyeisi ndị ndụmọdụ Devid bụ Eze soro ya iji mee ka àtụmààtụ ya sie ike. Ahitofel bụrị onye nke Chineke, okwu niile o kwuru bụ kwa nke si n’ọnụ Chineke pụta. Ná agbanyeghị obi mmehie nke Absalom ọ chọrọ inyeaka Chineke nime nnupụisi ya.

Àtụmààtụ niile nke Absalom dị ka ha na-agara ya nkeọma, usu ndịagha dị ukwuu nọnyekwaara ya na Hebron, ndị jikekwara ibuso Devid agha na Jerusalem.

Mgbapụ Devid

Devid nwere obintiwa mgbe ọ nụrụ ihe ọkpara ya ọ hụrụ n’anya mere. Otù onye sitere n’èzínaụlọ ya aghọgbuwo ya wee chigharịa imegide ya!

Devid matara na udo agaghị adịrị ya na Jerusalem, n’ihi nke a ọ kpọkọtara ọtụtụ ndịorù ya, wee jikere ịgbapụ. Òlee ndị i chere soro ya? Ọ bụghị ndị Israel ọ lụwooro óké ọlụ, kama ndị Pelet na ndị Keret bụ ndịkom Filistia; tinyere ndị Gat bụ ndị bịara na Jerusalem mgbe ná-adịghị anya.

Devid gwara Itai bụ onyeisi ha, na o kwesịghị ka ya na ndị ya tinye onwe ha n’iheizendụ inyere ya aka, ma Itai zara sị, “JEHOVA nādi ndu, onye-nwem bú eze nādi kwa ndu, n’ezie n’ọnọdu ebe onye-nwem bú eze, gānọ, ma-ọbu inwu anwu ma-ọbu idi ndu, n’ezie n’ebe ahụ ka orù-gi gānọ kwa.” Okwu ya na-echetara anyị ihe Rut, nwanwanyị Moab gwara nne di ya: “Ebe i nēje ka m’gēje; ọ bu kwa ebe i nānọ ọnọdu-abali ka m’gānọ ọnọdu-abali: ndi-gi gābu ndim, Chineke-gi gābu kwa Chinekem” (Rut 1:16).

Ọjụjụ Ndị Ju

Chineke akpọwo mba Israel ịbụ ndị nke aka-Ya. Ma ha jụrụ ifè Ya òfùfè, ndị Mbaọzọ wee hụta kwa na ụzọ nzọpụta ghere oghe nye ha. Ọtụtụ nime ha ñụrịrị ọñụ n’ihi nke a wee bịakute Onyenwe anyị. Rut bụri onye Mbaọzọ; otú a ka ọ dị kwa ndị Filistia ndị nọnyeere Devid. Ha natara ngọzi nke Chineke site n’ịnọnyeere ndị Ya.

Mgbe ndị Ju jụrụ Kraist, Ọ kwara ákwá n’ihi Jerusalem. Gịnị mere ha anaraghị ozi nke nzọpụta O wetara? Ọ bụrụ náánị na ha ga-aghọta ikpé nke chere ha, n’ezie ha ga-etiku Ya ka Ọ zọpụta ha! Kama nke ahụ ha kpọgidere Ya n’obe.

Ọ bụ n’okpuru ugwu ahụ, ebe Devid na-ejé ijè ugbu a, ka Jisọs wụpụrụ obi Ya n’iruuju n’abalị ikpeazụ ahụ, n’ihi ndị Ya ná-ekweghịekwe. Devid na ndị náeso ya gba ụkwụ efu mgbe ha na-ejé, rulata isi ha, ná-ákwá kwa ákwá, Ndị nke aka ha ajụwo ha!

Enyi Devid

Ka ndịa na-agbapụ agbapụ na-aga n’iru n’ijè ha nime ọzara ha hụrụ ndị ná-esoroghị Absalom n’ụzọ n’ebe dị icheiche. Hushai bụ otù nime ha, onye bụwororị enyi na onye ndụmọdụ Devid. Devid zigara Hushai n’obíeze dịka onyenledo, na inye Absalom ndụmọdụ ụgha. Ndịnchụàjà na-anọdụ na Jerusalem ga na-ewetara Devid akụkọ.

