Lesson 247 - Junior
Memory Verse
“M’gagh esure-kwa-ra JEHOVA, bú Chineke, ájá-nsure-ọku nke m’nētiyegh ego ọ bula” (2 Samuel 24:24).Notes
Anwara ya ọnwụnwa ime Mmehie
Otù oge bịara n’ụbọchị nke Devid, mgbe Ụmụ Israel hụjuru anya n’ihi otù mmehie nke e mere. “Setan we guzo imegide Israel, ọ we kpalie Devid iguta Israel” (I Ihe Emere 21:1). Devid dabara n’ọnwụnwa a. O nyere iwu ka agụọ Ụmụ Israel, ka ya wee mara ọnụọgụgụ ha. Ọ dịwo otù mgbe garaaga agụrụ Ụmụ Israel ọnụ, ma ọ bụ Chineke nyere iwu ka agụọ ha n’oge ahụ (Ọpupu 30:11-14).
Devid ekwughị ihe ọ bula kpatara o ji chọọ ịgụ ndị ahụ. Anyị amataghị ma ọ bụ n’ihi nganga ka Devid ji chọọ ịmara ọnụọgụgụ ndị ọ na-achị. Anyị amataghị ma Devid ọ na-adabere n’ọnụọgụgụ mmadụ karịa ịtụkwasịobi n’ike nke Onyenwe anyị ịlụ agha niile. Ihe ọ bụla dị n’obi Devid kpatara o ji chọọ ịmara ọnụọgụgụ Israel, ọ bụ mmehie.
Ịdọakanántị
Adọrọ Devid akanántị ka ọ ghara ime ihe a. Devid nyere Joab bụ onye isi ụsụ ndịagha iwu ahụ. Joab gbalịrị ịrịọ Devid ka ọ ghara ịgụ ndị ahụ, n’ihi na ọ dịghị mkpà. Joab sịrị, “N’ihi gini ka onyenwem nāchọ ihe a? n’ihi gini ka ọ gāghọrọ Israel ihe-ikpe-ọmuma?” Joab gbalịrị igbochi Devid tupu emee mmehie ahụ, n’otù aka ahụ, Mmụọ Chineke bụ Onye kwesịrị ntụkwasịobi ịdọ anyị akanántị, na dịka akọnauche mmadụ na-eme ka ọ mara ihe nke na adịghị mma.
Devid añaghị ntị n’ịdọakanántị nke ndị enyi ya kwesịrị ntụkwasịobi, Joab na ndịisi ụsụ ndịagha. Devid zipụrụ ndịkom ndịa ịgụ Ụmụ Israel ọnụ. Ha jègharịrị Israel niile (I Ihe Emere 21:4). Ha gafere Jọdan rue n’ala ebe Reuben na Gad nọdụworo (Ọnu-ọgugu 32:1-5). Ha jeruru n’ebe ugwu na n’ókèala Dan-jaan, Zaidon, na Taia -- emesịa n’akụkụ ugwu rue Bia-sheba na Juda, na-agụ ụmụmmadụ ka ha na-aga.
Enweghị Obiụtọ
Rue ihe karịrị ọnwa iteghete, ndịkom Devid na-alụ ọlụ ná-agụkọta ndị ahụ. Ọlụ ahụ enyeghị ha obiụtọ, n’ihi na ha matara na ọ dịghị mma. N’ikpeazụ Joab wetaara Devid ọnụọgụgụ ahụ. Agwaghị anyị na Devid nwere obiụtọ, maọbụ na afọ juru ya, maọbụ na ọnụọgụgụ ndị ahụ riri nne rue dịka o lere anya.
Ná enweghị obiabụọ, ọmụma nke amamikpé wepụrụ obiụtọ ọ bụla n’obi Devid. Mgbe mmadụ kpebiri n’obi ya ime otù ihe, na-achọ ime ya n’ụzọ nke aka ya ná-ekwesị olu ya ike ná-añaghị ntị n’ịdọakanantị, mgbe ụfọdụ Chineke na-enye ya ohere ka o mee ihe ahụ ọ chọrọ. Ma ọ dịghị mgbe onye ahụ na achọta obiụtọ na afọojuju nke o lere anya ya mgbe ọ malitere ime ihe ahụ.
