Abù Ọma 25:1-22; 94:1-23

Lesson 246 - Junior

Memory Verse
“Okporo-uzọ nile nke JEHOVA bu ebere na ezi-okwu n’ebe ndi nēchezi ọgbugba-ndu-Ya” (Abù Ọma 25:10).
Notes

Ngọzi dị icheiche

Ọ dị ụfọdụ ezi ihe makwara mma ná ndụ nke ndị eziomume na ndị ajọomume na-eketakọ ọñụ ha. Chineke kwenyere ka mmadụ niile keta ọñụ dị n’òkìkè na ọlụaka Ya niile. Ọtụtụ mmadụ na-enweta ngọzi na mkpali mgbe ha na-ele ịmamma nke ebe ugwu dị, mmiri, sno ná-ada, ọzara, maọbụ àgwà nke iru Eluigwe. Ụfọdụ na-enwe ọñụ dị ukwuu ịhụ anụọhịa maọbụ okooko osisi ọhịa gburugburu ebe ha na-anọ. Ọtụtụ mmadụ ndị ná-echèbeghị échìchè banyere Chineke na-aba ụba, na-enwe ọgan’iru, arụike, na obiụtọ, dịka ihe ụwa si dị. Ha na-eketa ókè n’ihe niile Chineke kwadowooro mmadụ dịka ikuku, anyanwụ, iheoriri, mmiri, na ihe niile dị mkpà nye mmadụ ibindụ nkeọma. Ndịa niile bụ ngọzi nke ụmụmmadụ na-anata ụbọchị niile. Ma ọ dị ngọzi dị icheiche pụrụ iche nke Chineke debèwooro ndị Ya. Ụfọdụ ngọzi dị ana-awụkwasị náánị ndị eziomume.

Nchèkwube

Devid, onye dere Abù Ọma kwuru okwu banyere nchèkwube o nwere nime Chineke. O kwukwara banyere nchèkwube o nwere na Chineke na-aza ekpere. Ihe Devid rịọrọ lee kwa anya ya n’ebe Chineke nọ bụ ngọzi dịrị ndị eziomume niile. Devid abụghị onye ahụrụ n’anya karịa ndị ọzọ niile. Ihe Devid natara n’aka Chineke bụ ihe OnyeKraist ọ bụla nwere ike ịnata!

Devid sịrị, “Gi, JEHOVA, ka m’nēbuliri nkpuru-obim,” Devid kpere ekpere, ọ dabeere Chineke; ọ gbara onwe ya ume nime Onyenwe anyị. E weliri obi Devid rue ebe dị elu n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi ya. Ka okwu niile nke Devid mee ka anyị kpee ekpere karịa, ibuli mkpụrụobi anyị nye Onyenwe anyị karịa ka anyị na-eme na mbụ. Jeremaia Onyeamụma n’Abùákwá ya sịrị, “Ka ayi weliere Chineke Nke bi n’elu-igwe obi-ayi n’ọbu-aka-ayi abụa” (Abù-akwa 3:41).

Mmadụ pụrụ ibuli obi ya nye iheefu (Abù Ọma 24:4), na nganga (I Timọti 3:6); ma nke ahụ ga-eweta amamikpe gbochie kwa ngọzi nke Chineke. Ka anyị bulie obi na mkpụrụobi anyị n’ekpere na òfùfè nye Chineke!

Ntụkwasịobi na Chineke

Ndị eziomume nwere nchèkwube na ntụkwasịobi ha na Chineke. Ọ dịghị ihe ọ bụla nke ụwa aga-eji tụnyere ndabere ha. Ọtụtụ mgbe ndị ná adịghị-asọpụrụ Chineke na-etinye ntụkwasịobi ha n’ego, ndị enyi, n’ihe ha pụrụ ime na ịgụ akwụkwọ, maọbụ n’ọlụ ha. Ma emeghị ka o doo anya na ihe ndịa ga-adịgide. Amarawo ihe niile a bụ ihe ụwa dịka ihe ná-agaghị adịgide.

