2 Samuel 22:1-51

Lesson 244 - Junior

Memory Verse
“N’ihi na m’nēsite na Gi gba ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe: anamesite na Chinekem wubiga mgbidi” (2 Samuel 22:30).
Notes

Abù Ná-egosi Obiekele

Devid gosịrị obiekele nye Chineke n’ihi ngọzi Ya niile bara ụba. Devid ghọtara na ewezuga inyeaka nke Onyenwe anyị, na ya enweghị inyeaka. Ọ lụwo ọtụtụ agha siri ike mgbe ndịiro karịrị ndị-agha nke ya ike; ọ bụrụ kwa na Onyenwe anyị anọghị n’akụkụ nke ya ọ gaghị emeriwori. Obi Devid buliri nnọọ n’ihi ike nke Chineke nyeworo ya na o tiri mkpu sị “M’nēsite na Gi gba ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe: anamesite na Chinekem wubiga mgbidi.”

Devid chètara inye Chineke ekele n’ihi inyeaka ahụ. Ọtụtụ nime Abù Ọma bụ abụ ekele nke Devid nye Chineke Kachasị ihe niile elu. Onye ná-eledakwasị ndị dị umeala n’obi anya zitekwara ha inyeaka dị nsọ.

Devid enweghị mmetụta na Chineke nọ n’ebe dịkarịrị anya ịnụ ekpere ya. N’elu ebe ahụ n’Eluigwe, Chineke nụrụ zaa kwa. Eze Solomon nwekwara ụdị okwukwe ahụ mgbe o kpere sị, “Gi onwe-gi nuru kwa n’ebe-obibi-Gi, n’elu-igwe; mgbe I nuworo, Gị gbaghara” (I Ndi-eze 8:30). Jọn Onyeozi sịrị na ọ bụrụ na anyị kwere na Jisọs naanụ olu anyị, agaaza ekpere anyị (I Jọn 5:15).

Agha Niile Ahụ Chineke Buru

Òlee otú Chineke si bue agha niile nke Israel? N’Ijipt O zidakwasịrị ndị obodo ahụ iheotiti iji mánye ha ka ha kwere ka ndị Israel pụọ n’obodo ahụ. Chineke mere ihe icheiche nke mmadụ ná-apụghị ime. Ọ tụgharịrị mmiri nke osimiri Nail ka ọ ghọọ ọbara, ka onye ọ bụla wee ghara inweta mmiri ọñụñụ. Emesịa O mee kwa ka ọ ghọọ ezigbo mmiri. O zitere anwụ ntà na awọ imekpá ndị Ijipt, arụ; n’abalị ahụ nke jọgbukwara onwe ya O mere ka ụmụ niile ebuụzọ mụọọ wee nwụọ n’èzínaulo ọ bụla nke Ijipt.

Mgbe ndị Israel pụworo n’Ijipt wee hụ na emechibidoro ha n’etiti ugwu na osimiri, ndịiro ha nọ kwa ha n’azụ. Chineke mere ka mmiri ahụ laa azụ wee kwee ka ndị Israel gabiga n’alaakọrọ. Mgbe ndị Ijipt nwara ịchụso ha, Chineke kwere ka mmiri ahụ lata kwa n’oruru ọ na-eru ha niile wee mikpue. Mmadụ agaghị apụworị ịnapụta ndị Israel n’aka ndịiro ha, ma Chineke mere ya.

Ka e wee merie Kenean, Chineke mere ka mgbidi Jeriko darue ala, ka ndị Israel wee nwe ike pụ ịbà n’obodo ahụ. Otù mgbe O zitere ebu ịgba ndị ahụ ka ha wee gbalaga n’iru ndị Israel. Oge ọzọ dị icheiche mgbe ndịagha karịrị ha nke ukwuu bịara imegide ha ndị ha ná-apụghị imeri n’onwe ha, Chineke zitere óké akụmmiri igwe; na “kpakpando si n’uzọ nile ha atuliri atuli buso Sisera agha”, onye bụ onye iro nke Israel.

