Abù Ọma 72:1-20

Lesson 248 - Junior

Memory Verse
“Ọ gēmere onye nēnwegh ike na ogbeye ebere, ọ bu kwa nkpuru-obi ndi-ogbeye ka ọ gāzọputa” (Abù Ọma 72:13).
Notes

Udo, Nlụpụta nke Eziomume

Devid achịwo Israel nkeọma ọtụtụ arọ. Ugbu a ọ bụrụwo agadị nwoke nwa ya nwoke na-aga kwa ịnọchị ọnọdụ ya n’ocheeze. Devid anwapụtawo n’ọtụtụ arọ niile ahụ na ume na ike ya sitere n’ebe Chineke nọ, ọ chọkwara ka nwa ya nwee ọñụ nke ngọzi niile ahụ o nweworo. N’ihi ya o kpere ekpere sị, “Chineke, nye eze ikpe Gi nile, nye kwa nwa eze ezi omume-Gi.”

Devid chọrọ ka ndị Israel bụ ndị ya nwee udo, ọ hụtakwara na udo na-esite náánị n’eziomume. Aisaia Onyeamụma dere sị “Ihe ezi omume ahụ gāluputa bu udo; ihe nke gēsi n’òfùfè ezi omume ahu puta bu kwa inọ-j na ntukwasi-obi rue mgbe ebigh-ebi” (Aisaia 32:17).

Chineke ekwewo Devid mkwà na otù onye sitere n’agbụrụ ya ga-anọkwasị n’ocheeze Israel rue ebighịebi. Devid ghọtara site na Mmụọ ahụ ná-akpalị ya, na nke a na-atụ aka n’onye karịrị nwa ya nwoke bụ Solomon, maọbụ nwanwa-ya bụ Rehoboam. Site n’okwukwe ọ pụrụ ilepụ anya rue n’Ọgbọ Ọlaedo ahụ mgbe Jisọs n’Onwe-ya ga-abịa n’ụwa a ịchị ọchịchị eziomume, na udo ga-adị kwa n’ụwa n’etiti mmadụ.

N’ụfọdụ ihe-odide nke Devid, o kwuru okwu banyere oge Jisọs ga-abịa dịka Àjà nke mmehie. Nke ahụ ga-abụ ọbịbịa Ya nke mbụ, mgbe Ọ ga-ebi n’obiumeala n’etiti mmadụ bụrụ Onye akpọrọ asị na Onye emere ihe-efu, kpọgide kwa Ya n’obe n’ikpeazụ. Ma n’Abù Ọma nke iri asaa n’abụọ a Devid na ekwu banyere ọbịbịa Ya nke ugbò abụọ mgbe Jisọs na ndịnsọ Ya ga-abịa, iguzobe ọchịchị nke Ya onwe ya n’ụwa nke a. Ihe ọ malịtere dịka ekpere n’ihi nwa ya wee ghọọ amụma dị ebube banyere Ọchịchị nke Puku Arọ.

Inwe Agụụ maka Udo

Siterị na mgbe ndị Israel biri n’Ijipt hụjue kwa anya n’okpuru ndị nna ukwuu akaike, ha na-eche échìchè banyere ụbọchị ahụ mgbe nsogbu ha ga-agwụsị, mgbe onye ọ bụla ga ebi n’udo na ọgan’iru, ọ gaghị enwe kwa onye ga-emekpà ha arụ maọbụ aápụ ha ihe ha nwere.

Chineke kwere ha mkwà ndị dị otú ahụ ọ bụrụ na ha ga-erubere Ya isi. “Onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu n’obodo, onye agọziri agọzi ka gi onwe-gi gābu kwa n’ọhia.” “JEHOVA gēme ka etigbue n’iru gi ndi-iro-gi ndi nēbili imegide gi.” “JEHOVA gēnye ngọzi-Ya iwu n’ebe I nọ n’ọba-gi nile, na nime nseti aka-gi nile” (Deuteronomi 28:3, 7, 8). Ihe niile a ga-emejụworị agụụ ha ọ bụrụ na ha rubeere Chineke isi, ma nke a efunarịwo ha n’ihi mmehie ha. Ọbụná taa ọtụtụ nde ndị Ju na-ahụju anya, ikpé karịrị nke a na-echère ha tutu ha ga-akpọku Mesaia ha ewee chịkọta ha n’ihi otù puku arọ nke udo n’ụwa nke a.