Mgbe mmadụ tinyere nchèkwube na ntụkwasịobi ya nime Chineke na n’Okwu Ya, ọ na-adabere n’Otù Onye, náánị Otù Onye ahụ na-adịgide. Moses gwara Ụmụ Israel okwu Onyenwe anyị, na Chineke agaghịara ha aka na Ọ gaghịarapụ kwa ha (Deuteronomi 31:6). Moses sịrị Joshua: “Di ike, nwe kwa ume … JEHOVA kwa, Ya onwe-ya bu onye nēje n’iru-gi; Ọ gānọnyere gi, Ọ gagh-ara gi aka, Ọ gagh-arapu kwa gi: atula egwù, atu-kwa-la ujọ” (Deuteronomi 31:7, 8). Chineke nọnyeere Joshua na Ụmụ Israel. Anyị na-agụ na “Ọ digh ihe ọ bula dapuru n’ezi ihe nile nke JEHOVA gwara ulo Israel; ha nile mere” (Joshua 21:45).

Chineke na Okwu-Ya apụghị ịda; Okwu Ya na-emezu. Anyị pụrụ ịtụkwasị obi anyị ná mkwà niile nke Chineke mata kwa na ha doro anya. (Gụọ Aisaia 34:16; 40:8; Matiu 24:35; Luk 16:17; na I Pita 1:25). Ndị ná adịghị-asọpụrụ Chineke enweghị ihe dị otú a nke ha pụrụ ịtụkwasịobi, ya edoo kwa ha anya na ọ ga-emezu.

Ihere Agaghịeme ya

Mgbe mmadụ tinyere ntụkwasịobi na nchèkwube ya na Chineke, o nweghị ihe ọ bụla nke ga-eme ka ihere mee ya. Ihere na-eme ọtụtụ ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke n’ụzọ ha si ebi ndụ. Ihere mmehie ha na-eme ha. OnyeKraist arịọwo Chineke ka O hichapụ mmehie niile ya, nye kwa ya ike ụbọchị ọ bụla ibindụ ná-enweghị mmehie. Onyemmehie na-ebi ndụ ihere, ma OnyeKraist na-echère Onyenwe anyị iduzi n’ụzọ kwesịrịekwesị. Onye dere Abù Ọma sịrị, “Mgbe ahu ihere agagh-emem, mgbe m’nēlegide anya n’ebe ihe i nyere n’iwu di” (Abù Ọma 119:6). Mgbe mmadụ na-erubeisi n’Okwu Chineke, ọ na-ebi ndụ ziriezi na nke eziomume, ọ gaghị enwe kwa ihere n’ihe ọ bụla ná ndụ ya.

Chineke kwere ndị Ya otù nkwà -- ndị na-echère Ya -- na ihere agaghị eme ha. Enyere Ụmụ Israel na ndị niile naeso Ya n’eziokwu nkwà ahụ. “Unu gāma kwa na n’etiti Israel ka M’nọ, na Mu onwem bu JEHOVA, bú Chineke-unu, na ọ digh onye ọzọ: ihere agagh-eme kwa ndim rue mgbe ebigh-ebi” (Joel 2:27). “Le, M’gēweliri mba nile akam, ọ bu kwa ndi di iche iche ka M’gēbuliri ọkọlotọm … i we mara na Mu onwem bu JEHOVA, Onye ihere agagh-eme ndi nēle anyam” (Aisaia 49:22, 23). Lee otú ọ dị iche n’ebe ndị nwere mmehie na ndụ ha nọ! Ha na-agbalị ikpuchi mmehie ha. Ha adịghị-achọ izute ndị eziomume n’ihi mmehie niile ahụ. Ha na-enwe amamikpé n’obi ná-atụ kwa egwù ka aghara ikpughe mmehie ha. OnyeKraist na-enwe akọnauche dị ọcha o nweghị kwa ihe ọ bụla nke ihere ga-eji mee ya.

