Abù Ọma 23:1-6; 27:1-14

Lesson 245 - Junior

Memory Verse
“JEHOVA bu onye nāzùm dika aturu: ọ digh ihe kọrọm. N’ebe-ita-nri nke ahihia ndu ka Ọ nēme ka m’makpu: n’akuku miri nke izu-ike ka Ọ nēdum nwayọ. Ọ nēweghachi nkpuru-obim: Ọ nēdum n’uzọ nile nke ezi omume n’ihi aha-Ya. Ọzọ, asi na ejem ije na ndagwurugwu onyinyo ọnwu, m’gagh-atu egwu ihe ọjọ ọ bula: n’ihi na Gi onwe-gi nọyerem: ndele-Gi na nkpa-n’aka Gi, ha onwe-ha nākasim obi. I nēdo table n’usoro n’irum n’anya ndi nākpagbum: I tewo isim manu: ikom bu inwebiga-ihe-ókè. Nání idi-nma na ebere gāgbasom ubochi nile nke ndum: m’gēbi kwa n’ulo JEHOVA rue ogologo ubọchi nile” (Abù Ọma 23:1-6).
Notes

Otù Abụ Maramma

Edere Abù Ọma ndịa dịka abụ aga na-abụ inye Chineke otuto. Ọ dịbeghị abụ edere maramma karịa Abù Ọma nke Iri abụọ na atọ.

Ndị ná-agụbeghị Baịbụl agụwo ya n’akwụkwọ ọzọ dị icheiche nke ndị ná-eme abụ dere, ha nwekwara ike were okwu dị na ya kwueokwu. Mkpụrụokwu ya niile maramma n’ihi na ha dị mfé ná nghọta, nkasịobi na ike na mkwà niile nke Chineke nyeworo iji rọpụtara ndị Ya, na olileanya nke iso Ya nwee ndụ ebighịebi.

Mmụọ Chineke esitewo n’okwu niile ahụ gwa mkpụrụobi okwu, ndị ọ dịghị mgbe ha gara échigharịkute Chineke maka inyeaka. Ọtụtụ mgbe ha naeso n’okwu mbụ anaakụziri ụmụntakịrị, bụrụ kwa okwu ikpeazụ ana-atakwunye ná ntị ndị ahụrụ n’anya ná-anwụanwụ.

Onye ọzụzụatụrụ Ọma

Chee otú obi Devid ga-ewuliworị elu ka ọ na-echè: “JEHOVA bu onye nāzùm dika aturu!” O ji aha kachasị ukwuu ana-akpọ Chineke: JEHOVA, Onye ukwu ahụ aha Ya bụ ABỤM, Chineke ebighịebi, Onye na-achị ụwa niile. Ọ bụ ihe pụrụ ime na Ọ ga-abụ Onye ọzụzụatụrụ nke otù onye?

Jisọs sịrị, “Mu onwem bu onye-ọzuzu-aturu ọma; ama-kwa-ram aturu nkem, aturu nkem ma-kwa-ram” (Jọn 10:14). N’ihi nke a Devid kwuru okwu ziriezi ịkpọ Onyenwe anyị Onye na azụ ya dịka atụrụ. Pọl Onyeozi kpọrọ Ya “oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya” (Ndi Hibru 13:20); Pita kwukwara banyere Ya dịka “Onye-isi-ọzùzù-aturu” (I Pita 5:4).

Ọñụ nke Devid

Ọñụ nke Devid bụ inwe mmetuta na Onyenwe ya nọ nso. Ọ bụ eze kachasị nke Israel nwere, ma obiụtọ ya esiteghị n’obíeze ọma nke o biri nime ya, o siteghị kwa n’ọtụtụ ndịorù ji ịhụn’anya ejere ya ozi, ọ bụghị kwa site n’óké ndịagha ndị ná erubeisi n’iwu ọ bụla o nyere. Nime otù abụ ya ọ bụkuru Onyenwe anyị, ọ sịrị, “Ojuju-afọ ọñu di n’iru-Gi: e! utọ di iche iche di n’aka-nri-Gi ebigh-ebi” (Abù Ọma 16:11).

