Lesson 242 - Junior
Memory Verse
“Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ugbò abua, ma nmehie adigh ya, ka ewe zọputa ha” (Ndi Hibru 9:28).Notes
Mbilimmegide nke Absalom
Absalom adọrọwo mkpụrụobi nke ọtụtụ mmadụ n’Israel nye onwe-ya, o wee kpalie óké mmegide nye nna nke aka ya, eze kachasị nke Israel nweworo. Devid agbapụwo site na Jerusalem, wee na-ezo kwa nime ime ọzara ebe nwa ya nwoke na-agbalị ịchị ndị Israel. Ndị niile gbakụtara Devid azụ chere na ihe niile ga-adị mma ugbu a Absalom bụ nwoke maramma nọ n’ọchịchị, n’ihi na o kwewo mkwà ilekọta ha nkeọma na ịhụ na ekpere ha ikpé dịka ha chọrọ.
Ma ịnyaisi nke Absalom bụ iheefu. O kwewo mkwà ọtụtụ ihe nke ọ na-apụghị imezu. Mgbe ná-adịghị anya egburu ya n’agha, e wee rapụ ndị Israel ná-enweghị eze. Ha dị ka atụrụ ná-enweghị onyeọzụzụ. Ná-enweghị onye ọ bụla ga-eme ka ihe niile gaa n’usoro ná-eduzi kwa ihe niile, mgbe ná-adịghị anya ihe niile dabara n’ọgba-aghara.
Nime nsogbu ha, ndị Israel malitere iche échìchè banyere Devid ọzọ. Òlee ebe ọ nọ? Ọ pụghị ịnapụta ha n’ọnọdụ a? Ha chètara na o jeworo ha ozi ọtụtụ arọ n’ịhụn’anya, na ọ napụtawo kwa ha ọtụtụ ugbò n’aka ndị Filistia. Gịnị mere akpọghachịghị Devid na Jerusalem ịbụ onyeisi ha?
Mwuta Devid Nwere
Devid agbaghị ọsọ laghachị Jerusalem ngwangwa ọ nụrụ banyere ọnwụ nwa ya nwoke. O bu ụzọ chọọ ịma ma achọrọ ya. Ọ hụwo ndị ya n’anya nkeukwuu, ọ fọdụkwara ntakịrị ka obi ya gbawaa mgbe ha biliri megide ya. N’ụbọchị ọjọọ ahụ mgbe Devid nụrụ na akpọsawo Absalom ịbụ eze, ọ pụrụ n’obodo jee n’elu ugwu, gbara ụkwụ efu, rulata kwa isi ya.
Ajụrụ Juda Ajụjụ
Oge gabigara, ọ gụkwara Devid agụụ ịlaghachikwuru ndị ya na inyere ha aka. Ọ gbagharawo mmegide ha, jikere kwa ichefu enweghị obiekele ha n’ebe ọ nọ. N’ikpeazụ ọ nụrụ okwu na ebo dị icheiche nke Israel na-ekwurita okwu n’etiti onwe ha ịkpọghachị ya n’ocheeze ma site n’ebo nke ya onwe ya bụ ebo Juda, anụghị okwu ọ bụla.
Otù ụbọchị Devid gwara ndị nchụàjà (ndị nọnyewooro ya) ka ha jekwuru ndịokenye Israel jụọ ha ajụjụ sị. “N’ihi gini ka unu bu ndi ikpe-azu ime ka eze lata n’ulo-ya? Ma okwu Israel nile abiaruwo eze nti, ime ka ọ lata n’ulo-ya? Umu-nnem ka unu bu, ọkpukpum na anu-arum ka unu bu: n’ihi gini kwa ka unu bu ndi ikpe-azu ime ka eze lata?”
Ọ bụghị náánị na Devid jikeere ịgbaghara ndị Israel biliri megide ya ma o kwere ụfọdụ nime ha mkwà ọnọdụ dị elu n’obíeze ya ọ bụrụ náánị na ha ga-akpọghachị ya. Ndịkom Juda wee malite ịhụ mkpà Devid dị ha, ha wee zigaara ya ozi a sị: “Lata, gi onwe-gi na ndi-orù-gi nile.” Obi ha wee laghachikute Devid bụ eze ha ha hụrụ n’anya.
Nlaghachita Ahụ
Óké ọñụ dị n’ọmụma ụlọikwuu nke Devid mgbe ọkpụkpọòkù ahụ rutere ya. Ngwangwa Devid na ndị niile ya na ha nọ wee bulie ijè ha ịlaghachị rue n’osimiri Jọdan na isi obodo ahụ. Ndịkom Juda abịawo iji ekele ana-ekele eze zute ha, ha ji óké ememe dufeta eze na ndị so ya na mmiri Jọdan. Ha nabatara Devid dịka eze ha, kwee kwa mkwà ọzọ ịsọpụrụ ya.