Ndị Livai chọrọrị iso Devid si n’obodo pụọ, ná-ebu Igbe Ọgbụgbandụ Chineke. Ma Devid agwawo ha ka ha laghachị n’ụlọikwuu nọdụ n’ebe ahụ, n’ihi na n’ezie Chineke ga-echèbe Igbe Ọgbụgbandụ Ya. Ọ bụrụ na ọgbaaghara nke a esiteghị n’ajọomume Devid, Chineke ga-eme kwa ka ọ lata n’udo. Ma ọ bụrụ na Devid mehiere, nsogbu nke a wee bịakwasị ya dịka ahụhụ mmehie, ọ chọghị ka Igbe Ọgbụgbandụ Chineke soro ya hụkọọ ahụhụ.

Ntụkwasịobi Devid

N’oge niile a nke ọnwụnwa, Devid tụkwasịrị Chineke obi ya. Ọ bụ oge a ka o dere Abù Ọma nke atọ (3). Ọ tụghị egwù ìgwè bara ụba ndị biliri ibuso ya agha; nime ọgbaaghara niile, mmegbu na izu ọjọọ, ọ pụrụ ịsị, “Mu onwem dinara ala, raru ura; etetaram; n’ihi na JEHOVA nākwagidem” (Abù Ọma 3:5).

Absalom nime Jerusalem

Ngwangwa Absalom nụrụ na nna-ya esiwo n’obodo pụọ, ya na ndịagha ya batara nime Jerusalem. N’ebe ahụ ka o jikeere ibuso nna ya agha. Ahitofel wee nye ndụmọdụ na ike ga-agwụworị Devid na ndịkom ya site ná mgbapụ ahụ, na ugbu a ga-abụ oge kwesịrị ịdakwasị ha merie ha ọsọsọ.

Absalom chọkwara ndụmọdụ Hushai. Nke a bụ ohere Hushai nwere iji nyere enyi ya Devid aka. Ọ tụlere n’uche ya na akpaliwo Devid na ndịkom ya nke ukwuu site ná mmeso ọjọọ ahụ emesoro ha, obi ha ga-adị kwa ilu dịka nne bear anapụsịrị ụmụ ọhụụ ya. Absalom aghaghị ịmata kwa n’ezie na nna ya ka bụ dike n’agha, apụghị kwa imeri ya ọsọsọ. Hushai dụrụ Absalom ọdụ ka o chere rue mgbe mmụọ Devid dajụrụ, ma were oge a chịkọta ndị-agha bara ụba site n’ebo niile nke Israel iji hụ na o meriri n’agha ahụ. Chineke zitere ndụmọdụ a iji merie ndịagha Absalom, ma Absalom naara ya, wee ghara ịmalite ngwangwa ibuso Devid agha.

Iwe were Ahitofel nke ukwuu na ewezugara ndụmọdụ ya, o wee laa n’ụlọ ya, wee dozie ụlọ ya, wee wepụ ndụ ya n’onwe ya. Ọ bụworị nwoke ñara ntị n’amamihe Chineke n’otù mgbe. Ma mgbe ọ gbakụtara ụzọ eziomume azụ wee ree onwe-ya nye mmehie, olileanya wee funarị ya o wee nwụọ n’ọnọdụ onye gburu onwe ya. Lee óké ihe ọmịko ọ ga-abụ ịmata ịhụn’anya Chineke na mbụ, wee mesịa bụrụ onye lara n’iyi ebighịebi.

Ọgụ Ahụ

Devid ka bụrị dike maara ibu agha nkeọma, ngwangwa o doziri ndị agha ya n’usu atọ, ha wee nọdụ ná njikere chere mgbe Absalom ga-abịa. Ọgbọ-agha ahụ bụ akụkụ obodo ná-adịghị larịị nke dị nime óké ọhịa. N’ụbọchị mbụ nke ibu agha ahụ ndụ nke iri puku ndịkom abụọ (20,000) lara n’iyi, “oke ọhia ahu we ripia ọtutu madu n’etiti ndi Israel n’ubọchi ahu kari ndi mma-agha ripiara.”