O nwere ike bụrụ na Devid dere Abù Ọma nke iriabụọ na atọ mgbe ọ ka bụ nwaokoro ná azụ atụrụ; maọbụ o nwere ike bụrụ n’etiti mbulielu na ọlụ nke obíeze o wepụtara oge náánị ya na Chineke ịnọ, tụgharịa kwa uche n’ịhụn’anya na nlekọta Ọ na elekọta ya dịka Onyeọzụzụatụrụ.

Onye Náazụm dịka atụrụ

N’ebe Devid nọ, Onyenwe anyị nọ nso karịa Onye ọzụzụatụrụ nke Israel niile. Ọ sịrị, “JEHOVA bu onye nāzum dika aturu.” Anyị niile bụ ndị amụworo ọhụụ pụrụ isoro Devid kwue na Jehova bụ “onye nāzum dika aturu.” Mgbe anyị bịakutere Ya ná nchègharị na n’okwukwe, Ọbara Ya na asachapụ mmehie niile anyị, anyị e wee bụrụ nke Ya. Anyị na enwe òkè nime Ya.

Devid chètara ịhụn’anya o nwere n’ebe atụrụ ya dị mgbe ọ naelekọta ha n’akụkụ ugwu. O jikeere ịlụso ọdụm na bear ahụ ọgụ ndị agụụ ndọgbu n’agụsi ike ka o wee nápụta ụmụatụrụ ntakịrị ya n’aka ha. Ọ matara na ezi onyeọzụzụatụrụ agaghị arapụ atụrụ ya ná-enweghị nchèbe. Ka ọ na-eche échìchè banyere nlekọta Chineke nye ya, échètaara ya banyere onye ọzụzụatụrụ kwesịrị ntụkwasịobi onye gaenye ndụ ya n’ihi atụrụ ya. Nke ahụ bụ kwa ihe Jisọs mere mgbe Ọ bịara n’ụwa. Ọ gwara ndị náesoụzọ Ya sị “Anamatọgbọ kwa ndum n’ihi aturum” (Jọn 10:15).

Ọ Dịghị Ihe Ana-achọ

Devid pụrụ ikwu ná mkwuwa okwu, “Ọ digh ihe kọrọm.” Ọ nwapụtawo na Chineke gaenyezu ya ihe niile ná-akpá ya. Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ náatọ Onyenwe anyị ụtọ, anyị nwekwara otù ntụkwasịobi na anyị agaghị achọ ezi ihe ọ bụla achọ. Pọl Onyeozi dere sị “Chineke gēnyezu unu ihe nile ọ bula nākpa unu dika akù-Ya n’ebube si di, nime Kraist Jisus” (Ndi Filipai 4:19).

Jisọs na-achọ ka ndị Ya tụkwasị Ya obi kwere kwa ná mkwà Ya niile. Ọ bụrụ na anyị enwetaghị ihe ọ bụla anyị kpere ekpere maka ya, o nwere ike bụrụ n’ihi na anyị chọrọ ihe ná-adịghị mma nye onwe anyị. Okwu ahụ na-agwa anyị sị “Ebe ayi nwere ihe-oriri na ihe igbokwasi n’aru, afọ gēju ayi n’ihe ndia” (I Timọti 6:8).