Mgbe náánị Jonatan na onye ná-ebu ihe agha ya bàra n’ọmụma ụlọikwu nke ndị Filistia -- ndịkom abụọ megide ọtụtụ ndị-agha -- Chineke zitere alaọmajijiji inye ha mmeri.

Ọbara Jisọs Nnapụta Anyị

Ná nsogbu niile nke Devid, Chineke anapụtawo ya-rị. O biri ndụ ime ihe gaatọ Chineke ụtọ. O nwewo mgbaghara nke mmehie ya, ọ dịghị kwa ya mkpà ọzọ ịtụegwù banyere ikpé. Otú ahụ ka ọ dị kwa n’ebe anyị nọ ọ bụrụ na anyị arịọwo Jisọs ka Ọ gbaghara anyị mmehie anyị sachapụ kwa ha n’Ọbara Ya. Site n’ichègharị ná mmehie anyị, anyị na-ezipụ ha ugbu a ka ekpee ha ikpé; mgbe Jisọs ga-abịa kwa ikpé ụwa ikpé anyị ga-enwe ike ikwu sị, “Azọputara site n’Ọbara nke Onye ahụ Akpọgburu.”

Devid sịrị “Ọ nādọputam, n’ihi na ihem tọrọ Ya utọ.” Ihe Devid atọghị Chineke ụtọ mgbe ọ bụ onye mmehie; kama mgbe agbagharaworo ya mmehie ya niile o wee hụ kwa Chineke n’anya site n’obi ya niile, mgbe ahụ ka Chineke nwere obi ụtọ n’ihe o mere.

Onyenwe anyị Ọ na-enwe obi ụtọ n’ihe anyị na-eme? Ndụ anyị na-ebi ọ na-adị ụtọ n’iru Ya? Ànyị na-echèta na Chineke na-ele ihe niile anyị na-eme? Ànyị na-eme kwa ha ka asọpụrụ Ya? Mgbe anyị na-eme otú a, anyị ga-enwe olileanya na Onyenwe anyị ga-anụ olu anyị mgbe anyị kpere ekpere, nye kwa anyị ọtụtụ ezi ihe. Jọn dere: “Ihe ọ bula ayi nāriọ kwa, ayi nānata ya n’aka-Ya, n’ihi na ayi nēdebe ihe nile O nyere n’iwu, ayị nēme kwa ihe nile nātọ utọ n’iru-Ya” (I Jọn 3:22). Ọ bụrụ na azaghị ekpere anyị, ka anyị leba anya ná ndụ anyị hụ ma anyị na eme ihe ọ bụla nke ná-adịghị atọ ụtọ n’iru Ya.

Okwu Ahụ Ezobere nime Obi

Devid pụrụ ikwu na ya edebewo ụzọ niile nke Jehova rube kwa isi n’ụkpụrụ Ya niile. Mgbe ọzọ ọ sịrị, “Ime ihe di Gi utọ atọwom utọ, Chineke, iwu-Gi di kwa nime obim” (Abù Ọma 40:8).

Anyị aghaghị ịmata uche Chineke, Okwu Ya, tutu anyị e nwee ike izobe ya, nime obi anyị. Anyị aghaghị ịgụ Baịbụl ná nleruanya ka anyị wee cheta ihe Onyenwe anyị chọrọ ka anyị mee. Ndịodeakwụkwọ na NdịFarisii n’oge nke Jisọs chere na ha matara Iwu ahụ nkeọma, otú ọ dị, Jisọs gwara ha ka ha nyochaa ihe edeworo n’Akwụkwọnsọ ka o wee doo ha anya na ha ga-ejikere ịbà n’Eluigwe. Ha nwere nghọta nke ha banyere ihe ha chere ziriezi, ha achọghị kwa ịmụta ihe banyere ebere na ịhụn’anya nye ndị ogbenye na ndị ana-emekpaarụ, dịka Jisọs kuziri.

Ha chere na o zuworo ha ịhụ ndịenyi ha n’anya kpọ kwa ndịiro ha asị: ma Jisọs sịrị “Nāhunu ndi-iro-unu n’anya, na agọzinu ndi nākọcha unu, me nu ihe ọma nye ndi nākpọ unu asi. Nēkpe kwa ekpere nye ndi nēsogbu unu na akpagbu kwa unu” (Matiu 5:44). Ha bụ ihe siri ike ime; ma ọ bụrụ na anyị hụrụ Jisọs n’anya n’ezie, Ọ ga-enyere anyị aka ime ha.

