2 Samuel 21:1-22

Lesson 243 - Junior

Memory Verse
“Ayi onwe-ayi ewerewo JEHOVA, bú Chineke Israel, ñuara ha iyi: ma ugbu a ayi apugh imetu ha aka” (Joshua 9:19).
Notes

Ikpéekpere

N’oge mgbe Devid bụ eze Ụmụ Israel, ụnwụ dara. Ụnwụ dịgidere rue arọ atọ, site n’otù arọ rue n’arọ ọzọ. N’oge a, mgbe iheoriri dị ụkọ, elekwara anya na agụụ naagụ ụmụmmadụ, Devid kpere ekpere. Ọ jụrụ Chineke ase banyere ụnwụ ahụ nke nọworo ogologo oge niile ahụ. Devid mere omume onye maara ihe site n’ịgwa Jehova okwu banyere ọnọdụ ahụ. Ọ bụ oge mkpà, Devid amaghị kwa ihe ọ ga-eme iji nápụta oge nsogbu a. Devid gwara Chineke okwu, bụ náánị onye pụrụ ịgwa Devid ihe kpatara ya. Ikpé ekpere bụ ihe ziriezi ime mgbe niile.

Devid pụrụrị ịkpọ ndị ná-enye ya ndụmọdụ. Eleghịanya ụfọdụ ga-échèpụtaworị na ha pụrụ ịnwa otù ihe; onye ọzọ ga-échèpụta ihe ọzọ. Ma site n’ijékwuru Chineke n’ekpere, agwara Devid ihe bụ nnọọ ihe kpatara ụnwụ ahụ. Devid ekpeghị ekpere ogologo oge tutu ọzịzá abịa.

Ọtụtụ mgbe ụmụmmadụ na-ahụju anya n’ihi na ha adịghị ejekwuru Chineke n’ekpere. Ọ dị mgbe ụfọdụ Chineke na-enye ohere ka ikpé bịakwasị mmadụ n’ihi mmehie dị na ndụ ha. N’ịhụn’anya na ebere Ya, Chineke ga-eduru ha n’ọnọdụ ebe ha ga-ekpé ekpere wee jụọ Ya ase, ma ha agaghị ekpe ekpere. Otù nsogbu n’elu ibe ya nwere ike ịbịakwasị ha, ma ha adịghị achọ Chineke. Site n’ịtụfu oge ha ná-ekpeghị ekpere, ha na-anapụ onwe ha ngọzi na inyeaka nke Chineke. Ụfọdụ mmadụ na-anọgide, si n’arọ baa n’arọ, ná nsogbu, na nhụjuanya, na nime mmehie, ná-achọghị Chineke. Site n’ilefuru anya na idebe oge agaekpe ekpere n’ọdịn’iru, mmadụ ga ná-aga n’iru ná-amaghị ihe, mmehie, maọbụ ime ndahie. Anyị pụrụ igbochiri onwe anyị ọtụtụ obimgbu site n’ikpé ekpere n’oge.

Ndị Gibeon

Jehova gwara Devid na ụnwụ ahụ dara n’ihi na Sọl gburu ụfọdụ ndị Gibeon. Ndịa abụghị Ụmụ Israel, ọ bụ ezie na ha ebiwo n’etiti ha ọtụtụ arọ. Ndị Gibeon ebiwo n’Ala Kenean ma ebibighi ha mgbe Ụmụ Israel bara n’ala ahụ na mbụ. Ụmụ Israel agbawo ndụ ikwenye ka ndị Gibeon dị ndụ; n’ihi na ndị Gibeon sitere n’aghụghọ na okwuụgha kwagide Ụmụ Israel ime ọgbugbandụ a. Ụmụ Israel arịọghị Chineke maka ndụmọdụ n’oge ahụ, ma ebe ha meworo ọgbụgbandụ ahụ Chineke chọrọ ka ha debe ya.