N’akụkụ Mmiri nke Izuike

Ka anyị were anya nke imemmụọ lee otú ìgwè atụrụ ná-edina n’okpuru ndò nke ụfọdụ osisi buru ibu n’akụkụ otù mmiri iyi. Ha atawo ezi akwụkwọ ndụ dị mma rue mgbe afọ juru ha, n’ihi na atụrụ agụụ na-agụ agaghị edina ala. Ebe a mara mma ka onye ọzụzụatụrụ wereworo ezi nleruanya chọpụta; n’ihi na ọkọchị na-ekpo ọkụ nke-ukwuu n’ebe Devid biri, atụrụ pụkwara ịnọ n’óké akpịrịịkpọnkụ n’ọzara ahụ maọbụ nwụọ n’ihi ikeọgwụgwụ site n’okpomọkụ ahụ. Ezi onye ọzụzụatụrụ duuru atụrụ ya jee n’akụkụ mmiri nke izuike, ebe ha pụrụ iri ihe afọ wee ju ha, ha wee dina kwa ala zue ike.

Ọ bụ ịnọ jụụ dị otú a ka Devid nwere mmetụta ya ka ọ na-atụgharị uche banyere Onye ná-azụ ya dịka atụrụ. Aisaia sịrị, “Ihe ezi omume ahu gāluputa bu udo; ihe nke gēsi n’òfùfè ezi omume ahu puta bu kwa inọ-j na ntukwasi-obi rue mgbe ebigh-ebi” (Aisaia 32:17). “Udo nke riri nne ka ndi nāhu iwu-Gi n’anya nwere: ọ digh kwa ihe-isu-ngọngọ ha nwere” (Abù Ọma 119:165). “JEHOVA gēnye ndi-Ya ike; JEHOVA gēji udo gọzie ndi Ya” (Abù Ọma 29:11). “Ọ nēnye ndi Ọ huru n’anya ura” (Abù Ọma 127:2).

Ụzọ Nkume

Mgbe atụrụ tasịrị ahịhịa niile dị n’otù ebeịtanri, ha aghaghị ịpụ jee n’ebe ọzọ, eleghịanya n’ụzọ nkume na n’ụzọ dị warara n’ugwu. Ma onye ọzụzụatụrụ na-aga n’iru ha ịwara ha ụzọ ahụ; ọ bụrụ kwa na ụfọdụ adịghị ike isoro ha, ọ gaekuru ha. Aisaia Onye amụma kwa, pụrụ ịhụ Onye nzọpụta ahụ site n’anya nke imemmụọ dịka Onye ọzụzụatụrụ, o wee dee sị “Dika onye-ọzụzụ-aturu ka Ọ gāzu ìgwè-aturu-Ya, n’ogwe-aka-Ya ka Ọ gāchikọta umu-aturu, ọ bu kwa n’obi-Ya ka Ọ gākuru ha, Ọ gāwere nwayọ nēdu ndi nēnye umu ara” (Aisaia 40:11).

OnyeKraist ga-agabiga ọnwụnwa nke ga-adị ya ka ụzọ nkume. Ma ọ bụrụ na ntụkasịobi ya dị nime Onyenwe anyị, ọ ga-agabiga ya ná mmeri. Devid sịrị, “Ọ nēweghachi nkpuru-obim.” Ọ bụrụ na ike agwụ anyị n’ụzọ ahụ, maọbụ daa mba ntakịrị n’obi n’ọrịa anyị na-arịa, Ọ ga-eweghachi mkpụrụobi anyị ọ bụrụ na anyị elekwasị Ya anya.

Ịkpánso Karị

N’àmàokwu mbụ nke Abù Ọma a, Devid kwuru banyere Onyeọzụzụatụrụ ahụ onye ná-edu ya; ma mgbe ọ na-ekwu ịgabiga na ndagwurugwu nke onyinyo ọnwụ, ọ na-agwa nnọọ Onyenwe anyị, “Gi onwe-gi nọyerem; ndele-gi na nkpa-n’aka-Gi, ha onwe-ha nākasim obi.” Onyenwe anyị ekwewo mkwà sị, “M’gagh-ara gi aka ma-ọli, M’gagh-arapu kwa gi ma-ọli” (Ndi Hibru 13:15).