Ágụrụ Kraist n’ihi Ndị Ya
Apụrụ iji agụụ ahụ Devid nwere ịnọ n’etiti ndị ya otù ugbò ọzọ tụnyere agụụ Kraist nwere n’ihi ezi Nzukọ Ya -- Nwanyị anaalụ Ọhụụ nke Kraist. Ugbu a Ọ nọ na “ala ọzọ” (obodo ahụ dị anya) nke O kwuru banyere ya n’ilu (Matiu 21:33-41); Ọ na-échèrè kwa ndị Ya ka ha jikere ịnọnyere Ya n’Ụlọ Ya n’elu.
Jisọs chọrọ ịbịa kpọrọ ndị Ya ka ha nọnyere Ya, ịhụ Ya n’otuto Ya, na ịchị ọchịchị na isoro Ya bụkọọ eze. Ànyị chọrọ ka Ọ bịa?
Ànyị na-eme ihe ọ bụla ná-akpọ Jisọs òkù ịlaghachị? Ọ gaghị abịaghachị rue mgbe Nwanyị ahụ Ánaalụ ọhụụ jikereworo izute Ya. Mmụọozi ahụ gwara Jọn n’Agwéetiti Patmos na ịmáọkwà nke Oriri Ọlụlụnwunye nke Nwaatụrụ ahụ ga-abụ: “Ka ayi ñuria ọñù, ka obi nātọ kwa ayi utọ nke-uku, ka ayi were kwa otuto nile nye Ya: n’ihi na ọlulu-nwunye nke Nwa-atutu ahu abiawo, nwunye-Ya edoziwo kwa onwe-ya” (Nkpughe 19:7).
Ezi Nzukọ ahụ bụ Nwanyị anaalụ Ọhụụ nke Kraist. Ọlụ anyị n’ebe a, dịka ndịKraist, bụ ijikere anyị dịka nwanyị nye di ya. Jisọs bụ Onye ahụ náalụ Nwunye Ọhụụ nke obi anyị.
Njikere
Ná njikere anyị, anyị na-eyikwasị iheịchọmma nke imemmụọ. Aha dị icheiche ka anyị na-akpọ ya. Ezi ákwàọcha ahụ bụ eziomume nke ndị nsọ. “Ewe kwenyere ya ka o gbokwasi onwe-ya ezi akwa ọcha nēnwu enwu, nke di kwa ọcha: n’ihi na ezi akwa ọcha ahu bu ezi omume nile nke ndi nsọ” (Nkpughe 19:8).
“N’uwe akpara akpa nke ọma ka agēduru ya jekuru eze” (Abù Ọma 45:14). Ọ bụ onyinyeamara niile nke OnyeKraist bụ ákwà ahụ akpara nkeọma nke eji chọọ Nwanyị ahụ ana-alụ Ọhụụ mma. Ọ na-ebi ndụ ya dịka òzízí niile nke Baịbụl si dị, ọ makwara mma n’anya Onyenwe anyị. Ihe ịchọmma ya bụ “mọ di nwayọ di kwa udo, nke di oké ọnu-ahia n’anya Chineke” (I Pita 3:4).
Agụụ anyị Maka Onyenwe anyị
Mgbe anyị yikwasịworo iheịchọmma niile a, anyị na-enwe agụụ dị ukwuu nime obi anyị ịhụ Onye ahụ náalụ Nwunye Ọhụụ, bụ Ọkpara Chineke. Devid nwere ọchịchọ ahụ mgbe o kpere ekpere sị “Ònye ka m’nwere n’elu-igwe ma-ọbugh Gi? Ma-ọbugh Gi ọ digh onye ihe-ya tọworom utọ n’uwa” (Abù Ọma 73:25).
Mgbe awụsịrị anyị mmiri nke Mmụọ Nsọ, Mmụọ nke Chineke na-ebiri nime anyị, Ọ na-agwa kwa anyị okwu banyere Jisọs, ka anyị na-aña kwa ntị n’okwu niile Ọ na-agwa anyị nwayọ nwayọ banyere ịhụn’anya nke Jisọs nye anyị, agụụ anyị ịhụ Jisọs gana-abakarị ụba.
Mmụọ ahụ na-akọwara anyị Akwụkwọnsọ nke ná-agwa anyị banyere Ụlọ ọma ahụ nke Jisọs jere ịkwadoro Nwunye Ọhụụ Ya. Ọ na-agwa anyị banyere urù niile anyị ga-enweta mgbe anyị na Ya nọ: “Onye nēmeri emeri, ya ka M’gēkweye ka o som nọdu ala n’oche-ezem, dika Mu onwem meri-kwa-ra, we so Nnam nọdu ala n’oche-eze-Ya” (Nkpughe 3:21). Ọ na-akọwara anyị banyere ihe ọlụ anyị ga-abụ mgbe anyị ga-eje nọnyere Onyenwe anyị: “Ngọzi nādiri ya, ọ di kwa nsọ, bú onye nwere òkè nime mbilite-n’ọnwu mbu ahu: ọnwu nke abua ahu enwegh ike n’ebe ndia nọ; kama ha gābu ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Kraist, ha gēso kwa Ya buru eze nnù arọ abụa na ọgu iri ahu” (Nkpughe 20:6). Nke ahụ ga-abụ ọchịchị nke eziomume n’eluụwa a n’oge Ọchịchị Puku arọ.