Site n’ọtụtụ ọgbọ garaaga ịsụude na-adị n’obi ndị ana-emekpà arụ ka oge ka mma bịa. Ana-enwe kwa nnọọ ọtụtụ ndị ọgaranya, na óké ìgwè ndị ogbenye -- ndị ogbenye ahụ ahụjuwo kwa anya. Ọ bụ ndị ojii ebuuru dịka orù jee n’obodo Amerịka ndị lụrụọlụ n’okpuru ndị nnaukwuu ọjọọ dere ọtụtụ abụ anyị naabụ n’ụbọchị ndịa obi wee ná-atọ kwa anyị ụtọ. Ha kpọkuru Onyenwe anyị ka O nyere ha aka. “Rịd’ugb’al’ọkụ ụtọ, bịa bularuem ụlọ.” “Ọ dịghị Onye Maara Ahụhụm,” “M’gaghị-amụ ihe banyere Ịlụagha Ọzọ”, abụ ndịa bụ ákwá maka nnapụta, ha na-egosịpụta kwa olileanya maka oge ka mma.

Mba dị icheiche na ndịọchịchị agbalịwo iwepụta ọnọdụ mara mma nke onye ọ bụla ga-enwe ihe niile ha chọrọ, ma ha gbalịrị ime ya ná-ajụghị Chineke otú aga-esi mee ya. Anyị nwere ndị òtù Communism na Socialism, na ọtụtụ òtù ọzọ dị icheiche nke na-achọ ka mmadụ niile nwekọrịta ihe n’otù, ma ọtụtụ ndị ndú n’etiti ha nwere obi ọjọọ nke ukwuu ha chọrọ ka ego na ike niile bụrụ nke ha. N’okpuru ọchịchị ha ndịogbenye naabụ ogbenye karị, ná-ahụju kwa anya karị n’ihi ụkọ. N’ụfọdụ obodo ìgwè ndịogbenye bi nime ha enweghị kwa olileanya ọzọ na aga-enwe ụwa ka mma mgbe ọ bụla.

Ụbọchị nke Chineke

Ma ụbọchị nke Chineke na-abịa. Ndị nke Ya ga-enwe ọñụ nke ihenketa dị ebube n’ime ụwa nke a. Anyị na-ekwu banyere ijikere ijé binyere Jisọs n’Eluigwe, ma otù aka ahụ anyị ga-enwe otù puku arọ n’ebe a mgbe Jisọs ga-achị n’ebere, ndị nsọ Ya ga-eso kwa Ya chịa.

Ekwuru ọtụtụ ihe na Testament Ochie banyere Ọgbọ Ọlaedo ahụ n’ụwa karịa ihe banyere Eluigwe. Ndịamụma buru amụma banyere ya, ndị Israel nwekwara agụụ ịhụ ụbọchị ahụ mgbe aga akpụgharị mma-agha ka ha bụrụ mmaoge na ube ha niile ka ha bụrụ mmaịkwaosisi mgbe ndị ahụ agaghị amụta kwa agha ọzọ. Ike agwụwo ha ịlụagha mgbe niile, dịka ọ gwụworo ọtụtụ mmadụ taa. Agụụ gụsirị ha ike maka “udo n’oge nke anyi” ka ha wee nwee ebe ha ga-anọ zụlite ụmụ ha. Ọ dịghị ha mma icheta na mgbe ụmụokorọbịa ha tolitere, ha aghaghị ijé agha, eleghịanya ha anwụọ n’okorọbịa n’ihi obodo ha. Ha chọrọ inwe èzínaụlọ na ubi nke aka-ha ebe ụmụ ha gana-egwuriegwu. Ha nwere olileanya nke otù oge mgbe ha ga-enwe iheoriri na uweoyiyi ga-ezuru ha, ndịogbenye agaghị adị kwa.

Ụbọchị dị otú ahụ na-abịa n’ezie, ụmụ Chineke niile ga-enwe kwa ọñụ nime ya. Ọbụná anụọhịa ọjọọ niile agaghị emerụ ha arụ. “Anu-ọhia wolf na nwa-aturu gānọ kwa, agu na nwa-ewu gāmakpukọ kwa; nwa-ehi na nwa-ọdum na nwa anu emere ka ọ ma abuba gādi kwa n’otù ebe; nwatakiri ganēdu kwa ha” (Aisaia 11:6).