Ọ dị ìhè ná-enwuwa gabiga ọchịchịrị nye OnyeKraist. Jisọs nwụrụ n’ihi anyị wee wezuga iheọgbụgba dị n’ọnwụ. N’oge hour ahụ mgbe ọ dịghị enyi nke ụwa pụrụ inyere anyị aka, Onyenwe anyị ga-anọ n’akụkụ anyị. Ọnwụ bụ náánị ụzọ dị mkpagide esi abà n’Ala Otuto ahụ. Onye ọ bụla ya na Chineke meworo udo pụrụ isoro Devid kwue sị “M’gagh-atu egwu ihe ọjọ ọ bụla.”

“Egwu adigh n’ihu-n’anya, kama ihu-n’anya nke zuru òkè nāchupu egwu n’èzí” (I Jọn 4:18). I nwere ike ịgbalị ime ka i nwere obiike, náachị kwa egwù gị ọchị; ma ha ka ga-anọ n’ebe ahụ ma-ọbụghị náánị na ntụkwasịobi gị ọ dị nime Chineke. Ọ bụrụ na anyị ji obi anyị niile hụ Ya n’anya, Ọ na-ewepụ egwù.

NdịEnyi

Ka anyị tụgharịworo àmàokwu niile a n’uche, anyị echèwo échìchè banyere onweanyị, dịka Devid mere, dịka atụrụ óké Onye ọzụzụatụrụ na-edu. N’àmàokwu niile a náeso anyị na-achọpụta ụdị onyinyo ọzọ: otù nwoke ya na enyi ya naerikọ ihe. Anyị bụ ndịọbịa nke Onyenwe anyị, náeri ihe na tebụl Ya. “I nēdo table n’usoro n’irum.”

Iheàmà kachasị nke ná-egosipụta ịbụ enyi n’Ọwụwaanyanwụ bụ mmadụ na ibe ya irikọ ihe. Jisọs sịrị, “Le, anameguzo n’ọnu-uzọ, nāku kwa aka: ọ buru na onye ọ bula anu olum, meghe kwa uzọ, M’gābakute ya, so kwa ya ri nri-anyasi, ya onwe-ya gēsokwam rie” (Nkpughe 3:20). Ọ gaeso anyị rie ihe, anyị onweanyị gaeso kwa Ya rie! Náánị ihe ntà ka anyị nwere inye Ya, ma Ya onwe ya nwere ihe niile inye anyị. Mgbe Ọ na-awụpụ ngọzi Ya, iko anyị naejubiga ókè .Ọ na-achọ ka anyị na Ya náejekọ ijè, ná ekwurịta okwu, ka Ọ na awụsa kwa anyị ezi ihe niile. “Ọ gagh-egbochi ezi ihe n’ebe ndi nējeghari n’izu-òkè nọ” (Abù Ọma 84:11).

Òlee otú Onyenwe anyị si edoziri anyị tebụl n’anya ndị ná-akpagbu anyị? Anyị nwere ike ịnọ náánị anyị n’etiti ndị mmehie, ná-enwe mwute ná mkparịta na omume ha niile. O nwere ike ha abụghị ndịiro anyị, ma ọ bụrụ na ha enweghị nzọpụta ha bụ ndịiro nke Chineke. Nime etiti ebe dị otú ahụ, Onyenwe anyị pụrụ ịgọzi anyị, ná-azụ kwa anyị n’Okwu Ya rue mgbe anyị ga-enwe mmetụta na Ọ gbasawo tebụl n’iru anyị. Ụmụokorọbịa bụ NdịKraist ndị fèrè obodo ha òfùfè n’oge agha nwapụtara nke a ọtụtụ ugbò. N’etiti mmehie na agha, Onyenwe anyị ga-abịaru nso wee zụọ ha n’Okwu Ya.

N’elu Osimmiri China, nime otù ụgbọelu ka ụfọdụ NdịKraist na-anya ụgbọmmiri nọ ná-ekpe ekpere abalị ịkpọbata Arọ Ọhụụ. Chineke jiri okwu niile ahụ ná adịghị anwụanwụ nke Onye ahụ dere Abù Ọma gọzie ha n’etiti agha n’ebe ahụ, “I nēdo table n’usoro n’irum n’anya ndi nākpagbum.”