Mmehie na Nchègharị
Devid matara na ya emehiewo. Obi nke onwe ya mara ya ikpé. Devid kpere ekpere wee kwupụta mmehie ya. Devid gwara Jehova sị “Emehiewom nke ukuu n’ihe m’meworo: ma ugbu a, Jehova, biko, me ka ajọomume orù Gi gabiga; n’ihi na emewom ihenzuzu nke ukuu.” Devid mere ihe ziriezi site n’ijekuru Chineke maka mgbaghara. Mgbe mmadụ dabara n’ọnwụnwa nke setan, wee mehie, ọ na-atụfu ngọzi nke Chineke. Náánị site ná nchègharị ka apụrụ iweghachị ya n’iruọma nke Chineke. Site n’ikwupụta na ịrapụ mmehie ya, na ịrịọ mgbaghara, ọ pụrụ ịnata mgbaghara n’aka Chineke. Ọ dị mma ịchọ Chineke ngwangwa karịa ikwu na anyị ga ekpe ekpere ma emesịa.
Ntaramahụhụ
N’ọzịzá nke ekpere Devid, n’ụtụtụ, Onyenwe anyị zigaara ya Gad Onyeamụma. Nke a bụ okwu nke Onyenwe anyị: “Ihe atọ ka Mu onwem nēbokwasi gi; rọputara onwe gi otù nime ha, ka M’we me gi ya.” Ọ bụ ihe ná adịghị eme na agaenye mmadụ ohere ịrọrọ ahụhụ agaenye ya, ma Chineke mere nke a nye Devid. Ọ dịghị ụzọ dị mfé agaesị pụta na nke a. Devid mehiere, ọ ghaghị kwa ịta ahụhụ ya ọbụná ọ bụ ezie na ọ rịọwo mgbaghara.
Devid nwere ohere ịrọrọ n’etiti arọ asaa nke ụnwụ, ọnwa atọ nke ịna-agbalaga n’iru ndịiro ya, maọbụ ụbọchị atọ nke ajọ ọrịa na èfèèfè. Nke ọ bụla nime ahụhụ atọ ndịa ga-ebilata ọnụọgụgụ nke Ụmụ Israel, eleghịanya mgbe emesịrị, Devid agaghị amata kwa ihe bụ ọnụọgụgụ nke Ụmụ Israel. Site ná mmehie nke otù nwoke a, Ụmụ Israel niile gaata ahụhụ.
Ọ bụrụ na Devid rọọrọ arọ asaa nke ụnwụ, ná-arụghịụka aga anapụtawo ya rị n’ihi na ọ bụ ọgaranya ndị ahụ ga-agbakọtawo kwa inyere eze ha aka. Ọ bụrụ kwa na Devid arọrọ ọnwa atọ nke ibu-agha, na enweghị obi abụọ ha agaghị ekwe ka Devid soro ha jee agha, n’ihi na Ụmụ Israel agwawo Devid: “I gagh-eso ayi pua agha ọzọ, ka i ghara imenyu oriọna Israel” (2 Samuel 21:17). Na nke ọ bụla n’etiti ihe abụọ ndịa, ná enweghị obi abụọ aga anapụtaworị ndụ Devid, ma ọtụtụ mmadụ gara anwụworị.
Chineke Eziomume
Devid mere nrọrọ nke amamihe mgbe ọ sịrị “Ka ayi daba n’aka JEHOVA; n’ihi na obi-ebere Ya bara uba: ma ka m’ghara idaba n’aka madu.” Devid matara na ụzọ niile nke Jehova ziriezi bụrụ kwa eziokwu (Nkpughe 15:3). Site n’ịrọrọ ajọ ọrịa na èfèèfè, Devid ga-anọ n’ọnọdụ isoro ndị Israel niile ọzọ nwụọ. Devid rọọrọ itinye onwe ya n’aka Jehova, ọ bụrụ kwa na ọ dị Chineke mma inye ohere, ajọ ọrịa ahụ na èfèèfè ga egbu kwa Devid.
Ikpé nke Chineke dị ọkụọkụ. O werewo Joab na ndịkom ya ihe karịrị ọnwa iteghete ijègharị n’ala ahụ dum ịgụ ndị ahụ ọnụ, ma nime hour olenaole ajọ ọrịa ahụ na èfèèfè esiwo na Dan rue Bia-sheba -- n’ugwu rue na ndịda nke Kenean. Ajọọrịa ahụ ná-éfèèfè malitere n’ụtụtụ ụbọchị ahụ, puku mmadụ iri asaa Ụmụ Israel wee nwụọ, n’akụkụ niile nke ala ahụ ewezuga Jerusalem. Jehova napụtara ndụ Devid na ndịokenye niile nke Israel (I Ihe Emere 21:16).