Ndị Ju bụ ndị sitere n’agbụrụ Ụmụ Israel ka aga-akpọghachị kwa n’Obodo Nsọ ahụ, ha ga-ebi kwa n’ebe ahụ n’udo. Ndị agadi ga-anọgide kwa, ọtụtụ ụmụntakịrị nwere ọñụ ga-anọ kwa ndị na agaghịama ihe banyere agha na nsogbu. Zekaraia Onyeamụma kwuru okwu banyere oge ahụ mgbe ọ sịrị: “Agadi ndikom na agadi ndinyom gānọdu kwa ala ọzọ n’ama nile nke Jerusalem, onye ọ bula o jide nkpa-n’aka-ya n’aka-ya site n’iba-uba nke ubọchi ndu-ya. Amá nile nke obodo ahu gējuputa kwa n’umu-ntakiri ndikom na umu-ntakiri ndinyom nēgwuri egwu n’ámá-ya nile” (Zekaraia 8:4, 5).

Ọ bụ oge a ka Devid pụrụ ịhụ, site n’okwukwe, mgbe o kpere ekpere n’ihi nwa ya nwoke. O kwuru banyere Jisọs mgbe ọ sịrị, “O gēji ezi omume kpe ndi-Gi ikpe, O gēji kwa ikpe ziri ezi kpe ndi-Gi ewedara n’ala.” Ọ bụ ezie na o nwekwara olileanya na nwa ya ga-abụ onye ikpe ziriezi na nke eziomume.

Site n’Osimmiri rue n’Osimmiri

Eze ahụ nke Devid kwuru banyere ya ga-achị “site n’otù oké osimiri rue oké osimiri ọzọ, site kwa n’Osimiri rue nsọtu nile nke uwa.” N’oge nke ha, náánị ihe ntà ka ha matara banyere otú ụwa ra. Ha matara Osimmiri Mediterranean dịka Óké Osimmiri, ha bi kwa nso Osimmiri Nwụrụanwụ nke na-atọ nnunnu. Ndị nna ha ochie agafewo Osimmiri Uhie. Ndịa bụ nchịkọta mmiri ha matara. Ha so ná mkwà Chineke kwere Abraham, Solomon na-aga kwa ịchị ha niile. Devid gakwara n’iru sị, “Site kwa n’Osimiri (nke bu Osimiri Yufretis) rue nsọtu nile nke uwa.” Nke ahụ karịrị ihe ndị Israel chèworo échìchè banyere ya. N’ezie Eze ga-achị obosara alaeze ra otú a karịrị Solomon.

Eze nke ndịEze

Nke a ga-abụ Eze nke ndị-eze niile nke ụwa ga-akpọ isiala nye. Chee échìchè nke a! Ndị ọchịchị niile na ndị niile ná-enye iwu ndị nweworo ike dị ukwuu n’ebe ọtụtụ nde mmadụ nọ (eleghịanya ọbụná n’ebe ndị karịrị ijeri mmadụ nọ) ga-akpọ isiala n’iru Eze ukwuu ahụ mgbe Ọ ga-abịa ịchị n’ụwa nke a. Ọ dịghị onye ọ bụla ga-enwe ike iguzogide ya, ọbụná ekwensu n’onwe ya agaghị enwe ike. “Ndi-iro-ya gāracha ájá.”

Ọ bụghị náánị na aga-eweda ndị eze nke ụwa ala n’iru Ya, kama ha ga-ewetara Ya onyinye site n’akụkụ niile nke ụwa. Mba niile ga-efè Onyeọchịchị a òfùfè.

Ọ ga-eju na ngàngà n’ihi ọnọdụ Ya nke a ebuliri elu? Ọ bụ náánị ndị ọgaranya nke ụwa ga-abụ ndị enyi Ya? Jisọs n’Onwe ya sịrị “Unu onwe-unu bu ndi-eyim, ma ọ buru na unu eme ihe Mu onwem nēnye unu n’iwu” (Jọn 15:14). Nke a ahụ gụkọtara anyị niile bụ ndị ná-erube isi n’okwu Ya. Chee nnọọ ihe ọ bụ na anyị pụrụ ịbụ ndị enyi nke Eze ukwuu a onye ga-edebe ndị eze niile ná-adịghịasọpụrụ Chineke na ndị niile ná-enye iwu n’ime uzuzu!

Jisọs sịrị na ndị dị umeala n’obi ga-eketa ụwa. “Ọ gānaputa ogbeye mgbe ọ nētiku ya; Ọ gānaputa kwa onye ewedara n’ala mgbe ọ digh onye nēyere ya aka.”