Nime agha ahụ ewezugara Absalom pụọ n’ebe ndị-agha ya nọ, ka ọ na-agba n’elu ịnyịnya mule ya isi ya wee baa n’alaka tụhịrị atụhị nke otù osisi. Ịnyịnya mule ahụ wee gabiga ya.

N’ebe ahụ ka Absalom nke ná-enweghị onye inye aka kwụrụ n’elu osisi, otù onye sitere ná ndị agha Devid wee hụ ya. O wee gwa Joab bụ onyeisi ya, Joab wee jụọ ya ihe mere o tigbughi Absalom. Onye agha ahụ wee sị na ya nụrụ ka Devid na-arịọ ndịkom ya ka ha mesoo Absalom nwayọọ, n’ihi nke a o chèghị ime ya ihe ọjọọ ọ bụla.

Ma Joab esighị otú a cheè échìchè. O weere Absalom dịka onye ná-emegide ezi ọchịchị; ná agbanyeghị ma ọ bụ ọkparaeze ma ọ bụghị, aghaghị ibibi ya. O wee chịrị mkpàn’aka nwere ọnụ dị nkọ atọ dụba ha n’obi Absalom, ya na ndịkom ya wee tida ya n’ala lie ya n’òlùlù. Ha wee mee ka óké óbò ukwuu nke nkume guzo n’elu arụ ya.

Iruuju Devid

Ndịọgbaọsọ abụọ bugaara Devid ozi mmeri ahụ. Ihe mbụ Devid jụrụ banyere ya bụ udo nke Absalom. Otù nime ndịọgbaọsọ ahụ zara sị: “Ndi-iro onye-nwem, bú eze, na ndi nile ndi biliworo imegide gi imejọ gi, ka ha di kwa ka nwa-okorọbia ahu.” Devid wee ghọta na nwa ya anwụwo, o wee baa nime ụlọ ya náánị ya ịkwara ya akwa: “Nwam Absalom, nwam, nwam Absalom! ọ gādim nọ nma ma asi na mu onwem anwuwo n’ọnọdu gi, Absalom, nwam, nwam!”

Obi jọrọ ndị Israel soro Devid njọ. Ha chere na ha na-efè Devid òfùfè n’ikwesị ntụkwasịobi site n’ibu agha megide ndị ná-akpagbu ya, ma ugbu a ọ dị ka ha emewo ihe ọjọọ. Joab biliri n’obiike wee jekwuru Devid dọọ ya akanántị ka o gosi ndị Israel obiekele bụ ndị buru agha ịnapụta ya, maọbụghị otú a ha ga-ebili megide ya. Devid ghọtara ọlụ dịrị ya nye ndị nke ya, o wee wezuga échìchè nke onwe ya jee nọdụ ala n’ọnụụzọámá obodo ịkasị ndị ya obi.

Absalom bụrị nwaeze, onye nwere ohere niile na ndụ ya. Ọ bụrị ọgaranya maa kwa mma ile anya. Ọ mataworị ihe banyere Chineke, wee nata kwa iruọma nke ụmụmmadụ. Kama iji amara nke iruọma niile a nyere ndị ọzọ aka, o chere banyere náánị onwe ya. Ọ kwara nna ya emò, lelịa kwa Chineke, wee site n’ihi nke a baa n’ílì n’ihere, ịlan’iyi ebighịebi. “Ugwọ-ọlu nke nmehie bu ọnwu” (Ndi Rom 6:23).

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ Absalom?
  2. Kọwaa ụdị na omume ya nke mere ụmụmmadụ ji hụ ya n’anya.
  3. Gịnị ka Absalom chọrọ?
  4. N’ụzọ dị añaa ka o si lụpụta nzube ya?
  5. Gịnị ka Devid mere mgbe ọ nụrụ banyere nsogbu ahụ?
  6. Òlee otú esi jide ma gbue kwa Absalom?
  7. Gịnị bụ ụgwọọlụ nke mmehie?