Otù Ọgbụgbandụ

Ụmụ Israel ghọtara ịdịmkpà nke mkwà ahụ ha kweworo. Ha sịrị: “Ayi onwe ayi ewerewo JEHOVA, bú Chineke Israel, ñuara ha iyi: ma ugbu a ayi apugh imetu ha aka … kwe kwa ka ha di ndu; ka iwe we ghara idikwasi ayi, n’ihi iyi ahu nke ayi ñuru ha” (Joshua 9:19, 20).

Ihe ra ka narị arọ anọ (400) agabigawo mgbe Sọl, dịka eze, gburu ụfọdụ ndị Gibeon. N’ịnụọkụn’obi ya, Sọl ebibiwo ọgbụgbandụ ahụ. Ọ bụghị ya na ha mere ọgbụgbandụ a, ma Chineke agụwo ya n’ihe jigidere Israel O lekwara anya na Sọl ga-asọpụrụ ya. Ọ bụghị ndị Gibeon mere mkpesa a, Chineke kwuuru ha ọnụ ha.

Ikpe Ọmụmá

Devid abụwo eze arọ olenaole mgbe ụnwụ a dara. Edeghị ihe ọ bụla banyere ogbugbu Sọl gburu ndị Gibeon; anyị amataghị nnọọ mgbe o mere. Ma ọchịchị Sọl akwụsịwo tutu oge a, n’ihi nke a ụnwụ a bụ ahụhụ enyere n’ihi ihe ọjọọ emeworo ọtụtụ arọ garaaga. Ụfọdụ mmadụ dị ka ha na-eche na oge náánị ga-ekpuchi mmehie, ma ọ bụghị otú ahụ dịka Okwu Chineke si dị. Eleghịanya ọ dịghị ihe ọ bụla ekwuru dị njọ mgbe egburu ndị ahụ, ma oge ruru mgbe Chineke jụrụ ase ya. “Unu emehiewo megide JEHOVA: mara-kwa-nu nmehie-unu, na ọ gāchọputa unu” (Ọnu-ọgugu 32:23). “Site n’aka rue aka, agagh-agu onye ọjọ n’onye nēmegh ihe ọjọ” (Ilu 11:21). Obodo ahụ niile hụjuru anya n’ihi mmehie Sọl.

Mgbe ụmụmmadụ nupụụrụ Chineke isi, ha na-eme ka ihe ọjọọ bịakwasị ha dịkwasị kwa ndị ọzọ. Ọ bụrụ na otù onye sitere n’otù èzínaụlọ emee ihe ná-adịghị mma, ọ na-emetụta èzínaụlọ ahụ niile. Ọ bụrụ na otù onye n’etiti nzukọ emejọọ Chineke, ndị ọzọ niile na-eketa òkè ná mwute nke nkewapụ ahụ. Mmadụ na-anata ahụhụ n’ihi mmehie nke ya, ma mmehie ahụ ga-eme ka ndị ọzọ hụjue kwa anya. Anyị amụwo iheọmụmụ banyere ihenlereanya ọzọ nke wepụtara eziokwu nke okwu a. (Lee Iheọmụmụ 172). Emeriri ụmụ Israel na Ai mgbe Ekan mehiere (Joshua 7:4). Enyeghị ha niile ahụhụ dịka enyere Ekan, ma ha niile hụjuru anya n’ihi ya.

MkwụghachịỤgwọ

Devid matara na mmehie bụ ihe ịtaụta na ihere nye mba ọ bụla (Ilu 14:34). Devid chọrọ ịkwụghachị n’ihi ihe ná-adịghị mma a nke emere ndị Gibeon. Ọ jụrụ ha ihe ekwesịrị ime. Ha achọghị ka ewere ego kwụghachị ha. Ọ bụghị mgbe niile ka apụrụ iji ọlaọcha na ọlaedo kwụghachị ụmụmmadụ ihe ọjọọ emeworo megide ha. Ndụ nke onye ọ bụla n’Israel agaghị ezu kwa ịkwụghachị. N’ikpé dị otú a, dịka Iwu si dị, ana-asachapụ amamikpé nke obodo ahụ site n’ịwụsị ọbara onye ahụ gburu mmadụ (Ọnu-ọgugu 35:33).