Ebere nye Onyeebere

Ọ bụrụ na anyị na-emere ndị ọzọ ebere, Chineke ga-emere anyị ebere. Devid matara nke ahụ wee dee sị, “N’ebe onye ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye ebere, n’ebe nwoke zuru òkè nọ I gēgosi Onwe gi onye zuru òkè.” Jisọs kwere mkwà ịgbaghara anyị ọ bụrụ na anyị gbaghara ndị ọzọ.

Anyị ga-achọpụta na anyị nwere ọtụtụ ndị enyi ọ bụrụ na anyị nwere obiọma n’ebe ndị ọzọ nọ gosi kwa ha na anyị hụrụ ha n’anya, dịka Jisọs chọrọ ka anyị mee. Ụmụmmadụ gana-emeso anyị otú anyị na-emeso ha; ọ bụrụ kwa na anyị bụ ndị maara náánị onwe anyị na ndị ná-akpọ mmadụ asị, ha ga-emeso kwa anyị otù aka ahụ.

Akọrọ akụkọ banyere otù nwaokoro ntà onye biri n’akụkụ otù ọhịa, otù ụbọchị o guzoro n’ezi tie mkpu sị, “Ndewo o.” Ọ nụrụ ụzụ daghachịịrị ya sị, “Ndewo o.” O chere na nwata nwoke ọzọ zaghachịrị ya, n’ihi nke a o tie kwa ọzọ sị, “Ị bụ nwanwoke ọjọọ!” Ụzụ daghachikwara sị, Ị bụ nwanwoke ọjọọ!” O tie ọzọ sị, “Bịa n’ebe a, m’ga-eti kwa gị ihe!” Ọzịzá ya bụrụ kwa, “Bịa n’ebe a, m’ga-eti kwa gị ihe!” “Anamabia.” “Anamabịa.”

Nwatakịrị nwoke a gbara ọsọ baa n’ụlọ wee gwa nne ya sị “Ọ dị otù nwanwoke ọjọọ nọ nime ọhịa, ọ chọkwara itim ihe.” Nne ya zaghachịrị ya sị “É-è, échèghịm na ọ bụ nwa ọjọọ. Ị gwaghị ya okwu dị mma. Ọ bụrụ na ị gwara ya okwu dị mma, ọ ga-enwe obiọma n’ebe ị nọ. Jee gwa ya ọzọ.” Nwatakịrị ahụ wee pụọ tie kwa ọzọ sị “Ndewo o.” Ọ nụ kwa ụzụ ahụ “Ndewo o.” N’oge nke a ọ sịrị, “Ị bụ ezi nwa!” ọzịzá wee bịaghachị, “Ị bụ ezi nwa?” Ahụrụm gị n’anya” -- otù aka ahụ ka ụzụ ahụ kwukwara, “Ahụrụm gị n’anya.” Ọ gbaa kwa ọsọ baa nime ụlọ, wee sị “Nne, ọ bụ ezi nwa.”

Anyị gaenweta ọtụtụ ndịenyi ọ bụrụ na anyị emeso ha dịka enyi. Ọtụtụ mgbe anyị naesite n’igosi obiọma rịta mkpụrụobi ndị meworo anyị ihe ná-adịghị mma n’urù. Mmadụ na-enwekarị obiụtọ mgbe o mere ezi ihe nye ndị ọzọ karịa ịnọgide n’ịchọ náánị ụzọ nke onwe ya.

Dike n’Agha

Ọlụ dịrị Devid ọbụ ibibi ndịiro niile nke Israel. Ndị dị otú ahụ bụ ndịiro nke Chineke, o kwesịkwara ka emerie ha. Chineke mere ka Devid dị ike n’agha ka o wee nwee ike mezue iwu niile nke Chineke.