E tere Mmanụ

Ọ bụ iheàmà nke mkwanyeùgwù n’Obodo Nsọ (nke ana-akpọ Palestine) ité onyeọbịa mmanụ n’isi. Anyị na-echèta ihe mere mgbe Jisọs bụ ọbịa n’ụlọ Saimon, onyeFarisii, egosighị Ya mkwanyeùgwù dị otú a. Mgbe nwanyị ahụ ji ite alabaster mmanụotite bịa tee Jisọs mmanụ n’ụkwụ, Ọ baara onyeFarisii ahụ mbá site n’ikwu sị, “I wegh manu tem n’isi: ma nwayi a were manu-otite tem n’ukwu” (Luk 7:46). N’ihi ịhụn’anya o nwere n’ebe Ọ nọ, Jisọs gbaghaara ya mmehie ya niile; ma Saimon ná-enweghị nsọpụrụ, onye ná-enweghị mmetụta nke nchègharị, nọgidere n’ịbụ onyemmehie. Devid pụrụ ikwu na Onyenwe anyị mesoro ya omume mkwanyeùgwù: “I tewo isim manu.”

Ọ ka dị kwa ihe dị omimi karịa ihe ité mmanụ ahụ pụtara. Anyị, dịka NdịKraist edoro nsọ, nwere ohere ịnata otitemmanụ nke Mmụọ Nsọ. Egosiri ụdị nke a n’òfùfè nke Ụlọikwuu site n’ité ndịnchụàjà mmanụ. Adọrọ ndị Israel akanántị na mmanụ ahụ dị nsọ. “Ọ bugh n’anu-aru madu ka agāwukwasi ya, unu eme-kwa-la nke di ka ya … nsọ ka ọ di, nsọ ka ọ gādiri unu” (Ọpupu 30:32).

Ka anyị na anọdụ na tebụl Ya, Onyenwe anyị naete anyị mmanụ nke Mmụọ Nsọ ịbụ ndịeze na ndịnchụàjà nye Chineke Kachasị ihe niile Elu.

Otù Ebumn’obi

Ka Devid na eleghachị anya n’azụ ná ndụ ya, ọ pụrụ ịhụ na Onyenwe anyị eduwo ya, o nwekwara nchèkwube na Onyenwe anyị ganaedu ya rue n’ọgwụgwụ. Ọ dị kwa nnọọ otù ihe o bu n’obi -- ibi n’Ụlọ Jehova rue ebighịebi. Ọ chọrọ ịnọ Enyi ya na Onyenzọpụta ya nso ụbọchị niile nke ndụ ya, ná-efè kwa òfùfè n’Ụlọikwuu Ya. Emesịa, mgbe ndụ nke a gasịworo, ọ gaedo ya anya na ya nwere ụlọ n’Eluigwe.

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee onye Devid ji tụnyere Onyenwe anyị?
  2. Gịnị mere Devid obiụtọ?
  3. Òlee ebe ezi onyeọzụzụatụrụ ahụ dugara atụrụ Ya?
  4. Gịnị bụ àjà kachasị onyeọzụzụatụrụ ga-achụ n’ihi atụrụ ya?
  5. Ònye na-enyezu anyị ihe niile ná-akpá anyị?
  6. Gịnị ka onyeọzụzụatụrụ na emere atụrụ ya mgbe ụzọ ntà ahụ dị mkputamkpu?
  7. Òlee mmekọrịta ọzọ Devid kwuru okwu ya dị n’etiti ya na Onyenwe anyị?
  8. Banyere gịnị ka ọ na-ekwu mgbe ọ sịrị, “I tewo isim manụ”?
  9. Gịnị bụ ihe Devid na achọsị ike ná ndụ ya?