Sọl anwụwo n’oge a, ma Devid kwenyere na aga enye ndị Gibeon ụmụ ndịkom asaa sitere n’èzínaụlọ Sọl. Anyị pụrụ ikwere náánị na ụmụ ndịkom ndịa esowo nna ha keta òkè n’igbu mmadụ ahụ. Iwu ahụ na-akụzi na “agagh-eme ka ndi bu nna nwua n’ọnọdu umu-ha, agagheme kwa ka umu nwua n’ọnọdu ndi bu nna-ha: agēme ka ha nwua, onye ọ bula n’ihi nmehie nke aka-ya” (Deuteronomi 24:16).

Jisọs, Otù Onye ná-enweghi Mmehie

Ọ dị náánị otù akụkọ nime Baịbụl ebe emere ka otù onye ná-enweghị mmehie nwụọ ka o wee kpuchie mmehie nke ndị ikpé mara. Otù Onye ahụ ná-enweghị mmehie bụ Jisọs, otù Ọkpara Chineke, Onye nyere ndụ Ya ka e wee gbaghara anyị mmehie anyị kwụọ kwa ụgwọ anyị niile. “N’ihi na mgbe ayi nọ nādigh ike, mgbe oge ya ruru Kraist nwuru n’ihi ndi nādigh-asọpuru Chineke” (Ndi Rom 5:6). “N’uzọ ra otú a Kraist, ebe echere Ya n’iru Chineke nani otù mgbe iburu nmehie nile nke ọtutu madu, Ọ gēme kwa ka ndi nēche Ya hu Ya anya nke ugbò abua, ma nmehie adigh ya, ka ewe zọputa ha” (Ndi Hibru 9:28). “N’ihi na Kraist hu-kwa-ra ahuhu banyere nmehie, nani otù mgbe, Onye ezi omume n’ihi ndi ajọ omume, ka Ọ we kuru ayi biakute Chineke” (I Pita 3:18).

Ọnwụ

Devid leziri anya ka ọ ghara ibibi ọgbụgbandụ ọzọ -- nke ya na Jonatan, nwanwoke Sọl gbara (I Samuel 18:3). N’ihi mkwekọrịta ahụ Devid napụtara ndụ Mefiboshet, ma ndịkom asaa ndị ọzọ tụfuru ndụ ha n’ihi mbibi nke ọgbụgbandụ ha na ndị Gibeon.

Nne nke mmadụ abụọ nime ha kwara ákwá rue kwa uju n’ihi ọnwụ ha. O gosiri ịhụn’anya ya site n’ikpuchi arụ ha n’ebe ihe ọ bụla na anụọhịa ọjọọ nọ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọ sịrị na ndị Gibeon mere ihe na-adịghị mma. Ọ taghị Devid ụta na o nyere ohere ka ihe dị otú a dakwasị ụmụ ya. O zopụghị arụ ha, kama ọ rapụrụ ka e mee ihe ekpere n’ikpé. Ọnwụ ha bụ ụgwọọlụ nke mmehie (Ndi Rom 6:23).

Òlìlì

Mgbe mmiri òzùzò bịara, Devid nyere ha òlìlì dị mma, na-akwanyere Sọl ugwu, onye bụworo eze. Nime ílì Kish, nna Sọl, ka Devid liri ha, ha na Sọl na Jonatan ndị ndịkom Jebesh-gilead lekọtaworo ọkpụkpụ ha.

Ọ bụ ezie na ha bụrịị ụmụ nke eze, achọtara ọbara ha n’ihi mmehie nke emeworo. Site n’ime nke a, emere ka obi Onyenwe anyị jụrụ n’ihi obodo ahụ ụnwụ ahụ wee kwụsị.