Nduzi

Devid kpere ekpere ka Chineke kuziere ya due kwa ya n’ụzọ nke Onyenwe anyị. Devid matara mkpà ọ dị na mmadụ ga-eje ijè n’ụzọ nke Onyenwe anyị kama ijé n’ụzọ nke ya. “Uzọ di nke ziri ezi n’iru madu, ma nsọtu ya bu uzọ nile nke ọnwu” (Ilu 14:12).

Náánị site n’isoro Onyenwe anyị ka mmadụ ga-ele anya ịbà n’Eluigwe. Jisọs sịrị “Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ digh onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbugh site na Mu” (Jọn 14:6). Aisaia Onyeamụma kwuru banyere “uzọ nke idi-nsọ” nke ndị agbapụtara ga-eje ijé na ya nke ndị ná-adịghị ọcha agaghị agabiga na ya (Aisaia 35:8, 9). Ọ dị ngọzi ana-akpọkwasị ndị ná-eje ijè n’ụzọ nke Onyenwe anyị (Abù Ọma 128:1). Ngọzi dị na ndụ a na ndụ nke ná-abịa. Site n’ịnọgide n’ụzọ ahụ dị warara nke dị kwa mkpagide, mmadụ ga-enwe ndụ ebighịebi (Matiu 7:14).

Ebere na Eziokwu

Devid kpere ekpere ka Chineke duzie ya, n’ihi na ọ matara na ụzọ nke Onyenwe anyị na-eduru Eluigwe. Mgbe mmadụ na-arọrọ ụzọ nke onwe ya, olùlù dị icheiche ga-adị, ihe ịman’ọnyà, ọnyà, na akụkụ ụzọ dị icheiche nke ga-eduba ya n’ịlan’iyi. Mgbe mmadụ na-esoro ụzọ nke Onyenwe anyị, ana-adọ ya akanántị banyere ihe izendụ; Onyenwe anyị gana-enyere ya aka ịgafe ebe dị icheiche jọrọ njọ; Jehova “gēme” ka ụkwụ ya abụọ si n’ụgbụ pụta; ụzọ nke ná-eduba ná ndụ ebighịebi pụtara ìhè nkeọma. “Chineke, uzọ-Ya zuru òkè” (Abù Ọma 18:30). Jehova na-edu ndị ná-edebe iwu Ya site n’ebere na eziokwu. Mmadụ aghaghị inwe obiumeala, kwenye kwa ka Chineke due ya. Jehova adịghị edu ndị ajọomume na ndị mpako, n’ihi na ha adịghị achọ ka Chineke duzie ha. Ànyị pụrụ isoro Onye dere Abù Ọma kwue sị: “Uzọ nke ikwesi-ntukwasi-obi ka m’rọputaworo: ikpe-Gi nile ka m’doworo n’irum” (Abù Ọma 19:30)? Ka ekpere anyị dị ka nke Devid: “JEHOVA, zim uzo-Gi; durukwam n’okporo-uzọ di lari” (Abù Ọma 27:11).

Mgbaghara

Ndị eziomume anatawo ngọzi ọzọ, mgbaghara nke mmehie. Agbaghaara ha n’ihi na ha chègharịrị wee rịọ kwa Chineke ka Ọ gbaghara ha. Devid kpere sị “Gbaghara ajọ omumem; me-kwa-ram amara;… bupu kwa nmehie nile.” Devid chètaara Chineke amara na ebere Ya niile na-adịru ebighịebi. Devid matara na ọ dịghị onye kwesịrị inwe udo nke Chineke; agbaghaara mmehie ya n’ihi na Chineke nwere obiebere. E siteghị n’ezi ihe nke mmadụ ọ bụla mere gụọ ya n’onye eziomume, ọ bụ site n’ịdịmma nke Chineke.

Ndị ná-adịghịasọpụrụ Chineke enweghị ngọzi nke ịmata na agbagharawo mmehie ha, n’ihi na ha adịghị echègharị ma rịọ kwa ebere nke Chineke. Náánị Jehova pụrụ ịgbaghara mmehie. Ọ pụkwara idebe mmadụ ka ọ ghara imehie karị. Devid kpere: “Debe nkpuru-obim.” Anyị aghaghị inwe nzọpụta, jigide kwa mnwapụta nke nzọpụta, ọ bụrụ na anyị chọrọ ka agụnye anyị ná ndị eziomume.