Devid ghọtara na Ụmụ Israel niile ahụ nwụrụ n’ihi na ya mehiere. Devid wee jupụta n’iruuju, hụjue kwa anya nkeukwuu. Ọ gwa Jehova sị: “Mu onwem emehiewo, mu onwem emewo kwa ajọ omume: ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? Biko, ka aka-Gi digidem.”
Otù Ebeịchuàjà
Gad Onyeamụma gwara Devid ka o wuere Chineke ebe ịchụàjà n’ebe nzọchaọka Arona, onye Jebus. Devid rubereisi. O jekwuuru Arona ịzụrụ ebe nzọchaọka ahụ iwuru Chineke ebe ịchụàjà. Arona wee chọọ inye eze iheonwunwe ya ahụ. Arona chọrọ iweta ihe eji achụàjà na nkụ eji esure ya na ala. Ọ chọrọ inye ha eze.
Ọnụahịa Zuruòkè
Devid zụrụ ebe nzọchaọka na ehi ahụ. Ọ sịrị na ya agaghị achụrụ Chineke àjà ná-efughị ya ihe. Devid kwụrụ ụgwọ ya n’òzùzùòkè. Lee otú ụfọdụ mmadụ na-eme omume dị iche taa. Ha gaachọ inwe ngọzi niile dị nime Oziọma ma ha na-enyeghachị Onyenwe anyị náánị ihe ntà n’ihi ndụ ebighịebi. Ọnwụ nke imemmụọ na-echère onye ọ bụla ná-achụghị àjà ziriezi nye Chineke -- àjà nke obi tiwaraetiwa na nke egwepịara egwepịa (Abù Ọma 51:17). Ọtụtụ mmadụ taa adịghị ejikere ịkwụ ụgwọ “zuru ezu o ruru” (I Ihe Emere 21:24). Ha adịghị achọ inye Chineke ihe dị ókéọnụ nke obi ha. Ha adịghị achọ inye Chineke ihe furu ha ihe. Ngọzi nke Onyenwe anyị na-adịrị ndị jikeere ịrapụ mmehie niile ha nye kwa Chineke ihe kachasị mma -- ndụ ha, oge ha, na talent ha.
Chineke nabatara onyinye Devid; agbaghaara Devid; iheotiti ahụ ewepụghị kwa ndụ ọzọ. Chineke ga-anara onyinye anyị zaa kwa ekpere anyị mgbe anyị gwara Ya na anyị ga-akwụ ụgwọ zuruezu, dịka Devid mere, na anyị agaghị enye Ya ihe bụ nke onye ọzọ, na anyị agaghị enye ihe ná-efughị anyị ihe. Mmadụ na Chineke apụghị ịrụrịta ọnụahịa. Ọ dịghị mbipụ, ọ dịghị kwa ịrụgharị ọnụahịa dị n’ebe Onyenwe anyị nọ. Oziọma nke Onyenwe anyị Jisọs Kraist kwesịrị ijiobichụaàjà niile anyị aghaghị ime na mgbalị niile anyị pụrụ itinye. Urù niile anyị na-enweta dị ọtụtụ karịa mgbalị anyị (Gụọ Mak 10:28-30).
N’otù Ebe ahụ
Ọtụtụ arọ gara aga tutu nke a, Chineke gwara Abraham ka o nye Aisak nwa ya, dịka àjànsureọkụ (Jenesis 22:1, 2). Dịka ndụmọdụ ahụ si dị ha jere na Moraia, otù ala ahụ ebe Devid chụrụ àjà ya ugbu a n’ebenzọchaọka Arọna. Anyị chetara na Chineke kpọrọ Abraham òkù ka ọ na-achọ imezu àjà ahụ. Edoziwo ihe dum n’usoro nọdụ kwa ná njikere. Abraham esorowo ndụmọdụ nke Jehova wee chọọ kwa iji nwa ya nwoke chụọ àjà. Chineke nwapụtara Abraham Ọ chọghị nnọọ ka o were nwa ya chụọ àjà ahụ. Abraham jikeere ime ihe Chineke kwuworo. Abraham erubeworo Chineke isi nime obi ya. Jehova “huru Onwe-ya nwa-aturu iji chu àjà-nsure-ọku.” Otù ebulu nọ nke alụghụlụ na-ejide na mpi ya. Abraham weere ebulu ahụ chụa àjà “ka ọ buru àjà-nsure-ọku n’ọnọdu nwa-ya nwoke” (Jenesis 22:13).