Otù Agha Ebusoro ndị Okoroukwu

Nke a abụghị ọgwụgwụ nke nsogbu niile nye Devid. Ndị Filistia, ndịiro ha ochie, malitere ibuso ha agha. Anyị chetara na ọtụtụ arọ garaaga, Devid egbuwo otù onye nime ha, Gọlaiat, otù okoroukwu. Ọ dị ka ndị èzínaụlọ Gọlaiat echèfubèghị.

Ná agbaghịagụgọ Devid amalitewo ime okenye, arụ ya apụghị kwa ịnagide ọlụ nke ibu agha. Ọ bụ ezie na ọ dara m̀bà, Devid agbalagaghị. Mgbe Devid “dara m̀bà” Abishai wee tinye ndụ ya n’iheizendụ site n’ijé ịnapụta Devid. Abishai gburu okoroukwu ahụ onye tụworo àtụmààtụ igbù Devid.

Ụmụ Israel nwere nsọpụrụ nye Devid dịka eze ha. Ha agaghị ekwe ka o jee agha ọzọ. Ha sọpụụrụ Devid n’ihi ọnọdụ ya n’iru Chineke. Ndịkom Devid jere agha megide ndị okoroukwu nke Filistia. Onyenwe anyị nyeere Ụmụ Israel aka igbusi ndị niile kwujọrọ Chineke na Israel, dịka Gọlaiat meworo tutu emerie ya. N’oge a, Chineke nyeere Ụmụ Israel aka igbu ndị okoroukwu anọ -- nke ọ bụla nime ha nwere mkpịsịaka isii isii n’aka ya abụọ na mkpịsịụkwụ isii isii n’ụkwụ ya abụọ. Chineke nọnyeere Ụmụ Israel, ike nke ndị okoroukwu wee bụrụ ihe efu. Ya mere, Ụmụ Israel nwere mmeri ikpeazụ n’ebe ndị Filistia bụ ndị iro ha nọ.

Mmụọ Dị Iche

Anyị chetara akụkọ ọjọọ nke ndịnledo iri ahụ. Ndị ahụ tụrụ egwù ndị okoroukwu na mgbidi agbara obodo niile nke Kenean gburugburu (Ọnu-ọgugu 13:28). Ma Keleb nwere “mmụọ di iche” nke nwere okwukwe nime Onyenwe anyị. Mgbe iri arọ anọ na ise gasịrị, mgbe ọ naraworo obodo nke ndị okoroukwu dịka ihenketa ya, Keleb sịrị, “Elegh anya JEHOVA gānọnyerem, m’gānapu kwa ha ala-ha” (Joshua 14:12). Site n’inyeaka Onyenwe anyị, Hebron ghọrọ ihe-nketa nke Keleb n’ihi na o ji obi ya niile soro Jehova bụ Chineke Israel (Joshua 14:14).

Site ná ntụkwasịobi ha nwere na Chineke ka Devid na ndịkom ya ji nwee ike inwe mmeri zuru òkè n’ebe ndị okoroukwu nke Gat na ndị Filistia nọ. Site n’ịtụkwasị Chineke obi na site n’irubeisi n’Okwu Ya, anyị onwe anyị kwa pụrụ imeri ndị okoroukwu niile bụ ndịiro nke gaabịa imegide anyị.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú Devid si mata ihe kpatara ụnwụ ahụ?
  2. Oge ra añaa ka ụnwụ ahụ dịgidere?
  3. Òlee ndị bụ ndị Gibeon?
  4. Gịnị bụ ọgbụgbandụ ha na Ụmụ Israel gbara?
  5. Gịnị kpatara eji kwụgbue ụmụ ndịkom Sọl asaa?
  6. Gịnị mere eji nápụta ndụ Mefiboshet?
  7. Ndị okoroukwu ole ka etigburu n’oge a?
  8. Gịnị mere ndị Filistia ji lụsoo Devid ọgụ?
  9. Ònye meriri n’ikpeazụ n’agha niile ahụ n’etiti Devid na ndị Filistia?