Pọl Onyeozi dere na ezi NdịKraist ga-eso Kraist ketakọọ ihe niile. Chineke gwara Ọkpara sị, “Oche-eze-gi, Chineke, nādiru mgbe nile ebigh-ebi: nkpa-n’aka-eze nke izi-ezi ka nkpa-n’aka nke ala-eze-Gi bu kwa” (Ndi Hibru 1:8). Anyị onwe-anyị kwa bụ NdịKraist amụrụ ọhụụ, bụ ụmụ Chineke, “Ma ọ buru na ayi bú umu, ayi bu kwa ndi-nketa; ndi-nketa nke Chineke, na ndi ha na Kraist nēkekọ; ma ọ buru na ọ bu ezie na ayi na Ya nāhukọ ahuhu, ka ewe nyekọ kwa ayi na Ya otuto” (Ndi Rom 8:16, 17).

Imeri Ahụhụ

Ọtụtụ oge adịwo mgbe Devid dara mbá n’ihi ndịiro ná alụso ya ọgụ. O kpere ekpere sị, “Rue ole mgbe ka m’gēdo ndum-ọdu nile nime nkpuru-obim, nēru uju n’obim n’ehihie nile? Rue ole mgbe agēbuli onye-irom elu ibu onye-isim?” (Abù Ọma 13:2). Mgbe ahụ aga-eme ka okwukwe ya dị kwa ọhụụ, ọ ga-abụ kwa, “Ma ọ bu ebere-Gi ka mu onwem tukwasiworo obi” (Abù Ọma 13:5). Ọ dakọtara n’okwu Pọl Onyeozi, onye sịrị “Anamagu na ahuhu nile nke oge di ugbu a ekwesigh ka ekwuta ha ma ele ebube ahu anya, bú nke agaje ikpughe n’ebe ayi nọ” (Ndi Rom 8:18). “Asi na ayi nēnwe ntachi-obi, ayi gēso kwa Ya bukọ eze” (2 Timọti 2:12).

Ụwa Ochie na Ụwa Ọhụụ

Mgbe Jọn Onyeozi nọ n’agwéetiti Patmọs, mmụọozi ahụ gwara ya sị “Ngọzi nādiri ya, ọ dị kwa nsọ, bú onye nwere òkè nime nbilite-n’ọnwu mbu ahu: ọnwu nke abua ahu enwegh ike n’ebe ndịa nọ, kama ha gābu ndi-nchu-àjà nke Chineke na nke Kraist, ha gēso kwa Ya buru eze nnu arọ abua na ọgu iri ahu” (Nkpughe 20:6). Nke ahụ ga-abụ n’ebe a nime ụwa nke a mgbe ewepụrụ ọbụbụọnụ ahụ: Jisọs wee bịa kwa ịbụ Eze nke ụwa niile. Mgbe ahụ mmụọozi ahụ wee kwue kwa sị, “Ha ganābu kwa eze rue mgbe nile ebighi-ebi” (Nkpughe 22:5). Ọ bụghị náánị otù puku n’ụwa ochie nke a, kama mgbe niile ebighịebi nime ụwa ọhụụ.

Mgbe Devid tụgharịsịrị uche n’ihe niile a nke Mmụọ ahụ gosiri ya, náánị ihe ọ pụrụ ime bụ inye Onyenwe anyị otuto. “Ka aha-Ya dirue mgbe ebigh-ebi; n’iru anyanwu ka aha-Ya nāmu ọmụmụ: madu gāgọzi kwa onwe-ha nime ya; mba nile gākpọ ya onye ihe nāgara nke-ọma … ka uwa nile juputa kwa na nsọpuru-Ya.” Nke a ga-emezu olileanya na agụụ niile nke Devid. Ọ dịghị kwa mkpà ikpé ekpere gaa n’iru. “Ekpere nke Devid nwa Jesi agwuwo.”

Questions
AJỤJỤ DỊ ICHEICHE
  1. Ònye bụ nwa-nwoke Devid?
  2. Gịnị mere Devid ji kpeere ya ekpere?
  3. Òlee ihe ekpere Devid mesịrị pụta nnọọ?
  4. Gịnị ka Devid na-ekwu banyere ya nime Abù Ọma nke a?
  5. Ònye ga-abụ Onye-ọchịchị nime alaeze ahụ ọ kpọrọ aha?
  6. Gịnị ga-eme ndịeze nke ụwa n’oge ahụ?
  7. Oge ra añaa ka ọchịchị Ya n’ụwa ga-anọgide?
  8. Òlee ndị ga-abụ ndị enyi nke Eze ọhụụ ahụ?
  9. Òlee ebe Alaeze Ya ga-agbasaru?
  10. Oge ra añaa ka ọchịchị nke ụwa ọhụụ ahụ ga-anọgide?