Karịa iwepụ mmehie, na idebe pụọ ná mmehie, Jehova adịghị echèta kwa mmehie niile agbagharaworo. Onyenwe anyị sịrị, “M’gāgbaghara ajọ omume-ha, M’gagh-echeta kwa nmehie-ha ọzọ” (Jeremaia 31:34; Ndi Hibru 8:12; 10:17).

Mmehie nke ndị Ntorọbịa

Devid rịọrọ nnọọ ka Chineke ghara ichèta mmehie nke mgbe okorọbịa ya. Devid ghọtara na nwata ọ bụla, mgbe o ruru ogo ịzà ajụjụ onwe ya -- mgbe o toruru ịmata iheọma na iheọjọọ -- emehiewo na o kwesịkwara ịrịọ mgbaghara. Devid emeghị ngọpụ ọ bụla n’ihi mmehie ya dịka ụfọdụ mmadụ na-eme. Devid asịghị na ya bụ nnọọ náánị nwata. Devid matara na ajọomume niile emere mgbe okorọbịa maọbụ agbọghọbịa bụ mmehie, o wee rịọ Chineke ka Ọ gbaghara ha niile.

Na mmadụ bụ náánị nwata maọbụ ntorọbịa abụghị ihengọpụ ime mmehie. Chineke ga-agbaghara ụmụntà mgbe ha chègharịrị. Chineke ga-ewepụ mmehie-ha nye kwa ha ike ibindụ ná-enweghị mmehie.

Ikpé

Ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke ga-achọ ichè na Chineke adịghịanụ mgbe ha na-ekwu okwu ọjọọ. Ha ga-achọ ichè na Chineke adịghịahụ mgbe ha na-eme mmehie. Chineke, Onye mere ntị, naanụ ihe, Chineke, Onye mere anya, naahụ ụzọ. Mgbe oge ruru, aga-ezidakwasị ndị ajọomume ahụhụ, Chineke ga-abọ kwa ọbọ n’arụ ndị mejọworo ndị Ya.

Ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke na-anapụ onwe ha ngọzi dị icheiche nke Chineke ga-enye ndị Ya. Karịa nke a, aga-echèta mmehie niile nke ndị ná-adịghị asọpụrụ Chineke n’ụbọchị ikpé; aga-ekpughepụ mmehie niile n’ìhè. Devid matara ihe ga-eme ndị na-adịghịnsọpụrụ Chineke, ma Devid nwere nkasịobi na inye-aka nime Onyenwe anyị. Devid anwapụtawo Chineke. Onyenwe anyị anapụtawo Devid n’aka ndịiro ya, jigide kwa ya mgbe ụkwụ ya na-agbụchapụ. Devid chekwubere Chineke maka ọdịn’iru, n’ihi na ọ tụkwasịrị Chineke obi. Devid sịrị, “JEHOVA aburuworom ulo-elu; Chinekem bu kwa óké nkume nke ebe-mgbabam.” Nime gịnị ka i tinyeworo ntụkwasịobi gị?

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Òlee otú mmadụ pụrụ isi bulie obi ya nye Onyenwe anyị?
  2. Nime ònye ka Devid tinyere ntụkwasịobi ya?
  3. Ònye na-ebi ndụ ihere?
  4. Ònye ka Devid chọrọ ka o duzie ya?
  5. Òlee ebe okporoụzọ nke Onyenwe anyị na-eduba?
  6. Ònye ka Devid rịọrọ ka ọ gbaghara mmehie ya?
  7. Ònye pụrụ ịgbaghara mmehie niile?
  8. Ònye nwe ọbọ?
  9. Ònye bụ ụlọelu na ebemgbabá nke Devid?
  10. Kpọọ aha ụfọdụ ngọzi nke ndị eziomume.