Ị na-enwe agụụ maka ọbịbịa nke Jisọs? kaọbụ ị naalụsi ọlụ ike n’ihe nke aka gị na inweghị ohere ichè échìchè banyere ya? Ònye bụ onye mbụ ị na-eche ihe banyere ya mgbe i tetara n’ụra n’ụtụtụ? Olileanya gị ọ bụ na “Jisọs pụrụ ịbịa taa?” Ònye bụ onye kachasị mkpà dị ná ndụ gị? Ị na-ewere ya ihe kachasị mkpà ime ihe ná-atọ Jisọs ụtọ, bụ Onye náalụ Nwunye Ọhụụ nke mkpụrụobi gị, karịa ime ihe ná-atọ ndịenyi gị na ndị gị na ha naeso ụtọ?
Nke Ya site ná Mgbapụta
Jisọs ejiwo Ọbara Ya dị óké ọnụ zụta anyị. Anyị bụ nke Ya, dị kwa óké ọnụ n’anya Ya. Ọ hụrụ anyị n’anya rue ịnwụrụ anyị ọnwụ, azọpụtakwara anyị site n’Ọbara Ya. “Dika obi-utọ nke onye na-alu nwunye ọhu nwere n’aru nwunye ọhu ya, otú a ka obi gātọ Chineke utọ n’aru gi” (Aisaia 62:5). Òlee otú ịhụn’anya anyị n’ebe Ọ nọ ra ma e were ya tụnyere ịhụn’anya Ya n’ebe anyị nọ? Ànyị na-etinye ndụ anyị n’ijere Ya ozi? Ànyị jikeere ịnwụ n’ihi Ya ọ bụrụ na ọ dapụta na ọ ghaghị ịdị otú ahụ?
Mgbe anyị jụrụ onweanyị ajụjụ niile dị otú a, mgbe ná-adịghị anya anyị ga-amata ma anyị nwere ezi agụụ ka Eze anyị laghachị maọbụ na anyị enweghị. Ọtụtụ ndị mmehie n’ụbọchị taa naenwe mmetụta na Jisọs na-abịa mgbe náadịghị anya. Òlee ihe banyere ndị nke Ya? Hà naasị Eze ahụ laghachịta, ná-ele kwa anya Ya ịbịa mgbe náadịghị anya? Ọtụtụ ndị náasị na ha bụ nke Jisọs adịghị alụsị ọlụ ike ijikere onwe ha izute Ya. Ha naegosi site n’otú ha si ebi ndụ na ha adịghị eme ngwa ịhụ Ya. Lee óké mwute Ọ naaghaghị inwe ịhụ omume ejighị ihe kpọrọ ihe ha!
Òkù nke Oziọma
Otù nime ọlụ nke Nwanyị ahụ anaalụ Ọhụụ nke Kraist bụ ịrịọ ndị mmehie ka ha chọọ nzọpụta tutu oge agaaganarị ha ebighịebi. Ka anyị jụọ onwe anyị, “Àyị nwere oké mmetụta n’ihi mkpụrụ-obi?” Ànyị naenwe agụụ ịhụ ka Oziọma naagbasa rue ụwa niile, ka o wee bụrụ na ọtụtụ nde mmadụ ndị na-anụbeghị ọbụná banyere Jisọs ka gaenwe ike bụrụ ndị azọpụtara?
Mmụọozi ahụ gwara Jọn n’Agwéetiti Patmos, “Mọ Nsọ na nwayi ahu anālu ọhu nāsi kwa, Bia” (Nkpughe 22:17). Ya mere ọ bụrụ na anyị bụ Nwanyị ahụ anaalụ Ọhụụ nke Kraist, anyị naasị, “Bia.” Site ná ndụ ebiri nye Jisọs, site n’ikpesi ekpere ike, site n’ịgbáàmà anyị, anyị naariọ onye ahụ anaazọpụtabeghị ka o nye Jisọs obi ya ka ya onwe ya wee bụrụ kwa otù nime Nwanyị ahụ anaalụ Ọhụụ nke Kraist.
Ọ bụrụ na anyị naeme ihe niile anyị pụrụ ime n’ihi Jisọs, anyị pụrụ isoro Jọn Onyeozi kwue sị: “Bia, Onye-nwe-ayi Jisus” (Nkpughe 22:20).
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Gịnị mere Devid ji bụrụ onye gbapụrụagbapụ site n’obodo?
- Gịnị bụ ọnọdụ nke Israel mgbe egbusiri Absalom?
- Gịnị mere Devid ji chèrè nwaoge tutu ya alaghachị na Jerusalem?
- Ònye kpọrọ Devid òkù nke ọ chọrọ?
- Ònye bụ Eze anyị?
- Gịnị mere OnyeKraist ọ bụla ji chọọ ka Ọ laghachịta?
- Òlee otú anyị pụrụ isi jikere onweanyị izute Eze anyị?
- Gịnị bụ ụfọdụ nime ọlụ nke Nwanyị ahụ Anaalụ Ọhụụ nke Kraist?
- Ònye naagwa anyị ihe dị icheiche náakpali obi anyị banyere Kraist?