N’otù oge mgbe nke a gasịrị, n’oge ọchịchị Solomon bụ nwa nwoke Devid, ewukwara ụlọ Jehova n’otù ebe a (2 Ihe Emere 3:1). Ihe atọ ndịa mere n’Ugwu Moraia.
Mnwapụta nke Imemmụọ
Ihe atọ ndịa mere dị ka ihe mnwapụta nke imemmụọ mmadụ pụrụ ịnata. Àjà nke Abraham chụrụ n’Ugwu Moraia dị ka nzọpụta. Dịka ọ bụ ebeịchụàjà mbụ ewuru n’ebe ahụ, otú ahụ nzọpụta bụ nzọụkwụ nke mbụ nime mnwapụta nke imemmụọ. Ndụ nke anyị onwe anyị apụghị ikpuchi mmehie anyị. Anyị aghaghị ịnabata Àjà nke Chineke. Onye ahụ ná-enweghị mmehie Onye nyere onwe Ya n’afọòfùfò ịbụrụ anyị ihe ndochi. Chineke arọpụtawo Àjà -- Ọkpara nke Ya onwe Ya, Onye awụsịrị Ọbara Ya ka e wee gbaghara anyị.
Ebeịchụàjà nke Devid wuru n’Ugwu Moraia dị ka odudonsọ, ọlụ amara nke abụọ. Mnwapụta nke a na-abịa mgbe enwetasịrị nzọpụta, site kwa na ya ana-asacha mmadụ pụọ ná mmehie ebum pụtaụwa. Ihe nke atọ mere n’elu Ugwu Moraia, n’oge ido Ụlọukwuu Chineke nsọ, bụ ụdị nke ọwụwụmmiri nke Mmụọ Nsọ nke ana-enweta mgbe azọpụtasịrị mmadụ doo kwa ya nsọ. Mgbe e doro Ụlọukwuu ahụ nsọ nye Onyenwe anyị, enyere onyinye dị icheiche, chụọ kwa àjà dị icheiche, na ekpere nke Solomon (2 Ihe Emere 7:5). Chineke zara, ọkụ wee si n’Eluigwe daa rechapụ àjà niile ahụ (2 Ihe Emere 7:1). Ebube Jehova jupụtara ebe ahụ rue na ndịnchụàjà apụghị kwa ịlụ ọlụ ha.
Ka anyị na-amụ Baịbụl, anyị na-achọpụta na akụzikwara ihe banyere mnwapụta niile a na Testament Ọhụụ nwee kwa ihe eji àtụnyere ha na Testament Ochie. Adịghị anata ha niile n’otù oge kama ha bụ mnwapụta atọ dị icheiche, dịka ihe atọ a dị icheiche mere na Baibụl. Chineke na-enye ha mmadụ ka onye ahụ na-ekpe ekpere, were ndụ ya ná-achụrụ Chineke àjà ná-enyebiga kwa Onyenwe anyị onwe ya. Ị natawo mnwapụta nke imemmụọ atọ ndịa?
Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE- Òlee otú Devid si mata na ya emehiewo?
- Gịnị bụ ihe atọ Devid pụrụ isite na ha rọrọ ahụhụ agaenye ya?
- Gịnị mere Devid ji rọrọ ajọ ọrịa na èfèèfè?
- Gịnị kpatara Devid ji rọrọ ịdaba n’aka Chineke?
- Ụmụ Israel ole nwụrụ?
- Ònye n’etiti ha ka anapụtara ndụ ya?
- Gịnị mere Devid ji chọọ ebe nzọchaọka nke Arona?
- Òlee otú Devid si nweta ebe nzọchaọka ahụ?
- Gịnị kpatara Devid ji kwụọ ụgwọ ya?
- Kwue ihe abụọ ọzọ mere n’otù ebe ahụ.