Akpọrọ Mba Ọzọ dị icheiche

Ndị Israel bụ ndị nke Chineke rọpụtara. Ọ naemeso kwa ha n’ụzọ pụrụ iche, náenye ha ohere ịmụta ihe banyere Ya. O nyere ha ihe niile ha chọrọ mgbe ha ji obi ha niile fee Ya òfùfè. Ma ha onwe ha, dịka mba, échigharịwo pụọ n’ebe Chineke nọ wee fee chi ọzọ dị icheiche òfùfè.

N’iheọmụmụ anyị, agwara anyị na Devid buru amụma banyere oge mgbe ndị ọzọ ná-abụghị ndị Israel ga-abịa fee Chineke òfùfè: “Ndi n’amaghm gēfem òfùfè. Ndị ala ọzọ nērube isi n’okpurum: mgbe ha nuru na nti ha, ha ga eruberem isi.”

Chineke kpalịkwara Aisaia ide sị “Le, mba nke i nāmagh ka i gākpọ, mba nke nāmagh gi gāgbakute kwa gi” (Aisaia 55:5). Ndị ahụ bụ ndị mba ọzọ, mba niile ọzọ na-abụghị ndị Ju, ndị na-enye Chineke obi ha ná-efè kwa Ya òfùfè. Lee óké ọñụ anyị nwere na ịhụn’anya Chineke kpọbatara anyị.

Ekèrè ka e wee nye Ya Otuto

Chineke kèrè mmadụ ka o nye Ya otuto. “M’kewo-kwa-ra ya nye nsọpurum” (Aisaia 43:7). Ọ chọkwara ka anyị nwee ọñụ nke iheụtọ niile nke ndụ ebighịebi n’ebe Ọ nọ. Ma lee otú mmadụ rapụworo Chineke! Ọtụtụ mmadụ ahụghị Chineke n’anya; kama, ha na-agbakụta Ya azụ náeme ihe jọrọ njọ.

Jisọs na-agbasapụ aka Ya, ná asị, “Biakutenum unu nile ndi nādọgbu onwe-unu n’ọlu, ndi ebowo-kwa-ra ibu di arọ, Mu onwem gēme kwa ka unu zuru ike” (Matiu 11:28). Ma mmadụ na-aza sị “É-è, m’gaghị abịa.” Jisọs sị na onye chọrọ nwere ike ịbịa. Ọ na-akpọ onye ọ bụla ka ha bịa bụrụ ndị Ya na ha ga abụ ndịnketa nke “ihe nile” -- ihe niile mmadụ pụrụ ichepụta -- ma ọtụtụ na-asị “É-è, achọrọm ibi ndụ nkem.”

Ka anyị onwe anyị ndị maara Ya were obi anyị niile hụ Ya n’anya. Ka anyị gwa kwa Ya otú ahụ. Ka anyị jisie ike nọchie anya nke ndị ahụ ná achọghị ịña Ya ntị. Ka anyị na-abụ abụ mgbe niile, nime obi anyị ọ bụrụ na anyị abụsịghị ya ike, dịka Devid mere: “N’ihi nka ka m’gēkele Gi, JEHOVA, n’etiti mba ọzọ, aha Gi ka m’gābuku kwa abù ọma.” Ka ihere Jisọs ghara ime gị, kama bụrụ onyeama nye Ya ebe ọ bụla O nyere gị ohere ibindụ na ikwu banyere Ya. Ka obiekele na ihụn’anya anyị nye Chineke náebili nime obi anyị mgbe niile!

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Gịnị mere Devid ji bụrụ dike n’agha?
  2. Òlee otú Chineke siworo lụara ndị Israel ọlụ?
  3. Gịnị ka Devid kwuru kpatara inyeaka nke Chineke?
  4. Òlee otú anyị pụrụ isi hụ ndịiro anyị n’anya?
  5. Kwue otù ụzọ anyị pụrụ isi nwee ndịenyi.
  6. Òlee otú anyị si mara na Ndịmbaọzọ so ná ndị agụnyere n’ịhụn’anya Chineke?
  7. N’ihi gịnị ka Chineke kere nmadụ?
  8. Ụdị ihenketa dị añaa ka Jisọs nwere inye ndị hụrụ Ya n’anya?